Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 45

Otú Anyị Ga-esi Enyere Ndị Ọzọ Aka Ka Ha Na-edebe Iwu Kraịst

Otú Anyị Ga-esi Enyere Ndị Ọzọ Aka Ka Ha Na-edebe Iwu Kraịst

“Ya mere, gaanụ mee . . . ndị na-eso ụzọ. . . . Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu.”—MAT. 28:19, 20.

ABỤ NKE 89 Gee Ntị, Rube Isi, Ka A Gọzie Gị

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Dị ka e dere na Matiu 28:18-20, olee ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha mee?

MGBE a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, ọ pụtara n’ihu ndị na-eso ụzọ ya gbakọtara na Galili. E nwere ihe dị mkpa ọ chọrọ ịgwa ha. Olee ihe ọ bụ? E dere ihe o kwuru na Matiu 28:18-20.—Gụọ ya.

2. Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle?

2 Iwu Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ka ha mee ndị na-eso ụzọ gbasara ndị ohu Chineke niile taa. N’ihi ya, ka anyị zaa ajụjụ atọ gbasara ọrụ a Jizọs nyere anyị. Nke mbụ, e wezụga ịkụziri ndị ọhụrụ ihe Chineke chọrọ ka anyị na-eme, olee ihe ọzọ anyị kwesịrị ime? Nke abụọ, olee otú ndị nkwusa niile nọ n’ọgbakọ ga-esi enye aka mee ka ndị a na-amụrụ Baịbụl na-emekwu nke ọma? Nke atọ, olee otú anyị ga-esi enyere ndị kwụsịrịla ịga ozi ọma aka ịmaliteghachi ime ndị na-eso ụzọ?

KỤZIERE HA IDEBE IWU KRAỊST

3. Olee ihe doro anya Jizọs kwuru n’iwu ahụ o nyere?

3 Iwu Jizọs nyere doro anya. Iwu ji anyị ịkụziri ndị mmadụ ihe o nyere n’iwu. Ma, o nwere ihe dị mkpa anyị na-ekwesịghị ileghara anya. Jizọs asịghị: ‘Na-ezi ha ihe niile m nyere unu n’iwu.’ Kama, ọ sịrị: “Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu.” Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe a Jizọs kwuru ma anyị na-eduziri mmadụ ọmụmụ Baịbụl, anyị kwesịrị ịkụziri onye ahụ ihe o kwesịrị ime, gosikwa ya otú ọ ga-esi eme ya. (Ọrụ 8:31) Gịnị mere anyị ji kwesị ime ihe a?

4. Jiri ihe atụ kọwaa otú anyị nwere ike isi kụziere onye anyị na-amụrụ ihe idebe ihe Kraịst nyere n’iwu.

4 Olee otú anyị nwere ike isi kụziere mmadụ idebe ihe Jizọs nyere n’iwu? Ka anyị tụlee ihe atụ ga-enyere anyị aka ịma otú anyị ga-esi eme ya. Olee otú onye na-akụziri mmadụ ịnya ụgbọala si akụziri onye ahụ ka ọ na-erubere iwu na-achị okporo ụzọ isi? O nwere ike ibu ụzọ kụziere ya iwu ndị ahụ n’ọnụ. Ma, iji kụziere ya otú ọ ga-esi na-erubere iwu ndị ahụ isi, e nwere ihe ọzọ o kwesịrị ime. O kwesịrị iso ya mgbe ọ na-anya ụgbọala iji mara otú ọ ga-esi eme ihe ndị ahụ ọ kụziiri ya. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe atụ a?

5. (a) Dị ka e kwuru na Jọn 14:15; 1 Jọn 2:3, gịnị ka anyị kwesịrị ịkụziri ndị anyị na-amụrụ Baịbụl ka ha na-eme? (b) Nye ihe atụ otú anyị nwere ike isi nyere ndị anyị na-amụrụ Baịbụl aka ime ihe ndị ha na-amụta na Baịbụl.

5 Anyị mụwara ndị mmadụ Baịbụl, anyị na-akụziri ha ihe Chineke chọrọ ka anyị na-eme. Ma e nwere ihe ọzọ anyị ga-eme. Anyị kwesịrị ịkụziri ha ka ha na-eme ihe ndị ha na-amụta eme. (Gụọ Jọn 14:15; 1 Jọn 2:3.) Anyị kwesịrị isi n’ihe ndị anyị na-eme kụziere ndị anyị na-amụrụ ihe otú ha ga-esi eme ihe Baịbụl kwuru n’ụlọ akwụkwọ, n’ebe ha na-arụ ọrụ, ma ọ bụ mgbe ha na-atụrụ ndụ. Anyị nwere ike ịkọrọ ha ihe mere anyị iji gosi ha otú ime ihe Baịbụl kwuru si chebe anyị ma ọ bụ otú o si nyere anyị aka ime mkpebi dị mma. Anyị nwekwara ike ịnọ n’ihu ha rịọ Jehova n’ekpere ka mmụọ nsọ ya nyere ha aka.—Jọn 16:13.

