Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 52

Otú Ị Ga-esi Emeri Ịda Mbà n’Obi

Otú Ị Ga-esi Emeri Ịda Mbà n’Obi

“Tụkwasị Jehova ibu arọ gị, ya onwe ya ga-akwadokwa gị.”—ỌMA 55:22.

ABỤ NKE 33 Tụkwasị Jehova Ibu Gị

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị ka ịda mbà n’obi nwere ike ime anyị?

KWA ụbọchị, nsogbu na-abịara anyị. Anyị na-agbalịkwa imeri ha. Ma, ị manụ na ọ ga-aka adịrị anyị mfe imeri ha ma ọ bụrụ na anyị adaghị mbà n’obi. N’ihi ya, anyị kwesịrị ile ịda mbà n’obi anya ka ihe nwere ike izuru obi ụtọ na obi ike anyị n’ohi. Ilu 24:10 sịrị: “Ì nwewo obi ịda mbà n’ụbọchị ahụhụ? Ike gị ga-adị ntakịrị.” N’eziokwu, ịda mbà n’obi nwere ike ime ka ike gwụ anyị ma nsogbu bịara anyị.

2. Olee ihe ndị nwere ike ime ka anyị daa mbà n’obi, oleekwa ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a?

2 Ọtụtụ ihe nwere ike ime ka anyị daa mbà. Ha nwere ike ịbụ ihe ndị anyị na-emejọ, ebe ndị anyị na-adịghị ike, ma ọ bụ ọrịa. O nwekwara ike ịbụ enwetaghị ihe ùgwù anyị na-atụ anya ya n’ọgbakọ, ma ọ bụkwanụ ikwusa ozi ọma n’ókèala ndị mmadụ na-anaghị egecha ntị. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe ụfọdụ anyị ga-eme iji merie ịda mbà n’obi.

MGBE ANYỊ NA IMEJỌ IHE NA ADỊGHỊ IKE NA-ALỤ

3. Gịnị ga-enyere anyị aka ile ihe ndị anyị na-emejọ anya otú kwesịrị ekwesị?

3 Ọ dị mfe obi ịjọwa anyị njọ n’ihi ihe ndị anyị na-emejọ. N’ihi ya, anyị nwere ike iche na Jehova agaghị ekwe ka anyị keta Alaeze ya n’ihi ihe ndị anyị na-emejọ. Ụdị echiche a jọgburu onwe ya. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ihe ndị anyị na-emejọ anya? Baịbụl sịrị na mmadụ niile “emehiewo” ma e wezụga Jizọs Kraịst. (Rom 3:23) Ma, Jehova anaghị elekwasịkarị anya n’ihe ndị anyị na-emejọ. Kama, ọ bụ Nna anyị hụrụ anyị n’anya, chọọkwa inyere anyị aka. Ọ na-enwekwara anyị ndidi. Ọ na-ahụ mbọ anyị niile na-agba ịkwụsị ihe na-adịghị mma anyị na-eme na ịna-ele onwe anyị anya otú kwesịrị ekwesị. Ọ dịkwa njikere inyere anyị aka.—Rom 7:18, 19.

Jehova ma ihe ọma ndị anyị mere n’oge gara aga, marakwa ndị nke anyị na-eme ugbu a (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5) *

4-5. Gịnị ka e kwuru na 1 Jọn 3:19, 20, nke nyeere ụmụnna nwaanyị abụọ a aka ịkwụsị ịda mbà n’obi?

4 Chegodị gbasara akụkọ Deborah na Maria. * Otú e si mesoo Deborah mgbe ọ ka bụ obere nwa mere ka o chee na ọ baghị uru. Ọ na-esi ike a jaa ya mma ma o mee ihe dị mma. Nke ahụ mere ka ọ na-ele onwe ya anya ka onye na-abaghị uru. O mejọọ ntakịrị ihe, ọ na-ewere onwe ya ka o nweghị ihe ọ dị mma ya. Ụdị ihe a mekwara Maria. Ndị ikwu ya mere ka ihere onwe ya na-eme ya. N’ihi ya, o chere na o nweghị uru ọ bụla ọ bara. Mgbe ọ natachara eziokwu, ọ nọkwa na-eche na ya erughị eru ịza aha Chineke.

