Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 36

Ị̀ Dị Njikere Ịbụ Onye Na-akụta Mmadụ?

Ị̀ Dị Njikere Ịbụ Onye Na-akụta Mmadụ?

“Kwụsị ịtụ egwu. Site ugbu a gaa n’ihu, ị ga na-akụta ndị mmadụ ná ndụ.”—LUK 5:10.

ABỤ NKE 73 Mee Ka Anyị Ghara Ịtụ Egwu

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee òkù Jizọs kpọrọ mmadụ anọ na-akụ azụ̀? Oleekwa ihe ha mere?

PITA, Andru, Jems, na Jọn bụ́ ndị na-eso ụzọ Jizọs ji ịkụ azụ̀ mere aka ọrụ. Chegodị otú o si gbaa ha gharịị mgbe Jizọs sịrị ha: “Soronụ m, m ga-eme unu ndị na-akụta mmadụ.” * Gịnị ka ha meziri? Baịbụl gwara anyị, sị: “Ozugbo ahụ, ha hapụrụ ụgbụ ha wee soro ya.” (Mat. 4:18-22) Ihe ahụ ha kpebiri ime gbanwere ndụ ha kpamkpam. Kama ịna-akụ azụ̀, ha ga “na-akụta ndị mmadụ ná ndụ.” (Luk 5:10) Taa, Jizọs na-akpọkwa ndị nwere ezi obi nwere mmasị n’eziokwu Baịbụl otu òkù ahụ. (Mat. 28:19, 20) Ị̀ zala òkù ahụ Jizọs na-akpọ gị ka ị bịa bụrụ onye na-akụta mmadụ?

2. Gịnị mere anyị ji kwesị iche echiche nke ọma tupu anyị ekpebie ịbụ ndị nkwusa? Oleekwa ihe ga-enyere anyị aka ikpebi ihe anyị ga-eme?

2 O nwere ike ịbụ na ị mụọla Baịbụl ruo oge ụfọdụ, gbanweekwa ihe ụfọdụ ná ndụ gị. Ihe fọziri ugbu a bụ ka ị ghọọ onye nkwusa. Ọ bụrụ na ọ ka na-eme gị obi abụọ ịza òkù a Jizọs kpọrọ, adala mbà. O nwere ike ịbụ na ihe mere i ji egbutụ oge bụ na ị maara na mkpebi a abụghị obere mkpebi. Ọ bụ eziokwu na Baịbụl sịrị na Pita na ndị enyi ya hapụrụ ụgbụ ha “ozugbo,” ma ọ pụtaghị na ha mere mkpebi ahụ n’echeghị echiche. Ha amatala na Jizọs bụ Mesaya ihe karịrị ọnwa isii tupu mgbe ahụ. (Jọn 1:35-42) O nwekwara ike ịbụ na ị mụtala ọtụtụ ihe gbasara Jehova na Jizọs, chọọkwa ka gị na Jehova na-adịkwu ná mma. Ma, tupu gị ekpebie ma ị̀ ga-abụ onye nkwusa, i kwesịrị ichebara ya echiche nke ọma. Gịnị nyeere Pita, Andru, na ndị ọzọ aka ikpebi ịza òkù ahụ Jizọs kpọrọ ha?

3. Olee àgwà ndị ga-eme ka ọ gụsiwe gị agụụ ike ịza òkù ahụ Jizọs kpọrọ?

Ndị mbụ soro ụzọ Jizọs nwere mmasị n’ihe ha na-eme, mara ọrụ ha nke ọma, nwee obi ike, na-arụkwa ahụ́ ha ụka. O doro anya na ọ bụ àgwà ndị a nyeere ha aka ịna-emekwu nke ọma n’ịkụta ndị mmadụ. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú anyị nwere ike isi mụta àgwà ndị ahụ ka anyị nwee ike ịna-eme nke ọma n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ.