6. Olee ihe so n’ịkụziri ndị mmadụ idebe ihe Jizọs nyere n’iwu?

6 Olee ihe so n’ịkụziri ndị mmadụ idebe ihe Jizọs nyere n’iwu? Anyị kwesịrị ime ka ọ na-agụ ndị anyị na-amụrụ Baịbụl agụụ ime ndị na-eso ụzọ. Ụjọ ikwusa ozi ọma nwere ike ịna-atụ ụfọdụ n’ime ha. N’ihi ya, anyị kwesịrị inwere ha ndidi mgbe anyị na-enyere ha aka ịghọta eziokwu ndị dị na Baịbụl ka okwukwe ha nwee ike isikwu ike. Ọ bụ mgbe ahụ ka ihe anyị na-akụziri ha ga-eru ha n’obi, ya emeekwa ka ha chọọ ikwusa ozi ọma. Olee ihe ndị anyị kwesịrị ime iji nyere ndị anyị na-amụrụ Baịbụl aka ka ọ gụwa ha agụụ ikwusa ozi ọma?

7. Olee otú anyị ga-esi enyere onye anyị na-amụrụ Baịbụl aka ka ọ gụwa ya agụụ ikwusa ozi ọma?

7 Anyị nwere ike ịjụ onye anyị na-amụrụ Baịbụl ajụjụ ndị a: “Olee otú ndụ gị sirila gbanwee n’ihi na ị na-eme ihe Baịbụl kwuru? Ì chere na ndị ọzọ kwesịrị ịnụ ozi ọma a? Gịnị ka i nwere ike ime iji nyere ha aka?” (Ilu 3:27; Mat. 9:37, 38) Gosi onye ahụ ị na-amụrụ Baịbụl traktị ndị so n’Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe. Gwa ya ka ọ họrọ ndị nke o chere ga-aka amasị ndị ikwu ya, ndị enyi ya, ma ọ bụkwanụ ndị ọrụ ibe ya. Nyekwa ya ole ga-ezuru ya. Gị na ya mụgharịakwa otú ọ ga-esi eji akọ enyefe traktị ndị ahụ. N’eziokwu, mgbe onye anyị na-amụrụ Baịbụl ghọrọ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim, anyị kwesịrị iso ya na-aga ozi ọma ka anyị nwee ike ịna-enyere ya aka.—Ekli. 4:9, 10; Luk 6:40.

OTÚ ỌGBAKỌ SI ENYERE NDỊ A NA-AMỤRỤ BAỊBỤL AKA IMEKWU NKE ỌMA

8. Gịnị mere o ji dị mkpa ka ndị anyị na-amụrụ Baịbụl nwee ịhụnanya siri ike maka Chineke nakwa maka ndị mmadụ? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Otú Anyị Ga-esi Eme Ka Ndị Anyị Na-amụrụ Baịbụl Hụkwuo Jehova n’Anya.”)

8 Cheta na Jizọs nyere anyị iwu ka anyị na-akụziri ndị mmadụ ka ha “debe ihe niile” o nyere n’iwu. Ihe ndị so n’ihe ndị ahụ o nyere n’iwu bụ iwu abụọ kachanụ, ya bụ, ịhụ Chineke n’anya na ịhụ ndị agbata obi anyị n’anya. (Mat. 22:37-39) Anyị ga-ahụrịrị Chineke na ndị mmadụ n’anya ka anyị nwee ike ikwusa ozi ọma. O doro anya na ikwusa ozi ọma nwere ike ịtụ ụfọdụ ndị anyị na-amụrụ Baịbụl ụjọ. Ma, anyị nwere ike ime ka obi sie ha ike na Jehova ga-enyere ha aka iji nwayọọ nwayọọ kwụsị ịtụ mmadụ egwu. (Ọma 18:1-3; Ilu 29:25) Igbe dị n’isiokwu a kọwara ihe ndị anyị kwesịrị ime iji nyere onye anyị na-amụrụ ihe aka ịhụkwu Chineke n’anya. Olee ihe ndị nọ n’ọgbakọ nwere ike ime iji nyere ndị ọhụrụ aka inwekwu ịhụnanya?

