Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 51

Jehova Na-azọpụta Ndị Dara Mbà n’Obi

Jehova Na-azọpụta Ndị Dara Mbà n’Obi

“Jehova nọ ndị obi ha tiwara etiwa nso; ọ na-azọpụtakwa ndị e gburu mmụọ ha.”—ỌMA 34:18.

ABỤ NKE 30 Nna M, Chineke M na Enyi M

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

EBE ọ bụ na ndụ anyị dị mkpụmkpụ, “jupụtakwa ná nsogbu,” o nwere ike ime ka anyị na-eche echiche mgbe ụfọdụ. (Job 14:1) Ihe a nwere ike ime ka anyị daa mbà n’obi mgbe ụfọdụ. Ọtụtụ ndị ohu Jehova n’oge ochie nwere mgbe ha dara mbà. E nwedịrị mgbe ụfọdụ n’ime ha chọrọ ịnwụ. (1 Eze 19:2-4; Job 3:1-3, 11; 7:15, 16) Ma n’oge ọ bụla ha dara mbà n’obi, Jehova, bụ́ Chineke ha tụkwasịrị obi, mesiri ha obi ike, meekwa ka ha dị ike. E dere akụkọ ha na Baịbụl ka ha kasie anyị obi ma kụziere anyị ihe.—Rom 15:4.

2 N’isiokwu a, anyị ga-ekwu gbasara ndị ohu Jehova ndị diri nsogbu dị iche iche, dị ka, Josef nwa Jekọb, Neomi bụ́ nwaanyị di ya nwụrụ, na nwunye nwa ya bụ́ Rut, onye Livaị dere Abụ Ọma 73, na Pita onyeozi. Olee otú Jehova si mee ka ha dị ike? Oleekwa ihe onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ ha? Azịza ajụjụ ndị a ga-eme ka obi sie anyị ike na “Jehova nọ ndị obi ha tiwara etiwa nso. Ọ na-azọpụtakwa ndị e gburu mmụọ ha.”—Ọma 34:18.

JOSEF DIRI MMEGBU

3-4. Olee ihe mere Josef mgbe ọ bụ okorobịa?

3 Josef dị ihe dị ka afọ iri na asaa mgbe ọ rọrọ nrọ abụọ Chineke mere ka ọ rọọ. Nrọ ndị ahụ gosiri na otu ụbọchị, Josef ga-abụ onye ukwu n’ezinụlọ ha. (Jen. 37:5-10) Ma, ozugbo ọ rọchara nrọ ndị ahụ, ndụ ya gbanwere. Ụmụnne ya eweereghị ya ka onye ga-abụ onye ukwu, kama, ha rere ya ya abụrụzie ohu Pọtịfa n’Ijipt. (Jen. 37:21-28) N’otu ntabi anya, Josef si n’ịbụ nwa nna ya hụrụ n’anya gaa n’ịbụ ohu nwoke na-amaghị Chineke n’Ijipt.—Jen. 39:1.

4 Ọnọdụ Josef bịara ka njọ. Nwunye Pọtịfa boro ya ebubo na ọ chọrọ idina ya n’ike. N’ebughị ụzọ mata nke bụ́ eziokwu, Pọtịfa tụbara Josef n’ụlọ mkpọrọ, ebe e ji agbụ ígwè kee ya. (Jen. 39:14-20; Ọma 105:17, 18) Chegodị otú obi dị nwa okorobịa a bụ́ Josef n’ihi na e boro ya ebubo ụgha na ọ chọrọ idina mmadụ n’ike. Ọ ga-abụkwa na ihe ahụ mere ka ndị mmadụ kwutọọ Jehova bụ́ Chineke Josef. N’eziokwu, e nwere ezigbo ihe mere Josef ga-eji daa mbà n’obi.

5. Olee otú Josef si merie ịda mbà n’obi?

5 O nweghị ihe Josef ga-emeli maka ọnọdụ ya n’oge ahụ ọ na-agba ohu, nakwa n’oge ahụ ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ. Gịnị nyeere ya aka ịna-enwe obi ụtọ? Kama itinye uche ya n’ihe ndị ọ na-agaghịzi emeli, o ji ike ya niile na-arụ ọrụ e nyere ya. Nke kachanụ bụ na Josef weere Jehova ka onye kacha ya mkpa ná ndụ. N’ihi ya, Jehova gọziri ihe niile Josef na-eme.—Jen. 39:21-23.

