Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 3

Oké Ìgwè Mmadụ Ndị So n’Atụrụ Ọzọ Na-eto Chineke na Kraịst

Oké Ìgwè Mmadụ Ndị So n’Atụrụ Ọzọ Na-eto Chineke na Kraịst

“Nzọpụta anyị si n’aka Chineke anyị, bụ́ onye nọ ọdụ n’ocheeze ahụ, nakwa n’aka Nwa Atụrụ ahụ.”—MKPU. 7:10.

ABỤ NKE 14 Anyị Na-eto Eze Ọhụrụ nke Ụwa

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị mere mgbe otu nwa okorobịa gechara okwu e kwuru n’otu mgbakọ e mere n’afọ 1935?

E NWERE otu nwa okorobịa dị afọ iri na asatọ mgbe e mere ya baptizim n’afọ 1926. Nne na nna ya bụ Ndị Mmụta Baịbụl, bụ́ aha a na-akpọ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ. Ha mụrụ ụmụ nwoke atọ na ụmụ nwaanyị abụọ. Ha zụkwara ha ka ha bụrụ ndị na-efe Chineke na ndị na-eṅomi Jizọs Kraịst. N’oge ahụ, nwa okorobịa ahụ so Ndị Mmụta Baịbụl niile na-ata achịcha ma na-aṅụ mmanya e ji echeta ọnwụ Jizọs kwa afọ. Ma, ihe gbanwere ná ndụ ya mgbe o gere otu okwu dere ude isiokwu ya bụ “Oké Ìgwè Mmadụ Ahụ.” Ọ bụ Nwanna J. F. Rutherford kwuru okwu a n’otu mgbakọ e nwere na Wọshịntịn D.C., dị n’Amerịka, n’afọ 1935. Olee ihe ọhụrụ a kọwaara Ndị Mmụta Baịbụl ná mgbakọ ahụ?

2. Olee eziokwu na-eme obi ụtọ Nwanna Rutherford kọwara?

2 Mgbe Nwanna Rutherford na-ekwu okwu ná mgbakọ ahụ, ọ kọwara ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ e kwuru gbasara ha ná Mkpughe 7:9. Tupu mgbe ahụ, Ndị Mmụta Baịbụl chere na oké ìgwè mmadụ ahụ ga-aga eluigwe, ma ezi omume ha eruchaghị ka nke ndị e tere mmanụ. Nwanna Rutherford ji Akwụkwọ Nsọ mee ka o doo anya na oké ìgwè mmadụ ahụ abụghị ndị ga-aga eluigwe, kama na ha bụ atụrụ ọzọ * Kraịst ga-agafe “oké mkpagbu” ma dịrị ndụ n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. (Mkpu. 7:14) Jizọs kwuru, sị: “Enwekwara m atụrụ ọzọ, ndị na-anọghị n’ogige atụrụ a; m ga-akpọtakwa ha, ha ga-ege ntị n’olu m, ha ga-aghọ otu ìgwè atụrụ, nweekwa otu onye ọzụzụ atụrụ.” (Jọn 10:16) Ndị a yiri atụrụ bụ Ndịàmà Jehova kwesịrị ntụkwasị obi nwere olileanya ibi na Paradaịs n’elu ụwa. (Mat. 25:31-33, 46) Ka anyị lee otú nkọwa a si gbanwee ndụ ọtụtụ ndị Jehova, ma nke nwa okorobịa ahụ dị afọ iri na asatọ.—Ọma 97:11; Ilu 4:18.

IHE ỌHỤRỤ A GHỌTARA GBANWERE NDỤ ỌTỤTỤ PUKU MMADỤ

3-4. Olee ihe ọtụtụ puku mmadụ chọpụtara gbasara olileanya ha n’afọ 1935? N’ihi gịnịkwa?

