Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 43

Jehova Na-eduzi Ọgbakọ Ya

Jehova Na-eduzi Ọgbakọ Ya

“‘Ọ bụghị site n’ụsụụ ndị agha, ọ bụghịkwa site n’ike, kama ọ bụ site na mmụọ m,’ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.”—ZEK. 4:6.

ABỤ NKE 40 Ònye Ka Anyị Bụ Nke Ya?

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị ka Ndị Kraịst merela baptizim kwesịrị ịna-eme?

Ì MEELA baptizim? Ọ bụrụ na i meela, ọ pụtara na ị nọ n’ihu ọha gosi na i nwere okwukwe n’ebe Jehova nọ, chọọkwa ịnọ n’ọgbakọ ya na-ejere ya ozi. * Ma, okwukwe i nwere n’ebe Jehova nọ kwesịrị ịna-esikwu ike ka oge na-aga. I kwesịkwara ịna-emesi onwe gị obi ike na ọ bụ Jehova na-eduzi ọgbakọ ya taa.

2-3. Olee otú Jehova si eduzi ọgbakọ ya taa? Nye ihe atụ.

2 Taa, otú Jehova si eduzi nzukọ ya na-egosi ụdị onye ọ bụ, nzube ya, nakwa ụdị omume na-amasị ya. Ka anyị leba anya n’àgwà ya atọ anyị nwere ike ịhụ n’ọgbakọ ya.

3 Nke mbụ, “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu.” (Ọrụ 10:34) Ọ bụ ịhụnanya mere Jehova ji nye Ọkpara ya ka ọ bụrụ “ihe mgbapụta . . . maka mmadụ niile.” (1 Tim. 2:6; Jọn 3:16) Jehova si n’aka ndị ohu ya na-eme ka ndị nwere ezi obi nụ ozi ọma. O si otú ahụ na-enyere onye ọ bụla chọrọnụ aka ka ihe mgbapụta ahụ baara ya uru. Nke abụọ, Jehova bụ Chineke nke udo na onye na-eme ihe n’usoro. (1 Kọr. 14:33, 40) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịtụ anya na ndị na-efe ya ga-adị n’udo ma bụrụ ndị a haziri ahazi. Nke atọ, Jehova bụ “Onye Ozizi Ukwu.” (Aịza. 30:20, 21) Ọ bụ ya mere ọgbakọ ya ji lekwasị anya n’ịkụzi Okwu ya e ji ike mmụọ nsọ dee ma n’ọmụmụ ihe ma n’ozi ọma. Olee otú ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ si mee ihe atọ a so n’ihe e ji mara Jehova? Olee otú ndị Jehova si eme ha taa? Oleekwa otú mmụọ nsọ ga-esi enyere gị aka n’ofufe ị na-efe Jehova n’ọgbakọ ya taa?

CHINEKE ANAGHỊ ELE MMADỤ ANYA N’IHU

4. Dị ka e kwuru n’Ọrụ Ndịozi 1:8, gịnị ka Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha mee, oleekwa ihe ga-enyere ha aka?

4 N’oge Ndị Kraịst oge mbụ. Ozi ọma Jizọs ziri mere ka ndị mmadụ nwee olileanya. (Luk 4:43) Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha rụrụ ọrụ ahụ ọ malitere gawa, ya bụ, ka ha gbaa àmà banyere ya ruo “n’ebe kasị anya n’ụwa.” (Gụọ Ọrụ Ndịozi 1:8.) N’eziokwu, ha enweghị ike ịrụ ọrụ a n’ike aka ha. Mmụọ nsọ, ya bụ, “ihe inyeaka ahụ” Jizọs kwuru okwu ya, dị ha mkpa.—Jọn 14:26; Zek. 4:6.

5-6. Olee ụzọ dị iche iche mmụọ nsọ si nyere ndị na-eso ụzọ Jizọs aka?

Ndị na-eso ụzọ Jizọs nwetara mmụọ nsọ na Pentikọst afọ 33. Mmụọ nsọ nyeere ha aka, ha amalite ikwusa ozi ọma ozugbo. N’oge na-adịghịkwa anya, ọtụtụ puku nabatara ozi ọma ha. (Ọrụ 2:41; 4:4) Mgbe a malitere ịkpagbu ha, ha atụghị ụjọ, kama, ha rịọrọ Jehova ka o nyere ha aka. Ha rịọrọ ya, sị: ‘Nye ndị ohu gị ike ka anyị nọgide na-ekwu okwu gị n’atụghị egwu ọ bụla.’ Ha jupụtara ná mmụọ nsọ ma nọgide na-ekwu “okwu Chineke n’atụghị egwu.”—Ọrụ 4:18-20, 29, 31.

