Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 49

Olileanya Mbilite n’Ọnwụ Bụ Ihe E Ji n’Aka

Olileanya Mbilite n’Ọnwụ Bụ Ihe E Ji n’Aka

‘Enwere m olileanya n’ebe Chineke nọ, na a gaje inwe mbilite n’ọnwụ.’—ỌRỤ 24:15.

ABỤ NKE 151 Ọ Ga-akpọ Òkù

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. Olee olileanya magburu onwe ya ndị na-efe Chineke nwere?

INWE olileanya dị ezigbo mkpa. Olileanya ụfọdụ ndị bụ na alụmdi na nwunye ha ga-aga nke ọma, na ha ga-amụta ụmụ ahụ́ gbasiri ike ma ọ bụkwanụ na ha ga-agbake n’ajọ ọrịa ha na-arịa. Anyịnwa bụ́ Ndị Kraịst nwekwara ike ịna-enwe ụdị olileanya ndị ahụ. Ma olileanya anyị kachanụ karịrị ihe ndị a niile. Ihe ndị so na ya bụ ndụ ebighị ebi na ịhụ mgbe a ga-akpọlite ndi anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ.

2 Pọl onyeozi kwuru, sị: “Enwekwara m olileanya n’ebe Chineke nọ . . . na a gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.” (Ọrụ 24:15) Ọ bụghị Pọl bụ onye mbụ kwuru na ya nwere olileanya mbilite n’ọnwụ. Job budị ya ụzọ kwuo ya. Obi siri ya ike na Chineke ga-echeta ya ma kpọlite ya ka ọ dịrị ndụ ọzọ.—Job 14:7-10, 12-15.

3. Gịnị mere 1 Ndị Kọrịnt isi 15 ga-eji baara anyị uru?

3 “Mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ” so na “ntọala” ma ọ bụ “ozizi ndị mbụ” n’ime ozizi Ndị Kraịst niile. (Hib. 6:1, 2) Pọl kwuru gbasara mbilite n’ọnwụ ná 1 Ndị Kọrịnt isi 15. Ọ ga-abụrịrị na ihe ndị o kwuru gbara Ndị Kraịst oge mbụ ume. Ọ ga-agbakwa anyịnwa ume ma mee ka olileanya anyị nwere kemgbe na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ sikwuo ike.

4. Olee ihe mere anyị ji nwee olileanya na ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ga-ebili?

4 Okwukwe anyị nwere na Jizọs si n’ọnwụ bilie bụ ihe mere anyị ji nwee okwukwe na a ga-akpọlite ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ. O so ‘n’ozi ọma’ Pọl zisaara ndị Kọrịnt. (1 Kọr. 15:1, 2) Pọl kwudịrị na ọ bụrụ na Onye Kraịst enweghị okwukwe ná mbilite n’ọnwụ, na okwukwe ya enweghị isi. (1 Kọr. 15:17) Okwukwe anyị nwere na Jizọs si n’ọnwụ bilie bụ ihe mere anyị ji nwee okwukwe na a ga-akpọlite ndị ọzọ nwụrụ anwụ.

5-6. Gịnị ka ihe e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 15:3, 4 na-akụziri anyị?

5 Mgbe Pọl bidoro ikwu gbasara mbilite n’ọnwụ, o kwuru ihe atọ bụ́ eziokwu. Ha bụ (1) “Kraịst nwụrụ maka mmehie anyị.” (2) “E liri ya.” (3) “A kpọlitere ya n’ụbọchị nke atọ dị ka Akwụkwọ Nsọ kwuru.”—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:3, 4.

6 Gịnị ka ọnwụ Jizọs, olili ya, na mbilite n’ọnwụ ya na-akụziri anyị? Aịzaya onye amụma kwuru na “a ga-ebipụ Mesaya ahụ n’ala ndị dị ndụ,” nakwa na “ili ya ga-adị n’etiti ndị ajọ omume.” Ma e nwekwara ihe ọzọ ga-emenụ. Aịzaya kwukwara na Mesaya ahụ ga-eburu “mmehie nke ọtụtụ ndị.” Jizọs mezuru ihe a mgbe o ji ndụ ya chụọ àjà. (Aịza. 53:8, 9, 12; Mat. 20:28; Rom 5:8) N’ihi ya, ọnwụ Jizọs, olili ya, na mbilite n’ọnwụ ya mere ka anyị nwee olileanya na anyị ga-enwere onwe anyị n’aka mmehie na ọnwụ, nakwa na anyị ga-ahụ ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ọzọ.

