Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 1

Nọrọnụ Jụụ ma Tụkwasị Jehova Obi

Nọrọnụ Jụụ ma Tụkwasị Jehova Obi

ISIOKWU AFỌ 2021: “Unu ga-adị ike naanị site n’ịnọrọ jụụ na ịtụkwasị m obi.”—AỊZA. 30:15.

ABỤ NKE 3 Ị Bụ Ike Anyị, Olileanya Anyị, na Obi Ike Anyị

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee ajụjụ Eze Devid jụrụ nke ụfọdụ n’ime anyị nwere ike ịjụ?

ANYỊ niile chọrọ ka obi na-eru anyị ala. E nweghị onye na-achọ ichegbu onwe ya. Ma mgbe ụfọdụ, anyị na nchegbu nwere ike ịna-alụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ụfọdụ ndị ohu Jehova nwere ike ịjụ ụdị ajụjụ Eze Devid jụrụ Jehova. Ọ jụrụ ya, sị: “Ruo ole mgbe ka mkpụrụ obi m ga na-agba mgba, ruo ole mgbe ka obi m ga na-eru uju ogologo ụbọchị dum?”—Ọma 13:2.

2. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?

2 Ọ bụ eziokwu na anyị agaghị akwụsịli ichegbu onwe anyị kpamkpam, ma o nwere ihe anyị nwere ike ime ka anyị ghara ịna-echegbukarị onwe anyị. N’isiokwu a, anyị ga-ebu ụzọ chọpụta ụfọdụ ihe nwere ike ịna-eme ka anyị na-echegbu onwe anyị. Anyị ga-elebakwa anya n’ihe isii anyị nwere ike ime ka obi ruo anyị ala ma nsogbu bịara anyị.

OLEE IHE NDỊ NWERE IKE IME KA ANYỊ NA-ECHEGBU ONWE ANYỊ?

3. Olee ihe ndị na-eme ka anyị na-echegbu onwe anyị? Ọ̀ bụ ha niile ka anyị ga-emeli ihe gbasara ha?

3 O nwere ihe ụfọdụ nwere ike ime ka anyị na-echegbu onwe anyị ọ na-enweghị ihe anyị ga-emeli gbasara ha. Dị ka ihe atụ, anyị agaghị ekwuli otú ego nri, ego uwe, na ego ụlọ ga-esi agbago kwa afọ. Anyị agaghị ekwuli ugboro ole ndị ọrụ anyị ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe anyị ga-achọ ịnwa anyị ọnwụnwa ka anyị ghọọ aghụghọ ma ọ bụ mee omume rụrụ arụ. Anyị agaghịkwa akwụsịli ndị omekome ịkpa ike n’ebe anyị bi. Ihe kpatara ihe ndị a niile bụ na ọtụtụ ndị bi n’ụwa a anaghị eche gbasara ihe Baịbụl kwuru. Ihe ọzọ bụ na Ekwensu, bụ́ onye na-achị ụwa a, ma na ụfọdụ ndị ga-ekwe ka “nchegbu nke usoro ihe a” mee ka ha kwụsị ife Jehova. (Mat. 13:22; 1 Jọn 5:19) Ọ bụ ya mere na ọ naghị eju anyị anya na ihe anyị na-ahụ n’ụwa taa bụ ihe ndị na-eme ka mmadụ na-echegbu onwe ya.

