Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 42

Otú E Si Eduziri Mmadụ Ọmụmụ Baịbụl Ga-eme Ka O Ruo Eru Ime Baptizim—Agba nke Abụọ

Otú E Si Eduziri Mmadụ Ọmụmụ Baịbụl Ga-eme Ka O Ruo Eru Ime Baptizim—Agba nke Abụọ

“Na-elezi onwe gị na ozizi gị anya mgbe niile.”—1 TIM. 4:16.

ABỤ NKE 77 Ìhè Na-enwu n’Ụwa A Gbara Ọchịchịrị

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee otú anyị si mara na ọrụ ime ndị na-eso ụzọ na-azọ ndị mmadụ ndụ?

ỌRỤ ime ndị na-eso ụzọ bụ ọrụ na-azọ ndị mmadụ ndụ. Olee otú anyị si mara? Mgbe Jizọs nyere iwu ahụ e dere na Matiu 28:19, 20, ọ sịrị: “Gaanụ mee . . . ndị na-eso ụzọ. . . . Na-eme ha baptizim.” Olee otú ime baptizim dịruru ná mkpa? Ọ bụ ihe ndị chọrọ ka a zọpụta ha ga-emerịrị. Onye chọrọ ime baptizim ga-ekwetarịrị na naanị ihe ga-eme ka a zọpụta ya bụ n’ihi na Jizọs nwụrụ maka anyị, a kpọlitekwa ya. Ọ bụ ya mere Pita onyeozi ji gwa Ndị Kraịst ibe ya, sị: “Ihe ya na ihe a yiri na-azọpụtakwa unu ugbu a, ya bụ, baptizim, . . . site ná mbilite n’ọnwụ Jizọs Kraịst.” (1 Pita 3:21) N’ihi ya, onye ọhụrụ mee baptizim, o meela ihe ga-eme ka o nwee olileanya na a ga-azọpụta ya.

2. Olee ụdị ndị nkụzi 2 Timoti 4:1, 2 sị na anyị kwesịrị ịbụ?

2 Iji mee ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, anyị kwesịrị inwe “nkà izi ihe.” (Gụọ 2 Timoti 4:1, 2.) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Jizọs nyere anyị iwu, sị: “Gaanụ mee . . . ndị na-eso ụzọ. . . . Na-ezi ha [ihe].” Pọl onyeozi sịrị ka anyị “nọgide” n’ọrụ a, ‘n’ihi na site n’ime otú a, anyị ga-azọpụta onwe anyị, zọpụtakwa ndị na-ege anyị ntị.’ Ọ bụ ya mere Pọl ji buru ụzọ kwuo, sị: “Na-elezi . . . ozizi gị anya mgbe niile.” (1 Tim. 4:16) Ebe ọ bụ na izi ihe na ime ndị na-eso ụzọ na-aga ụkwụ na ụkwụ, anyị kwesịrị ime ka otú anyị si ezi ihe bụrụ ịgba.

3. Gịnị ka anyị ga-atụle gbasara ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl n’isiokwu a?

3 Anyị na-akụziri ọtụtụ nde mmadụ eziokwu ndị dị na Baịbụl n’ụwa niile. Ma, dị ka e kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị chọrọ ịma otú anyị ga-esi nyere ọtụtụ n’ime ndị a aka ka ha mee baptizim ma ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe ise ọzọ anyị kwesịrị ime iji nyere onye anyị na-amụrụ Baịbụl aka ka ọ na-eme nke ọma ma ruo eru ime baptizim.

KWE KA Ọ BỤRỤ BAỊBỤL GA-AKỤZIRI YA IHE

Gwa onye nkwusa bụ́ aka ochie n’ịkụzi ihe ka o nyere gị aka ka ị mụtakwuo ikwe ka Baịbụl kụziere mmadụ ihe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4 ruo na nke 6) *