5 Ma, ụmụnna nwaanyị abụọ a akwụsịghị ife Jehova. N’ihi gịnị? Otu ihe bụ na ha kọọrọ Jehova nsogbu ha niile n’ekpere. (Ọma 55:22) Ọ bịaziri doo ha anya na Nna anyị nke eluigwe ghọtara otú ihe ndị mere anyị n’oge gara aga nwere ike isi na-enye anyị nsogbu n’obi. Ma, ọ na-ahụkwa àgwà ọma ndị anyị nwere, ndị o nwere ike ịbụ na anyịnwa anaghị ahụ.—Gụọ 1 Jọn 3:19, 20.

6. Gịnị ka mmadụ ga-eme ma o meghachi ihe ọjọọ ọ na-agbalị ịkwụsị?

6 Onye na-agbalị ịkwụsị àgwà ọjọọ ririla ya ahụ́ nwekwara ike ịkpa àgwà ahụ ọzọ, ya emee ka ọ daa mbà n’obi. Nke bụ́ eziokwu bụ na obi na-ajọkarị anyị njọ ma anyị mee ihe ọjọọ. (2 Kọr. 7:10) Ma, anyị ekwesịghị ịkatọwa onwe anyị, na-eche, sị: ‘Ọ dịghị ihe m dị mma ya. Jehova emekataghị gbaghara m.’ Ụdị echiche a adịghị mma. O nwekwara ike ime ka anyị kwụsị ife Jehova. Cheta ihe anyị gụrụ n’Ilu 24:10. Anyị daa mbà n’obi, ike anyị ga-adị ntakịrị. Kama ime otú ahụ, ka anyị rịọ Jehova n’ekpere ka o meere anyị ebere ka anyị na ya “kpezie.” (Aịza. 1:18) Jehova hụ na i chegharịala n’eziokwu, ọ ga-agbaghara gị. Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ịgakwuru ndị okenye. Ha ga-enyere gị aka ka gị na Chineke dịghachi ná mma.—Jems 5:14, 15.

7. Gịnị mere obi ekwesịghị ịda anyị mbà ma ọ bụrụ na ọ na-esiri anyị ike ime ihe ziri ezi?

7 Otu okenye bi na Frans aha ya bụ Jean-Luc gwara ndị ọ na-esiri ike ịkwụsị àgwà ọjọọ ha na-akpa, sị: “Onye Jehova weere ka onye ezi omume abụghị onye na-anaghị emejọ ihe. Kama, ọ bụ onye ọ na-ewute ma o mejọọ ihe, nakwa onye na-echegharị.” (Rom 7:21-25) N’ihi ya, ọ bụrụ na o nwere àgwà ọjọọ gị na ya na-alụ, echela na nke ị na-eme agwụla. Cheta na anyị niile na-emejọ ihe. Anyị niile chọrọ ka Chineke meere anyị amara n’ihi àjà mgbapụta Jizọs.—Efe. 1:7; 1 Jọn 4:10.

8. Anyị daa mbà n’obi, olee ndị anyị nwere ike ịgakwuru ka ha nyere anyị aka?

8 Ụmụnna anyị ga-agba anyị ume. Ha nwere ike ige anyị ntị mgbe anyị na-agwa ha okwu ma gwa anyị okwu ga-agba anyị ume. (Ilu 12:25; 1 Tesa. 5:14) Otu nwanna nwaanyị onye Naịjirịa aha ya bụ Joy, onye ya na ịda mbà n’obi na-alụ, kwuru, sị: “Gịnị ka m gaara emeli ma e wezụga ụmụnna anyị? Aka ụmụnna anyị nyeere m gosiri na Jehova zara m ekpere. Esila m n’aka ha mụta otú m ga-esi gbaa ndị ọzọ dara mbà n’obi ume.” Anyị kwesịrị ịma na ọ bụghị mgbe niile ka ụmụnna anyị ga-achọpụta na anyị chọrọ agbamume. N’ihi ya, anyị nwere ike ịgakwuru nwanna ma nke a na-akọ n’ọgbakọ gwa ya na anyị chọrọ ka a gbaa anyị ume.

MGBE ANYỊ NA ỌRỊA NA-ALỤ

9. Olee otú Abụ Ọma 41:3 na 94:19 si agba anyị ume?

9 Gwa Jehova ka o nyere gị aka. Mgbe anyị na-arịa ọrịa, karịchaa, ọrịa na-ekweghị ala ala, o nwere ike isiri anyị ike iche echiche nke ọma. Ọ bụ eziokwu na Jehova anaghị esi n’ụzọ ọrụ ebube agwọ anyị ugbu a, ma ọ na-akasi anyị obi. O nwekwara ike inye anyị ike anyị ga-eji na-edi ya. (Gụọ Abụ Ọma 41:3; 94:19.) Dị ka ihe atụ, o nwere ike ime ka otu nwanna bịa nyere anyị aka ma anyị chọọ onye ga-arụrụ anyị ọrụ dị n’ụlọ ma ọ bụ ịzụtara anyị ihe n’ahịa. O nwekwara ike ime ka ụmụnna anyị soro anyị kpee ekpere. Ihe ọzọ bụ na o nwere ike ime ka anyị cheta ihe anyị mụrụ na Baịbụl ga-akasi anyị obi, dị ka, olileanya izu okè n’ụwa ọhụrụ mgbe ọrịa na-agaghịzi adị.—Rom 15:4.