3 Mgbe Nwanna Rutherford nọ na-ekwu okwu ná mgbakọ ahụ, o nwere ihe merenụ mgbe o kwuru, sị: “Biko, ka ndị niile nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa bilie ọtọ.” Otu onye nọ ebe ahụ mgbe ihe ahụ mere kwuru na mgbe o kwuchara ihe ahụ, ihe karịrị ọkara n’ime puku mmadụ iri abụọ bịara mgbakọ ahụ biliri ọtọ. Nwanna Rutherford kwuziri, sị: “Leenụ oké ìgwè mmadụ ahụ.” Mgbe o kwuchara ihe a, ndị nọ ebe ahụ ji obi ụtọ tie mkpu. Ndị biliri ọtọ ghọtara na a họrọghị ha ịga eluigwe. Ha ma na e jighị mmụọ nsọ Chineke tee ha mmanụ. N’echi ya, e mere narị mmadụ asatọ na iri anọ baptizim, ọtụtụ n’ime ha sokwa n’atụrụ ọzọ ahụ.

4 Mgbe e kwuchara okwu ahụ, nwa okorobịa ahụ anyị kwuburu gbasara ya na ọtụtụ puku ndị ọzọ kwụsịrị ịṅụ mmanya na ịta achịcha e ji echeta ọnwụ Jizọs. Otu nwanna nwoke kwuru ihe dị ọtụtụ ndị n’obi. Ọ sịrị: “Ncheta Ọnwụ Jizọs e mere n’afọ 1935 bụ mgbe ikpeazụ m tara achịcha ma ṅụọ mmanya e ji echeta ọnwụ Jizọs. Ihe kpatara ya bụ na m ghọtara na Jehova ejibeghị mmụọ nsọ ya tee m mmanụ ịga eluigwe. Kama, enwere m olileanya ibi n’ụwa ebe a ma soro mee ka ọ ghọọ Paradaịs.” (Rom 8:16, 17; 2 Kọr. 1:21, 22) Kemgbe ahụ, ọnụ ọgụgụ oké ìgwè mmadụ ahụ na-agbago n’ike n’ike. Ha na ndị e tere mmanụ ka nọ ndụ n’ụwa na-arụkọkwa ọrụ.

5. Olee otú Jehova si ewere ndị kwụsịrị ịta achịcha na ịṅụ mmanya e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs?

5 Olee otú Jehova si were ndị kwụsịrị ịta achịcha na ịṅụ mmanya e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs mgbe afọ 1935 gachara? Ọ bụrụkwanụ na Onyeàmà Jehova na-ata achịcha ma na-aṅụ mmanya e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs emechaa chọpụta na e teghị ya mmanụ? (1 Kọr. 11:28) E nwere ụfọdụ ndị na-ata achịcha ma na-aṅụ mmanya e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs n’ihi na ha amaghị ma hà nwere olileanya ịga eluigwe ma ọ bụkwanụ ibi n’ụwa. Ma, ọ bụrụ na ha aghọta na ha ekwesịghị ịna-ata achịcha ma ọ bụ na-aṅụ mmanya e ji na-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs, kwụsị ya, ma jiri obi ha niile na-efe Jehova, Jehova ga-anabata ha, ha esoro n’atụrụ ọzọ ahụ. N’agbanyeghị na ha anaghịzi ata achịcha ma ọ bụ na-aṅụ mmanya e ji na-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs, ha ka ga na-abịa Ncheta Ọnwụ Jizọs, n’ihi na obi dị ha ụtọ maka ihe Jehova na Jizọs meere ha.

OLILEANYA MAGBURU ONWE YA

6. Gịnị ka Jizọs gwara ndị mmụọ ozi ka ha mee?

6 Ebe ọ bụ na oké mkpagbu ga-amalite n’oge na-adịghị anya, ọ ga-adị mma ka anyị tụlee ihe ndị ọzọ Mkpughe isi nke asaa kwuru gbasara ndị e tere mmanụ na oké ìgwè mmadụ ndị so n’atụrụ ọzọ ahụ. Jizọs gwara ndị mmụọ ozi ka ha jidesie ifufe anọ nke ụwa ike ka ha ghara imebi ụwa. Ha ga-ejidesi ya ike ruo mgbe a kachara ndị niile e tere mmanụ akara n’egedege ihu ha. (Mkpu. 7:1-4) Ihe ga-abụ ụgwọ ọrụ ụmụnna Kraịst ndị a e tere mmanụ n’ihi ikwesị ntụkwasị obi ha bụ na Jehova ga-eme ka ha bụrụ ndị eze na ndị nchụàjà n’eluigwe. (Mkpu. 20:6) Ọ na-agụsi Jehova, Jizọs, na ndị mmụọ ozi agụụ ike ịhụ ka otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ahụ nwetara ụgwọ ọrụ ha n’eluigwe.