6. Olee otú nrọ ndị ahụ Josef rọrọ si kasie ya obi?

6 O nwere ike ịbụ na Josef chetara nrọ ndị ahụ ọ rọrọ n’oge gara aga, ha agbaa ya ume. Ha mere ka ọ mata na ọ ga-ahụ ndị ezinụlọ ya ọzọ, nakwa na ihe ga-emecha dịrị ya mma. Ihe ndị a mechakwara mee. Mgbe Josef dị afọ iri atọ na asaa, nrọ ndị ahụ ọ rọrọ malitere imezu n’ụzọ dị ịtụnanya.—Jen. 37:7, 9, 10; 42:6, 9.

7. Dị ka e kwuru na 1 Pita 5:10, gịnị ga-enyere anyị aka idi ọnwụnwa?

7 Ihe ọ na-akụziri anyị. Akụkọ Josef na-akụziri anyị na ụwa a dị njọ, nakwa na ndị mmadụ nwere ike imegbu anyị. Nwanna anyị nwedịrị ike imejọ anyị. Ma, anyị were Jehova ka Oké Nkume anyị, ma ọ bụ ebe Mgbaba anyị, anyị agaghị ada mbà ma ọ bụ kwụsị ife ya. (Ọma 62:6, 7; gụọ 1 Pita 5:10.) Chetakwa na Josef dị ihe dị ka afọ iri na asaa mgbe Jehova mere ka ọ rọọ nrọ ndị ahụ pụrụ iche. Ihe a gosiri na Jehova tụkwasịdịrị ndị ohu ya na-eto eto obi. Taa, e nwere ọtụtụ ndị na-eto eto na-eme ka Josef. Ha nwekwara okwukwe na Jehova. A tụọla ụfọdụ n’ime ha mkpọrọ n’ihi na ha ekweghị akwụsị ife Chineke.—Ọma 110:3.

ỤMỤ NWAANYỊ ABỤỌ NNUKWU NSOGBU BỊAARA

8. Gịnị mere Neomi na Rut?

8 N’ihi oké ụnwụ dara na Juda, Neomi na ndị ezinụlọ ya kwagara n’obodo Moab. N’ebe ahụ, di Neomi bụ́ Elimelek nwụrụ hapụrụ ya ụmụ nwoke abụọ. Ka oge na-aga, ụmụ ha nwoke abụọ ahụ lụrụ ụmụ nwaanyị Moab aha ha bụ Rut na Ọpa. Mgbe ihe dị ka afọ iri gachara, ụmụ Neomi abụọ a nwụrụ n’amụtaghị ụmụ. (Rut 1:1-5) Chegodị otú ihe a nwere ike isi gbawaa ụmụ nwaanyị atọ a obi. Nke bụ́ eziokwu bụ na Rut na Ọpa nwere ike ịlụgharị di. Ma, ònye ga-elekọtakwanụ Neomi? Ihe ndị a gbawara Neomi obi nke ukwuu nke na o kwuru, sị: “Unu akpọla m Neomi. Kpọwanụ m Mera, n’ihi na Onye Pụrụ Ime Ihe Niile emewo m ihe obi ilu dị ukwuu.” Mgbe ihe ndị a niile mechara, Neomi kpebiri ịlaghachi Betlehem, Rut sokwa ya laghachi.—Rut 1:7, 18-20.

Chineke gosiri Neomi na Rut na ya ga-emeli ka ndị ohu ya kwụsị ịda mbà n’obi ma nwewe obi ụtọ. Ì kwetara na ọ ga-emeliri gị otú ahụ? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8 ruo na nke 13) *

9. Dị ka e kwuru na Rut 1:16, 17, 22, olee otú Rut si gbaa Neomi ume?

9 Ihe nyeere Neomi aka idi nsogbu bịaara ya bụ ezigbo ịhụnanya Rut gosiri ya. Rut so Neomi biri. Ihe a gosiri na ọ hụrụ ya n’anya. (Gụọ Rut 1:16, 17, 22.) Na Betlehem, Rut rụsiri ọrụ ike ịtụtụkọta ọka bali maka ya na Neomi. N’ihi ya, mmadụ niile maara ya ka ezigbo nwaanyị.—Rut 3:11; 4:15.