9. N’ihe atụ onye na-amụ ịnya ụgbọala, olee otú onye ahụ na-amụ ịnya ụgbọala ga-esi amụta ihe ndị bara uru?

9 Ka anyị lebakwa anya n’ihe atụ onye ahụ na-amụ ịnya ụgbọala. Ọ gaa ịnya ụgbọala mgbe onye nkụzi ya so ya, olee otú ọ ga-esi amụta ihe? Ọ ga na-ege onye nkụzi ya ntị ma na-elekwa otú ndị ọzọ ji nlezianya na-anya ụgbọala si anya. Dị ka ihe atụ, onye nkụzi ya nwere ike igosi ya ọkwọ ụgbọala kwere ka onye ọzọ gbafere ya. O nwekwara ike igosi ya ọkwọ ụgbọala gbatulatara ọkụ ya ka ọ ghara ịchachi ndị ọzọ na-akwọ ụgbọala anya. Ihe ndị a ga-akụziri onye ahụ na-amụ ịnya ụgbọala ihe ndị o nwere ike ịna-eme ma ọ nyawa ụgbọala.

10. Olee ihe ga-enyere onye a na-amụrụ Baịbụl aka ịghọ onye na-eso ụzọ?

10 Otú ahụkwa ka ọ dị onye a na-amụrụ Baịbụl malitere ije ije n’ụzọ nke ndụ. Ọ bụghị naanị n’aka onye na-amụrụ ya Baịbụl ka ọ ga-esi amụta ihe. Ọ ga-amụtakwa ihe n’aka ndị ọzọ na-efe Jehova. N’ihi ya, olee ihe ga-enyere ndị a na-amụrụ Baịbụl aka ime nke ọma? Ọ bụ ịbịa ọmụmụ ihe anyị. N’ihi gịnị? Ihe ha ga-anụ n’ọmụmụ ihe ga-eme ka ha mụtakwuo ihe, mee ka okwukwe ha sikwuo ike, meekwa ka ha hụkwuo Chineke n’anya. (Ọrụ 15:30-32) Ihe ọzọ bụ na, n’ọmụmụ ihe, onye na-amụrụ ya Baịbụl nwere ike igosi ya ụmụnna ndị ọnọdụ ya na ha bụ otu, ma ọ bụkwanụ ndị ihe na-eme ya metụrụla. Ọ ga-ahụ na ụmụnna nọ n’ọgbakọ hụrụ ibe ha n’anya. Ka anyị tụlee ihe atụ ụfọdụ.

11. Olee ihe ndị onye a na-amụrụ Baịbụl nwere ike ịchọpụta n’ọgbakọ? Oleekwa otú ihe ndị ahụ nwere ike isi nyere ya aka?

11 Mgbe otu nwaanyị a na-amụrụ Baịbụl naanị ya na-azụ ụmụ gara ọmụmụ ihe, ọ hụrụ otu nwanna nwaanyị na-azụkwa ụmụ naanị ya, ya emetụ ya n’obi otú nwanna nwaanyị ahụ si agba mbọ akpọ obere ụmụaka ya abịa ọmụmụ ihe. Otu nwoke na-aṅụ sịga a na-amụrụ Baịbụl matara nwanna gbara mbọ kwụsị ịṅụ sịga. Nwanna ahụ gwara ya otú ịhụkwu Jehova n’anya si nyere ya aka idebe iwu ya. (2 Kọr. 7:1; Fil. 4:13) Mgbe onye ahụ a na-amụrụ Baịbụl nụchara ihe nwanna ahụ kọọrọ ya gbasara onwe ya, obi siri ya ike mgbe nwanna ahụ gwara ya, sị: “Gịnwa ga-akwụsịlikwa ịṅụ sịga.” Otu nwa agbọghọ a na-amụrụ Baịbụl chọpụtara na obi na-atọ otu nwanna nwaanyị na-eto eto ụtọ n’ihi na ọ bụ Onyeàmà Jehova. Ihe a mere ka ọ chọọ ịmatakwu ihe mere nwanna nwaanyị a ji enwe obi ụtọ.

12. Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ nwere ihe ọ ga-eme iji nyere onye a na-amụrụ Baịbụl aka?