4. Gịnị mere onye na-amụrụ mmadụ ihe ekwesịghị ịna-ekwu ọtụtụ okwu? (Kwuokwa ihe e dere n’ala ala peeji.)

4 Ebe ọ bụ na ihe anyị si n’Okwu Chineke na-akụzịrị ndị mmadụ na-atọgbu anyị atọgbu, o nwere ike ime ka anyị chọọ iji ọnụ anyị kwuchaa ihe niile. N’ihi ya, ma ànyị na-eduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche, Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ, ma ọ bụkwanụ na-eduziri ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl n’ụlọ ha, anyị ekwesịghị ịna-ekwu ọtụtụ okwu. Onye na-amụrụ mmadụ Baịbụl ekwesịghị ịna-ekwu ọtụtụ okwu. O kwesịrị ịhapụ ka ọ bụrụ Baịbụl ga-akụziri onye ahụ ihe. O kwesịghịkwa ịna-achọ ịkọwacha ihe niile ọ maara banyere otu amaokwu Baịbụl ma ọ bụ isiokwu ha na-amụ. * (Jọn 16:12) Chegodị banyere ihe ndị ị maara na Baịbụl tupu gị emee baptizim na ihe ndị ị maara ugbu a. O yikarịrị ka ihe ị ma mgbe i mere baptizim ọ̀ bụ eziokwu ndị bụ́ isi Baịbụl na-akụzi. (Hib. 6:1) O weela gị ọtụtụ afọ iji mata ihe ndị ị ma ugbu a. N’ihi ya, achọla ka ị kụzichaara onye ị na-amụrụ Baịbụl ihe niile ị ma otu mgbe.

5. (a) N’ihi ihe e kwuru ná 1 Ndị Tesalonaịka 2:13, olee ihe anyị chọrọ ka o doo onye anyị na-amụrụ Baịbụl anya? (b) Olee otú anyị nwere ike isi gbaa onye anyị na-amụrụ Baịbụl ume ka ọ na-ekwu ihe ndị ọ na-amụta?

5 Anyị chọrọ ka o doo onye anyị na-amụrụ ihe anya na ihe ọ na-amụta si n’Okwu Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee. (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 2:13.) Olee otú anyị ga-esi eme ya? Gbaa onye ị na-amụrụ Baịbụl ume ka ọ na-ekwu ihe ndị ọ na-amụta. Kama ịna-akọwara ya amaokwu Baịbụl mgbe niile, gwa ya ka ọ kọwaara gị ụfọdụ n’ime ha. Nyere ya aka ka ọ chọpụta otú Okwu Chineke si gbasa ya. Jụọ ya ajụjụ ndị ga-eme ka o kwuo ihe o chere ma ọ bụ otú obi dị ya gbasara ebe ndị unu gụrụ na Baịbụl. (Luk 10:25-28) Dị ka ihe atụ, jụọ ya, sị: “Olee àgwà Jehova amaokwu Baịbụl a na-akọrọ gị banyere ya?” “Olee uru eziokwu Baịbụl a baara gị?” “Olee otú obi dị gị gbasara ihe a ị mụtara?” (Ilu 20:5) Ihe kacha mkpa abụghị ihe ole onye anyị na-amụrụ Baịbụl ma, kama ọ bụ otú ndị nke ọ ma si na-atọ ya ụtọ, ya ana-emekwa ha eme.

6. Olee ihe mere o ji dị mma ịkpọrọ onye nkwusa ma nke a na-akọ ma ị gawa ịmụrụ mmadụ ihe?

6 Ị̀ na-akpọrọ ndị nkwusa ma nke a na-akọ ma ị gawa ịmụrụ mmadụ ihe? Ya bụrụ otú ahụ, i nwere ike ịjụ ha ihe ha chere gbasara otú i si akụzi ihe nakwa ma ị̀ na-ekwe ka Baịbụl kụziere mmadụ ihe. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmụtakwu otú e si akụzi ihe nke ọma, ị ga-adịrịrị umeala n’obi. (Tụlee Ọrụ Ndịozi 18:24-26.) Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ịjụ onye nkwusa ahụ ma ò chere na onye ahụ ị na-amụrụ ihe na-aghọta ihe a na-akụziri ya. I nwekwara ike ịgwa ya ka ọ gaa mụọrọ onye ahụ ihe ma ọ bụrụ na ị gaghị anọ ya ruo otu izu ma ọ bụ karịa. Ọ ga-eme ka ọmụmụ ihe ahụ na-aga n’ihu, meekwa ka onye ị na-amụrụ ihe ghọta mkpa ọmụmụ ihe ahụ dị. Echekwala na ọmụmụ ihe ahụ bụ nke gị, nakwa na e nweghị onye ọzọ ga-eduzili ya. A sị ka e kwuwe, ihe ị chọrọ bụ ihe ga-akacha abara onye ị na-amụrụ ihe uru, ka o nwee ike ịna-enwe ọganihu n’eziokwu ọ na-amụta.

