Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụwa A Ọ̀ Na-aga Ịgwụ n’Eziokwu?

Ụwa A Ọ̀ Na-aga Ịgwụ n’Eziokwu?

O nwere ike ịbụ na ị ma na Baịbụl kwuru na ụwa ga-agwụ. (1 Jọn 2:17) Ọgwụgwụ ụwa ọ̀ pụtara na e nweghịzi ndị ga-ebi n’ụwa? Ụwa anyị a ọ̀ ga-atọgboro chakoo? Ka à ga-ebibi ya kpamkpam?

IHE BAỊBỤL ZARA N’AJỤJỤ NDỊ A BỤ MBA

Olee Ihe Ndị Na-agaghị Agwụ?

ỤMỤ MMADỤ

Ihe Baịbụl kwuru: Chineke ‘ekeghị ụwa na nkịtị, kama o kere ya ka ndị mmadụ biri na ya.’​—AỊZAYA 45:18.

ỤWA A ANYỊ BI NA YA

Ihe Baịbụl kwuru: “Otu ọgbọ na-agafe, ọgbọ ọzọ na-abịakwa, ma ụwa na-adịru mgbe ebighị ebi.” ​—EKLIZIASTIS 1:4.

IHE Ọ PỤTARA: Ihe a Baịbụl kwuru gosiri na o nweghị mgbe ọ bụla a ga-ebibi ụwa nkịtị a anyị bi na ya. Ụmụ mmadụ ga na-ebi na ya ruo mgbe ebighị ebi. Ebe ọ dị otú ahụ, oleezi ihe ọgwụgwụ ụwa pụtara?

CHEGODỊ IHE A: Baịbụl ji ọgwụgwụ ụwa tụnyere ihe mere n’oge Noa. N’oge ahụ, ndị juru n’ụwa “bụ ndị tigbuo zọgbuo.” (Jenesis 6:13) Ma, Noa bụ onye ezi omume. N’ihi ya, Chineke chebere ya na ezinụlọ ya ma jiri iju mmiri bibie ndị ọjọọ. Lee ihe Baịbụl kwuru gbasara ihe mere n’oge ahụ. Ọ sịrị: “E jikwa mmiri bibie ụwa nke oge ahụ mgbe mmiri tojuru ebe niile n’ụwa.” (2 Pita 3:6) Ihe a bụ otú ụwa nke oge ahụ si gwụ. Ma, olee ihe e bibiri mgbe ahụ? Ọ bụ ndị ọjọọ, ọ bụghị ụwa nkịtị. N’ihi ya, mgbe ọ bụla Baịbụl kwuru gbasara ọgwụgwụ ụwa, ihe ọ na-ekwu okwu ya abụghị na a ga-ebibi ụwa nkịtị, kama, ihe ọ na-ekwu bụ na a ga-ebibi ndị ajọ omume bi n’ụwa na aka ọrụ ha dị iche iche.

Olee Ihe Ndị Ga-agwụnụ?

NSOGBU NA IHE ỌJỌỌ

Ihe Baịbụl kwuru: “N’oge na-adịghị anya, ndị ajọ omume agaghịzi anọ. Ị ga-ele anya n’ebe ha na-anọ, ma ha agaghị anọ ya. Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, obi ga-adịkwa ha ezigbo ụtọ maka na ha ga-anọ nnọọ n’udo.”​—ABỤ ỌMA 37:​10, 11.

IHE Ọ PỤTARA: Iju Mmiri oge Noa emeghị ka ihe ọjọọ kwụsị kpamkpam. Mgbe Iju Mmiri ahụ gachara, ndị ọjọọ bịara mesiwekwa ndị mmadụ ike. Ma, n’oge na-adịghị anya, Chineke ga-eme ka ihe ọjọọ kwụsị. Dị ka otu ọbụ abụ si kwuo, “Ndị ajọ omume agaghịzi anọ.” Chineke ga-eji Alaeze ya mee ka ihe ọjọọ gharazie ịdị. Alaeze ya bụ ọchịchị ga-esi n’eluigwe na-achị ndị ezi omume.

CHEGODỊ IHE A: Ndị na-achị ụwa ugbu a, hà ga-akwado Alaeze Chineke? Baịbụl gosiri na ha agaghị akwado ya. Ha ga-agba ya ụkwụ. Ihe a ga-abụ izuzu nzuzu. (Abụ Ọma 2:2) Olee ihe ụkwụ a ha ga-agba Alaeze Chineke ga-akpata? Chineke ga-eji Alaeze ya dochie ọchịchị ụmụ mmadụ niile, “ma naanị ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.” (Daniel 2:44) Ma, olee ihe mere e kwesịrị iji jiri ọchịchị Chineke dochie ọchịchị ụmụ mmadụ?

Ọchịchị Ụmụ Mmadụ KWESỊRỊ ỊGWỤ

Ihe Baịbụl kwuru: “Mmadụ enweghịkwa ikike iduzi nzọụkwụ ya mgbe ọ na-eje ije.”​—JEREMAYA 10:23.

IHE Ọ PỤTARA: Chineke ekeghị ụmụ mmadụ ka ha na-achị onwe ha. Ọ bụ ya mere na ha achịtaghị ájá ma a bịa n’ịchị ụmụ mmadụ nakwa n’igboro ha mkpa ha.

CHEGODỊ IHE A: Akwụkwọ bụ́ Britannica Academic kwuru na ọ dịghị ka è nwere ọchịchị “ga-akwụsili nsogbu ndị zuru ụwa ọnụ dị ka ịda ogbenye, agụụ, ọrịa, ọdachi ndị na-emere onwe ha, agha, ma ọ bụ ihe ike ndị ọzọ a na-eme.” O kwuziri, sị: “Ụfọdụ . . . na-eche na naanị ihe ga-eme ka nsogbu ndị a niile kwụsị kpamkpam bụ ma e nwee otu ọchịchị ga na-achị ụwa niile.” Mana, ọ bụrụgodị na ndị ọchịchị niile ejikọta aka na-achị, ha agaghị enwe ike ịkwụsị nsogbu ndị ahụ n’ihi na ha ka bụkwa ndị na-ezughị okè. Ọ bụ naanị Alaeze Chineke bụ ọchịchị ga-akwụsịli nsogbu niile e nwere n’ụwa a kpamkpam.

N’ihi ihe ndị a Baịbụl kwuru, ọgwụgwụ ụwa abụghị ihe ndị ezigbo mmadụ kwesịrị ịna-atụ ụjọ ya n’ihi na ọ pụtara mbibi a ga-ebibi ndị ajọ omume na aka ọrụ ha dị iche iche. Ọ bụ ihe anyị kwesịrị ịna-atụ anya ya n’ihi na e bibichaa ndị ajọ omume, ndị ezi omume ga-afọdụzi n’ụwa.

Ma, oleekwanụ mgbe ihe a niile ga-eme? Isiokwu na-esonụ ga-akọwa ihe Baịbụl zara n’ajụjụ a.