Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 50

“Olee Otú A Ga-esi Kpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ?”

“Olee Otú A Ga-esi Kpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ?”

“Ọnwụ, olee mmeri gị? Ọnwụ, olee ebe ihe i ji agba mmadụ dị?”—1 KỌR. 15:55.

ABỤ NKE 141 Ndụ Bụ Ọrụ Ebube

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. Gịnị mere Ndị Kraịst niile ji kwesị inwe mmasị ná ndi a ga-akpọlite n’ọnwụ ha agaa eluigwe?

ỌTỤTỤ ndị na-efe Jehova ugbu a nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Ma, ndị fọdụrụ n’ime Ndị Kraịst e tere mmanụ nwere olileanya na a ga-akpọlite ha n’ọnwụ ha agaa eluigwe. Ọ na-agụsi ndị a niile e tere mmanụ agụụ ike ịma otú ndụ ha ga-adị n’eluigwe. Ma, oleekwanụ banyere ndị nwere olileanya ibi n’ụwa? Dị ka anyị ga-ahụ, mkpọlite a ga-akpọlite ndị nwere olileanya ịga eluigwe ga-ewetara ndị niile nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọtụtụ ngọzi. N’ihi ya, ma olileanya anyị ọ̀ bụ ịga eluigwe ma ọ bụ ibi n’ụwa, anyị kwesịrị inwe mmasị n’ihe banyere ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ha agaa eluigwe.

2 Chineke nyere ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Jizọs n’oge ochie mmụọ nsọ, ha edee gbasara olileanya ịga eluigwe. Jọn onyeozi kwuru, sị: “Ugbu a, anyị bụ ụmụ Chineke, ma e mebeghị ka ihe anyị ga-abụ pụta ìhè. Anyị maara na mgbe ọ bụla e mere ka onye ahụ pụta ìhè, anyị ga-adị ka ya.” (1 Jọn 3:2) N’ihi ya, Ndị Kraịst e tere mmanụ amaghị otú ha ga-adị mgbe a ga-akpọlite ha n’ọnwụ ha abụrụ mmụọ n’eluigwe. Ma, ha ga-ahụ Jehova ihu na ihu mgbe ahụ. Baịbụl agwaghị anyị ihe niile banyere ndị a a ga-akpọlite n’ọnwụ ha agaa eluigwe, ma Pọl onyeozi kwuru ihe ụfọdụ banyere ha. Ndị a e tere mmanụ na Jizọs ga-anọ mgbe Jizọs ga-eme ka “ọchịchị niile na ikike na ike niile ghara ịdị irè.” Ọ ga-emekwa ka ‘onye iro ikpeazu, bụ́ ọnwụ, ghara ịdị irè.’ N’ikpeazụ, Jizọs na ndị a ya na ha ga-eso achị ga-edo onwe ha na ihe niile ọzọ n’okpuru Jehova. (1 Kọr. 15:24-28) Oge ahụ ga-amagbu onwe ya. *

3. Dị ka e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 15:30-32, gịnị ka olileanya Pọl nwere na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ mere ka o mee?

3 Okwukwe Pọl nwere ná mbilite n’ọnwụ nyeere ya aka idi ọnwụnwa ndị bịaara ya. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:30-32.) Ọ gwara ndị Kọrịnt, sị: “Kwa ụbọchị, ana m eche ọnwụ ihu.” O kwukwara, sị: “Mụ na anụ ọhịa lụrụ ọgụ n’Efesọs.” O nwere ike ịbụ na ọ na-ekwu banyere ọgụ ya na anụ ọhịa nkịtị lụrụ n’ámá egwuregwu dị n’Efesọs. (2 Kọr. 1:8; 4:10; 11:23) O nwekwara ike ịbụ na ọ na-ekwu banyere mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ ndị Juu na ndị ọzọ yiri “anụ ọhịa” kpagburu ya. (Ọrụ 19:26-34; 1 Kọr. 16:9) Nke ọ bụla ọ bụ, o doro anya na nsogbu kpụ ọkụ n’ọnụ bịaara Pọl. Ma, ọ ka nọkwa na-enwe olileanya na ihe ga-adịrị ya mma n’ọdịnihu.—2 Kọr. 4:16-18.

