Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-anụ Ọkụ n’Obi n’Ozi Gị

Na-anụ Ọkụ n’Obi n’Ozi Gị

OLEE otú obi na-adị gị ma ị nata akwụkwọ ozi na-eme obi ụtọ si n’aka ezigbo enyi gị? Onye Kraịst aha ya bụ Timoti natara ụdị akwụkwọ ozi a n’aka Pọl onyeozi. Ọ bụ akwụkwọ ozi a ka a na-akpọ Timoti nke Abụọ na Baịbụl. O doro anya na Timoti gbaara gaa n’ebe dị jụụ ka ọ nọrọ gụọ akwụkwọ ozi a ezigbo enyi ya detaara ya. O nwere ike ịbụ na Timoti nọ na-eche, sị: ‘Olee otú Pọl mere? Ò nwere ihe ọ chọrọ ịgwa m gbasara ozi m. Akwụkwọ ozi a ọ̀ ga-enyere m aka ịna-emekwu nke ọma n’ozi m ma nyere ndị ọzọ aka?’ Dị ka anyị ga-emecha chọpụta, Timoti matara azịza ajụjụ ndị a nakwa ihe ndị ọzọ n’akwụkwọ ozi ahụ. Ma ugbu a, ka anyị buru ụzọ leba anya na ndụmọdụ ụfọdụ dị mkpa dị n’akwụkwọ ozi ahụ.

‘M NỌGIDERE NA-ATACHI OBI N’IHE NIILE’

Mgbe Timoti malitere ịgụ akwụkwọ ozi ahụ Pọl detaara ya, ọ chọpụtara ozugbo na Pọl hụrụ ya n’anya. Pọl ji obi ya niile kpọọ ya “nwa a hụrụ n’anya.” (2 Tim. 1:2) N’agbanyeghị na Timoti ji ntakịrị ihe gafetụ afọ iri atọ mgbe ọ natara akwụkwọ ozi ahụ n’ihe dị ka n’afọ 65, ọ bụrụla okenye ma nke a na-akọ n’ọgbakọ. Ya na Pọl ejekọọla ozi ihe karịrị afọ iri. Ọ mụtakwala ọtụtụ ihe n’aka ya.

Mgbe Timoti matara na Pọl nọ na-atachi obi n’agbanyeghị mkpagbu, ọ ga-abụ na ọ gbara ya ume. A tụrụ Pọl mkpọrọ na Rom, a ga-egbukwa ya n’oge na-adịghị anya. (2 Tim. 1:15, 16; 4:6-8) Timoti chọpụtara na obi ka siri Pọl ike n’ihi na Pọl gwara ya na ya ka ‘nọgidere na-atachi obi n’ihe niile.’ (2 Tim. 2:8-13) Otú Pọl si tachie obi nwere ike ịgba anyị ume otú ahụ ọ gbara Timoti.

MEE KA ONYINYE DỊ N’IME GỊ NWUO DỊ KA ỌKỤ

Pọl gwara Timoti ka o jiri ozi ọ na-ejere Chineke kpọrọ ihe. Pọl chọrọ ka Timoti mee ka onyinye Chineke nke dị n’ime ya “nwuo dị ka ọkụ.” (2 Tim. 1:6) Ihe Pọl kpọrọ “onyinye” n’amaokwu a bụ okwu Grik bụ́ khaʹri·sma. Okwu Grik ahụ pụtara onyinye e nyere mmadụ nke na-erụghịrị onye ahụ. Timoti nwetara onyinye a mgbe a họpụtara ya ka o jewe ozi pụrụ iche n’ọgbakọ.—1 Tim. 4:14.

Gịnị ka Timoti ga-eji onyinye a eme? Mgbe ọ gụrụ okwu ahụ bụ́ “nwuo dị ka ọkụ,” ọ ga-abụ na o chetara ọkụ ndị mmadụ na-akwanye n’ụlọ ha nke nwere ike iji nwayọọ nwayọọ chọwa ịnyụ. Ọkụ ndị ahụ chọwa ịnyụ, a na-afụnwu ha ka ha bidokwa nwusiwa ike ma mee ka ime ụlọ kporo ọkụ. Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kwuru na okwu Grik Pọl dere, ya bụ, a·na·zo·py·reʹo, pụtara “ịtụte ihe, ịfụnwu ọkụ chọrọ ịnyụ anyụ,” ya bụ, mmadụ iji ịnụ ọkụ n’obi maliteghachi ịrụ ọrụ. Ihe ọ pụtara bụ na Pọl na-agwa Timoti, sị: ‘Jiri ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi gị.’ Ihe a dịkwa anyịnwa mkpa taa. Anyị kwesịrị iji ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi anyị.