12 Onye a na-amụrụ Baịbụl mata ụmụnna dị iche iche kwesịrị ntụkwasị obi n’ọgbakọ, ọ ga-esi n’akụkọ ha mụta ihe mmadụ irube isi n’iwu Kraịst pụtara, nke bụ́ ka anyị hụ Chineke na ndị agbata obi anyị n’anya. (Jọn 13:35; 1 Tim. 4:12) Ihe ọzọkwa bụ na, dị ka anyị kwurula, onye a na-amụrụ Baịbụl nwere ike isi n’aka ụmụnna ndị nwere ụdị nsogbu yanwa na-enwe mụta idi nsogbu ahụ. Onye ahụ a na-amụrụ Baịbụl ga-esikwa n’aka ha mụta na ọ ga-emeli mgbanwe ndị ọ dị mkpa ka o mee iji nwee ike ịghọ onye na-eso ụzọ Kraịst. (Diut. 30:11) Onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ nwere ike inye aka n’ụzọ dị iche iche, mee ka onye a na-amụrụ Baịbụl na-eme nke ọma n’ọgbakọ. (Mat. 5:16) Olee mbọ ndị gịnwa na-agba iji gbaa onye a na-amụrụ Baịbụl na-abịa ọmụmụ ihe ume?

NYERE NDỊ KWỤSỊRỊLA ỊGA OZI ỌMA AKA KA HA MALITEGHACHI ỊGA OZI ỌMA

13-14. Olee otú Jizọs si mesoo ndịozi ya mgbe ha dara mbà n’ihi ụjọ?

13 Anyị chọrọ inyere ụmụnna anyị ndị kwụsịrịla ịga ozi ọma aka ka ha maliteghachi ime ihe Kraịst gwara anyị mee, ya bụ, ime ndị na-eso ụzọ. Otú Jizọs si mesoo ndịozi ya dara mbà gosiri ihe anyị nwere ike ime taa.

14 Mgbe ọ fọrọ ntakịrị ka e gbuo Jizọs, ndịozi ya niile ‘hapụrụ ya gbaa ọsọ.’ (Mak 14:50; Jọn 16:32) Olee otú Jizọs si mesoo ha n’oge ahụ ha dara mbà n’ihi ụjọ? Obere oge a kpọlitechara ya n’ọnwụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu atụla egwu! Gaanụ kọọrọ ụmụnna m, [na a kpọlitela m n’ọnwụ].” (Mat. 28:10a) Jizọs ahapụghị ndịozi ya. N’agbanyeghị na hanwa hapụrụ ya, ọ ka nọkwa na-akpọ ha “ụmụnna m.” Jizọs mere ka Jehova. O meere ha ebere ma gbaghara ha.—2 Eze 13:23.

15. Olee otú ọ na-adị anyị ma anyị cheta ụmụnna ndị kwụsịrịla ịga ozi ọma?

15 Otú ahụ ka ọ dịkwa anyịnwa. Ihe banyere ndị kwụsịrịla ịga ozi ọma na-emetụ anyị n’obi. Ha ka bụkwa ụmụnna anyị, anyị hụkwara ha n’anya. Anyị ka na-echeta ọrụ ha rụsiri ike maka Jehova n’oge ndị gara aga. Ụfọdụ n’ime ha rụsiri ọrụ ike ruo ọtụtụ afọ. (Hib. 6:10) Ọ na-agụsi anyị agụụ ike ka ha lọghachi. (Luk 15:4-7) Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie Jizọs ma gosi na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi?

16. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na ihe banyere ụmụnna anyị kwụsịrịla ịga ozi ọma na-emetụ anyị n’obi?

16 Meda obi kpọọ ha ka ha bịa ọmụmụ ihe. Otu ụzọ Jizọs si gbaa ndịozi ya dara mbà n’obi ume bụ ịkpọ ha ka ha zukọta. (Mat. 28:10b; 1 Kọr. 15:6) Taakwa, anyị nwere ike ịgba ndị kwụsịrịla ịga ozi ọma ume ka ha bịa ọmụmụ ihe ma ọ bụrụ na ha ebidobeghị ime otú ahụ. O nwere ike iwetụ oge tupu ha amaliteghachi ịbịa ọmụmụ ihe. O doro anya na obi tọrọ Jizọs ụtọ mgbe ndịozi ya zara ya òkù ọ kpọrọ ha ka ha zukọta.—Tụlee Matiu 28:16 na Luk 15:6.

17. Olee ihe anyị kwesịrị ime ma ndị kwụsịrịla ịga ozi ọma bịa ọmụmụ ihe?

17 Jiri obi gị niile nabata ha. Jizọs mere ka obi ruo ndị na-eso ụzọ ya ala mgbe ha bịakwutere ya. Ọ bụ yanwa bu ụzọ gwa ha okwu. (Mat. 28:18) Gịnị ka anyị ga-eme ma ndị kwụsịrịla ịga ozi ọma bịa ọmụmụ ihe? Anyị kwesịrị ịga jiri obi anyị niile nabata ha. O nwere ike isiri anyị ike ná mmalite ịma ihe anyị ga-ekwu. Ma, anyị nwere ike ịgwa ha na obi dị anyị ụtọ ịhụ ha, gwakwa ha ya otú ọ na-agaghị emenye ha ihere.