JIRI ỊNỤ ỌKỤ N’OBI NA-AKỤZI IHE, GOSIKWA NA I KWETARA N’IHE Ị NA-AKỤZI

Kọọrọ onye ị na-amụrụ Baịbụl akụkọ ndị mere eme gosiri otú e si eme ihe Baịbụl kwuru (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7 ruo na nke 9) *

7. Gịnị ga-eme ka ihe onye a na-amụrụ Baịbụl na-amụta na-atọ ya ụtọ?

7 Onye ị na-amụrụ ihe kwesịrị ịchọpụta na eziokwu ndị dị na Baịbụl na-enu gị enu n’obi nakwa na i kwetasiri ike na ha. (1 Tesa. 1:5) O yiri ka ọ̀ bụ mgbe ahụ ka ihe ndị ọ na-amụta ga-atọwa ya ụtọ. I nwedịrị ike ịgwa ya otú ime ihe Baịbụl kwuru sirila nyere gị aka. Ọ ga-abịazi doo ya anya na ihe ndị dị na Baịbụl ga-enyekwara yanwa aka.

8. Olee ihe ndị ọzọ i nwere ike ime iji nyere onye ị na-amụrụ Baịbụl aka? Oleekwa ihe mere ị ga-eji eme ihe ndị ahụ?

8 Unu mụwa Baịbụl, kọọrọ ya akụkọ ndị mere eme gbasara ụmụnna anyị ndị nwere ụdị nsogbu ndị yanwa nwere ma ha emerie ya. I nwere ike ịkpọrọ onye nọ n’ọgbakọ unu akụkọ ya ga-abara onye ị na-amụrụ ihe uru. I nwekwara ike isi na jw.org nweta akụkọ ndị na-agba ume n’isiokwu bụ́ “Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ.” * Ụdị isiokwu ndị ahụ na vidio ha na ha so ga-enyere onye ị na-amụrụ ihe aka ịghọta uru ime ihe Baịbụl kwuru ga-abara ya.

9. Olee otú i nwere ike isi gbaa onye ị na-amụrụ ihe ume ka ọ na-agwa ndị ezinụlọ ya na ndị enyi ya ihe ndị ọ na-amụta?

9 Ọ bụrụ na onye ị na-amụrụ Baịbụl alụọla di ma ọ bụ nwunye, di ya ma ọ bụ nwunye ya ọ̀ na-amụkwa Baịbụl? Ọ bụrụ na azịza ya bụ mba, gwa ya ka o sonyere unu n’ọmụmụ ihe unu. Gbaa onye ị na-amụrụ ihe ume ka ọ na-agwa ndị ezinụlọ ya na ndị enyi ya ihe ndị ọ na-amụta. (Jọn 1:40-45) Olee otú ị ga-esi eme ya? I nwere ike ịjụ ya, sị: “Olee otú i nwere ike isi kọwaara ndị ezinụlọ gị ihe a ị mụtara?” ma ọ bụ “Olee amaokwu Baịbụl i nwere ike iji kọwaara enyi gị ihe a?” I si otú a na-eme ya, ọ pụtara na ị na-azụ ya ka ọ bụrụ onye nkuzi. O mechaa ghọọ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim, ọ ga-enwezi ike iso ọgbakọ na-aga ozi ọma. I nwere ike ịjụ ya ma è nwere onye ọzọ ọ ma ga-achọ ịmụ Baịbụl. Ọ bụrụ na e nwere, kpọtụrụ onye ahụ ozugbo ma gwa ya ka gị na ya mụwa Baịbụl. Gosi ya vidio bụ́ Olee Otú Anyị na Ndị Mmadụ Si Amụ Baịbụl? *

