Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịbụ Ezigbo Mmadụ Ọ̀ Ga-eme Ka Ihe Dịrị Gị ná Mma n’Ọdịnihu?

Ịbụ Ezigbo Mmadụ Ọ̀ Ga-eme Ka Ihe Dịrị Gị ná Mma n’Ọdịnihu?

Kemgbe ụwa, ọtụtụ ndị chere na ha bụrụhaala ezigbo mmadụ, na-akpa àgwà ọma, na ihe ga-adịrị ha ná mma n’ọdịnihu. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị Eshia kwetara n’ihe otu ọkà mmụta a ma ama aha ya bụ Kọnfushọs (Afọ 551 ruo afọ 479 Tupu Oge Ndị Kraịst) kwuru. Ọ sịrị: “Ihe ị na-achọghị ka mmadụ mee gị, emela ya ndị ọzọ.” *

IHE ỌTỤTỤ NDỊ CHERE

Ọtụtụ ndị chere na ịna-akpa àgwà ọma ga-eme ka ihe dịrị ha ná mma n’ọdịnihu. Ha na-agbalị ka ha na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù, na-akpa àgwà ọma, na-emere ndị ọzọ ihe ọma, na-emekwa ihe obi ha na-agaghị ama ha ikpe. Otu nwaanyị bi na Vietnam aha ya bụ Linh kwuru, sị, “Kemgbe ụwa m, m kwetara na ọ bụrụ na mụ akwụwa aka m ọtọ, ihe ga-adịrị m ná mma.”

Ụfọdụ na-emere ndị ọzọ ihe ọma maka na ọ bụ ihe a na-akụziri ha n’okpukpe ha. Otu nwoke bi na Taịwan aha ya bụ Hsu-Yun kwuru, sị, “A kụziiri m na ihe mmadụ mere mgbe ọ dị ndụ ga-eme ka ọ na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi ma ọ nwụọ ma ọ bụkwanụ na-ata ahụhụ.”

ỊBỤ EZIGBO MMADỤ Ọ̀ NA-EME KA IHE DỊRỊ MMADỤ NÁ MMA?

O doro anya na imere ndị ọzọ ihe ọma na-abara anyị ezigbo uru. Ma, ọtụtụ ndị ji obi ha niile na-emere ndị ọzọ ihe ọma na-achọpụta na ọtụtụ mgbe, ndị ọzọ anaghị emere ha otú ahụ. Otu nwaanyị bi na Họng Kọng aha ya bụ Shiu Ping kwuru, sị: “M si n’ihe mere m chọpụta na ọ bụghị mgbe niile ka ihe na-agaziri ndị na-emere ndị ọzọ ihe ọma. M na-anwa ike m ịna-elekọta ndị ezinụlọ m na ịna-emere ndị ọzọ ihe ọma. Ma mụ na di m tisara, ya ahapụkwa mụ na nwa anyị nwoke.”

Ọtụtụ ndị achọpụtala na ọ bụghị ndị niile na-aga chọọchị bụ ezigbo mmadụ. Otu nwaanyị bi na Japan aha ya bụ Etsuko kwuru, sị: “M banyere chọọchị, bụrụkwa onyeisi nke òtù ụmụ okoro na agbọghọ. Ma, akpata oyi wụrụ m mgbe m hụrụ otú ụfọdụ ndị chọọchị anyị si eme omume rụrụ arụ, na-azọ ọkwá, ma na-agbari ego chọọchị.”

“M na-anwa ike m ịna-elekọta ndị ezinụlọ m na ịna-emere ndị ọzọ ihe ọma. Ma mụ na di m tisara, ya ahapụkwa mụ na nwa anyị nwoke.”—SHIU PING, HỌNG KỌNG

Ọ na-ewute ụfọdụ ndị ji obi ha niile emere ndị ọzọ ihe ọma ma ihe ọjọọ mee ha. Ụdị ihe a mere otu nwaanyị bi na Vietnam aha ya bụ Van. O kwuru, sị: “M na-azụ mkpụrụ osisi, okooko osisi, na nri kwa ụbọchị ma na-edosa ha n’ebe m na-achụrụ ndị nna nna m hà nwụrụ anwụ àjà, na-eche na ha ga-eme ka ihe dịrị m ná mma n’ọdịnihu. N’agbanyeghị ihe ọma ndị m na-emere ndị mmadụ kemgbe ọtụtụ afọ na ihe ndị ahụ m na-edosara ndị nna nna m hà nwụrụ anwụ, di m mechara daa ọrịa. Nwa m nwaanyị dị afọ iri abụọ nwụkwara n’ebe ọ na-agụ akwụkwọ ná mba ọzọ.”

Ọ bụrụ na ịbụ ezigbo mmadụ naanị agaghị eme ka ihe dịrị mmadụ ná mma n’ọdịnihu, oleezi ihe ga-eme ya? Ka anyị nwee ike ịza ajụjụ a, e kwesịrị inwe ihe anyị ga-atụkwasị obi ga-agwa anyị ihe anyị ga-eme ka ihe dịrị anyị ná mma n’ọdịnihu. Gịnị bụ ihe ahụ?

^ par. 2 Ị chọọ ịmatakwu ihe Kọnfushọs kwuru, gụọ akwụkwọ Mankind’s Search for God, isi nke 7, paragraf nke 31-35. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya. Ọ dịkwa na www.pr418.com.