Ebe otu ezinụlọ ka na-efe Chineke n’agbanyeghị na ha bi n’obodo ebe ndị ọchịchị na-enye anyị nsogbu. Obi siri ha ike na Chineke nwere ihe ọma ndị ọ ga-emere ha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4)

4. Olee otú olileanya mbilite n’ọnwụ sirila mee ka okwukwe Ndị Kraịst sie ike taa? (Lee ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

4 Anyị bi n’oge dị oké egwu. Ụmụnna anyị ụfọdụ adabala n’aka ndị omekome. E nwekwara ndị nke bi n’obodo ndị a na-alụ agha, mgbe ọ bụla ha chị obi n’aka. Ndị ọzọ bi n’obodo ebe ndị ọchịchị na-enye anyị nsogbu ma ọ bụdị ebe a machiri ọrụ anyị iwu kpamkpam. Ma, ha ka na-efe Jehova n’agbanyeghị na e nwere ike igbu ha ma ọ bụ tụọ ha mkpọrọ. Ụmụnna ndị a bụụrụ anyị ezigbo ihe nlereanya. Obi siri ha ike na ọ bụrụgodị na ha anwụọ ugbu a, Jehova ga-akpọlite ha n’ọnwụ n’ọdịnihu.

5. Olee echiche na-ezighị ezi nwere ike ime ka anyị kwụsị inwe olileanya ná mbilite n’ọnwụ?

5 Pọl dọrọ ụmụnna ya aka ná ntị gbasara echiche na-ezighị ezi ụfọdụ ndị nwere. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na a gaghị akpọlite ndị nwụrụ anwụ, ‘ka anyị rie ma ṅụọ n’ihi na echi ka anyị ga-anwụ.’” E nwedịrị ndị nwere ụdị echiche a tupu oge Pọl. O nwere ike ịbụ na Pọl na-ekwu ihe dị n’Aịzaya 22:13, bụ́ ebe kwuru gbasara àgwà ụmụ Izrel na-akpa. Kama ime ka ha na Chineke dịrị ná mma, ihe bụ́ mkpa ha bụ ikpori ndụ. Echiche ha nwere bụ na ha kwesịrị ikpori ndụ ugbu a n’ihi na ọnwụ nwere ike ịbịa mgbe ọ bụla. Ọ bụkwa ụdị echiche a ka ọtụtụ ndị nwere taa. Ma, Baịbụl kwuru na echiche a kpataara ụmụ Izrel ọtụtụ nsogbu.—2 Ihe 36:15-20.

6. Ebe ọ bụ na anyị kweere ná mbilite n’ọnwụ, olee ụdị ndị anyị kwesịrị ịna-emeta enyi?

6 Ebe anyị ma na Jehova ga-akpolite ndị nwụrụ anwụ, o kwesịrị ime ka anyị mara ụdị ndị anyị na ha ga-abụ enyi. Ụmụnna nọ na Kọrịnt ekwedịghị iso ndị na-ekweghị ná mbilite n’ọnwụ na-akpa. Ihe a na-akụziri anyị na anyị ekwesịghị imeta ndị nwere echiche ka anyị rie taa nwụọ echi enyi. Iso ụdị ndị ahụ na-akpa nwere ike ime ka Onye Kraịst nwewe echiche na-ezighị ezi ma ọ bụ kwụsị ịkpa ezi àgwà. O nwedịrị ike ime ka onye ahụ bido mewe mmehie. N’ihi ya, Pọl dọsiri anyị aka ná ntị ike, sị: “Meenụ ka uche unu zuo okè n’ụzọ ezi omume, unu anọkwala na-eme mmehie.”—1 Kọr. 15:33, 34.

OLEE ỤDỊ AHỤ́ HA GA-EBU PỤTA?

7. Dị ka e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 15:35-38, gịnị ka ụfọdụ ndị nwere ike ịdị na-ajụ gbasara mbilite n’ọnwụ?