10. Gịnị mere Isang anọgideghị na-ada mbà n’obi mgbe o nwechara ihe mberede?

10 Otu nwanna onye Naịjiria aha ya bụ Isang nwere ihe mberede nke mere ka ụkwụ ya abụọ kpọnwụọ. Dọkịta gwara ya na ọ gaghị aga ije ọzọ. Isang kwuru, sị: “Ihe a gbawara m obi ma mee ka m daa mbà.” Ma, ọ̀ nọgidere na-ada mbà n’obi? Mba. Gịnị nyeere ya aka? O kwuru, sị: “Mụ na nwunye m akwụsịghị ịmụ Baịbụl na ikpe ekpere. Anyị na-echeta ihe ọma ndị Chineke na-emere anyị, nakwa olileanya anyị nwere ibi n’ụwa ọhụrụ ya.”

Ndị ahụ́ na-adịghị ka nwere ike ịna-ekwusa ozi ọma ma na-enwekwa ọṅụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11 ruo na nke 13)

11. Olee otú Cindy si na-enwe obi ụtọ mgbe ọ nọ n’ọrịa?

11 A gwara Cindy, onye bi na Meksiko, na ọ na-arịa ọrịa nwere ike ịta isi ya. Gịnị nyeere ya aka idi ọrịa a? Mgbe a na-agwọ ya, o kpebisiri ike ịna-ezi ndị mmadụ ozi ọma. O kwuru, sị: “Nke a nyeere m aka ịna-eche gbasara ndị ọzọ kama ịna-eche gbasara ahụ́ a wara m na mgbu ọ na-egbu m. Ihe m na-eme bụ, mụ na ndị dọkịta ma ọ bụ ndị nọọsụ kwurịtawa okwu, m na-ajụ ha gbasara ndị ezinụlọ ha. M na-ajụ ha ihe mere ha ji arụ ọrụ a siri ike ọrụrụ. M jụchaa ha ihe ndị a, ọ na-adịrị m mfe ịhọrọ isiokwu ga-eru ha n’obi mụ na ha ga-eji kwurịta okwu. Ọtụtụ n’ime ha na-ekwu na o siri ike ịhụ onye ọrịa na-ajụ ha, sị: ‘Olee otú unu mere?’ Ọtụtụ n’ime ha kelere m maka ihe a m na-eme. Ụfọdụ nyekwara m akara ekwentị ha. N’oge a mụ na ọrịa na-alụ, Jehova mere ka m nwee ezigbo obi ụtọ. Ihe a o meere m tụrụ m n’anya.”—Ilu 15:15.

12-13. Olee otú ndị ọrịa na-anaghịzi ekwe pụta èzí ka si na-ezi ozi ọma, oleekwa uru ọ na-aba?

12 Obi nwere ike ịda ndị nọ n’ọrịa mbà n’ihi na ha anaghị ekwusacha ozi ọma otú ha chọrọ. Ma, ọtụtụ n’ime ha achọpụtala ụzọ ndị ha ga-esi na-ezi ozi ọma. N’Amerịka, e tinyere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Laurel n’ígwè na-enyere ya aka iku ume ruo afọ iri atọ na asaa. O nwere ọrịa kansa. A waakwala ya ahụ́ ọtụtụ ugboro. O nwekwara ọrịa ọjọọ na-arịa ya n’akpụkpọ ahụ́ ya. Ma, ọrịa ndị a emeghị ka ọ ghara ịna-ezi ozi ọma. Ọ na-ezi ndị nọọsụ na ndị ọzọ na-abịa eleta ya n’ụlọ ya ozi ọma. O si otú a nyere, ọ dịkarịa ala, mmadụ iri na asaa aka ha abịa fewe Jehova. *

13 O nwere aro otu okenye bi na Frans aha ya bụ Richard tụụrụ ndị ọrịa na-anaghịzi ekwe pụta èzí. Ọ sịrị: “M na-atụ aro ka ha nwee obere ihe ha ga na-akpọsa akwụkwọ na ya. Ihe a ga-eme ka ndị mmadụ bịa ka ha na ha kwurịta okwu. Ọ ga-enyere ụmụnna anyị ndị na-anaghịzi aga ozi ụlọ n’ụlọ aka.” Ndị na-anaghịzi apụta èzí nwekwara ike iji akwụkwọ ozi ma ọ bụ ekwentị na-ezi ozi ọma.

