AKỤKỌ NDỤ
Anyị Kpebiri na Anyị Agaghị Ajụ Ọrụ Ọ Bụla Nzukọ Jehova Nyere Anyị
E NWERE otu oge oké ifufe fere, ụrọ ejupụta n’ime otu osimiri, ya ana-asọsikwa ike nke na ọ na-ebupụsị nnukwu okwute. Anyị chọrọ ịgafe n’akụkụ nke ọzọ nke osimiri ahụ. Ma, mmiri ahụ na-asọsi ike emebiela àkwà e ji agafe osimiri ahụ. Ụjọ jidere ma mụnwa ma di m bụ́ Harvey ma onye na-asụgharịrị anyị asụsụ Amis. Anyị amaghịkwa ihe anyị ga-eme. Ma ka ụmụnna nọ n’akụkụ nke ọzọ chị obi n’aka na-ele anyị, anyị bidoro ịgafe. Anyị bu ụzọ nyaba obere ụgbọala anyị n’otu ụgbọala buru ibu. Ụgbọala ahụ bu ụgbọala anyị jizi nwayọọ nwayọọ gafee mmiri ahụ na-asọsi ike. O yiri anyị ka ọ̀ na-ewe ọtụtụ oge ịgafe. Ma anyị mechara gafee. N’oge ahụ niile, anyị nọ na-ekpesi ekpere ike. Ihe a mere n’afọ 1971. N’oge ahụ, anyị nọ n’akụkụ oké osimiri dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Taịwan. Obodo a dị ezigbo anya n’ebe a mụrụ anyị. Ka m kọọrọ unu otú anyị na ije si gaa.
OTÚ ANYỊ SI MỤTA ỊHỤ JEHOVA N’ANYA
Di m bụ́ Harvey bụ nwa nke mbụ n’ime ụmụ nwoke anọ nne na nna ha mụrụ. Ndị ezinụlọ ha batara n’ọgbakọ ihe dị ka afọ iri asatọ gara aga n’obodo a na-akpọ Midland Jọnshọn, nke dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ọstrelia. Ihe siri ezigbo ike n’obodo ahụ n’oge ahụ. Di m bịara hụ Jehova n’anya ma mee baptizim mgbe ọ dị afọ iri na anọ. N’oge na-adịghị anya, ọ mụtara na ya ekwesịghị ịjụ ọrụ ọ bụla e nyere ya ná nzukọ Jehova. Mgbe ọ ka na-eto eto, e nwere oge ọ jụrụ ịgụpụta Ụlọ Nche n’ọmụmụ ihe. O chere na ya erughị eru ịgụ ya. Ma otu nwanna nyeere ya aka ịgbanwe echiche ya. Nwanna ahụ sịrị ya: “Mgbe ọ bụla onye nọ n’ọgbakọ gwara gị ihe ị ga-eme, ọ ma na ị ga-emeli ya.”—2 Kọr. 3:5.
Mụ na nne m na nwanne m nwaanyị nke tọrọ m batara n’ọgbakọ n’Ịngland. Papa m nọ na-emegide anyị. Ma, o mechara bata n’ọgbakọ mgbe ọtụtụ afọ gachara. N’agbanyeghị na papa m achọghị ka m mee baptizim, m mere baptizim mgbe m dị afọ itoolu. Ihe na-agụ m bụ ịbụ ọsụ ụzọ nakwa imecha bụrụ onye ozi ala ọzọ. Papa m sịrị
na ya agaghị ekwe ka m bụrụ ọsụ ụzọ, ọ gwụkwala ma m ruru afọ iri abụọ na otu. Achọghị m ịnọ na-eche ruo oge ahụ. Ma mgbe m dị afọ iri na isii, papa m kwere ka m gaa ka mụ na ada nne m bi n’Ọstrelia biri. M mechara bido ịsụ ụzọ mgbe m dị afọ iri na asatọ.Ọ bụ n’Ọstrelia ka mụ na di m Harvey nọ hụ. Anyị abụọ chọrọ ịbụ ndị ozi ala ọzọ. Anyị lụrụ n’afọ 1951. Mgbe anyị sụchara ụzọ afọ abụọ, a gwara anyị ka anyị bụrụzie ndị nlekọta sekit. Sekit anyị na-eleta n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ọstrelia buru ibu. N’ihi ya, anyị na-agbara ụgbọala anyị gaa ebe dị anya, ebe ndị ala ya kpọrọ nkụ, na ebe ndị dịpụrụ adịpụ.