7 Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:35-38. Onye chọrọ ime ka ndị ọzọ na-enyo olileanya mbilite n’ọnwụ enyo, nwere ike ịjụ, sị: “Olee otú a ga-esi kpọlite ndị nwụrụ anwụ?” Ọ dị mma ka anyị chebara ihe Pọl zara n’ajụjụ a echiche n’ihi na ọtụtụ ndị taa kweere ihe dị iche iche banyere ihe na-eme mmadụ ma ọ nwụọ. Ma gịnị ka Baịbụl na-akụzi?

Pọl ji mkpụrụ a kụrụ n’ala mee ihe atụ otú Chineke ga-esi nye ndị ọ kpọlitere n’ọnwụ ahụ́ kwesịrị ekwesị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8)

8. Olee ihe atụ ga-enyere anyị aka ịghọta otú a ga-esi kpọlite ndị e tere mmanụ ha agaa eluigwe?

8 Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ahụ́ ya na-ere. Ma Onye ahụ nke kere eluigwe na ụwa nwere ike ịkpọlite onye ahụ n’ọnwụ ma nye ya ụdị ahụ́ kwesịrị ekwesị ọ ga-eji adị ndụ. (Jen. 1:1; 2:7) Pọl mere ihe atụ iji gosi na Chineke agaghị enye onye ahụ ahụ́ o nwere tupu ya anwụọ. Chegodị banyere “mkpụrụ nkịtị” ma ọ bụ “mkpụrụ” a na-akụ akụ. A kụọ mkpụrụ n’ala, ọ na-epu ghọọ osisi ọhụrụ. Osisi ọhụrụ a dị iche n’obere mkpụrụ ahụ a kụrụ. Pọl mere ihe atụ a iji gosi na Onye kere anyị nwere ike inye onye ahụ nwụrụ anwụ ‘ahụ́ dị nnọọ ka o si dị ya mma.’

9. Gịnị ka 1 Ndị Kọrịnt 15:39-41 kwuru gbasara ụdị ahụ́ dị iche iche e nwere?

9 Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:39-41. Pọl kwuru na Chineke kere ụdị ahụ́ dị iche iche. Dị ka ihe atụ, e nwere ahụ́ ehi, ahú nnụnụ, na ahụ́ azụ̀. O kwuru na e nwere ihe dị iche n’anyanwụ na ọnwa. O kwukwara na “ebube otu kpakpando dị iche n’ebube kpakpando ọzọ.” Ihe a o kwuru bụ eziokwu n’agbanyeghị na anyị anaghị ahụ ọdịiche a anya. Ndị ọkà mmụta sayensị gwara anyị na e nwere ụdị kpakpando dị iche iche. E nwere ndị nke buru ibu, nwee ndị nke dị ntakịrị. E nwekwara ndị nke na-acha ọbara ọbara, nwee ndị nke na-acha ọcha na ndị nke na-acha odo odo, dị ka anyanwụ. Pọl kwukwara na “e nwere ahụ́ nke eluigwe na ahụ́ nke ụwa.” Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara? Ihe ọ pụtara bụ na n’ụwa anyị a, e nwere anụ́ ahụ́ dị iche iche. Ma n’eluigwe, e nwere ahụ́ nke mmụọ, dị ka nke ndị mmụọ ozi.

10. Olee ụdị ahụ́ ndị a ga-akpọlite ka ha gaa eluigwe ga-enwe?

10 Lee ihe ọzọ Pọl kwuru. Ọ sịrị: “Otú ahụkwa ka mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ dị. A na-akụ ya n’ire ure, a na-akpọlite ya n’ereghị ure.” N’eziokwu, mmadụ nwụọ, ahụ́ onye ahụ na-ere laghachịkwa n’ájá. (Jen. 3:19) N’ihi ya, oleezi otú a ga-esi ‘akpọlite ahụ́ mmadụ n’ereghị ure’? Ihe Pọl na-ekwu abụghị gbasara onye a kpọlitere n’ọnwụ ka ọ dịrị ndụ n’ụwa, dị ka ndị ahụ Ịlaịja, Ịlaịsha na Jizọs kpọlitere n’ọnwụ. Pọl na-ekwu gbasara onye a kpọlitere ka o nwee ahụ́ ọ ga-eji ebi n’eluigwe, ya bụ, “ahụ́ nke mmụọ.”—1 Kọr. 15:42-44.