MGBE ANYỊ NA-ENWETAGHỊ IHE ÙGWÙ ANYỊ TỤRỤ ANYA YA

14. Gịnị ka Devid mere nke anyị kwesịrị iṅomi?

14 N’ihi nká, ọrịa, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ, o nwere ike anyị agaghị enweta ihe ùgwù ụfọdụ n’ọgbakọ ma ọ bụ na sekit. Ma, o nwere ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Eze Devid. Mgbe a gwara ya na ọ bụghị ya ga-arụrụ Chineke ụlọ nsọ, o ji obi ya niile kwadoo onye Chineke họọrọ ịrụ ọrụ ahụ. O nyedịrị ọlaọcha na ọlaedo buru ibu ka e jiri rụọ ọrụ ahụ. Anyị kwesịrị ime ka Devid.—2 Sam. 7:12, 13; 1 Ihe 29:1, 3-5.

15. Olee otú Nwanna Hugues si merie ịda mbà n’obi?

15 O nwere otu nwanna aha ya bụ Hugues bi na Frans. Ọ kwụsịrị ịbụ okenye n’ihi ọrịa. O nweghịkwa ike ime ihe ọ bụla n’ụlọ. O dere, sị: “Ná mmalite, m chere na o nweghịzi uru m bara, obi dakwara m mbà. Ma ka oge na-aga, m kwụsịrị ichegbu onwe m ma were ụwa m otú m si hụ ya. Ihe ndị m na-emeli n’ozi Jehova ugbu a na-emekwa m obi ụtọ. Ekpebiela m na agaghị m ada mbà. M ga na-eme ike m niile dị ka Gidiọn na narị ndị ikom atọ ya na ha so mere. Ha mere ike ha niile n’agbanyeghị na ike gwụrụ ha.”—Ikpe 8:4.

16. Gịnị ka anyị ga-amụta n’aka ndị mmụọ ozi?

16 O nwekwara ezigbo ihe anyị ga-amụta n’aka ndị mmụọ ozi. Mgbe Eze Ehab na-achị, Jehova kpọkọtara ndị mmụọ ozi ma gwa ha ka ha tụọ aro otú a ga-esi arafu eze ahụ. Ọtụtụ n’ime ha tụrụ aro otú a ga-esi eme ya. Ma, Chineke gwara otu mmụọ ozi na aro nke ya dị mma, na ọ ga-arafu Ehab. (1 Eze 22:19-22) Ndị mmụọ ozi ndị nke ọzọ hà bịara daa mbà n’obi, na-ajụ onwe ha, sị: ‘Gịnị medịrị m ji nyewe onwe m nsogbu tụwa aro?’ Mba. Ndị mmụọ ozi dị umeala n’obi. Ha chọkwara ka otuto niile gaara Jehova.—Ikpe 13:16-18; Mkpu. 19:10.

17. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị adaa mbà n’obi n’ihi na anyị enwetaghị ihe ùgwù ụfọdụ?

17 Na-echeta na ihe ùgwù kachanụ anyị nwere bụ ịza aha Jehova na ikwusa Alaeze ya. Ihe ùgwù nwere ike ịbịa taa laa echi. Ma, ọ bụghị ya ga-eme ka Jehova jiri anyị kpọrọ ihe. Anyị dịrị umeala n’obi, ọ bụ mgbe ahụ ka Jehova na ụmụnna anyị ga-eji anyị kpọrọ ihe. N’ihi ya, rịọ Jehova ka o nyere gị aka ịdị umeala n’obi. Chee banyere ndị dị umeala n’obi a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. Jiri obi gị niile jeere ụmụnna gị ozi otú ọ bụla i nwere ike.—Ọma 138:6; 1 Pita 5:5.

MGBE NDỊ MMADỤ NA-ANAGHỊ EGECHA NTỊ N’ÓKÈALA UNU

18-19. Olee otú ị ga-esi na-enwe obi ụtọ n’ozi gị, ọ bụrụgodị na ndị mmadụ anaghị ege ntị n’ókèala unu?