IHE ANYỊ NA-ACHỌSI IKE MECHARA MEZUO
N’afọ 1954, a kpọrọ anyị ka anyị gaa klas nke iri abụọ na ise nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Oge eruwela mgbe anyị ga-abụ ndị ozi ala ọzọ ahụ na-agụsi anyị agụụ ike kemgbe. Anyị ji ụgbọ mmiri garuo Niu Yọk. Mgbe anyị ruru, anyị malitere ịmụsi Baịbụl ike. Asụsụ Spanish sokwa n’ihe anyị na-amụ. O siiri di m ike ịmụta ya n’ihi na ọ naghị akpọtacha “r” ha otú ha si akpọ ya.
N’oge anyị nọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ, ndị nkụzi anyị bịara gwa anyị na ndị chọrọ ka e ziga ha Japan nwere ike ide aha ha ka ha soro ná ndị a ga-akụziri asụsụ Japaniiz. Anyị kpebiri na ọ ga-akara anyị mma ịga ebe ọ bụla e zigara anyị. Mgbe obere oge gafere, Nwanna Albert Schroeder, bụ́ otu n’ime ndị nkụzi Gilied, chọpụtara na anyị edeghị aha anyị ná ndị ga-amụ asụsụ Japaniiz, ya agwa anyị ka anyị chebakwuoro ya echiche. Mgbe nwanna Schroeder hụrụ na anyị na-egbu oge ideba aha anyị, ọ gwara anyị, sị: “Mụ na ndị nkụzi ndị ọzọ edebala aha unu. Unu lee ma ùnu ga-amụta Japaniiz.” O sirighị di m ike ịmụta asụsụ Japaniiz.
Anyị ruru Japan n’afọ 1955. N’oge ahụ, ọ bụ naanị narị ndị nkwusa ise ka e nwere n’obodo ahụ niile. N’oge ahụ, di m dị afọ iri abụọ na isii, mụnwa adịrị afọ iri abụọ na anọ. E zigara anyị n’obodo a na-akpọ Kobe, ebe anyị nọ jee ozi ruo afọ anọ. Obi tọrọ anyị ụtọ mgbe a gwara anyị ka anyị maliteghachi ọrụ nlekọta sekit. Sekit anyị na-eleta di nso n’obodo Nagoya. Ihe niile gbasara ozi anyị na-eje na-atọgbu anyị atọgbu, ma ụmụnna anyị, ma nri ha, ma ihe ndị anyị na-ahụ n’obodo ahụ. O teghị aka, ya enwee ọrụ ọzọ e nyere anyị anyị na-agaghị asị na anyị agaghị arụ.
ỌRỤ ỌHỤRỤ E NYERE ANYỊ MERE KA IHE SITỤRỤ ANYỊ IKE
Mgbe afọ atọ gachara anyị rụrụ ọrụ nlekọta sekit, alaka ụlọ ọrụ Japan jụrụ anyị ma ànyị ga-achọ ịga Taịwan gaa jewe ozi n’obodo ndị Amis. Ndị si n’ezi ofufe dapụ enyewela nsogbu n’ebe ahụ. Ọ dịkwa mkpa ka nwanna ma asụsụ Japaniiz asụ gaa ebe ahụ iji nyere ụmụnna anyị ndị Amis aka. * Ozi anyị na-eje na Japan na-atọgbu anyị atọgbu. N’ihi ya, o siiri anyị ezigbo ike ikweta ịga Taịwan. Ma ebe ọ bụ na di m ekpebiela na ya agaghị ajụ ọrụ ọ bụla nzukọ Jehova nyere ya, anyị kwetara ịga.