Ebe oké ìgwè mmadụ guzo n’ihu ocheeze Chineke dị ebube nakwa n’ihu Nwa Atụrụ ahụ. Ha yi uwe mwụda na-acha ọcha, jirikwa igu nkwụ n’aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)

7. Dị ka e kwuru ná Mkpughe 7:9, 10, ole ndị ka Jọn hụrụ n’ọhụụ, gịnịkwa ka ha na-eme? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

7 Mgbe Jọn kwuchara gbasara ndị eze na ndị nchụàjà ahụ dị otu narị puku na iri puku anọ na puku anọ, ọ hụkwara ihe ọzọ mere ya obi ụtọ. Ọ hụrụ “oké ìgwè mmadụ” gafere Amagedọn. Ndị nke a dị iche ná ndị mbụ ahụ. Ndị nke a buru ibu, a gaghịkwa agụtali ha ọnụ. (Gụọ Mkpughe 7:9, 10.) Ha “yi uwe mwụda na-acha ọcha,” nke pụtara na ha enweghị ntụpọ ọ bụla n’ụwa Setan a, nakwa na ha nọgidere na-erubere Chineke na Kraịst isi. (Jems 1:27) Ha na-eti mkpu na a zọpụtala ha n’ihi ihe Jehova na Jizọs bụ́ Nwa Atụrụ Chineke meere ha. Ha jikwa igu nkwụ n’aka ha, nke gosiri na ha ji obi ụtọ nabata Jizọs ka eze Jehova họpụtara.—Tụlee Jọn 12:12, 13.

8. Gịnị ka Mkpughe 7:11, 12 gwara anyị gbasara ndị nọ n’eluigwe?

8 Gụọ Mkpughe 7:11, 12. Gịnị ka ndị nọ n’eluigwe mere mgbe ha hụrụ oké ìgwè mmadụ ahụ? Jọn hụrụ ka ndị niile nọ n’eluigwe ṅụrịrị ọṅụ ma na-eto Chineke mgbe ha hụrụ oké ìgwè mmadụ ahụ. Ndị niile nọ n’eluigwe ga-enwe obi ụtọ mgbe ha ga-ahụ ka ihe a na-emezu, mgbe oké ìgwè mmadụ ahụ ga-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta.

9. Dị ka e kwuru ná Mkpughe 7:13-15, gịnị ka oké ìgwè mmadụ ahụ na-eme taa?

9 Gụọ Mkpughe 7:13-15. Jọn kwuru na oké ìgwè mmadụ ahụ ‘asaala uwe mwụda ha, meekwa ka ọ na-acha ọcha n’ime ọbara nwa atụrụ ahụ.’ Nke ahụ pụtara na ha nwere ezigbo akọnuche, nakwa na ihe ha dị Jehova ezigbo mma. (Aịza. 1:18) Ha bụ Ndị Kraịst nyefere Chineke onwe ha, e meekwa ha baptizim. Ha nwere okwukwe siri ike n’àjà Jizọs chụrụ. Ha na Jehova dịkwa n’ezigbo mma. (Jọn 3:36; 1 Pita 3:21) Ọ bụ ihe ndị a mere ka ha ruo eru iguzo n’ihu ocheeze Chineke, “na-ejekwara ya ozi dị nsọ ehihie na abalị” n’ụwa ebe a. Taa, ọ bụ ha na-arụ ọrụ kachanụ n’ikwusa ozi ọma na ime ndị na-eso ụzọ. Ha na-ebute ihe gbasara Alaeze Chineke ụzọ ná ndụ ha.—Mat. 6:33; 24:14; 28:19, 20.