11-12. Olee ụdị ahụ́ Jizọs nwere mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ? Oleekwa ụdị ahụ́ ndị e tere mmanụ ga-enwe mgbe a ga-akpọlite ha n’ọnwụ?

11  Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o nwere ahụ́ nke mmadụ. Ma mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ, ọ“ ghọrọ mmụọ na-enye ndụ” ma laghachi eluigwe. Otú ahụ ka ọ dịkwa Ndị Kraịst e tere mmanụ. A ga-akpọlite ha ha enwee ahụ́ nke mmụọ. Pọl kọwara, sị: “Dịkwa nnọọ ka anyị yiiri onyinyo nke onye ahụ e ji ájá mee, anyị ga-eyirikwa onyinyo nke onye eluigwe ahụ.”—1 Kọr. 15:45-49.

12 Pọl onyeozi ekwuchawala ihe ọ na-ekwu gbasara mbilite n’ọnwụ. Ọ dị mma ịmara na a kpọliteghị Jizọs n’ọnwụ ya enwee ahụ́ nke mmadụ. Pọl kọwara ya nke ọma mgbe ọ sịrị: “Anụ ahụ́ na ọbara apụghị iketa alaeze Chineke” n’eluigwe. (1 Kọr. 15:50) A gaghị akpọlite ndịozi Jizọs na ndị ọzọ e ji mmụọ nsọ tee mmanụ ka ha jiri anụ ahụ́ ha pụrụ ire ure na ọbara gaa eluigwe. Olee mgbe a ga-akpọlite ha n’ọnwụ? Pọl kwuru na oge a ga-akpọlite ha n’ọnwụ ka dị n’ihu. A gaghị akpọlite ha n’ọnwụ ozugbo ha nwụrụ. Mgbe Pọl na-ede 1 Ndị Kọrịnt, ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Jizọs “adawo n’ụra ọnwụ.” Otu n’ime ha bụ Jems onyeozi. (Ọrụ 12:1, 2) Ndịozi ndị ọzọ na ndị ọzọ e tere mmanụ ga-emechakwa daa “n’ụra ọnwụ.”—1 Kọr. 15:6.

IMERI ỌNWỤ

13. Gịnị ka a ga-eji ama oge ọnụnọ Jizọs?

13 Jizọs na Pọl kwuru gbasara oge pụrụ iche, ya bụ, oge ọnụnọ Kraịst. Ihe a ga-eji mara oge ahu bụ agha, ala ọma jijiji, ọrịa na-efe efe, na ihe ọjọọ ndị ọzọ ga na-eme n’ụwa niile. Anyị ji anya anyị na-ahụ ka amụma Baịbụl a na-emezu kemgbe afọ 1914. E nwekwara ihe ọzọ a ga-eji ama oge ọnụnọ Kraịst. Jizọs kwuru na a ga-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke “n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Mat. 24:3, 7-14) Pọl kwuru na ọ bụ “n’oge ọnụnọ Onyenwe anyị” ka a ga-akpọlite Ndị Kraịst e tere mmanụ “dara n’ụra ọnwụ.”—1 Tesa. 4:14-16; 1 Kọr. 15:23.

14. Gịnị na-eme ndị e tere mmanụ na-anwụ n’oge ọnụnọ Kraịst?

14 N’oge anyị a, onye ọ bụla e tere mmanụ nwụhaala, a na-akpọlite ya n’ọnwụ ozugbo ya agawa eluigwe. Ihe Pọl kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 15:51, 52 gosiri na ihe a bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Anyị niile agaghị ada n’ụra ọnwụ, kama a ga-agbanwe anyị niile, n’ime ntakịrị oge, n’otu ntabi anya, n’oge a ga-afụ opi ikpeazụ.” Ihe a Pọl kwuru na-emezu ugbu a. Ozugbo a kpọlitere ụmụnna Kraịst ndị a n’ọnwụ, ha ga-enwe ọṅụ zuru ezu, ha na “Onyenwe anyị ga-anọ mgbe niile.”—1 Tesa. 4:17.