AKAEBE ỌTỤTỤ NDỊ GBARA

7-8. Olee ihe nyeere Ndị Kraịst aka ikweta na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ?

7 E nwere ihe jikọrọ mbilite n’ọnwụ Jizọs na olileanya mbilite n’ọnwụ anyị nwere. N’ihi ya, anyị kwesịrị ijide n’aka na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ. Gịnị mere obi ji sie anyị ike na Jehova kpọlitere Jizọs n’ọnwụ?

8 E nwere ọtụtụ ndị ji anya ha hụ na a kpọlitela Jizọs n’ọnwụ. (1 Kọr. 15:5-7) Onye mbụ n’ime ha Pọl kpọrọ aha bụ Pita onyeozi, ya bụ, Sifas. E nwekwara ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị ọzọ gbara akaebe na Pita hụrụ na a kpọlitela Jizọs n’ọnwụ. (Luk 24:33, 34) “Mmadụ iri na abụọ ahụ,” ya bụ, ndịozi Jizọs hụkwara Jizọs mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ. Jizọs Kraịst ‘pụtakwara n’ihu ihe karịrị narị ụmụnna ise n’otu mgbe.’ Ọ ga-abụ na mgbe Jizọs pụtara n’ihu ha bụ ná nnọkọ ahụ mere ha obi ụtọ ha nwere na Galili e kwuru okwu ya na Matiu 28:16-20. Jizọs ‘pụtakwara n’ihu Jems.’ Jems a nwere ike ịbụ onye nne ji ya na ya, bụ́ onye na-ekwebughị na Jizọs bụ Mesaya. (Jọn 7:5) Mgbe Jems hụrụ Jizọs mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ, o kwetaziri na Jizọs bụ Mesaya ahụ. Ọ dị mma ịmara na n’ihe dị ka n’afọ 55 mgbe Pọl dere akwụkwọ ozi a, ọtụtụ ndị ji anya ha hụ na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ ka nọ ndụ. N’ihi ya, onye ọ bụla ọ na-eme obi abụọ nwere ike ịga jụọ ha.

9. Dị ka e kwuru n’Ọrụ Ndịozi 9:3-5, olee otú ihe mere Pọl si gosi na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ?

9 Mgbe e mechara, Jizọs pụtara n’ihu Pọl n’onwe ya. (1 Kọr. 15:8) Pọl, ya bụ Sọl, nọ n’ụzọ na-aga Damaskọs mgbe ọ nụrụ olu Jizọs, hụkwa ya n’ọhụụ ka ọ nọ n’eluigwe. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 9:3-5.) Ihe a bụ ihe ọzọ gosiri na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ n’eziokwu.—Ọrụ 26:12-15.

10. Gịnị ka Pọl mere mgbe o doro ya anya na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ?

10 E nwere ụfọdụ ndị ga-enwe ezigbo mmasị n’ihe a Pọl kọrọ n’ihi na e nwere mgbe Pọl nọbụ na-akpagbu Ndị Kraịst. Ozugbo Pọl matara na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ n’eziokwu, ọ gbalịsiri ike ime ka ndị ọzọ kweta. Ka ọ na-aga n’ebe dị iche iche na-akọrọ ndị mmadụ na Jizọs nwụrụ, a kpọlitekwa ya n’ọnwụ, e tiri ya ihe, tụọ ya mkpọrọ, o nwekwara mgbe ụgbọ mmiri ọ nọ na ya kpuru. (1 Kọr. 15:9-11; 2 Kọr. 11:23-27) Pọl kwetasiri ike na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ nke na ọ dịdị njikere ịnwụ iji gbachitere ihe ahụ o kweere. Akaebe a Ndị Kraịst oge mbụ gbara na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, ọ́ naghị eme ka i kweta na a kpọlitere ya n’ọnwụ? Ọ́ naghịkwa eme ka i kwetasie ike na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ n’ọdịnihu?