NWEKWUO MMASỊ N’IKWUSA OZI ỌMA

Pita na ndị ọzọ ghọrọ ndị na-akụta mmadụ. A ka na-arụkwa ọrụ a dị ezigbo mkpa n’oge anyị a (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4 na nke 5)

4. Gịnị mere Pita ji nwee mmasị n’ọrụ ịkụ azụ̀?

Pita ji ịkụ azụ̀ akpa afọ ya na ezinụlọ ya. Ma, e wezụga iji ya akpa afọ ya na ezinụlọ ya, ọrụ ịkụ azụ̀ na-atọ ya ụtọ. (Jọn 21:3, 9-15) Ọ gbalịkwara mee ka ọrụ ịkụta mmadụ na-atọ ya ụtọ. Jehova nyeere Pita aka, ya amụta ọrụ ahụ nke ọma.—Ọrụ 2:14, 41.

5. Dị ka e kwuru na Luk 5:8-11, gịnị mere ụjọ ji bịa Pita, oleekwa ihe anyị ga-eme ma ụdị ụjọ ahụ bịa anyị?

5 Isi ihe mere anyị ji na-ekwusa ozi ọma bụ na anyị hụrụ Jehova n’anya. Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ nwere ike ime ka anyị kwụsị ịna-eche na anyị erughị eru ikwusa ozi ọma. Mgbe Jizọs kpọrọ Pita ka ọ bịa bụrụ onye na-akụta mmadụ, ọ gwara ya, sị: “Kwụsị ịtụ egwu.” (Gụọ Luk 5:8-11.) Pita atụghị ụjọ ihe nwere ike ime ya ma ọ ghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs. Kama nke ahụ, ọrụ ebube ahụ Jizọs rụrụ ha egbute ọtụtụ azụ̀ riri Pita ọnụ, meekwa ka o chee na o rughị eru iso Jizọs rụkọọ ọrụ. Gịnwa nwekwara ike ịtụwa ụjọ ma ị chọpụta ihe dị ná mmadụ ịbụ onye na-eso ụzọ Jizọs. Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, hụkwuo Jehova, Jizọs, na ndị agbata obi gị n’anya. Ọ ga-eme ka i nwekwuo mmasị ịza òkù ahụ Jizọs kpọrọ gị ka ị bịa bụrụ onye na-akụta mmadụ.—Mat. 22:37, 39; Jọn 14:15.

6. Olee ihe ndị ọzọ mere anyị ji enwe mmasị ikwusa ozi ọma?

6 Ka anyị leba anya n’ihe ndị ọzọ mere anyị ji enwe mmasị ikwusa ozi ọma. Anyị chọrọ ime ihe Jizọs gwara anyị mee. Ọ sịrị: “Gaanụ mee . . . ndị na-eso ụzọ.” (Mat. 28:19, 20) Ihe ọzọ mere anyị ji ekwusa ozi ọma bụ na ‘a gbara ndị mmadụ akpụkpọ, na-achụsakwa ha.’ Ọ dịkwa ha ezigbo mkpa ịnụ ozi ọma Alaeze Chineke. (Mat. 9:36) Jehova chọrọ ka ụdị mmadụ niile nweta ezi ihe ọmụma nke eziokwu nakwa ka a zọpụta ha.—1 Tim. 2:4.

7. Olee otú Ndị Rom 10:13-15 si gosi na ikwusa ozi ọma dị ezigbo mkpa?

7 Ọ bụrụ na anyị echee gbasara otú ozi ọma anyị nwere ike isi zọpụta ndị mmadụ, ọ ga-eme ka anyị nwee mmasị ikwusa ozi ọma. Ndị na-akụ azụ̀ na-ere azụ̀ ha kụtara ma ọ bụ rie ya. Ma, anyịnwa “na-akụta” ndị mmadụ ka e nwee ike ịzọpụta ha.—Gụọ Ndị Rom 10:13-15; 1 Tim. 4:16.

MỤTAKWUO IKWUSA OZI ỌMA

8-9. Gịnị ka onye na-akụ azụ̀ kwesịrị ịma, n’ihi gịnịkwa?