4. Gịnị ka nsogbu ndị kpụ ọkụ n’ọnụ nwere ike ime ka anyị na-eme?

4 Nsogbu ndị kpụ ọkụ n’ọnụ nwere ike ime ka anyị na-echegbu onwe anyị. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịna-echegbu onwe anyị na anyị agaghị enweta ego ga-ezuru anyị igbo mkpa anyị, ma ọ bụ na ọrịa ga-eme ka anyị ghara ịna-aga ọrụ ma ọ bụkwanụ mee ka a chụọ anyị n’ọrụ. Anyị nwekwara ike ịna-echegbu onwe anyị na anyị nwere ike imebi iwu Chineke ma a nwaa anyị ọnwụnwa. N’oge na-adịghị anya, Ekwensu ga-eme ka ndị ọ na-achị bịa ịlụso ndị Chineke ọgụ. Anyị nwere ike ịna-echegbu onwe anyị gbasara ihe anyị ga-eme ma ha bịa ịlụso anyị ọgụ. Anyị nwere ike ịna-eche, sị: ‘Ọ̀ dị njọ ma m na-eche gbasara ihe ndị a?’

5. Gịnị ka Jizọs bu n’obi mgbe ọ sịrị: “Kwụsịnụ ichegbu onwe unu”?

5 Anyị ma na Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Kwụsịnụ ichegbu onwe unu.” (Mat. 6:25) Ihe a ọ̀ pụtara na Jizọs anaghị atụ anya na anyị ga-echegbu onwe anyị gbasara ihe ọ bụla? Mba. A sị ka e kwuwe, ụfọdụ ndị fere Jehova n’oge ochie chegburu onwe ha gbasara ihe ụfọdụ. Nke a emeghịkwa ka ha na Jehova ghara ịdị ná mma. * (1 Eze 19:4; Ọma 6:3) Ihe mere Jizọs ji kwuo ihe a bụ iji mee ka obi sie anyị ike. Ọ chọghị ka anyị kwe ka nchegbu maka ihe ndị e ji ebi ndụ kpaa ofufe anyị na-efe Jehova aka ọjọọ. Oleezi ihe anyị ga-eme ma nsogbu ndị nwere ike ime ka anyị chegbuwe onwe anyị bịara anyị?—Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Otú Ị Ga-esi Eme Ya.”

IHE ISII GA-ENYE AKA MEE KA OBI NA-ERU ANYỊ ALA

A ga-akọwa ya na paragraf nke 6 *

6. Dị ka e kwuru ná Ndị Filipaị 4:6, 7, gịnị nwere ike ime ka anyị gharazie ịna-echegbu onwe anyị?

6 (1Na-ekpe ekpere mgbe niile. Ọ bụrụ na Onye Kraịst enwee nsogbu, obi nwere ike iru ya ala ma o si n’ala ala obi ya rịọ Jehova ka o nyere ya aka. (1 Pita 5:7) Otú Jehova nwere ike isi za ekpere anyị bụ inye anyị “udo nke Chineke nke karịrị echiche niile.” (Gụọ Ndị Filipaị 4:6, 7.) Jehova na-eji mmụọ nsọ ya dị ike eme ka anyị gharazie ịna-echegbu onwe anyị.—Gal. 5:22.

7. Olee ihe anyị kwesịrị ime ma anyị na-ekpe ekpere?

7 I kpewe ekpere, gwa Jehova otú obi dị gị. Gwa ya kpọmkwem ihe bụ́ mkpa gị nakwa otú ọ dị gị n’obi. Ọ bụrụ na o nwere ihe a ga-emeli gbasara nsogbu ahụ, rịọ ya ka o nye gị amamihe ka ị chọpụta ihe ị ga-eme gbasara ya, nyekwa gị ike ị ga-eji eme ya. Ọ bụrụkwanụ na e nweghị ihe a ga-emeli gbasara nsogbu ahụ, rịọ Jehova ka o nyere gị aka ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị gbasara ya. Ọ bụrụ na ị na-akpọ okwu aha ma i kpewe ekpere, ị ga-achọpụta mgbe Jehova zara gị ekpere ahụ. Ma a zaghị gị ekpere ahụ ozugbo, akwụsịla ịrịọ Jehova ka o nyere gị aka. Ihe Jehova chọrọ abụghị naanị ka ị gwa ya kpọmkwem ihe bụ́ mkpa gị n’ekpere, ọ chọkwara ka ị nọgide na-ekpe ekpere gbasara ya.—Luk 11:8-10.