GBAA ONYE Ị NA-AMỤRỤ IHE UME KA O META NDỊ NỌ N’ỌGBAKỌ ENYI

Gbaa onye ị na-amụrụ ihe ume ka o meta ndị nọ n’ọgbakọ enyi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10 na nke 11) *

10. Dị ka e kwuru ná 1 Ndị Tesalonaịka 2:7, 8, olee otú anyị nwere ike isi ṅomie Pọl?

10 Onye na-amụrụ mmadụ ihe kwesịrị igosi na ọ na-eche banyere ndị ọ na-amụrụ ihe. Were ha ka ndị ga-emecha bụrụ ụmụnna gị. (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 2:7, 8.) Ọ gaghị adịrị ha mfe ịhapụ ndị enyi ha bụ́ ndị ụwa, gbanweekwa ọtụtụ ihe ná ndụ ha iji fee Jehova. Anyị kwesịrị inyere ha aka ka ha nweta ezigbo ndị enyi n’ọgbakọ. Meta onye ị na-amụrụ ihe enyi. Na-ewepụta oge ka gị na ya na-anọrị, ọ bụghị naanị mgbe unu na-amụ ihe. Ọ bụrụ na ị na-akpọ ya n’ekwentị, na-ezigara ya ozi, ma ọ bụ na-aga eleta ya n’oge ndị ọzọ, ọ ga-egosi na ị na-eche banyere ya.

11. Gịnị ka anyị chọrọ ka ndị anyị na-amụrụ ihe nweta n’ọgbakọ, n’ihi gịnịkwa?

11 A na-ekwukarị na otu onye anaghị azụ nwa, nakwa na nwa bụ nwa ọha. N’ihi ya, anyị nwere ike ikwu na otu onye anaghị eme ka mmadụ ghọọ onye na-eso ụzọ. Ọgbakọ ga-enye aka. Ọ bụ ya mere ndị ma nke a na-akọ n’ịkụzi ihe ji eme ka ndị ha na-amụrụ ihe mata ụmụnna ndị ga-enyere ha aka n’ọgbakọ. Ha ga-enyere ha aka ịghọ enyi Jehova, nyekwara ha aka n’oge nsogbu. Anyị chọrọ ka onye nke ọ bụla anyị na-amụrụ ihe mata na e ji ya kpọrọ ihe n’ọgbakọ, nakwa na anyị na ya nọ n’otu ezinụlọ. Anyị chọkwara ka onye nke ọ bụla n’ime ha nwee mmasị n’ebe ụmụnna anyị nọ. Ọ bụ mgbe ahụ ka ọ ga-adịrị ya mfe ịkwụsị iso ndị na-anaghị enyere ya aka ife Jehova na-akpakọrịta. (Ilu 13:20) Ọ bụrụ na ndị bụ́bu enyi ya ajụ ya, obi ga-esi ya ike na ọ ga-enweta ezigbo ndị enyi ná nzukọ Jehova.—Mak 10:29, 30; 1 Pita 4:4.

MEE KA Ọ MATA NA Ọ DỊ MKPA KA O NYEFEE JEHOVA ONWE YA, E MEEKWA YA BAPTIZIM

E nwere ihe ndị onye a na-amụrụ Baịbụl kwesịrị ime ka o ruo eru ime baptizim (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12 na nke 13)

12. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-agwa onye anyị na-amụrụ ihe banyere inyefe Jehova onwe ya na ime baptizim?

12 Na-agwa ya mgbe niile na ọ dị mkpa ka o nyefee Chineke onwe ya ma mee baptizim. A sị ka e kwuwe, ihe anyị bu n’obi na-amụrụ ndị mmadụ ihe bụ iji nyere ha aka ka ha fewe Jehova, e meekwa ha baptizim. Ọ bụrụ na anyị amụọrọ mmadụ ihe ruo ọnwa ole na ole, karịchaa, ọ bụrụ na onye ahụ abịawala ọmụmụ ihe, o kwesịrị ido ya anya na ihe mere anyị ji na-amụrụ ya ihe bụ ka ọ bụrụ Onyeàmà Jehova.