8 N’oge Jizọs, onye Izrel na-akụ azụ̀ na-ama ụdị azụ̀ o nwere ike ịkụta. (Lev. 11:9-12) Ọ na-amakwa ebe o nwere ike ịhụ ụdị azụ̀ ahụ. Azụ̀ na-anọkarị ná mmiri dị ya mma n’ahụ́ nakwa n’ebe ọ ga na-enweta nri mgbe niile. Oge onye na-akụ azụ̀ ji aga ịkụ azụ̀ dịkwa ezigbo mkpa. Otu onye ozi ala ọzọ bi n’agwaetiti Pasifik matara na e nwere oge kacha mma e ji aga ịkụ azụ̀. Otu nwanna nọ n’obodo ahụ gwara ya ka ha gaa kụọ azụ̀, ya asị nwanna ahụ, “M ga-abịa ma ọ kụọ elekere anya itoolu nke ụtụtụ echi.” Nwanna ahụ gwara ya, sị: “Anyị ga-aga mgbe anyị ga-akụta azụ̀, ọ bụghị mgbe dị anyịnwa mma.”

9 Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị rụrụ ọrụ ịkụta mmadụ n’oge ndịozi. Ha gara n’ebe e nwere ike ịhụ ndị mmadụ nakwa n’oge e nwere ike inweta ha. Dị ka ihe atụ, ndị na-eso ụzọ Jizọs kwusara ozi ọma n’ụlọ nsọ na n’ụlọ nzukọ, n’ụlọ n’ụlọ nakwa n’ọma n’ahịa. (Ọrụ 5:42; 17:17; 18:4) Anyịnwa kwesịkwara ịma mgbe anyị ga-enweta ndị mmadụ n’ụlọ n’ókèala anyị. Anyị kwesịrị ịhazigharị ihe ndị anyị na-eme ka anyị nwee ike izi ndị mmadụ ozi ọma n’ebe na n’oge anyị ga-enweta ha.—1 Kọr. 9:19-23.

NDỊ BỤ́ AKA OCHIE N’ỊKỤ AZỤ̀ . . . 1. na-akụ azụ̀ n’oge na n’ebe ha ga-enweta azụ̀ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8 na nke 9)

10. Olee ngwá ọrụ ndị nzukọ Jehova nyere anyị?

10 Onye na-akụ azụ̀ kwesịrị inwe ngwá ọrụ dị mma ọ ga-eji na-arụ ọrụ, marakwa otú e si eji ya arụ ọrụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyịnwa. Anyị kwesịrị inwe ngwá ọrụ dị mma anyị ji ezi ozi ọma, marakwa otú e si eji ya ezi ozi ọma. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya hoo haa otú ha ga-esi na-akụta ndị mmadụ. Ọ gwara ha ihe ha na-agaghị eji aga, ebe ha ga-aga, na ihe ha ga-ekwu. (Mat. 10:5-7; Luk 10:1-11) Taa, nzukọ Jehova emepụtarala anyị ọtụtụ ngwá ọrụ e ji akụzi Baịbụl. Ha dị n’ebe a na-akpọ, “Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe.” * Nzukọ Jehova na-azụ anyị ka anyị mụta iji ha akụzi ihe nke ọma. Ọzụzụ a na-eme ka anyị mụta iji obi ike akụzi ihe na ịkụzi ihe nke ọma.—2 Tim. 2:15.

