Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 2

Ihe Anyị Ga-amụta n’Aka “Onye Ahụ Na-eso Ụzọ Jizọs, Bụ́ Onye Ọ Hụrụ n’Anya”

Ihe Anyị Ga-amụta n’Aka “Onye Ahụ Na-eso Ụzọ Jizọs, Bụ́ Onye Ọ Hụrụ n’Anya”

“Ka anyị na-ahụrịta ibe anyị n’anya, n’ihi na ịhụnanya si n’aka Chineke.”—1 JỌN 4:7.

ABỤ NKE 105 “Chineke Bụ Ịhụnanya”

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee otú obi dị gị n’ihi na Chineke hụrụ anyị n’anya?

JỌN onyeozi kwuru na “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Ihe a Jọn kwuru na-echetara anyị otu eziokwu dị mkpa: Ọ bụ Chineke, Onye na-enye anyị ndụ, ka ịhụnanya sikwa n’aka. Otú o si hụ anyị n’anya na-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ, ahụ́ ana-erukwa anyị ala.

2. Dị ka e kwuru na Matiu 22:37-40, olee iwu abụọ kachanụ, gịnịkwa mere o nwere ike iji siere anyị ike idebe nke abụọ?

2 Ịhụ ndị ọzọ n’anya abụghị ihe Ndị Kraịst ga-eme ma ha chọọ. Ọ bụ iwu e nyere ha. (Gụọ Matiu 22:37-40.) Ọ bụrụ na anyị amata Jehova nke ọma, o nwere ike ịdịrị anyị mfe idebe iwu nke mbụ ahụ. Ihe kpatara ya bụ na Jehova zuru okè, ọ na-eche gbasara anyị, na-enwekwara anyị obiọma. Ma, o nwere ike isiri anyị ike idebe iwu nke abụọ ahụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ụmụnna anyị, bụ́ ndị so ná ndị kacha bụrụ ndị agbata obi anyị, ezughị okè. Mgbe ụfọdụ, ha nwere ike ikwu ma ọ bụ mee ihe na-adịghị anyị mma. Jehova ma na ụdị ihe a nwere ike ime. Ọ bụ ya mere o ji jiri mmụọ nsọ ya mee ka ụfọdụ ndị dere Baịbụl dee ihe mere anyị ji kwesị ịhụ ndị ọzọ n’anya na otú anyị ga-esi eme ya. Otu onye n’ime ndị ahụ bụ Jọn.—1 Jọn 3:11, 12.

3. Gịnị ka Jọn kwusiri okwu ike gbasara ya?

3 N’akwụkwọ ndị Jọn dere, o kwusiri okwu ike ihe mere o ji dị mkpa ka Ndị Kraịst na-ahụ ndị ọzọ n’anya. Nke bụ́ eziokwu bụ na n’ihe ndị Jọn onyeozi dere gbasara ndụ Jizọs, ugboro ole o dere okwu bụ́ “ịhụnanya” ma ọ bụ “hụrụ n’anya” karịrị ugboro ole Matiu, Mak, Luk, na Jọn dere ha ma a gụkọta ha. Jọn dị ihe dị ka otu narị afọ mgbe o dere akwụkwọ Jọn na akwụkwọ ozi atọ ndị ọzọ o dere. Akwụkwọ ndị ahụ Jọn dere gosiri na Ndị Kraịst kwesịrị iji ịhụnanya na-eme ihe niile ha na-eme. (1 Jọn 4:10, 11) Ma, o were ọtụtụ oge tupu Jọn amụta ịhụ ndị ọzọ n’anya.

4. Ọ̀ bụ mgbe niile ka Jọn gosiri ndị ọzọ ịhụnanya?