10. Olee ụzọ ndị Jehova si gosi na ọ hụrụ ndị ogbenye dị ka Neomi na Rut n’anya?

10 Jehova nyere ụmụ Izrel iwu gosiri na ọ na-enwere ndị ogbenye dị ka Neomi na Rut ọmịiko. Ọ gwara ha na ọ bụrụ na ha na-ewe ihe ubi, ha ewerechala ihe ndị dị n’ọnụ ọnụ ubi ha, ka ndị ogbenye nwee ike iwere ha. (Lev. 19:9, 10) N’ihi ya, Neomi na Rut agaghị na-arịọ nri tupu ha enweta ihe ha ga-eri.

11-12. Olee otú Boaz si mee ka obi tọọ Neomi na Rut ụtọ?

11 Onye nwe ubi ahụ Rut na-atụtụkọta mkpụrụ na ya bụ otu ọgaranya aha ya bụ Boaz. Otú Rut si soro nne di ya biri na otú o si hụ ya n’anya metụrụ Boaz n’obi, ya azụrụ ihe niile ezinụlọ ha nwere, kpọrọkwa Rut ka ọ bụrụ nwunye ya. (Rut 4:9-13) Rut na Boaz mụtara Obed. Obed mechara bụrụ nna nna Eze Devid.—Rut 4:17.

12 Chegodị ụdị obi ụtọ Neomi nwere mgbe o ku Obed n’aka si n’ala ala obi ya kelee Jehova. Ma, e nwere ihe ọzọ ga-akacha eme Neomi na Rut obi ụtọ n’ọdịnihu. Mgbe a ga-akpọlite ha n’ọnwụ, ha ga-amata na Obed bụ nna nna Jizọs Kraịst bụ́ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa.

13. Olee ihe ndị dị mkpa anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ Neomi na Rut?

13 Ihe ọ na-akụziri anyị. Nsogbu bịara anyị, anyị nwere ike ịda mbà n’obi, ma ọ bụdị obi agbawaa anyị. Anyị nwere ike ịna-eche na nsogbu anyị agaghị akwụsị akwụsị. Ọ́ dị anyị otú ahụ, anyị kwesịrị ịtụkwasị Nna anyị nke eluigwe obi anyị niile ma soro ụmụnna anyị na-akpachi anya. Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova nwere ike ọ gaghị ewepụrụ anyị nsogbu ahụ. A sị ka e kwuwe, ọ kpọliteghịrị Neomi di ya na ụmụ ya abụọ. Ma, o nwere ike isi n’ịhụnanya ụmụnna anyị ga-egosi anyị nyere anyị aka idi nsogbu bịaara anyị.—Ilu 17:17.

ONYE LIVAỊ Ọ FỌRỌ OBERE KA Ọ KWỤSỊ IFE JEHOVA

Ọ fọrọ obere ka onye dere Abụ Ọma nke 73 kwụsị ife Jehova mgbe o chere na ihe na-agara ndị ọjọọ nke ọma. Ụdị ihe ahụ nwekwara ike ime anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14 ruo na nke 16)

14. Gịnị mere otu onye Livaị ji daa mbà n’obi nke ukwuu?

14 Ọ bụ onye Livaị dere Abụ Ọma nke 73. O nwere ihe ùgwù pụrụ iche ijere Jehova ozi n’ụlọ nsọ ya. Ma, o nwere mgbe ọ dara mbà n’obi. N’ihi gịnị? O bidoro imere ndị na-etu ọnụ na ndị ọjọọ anyaụfụ. Anyaụfụ ọ na-emere ha abụghị n’ihi ihe ọjọọ ha na-eme. Kama, ọ bụ n’ihi na o chere na ihe na-agaziri ha. (Ọma 73:2-9, 11-14) Ọ dị nnọọ ka ihe niile ò zuuru ha. Ha bara ọgaranya, na-ekpori ndụ. Ha anaghịkwa echegbu onwe ha. Otú a o si dị ka ihe ọ̀ na-agaziri ha mere ka ọbụ abụ a daa mbà n’obi nke na ọ sịrị: “N’ezie, ọ bụ n’efu ka m meworo ka obi m dị ọcha, kwọọkwa aka m iji gosi na aka m dị ọcha.” O doro anya na ihe a nwere ike ime ka ọ kwụsị ife Jehova.

15. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 73:16-19, 22-25, gịnị nyeere onye Livaị dere abụ ọma a aka ịkwụsị ịda mbà n’obi?

15 Gụọ Abụ Ọma 73:16-19, 22-25. Onye Livaị ahụ banyere “ná nnukwu ebe nsọ Chineke.” Ọ ga-abụ na ya na ndị ọzọ na-efe Chineke nọ n’ebe ahụ, ya enwee ike iwetu obi chebara ọnọdụ ya echiche ma kpee ekpere banyere ya. Ọ bịaziri chọpụta na ya na-eche echiche ka onye na-amaghị ihe, nakwa na ihe a nwere ike ime ka ya na Jehova kwụsị ịdị ná mma. Ọ bịakwara ghọta na ndị ọjọọ ahụ nọ “n’ala na-amị amị” nakwa na a ga-emecha ‘laa ha n’iyi.’ Ihe ga-enyere onye Livaị a aka ịkwụsị inwere ndị ọjọọ anyaụfụ na ịda mbà n’obi bụ ile ihe anya otú Jehova si ele ya. Mgbe o mere otú ahụ, ọ kwụsịrị ichegbu onwe ya, obi ana-atọkwa ya ụtọ. O kwuru, sị: “Ọ dịghị ihe ọzọ na-enye m obi ụtọ n’ụwa ma e wezụga [Jehova].”

16. Olee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’aka otu onye Livaị?

16 Ihe ọ na-akụziri anyị. Ya adịla mgbe anyị ga-emewere ndị ajọ omume ọ dị ka ihe ọ̀ na-agaziri anyaụfụ. Obi ụtọ ha abụghị nke ezigbo ya. Ọ gaghịkwa adịte aka n’ihi na ha agaghị adị ndụ ebighị ebi. (Ekli. 8:12, 13) Anyị mewere ha anyaụfụ, anyị ga-ada mbà n’obi, lawakwa azụ n’ofufe Chineke. N’ihi ya, mgbe ọ bụla ọ dịwara gị otú ahụ ọ dị onye Livaị ahụ, mee ihe ahụ o mere. Mee ihe Chineke na-agwa gị. Gị na ndị na-efe Chineke na-akpakwa. Ọ bụrụ na ị hụrụ Jehova n’anya karịa ihe ọ bụla ọzọ, ị ga na-enwe ezigbo obi ụtọ. Ị ga-anọgidekwa n’ụzọ nke na-eduba ná “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.”—1 Tim. 6:19.

IHE NDỊ PITA MEJỌRỌ MERE KA Ọ DAA MBÀ N’OBI

Anyị chee banyere otú Pita si kwụsị ịda mbà n’obi ma lekwasị anya n’ozi Chineke, ọ ga-enyere anyị aka. Anyị nwekwara ike iji ya nyere ndị ọzọ aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17 ruo na nke 19)

17. Olee ihe ndị mere ka Pita daa mbà n’obi?

17 Pita onyeozi bụ nwoke na-anụ ọkụ n’obi. Ma, ọ na-emefe ihe okè mgbe ụfọdụ. N’ihi ya, o nwere oge ndị o kwuru ma ọ bụ mee ihe ndị o mechara kwaara mmakwaara. Dị ka ihe atụ, mgbe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na ya ga-ata ahụhụ ma nwụọ, Pita baara ya mba, sị ya: “Ihe a agaghị eme gị ma ọlị.” (Mat. 16:21-23) Ma, Jizọs gbaziri Pita. Mgbe ígwè mmadụ bịara ijide Jizọs, Pita gbupụrụ ntị ohu nnukwu onye nchụàjà n’echeghị echiche. (Jọn 18:10, 11) Jizọs gbazikwara Pita ọzọ. N’oge ọzọ, Pita turu ọnụ sị na ọ bụrụ na ndịozi ndị ọzọ ahapụ Jizọs, na yanwa agaghị ahapụ ya. (Mat. 26:33) Ma, mgbe ụjọ jidere ya, ọ gọnahụrụ Jizọs ugboro atọ. Ihe a o mere wutere ya. “O wee pụọ n’èzí, kwaa ákwá nke ukwuu.” (Mat. 26:69-75) Ọ ga-abụ na ọ nọ na-eche ma Jizọs ọ̀ ga-agbagharakwa ya.