8. Gịnị ka anyị kwesịrị ịna-ekpe n’ekpere anyị?

8 Ị gwawa Jehova ihe bụ́ nsogbu gị, hụ na i kelere ya maka ihe ndị o meere gị. Anyị kwesịrị ịna-echeta ihe ọma ndị Jehova na-emere anyị, ma mgbe anyị nọ n’ezigbo nsogbu. Ọ bụrụ na e nwere mgbe ị na-amaghị ihe ị ga-ekwu ma i kpewe ekpere, cheta na Jehova ga-aza gị ekpere ma ọ bụrụgodị na naanị ihe ị gwara ya bụ, ‘Biko, nyere m aka.’—2 Ihe 18:31; Rom 8:26.

A ga-akọwa ya na paragraf nke 9 *

9. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ụjọ bịa anyị?

9 (2Tụkwasị Jehova obi, ọ bụghị onwe gị. N’oge Aịzaya onye amụma, ụjọ bịara ndị Juu n’ihi na ndị Asiria chọrọ ịbịa lụso ha ọgụ. Ha achọghị ka ndị Asiria merie ha. N’ihi ya, ha gakwuuru ndị Ijipt ka ha nyere ha aka. (Aịza. 30:1, 2) Jehova dọrọ ha aka ná ntị na obi ahụ ha tụkwasịrị ndị Ijipt ga-akpatara ha nsogbu. (Aịza. 30:7, 12, 13) Jehova si n’ọnụ Aịzaya gwa ha ihe ha nwere ike ime ma ụjọ bịa ha. Ọ sịrị: “Unu ga-adị ike naanị site n’ịnọrọ jụụ na ịtụkwasị [Jehova] obi.”—Aịza. 30:15b.

10. Olee oge ndị anyị nwere ike igosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi?

10 Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi? Ka anyị tụlee ihe atụ ụfọdụ. Ka e were ya na e nyere gị ọrụ ga na-akwụta gị ụgwọ, ma ọ ga-eme ka ị ghara inwe ohere ị ga-eji na-eme ihe ndị ị na-emebu n’ofufe Jehova. Ma ọ bụ na e nwere onye ọrụ unu na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị chọrọ ka gị na ya kpawa, ma ọ bụghị Onyeàmà Jehova. Ma ọ bụkwanụ were ya na onye ezinụlọ unu gị na ya dị n’ezigbo mma sịrị gị na ọ bụrụ na ị kwụsịghị ife Jehova, gị na ya esee. O doro anya na ọ gaghị adịrị gị mfe ikpebi ihe ị ga-eme n’ihe ndị a niile. Ma, Jehova ga-enyere gị aka ịma ihe ị ga-eme. (Mat. 6:33; 10:37; 1 Kọr. 7:39) Ajụjụ bụzi, Ị̀ ga-atụkwasị Jehova obi ma mee ihe ọ gwara gị?

A ga-akọwa ya na paragraf nke 11 *

11. Olee akụkọ Baịbụl ndị anyị nwere ike ịmụ ka anyị nwee ike ịnọrọ jụụ mgbe a na-akpagbu anyị?

11 (3Mụta ihe n’akụkọ ndị mere ihe ọma na ndị mere ihe ọjọọ. Na Baịbụl, anyị ga-ahụ ọtụtụ akụkọ gosiri na ọ dị mkpa ka anyị nọrọ jụụ ma tụkwasị Jehova obi ma anyị nọrọ ná nsogbu. Ka ị na-amụ gbasara akụkọ ndị ahụ, chọpụta ihe nyeere ndị ohu Jehova aka ịnọrọ jụụ mgbe mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ bịaara ha. Dị ka ihe atụ, mgbe ụlọikpe kacha elu ndị Juu gwara ndịozi Jizọs ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma, ụjọ atụghị ha. Kama, ha katara obi kwuo, sị: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.” (Ọrụ 5:29) Mgbe a pịachakwara ha ihe, ha atụghị ụjọ. N’ihi gịnị? N’ihi na ha ma na Jehova nọnyeere ha. Ihe ha masịkwara ya. Ọ bụ ya mere na ha akwụsịghị ikwusa ozi ọma. (Ọrụ 5:40-42) Mgbe a chọkwara igbu Stivin, obi ruru ya ala, ihu ya adị ka “ihu mmụọ ozi.” (Ọrụ 6:12-15) N’ihi gịnị? N’ihi na obi siri ya ike na ihe ya masịrị Jehova.