4 Ọ bụghị mgbe niile ka Jọn gosiri na ọ hụrụ ndị ọzọ n’anya n’oge ọ ka na-eto eto. Dị ka ihe atụ, e nwere mgbe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya si Sameria na-aga Jeruselem. Otu obodo na Sameria jụrụ ịnabata ha. Gịnị ka Jọn mere? Ya na nwanne ya Jems jụrụ Jizọs ma ọ̀ ga-ekwe ka ha gwa ọkụ ka o si n’eluigwe bịa repịa ndị niile bi n’obodo ahụ. (Luk 9:52-56) E nwekwara mgbe ọzọ Jọn na-egosighị ndịozi ibe ya ịhụnanya. Ya na nwanne ya Jems gwara nne ha ka ọ rịọ Jizọs ka o nye ha ọkwá dị elu n’Alaeze eluigwe. Mgbe ndịozi ndị ọzọ nụrụ ya, iwe bịara ha. (Mat. 20:20, 21, 24) Ma n’agbanyeghị ihe ndị a niile Jọn mere, Jizọs ka hụrụ ya n’anya.—Jọn 21:7.

5. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

5 N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe ndị Jọn mere na ụfọdụ ihe ndị o dere gbasara ịhụnanya. Ka anyị na-atụle ihe ndị a, anyị ga-amụta ụzọ ụfọdụ anyị ga-esi gosi ụmụnna anyị na anyị hụrụ ha n’anya. Anyị ga-atụlekwa otu ụzọ dị mkpa onyeisi ezinụlọ ga-esi egosi na ọ hụrụ ndị ezinụlọ ya n’anya.

OTÚ ANYỊ GA-ESI EGOSI NA ANYỊ HỤRỤ NDỊ ỌZỌ N’ANYA

Jehova gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya mgbe o zitere Ọkpara ya ka ọ bịa n’ụwa nwụọ n’ihi anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6 na nke 7)

6. Olee otú Jehova si egosi na ọ hụrụ anyị n’anya?

6 Anyị nwere ike ịna-eche na ịhụ ndị mmadụ n’anya pụtara naanị ịna-eche ihe ọma gbasara ha ma ọ bụkwanụ ịgwa ha okwu ọma. Ma, ọ bụrụ na anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya n’eziokwu, anyị ga na-emere ha ihe ọma. (Tụlee Jems 2:17, 26.) Dị ka ihe atụ, Jehova hụrụ anyị n’anya. (1 Jọn 4:19) O sikwa n’ọmarịcha ihe ndị o dere na Baịbụl na-agwa anyị na ọ hụrụ anyị n’anya. (Ọma 25:10; Rom 8:38, 39) Ma, ihe mere obi ji sie anyị ike na Jehova hụrụ anyị n’anya abụghị naanị ihe ndị ọ na-ekwu, kamakwa ihe ndị ọ na-emere anyị. Jọn dere, sị: “Ọ bụ site n’ihe a ka e mere ka ịhụnanya Chineke pụta ìhè n’ebe anyị nọ, n’ihi na Chineke zitere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya n’ụwa ka anyị nwee ike inweta ndụ site n’aka ya.” (1 Jọn 4:9) Jehova hapụrụ Ọkpara ya ka ọ taa ahụhụ ma nwụọ n’ihi anyị. (Jọn 3:16) N’ihi ya, obi siri anyị ike na Jehova hụrụ anyị n’anya.

7. Gịnị ka Jizọs mere iji gosi na ọ hụrụ anyị n’anya?

7 Jizọs mesiri ndị na-eso ụzọ ya obi ike na ọ hụrụ ha n’anya. (Jọn 13:1; 15:15) O si n’ihe ndị o kwuru na n’ihe ndị o mere gosi na ọ hụrụ ma hanwa ma anyịnwa n’anya nke ukwuu. Jizọs sịrị: “Ọ dịghị onye nwere ịhụnanya karịrị nke a, na mmadụ ga-atọgbọ mkpụrụ obi ya n’ihi ndị enyi ya.” (Jọn 15:13) Olee ihe iche gbasara ihe ndị Jehova na Jizọs meere anyị ga-eme ka anyị mee?