Oké ìgwè mmadụ ndị so n’atụrụ ọzọ ahụ ji obi ụtọ si n’oké mkpagbu ahụ pụta (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)

10. Olee ihe obi siri oké ìgwè mmadụ ahụ ike na ya? Oleekwa nkwa ha ga-ahụ mgbe ọ na-emezu?

10 Obi siri oké ìgwè mmadụ ahụ ga-esi n’oké mkpagbu pụta ike na Jehova bụ́ Chineke ga na-elekọta ha n’ihi na “Onye ahụ nke nọ ọdụ n’ocheeze ahụ ga-agbasakwa ụlọikwuu ya n’isi ha.” A ga-emezukwa nkwa ahụ ndị so n’atụrụ ọzọ ahụ nọ na-atụ anya ya, nke bụ́ na “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.”—Mkpu. 21:3, 4.

11-12. (a) Dị ka e kwuru ná Mkpughe 7:16, 17, olee ngọzi oké ìgwè mmadụ ahụ ga-enweta? (b) Gịnị ka ndị so n’atụrụ ọzọ ahụ nwere ike ime ná Ncheta Ọnwụ Jizọs, n’ihi gịnịkwa?

11 Gụọ Mkpughe 7:16, 17. Ka ọ dị ugbu a, agụụ na-anyụ ụfọdụ ndị Jehova anya n’ihi ihe isi ike, ọgba aghara, na agha. E nwekwara ndị ọzọ a tụrụ mkpọrọ n’ihi okwukwe ha. Ma, oké ìgwè mmadụ ahụ ma na ọ bụrụ na ha alanahụ mbibi ụwa ọjọọ Ekwensu a, nri agaghị akọ ha, Jehova ga na-akụzikwara ha ihe. Mgbe a ga-ebibi ụwa ọjọọ Setan a, oké ìgwè mmadụ agaghị eso ndị mba ọzọ taa ahụhụ oké iwe Jehova nke e ji tụnyere oké okpomọkụ. Oké mkpagbu ahụ gachaa, Jizọs ga-eduru ndị gafere ya gaa “n’isi iyi nke mmiri nke ndụ” ebighị ebi. Chetụdịnụ echiche, oké ìgwè mmadụ ga-enwe olileanya magburu onwe ya. N’ime ọtụtụ ijeri mmadụ birila ndụ n’ụwa, ọ bụ ha bụ ndị nwere ike ha agaghị edetụ ọnwụ ire.—Jọn 11:26.

12 Ndị so n’atụrụ ọzọ ahụ nwere olileanya magburu onwe ya ha ji maka ya na-ekele Jehova na Jizọs. A họrọghị ha ịga eluigwe. Ma, nke a emeghị ka ha ghara ịdị oké ọnụ ahịa n’anya Jehova. Ma ndị e tere mmanụ ma ndị so n’atụrụ ọzọ nwere ike ịna-eto Chineke na Kraịst. Otu ụzọ ha si eme ya bụ ịga Ncheta Ọnwụ Jizọs.

JIRI OBI GỊ NIILE TOO CHINEKE N’OGE NCHETA ỌNWỤ JIZỌS

Achịcha na mmanya a na-ebugharị ná Ncheta Ọnwụ Jizọs na-echetara anyị na Jizọs nwụrụ ka anyị nwee ike ịdị ndụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13 ruo na nke 15)

13-14. Gịnị mere ndị e tere mmanụ ka fọrọ ndụ n’ụwa na ndị so n’atụrụ ọzọ ahụ ji aga Ncheta Ọnwụ Jizọs?

13 Kemgbe afọ ole na ole ugbu a, n’ime otu puku mmadụ ọ bụla bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs, ọ bụ naanị ihe dị ka otu onye na-ata achịcha ma na-aṅụ mmanya e ji echeta ọnwụ Jizọs. N’ọtụtụ ọgbakọ, e nweghị onye na-ata achịcha ma na-aṅụ mmanya e ji echeta ọnwụ Jizọs. Ọtụtụ ndị na-abịa Ncheta Ọnwụ Jizọs nwere olileanya ibi n’ụwa. Oleezi ihe mere ha ji na-aga Ncheta Ọnwụ Jizọs? Ihe mere ha ji aga ya bụkwa otu ihe ahụ mere mmadụ ji aga agbamakwụkwọ enyi ya. Ndị mmadụ na-aga agbamakwụkwọ enyi ha n’ihi na ha hụrụ ha n’anya, chọọkwa ịkwado ha. Ndị so n’atụrụ ọzọ ahụ na-agakwa Ncheta Ọnwụ Jizọs n’ihi na ha chọrọ igosi na ha hụrụ Jizọs na ndị e tere mmanụ n’anya ma na-akwado ha. Ihe ọzọ mekwara ha ji aga ya bụ na ha chọrọ igosi obi ụtọ ha nwere maka àjà Jizọs Kraịst chụrụ nke mere ha ji nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa.