IME KA A MATA NKE BỤ́ EZIOKWU

11. Gịnị ka ọ ga-abụ ya mere ụfọdụ ndị nọ na Kọrịnt ji kwere ihe na-abụghị eziokwu banyere mbilite n’ọnwụ?

11 Ụfọdụ ndị bi n’obodo Kọrịnt dị na Gris kweere ihe ndị na-abụghị eziokwu gbasara mbilite n’ọnwụ. Ha kwudịrị na “mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ” adịghị. N’ihi gịnị? (1 Kọr. 15:12) Ọ bụ n’ihi na ndị ọkà mmụta nọ n’Atens chịrị ọchị mgbe ha nụrụ na a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ. Ọ ga-abụ na ihe a mere ka ụfọdụ ndị nọ na Kọrịnt chewekwa na a kpọliteghị Jizọs n’ọnwụ. (Ọrụ 17:18, 31, 32) Ọ ga-abụkwa na ndị ọzọ chere na mbilite n’ọnwụ a abụghị mbilite n’ọnwụ nkịtị. Kama na ọ pụtara mmadụ “ịnwụ” ná mmehie ọ na-emebu ma “dịrị ndụ” bụrụzie Onye Kraịst. N’agbanyeghị ihe mere na ha ekweghị ná mbilite n’ọnwụ, ihe a mere ka okwukwe ha ghara ịba uru. Ọ bụrụ na Chineke akpọliteghị Jizọs n’ọnwụ, ọ pụtara na a kwụghị ihe mgbapụta ahụ. Ọ pụtakwara na anyị niile ka nọ ná mmehie. N’ihi ya, ndị na-ekweghị ná mbilite n’ọnwụ enweghị ezigbo olileanya.—1 Kọr. 15:13-19; Hib. 9:12, 14.

12. Dị ka e kwuru na 1 Pita 3:18, 22, olee otú mbilite n’ọnwụ Jizọs si dị iche ná ndị nke bu ya ụzọ?

12 Pọl ma na “e siwo ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite Kraịst.” Mbilite n’ọnwụ nke Jizọs pụrụ iche. Ọ dị iche na nke ndị a kpọlitere n’ọnwụ tupu Jizọs, n’ihi na ndị ahụ mechakwara nwụọ ọzọ. Pọl sịrị na Jizọs bụ “mkpụrụ mbụ nke ndị dara n’ụra ọnwụ.” Olee otú Jizọs si bụrụ mkpụrụ mbụ? Ọ bụ ya bụ onye mbụ a kpọlitere n’ọnwụ ya abụrụ mmụọ, ọ bụkwa ya bụ onye mbụ si n’ụwa gaa eluigwe.—1 Kọr. 15:20; Ọrụ 26:23; gụọ 1 Pita 3:18, 22.

“NDỊ A GA-EME KA HA DỊ NDỤ”

13. Olee ihe Pọl kwuru dị iche n’etiti Adam na Jizọs?

13 Olee otú ọnwụ otu onye ga-esi mee ka ọtụtụ nde mmadụ dịrị ndụ? Pọl zara ajụjụ ahụ nke ọma. Ọ kọwara ihe dị iche ná nsogbu Adam kpataara ụmụ mmadụ na uru ọnwụ Jizọs baara anyị. Pọl dere gbasara Adam, sị: “Ọnwụ si n’aka otu onye.” Mgbe Adam mere mmehie, ọ kpataara onwe ya na ụmụ ya nsogbu. Anyị ka na-ata ahụhụ mmehie ahụ Adam mere. Ma, ihe ga-adịrị anyị mma n’ọdịnihu n’ihi na Chineke kpọlitere Ọkpara ya n’ọnwu. “Mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ sikwa n’aka otu onye,” ya bụ, Jizọs. Pọl kwuru, sị: “N’ihi na dị nnọọ ka mmadụ niile na-anwụ n’ime Adam, otú ahụkwa ka a ga-eme ka mmadụ niile dị ndụ n’ime Kraịst.”—1 Kọr. 15:21, 22.

14. À ga-akpọlite Adam n’ọnwụ? Kọwaa.

14 Olee ihe Pọl bu n’uche mgbe o kwuru, sị: “Mmadụ niile na-anwụ n’ime Adam”? O bu n’uche ụmụ Adam niile ketara mmehie, ezughị okè, na ọnwụ n’aka Adam. (Rom 5:12) Adam esoghị ná ndị a ‘ga-eme ka ha dị ndụ.’ Àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ agaghị abara Adam uru n’ihi na Adam zuru okè ma kpachara anya nupụrụ Chineke isi. Ihe mere Adam ga-emecha mee ndị “Nwa nke mmadụ” ga-ewere ka “ewu” mgbe ọ ga-ekpe ikpe, ya bụ, ha ga-anwụ “ọnwụ ebighị ebi.”—Mat. 25:31-33, 46; Hib. 5:9.