6 E nwekwara nsogbu ndị ọzọ ndị na-eso ụzọ Jizọs nwere. Dị ka ihe atụ, Akwụkwọ Nsọ e nwere n’oge ahụ dị ole na ole. Ha enweghịkwa ihe ndị e ji amụ Baịbụl dị ka anyị nwere taa. Ndị ha na-ezi ozi ọma nwekwara asụsụ dị iche iche ha na-asụ. N’agbanyeghị ihe ndị a niile, ha mere ihe yiri ihe na-agaghị ekwe omume. Naanị n’ime ihe dị ka afọ iri atọ, ha kwusara ozi ọma ahụ “n’etiti ihe niile e kere eke dị n’okpuru eluigwe.”—Kọl. 1:6, 23.

7. N’ihe karịrị otu narị afọ gara aga, olee otú ndị ohu Jehova si mara ihe Jehova chọrọ ka ha mee, gịnịkwa ka ha mere?

7 N’oge anyị a. Jehova ka na-eduzi ndị ya ma na-enye ha ike. Ọ bụ Okwu ya e ji ike mmụọ nsọ dee ka ọ kacha eji eduzi ndị ya. Ọ bụ n’ebe ahụ ka e dere ihe gbasara ozi Jizọs jere nakwa iwu o nyere ndị na-eso ụzọ ya ka ha nọgide na-ekwusa ozi ọma ọ malitere. (Mat. 28:19, 20) N’ọnwa Julaị afọ 1881, Ụlọ Nche kwuru, sị: “Ihe mere e ji kpọọ anyị ma ọ bụ họpụta anyị abụghị ka a na-akwanyere anyị ùgwù ma ọ bụ ka anyị baa ọgaranya, kama, ọ bụ ka anyị jiri ihe niile anyị nwere kwusaa ozi ọma.” Otu akwụkwọ nta e bipụtara n’afọ 1919 aha ya bụ To Whom the Work Is Entrusted (ya bụ, Ndị E Nyere Ọrụ) sịrị: “Ọrụ a ga-arụ juru eju bara abara. Ma, ọ bụ ọrụ Onyenwe anyị. Ọ ga-enyekwa anyị ike anyị ga-eji arụ ya.” Dịkwa ka Ndị Kraịst oge mbụ, ụmụnna anyị ndị a nwere obi ike ma rụsie ọrụ ike n’ihi na ha ma na mmụọ nsọ ga-enyere ha aka ikwusara ụdị mmadụ niile ozi ọma. Anyịnwa nwekwara ụdị obi ike ahụ taa.

Nzukọ Jehova ejirila ngwá ọrụ ndị kacha mma e nwere mee ka ozi ọma gbasaa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8 na nke 9)

8-9. Olee ụzọ dị iche iche nzukọ Jehova sirila mee ka ọtụtụ ndị nụ ozi ọma?

8 Nzukọ Jehova ejirila ngwá ọrụ ndị kacha mma e nwere eme ka ozi ọma gbasaa. Ụfọdụ n’ime ngwá ọrụ ndị a bụ akwụkwọ ndị e biri ebi, “Foto Ihe Nkiri nke Okike,” gramafon, ụgbọala ndị a rụnyere ígwè okwu, na redio. Taa ha na-ejikwa kọmputa na Ịntanet eme ya. Nzukọ Jehova na-asụgharịkwa ọtụtụ ihe n’ọtụtụ asụsụ karịa otú ndị ọ bụla ọzọ metụrụla. N’ihi gịnị? Ọ bụ ka ụdị mmadụ niile nwee ike ịnụ ozi ọma ahụ n’asụsụ ha. Jehova anaghị ele mmadụ anya n’ihu. O buru amụma na a ga-ekwusara “mba niile na ebo niile na asụsụ niile na ndị niile” ozi ọma. (Mkpu. 14:6, 7) Ọ chọrọ ka mmadụ niile nwee ike ịnụ ozi ọma Alaeze ahụ.