14 Ihe ọzọ dị mkpa mere ndị so n’atụrụ ọzọ ji aga Ncheta Ọnwụ Jizọs bụ ka ha rube isi n’iwu Jizọs nyere. Mgbe Jizọs na ndịozi ya na-eri Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị nke mbụ, ọ gwara ha, sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” (1 Kọr. 11:23-26) Ndị so n’atụrụ ọzọ ka na-aga Ncheta Ọnwụ Jizọs n’ihi na ndị e tere mmanụ ka fọrọ n’ụwa. Ha na-akpọdị mmadụ niile ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs.

15. Gịnị ka anyị ga-eme iji too Chineke na Kraịst ná Ncheta Ọnwụ Jizọs?

15 Ná Ncheta Ọnwụ Jizọs, anyị na-enwe ohere ito Chineke mgbe anyị na-abụ abụ na mgbe a na-ekpe ekpere. Isiokwu a ga-ekwu ná Ncheta Ọnwụ Jizọs nke afọ a bụ “Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Ihe Chineke na Kraịst Meere Gị.” Ọ ga-eme ka obi na-adịkwu anyị ụtọ maka ihe Jehova na Kraịst meere anyị. Ka a na-ebugharị achịcha na mmanya ahụ, onye na-ekwu okwu ga-echetara anyị na ha nọchiri anya anụ ahụ́ na ọbara Jizọs. Anyị ga-echeta na Jehova kwere ka Ọkpara ya nwụọ ka anyị nwee ike ịdị ndụ. (Mat. 20:28) Onye ọ bụla hụrụ Nna anyị nke eluigwe na Ọkpara ya n’anya ga-achọ ịbịa Ncheta Ọnwụ Jizọs.

NA-EKELE JEHOVA MAKA OLILEANYA O MERE KA ANYỊ NWEE

16. Olee ụzọ dị iche iche ndị e tere mmanụ na atụrụ ọzọ ahụ si yie?

16 Ihe mere ndị e tere mmanụ ji dị iche n’atụrụ ọzọ ahụ abụghị na ha bara uru karịa n’anya Jehova. Jehova ji ha niile kpọrọ ihe. A sị ka e kwuwe, ọ bụ otu ọbara Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya ka o ji zụta ma ndị e tere mmanụ ma atụrụ ọzọ ahụ. Ihe dị iche na ha abụọ bụ na olileanya ha dị iche. Ha abụọ kwesịrị ịnọgide na-erubere Chineke na Kraịst isi. (Ọma 31:23) Chetakwa na otú Chineke si enye ndị e tere mmanụ mmụọ nsọ ka o sikwa enye atụrụ ọzọ ahụ mmụọ nsọ. Ihe ọ pụtara bụ na Jehova na-enye onye nke ọ bụla n’ime anyị mmụọ nsọ dị ya mkpa.

17. Olee ihe ndị e tere mmanụ na-atụsi anya ya ike?

17 Ndị Kraịst e tere mmanụ enweghị olileanya ịga eluigwe mgbe a mụrụ ha. Ọ bụ Chineke na-etinye ya n’obi ha. Ha na-eche gbasara olileanya ha nwere, na-ekpe ekpere gbasara ya, na-atụsikwa anya ike mgbe ha ga-enweta ụgwọ ọrụ ha n’eluigwe. Ha amaghị otú ahụ́ ha ga-adị n’eluigwe. (Fil. 3:20, 21; 1 Jọn 3:2) N’agbanyeghị ya, ha na-atụ anya ịhụ Jehova, Jizọs, ndị mmụọ ozi, na ndị ọzọ e tere mmanụ. Ọ na-agụsi ha agụụ ike isoro ha nọrọ n’Alaeze eluigwe.