8. Gịnị ka 1 Jọn 3:18 gwara anyị ka anyị mee?

8 Otú anyị si egosi na anyị hụrụ Jehova na Jizọs n’anya bụ irubere ha isi. (Jọn 14:15; 1 Jọn 5:3) Jizọs nyekwara anyị iwu ka anyị hụ ibe anyị n’anya. (Jọn 13:34, 35) Otú anyị ga-esi egosi ụmụnna anyị na anyị hụrụ ha n’anya abụghị naanị n’okwu ọnụ anyị. Ihe ndị anyị na-emere ha kwesịrị igosi na anyị hụrụ ha n’anya. (Gụọ 1 Jọn 3:18.) Olee ihe ndị anyị nwere ike imere ha iji gosi na anyị hụrụ ha n’anya?

HỤ ỤMỤNNA GỊ N’ANYA

9. Gịnị ka Jọn mere n’ihi na ọ hụrụ ndị ọzọ n’anya?

9 Ọ bụrụ na Jọn chọrọ, ọ gaara esoro nna ya na-arụ ọrụ ịkụ azụ̀ ha na-arụ n’ezinụlọ ha. Kama ime otú ahụ, o kpebiri iji ndụ ya niile na-enyere ndị mmadụ aka ịmụta eziokwu gbasara Jehova na Jizọs. Ụdị ndụ a Jọn kpebiri ibi adịghị mfe. A kpagburu ya. A chụgakwara ya obodo ọzọ ná ngwụcha oge ndịozi, mgbe ọ bụzi agadi. (Ọrụ 3:1; 4:1-3; 5:18; Mkpu. 1:9) Ma mgbe a tụrụ Jọn mkpọrọ n’ihi na ọ na-ekwusa ozi ọma banyere Jizọs, ọ nọgidere na-egosi na ọ hụrụ ndị ọzọ n’anya. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ nọ n’agwaetiti Patmọs, o dere ihe e kpugheere ya ma zigara ya ọgbakọ dị iche iche ka ha nwee ike ịmata “ihe ndị na-aghaghị ime n’oge na-adịghị anya.” (Mkpu. 1:1) Ọ ga-abụ mgbe a tọhapụchara ya n’ụlọ mkpọrọ na Patmọs ka o dere akwụkwọ Jọn, bụ́ ebe ọ kọrọ gbasara ndụ Jizọs na ozi ya. O dekwara akwụkwọ ozi atọ iji gbaa ụmụnna ya ume ma mee ka ha dị ike. Olee otú i nwere ike isi na-eme ka Jọn?

10. Olee otú ị ga-esi gosi na ị hụrụ ndị ọzọ n’anya?

10 I nwere ike isi n’ihe ndị i kpebiri iji ndụ gị eme gosi na ị hụrụ ndị ọzọ n’anya. Ụwa Ekwensu ga-achọ ka i jiri oge gị niile na ike niile na-eme ihe ga-abara naanị onwe gị uru, na-achọ ka i nweta ego ma ọ bụ bụrụ onye a ma ama. Ma, Ndị Kraịst n’ụwa niile na-eji oge buru ibu ekwusa ozi ọma ma na-enyere ndị mmadụ aka ịbịaru Jehova nso. Ụfọdụ na-ejidị oge ha niile ezi ndị mmadụ ozi ọma ma na-akụziri ha Baịbụl.