Jizọs bụ onye nke mbụ n’ime ọtụtụ ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ha agaa eluigwe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15 na nke 16) *

15. Olee ndị so ná “mmadụ niile” ahụ a ‘ga-eme ka ha dị ndụ’?

15 Cheta na Pọl kwuru na “a ga-eme ka mmadụ niile dị ndụ n’ime Kraịst.” (1 Kọr. 15:22) Ndị Pọl degaara akwụkwọ ozi a bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ na Kọrịnt a ga-akpọlite n’ọnwụ ha agaa eluigwe. Ndị Kraịst ndị ahụ bụ ndị “e doro nsọ n’ime Kraịst Jizọs, ndị a kpọrọ ịbụ ndị nsọ.” Pọl kwukwara gbasara “ndị dara n’ụra ọnwụ n’ime Kraịst.” (1 Kọr. 1:2; 15:18; 2 Kọr. 5:17) N’akwụkwọ ozi ọzọ Pọl si n’ike mmụọ nsọ dee, o kwuru na ndị e ‘mere ka ha na Jizọs dị n’otu n’ọdịdị nke ọnwụ ya’ ka ‘a ga-emekwa ka ha na ya dị n’otu n’ọdịdị nke mbilite n’ọnwụ ya.’ (Rom 6:3-5) A kpọlitere Jizọs ya abụrụ mmụọ ma laa eluigwe. Otú ahụ ka a ga-emekwa ndị niile nọ “n’ime Kraịst,” ya bụ, Ndị Kraịst e tere mmanụ.

16. Olee ihe Pọl bu n’obi mgbe ọ kpọrọ Jizọs “mkpụrụ mbụ”?

16 Pọl kwuru na a kpọlitere Kraịst n’ọnwụ ya abụrụ “mkpụrụ mbụ nke ndị dara n’ụra ọnwụ.” Cheta na a kpọlitere ndị ọzọ n’ọnwụ, dị ka Lazarọs, ha ebiri n’ụwa. Ma, Jizọs bụ onye mbụ a kpọlitere n’ọnwụ ya abụrụ mmụọ ma dịrị ndụ ebighị ebi. E nwere ike iji ya tụnyere mkpụrụ mbụ ndị Izrel na-ewe n’ubi ha ha na-eji achụrụ Chineke àjà. Ihe ọzọ bụ na mgbe Pọl kpọrọ Jizọs “mkpụrụ mbụ,” ihe ọ na-ekwu bụ na e nwere ndị ọzọ a ga-akpọlite n’ọnwụ ha agaa eluigwe ka Jizọs. A ga-emecha kpọlite ndịozi Jizọs na ndị ọzọ “ha na Kraịst dị n’otu” ha ebiri n’eluigwe ka Jizọs.

17. Olee mgbe a ga-akpọlite ndị “ha na Kraịst dị n’otu” ịga eluigwe?

17 A malitebeghị ịkpọlite “ndi ha na Kraịst dị n’otu” ịga eluigwe mgbe ahụ Pọl degaara ndị Kọrịnt akwụkwọ ozi. Kama, Pọl kwuru na a ga-akpọlite ha n’ọnwụ n’ọdịnihu. O kwuru, sị: “Onye ọ bụla n’ọnọdụ nke ya: Kraịst mkpụrụ mbụ, e mesịakwa, ndị nke Kraịst n’oge ọnụnọ ya.” (1 Kọr. 15:23; 1 Tesa. 4:15, 16) Taa, anyị na-ebi “n’oge ọnụnụ” Kraịst ahụ e buru n’amụma. N’ihi ya, ndịozi Jizọs na Ndị Kraịst ndị ọzọ e tere mmanụ nwụrụ anwụ cheere ruo oge ọnụnọ Kraịst ka a kpọlite ha n’ọnwụ ịga eluigwe, nakwa ka ha na “[Jizọs] dị n’otu n’ọdịdị nke mbilite n’ọnwụ ya.”

OLILEANYA GỊ BỤ IHE E JI N’AKA

18. (a) Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ ọzọ? (b) Dị ka e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 15:24-26, olee ihe ndị ga-eme n’eluigwe?