“NA-ECHE EZI IHE A NKE E NYEFERE N’AKA GỊ NCHE”

Ka Timoti na-agụ akwụkwọ ozi a ezigbo enyi ya detaara ya, ọ gụtara ihe ọzọ ga-enyekwuru ya aka n’ozi ya. Pọl dere, sị: “Na-eche ezi ihe a nke e nyefere n’aka gị nche site na mmụọ nsọ nke dị n’ime anyị.” (2 Tim. 1:14) Gịnị bụ ihe ahụ e nyefere ya n’aka? N’amaokwu nke iri na atọ, Pọl kpọrọ ya “okwu na-enye ezi ndụ,” ya bụ, eziokwu ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ. (2 Tim. 1:13) Ebe ọ bụ na Timoti bụ onye ozi Chineke, ọ ga-akụziri ma ndị nọ n’ọgbakọ ma ndị nọ n’èzí eziokwu Chineke. (2 Tim. 4:1-5) Ihe ọzọ bụ na a họpụtala Timoti ka ọ bụrụ okenye ga na-azụ atụrụ Chineke. (1 Pita 5:2) Ihe ga-enyere Timoti aka iche ihe ahụ e nyefere ya n’aka nche, ya bụ, eziokwu ahụ ọ na-akụzi, bụ ịdabere ná mmụọ nsọ Jehova na n’Okwu ya.—2 Tim. 3:14-17.

Taakwa, e nyefere anyị eziokwu anyị na-akụziri ndị mmadụ n’ozi ọma. (Mat. 28:19, 20) Otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe a magburu onwe ya e nyefere anyị n’aka bụ ịna-ekpe ekpere mgbe niile na ịna-amụchi Okwu Chineke anya. (Rom 12:11, 12; 1 Tim. 4:13, 15, 16) O nwekwara ike ịbụ na anyị bụ okenye ma ọ bụ ndị ozi oge niile. Ụdị ozi a kwesịrị ime ka anyị dị umeala n’obi, meekwa ka anyị mata na anyị kwesịrị ịdabere n’ebe Chineke nọ. N’ihi ya, otú anyị ga-esi eche ihe e nyefere anyị n’aka nche bụ iji ya kpọrọ ihe na ịdabere n’ebe Jehova nọ ka o nyere anyị aka iche ya nche.

“NYEFEE YA N’AKA NDỊ KWESỊRỊ NTỤKWASỊ OBI”

Ọ bụghị naanị Timoti ga-arụ ọrụ ndị e nyefere ya. Ndị ọzọ ga-esokwa ya arụ ya. N’ihi ya, Pọl gwara ya, sị: “Ihe ị nụrụ n’ọnụ m . . . nyefee ya n’aka ndị kwesịrị ntụkwasị obi, ndị ga-erukwa eru nke ọma ịkụziri ya ndị ọzọ.” (2 Tim. 2:2) Pọl gwara Timoti ka ọ kụziere ụmụnna ya ihe ndị ọ mụtara. Okenye ọ bụla nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst taa kwesịrị ime ụdị ihe a. Ezigbo okenye anaghị ezochi ihe ọ ma ka ndị ọzọ ghara ịmụta ya. Kama, ọ na-akụziri ya ndị ọzọ ka ha nwee ike ịrụ ọrụ ahụ ọ na-arụ. Ụjọ anaghị atụ ya na ya kụziere ndị ọzọ ọrụ ahụ na ha ga-amarazi ya karịa yanwa. N’ihi ya, okenye ahụ anaghị akụziri ndị ọzọ naanị ihe ole na ole. Kama, ọ na-enyere ha aka ka ha mụta ọrụ ha nke ọma, bụrụ ndị ma nke a na-akọ n’ọgbakọ. ‘Ndị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi’ ọ kụziiri ọrụ ga-aba ezigbo uru n’ọgbakọ.

O doro anya na obi tọrọ Timoti ụtọ maka akwụkwọ ozi ahụ Pọl detaara ya. O nwere ike ịbụ na ọ gụrụ akwụkwọ ozi ahụ ọtụtụ ugboro, na-echebara ya echiche ka ọ mara otú ọ ga-esi eme ihe ndị e kwuru na ya.

Anyịnwa kwesịkwara ime ihe ndị e kwuru n’akwụkwọ ozi ahụ. Olee otú anyị ga-esi eme ya? Anyị nwere ike ịgbalịsi ike jiri ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi anyị, chee ihe e nyefere anyị n’aka nche, kụziekwara ndị ọzọ ihe ndị anyị ma. Anyị mee otú ahụ, anyị ‘ga-ejezu ozi anyị’ otú ahụ Pọl gwara Timoti ka o mee.—2 Tim. 4:5.