18. Olee ihe ndị so n’atụrụ ọzọ na-atụsi anya ya ike?

18 Ndị so n’atụrụ ọzọ na-atụsi anya ike ibi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụkwa ihe na-agụ mmadụ niile agụụ. (Ekli. 3:11) Ha na-atụsi anya ike ụbọchị ha ga-eso mee ka ụwa a ghọọ paradaịs. Ha na-atụ anya mgbe ha ga-arụ ụlọ, kụọ mkpụrụ n’ubi ha, nakwa mgbe ahụ́ ga-agbasi ha na ụmụ ha ike. (Aịza. 65:21-23) Ha na-atụ anya ịga ebe dị iche iche n’ụwa: ịga n’elu ugwu, n’ime oké ọhịa, n’oké osimiri, nakwa ịmụ banyere ihe dị iche iche Jehova kere. Nke kachanụ bụ na obi na-atọ ha ezigbo ụtọ na ha na Jehova ga-anọgide na-adịkwu ná mma.

19. Olee ihe Ncheta Ọnwụ Jizọs nke afọ a ga-enye anyị ohere ime? Oleekwa mgbe a ga-eme ya?

19 Jehova emeela ka ohu ya ọ bụla nyefere ya onwe ya nwee olileanya magburu onwe ya maka ọdịnihu. (Jere. 29:11) Ncheta Ọnwụ Jizọs emeela ka anyị niile nwee ohere pụrụ iche anyị ga-eji too Chineke na Jizọs Kraịst maka ihe ọma ndị ha meere anyị ka anyị nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. O doro anya na Ncheta Ọnwụ Jizọs bụ ọmụmụ ihe kachanụ Ndị Kraịst na-enwe kwa afọ. A ga-eme ya mgbe anyanwụ dachara na Satọdee, abalị iri abụọ na asaa n’ọnwa Mach afọ 2021. Ọtụtụ ndị ga-abịa ihe omume a n’afọ a bi n’ebe ha nweere onwe ha ịbịa ya. Ndị ọzọ ga-abịa ya n’agbanyeghị na a na-akpagbu ha. E nwekwara ụfọdụ ga-anọ n’ụlọ mkpọrọ mee nke ha. Jehova, Jizọs, ndị mmụọ ozi, na ndị e tere mmanụ nọ n’eluigwe ga na-ahụ ka ọgbakọ ọ bụla, ìgwè ọ bụla, na ndị niile ga-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs nke afọ a na-eme ya. Ekpere anyị bụ ka ihe omume a gaziere anyị niile.

ABỤ NKE 150 Chọọ Chineke Ka O Chebe Gị

^ par. 5 Abalị iri abụọ na asaa n’ọnwa Mach afọ 2021 ga-abụrụ Ndịàmà Jehova ụbọchị pụrụ iche. N’anyasị ụbọchị ahụ, a ga-echeta ọnwụ Jizọs Kraịst. Ọtụtụ ndị ga-echeta ọnwụ Jizọs Kraịst so ná ndị Jizọs kpọrọ “atụrụ ọzọ.” Olee eziokwu gbara ọkpụrụkpụ Ndịàmà Jehova mụtara gbasara atụrụ ọzọ ahụ n’afọ 1935? Olee ihe na-eme obi ụtọ ndị so n’atụrụ ọzọ ahụ na-atụ anya ya ma oké mkpagbu gachaa? Olee otú ndị so n’atụrụ ọzọ ga-esi eto Chineke na Jizọs Kraịst ma ha gaa Ncheta Ọnwụ Jizọs?

^ par. 2 NKỌWAKWU: Atụrụ ọzọ ahụ bụ ndị na-eso Kraịst nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ụwa. Ụfọdụ n’ime ha malitere ife Jehova n’oge ikpeazụ a. Oké ìgwè mmadụ ahụ bụ ndị so n’atụrụ ọzọ ahụ ga-adị ndụ mgbe Kraịst ga-ekpe ndị mmadụ ikpe n’oké mkpagbu. Ha ga-adị ndụ gafee oké mkpagbu ahụ.