9 Oleekwanụ maka ndị ọ na-esi ike izi ozi ọma? O nwere ike ịbụ n’ihi na ndị nche anaghị ekwe mmadụ bata n’ebe ha bi, ma ọ bụkwanụ na ụzọ ha na-agbachikarị agbachi. Iji mee ka ụdị ndị a nụ ozi ọma, Jehova ejirila nzukọ ya mee ka e bido isi n’ụzọ dị iche iche na-ekwusa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị. Dị ka ihe atụ, n’afọ 2001, Òtù Na-achị Isi kwuru ka e bido iji ihe nkwagharị na ihe ndị ọzọ e nwere ike iji akpọsa akwụkwọ anyị na-ezi ozi ọma na Frans. Ka oge na-aga ha kwukwara ka e mewe ya n’ebe ndị ọzọ. Ihe a mịpụtara ezigbo mkpụrụ. N’afọ 2011, a malitere isi n’ụzọ ọhụrụ ekwusa ozi ọma n’otu n’ime ebe kacha ekwo ekwo na Niu Yọk Siti dị n’Amerịka. N’afọ mbụ a malitere ya, e nyefere ndị mmadụ akwụkwọ dị otu narị puku na puku abụọ, otu narị na iri abụọ na itoolu nakwa magazin dị puku iri isii na asatọ, narị itoolu na iri na otu. Puku mmadụ anọ, narị asaa na otu kwukwara ka a mụwara ha Baịbụl. Ihe a mere ka o doo anya na Jehova ji mmụọ nsọ ya na-eduzi ọrụ a. N’ihi ya, Òtù Na-achị Isi kwuru ka a malite iji ihe ndị a na-akwagharị akwagharị na-ekwusa ozi ọma n’ebe niile n’ụwa.

10. Gịnị ka anyị nwere ike ime ka anyị mụtakwuo izi ozi ọma?

10 Ihe i nwere ike ime. Gbalịa mụta ọtụtụ ihe Jehova na-akụziri anyị ma anyị gaa ọmụmụ ihe. Soro ndị nọ n’ìgwè ozi ubi unu na-aga ozi ọma ọtụtụ mgbe. Ị ga-esi n’aka ha mụtakwuo otú e si ezi ozi ọma na otú e si akụzi ihe. Ha ga-agbakwa gị ume. Na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị ihe ndị nwere ike ime ka o siere gị ike. Dị ka amaokwu e si nweta isiokwu a si kwuo, anyị agaghị emeli uche Chineke n’ike nke onwe anyị, kama, ọ bụ mmụọ nsọ ga-enyere anyị aka ime ya. (Zek. 4:6) A sị ka e kwuwe, ọrụ anyị na-arụ bụ nke Chineke.

JEHOVA BỤ CHINEKE NKE UDO NA NKE NA-EME IHE N’USORO

11. Olee otú òtù na-achị isi e nwere n’oge ndịozi si gbakọọ aka mee ka ndị Chineke nọgide na-eme ihe n’usoro?

11 N’oge ndịozi. Òtù na-achị isi nọ na Jeruselem gbakọrọ aka ọnụ mee ka ndị Chineke nọgide na-eme ihe n’usoro ma dịrị n’udo. (Ọrụ 2:42) Dị ka ihe atụ, n’afọ 49, mgbe a na-enweghị otu olu n’ihe gbasara ibi ùgwù, mmụọ nsọ duziri òtù na-achị isi, ha eleba okwu ahụ anya. Ọ bụrụ na ọgbakọ emechaghị nwee otu olu n’okwu a, ozi ọma agaraghị agbasa otú o si gbasaa. N’agbanyeghị na ndịozi na ndị okenye ahụ bụ ndị Juu, ha ekweghị ka omenala ndị Juu ma ọ bụ ndị omenala ndị Juu riri isi megharịa ha anya. Kama, ha kwere ka Okwu Chineke na mmụọ nsọ ya duzie ha. (Ọrụ 15:1, 2, 5-20, 28) Gịnị mechara mee? Jehova gọziri mkpebi ha mere. Ọgbakọ nọgidere na-adị n’otu, ozi ọma ana-agakwa n’ihu.—Ọrụ 15:30, 31; 16:4, 5.