18. Olee otú Jizọs si nyere Pita aka imeri ịda mbà n’obi?

18 Ma, Pita ekweghị ka obi nọgide na-ada ya mbà. Mgbe obere oge gachara, o nwetara onwe ya ma sorokwa ndịozi ndị ọzọ. (Jọn 21:1-3; Ọrụ 1:15, 16) Gịnị nyeere ya aka ịkwụsị ịda mbà n’obi? Otu ihe bụ na e nweela mgbe Jizọs kpere ekpere ka okwukwe Pita ghara ịda mbà. Ọ gbakwara Pita ume ka ọ laghachi ma mee ka ụmụnna ya ndị ọzọ dị ike. Jehova zara ekpere Jizọs. Mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, ọ pụtara n’ihu Pita. Ọ ga-abụ na ọ bịara ịgba ya ume. (Luk 22:32; 24:33, 34; 1 Kọr. 15:5) Jizọs pụtakwara n’ihu ndịozi ya niile mgbe ha gara igbu azụ̀ nọọ abalị dum ma ọ dịghị nke ha gbutara. N’oge ahụ, Jizọs nyere Pita ohere igosi ya otú ọ hụruru ya n’anya. Jizọs agbagharala ezigbo enyi ya ma nyekwuokwa ya ọrụ.—Jọn 21:15-17.

19. Gịnị ka Abụ Ọma 103:13, 14 na-akụziri anyị banyere otú Jehova si ele anyị anya ma anyị mee mmehie?

19 Ihe ọ na-akụziri anyị. Otú Jizọs si mesoo Pita ihe gosiri na ọ dị obi ebere ka Nna ya. N’ihi ya, anyị mejọọ ihe, anyị ekwesịghị iche na Jehova agaghị agbaghara anyị. Anyị kwesịrị icheta na ọ bụ Setan na-achọ ka anyị chewe otú ahụ. Kama iche otú ahụ, ka anyị cheta na Jehova dị njikere ịgbaghara anyị. Anyị kwesịkwara ịdị njikere ịgbaghara ndị mejọrọ anyị.—Gụọ Abụ Ọma 103:13, 14.

20. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

20 Akụkọ Josef, Neomi na Rut, onye Livaị, na Pita na-eme ka obi sie anyị ike na “Jehova nọ ndị obi ha tiwara etiwa nso.” (Ọma 34:18) O nwere ike ịgba nkịtị ka ọnwụnwa bịara anyị ma ọ bụ ka anyị daa mbà n’obi mgbe ụfọdụ. Ma, mgbe ọ bụla Jehova nyeere anyị aka anyị edie ọnwụnwa, okwukwe anyị na-esikwu ike. (1 Pita 1:6, 7) N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-achọpụtakwu otú Jehova si akwado ndị ohu ya dara mbà n’obi n’ihi ihe ndị ha na-emejọ ma ọ bụ n’ihi nsogbu.

ABỤ NKE 7 Jehova Bụ Ike Anyị

^ par. 5 Josef, Neomi na Rut, onye Livaị, na Pita onyeozi nwechara ihe ndị mere ka ha daa mbà n’obi. N’isiokwu a, anyị ga-ahụ otú Jehova si kasie ha obi ma mee ka ha dị ike. Anyị ga-atụlekwa ihe anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ ha, nakwa otú Chineke si jiri obiọma mesoo ha ihe.

^ par. 56 NKỌWA FOTO: Ọnwụ di Neomi, di Rut, na di Ọpa mere ka ha daa mbà n’obi. Mgbe e mechara, Rut na Neomi so Boaz ṅụrịa ọṅụ mgbe a mụrụ Obed.