Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ilu 24:16 kwuru, sị: “Onye ezi omume nwere ike ịda ọbụna ugboro asaa, ma ọ ga-ebilicha.” Ebe a ọ̀ na-ekwu banyere onye na-eme mmehie ugboro ugboro ma Chineke ana-agbaghara ya?

Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị ihe a ka amaokwu Baịbụl a na-ekwu. Kama, ọ na-ekwu banyere onye na-ada, ya bụ, onye ọtụtụ nsogbu na-abịara ma ọ na-ebili, ya bụ, ọ na-emeri nsogbu ndị ahụ.

Ka anyị lebagodị anya n’amaokwu ndị ọzọ gbara amaokwu ahụ gburugburu. Amaokwu ndị ahụ kwuru, sị: “Echebirila inweta ebe obibi onye ezi omume, dị ka onye ajọ omume na-eme; ebukọrọkwala ihe dị n’ebe izu ike ya. N’ihi na onye ezi omume nwere ike ịda ọbụna ugboro asaa, ma ọ ga-ebilicha; ma ọdachi ga-eme ka ndị ajọ omume sụọ ngọngọ. Mgbe onye iro gị dara, aṅụrịla ọṅụ; mgbe e mere ka ọ sụọ ngọngọ, ka obi gị ghara inwe aṅụrị.”—Ilu 24:15-17.

Ụfọdụ ndị chere na amaokwu nke 16 na-ekwu banyere onye mere mmehie ma mechaa chegharịa. Ndị ụkọchukwu abụọ si Ịngland kwuru na ọ bụ otú a ka “ndị na-ekwu okwuchukwu ma n’oge mbụ ma n’oge a si akọwa amaokwu a.” Ha kwukwara na ọ bụrụ otú ahụ, ihe ọ pụtara bụ na “ezigbo mmadụ nwere ike ịdaba ná . . . mmehie dị oké njọ ma ka na-ahụkwa Chineke n’anya, na-echegharịkwa mgbe ọ bụla ọ dabara ná mmehie.” Otú a e si kọwaa ya nwere ike ịmasị onye na-achọghị ịkwụsị ime mmehie. O nwere ike ịna-eche na Chineke ga na-agbaghara ya mgbe ọ bụla o mere mmehie.

Ma ihe a abụghị ihe amaokwu nke 16 ahụ na-ekwu.

E nwere ọtụtụ ụzọ e nwere ike isi sụgharịa okwu Hibru a kpọrọ “ịda” na “dara” n’amaokwu nke 16 na nke 17. O nwere ike ịpụta ịda ada nkịtị, dị ka ihe atụ, ehi ịda n’okporo ụzọ, mmadụ isi n’elu ụlọ daa ma ọ bụkwanụ nkume ịda n’ala. (Diut. 22:4, 8; Emọs 9:9) E nwekwara ike iji okwu ahụ kọwaa ihe na-abụghị ịda ada nkịtị. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụ Jehova na-eme ka nzọụkwụ nke dimkpa guzosie ike, ụzọ ya na-atọkwa Ya ụtọ. Ọ bụrụgodị na ọ daa, ọ gaghị akụ afọ n’ala, n’ihi na Jehova ji ya aka.”—Ọma 37:23, 24; Ilu 11:5; 13:17; 17:20.

Ma, legodị ihe Prọfesọ Edward H. Plumptre kwuru. Ọ sịrị: “O nwetụghị mgbe okwu Hibru a sụgharịrị [“ịda”] pụtara ime mmehie.” N’ihi ya, lee otú ọkà mmụta ọzọ si kwuo ihe ahụ dị n’amaokwu nke 16. Ọ sịrị: “Onye na-emegide ndị Chineke na-egbu oge ya n’ihi na ihe ga na-agara ha nke ọma, ma ihe agaghị agara ndị ajọ omume nke ọma.”

N’eziokwu, Ilu 24:16 anaghị ekwu banyere mmadụ ‘ịdaba’ ná mmehie, kama, ọ na-ekwu banyere nsogbu ịbịara mmadụ ọtụtụ ugboro. N’ụwa ọjọọ a anyị bi na ya, onye ezi omume nwere ike ịda ọrịa ma ọ bụkwanụ nsogbu ndị ọzọ abịara ya. Ndị ọchịchị nwedịrị ike ịkpagbu ya. Ma obi siri ya ike na Chineke ga na-enyere ya aka ma na-akwado ya. Jụgodị onwe gị, sị: ‘Ọ̀ bụ na ihe anaghị agaziri ndị na-efe Chineke?’ Gịnị mere ihe ji agaziri ha? Ọ bụ n’ihi na “Jehova na-akwado ndị niile na-ada ada, ọ na-ekulitekwa ndị niile huuru ehuru.”—Ọma 41:1-3; 145:14-19.

Obi anaghị atọ “onye ezi omume” ụtọ na nsogbu na-abịara ndị ọzọ. Kama, obi na-atọ ya ụtọ n’ihi na ọ ma na “ọ ga-adịrị ndị na-atụ egwu ezi Chineke mma, n’ihi na ha tụrụ egwu ya.”—Ekli. 8:11-13; Job 31:3-6; Ọma 27:5, 6.