Anyị ruru Taịwan n’ọnwa Nọvemba afọ 1962. Ndị nkwusa nọ n’obodo ahụ dị puku abụọ narị abụọ na iri asaa na otu. Ọtụtụ n’ime ha bụkwa ndị Amis. Anyị bu ụzọ mụọ asụsụ Chaịniiz. Naanị ihe anyị nwere bụ akwụkwọ e ji amụ Chaịniiz na onye nkụzi na-amaghị asụ Bekee. Ma anyị gbalịrị mụta Chaịniiz.
Obere oge anyị rutere Taịwan, e mere di m onye na-elekọta alaka ụlọ ọrụ Taịwan. Alaka ụlọ ọrụ ahụ dị obere. N’ihi ya, ọ na-arụ ọrụ ya n’alaka ụlọ ọrụ ahụ, nweekwa ohere ọ na-eji eleta ụmụnna ndị Amis izu atọ n’ọnwa ọ bụla. Ọ na-arụkwa ọrụ onye nlekọta distrikti si n’oge ruo n’oge, nke mere ka ọ na-ekwu okwu ná mgbakọ dị iche iche. Ọ bụrụ na o jiri asụsụ Japaniiz kwuo okwu, ụmụnna ndị Amis ga-aghọta ya. Mana, gọọmenti mba ahụ nyere iwu na naanị asụsụ ha kwadoro ka a na-eji enwe nnọkọ okpukpe ọ bụla bụ asụsụ Chaịniiz. Ma ịsụ Chaịniiz ka na-ara di m ahụ́. N’agbanyeghị ya, ọ na-agbalị na-eji Chaịniiz ekwu okwu, nwanna ọzọ ana-atapịa ya n’Amis.
N’oge ahụ, e nwere ọchịchị aka ike na Taịwan. N’ihi ya, ụmụnna ga-anata ikike n’aka ndị ọchịchị tupu e nwee mgbakọ. Ịnata ikike ahụ anaghị adị mfe. Ọtụtụ mgbe, ndị uwe ojii na-egbu oge tupu ha enye mmadụ ikike ahụ. Ọ bụrụ na ndị uwe ojii enyebeghị anyị ikike ruo n’izu ahụ a ga-enwe mgbakọ, di m na-aga nọrọ n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii ruo mgbe ha nyere ya ya. Ihe a di m na-eme na-adabara anyị n’ihi na ọ na-eme ndị uwe ojii ihere ma onye na-abụghị onye ebe ha bịa nọgide ha n’ụlọ ọrụ ha.
UGWU MBỤ M RỊRỊ
Anyị gaa ileta ụmụnna ndị ebe ahụ, anyị na-aga ije ruo otu awa ma ọ bụ karịa. Anyị na-arịkwa ugwu dị iche iche, gafeekwa ọtụtụ osimiri. M chetara oge mbụ m rịrị ugwu. Anyị riri nri ụtụtụ anyị ọkụ ọkụ, banye bọs na-apụ ma o jiri ọkara gafee elekere ise nke ụtụtụ gaa otu obodo dị ezigbo anya. Anyị gafere mmiri sara mbara, rịakwa ugwu kpọnyere ọnụ n’ala. Otú ugwu ahụ si kpọnye ọnụ n’ala mere ka m na-ahụ ọbụ ụkwụ nwanna nọ m n’ihu na-arị ugwu ahụ.
