Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

I nwere ike ibido ugbu a na-akwadebe ibi n’ụwa ọhụrụ a ga-enwe n’oge na-adịghị anya

Mgbe Ụwa Ga-aghọ Paradaịs Dị Nso

Mgbe Ụwa Ga-aghọ Paradaịs Dị Nso

Chineke kere ụwa ka ndị ezi omume biri na ya ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 37:29) Mgbe o kechara Adam na Iv, o mere ka ha biri n’ogige Iden mara ezigbo mma. O nyekwara ha na ụmụ ha ga-amụta ọrụ ịna-elekọta ụwa.​—Jenesis 1:28; 2:15.

Otú ụwa dị ugbu a abụtụdịghị otú ọ dị mgbe ahụ ọ bụ Paradaịs. Ma, Chineke agbanwebeghị ihe o bu n’obi kee ụwa. Olee otú ọ ga-esi eme ka ụwa bụrụghachi Paradaịs? Dị ka anyị mụtara n’isiokwu ndị bu nke a ụzọ, ihe Chineke ga-ebibi abụghị ụwa a anyị bi n’ime ya. Ọ ga-ahapụ ndị ezi omume ka ha biri na ya. Ma, olee otú ụwa ga-adị mgbe Chineke ga-eme ka ọ ghọọ Paradaịs?

Otu ọchịchị ga na-achị ụwa niile

N’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke, nke bụ́ ọchịchị dị n’eluigwe, ga-ebido chịwa ndị bi n’ụwa. N’oge ahụ, obi ga na-atọ ndị bi n’ụwa ụtọ, ha na ibe ha ga-adịkwa n’udo. Onye ọ bụla ga na-arụkwa ezigbo ọrụ ga-eme ya obi ụtọ. Chineke emeela Jizọs Kraịst eze ga-achị ụwa. Jizọs adịghị ka ndị ọchịchị e nwere taa n’ihi na ihe banyere ndị ọ na-achị ga na-emetụ ya n’obi. Ọ ga-ahụ ndị ọ na-achị n’anya, dịrị obiọma na obi ebere. O nweghịkwa onye ọ ga-emegbu.​—Aịzaya 11:4.

Ndị niile bi n’ụwa na ibe ha ga-adị n’udo

A gaghịzi enwe ihe dị ka “onye a bụ onye mba ọzọ” ma ọ bụ “onye a bụ onye agbụrụ ọzọ.” Mmadụ niile ga-abụ otu ezinụlọ. (Mkpughe 7:​9, 10) Ndị niile ga-ebi n’ụwa mgbe ahụ ga-ahụ Chineke na mmadụ ibe ha n’anya. Ha na ibe ha ga-adị n’udo. Ha ga-agbakọkwa aka ọnụ na-elekọta ụwa otú ahụ Chineke chọrọ na mbụ.​—Abụ Ọma 115:16.

A gaghịzi enwe ọdachi ndị na-emere onwe ha

Mgbe Alaeze Chineke ga-achịwa ụwa, Chineke ga-akwụsị ọdachi ndị na-emere onwe ha. (Abụ Ọma 24:​1, 2) Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o mere ka nnukwu ebili mmiri dajụọ. O si otú ahụ gosi ihe ọ ga-eji ike Chineke nyere ya mee. (Mak 4:​39, 41) Mgbe Kraịst ga-achịwa ụwa, o nweghịzi onye ga-achịrị obi n’aka n’ihi ọdachi ndị na-emere onwe ha. Alaeze Chineke ga-emekwa ka ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ dịrị n’udo, meekwa ka ụmụ mmadụ gharazie ịna-emetọsị ụwa.​—Hosia 2:18.

Ahụ́ ga-agbasi onye ọ bụla ike, nri abụrụkwa atụrụ tawa

Ahụ́ ga-agbasi onye ọ bụla ike. O nweghị onye ga-arịa ọrịa, kaa nká, ma ọ bụkwanụ nwụọ. (Aịzaya 35:​5, 6) Ndị mmadụ ga-ebi n’ebe mara mma na ebe dị ọcha ka ogige Iden ahụ Adam na Iv biri na ya. N’ụwa ọhụrụ, ala ga na-eme nri nke ọma ka ogige Iden. Nri ga-ejukwa ebe niile. (Jenesis 2:9) Ndị niile bi na Paradaịs ga ‘na-eri nri rijuo afọ’ otú ahụ ụmụ Izrel riri n’oge ochie.​—Levitikọs 26:​4, 5.