18. Olee otú anyị nwere ike isi mee ka obi sie ndị nkwusa kwụsịrịla ịga ozi ọma ike?

18 Mesie ha obi ike. Ọ ga-abụ na ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ na-eche na ha agaghị ekwusali ozi ọma Jizọs sịrị ha kwusaa n’ụwa niile. Ma, Jizọs mesiri ha obi ike. Ọ sịrị ha: “M nọnyeere unu ụbọchị niile.” (Mat. 28:20) Ihe a Jizọs kwuru ò mesiri ha obi ike? Ee. Obere oge, ha malitere “na-akụzi ihe” ma “na-ezisa ozi ọma.” (Ọrụ 5:42) E kwesịkwara ime ka obi sie ndị nkwusa kwụsịrịla ịga ozi ọma ike. Ịmaliteghachi ịga ozi ọma nwere ike ịna-atụ ha ụjọ. Anyị nwere ike ime ka obi sie ha ike na ọ bụghị naanị ha ga-ekwusa ozi ọma. Ọ bụrụ na ha ekpebie ibido ịga ozi ọma, anyị nwere ike iso ha gaa. O doro anya na obi ga-adị ha ụtọ ma anyị kwadoo ha. Anyị were ha ka ụmụnna anyị, o nwere ike ime ka ha maliteghachi ịga ozi ọma, obi atọọ onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ ụtọ.

ANYỊ CHỌRỌ ỊRỤCHA ỌRỤ JIZỌS NYERE ANYỊ

19. Olee ihe anyị chọrọ ime, n’ihi gịnịkwa?

19 Olee mgbe anyị ga-akwụsị ime ndị na-eso ụzọ? Anyị ga-emegide ya ruo ọgwụgwụ usoro ihe a. (Mat. 28:20) Ànyị ga-emeli ya? Anyị kpebisiri ike na anyị ga-eme ya. Anyị na-eji obi ụtọ eji oge anyị, ike anyị, na ihe ndị anyị nwere achọta ndị “nwere ezi obi maka inweta ndụ ebighị ebi.” (Ọrụ 13:48) Anyị mee ihe a, anyị na-eṅomi Jizọs. Jizọs sịrị: “Ihe oriri m bụ ka m mee uche onye zitere m, ka m rụchaa ọrụ ya.” (Jọn 4:34; 17:4) Ọ bụkwa ihe a ka anyịnwa chọrọ ime. Anyị chọrọ ịrụcha ọrụ e nyere anyị. (Jọn 20:21) Anyị chọkwara ka ndị kwụsịrịla ịga ozi ọma na ndị ọzọ soro anyị rụruo ya n’isi.—Mat. 24:13.

20. Dị ka e kwuru ná Ndị Filipaị 4:13, olee ihe mere obi ji sie anyị ike na anyị ga-arụli ọrụ ahụ Jizọs nyere anyị?

20 Ọ bụ eziokwu na ịrụ ọrụ a Jizọs nyere anyị adịghị mfe, ma, anyị anaghị arụ ya naanị anyị. Jizọs kwere anyị nkwa na ọ ga-anọnyere anyị. Anyị na-arụ ọrụ a n’ihi na anyị bụ “ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ” na ndị ha na Kraịst na-emekọrịta ihe. (1 Kọr. 3:9; 2 Kọr. 2:17) N’ihi ya, anyị ga-arụli ọrụ a. Obi dị anyị ụtọ maka ọrụ a pụrụ iche e nyere anyị. Anyị jikwa obi ụtọ na-enyere ndị ọzọ aka ka ha soro rụọ ya.—Gụọ Ndị Filipaị 4:13.

ABỤ NKE 79 Na-ezi Ha Ihe Ka Okwukwe Ha Sie Ike

^ par. 5 Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha mee ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya, nakwa ka ha kụziere ha idebe ihe niile o nyere n’iwu. N’isiokwu a, anyị ga-atụle otú anyị ga-esi eme ihe a Jizọs kwuru. Ihe ụfọdụ e kwuru n’isiokwu a si n’Ụlọ Nche July 1, 2004, peeji nke 14 ruo na nke 19.

^ par. 66 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna nwaanyị na-akọwara onye ọ na-amụrụ Baịbụl ihe ndị ọ ga-eme ka ọ hụkwuo Chineke n’anya. Mgbe e mechara, onye ahụ ọ na-amụrụ ihe mere ihe atọ ọ mụtara n’aka onye na-amụrụ ya ihe.