Ọ bụrụ na anyị ana-emere ụmụnna anyị na ndị ezinụlọ anyị ihe ọma, anyị na-egosi na anyị hụrụ ha n’anya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11 na nke 17) *

11. Olee otú ọtụtụ ụmụnna anyị na-esi egosi na ha hụrụ Jehova na ụmụnna ha n’anya?

11 E nwere ọtụtụ Ndị Kraịst ga na-arụ ọrụ mgbe niile ka ha nwee ike ịna-egbo mkpa ha na nke ndị ezinụlọ ha. N’agbanyeghị nke ahụ, ha na-akwado nzukọ Jehova otú ọ bụla ha nwere ike. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ na-eso agbatara ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka. Ndị ọzọ na-eso arụ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova. Onye ọ bụla nwekwara ike iji ego ya kwado ọrụ zuru ụwa ọnụ. Ihe mere ha ji eme ihe ndị a niile bụ n’ihi na ha hụrụ Chineke na mmadụ ibe ha n’anya. Kwa izu, anyị na-aga ọmụmụ ihe ma na-eme ihe ndị a na-eme na ya iji gosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya. Ike nwere ike ịgwụcha anyị, ma anyị na-ebu ya aga ọmụmụ ihe. Ụjọ nwere ike ịna-atụ anyị, ma anyị na-agbalị na-aza ajụjụ. Ọ bụ eziokwu na e nwere nsogbu ndị anyị na ha na-alụ, ma anyị na-agba mbọ agba ụmụnna anyị ume tupu ọmụmụ ihe ebido ma ọ bụ mgbe a gbasara. (Hib. 10:24, 25) Obi na-adị anyị ezigbo ụtọ maka mbọ ụmụnna anyị na-agba.

12. Olee ụzọ ọzọ Jọn si gosi na ọ hụrụ ụmụnna ya n’anya?

12 Otú Jọn si gosi na ọ hụrụ ụmụnna ya n’anya abụghị naanị ịja ha mma, kamakwa, inye ha ndụmọdụ. Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ ozi ndị o dere, ọ jara ụmụnna ya mma maka okwukwe ha na ọrụ ọma ha. Ma, o nyere ha ndụmọdụ ka ha zere mmehie. (1 Jọn 1:8–2:1, 13, 14) Anyị kwesịkwara ịna-aja ụmụnna anyị mma maka ihe ọma ndị ha na-eme. Ma, ọ bụrụ na mmadụ amalite ịkpa àgwà ọjọọ, anyị nwere ike iji akọ nye ya ndụmọdụ iji gosi na anyị hụrụ ya n’anya. Anyị ga-akata obi ka anyị nwee ike inye enyi anyị ndụmọdụ. Baịbụl kwuru na ezigbo ndị enyi na-agbazi ibe ha.—Ilu 27:17.

13. Gịnị ka anyị na-ekwesịghị ime?

13 Mgbe ụfọdụ, otú anyị si egosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya bụ ịghara ime ihe ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, ihe ha kwuru anaghị ewe anyị iwe ọsọ ọsọ. Legodị ihe mere obere oge tupu Jizọs ejechaa ozi ya n’ụwa. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya na ọ bụrụ na ha chọrọ inweta ndụ na ha ga-eri anụ ahụ́ ya ma ṅụọ ọbara ya. (Jọn 6:53-57) Ihe a o kwuru wụrụ ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya akpata oyi n’ahụ́, ha ahapụ ya. Ma ezigbo ndị enyi ya ahapụghị ya, ma Jọn. Ha akwụsịghị iso ya. Ha aghọtaghị ihe ihe ahụ Jizọs kwuru pụtara. Ọ ga-abụkwa na o juru ha anya. Ma ha echeghị na ihe ahụ Jizọs kwuru adịghị mma, ya emee ka ha wewe iwe. Kama, ha tụkwasịrị Jizọs obi n’ihi na ha ma na ọ na-ekwu eziokwu. (Jọn 6:60, 66-69) Ihe a gosiri na ọ dị ezigbo mkpa ka ihe ndị enyi anyị kwuru ghara iwe anyị iwe ọsọ ọsọ. Kama, anyị kwesịrị inye ha ohere ka ha kọwaara anyị ihe ha kwuru anyị na-aghọtachaghị nke ọma.—Ilu 18:13; Ekli. 7:9.