Ndị ahụ a kpọlitere n’ọnwụ “n’otu ntabi anya” ga-eso Jizọs bibie ndị ajọ omume niile nọ n’ụwa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)

15. Olee ọrụ ndị ahụ a ga-agbanwe “n’otu ntabi anya” ga-arụ?

15 Baịbụl gwara anyị ọrụ ndị ahụ a ga-agbanwe “n’otu ntabi anya” ga-arụ n’eluigwe. Jizọs gwara ha, sị: “Onye meriri emeri, debekwa ihe m nyere n’iwu ruo ọgwụgwụ, m ga-enye ya ikike ịchị mba niile, ọ ga-ejikwa mkpanaka ígwè zụọ ndị mmadụ dị ka atụrụ, ka e wee kụrisịa ha dị ka arịa e ji ụrọ kpụọ, dị ka m natara ikike n’aka Nna m.” (Mkpu. 2:26, 27) Ha ga-esoro Onyeisi ha jiri mkpanaka ígwè zụọ mba niile dị ka atụrụ.—Mkpu. 19:11-15.

16. Olee otú ọtụtụ mmadụ ga-esi emeri ọnwụ?

16 O doro anya na ndị e tere mmanụ ga-emeri ọnwụ. (1 Kọr. 15:54-57) A kpọlite ha n’ọnwụ, ha ga-eso mee ka ajọ omume kwụsị n’ụwa niile n’agha Amagedọn na-abịanụ. Ọtụtụ nde Ndị Kraịst ndị ọzọ ga-esi “n’oké mkpagbu ahụ pụta” ma banye n’ụwa ọhụrụ. (Mkpu. 7:14) Ndị ahụ ga-ebi n’ụwa ga-eji anya ha hụ ụzọ ọzọ a ga-esi emeri ọnwụ, ya bụ, mkpọlite a ga-akpọlite ọtụtụ ijeri mmadụ nwụrụ n’oge ndị gara aga. Chegodị ụdị ọṅụ ụmụ mmadụ ga-enwe mgbe ihe a ga-eme. (Ọrụ 24:15) Ndị niile ji obi ha niile na-erubere Jehova isi ga-emeri ọnwụ ahụ anyị ketara n’aka Adam. Ha ga-adị ndụ ebighị ebi.

17. N’ihi ihe e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 15:58, gịnị ka anyị kwesịrị ime ugbu a?

17 Onye Kraịst ọ bụla dị ndụ ugbu a kwesịrị ịna-enwe obi ụtọ maka ihe Pọl kwuru banyere mbilite n’ọnwụ n’akwụkwọ Ndị Kọrịnt. Anyị nwere ezigbo ihe mere anyị ga-eji mee ihe Pọl kwuru, ya bụ, ka anyị mee ike anyị niile “n’ọrụ Onyenwe anyị.” (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:58.) Anyị jiri obi anyị niile na-arụsi ọrụ a ike, anyị ga-enwe ezigbo obi ụtọ n’ọdịnihu. Oge ahụ ga-amagbu onwe ya karịa ihe ọ bụla anyi nwere ike ichetụ n’echiche. Ọ ga-egosi na ndọgbu anyị dọgburu onwe anyị n’ọrụ n’ime Onyenwe anyị abụghị n’efu.

ABỤ NKE 140 Lee Ndụ Ebighị Ebi

^ par. 5 Ihe ndị ọzọ e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt isi 15 bụ gbasara mbilite n’ọnwụ nke Ndị Kraịst e tere mmanụ. Ma, ihe Pọl kwuru na ya ga-abara ndị so n’atụrụ ọzọ uru. Isiokwu a ga-akụziri anyị otú olileanya mbilite n’ọnwụ ga-esi baara anyị uru ugbu a ma mee ka anyị na-atụ anya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu.

^ par. 2Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” nke gbara n’Ụlọ Nche a kọwara ihe Pọl kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 15:29.