13. Olee ihe ndị onye a na-amụrụ Baịbụl kwesịrị ime ka o ruo ime baptizim?

13 E nwere ihe ndị onye a na-amụrụ Baịbụl chọrọ ime baptizim kwesịrị ime. Nke mbụ, o kwesịrị ịmara Jehova nke ọma, hụ ya n’anya, nweekwa okwukwe na ya. (Jọn 3:16; 17:3) Ya na Jehova kwesịkwara ịdị n’ezigbo mma, ya na ụmụnna abụrụkwa enyi. (Hib. 10:24, 25; Jems 4:8) Ka oge na-aga, ọ ga-akwụsị ịkpa àgwà ọjọọ ma chegharịa ná mmehie ya. (Ọrụ 3:19) Ihe ọzọkwa ọ ga-eme bụ ịgwa ndị ọzọ banyere eziokwu ndị ọ na-amụta. (2 Kọr. 4:13) N’ikpeazụ, ọ ga-enyefe Jehova onwe ya ma mee baptizim. (1 Pita 3:21; 4:2) Mmadụ niile na-enwe obi ụtọ n’ụbọchị ahụ o mere baptizim. Ka onye ahụ a na-amụrụ Baịbụl na-agba mbọ ka o mee nke ọ bụla n’ime ihe ndị a, jiri obi gị niile na-aja ya mma ma na-agba ya ume ka ọ nọgide na-eme nke ọma.

Ị GỤRỤ GỤRỤ, GỊ ELEE MA Ọ̀ NA-EMEKWA NKE ỌMA

14. Olee otú onye na-amụrụ mmadụ Baịbụl nwere ike isi chọpụta ma onye ọ na-amụrụ Baịbụl ọ̀ na-emekwa nke ọma?

14 Anyị kwesịrị inwe ndidi ma anyị nyewere mmadụ aka ka o nyefee Jehova onwe ya ma mee baptizim. Ma, o nwere mgbe ọ ga-eru, ya adị mkpa ka anyị chọpụta ma onye anyị na-amụrụ ihe ọ̀ chọkwara ife Jehova Chineke. È nwere ihe ndị na-egosi na onye ahụ na-agba mbọ idebe ihe Jizọs nyere n’iwu? Ka ihe ọ chọrọ ọ̀ bụ naanị ịmụta ihe ndị dị na Baịbụl?

15. Olee ihe ndị onye na-amụrụ mmadụ ihe ga-eji mara ma onye ọ na-amụrụ ihe ọ̀ na-eme nke ọma?

15 Si n’oge ruo n’oge, na-ele ma onye ị na-amụrụ Baịbụl ọ̀ na-emekwa nke ọma. Dị ka ihe atụ, ọ̀ na-ekwu otú obi dị ya gbasara Jehova? Ọ̀ na-ekpe ekpere? (Ọma 116:1, 2) Ịgụ Baịbụl ọ̀ na-atọ ya ụtọ? (Ọma 119:97) Ọ̀ na-abịachi ọmụmụ ihe anya? (Ọma 22:22) Ò meela mgbanwe ndị o kwesịrị ime ná ndụ ya? (Ọma 119:112) Ọ̀ malitela ịkọrọ ndị ezinụlọ ya na ndị enyi ya ihe ọ na-amụta? (Ọma 9:1) Nke kacha mkpa, ọ̀ chọrọ ịbụ Onyeàmà Jehova? (Ọma 40:8) Ọ bụrụ na ọ naghị eme nke ọma ná nke ọ bụla n’ime ihe ndị a, jiri akọ chọpụta ihe kpatara ya. Gị na ya kwurịtakwa ya. Gwakwa ya ihe o kwesịrị ime n’ezoghị ọnụ. *

16. Olee mgbe i kwesịrị ịkwụsị ịmụrụ mmadụ ihe?

16 Si n’oge ruo n’oge, gbalịa chọpụta ma gị na onye ị na-amụrụ ihe ùnu ga-amụrụ ihe na-aga. Jụọ onwe gị, sị: ‘Ọ̀ na-ahapụ ịkwadebe ihe unu ga-amụ? Ọ̀ na-esiri ya ike ịbịa ọmụmụ ihe? Ò nwere àgwà ọjọọ ndị ọ ka na-akpa? Ọ̀ ka nọ n’okpukpe ụgha?’ Ọ bụrụ na azịza ajụjụ ndị a bụ ee, ịnọgide na-amụrụ ya ihe dị ka ịkụziri onye na-achọghị ka mmiri mesa ya n’ahụ́ otú e si egwu mmiri. Ọ bụrụ na onye ị na-amụrụ ihe ejighị ihe ị na-amụrụ ya kpọrọ ihe, ọ chọghịkwa ịgbanwe ndụ ya, gịnị mere ị ga-eji nọgide na-amụrụ ya ihe?