12. Dị ka e kwuru na 1 Pita 3:14; 4:14, gịnị mere obi nwere ike iji na-adị anyị ụtọ mgbe a na-akpagbu anyị?

12 O doro ndịozi Jizọs anya na Jehova nọnyeere ha. O nyere ha ike ịrụ ọrụ ebube. (Ọrụ 5:12-16; 6:8) Ma, ọ bụghị otú ọ dị anyịnwa taa. N’agbanyeghị ya, Jehova si n’Okwu ya na-eme ka obi sie anyị ike na ọ bụrụ na anyị ana-ata ahụhụ n’ihi na anyị na-eme ezi omume, obi dị ya ụtọ n’ebe anyị nọ, mmụọ ya nọnyekwaara anyị. (Gụọ 1 Pita 3:14; 4:14.) N’ihi ya, kama ịnọ na-eche gbasara ihe anyị ga-eme ma mkpagbu bịara anyị n’ọdịnihu, anyị kwesịrị ilekwasị anya n’ime ka obi sie anyị ike na Jehova ga-anọnyere anyị ma napụta anyị. Anyị kwesịrị ịtụkwasị nkwa Jizọs obi otú ahụ ndị na-eso ụzọ ya mere. Jizọs kwere anyị nkwa, sị: “M ga-eme ka unu nwee ọnụ na amamihe, nke ndị niile na-emegide unu na-agaghị enwe ike iguzogide ma ọ bụ ịgbagha.” Ọ gwakwara anyị, sị: “Unu ga-esite n’ịtachi obi nweta mkpụrụ obi unu.” (Luk 21:12-19) Echefukwala na Jehova na-echeta ihe niile gbasara ohu ya ọ bụla fegidere ya ruo ọnwụ. Ọ ga-eji ihe ndị ahụ ọ na-echeta gbasara onye ahụ kpọlite ya.

13. Olee uru ịmụ gbasara akụkọ ndị na-anọghị jụụ ma gharakwa ịtụkwasị Jehova obi ga-abara anyị?

13 Anyị nwekwara ike ịmụta ihe n’akụkọ ndị na-anọghị jụụ ma gharakwa ịtụkwasị Jehova obi. Ịmụ banyere ha ga-enyere anyị aka ịghara ime ihe ndị ha mere. Dị ka ihe atụ, mgbe Eze Esa malitere ịchị, ọ tụkwasịrị Jehova obi mgbe ìgwè ndị agha bịara ịlụso ya ọgụ, Jehova gọzikwara ya ma mee ka o merie. (2 Ihe 14:9-12) Ma, mgbe Eze Beasha nke Izrel du ndị agha dị obere karịa ndị agha nke mbụ bịa ịlụso Eze Esa ọgụ, Eze Esa kwụrụ ndị Siria ụgwọ ka ha bịa nyere ya aka kama ịgakwuru Jehova ka o nyere ya aka otú ahụ o mere n’oge gara aga. (2 Ihe 16:1-3) Mgbe ọ dara ezigbo ọrịa ná ngwụcha ndụ ya, ọ gakwurughị Jehova ka o nyere ya aka.—2 Ihe 16:12.

14. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Esa mejọrọ?