12. Gịnị gosiri na nzukọ Jehova dị n’otu ma dịrị n’udo taa?

12 N’oge anyị a. Nzukọ Jehova agbaala mbọ ka ndị Jehova na-eme ihe n’usoro ma dịrị n’udo. N’afọ 1895, Zion’s Watch Tower and Herald of Christ’s Presence nke Nọvemba 15 nwere isiokwu bụ́ “N’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị na n’Usoro.” E si ná 1 Ndị Kọrịnt 14:40 nweta ya. Isiokwu ahụ sịrị: “E nwere ọtụtụ ihe ndịozi dere gbasara ime ihe n’usoro . . . Ọ ga-abara anyị uru ma anyị jiri nlezianya mee ‘ihe ndị e dere n’oge gara aga, ndị e dere iji nye anyị ntụziaka.’” (Rom 15:4) Ndị Jehova taa ka chọkwara ịna-eme ihe n’usoro ma dịrị n’udo otú ahụ Ndị Kraịst oge mbụ mere. Iji maa atụ, ọ bụrụ na ị chọrọ ịga Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche n’ọgbakọ ọzọ ma ọ bụdị ná mba ọzọ, ị ma isiokwu a ga-amụ nakwa otú a ga-esi eduzi ya. Ihe a na-eme ka ahụ́ ruo gị ala. E nweghị ihe nwere ike ime ka ndị Jehova dị n’otu otú a ma ọ́ bụghị mmụọ nsọ Chineke.—Zef. 3:9.

13. N’iburu ihe e kwuru na Jems 3:17 n’uche, olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?

13 Ihe i nwere ike ime. Jehova chọrọ ka ndị ya “nọgide n’ịdị n’otu nke mmụọ nsọ, n’ihe nkekọ nke bụ́ udo.” (Efe. 4:1-3) Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-enye aka eme ka udo dị n’ọgbakọ? M̀ na-akwanyere ndị na-edu ndú n’ọgbakọ ùgwù? Ndị ọzọ hà ga-atụkwasịli m obi, karịchaa ma ọ bụrụ na m nwere ihe ndị m na-arụ n’ọgbakọ? M̀ na-abịa ihe n’oge, na-enyere ndị mmadụ aka ma dịrị njikere ijere ndị ọzọ ozi?’ (Gụọ Jems 3:17.) Ọ bụrụ na ị chọpụta na e nwere ebe i kwesịrị imezikwu, kpee ekpere ka Chineke nye gị mmụọ nsọ ya. Ka ị na-ekwe ka mmụọ nsọ na-eduzi otú i si eche echiche na ihe ndị ị na-eme, ka ụmunna gị ga na-ahụkwu gị n’anya ma jiri gị kpọrọ ihe.

JEHOVA NA-AKỤZIRI ANYỊ IHE MA NA-ENYE ANYỊ IHE NDỊ DỊ ANYỊ MKPA

14. Dị ka e kwuru ná Ndị Kọlọsi 1:9, 10, olee otú Jehova si kụziere ndị ya ihe n’oge ndịozi?

14 N’oge ndịozi. Ọ na-atọ Jehova ụtọ ịkụziri ndị ya ihe. (Ọma 32:8) Ọ chọrọ ka ha mara ya, hụ ya n’anya ma dịrị ndụ ebighị ebi dị ka ụmụ ọ hụrụ n’anya. Ihe a niile agaghị ekwe omume ma ọ bụrụ na ọ naghị akụziri ha ihe. (Jọn 17:3) Jehova si n’aka ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ kụziere ndị ya ihe. (Gụọ Ndị Kọlọsi 1:9, 10.) Mmụọ nsọ, ya bụ “ihe inyeaka” ahụ Jizọs kwere ndịozi ya ná nkwa, nyekwaara ha ezigbo aka. (Jọn 14:16) O mere ka ndịozi ahụ ghọtakwuo ihe dị n’Okwu Chineke. O chetakwaara ha ọtụtụ ihe Jizọs kụziri na ọtụtụ ihe o mere, ndị e mechara dee na Baịbụl. Ihe Ndị Kraịst oge mbụ mụtara n’Okwu Chineke mere ka okwukwe ha sie ike, ha ahụkwuokwa Jehova, Jizọs, na ụmụnna ha n’anya.