18 Ò nwetụla mgbe ị dara mbà n’ihi na ndị mmadụ anaghị egecha ntị n’ókèala unu, ma ọ bụkwanụ n’ihi na ha anaghị anọcha n’ụlọ? Ọ́ dị otú a, gịnị ka anyị ga-eme iji nọgide na-enwe obi ụtọ? E kwuru ihe ụfọdụ anyị nwere ike ime n’igbe isiokwu ya bụ “ Ụzọ Ndị Anyị Ga-esi Mee Ka Ozi Anyị Ka Mma.” Ọ dịkwa mkpa ka anyị na-ele ozi anyị anya otú kwesịrị ekwesị. Olee otú anyị ga-esi eme ya?

19 Tinye uche gị n’ịkụziri ndị mmadụ gbasara aha Jehova na Alaeze ya. Jizọs kwuru hoo haa na ọ bụ mmadụ ole na ole ga-achọta ụzọ ndụ. (Mat. 7:13, 14) Anyị nọrọ n’ozi ọma, anyị nwere ihe ùgwù iso Jizọs, Jehova, na ndị mmụọ ozi na-arụkọ ọrụ. (Mat. 28:19, 20; 1 Kọr. 3:9; Mkpu. 14:6, 7) Jehova na-adọta ndị nwere mmasị ife ya. (Jọn 6:44) N’ihi ya, ọ bụrụ na mmadụ egeghị ntị n’ozi ọma anyị ugbu a, o nwere ike ige ntị n’oge ọzọ.

20. Gịnị ka anyị ga-amụta na Jeremaya 20:8, 9 nke ga-enyere anyị aka imeri ịda mbà n’obi?

20 O nwere ọtụtụ ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Jeremaya onye amụma. Ndị ọ gara kwusaara ozi ọma egeghị ya ntị. Ha kọchara ya ma kparịa ya “ogologo ụbọchị dum.” (Gụọ Jeremaya 20:8, 9.) Ọ dara mbà n’obi nke na ọ chọdịrị ịkwụsị ikwusa okwu Chineke. Ma, o meghị otú ahụ. N’ihi gịnị? “Okwu Jehova” dị ka ọkụ na-ere ere n’ime Jeremaya. O nweghịkwa ike idi ya. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ ga-adị anyị ma anyị na-amụ Baịbụl kwa ụbọchị ma na-echebara ya echiche. Ọ ga-eme ka anyị na-enwekwu ọṅụ, na-emekwukwa nke ọma n’ozi anyị.—Jere. 15:16.

21. Olee otú anyị ga-esi emeri ịda mbà n’obi n’agbanyeghị ihe kpatara ya?

21 Deborah anyị kwuru okwu ya na mbụ kwuru, sị: “Setan nwere ike iji ịda mbà n’obi kwara ngwá ọrụ.” Ma Jehova karịrị Setan na ihe niile o ji anwa anyị. N’ihi ya, e nwee ihe ọ bụla mere ka ị daa mbà n’obi, rịọ Jehova ka o nyere gị aka. Ọ ga-enyere gị aka imezi ebe ndị ị na-anaghị emecha nke ọma. Ọ ga-enyekwara gị aka mgbe ị na-arịa ọrịa, nyekwara gị aka ịna-ele ọrụ ndị nọ n’ọgbakọ anya otú kwesịrị ekwesị. Ọ ga-enyekwara gị aka ịna-ele ozi gị anya otú kwesịrị ekwesị. Kọọrọ Nna gị nke eluigwe ihe niile na-enye gị nsogbu n’obi. Jehova ga-enyere gị aka imeri ịda mbà n’obi.

ABỤ NKE 41 Biko, Nụrụ Ekpere M

^ par. 5 Anyị niile na-ada mbà n’obi mgbe ụfọdụ. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe ụfọdụ anyị nwere ike ime ma anyị dawa mbà n’obi. Dị ka anyị ga-ahụ, Jehova ga-enyere anyị aka imeri ịda mbà n’obi.

^ par. 4 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ par. 12 E dere akụkọ Laurel Nisbet na Teta! Bekee nke January 22, 1993.

^ par. 69 NKỌWA FOTO: Obi dara otu nwanna nwaanyị mbà, ma o chetara ozi o jeere Jehova n’oge gara aga, kọọkwara Jehova obi ya n’ekpere. Obi siri ya ike na Jehova na-echeta ozi o jere n’oge gara aga nakwa nke ọ na-eje ugbu a