17. Dị ka e kwuru na 1 Timoti 4:16, gịnị ka ndị niile na-amụrụ mmadụ Baịbụl kwesịrị ime?

17 Anyị ji ọrụ ime ndị na-eso ụzọ kpọrọ ihe, anyị chọkwara ka ndị anyị na-amụrụ ihe na-eme nke ọma ma ruo eru ime baptizim. N’ihi ya, anyị kwesịrị ikwe ka ọ bụrụ Baịbụl ga-akụziri ha ihe, jiri ịnụ ọkụ n’obi kụzie ihe, gosikwa na anyị kweere n’ihe anyị na-akụzi. Anyị kwesịrị ịgba ndị anyị na-amụrụ ihe ume ka ha meta ndị nọ n’ọgbakọ enyi. Anyị kwesịkwara ime ka ha mata na inyefe Jehova onwe ha na ime baptizim dị ezigbo mkpa. Anyị nọtụ, anyị atụlee otú ha si eme. (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Ihe Ndị Na-amụrụ Mmadụ Baịbụl Ga-eme Iji Nyere Ndị Ha Na-amụrụ Ihe Aka Ịna-eme Nke Ọma ma Ruo Eru Ime Baptizim.”) Obi dị anyị ụtọ na anyị so na-arụ ọrụ a na-azọ ndị mmadụ ndụ. Ka anyị kpebisie ike ime ike anyị niile n’iduzi ọmụmụ Baịbụl ga-eme ka ndị mmadụ mee nke ọma ma ruo eru ime baptizim.

ABỤ NKE 79 Na-ezi Ha Ihe Ka Okwukwe Ha Sie Ike

^ par. 5 Anyị mụwara ndị mmadụ Baịbụl, anyị na-enyere ha aka ịmata otú Jehova chọrọ ka ha si na-eche echiche, na-ele ihe anya ma na-akpa àgwà. Isiokwu a ga-akọwakwu otú anyị ga-esi na-emekwu nke ọma n’ịkụzi ihe.

^ par. 4 Gụọ isiokwu bụ́ “Emela Ihe Ndị A Mgbe Ị Na-amụrụ Mmadụ Ihe.” Ọ gbara n’akwụkwọ Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ nke Septemba 2016.

^ par. 8 Gaa n’ebe e dere GBASARA ANYỊ, pịa AKỤKỌ GBASARA NDỊÀMÀ JEHOVA.

^ par. 9 Na JW Library®, gaa n’ebe e dere MEDIA, pịa OUR MEETINGS AND MINISTRY, pịzie TOOLS FOR THE MINISTRY.

^ par. 15 Gụọ isiokwu ndị a: “Ịhụ Jehova n’Anya Ga-eme Ka I Mee Baptizim” na “Ị̀ Dịla Njikere Ime Baptizim?” Ha gbara n’Ụlọ Nche nke Mach 2020.

^ par. 77 NKỌWA FOTO: Mgbe ụmụnna nwaanyị abụọ gachara duzie ọmụmụ Baịbụl, nwanna nwaanyị nke bụ́ aka ochie ana-agwa nwanna nwaanyị duziri ọmụmụ ihe ahụ otú ọ ga-esi na-eduzi ọmụmụ Baịbụl n’ekwughị ọtụtụ okwu.

^ par. 79 NKỌWA FOTO: Ebe a na-akụziri nwaanyị ahụ a na-amụrụ Baịbụl otú ọ ga-esi buru ezigbo nwunye. O mechara kọọrọ di ya ihe ọ mụtara.

^ par. 81 NKỌWA FOTO: Ebe nwaanyị ahụ na di ya gara n’ụlọ otu n’ime ndị ọ matara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.