Ezigbo udo ga-adị, obi ga-erukwa mmadụ niile ala

Mgbe Alaeze Chineke ga-abụ naanị ọchịchị na-achị ụwa, mmadụ niile ga-adị n’udo, ha ga-ejikwa obiọma na-emeso ibe ha ihe, o nweghịkwa onye ga-emegbu ibe ya. Ndị mmadụ agaghịzi na-alụ agha, o nweghịkwa onye ga-eji ikike o nwere megbuo onye ọzọ, ndị mmadụ ga na-enwetakwa ihe ndị na-akpa ha. Baịbụl kwuru, sị: “Onye ọ bụla n’ime ha ga-anọdụ ala n’okpuru osisi vaịn ya nakwa n’okpuru osisi fig ya. E nweghịkwa onye ga-emenye ha ụjọ.”​—Maịka 4:​3, 4.

Onye ọ bụla ga-enwe ụlọ nke ya na ezigbo ọrụ

Ezinụlọ ọ bụla ga-enwe ụlọ nke ha. Ha agaghịkwa achịrị obi n’aka na a ga-anara ha ya. Mmadụ agaghịkwa arụcha ọrụ, ya abụrụ ịkwọ aka tiere ọkụkọ akị. Baịbụl kwuru na ndị ga-ebi n’ụwa ọhụrụ Chineke “agaghị arụsi ọrụ ike na nkịtị” ma ọ bụ n’efu.​—Aịzaya 65:​21-23.

A ga-enwe agụmakwụkwọ kacha mma

Baịbụl kwuru, sị: “Amamihe gbasara Jehova ga-ejupụta ụwa.” (Aịzaya 11:9) Ndị ga-ebi n’ụwa ọhụrụ Chineke ga na-amụta ihe n’aka Jehova, bụ́ Onye kere ha. Amamihe Jehova anaghịkwa agwụ agwụ. Ha ga-amụtakwa gbasara ọmarịcha ihe ndị o kere. Ha agaghị eji ihe ndị ha mụtara rụọ ngwá agha ha ga-eji egbu ndị ọzọ. (Aịzaya 2:4) Kama, ha ga-amụta otú ha na ibe ha ga-esi na-ebi n’udo na otú ha ga-esi na-elekọta ụwa.​—Abụ Ọma 37:11.

Ndị mmadụ ga-adị ndụ ebighị ebi

Chineke gbara ezigbo mbọ kee ụwa a otú ibi na ya ga na-atọ anyị ụtọ kwa ụbọchị. Ọ chọrọ ka ụmụ mmadụ biri n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 37:29; Aịzaya 45:18) Ka ihe a nwee ike mezuo, Chineke “ga-eme ka ọnwụ ghara ịdị ruo mgbe ebighị ebi.” (Aịzaya 25:8) “Ọnwụ agaghịzi adị. Iru uju ma ọ bụ ibe ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịzi adị.” (Mkpughe 21:4) Chineke ga-enye mmadụ niile ohere ka ha dịrị ndụ ebighị ebi, ma ndị ọ ga-echebe mgbe ọ na-ebibi ndị ajọ omume ma imeriime ndị ọ ga-akpọlite n’ọnwụ n’ụwa ọhụrụ ya.​—Jọn 5:​28, 29; Ọrụ Ndịozi 24:15.

Ka ọ dị ugbu a, ọtụtụ nde mmadụ akwadebewala otú ha ga-esi ebi na Paradaịs a ga-enwe n’oge na-adịghị anya. Ọ bụ eziokwu na ha ezughị okè, ha na-agbalị ịbụ ụdị ndị Chineke chọrọ ka ha biri n’ụwa ọhụrụ ya. Olee otú ha si eme ya? Ọ bụ ịna-amụ gbasara Jehova Chineke nakwa onye o zitere bụ́ Jizọs Kraịst.​—Jọn 17:3.

Chọpụtakwuo ihe ị ga-eme ka a ghara ibibi gị mgbe ụwa a ga-agwụ, gị adịrịkwa ndụ n’ụwa ọhụrụ a ga-enwe n’oge na-adịghị anya. Gwa Onyeàmà Jehova ka gị na ya mụwa Baịbụl, ọ gaghị ana gị ego. Ọ ga-eji akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị mụwara gị ya.