14 Ná mmalite, Esa gakwuuru Jehova mgbe nsogbu bịaara ya. Ma, ka oge na-aga, o kweghịzi agakwuru Jehova ka o nyere ya aka. Ọ họọrọ iji aka ya dozie nsogbu ya. N’anya mmadụ, otú ahụ Esa gakwuuru ndị Siria ka ha nyere ya aka yiri ihe kacha mma ime. Ma, o mere ka udo ghara ịdị na Juda ruo ọtụtụ afọ. Jehova si n’ọnụ otu onye amụma gwa ya, sị: “Ebe ọ bụ na ị dabeere n’ebe eze Siria nọ, ị dabereghị n’ebe Jehova bụ́ Chineke gị nọ, n’ihi ya, ndị agha eze Siria agbapụwo n’aka gị.” (2 Ihe 16:7) Anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara iche na anyị ma otú anyị ga-esi dozie nsogbu anyị n’onwe anyị kama ịgakwuru Jehova ka o jiri Okwu ya bụ́ Baịbụl nyere anyị aka. Anyị kwesịrị ịnọrọ jụụ ma tụkwasị Jehova obi, ọ bụrụgodị mgbe anyị kwesịrị ikpebi ihe anyị ga-eme ọkụ ọkụ. Jehova ga-enyere anyị aka ime mkpebi dị mma.

A ga-akọwa ya na paragraf nke 15 *

15. Gịnị ka anyị nwere ike ime ma anyị na-agụ Baịbụl?

15 (4Bute amaokwu Baịbụl ụfọdụ n’isi. Ị na-agụ Baịbụl hụ amaokwu ndị kwuru gbasara uru ịnọ jụụ na ịtụkwasị Jehova obi bara, gbalịa bute ha n’isi. O nwere ike ịdị mma ka ị na-agụpụta ya agụpụta ma ọ bụ detuo ya n’akwụkwọ ka i nwee ike ịna-agụgharị ha. Jehova nyere Jọshụa iwu ka ọ na-agụ akwụkwọ Iwu ahụ n’olu dị ala ehihie na abalị ka o nwee ike jiri amamihe na-eme ihe. Ihe ọ gụtara n’akwụkwọ Iwu ahụ ga-enyere ya aka ka ọ ghara ịna-atụ ụjọ, nyekwara ya aka iji obi ike na-edu ndị Izrel. (Jọsh. 1:8, 9) Ọtụtụ ihe e dere na Baịbụl nwere ike ime ka obi ruo gị ala ma nsogbu ndị nwere ike ime ka i chegbuwe onwe gị bịara gị.—Ọma 27:1-3; Ilu 3:25, 26.

A ga-akọwa ya na paragraf nke 16 *

16. Olee otú Jehova si eji ụmụnna nọ n’ọgbakọ enyere anyị aka ka anyị nọrọ jụụ ma tụkwasị ya obi?

16 (5Gị na ndị na-efe Chineke na-akpakọrịta. Jehova na-eji ụmụnna anyị enyere anyị aka ka anyị nọrọ jụụ ma tụkwasị ya obi. N’ọmụmụ ihe anyị, anyị na-amụta ọtụtụ ihe n’okwu ndị a na-ekwu, ajụjụ ụmụnna anyị na-aza, nakwa ma anyị na ụmụnna anyị na-akparịta ụka. (Hib. 10:24, 25) Ọ bụrụkwa na anyị akọọrọ ụmụnna ndị anyị tụkwasịrị obi n’ọgbakọ nsogbu anyị, obi ga-eru anyị ala. “Okwu ọma” enyi anyị gwara anyị nwere ike inyere anyị aka mee ka anyị gharazie ịna-echegbu onwe anyị.—Ilu 12:25.