15. Olee ụzọ dị iche iche ị chọpụtarala Jehova si emezu ihe e kwuru n’Aịzaya 2:2, 3?

15 N’oge anyị a. Jehova buru amụma na “n’oge ikpeazụ,” ndị si ná mba niile ga-ekworo na-aga n’ugwu Jehova ka ọ kụziere ha ụzọ ya. (Gụọ Aịzaya 2:2, 3.) Amụma ahụ na-emezu taa. E buliela ofufe Jehova elu karịa okpukpe ụgha niile e nwere. Jehova jikwa Baịbụl na-akụziri anyị ọtụtụ ihe. (Aịza. 25:6) O si n’aka “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” na-akụziri anyị ihe ndị a. Dị ka ihe atụ, anyị nwere vidio na katuun, okwu ndị a na-ekwu ná nnọkọ anyị dị iche iche, na isiokwu ndị na-agba n’akwụkwọ anyị. (Mat. 24:45) Obi dị anyị otú ahụ ọ dị Elaịhu mgbe ọ sịrị: “Olee onye ozizi dị ka [Chineke]?”—Job 36:22.

Mee ka eziokwu Baịbụl bamie gị n’obi, na-emekwa ihe ndị ị mụtara (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16) *

16. Olee ihe ndị i nwere ike ime ka ihe ndị Jehova na-akụziri anyị na-abara gị uru?

16 Ihe i nwere ike ime. Mmụọ nsọ ga-enyere gị aka ịma otú ị ga-esi eme ihe ndị ị mụtara n’Okwu Chineke. Kpee ụdị ekpere otu ọbụ abụ kpere. Ọ sịrị: “Jehova, biko, kụziere m ụzọ gị. M ga-eje ije n’eziokwu gị. Mee ka obi m dị n’otu ịtụ egwu aha gị.” (Ọma 86:11) N’ihi ya, nọgide na-amụ Baịbụl na ihe ndị nzukọ Jehova na-ewepụtara anyị. Ma, ihe mere i ji na-amụ ihe ndị a abụghị naanị ka ị mụta ihe. I kwesịkwara ime ka eziokwu bamie gị n’obi, na-emekwa ihe ị mụtara. Mmụọ nsọ Jehova ga-enyere gị aka ime ya. I kwesịkwara iji ihe ị mụtara na-agba ụmụnna gị ume. (Hib. 10:24, 25) N’ihi gịnị? N’ihi na ha bụ ndị ezinụlọ anyị. Rịọ Jehova ka o nyere gị aka isi n’obi gị na-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe nakwa ka i mee ihe omume e nyere gị n’ụzọ kacha mma i nwere ike. I mee ihe ndị a, ị na-egosi Jehova na Ọkpara ya na ị hụrụ “atụrụ” ha n’anya.—Jọn 21:15-17.

17. Olee ụzọ ndị i nwere ike isi gosi na ị na-akwado nzukọ Jehova?

17 N’oge na-adịghị anya, ọ bụ naanị nzukọ Jehova nke o ji mmụọ nsọ ya na-eduzi ga-afọdụ. N’ihi ya, jiri ịnụ ọkụ n’obi na-akwado nzukọ Jehova. Gosi na ị hụrụ ndị ọzọ n’anya ka Jehova. Otú ị ga-esi eme ya bụ ịna-ekwusara ụdị mmadụ niile ozi ọma. Jehova ejighị udo na ime ihe n’usoro egwu egwu. N’ihi ya, ṅomie Jehova ma na-eme ka ọgbakọ dịrị n’otu. Na-esi n’ọtụtụ ihe Jehova ji akụziri anyị ihe na-amụta ihe. Ị ga-esi otú ahụ na-ege Onye Ozizi anyị kachanụ ntị. Ọ ga-eme ka ụjọ ghara ịtụ gị ka ụwa Setan a na-eru ọgwụgwụ ya. Kama ịtụ ụjọ, obi ga-esi gị ike, gị esorokwa ụmụnna gị ndị ọzọ na-efe Jehova ná nzukọ ya.

ABỤ NKE 3 Ị Bụ Ike Anyị, Olileanya Anyị, na Obi Ike Anyị

^ par. 5 Obi ò siri gị ike na Jehova na-eduzi ọgbakọ ya taa? N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú Jehova si duzie ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ nakwa otú o si eduzi ndị ya n’oge a.

^ par. 1 NKỌWAKWU: Ndị na-efe Jehova n’eluigwe na ndị na-efe ya n’ụwa socha ná nzukọ Jehova. Ma n’isiokwu a, anyị kwuo “nzukọ Jehova,” ọ bụ ndị nke nọ n’ụwa na-efe ya ka anyị na-ekwu.

^ par. 52 NKỌWA FOTO: Mgbe otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ oge niile lechara vidio ndị gara mba ndị a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma, o kpebiri na ọ ga-eme ka ha. O mechara mezuo ihe a o kpebiri.