14. Gịnị mere anyị ekwesịghị ịkpọ ụmụnna anyị asị?

14 Jọn gwakwara anyị ka anyị ghara ịkpọ ụmụnna anyị asị. Anyị jụ ige ntị n’ihe a o kwuru, o nwere ike ime ka Ekwensu jiri anyị kwara ngwá ọrụ. (1 Jọn 2:11; 3:15) Ọ bụ ihe a mere ụfọdụ Ndị Kraịst ná ngwụcha oge ndịozi. Setan nọ na-eme ike ya niile iji hụ na nkewa na ịkpọasị batara n’etiti ndị Chineke. N’oge Jọn na-ede akwụkwọ ozi ya, ndị na-akpa àgwà ka Setan egbebatala n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Dị ka ihe atụ, Dayọtrefis nọ na-akpata nsogbu n’otu ọgbakọ. (3 Jọn 9, 10) Ọ nọ na-akparị ndị okenye òtù na-achị isi zitere. E nwee ndị lere ndị ọ kpọrọ asị ọbịa, ọ na-achọdị ịchụpụ ha n’ọgbakọ. Ihe a o mere jọgburu onwe ya. Taakwa, Setan ka na-eme ike ya niile iji hụ na o mere ka ndị Jehova ghara ịdị n’otu. Ka anyị ghara ikwe ka ịkpọ ụmụnna anyị asị mee ka anyị na ha ghara ịdị n’otu.

HỤ NDỊ EZINỤLỌ GỊ N’ANYA

Jizọs gwara Jọn ka o lekọta nne ya ma nyere ya aka ịnọgide na-efe Chineke. Taa, ndị isi ezinụlọ kwesịrị ịna-elekọta ezinụlọ ha ma na-egboro ha mkpa ha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15 na nke 16)

15. Gịnị ka onyeisi ezinụlọ kwesịrị icheta?

15 Otu ụzọ dị ezigbo mkpa onyeisi ezinụlọ ga-esi egosi na ọ hụrụ ezinụlọ ya n’anya bụ ịna-egboro ha mkpa ha. (1 Tim. 5:8) Ma, o kwesịrị icheta na naanị igboro ndị ezinụlọ ya mkpa ha agaghị eme ka ha na Chineke dịrị ná mma. (Mat. 5:3) Ka anyị tụlee ihe Jizọs mere ndị isi ezinụlọ kwesịrị ịna-eme. Akwụkwọ Jọn gwara anyị na mgbe a kpọgidere Jizọs n’osisi ịta ahụhụ, ọ nọkwa na-eche gbasara ezinụlọ ya. Jọn nọ n’akụkụ Meri nne Jizọs n’ebe ahụ a kpọgidere Jizọs n’osisi. N’agbanyeghị na Jizọs na ahụ́ ụfụ na-alụ n’oge ahụ, ọ gwara Jọn ka ọ na-elekọta nne ya Meri. (Jọn 19:26, 27) Jizọs nwere ụmụnne ndị nwere ike igboro nne ya mkpa ya. Ma o yiri ka o nwebeghị onye n’ime ha bụ onye na-eso ụzọ ya n’oge ahụ. Jizọs chọrọ ijide n’aka na e nwere onye ga-elekọta nne ya nakwa onye ga na-agba ya ume ịnọgide na-ejere Jehova ozi.

16. Olee ọrụ ndị Jọn rụrụ?

16 E nwere ọtụtụ ọrụ Jọn rụrụ. Ebe o so ná ndịozi, o butere ụzọ n’ikwusa ozi ọma. O nwekwara ike ịbụ na ọ lụrụ nwaanyị. N’ihi ya, ọ ga na-egboro ndị ezinụlọ ya mkpa ha, na-enyekwara ha aka ka ha na Chineke na-adị ná mma. (1 Kọr. 9:5) Olee ihe ndị isi ezinụlọ taa nwere ike ịmụta n’aka ya?