N’ụtụtụ ahụ, di m na ụmụnna ndị obodo ahụ rụrụ n’ozi ọma, naanị m ana-ezi ozi ọma n’otu obere obodo ndị bi na ya na-asụ Japaniiz. Mgbe o ruru n’elekere anya mbụ nke ehihie, ezigbo ike gwụrụ m n’ihi na agụụ agụkaala m ahụ́. Mgbe mụ na di m mechara hụ, e nweghịzi nwanna ya na ya nọ. Tupu mgbe ahụ, e nwere ndị o ji magazin ụfọdụ nata àkwá ndụ atọ. O gosiri m otú m ga-esi kụputụ ya, mịa ihe dị ya n’ime. Ọ bụ eziokwu na ọ naghị atọcha ụtọ, ma m ṅụchara otu. Ma, ònye
ga-aṅụzi otu nke fọrọ afọ? M ṅụrụ ya n’ihi na di m sị na ya agaghị ebuli m ma m tụbọọ n’ihi agụụ.ỊNỌ EBE PỤRỤ ICHE SAA AHỤ́
N’otu mgbakọ sekit anyị gara, e nwere otu ihe pụrụ iche merenụ. Anyị bi n’ụlọ nwanna bi nso n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ndị Amis weere ịsa ahụ́ ka ihe dị ezigbo mkpa. N’ihi ya, nwunye onye nlekọta sekit wepụtaara mụ na di m ihe ndị anyị ga-eji saa ahụ́. Di m ji ọrụ n’aka mgbe ahụ. N’ihi ya, ọ gwara m ka m buru ụzọ gaa saa. E nwere ihe atọ o wepụtaara anyị: bọket mmiri ọkụ, bọket mmiri oyi, na bezin ihe na-adịghị n’ime ya. O juru m anya na nwunye onye nlekọta sekit ahụ dosara ihe ndị a n’èzí n’ebe chere ihu n’ebe ụmụnna nwoke nọ na-akwadebe maka mgbakọ. M gwara ya ka o nye m ihe m ga-eji asachi ebe ahụ, ya ewetara m ihe plastik na-ahụ ụzọ. M gara ka m nọrọ n’azụ ụlọ ahụ saa ahụ́, ma mgbe m lere anya, m hụrụ ọbọgwụ ndị tụpụtara isi ha ná mgbidi ụlọ ahụ. Ụjọ na-atụ m na ha nwere ike ịtụ m ma m nọrọ ebe ahụ. M gwara onwe m na ụmụnna ndị ahụ ji ọrụ n’aka, na ha agadịghị ama na m na-asa ahụ́. Ọ bụrụkwanụ na mụ asaghị ahụ́, iwe ga-ewe ha. M kpebiziri ịnọrọ ebe ahụ saa ahụ́.
IWEPỤTA AKWỤKWỌ ANYỊ N’ASỤSỤ AMIS
Di m chọpụtara na ụmụnna ndị Amis anaghị emecha nke ọma n’ọgbakọ n’ihi na ọtụtụ n’ime ha amaghị akwụkwọ, e nweghịkwa akwụkwọ anyị ọ bụla n’asụsụ ha. Ebe ọ bụ na e bidola dewe asụsụ Amis n’akwụkwọ n’oge ahụ, o yiri ka oge ahụ ọ̀ bụ oge kacha daba adaba ịkụziri ụmụnna ndị ahụ otú e si agụ asụsụ ha. Ihe a adịghị mfe. Ma, ụmụnna ndị ahụ mechara mụta ịgụ ihe, jirizie aka ha na-amụ banyere Jehova. Ọ bụ malite n’ihe dị ka n’afọ 1966 ka a malitere ibipụta akwụkwọ anyị n’asụsụ Amis. E bipụtakwara Ụlọ Nche mbụ n’asụsụ Amis n’afọ 1968.
Ma, ndị ọchịchị nyere iwu ka a ghara ibipụta akwụkwọ n’asụsụ ọzọ na-abụghị asụsụ Chaịniiz. Iji gbaara nsogbu ọsọ, e si n’ụzọ dị iche iche na-ewepụta Ụlọ Nche n’asụsụ Amis. Dị ka ihe atụ, ruo oge ụfọdụ, Ụlọ Nche a nọ na-ebipụta na-enwe ma asụsụ Chaịniiz Mandarin ma asụsụ Amis n’ime ya. Ọ bụrụ na mmadụ elee Ụlọ Nche ahụ anya, ọ ga-asị na e ji ya na-akụziri ndị Amis Ọrụ 10:34, 35.
Chaịniiz. Kemgbe ahụ, nzukọ Jehova ebipụtala ọtụtụ akwụkwọ n’asụsụ Amis iji nyere ndị ebe ahụ aka ịmụta eziokwu dị na Baịbụl.—IME KA ỌGBAKỌ DỊ ỌCHA
Ruo ọtụtụ afọ, ọtụtụ n’ime ụmụnna anyị ndị Amis anaghị ebi ndụ otú Chineke chọrọ. Ebe ọ bụ na ha aghọtachaghị ihe Baịbụl kwuru nke ọma, ụfọdụ n’ime ha nọ na-eme omume rụrụ arụ, na-aṅụ oké mmanya, ma ọ bụkwanụ na-aṅụ sịga ma na-ata akị osisi bitel. Di m gara leta ọtụtụ ọgbakọ iji nyere ha aka ịmata otú Jehova si ele ihe ndị a anya. Ọ bụ n’otu n’ime njem ndị ahụ ka ihe ahụ a kọrọ ná mmalite isiokwu a mere.