NDỊ BỤ́ AKA OCHIE N’ỊKỤ AZỤ̀ . . . 2. ma otú e si e ji ngwá ọrụ ha arụ ọrụ nke ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)

NWEE OBI IKE

11. Gịnị mere ndị na-akụ azụ̀ ji kwesị inwe obi ike?

11 Ndị ji ịkụ azụ̀ mere aka ọrụ kwesịrị inwe obi ike. E nwere mgbe ihu ígwé na-agbanwe na mberede ma ha gaa ịkụ azụ̀. Ọtụtụ mgbe, ha na-aga ịkụ azụ̀ n’abalị. Ha na-agakwa ná mmiri ebe e nwere ike inwe oké ifufe na ebili mmiri. Ndị na-akụta mmadụ kwesịkwara inwe obi ike. Anyị malite ịga ozi ọma ma na-agwa ndị mmadụ na anyị bụ Ndịàmà Jehova, ndị ezinụlọ anyị nwere ike ịna-emegide anyị, ndị enyi anyị ana-akwa anyị emo, ndị mmadụ ajụkwa ige ntị n’ozi ọma anyị. Ma, ihe a anaghị eju anyị anya. Jizọs sịrị na ọ ga-eziga ndị na-eso ụzọ ya n’ebe a ga-akpagbu ha.—Mat. 10:16.

12. Dị ka e kwuru na Jọshụa 1:7-9, olee ihe ndị ga-enyere anyị aka inwekwu obi ike?

12 Olee ihe ndị ga-enyere gị aka ịna-enwekwu obi ike? Nke mbụ, ka obi sie gị ike na Jizọs si n’eluigwe na-eduzi ọrụ ikwusa ozi ọma a. (Jọn 16:33; Mkpu. 14:14-16) Nke abụọ, ka okwukwe gị sie ike na Jehova ga-elekọta gị. (Mat. 6:32-34) Ka okwukwe gị na-esikwu ike, ị ga na-enwekwu obi ike. Pita na ndịozi ndị ọzọ gosiri na ha nwere ezigbo okwukwe mgbe ha hapụrụ ọrụ ịkụ azụ̀ malite iso Jizọs. Gịnwa mekwara ụdị ihe ahụ. I gosiri na i nwere ezigbo okwukwe mgbe ị gwara ndị ezinụlọ gị na ndị enyi gị na gị na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl nakwa na ị na-eso ha aga ọmụmụ ihe. O dokwara anya na ị gbanweela ọtụtụ ihe ná ndụ gị ka i nwee ike ibi ndụ dị Jehova mma. I nwere ezigbo okwukwe na obi ike tupu gị enwee ike ime ihe ndị ahụ. Ka ị na-agbalị ka i nwekwuo obi ike, mara na “Jehova bụ́ Chineke gị nọnyeere gị ebe ọ bụla ị na-aga.”—Gụọ Jọshụa 1:7-9.

NDỊ BỤ́ AKA OCHIE N’ỊKỤ AZỤ̀ . . . 3. na-eji obi ike arụ ọrụ n’agbanyeghị otú ihu ígwé dị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11 na nke 12)

13. Olee otú ịtụgharị uche na ikpe ekpere nwere ike isi nyere gị aka inwe obi ike?

13 Olee ihe ọzọ anyị nwere ike ime ka anyị nwekwuo obi ike? Rịọ Jehova ka o mee ka i nwee obi ike. (Ọrụ 4:29, 31) Jehova ga-aza gị ekpere. Ọ gaghịkwa agbahapụ gị. Ọ nọnyeere gị mgbe niile. I nwekwara ike ịtụgharị uche gbasara otú Jehova si zọpụta ndị ya n’oge gara aga. Cheekwa otú o si nyere gị aka imeri nsogbu ndị bịaara gị, nakwa otú o si nyere gị aka ịgbanwe otú i si ebi ndụ. N’eziokwu, Onye ahụ nke duuru ndị ya gafee n’Oké Osimiri Uhie nwere ike inyere gị aka ịbụ onye na-eso ụzọ Kraịst. (Ọpụ. 14:13) Ka obi siekwa gị ike otú ahụ o siri ọbụ abụ ahụ sịrị: “Jehova nọnyeere m; agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?”—Ọma 118:6.

14. Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ Masae na Tomoyo?