17. Olee ọrụ dị mkpa onyeisi ezinụlọ nwere? Oleekwa uru ọ ga-abara ezinụlọ ya?

17 E nwere ike inwe ọtụtụ ọrụ nwanna bụ́ onyeisi ezinụlọ na-arụ. Dị ka ihe atụ, ọ ga na-arụsi ọrụ ike n’ebe ọ na-arụ ọrụ ka e nwee ike ito Jehova. (Efe. 6:5, 6; Taị. 2:9, 10) O nwekwara ike inwe ọrụ ọ na-arụ n’ọgbakọ, dị ka, ịgba ụmụnna ume na ịhazi ozi ọma. N’agbanyeghị ihe ndị a, ọ dị ezigbo mkpa ka ọ na-ewepụta oge ya na ndị ezinụlọ ya ga-eji na-amụ Baịbụl. Obi ga na-adị ha ụtọ maka mbọ ọ na-agba igboro ha mkpa ha, ime ha obi ụtọ, nakwa ime ka ha na Jehova dịrị ná mma.—Efe. 5:28, 29; 6:4.

‘NỌGIDE N’ỊHỤNANYA M’

18. Gịnị ka obi siri Jọn ike na ya?

18 Jọn biri ogologo ndụ. Ọtụtụ ihe mere ná ndụ ya. Ọtụtụ nsogbu ndị nwere ike ime ka okwukwe ya nyụọ ka ọkụ bịakwaara ya. Ma, o mere ike ya mgbe niile idebe iwu Jizọs nke ịhụ ụmụnna anyị n’anya so na ya. N’ihi ya, obi siri ya ike na Jehova na Jizọs hụrụ ya n’anya nakwa na ha ga-enye ya ike ọ ga-eji emeri ọnwụnwa ọ bụla bịaara ya. (Jọn 14:15-17; 15:10; 1 Jọn 4:16) O nweghị ihe Setan ma ọ bụ ụwa ya mere nke kwụsịrị Jọn ịhụ ụmụnna ya n’anya nakwa igosi ha na ọ hụrụ ha n’anya.

19. Olee ihe 1 Jọn 4:7 gbara anyị ume ka anyị na-eme, n’ihi gịnịkwa?

19 Dị ka Jọn, anyị bikwa n’ụwa ọjọọ Ekwensu, bụ́ onye na-enweghị onye ọ hụrụ n’anya, na-achị. (1 Jọn 3:1, 10) Ọ bụ eziokwu na ọ chọrọ ka anyị kpọ ụmụnna anyị asị, ma ọ gaghị enwe ike ime ya ma ọ bụrụ na anyị ekweghị. Ka anyị kpebisie ike isi n’ihe anyị na-ekwu na n’ihe anyị na-eme na-egosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya. Anyị mee otú ahụ, obi ga-adị anyị ụtọ na anyị so n’ezinụlọ Jehova, ndụ ga na-atọkwa anyị ụtọ.—Gụọ 1 Jọn 4:7.

ABỤ NKE 88 Mee Ka M Mara Ụzọ Gị

^ par. 5 Ọ ga-abụ na ọ bụ Jọn onyeozi bụ “onye ahụ na-eso ụzọ Jizọs, bụ́ onye ọ hụrụ n’anya.” (Jọn 21:7) Ọ ga-abụ na o nwere àgwà ndị magburu onwe ha mgbe ọ na-eto eto. Mgbe ọtụtụ afọ gachara, Jehova ji ya dee ọtụtụ ihe banyere ịhụnanya. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe ụfọdụ Jọn dere nakwa n’ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’aka ya.

^ par. 59 NKỌWA FOTO: Ebe otu onyeisi ezinụlọ na-arụsi ọrụ ike so na-agbatara ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka, na-enye onyinye iji kwado ọrụ zuru ụwa ọnụ, na-akpọkwa ndị mmadụ ka ha bịa soro n’ofufe ezinụlọ ha.