Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe e dere na nkume a bụ: “Onye Yahweh Sabaot bụrụ ọnụ ka Hagaf nwa Hagav bụ”

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Olee otú ihe e dere n’oge ochie si gosi na ihe e dere na Baịbụl bụ eziokwu?

E NWERE otu nkume e dere ihe na ya nke dị n’ebe a na-edebe ihe mgbe ochie aha ya bụ Bible Lands Museum, dị na Jeruselem. Mgbe e dere ihe dị na nkume ahụ bụ n’ihe dị ka afọ 700 ruo afọ 600 Tupu Oge Ndị Kraịst. E wepụtara nkume a n’otu ọgba e ji mere ili nke na-adịghị anya n’obodo Hibrọn, n’Izrel. Ihe e dere na nkume ahụ bụ: “Onye Yahweh Sabaot bụrụ ọnụ ka Hagaf nwa Hagav bụ.” Olee otú ihe a si gosi na ihe e dere na Baịbụl bụ eziokwu. O gosiri na aha Chineke, bụ́ Jehova, nke a na-eji mkpụrụ akwụkwọ Hibru oge ochie dabara ná mkpụrụ akwụkwọ bụ́ YHWH ede, bụ aha ndị mmadụ maara nke ọma ma na-akpọ n’oge e dere Baịbụl. Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe ndị ọzọ e dere n’ihe ndị e wetara n’ọgba ndị ahụ gosiri na ndị na-agbaba n’ọgba ndị ahụ iji chebe onwe ha ma ọ bụ ka ha zukọọ na ya na-edekarị aha Chineke na aha ndị mmadụ aha Chineke dị n’ime ya n’ahụ́ ọgba ndị ahụ.

Otu ọkà mmụta aha ya bụ Rachel Nabulsi na-akụzi ihe na Mahadum dị na Jọjịa kwuru gbasara ihe e dere n’ihe ndị ahụ, sị: ‘Otú mkpụrụ akwụkwọ Hibru ahụ bụ́ YHWH si gbaa ọtụtụ ugboro n’ihe ndị ahụ gosiri na ọ dị ezigbo mkpa. Ihe ndị e dere na Baịbụl nakwa n’ihe ndị ahụ gosiri otú YHWH si dị ezigbo mkpa ná ndụ ndị Izrel na ndị Juda.’ Ihe a gosiri na ihe e dere na Baịbụl bụ eziokwu, n’ihi na okwu Hibru ahụ bụ́ YHWH pụtara ọtụtụ puku ugboro na Baịbụl. Ọtụtụ mgbe, aha Chineke na-adịkarị n’aha ndị mmadụ n’oge ahụ.

Okwu ahụ bụ́ “Yahweh Sabaot,” nke e dere na nkume ahụ, pụtara “Jehova nke ụsụụ ndị agha.” O yiri ka ihe a ọ̀ na-egosi na ọ bụghị naanị aha Chineke ka ndị mmadụ maara nke ọma n’oge Baịbụl. Kama, ha makwa okwu ndị dị ka “Jehova nke ụsụụ ndị agha.” Ihe a gosikwara na “Jehova nke ụsụụ ndị agha” e dere na Baịbụl dabara adaba. E dere ya ihe karịrị ugboro narị abụọ na iri ise n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ndị kacha dee ya bụ Aịzaya, Jeremaya, na Zekaraya.