14 Ihe ọzọkwa ị ga-eme iji na-enwekwu obi ike bụ ịmụ otú Jehova si nyere ndị na-emebu ihere aka, ha ebido inwe obi ike. Ka anyị tụlee banyere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Masae. Ọ na-eme ihere ma na-eche na ya enweghị ike ikwusa ozi ọma. Ịgwa ndị ọ na-amaghị okwu na-adị ya ka ịrị ugwu. N’ihi ya, o chere na ya agaghị ekwusali ozi ọma. Ọ gbasiri mbọ ike hụkwuo Jehova na ndị agbata obi ya n’anya. O chetakwara na ọ dị ezigbo mkpa ka ndị mmadụ nụ ozi ọma n’ihi na oge adịghịzi. O kpeziri ekpere ka Jehova mee ka ikwusa ozi ọma na-agụsi ya agụụ ike. Ọ kwụsịrị ime ihere. O mechadịrị bụrụ ọsụ ụzọ oge niile. Jehova nwekwara ike inyere ndị nkwusa ọhụrụ aka ‘inwe obi ike.’ Chegodị gbasara ihe otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Tomoyo kwuru. Mgbe mbụ ọ malitere ikwusa ozi ọma ụlọ n’ụlọ, onye mbụ ọ gara izi ozi ọma tiri mkpu, sị: “Achọghị m ihe ọ bụla ga-ejikọ mụ na Ndịàmà Jehova,” ya akwachie ụzọ ya n’ike. Tomoyo ji obi ike gwa onye ya na ya so, sị: “Ị̀ nụrụ ihe o kwuru? O nweghị ihe ọ bụla m kwuru, ya amata na m bụ Onyeàmà Jehova. Ihe a atọgbuola m.” Tomoyo bụzi ọsụ ụzọ oge niile ugbu a.

MỤTA ỊRỤ AHỤ́ GỊ ỤKA

15. Gịnị bụ mmadụ ịrụ ahụ́ ya ụka, gịnịkwa mere o ji dị Ndị Kraịst mkpa?

15 Ọtụtụ ndị bụ́ aka ochie n’ịkụ azụ̀ na-arụ ahụ́ ha ụka. Mmadụ ịrụ ahụ́ ya ụka pụtara onye ahụ “ịmanye onwe ya ime ihe o kwesịrị ime.” Ndị ji ịkụ azụ̀ mere aka ọrụ kwesịrị ịrụ ahụ́ ha ụka bilie n’isi ụtụtụ, nọrọ ruo mgbe ha kụchara azụ̀, nọgidekwa na-akụ azụ̀ n’agbanyeghị ihu ígwé. Anyịnwa kwesịkwara ịna-arụ ahụ́ anyị ụka ka anyị nwee ike ịtachi obi n’ọrụ anyị.—Mat. 10:22.

16. Olee otú anyị nwere ike isi mụta ịrụ ahụ́ anyị ụka?

16 Mmadụ ịrụ ahụ́ ya ụka abụghị ebumpụta ụwa. Kama nke ahụ, ihe na-amasịkarị anyị bụ ime ihe na-agaghị enye anyị nsogbu. Anyị ga-agbalịsirịrị ike iji na-arụ ahụ́ anyị ụka. N’ihi ya, enyemaka dị anyị mkpa iji zụọ onwe anyị ime ihe ndị nwere ike isiri anyị ike. Jehova na-eji mmụọ nsọ ya enyere anyị aka.—Gal. 5:22, 23.

17. Dị ka e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 9:25-27, olee otú Pọl onyeozi si kọwaa mgba ọ na-agba iji mụta ịrụ ahụ́ ya ụka?

17 Pọl onyeozi na-agbalị arụ ahụ́ ya ụka. Ma, o kwukwara na ọ dịghịrị ya mfe. Ọ sịrị na ọ ‘na-etipụta ahụ́ ya ọnyá’ ka o nwee ike ime ihe dị mma. (1 Ndị Kọrịnt 9:25-27.) Ọ gwara ndị ọzọ ka ha na-arụ ahụ́ ha ụka ma na-eme ihe niile “n’ụzọ kwesịrị ekwesị nakwa n’usoro.” (1 Kọr. 14:40) Anyị kwesịrị ịna-arụ ahụ́ anyị ụka ka anyị nwee ike ịna-aga ozi ọma ma na-eme ihe ndị ọzọ anyị kwesịrị ime n’ofufe Jehova.—Ọrụ 2:46.