Ụmụnna ndị dị umeala n’obi gbanwere. Ma ọ dị mwute na e nwere ọtụtụ na-agbanweghị. Nke a mere na n’ime afọ iri abụọ, ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa nọ na Taịwan si na puku abụọ narị anọ na iri ise gbadaa dịrịzie narị itoolu. Ihe a wutere anyị. Mana, anyị ma na Jehova agaghị agọzi ọgbakọ na-adịghị ọcha. (2 Kọr. 7:1) N’ikpeazụ, ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ malitere ịna-efe Jehova otú ọ chọrọ, Jehova ana-agọzikwa ha. Ugbu a na Taịwan, e nwere ndị nkwusa karịrị puku iri na otu.
Malite n’afọ 1980 gawa, anyị hụrụ na okwukwe ụmụnna nọ n’ọgbakọ Amis na-esikwu ike. N’ihi ya, di m nwekwuru ohere ọ ga-eji na-eleta ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ Chaịniiz. Obi dị ya ụtọ inyere ọtụtụ ndị di ụmụnna nwaanyị aka ha abata n’ọgbakọ. Echetara m na e nwere mgbe o kwuru otú obi si tọgbuo ya atọgbuo mgbe otu n’ime ha kpere ekpere nke mbụ ya. Obi na-atọkwa mụnwa ụtọ na m nyeere ọtụtụ ndị nwere ezi obi aka, ha abịa fewe Jehova. Obi tọkwara m ezigbo ụtọ na mụ na ụmụ abụọ onye m mụụrụ Baịbụl jekọrọ ozi n’alaka ụlọ ọrụ Taịwan.
ỌNWỤ GBAWARA M OBI
Ugbu a, ọ bụzi naanị m nọ. Ọrịa kansa gburu ọmarịcha di m n’abalị mbụ n’ọnwa Jenụwarị afọ 2010. Mụ na ya lụrụ ihe fọrọ obere ka o ruo afọ iri ise na itoolu. O jere ozi oge niile ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ iri isii. Ọnwụ ya ka na-ewute m nke ukwuu. Ma, obi dị m ezigbo ụtọ na mụ na ya so jee ozi ná mba abụọ tọgburu anyị atọgbu. Mụ na ya mụtara asụsụ ndị Eshia abụọ tara ezigbo akpụ. Yanwa mụtakwara ide ha abụọ.
Mgbe ihe dị ka afọ anọ gachara, Òtù Na-achị Isi kpebiri na ọ ga-akara m mma ịlaghachi Ọstrelia n’ihi na akatawala m ahụ́. Ma n’obi m, achọghị m ịhapụ Taịwan. Ma, di m kụziiri m ịghara ịjụ ime ihe ọ bụla nzukọ Jehova gwara anyị. N’ihi ya, ajụghị m ịlaghachi. M mechara chọpụta na ọ dị mma ka m laghachi.
Ugbu a, m na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’Ọstrelia. M na-esokwa ụmụnna aga ozi ọma ná ngwụcha izu. Obi na-adị m ụtọ iji asụsụ Japaniiz na asụsụ Chaịniiz edugharị ndị bịara ilegharị anya na Betel. Ọ na-agụsi m agụụ ike ka ụbọchị a ga-akpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ ruo. Ama m na Jehova ga-akpọlite di m bụ́ onye na-anaghị ajụ ime ihe ọ bụla ọ gwara ya mee n’ọnwụ.—Jọn 5:28, 29.
^ par. 14 Ọ bụ eziokwu na asụsụ a kacha asụ na Taịwan bụ Chaịniiz ugbu a, n’oge gara aga, ọ bụ Japaniiz. Ma ọtụtụ ndị Taịwan ka na-asụkwa Japaniiz ugbu a.