A ga-akọwa ya na paragraf nke 17 *

17. Dị ka e kwuru ná Ndị Hibru 6:19, olee otú olileanya anyị nwere ike isi mee ka obi ruo anyị ala n’oge nsogbu?

17 (6Mee ka obi sie gị ike n’olileanya gị. Olileanya anyị dị ka “arịlịka maka mkpụrụ obi.” Ọ na-eme ka obi ruo anyị ala mgbe nsogbu bịaara anyị ma ọ bụ mgbe anyị na-echegbu onwe anyị. (Gụọ Ndị Hibru 6:19.) Chee gbasara nkwa Jehova kwere na n’ọdịnihu, ihe ọ bụla na-echegbu anyị ga-ala ka naị. (Aịza. 65:17) Na-eche gbasara otú ọ ga-adị ma ị nọrọ n’ụwa ọhụrụ ebe nsogbu na-adịghịzi. (Maị. 4:4) Ọ bụrụ na ị na-akọrọ ndị ọzọ gbasara olileanya gị, ọ ga-eme ka obi sie gị ike na ọ ga-emezu. Gbalịa mee ike gị niile n’ikwusa ozi ọma na ime ka ndị mmadụ ghọọ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Ị na-eme otú ahụ, ị ga-enwe “obi ike zuru ezu n’olileanya ahụ ruo ọgwụgwụ.”—Hib. 6:11.

18. Olee nsogbu ndị anyị nwere ike ịtụ anya ha n’ọdịnihu, gịnị ga-enyekwara anyị aka idi ha?

18 Ka ụwa ochie a na-agba egwú ụla ya, ọtụtụ nsogbu ndị nwere ike ime ka anyị chegbuwe onwe anyị ga-abịara anyị. Isiokwu nke afọ 2021 ga-enyere anyị aka idi nsogbu ndị ahụ ma tụkwasị Jehova obi na ọ ga-enyere anyị aka ịnọrọ jụụ, ọ bụghị ịtụkwasị onwe anyị obi. N’afọ 2021, ka ihe niile anyị ga-eme gosi na anyị nwere okwukwe ná nkwa Jehova kwere anyị nke bụ́: “Unu ga-adị ike naanị site n’ịnọrọ jụụ na ịtụkwasị m obi.”Aịza. 30:15.

ABỤ NKE 8 Jehova Bụ Ebe Mgbaba Anyị

^ par. 5 Isiokwu afọ 2021 gosiri na ọ dị ezigbo mkpa ka anyị tụkwasị Jehova obi ma nsogbu ndị nwere ike ime ka anyị na-echegbu onwe anyị bịara anyị, ma ugbu a ma n’ọdịnihu. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú anyị ga-esi eme ihe e kwuru n’isiokwu afọ a.

^ par. 5 Ụfọdụ ụmụnna anyị na oké nchegbu ma ọ bụ oké ụjọ na-alụ. Ụdị nsogbu a bụ nnukwu ọrịa. Ọ bụghịkwa ụdị nchegbu a ka Jizọs na-ekwu okwu ya.

^ par. 63 NKỌWA FOTO: (1) Ebe otu nwanna nwaanyị na-ekpesi ekpere ike gbasara nsogbu o nwere n’ụbọchị ahụ niile.

^ par. 65 NKỌWA FOTO: (2) Ebe ọ na-agụ Baịbụl n’oge ezumike n’ebe ọrụ ya ka o nweta amamihe.

^ par. 67 NKỌWA FOTO: (3) Ebe ọ na-eche gbasara ndị mere ihe ọma na ndị mere ihe ọjọọ na Baịbụl.

^ par. 69 NKỌWA FOTO: (4) Ebe ọ na-amapawa amaokwu Baịbụl ọ chọrọ ibute n’isi na friji ya.

^ par. 71 NKỌWA FOTO: (5) Ebe obi na-atọ ya ụtọ mgbe ya na enyi ya nọ n’ozi ọma.

^ par. 73 NKỌWA FOTO: (6) Ebe ọ na-eche gbasara ihe ga-eme n’ọdịnihu, ya ana-eme ka obi sikwuo ya ike n’olileanya o nwere.