EGBULA OGE

18. Gịnị ka anyị ga-eme ka Jehova na-ele anyị anya ka ndị na-eme nke ọma n’ozi ọma?

18 Ihe onye ji ịkụ azụ̀ mere aka ọrụ ji ama ma ọ̀ na-eme nke ọma bụ azụ̀ ole ọ na-akụta. Ma, ihe anyị ji ama ma ànyị na-eme nke ọma n’ozi ọma abụghị mmadụ ole anyị mere ka ha bata n’ọgbakọ. (Luk 8:11-15) Ọ bụrụ na anyị anọgide na-ekwusa ozi ọma ma na-akụziri ndị mmadụ Okwu Chineke, Jehova ga na-ele anyị anya ka ndị na-eme nke ọma. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na anyị na-erubere ya na Nwa ya isi.—Mak 13:10; Ọrụ 5:28, 29.

19-20. Olee ihe pụrụ iche mere anyị kwesịrị iji na-ekwusasi ozi ọma ike ugbu a?

19 N’obodo ụfọdụ, ọ bụ naanị n’ọnwa ụfọdụ ka a na-ahapụ ndị mmadụ ka ha gaa kụọ azụ̀. N’obodo ndị ahụ, ndị ọ́kụ̀ azụ̀ na-agbalịsikwu ike ma ọnwa ha ji akụ azụ̀ gwụwa. Ebe anyị bụ ndị na-akụta mmadụ, o nwere ezigbo ihe mere anyị kwesịrị iji na-ekwusasi ozi ọma ike ugbu a. Ọ bụ n’ihi na ọgwụgwụ ụwa a ji ọsọ na-abịa. Oge fọrọnụ iji kwusaa ozi a na-azọ ndụ dịzi ntakịrị. Egbula oge ma ọ bụ sị ka i chere ka ihe niile dịchaara gị mma tupu gị esoro n’ọrụ a dị ezigbo mkpa.—Ekli. 11:4.

20 Gbalịa ugbu a ka i nwekwuo mmasị n’ikwusa ozi ọma, mụtakwuo otú e si ekwusa ozi ọma, nwee obi ike, mụtakwa ịna-arụ ahụ́ gị ụka. E nwere ihe karịrị nde mmadụ asatọ na-arụ ọrụ ịkụta mmadụ n’ụwa niile. Soro ha na-arụ ọrụ a. Ị ga na-enwe ọṅụ si n’aka Jehova. (Nehe. 8:10) Kpebisie ike iji obi gị niile soro na-arụ ọrụ a, sorokwa rụọ ya ruo mgbe Chineke ga-asị na o zuola. N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-atụle ihe atọ ga-enyere anyị aka ikpebisikwu ike ịnọgide na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke dị ka ndị na-akụta mmadụ.

ABỤ NKE 66 Na-ekwusa Ozi Ọma

^ par. 5 Jizọs kpọrọ ndị ọ́kụ̀ azụ̀ dị umeala n’obi ma na-arụsi ọrụ ike ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Taa, Jizọs ka na-akpọkwa ndị nwere àgwà ndị a ka ha bịa bụrụ ndị na-akụta mmadụ. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe ndị a na-amụrụ Baịbụl kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ọ na-esiri ha ike ịza òkù a Jizọs na-akpọ.

^ par. 1 NKỌWAKWU: Ndị na-akụta mmadụ” bụ ndị niile na-ekwusa ozi ọma ma na-akụziri ndị ọzọ ihe ga-eme ka ha ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs.

^ par. 10 Gụọ isiokwu bụ́ “Na-akụzi Eziokwu.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Ọktoba 2018, peeji nke 11-16.