Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Onye Ọ Bụla Chọrọ Ka Ihe Dịrị Ya ná Mma

Onye Ọ Bụla Chọrọ Ka Ihe Dịrị Ya ná Mma

Olee otú ị chọrọ ka ihe dịrị gị n’ọdịnihu? Ọ ga-abụ na ị chọrọ ka gị na ezinụlọ gị na-enwe obi ụtọ, ka ahụ́ gbasie unu ike, ka unu biri n’udo, nakwa ka ihe gaziere unu. Ọtụtụ ndị chọkwara ihe ndị a.

Ma, obi esighị ọtụtụ ndị ike na ihe ga-adịrị ha ná mma n’ọdịnihu otú ahụ ha chọrọ. Ha ahụla ka ihe ụfọdụ ha na-atụghị anya ha, dị ka ọrịa koronavaịrọs, mere ná mberede ma ghasaa ndụ ha, mee ka ha daa ogbenye, gbuodị ọtụtụ ndị. Ọ bụ ihe ndị a mere ha ji chee na ihe agaghị adịrị ha ná mma n’ọdịnihu.

Ihe ndị a emeekwala ka ndị mmadụ chọọ ịmata ihe ga-eme ka ihe dịrị ha ná mma n’ọdịnihu. Ụfọdụ ndị chere na ọ bụ akara aka ma ọ bụ inwe ihu ọma ga-eme ya. E nwekwara ndị nke chere na ọ bụ ịgụ oké akwụkwọ na inwe ego ga-eme ka ihe dịrị ha ná mma. Ndị ọzọ echeekwanụ na ọ gwụchaala ịbụ ezigbo mmadụ ga-eme ya.

È nwere nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ ga-eme ka ihe dịrị gị ná mma n’ọdịnihu? Iji chọpụta, tụlee ajụjụ ndị na-esonụ:

  • Gịnị ga-eme ka ihe dịrị gị ná mma n’ọdịnihu?

  • Ọ̀ bụ ịgụ oké akwụkwọ na inwe ego?

  • Ọ̀ bụ ịbụ ezigbo mmadụ?

  • Olee ihe ga-enyere gị aka ịmata ihe ị ga-eme ka ihe dịrị gị ná mma n’ọdịnihu?

Ụlọ Nche a ga-enyere gị aka ịmata azịza ha.