18 Olee ihe ga-eme Ndị Kraịst niile na-enweghị olileanya iso Kraịst biri n’eluigwe? Ha niile nwekwara olileanya na a ga-akpọlite ha n’ọnwụ. Baịbụl kwuru na Pọl na ndị ọzọ ga-aga eluigwe so ná ndị nwere òkè ná “mbilite n’ọnwụ bu ụzọ site ná ndị nwụrụ anwụ.” (Fil. 3:11) Ihe a Baịbụl kwuru ọ́ naghị egosi na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ ọzọ? Nke a dabara n’ihe Job kwuru ga-eme ya n’ọdịnihu. (Job 14:15) “Ndị nke Kraịst n’oge ọnụnọ ya” ga-eso ya biri n’eluigwe mgbe ọ ga-eme ka ọchịchị niile, na ikike na ike niile ghara ịdị irè. Ọ ga-emedị ka “onye iro ikpeazụ” bụ́ ọnwụ ghara ịdịkwa. N’eziokwu, ndị a kpọlitere n’ọnwụ ha agaa eluigwe agaghịzi anwụ anwụ. Gịnịkwanụ banyere ndị ọzọ?—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:24-26.

19. Olee ihe ndị nwere olileanya ibi n’ụwa nwere ike ịtụ anya ya?

19 Olee ihe ndị nwere olileanya ibi n’ụwa ga-atụ anya ya? Ihe Pọl kwuru ga-eme ka ha nwee olileanya. Ọ sịrị: “Enwekwara m olileanya na . . . a gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.” (Ọrụ 24:15) O doro anya na e nweghị onye ajọ omume ga-aga eluigwe, n’ihi ya, ihe a Pọl kwuru gosiri na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ n’ụwa n’ọdịnihu.

Anyị kwere na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ, ọ ga-eme ka obi sie anyị ike na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 20) *

20. Olee otú e sirila mee ka olileanya i nwere ná mbilite n’ọnwụ sikwuo ike?

20 O doro anya na “a ga-eje inwe mbilite n’ọnwụ.” Ndị a kpọlitere n’ọnwụ ibi n’ụwa ga-enwe olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Ka obi sie gị ike na nkwa a ga-emezu. Nkwa a nwere ike ịkasi gị obi ma i cheta ndị ị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ. E nwere ike ịkpọlite ha n’ọnwụ mgbe Kraịst na ndị ọzọ ‘ga-achị dị ka ndị eze ruo otu puku afọ.’ (Mkpu. 20:6) Obi nwekwara ike isi gịnwa ike na ọ bụrụ na ọ daba na ị nwụọ tupu oge ọchịchị puku afọ Kraịst, a ga-akpọlite gị n’ọnwụ. ‘Olileanya a adịghị eduga ná mmechuihu.’ (Rom 5:5) O nwere ike ime ka okwukwe gị sikwuo ike ugbu a, meekwa ka i jirikwuo ọṅụ na-ejere Chineke ozi. O nwere ihe ndị anyị ga-amụta ná 1 Ndị Kọrịnt isi 15. Anyị ga-amụta ha n’isiokwu na-esonụ.

ABỤ NKE 147 Jehova Kwere Anyị Nkwa Ndụ Ebighị Ebi

^ par. 5 Ndị Kọrịnt nke mbụ isi 15 kwuru ọtụtụ ihe banyere mbilite n’ọnwụ. Gịnị mere ozizi mbilite n’ọnwụ ji dị anyị mkpa? Oleekwa ihe mere obi ga-eji sie anyị ike na Jizọs si n’ọnwụ bilie? Isiokwu a ga-aza ajụjụ ndị a na ajụjụ ndị ọzọ dị mkpa gbasara mbilite n’ọnwụ.

^ par. 56 NKỌWA FOTO: Jizọs bụ onye mbụ a kpọlitere n’ọnwụ ya alaa eluigwe. (Ọrụ 1:9) Ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya ga-eso ya laa eluigwe bụ Tọmọs, Jems, Lidia, Jọn, Meri, na Pọl.

^ par. 58 NKỌWA FOTO: Nwunye nwanna nwoke a nwụnahụrụ ya. Ha abụọ ejeerela Jehova ozi kemgbe ọtụtụ afọ. Ma, obi siri ya ike na a ga-akpọlite nwunye ya n’ọnwụ. Ọ nọgidekwara na-ejere Jehova ozi.