Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 5

“Kraịst Bụ Isi nke Nwoke Ọ Bụla”

“Kraịst Bụ Isi nke Nwoke Ọ Bụla”

“Kraịst bụ isi nke nwoke ọ bụla.”—1 KỌR. 11:3.

ABỤ NKE 12 Jehova Chineke Dị Ukwuu

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee ihe ndị nwere ike ime ka nwoke na-emeso nwunye ya na ụmụ ya otú o si emeso ha?

GỊNỊ ka i chere ịbụ “onyeisi” pụtara? Ụfọdụ ụmụ nwoke na-ekwe ka omenala ha ma ọ bụ otú e si zụlite ha kpebie otú ha na-esi emeso nwunye ha na ụmụ ha. Lee ihe Yanita bụ́ otu nwanna nwaanyị bi na Yurop kwuru. Ọ sịrị: “N’ebe m bi, ọtụtụ ndị kweere na o nweghị uru ọ bụla ụmụ nwaanyị bara ma e jiri ha tụnyere ụmụ nwoke, nakwa na e kwesịrị iwere ha ka odibo.” Otu nwanna nwoke bi n’Amerịka aha ya bụ Luke sịrị: “Ụfọdụ ndị nna na-akụziri ụmụ ha ndị nwoke na okwu ụmụ nwaanyị anaghị aba uru, n’ihi ya, ha ekwesịghị igbuwe oge na-ege ụmụ nwaanyị ntị.” Ma ọ bụghị otú ahụ ka Jehova chọrọ ka ụmụ nwoke si na-emeso ndị nwunye ha. (Tụlee Mak 7:13.) Oleezi otú nwoke ga-esi amụta ịbụ ezigbo onyeisi ezinụlọ?

2. Gịnị ka onyeisi ezinụlọ kwesịrị ịma, n’ihi gịnịkwa?

2 Ọ bụrụ na nwoke chọrọ ịbụ ezigbo onyeisi ezinụlọ, o kwesịrị ibu ụzọ ghọta ihe Jehova chọrọ ya n’aka. O kwesịkwara ịma ihe mere Jehova ji mee ndị ụfọdụ ndị isi nakwa otú ọ ga-esi eṅomi Jehova na Jizọs. Olee ihe mere o ji dị mkpa ka nwoke mata ihe ndị a? Ọ bụ n’ihi na Jehova nyere ndị isi ezinụlọ ikike ụfọdụ, ọ chọkwara ka ha jiri ya mee ihe kwesịrị ekwesị.—Luk 12:48b.

GỊNỊ KA ỊBỤ ONYEISI PỤTARA?

3. Gịnị ka 1 Ndị Kọrịnt 11:3 na-akụziri anyị gbasara ịbụ onyeisi?

3 Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 11:3. Amaokwu a kọwara otú Jehova si hazie ezinụlọ ya ma n’eluigwe ma n’ụwa. Ihe abụọ ya na ịbụ onyeisi so bụ ikike e nyere mmadụ na ịza ajụjụ ihe e ji ikike ahụ mee. Jehova bụ “isi” ma ọ bụ onye nwe ikike kachanụ. Ụmụ ya niile, ma ndị mmụọ ozi ma ụmụ mmadụ, ga-aza ya ajụjụ ihe ha ji ikike o nyere ha mee. (Rom 14:10; Efe. 3:14, 15) Jehova mere Jizọs onyeisi ọgbakọ. Ma, Jizọs ga-aza Jehova ajụjụ otú o si meso ha. (1 Kọr. 15:27) Jehova mere ndị di isi nke nwunye ha na ụmụ ha. Ma, ndị di ga-aza ma Jehova ma Jizọs ajụjụ maka otú ha si emeso ezinụlọ ha.—1 Pita 3:7.

4. Olee ikike Jehova na Jizọs nwere?

4 Ebe Jehova bụ Onyeisi ma ndị nọ n’eluigwe ma ndị nọ n’ụwa, o nwere ikike ịgwa ha otú ha ga-esi na-akpa àgwà, nweekwa ikike ịhụ na ha mere ihe ndị ahụ o kwuru. (Aịza. 33:22) Ebe ọ bụkwa Jizọs bụ onyeisi nke ọgbakọ, o nwere ikike inye ha iwu nakwa ịhụ na ha debere iwu ahụ.—Gal. 6:2; Kọl. 1:18-20.

5. Olee ikike onyeisi ezinụlọ nwere? Oleekwa ihe ndị a na-enyeghị ya ikike ime?

5 N’ezinụlọ Ndị Kraịst, onyeisi ezinụlọ nwere ikike ikpebi ihe a ga-eme n’ezinụlọ ya otú ahụ Jehova na Jizọs na-eme. (Rom 7:2; Efe. 6:4) Ma, ọ bụghị ihe niile ka o nwere ikike ime. Dị ka ihe atụ, iwu ya kwesịrị ịgbakwasị ụkwụ na Baịbụl. (Ilu 3:5, 6) Ma, onyeisi ezinụlọ enweghị ikike imere ndị na-abụghị ndị ezinụlọ ya iwu. (Rom 14:4) Ọ bụrụkwa na ụmụ ya etolite gaa biri nke ha, ha ka ga na-akwanyekwara ya ùgwù, ma ọ bụghị ya ga na-ekpebiri ha ihe ha ga-eme.—Mat. 19:5.

GỊNỊ MERE JEHOVA JI HAZIE KA E NWEE NDỊ ISI?

6. Gịnị mere Jehova ji hazie ka e nwee ndị isi?

6 Ihe mere Jehova ji hazie ka e nwee ndị ga-abụ ndị isi bụ n’ihi na ọ hụrụ ndị ezinụlọ ya n’anya. Ọ bụ onyinye o nyere ha. Inwe onyeisi na-eme ka ezinụlọ Jehova dịrị n’udo, bụrụkwa nke a haziri ahazi. (1 Kọr. 14:33, 40) Ọ bụrụ na e nweghị onye Jehova mere onyeisi, ezinụlọ ya ga-adị ghaa ghaa ghaa, ha agaghịkwa na-enwe obi ụtọ. Ọ ga-eme ka a ghara ịma onye ga-ekpebi ihe a ga-eme nakwa onye ga-ebute ụzọ n’ime ihe ahụ e kpebiri.

7. Gịnị ka Ndị Efesọs 5:25, 28 kwuru gbasara otú Jehova chọrọ ka ụmụ nwoke si na-emeso ndị nwunye ha ihe?

7 Ọ bụrụ na nhazi Jehova mere ka e nwee ndị isi magburu onwe ya, olee ihe mere o ji adị ọtụtụ ụmụ nwaanyị ka ndị di ha hà na-emegbu ha emegbu? Ihe kpatara ya bụ na ọtụtụ ụmụ nwoke anaghị eme ihe Jehova kwuru ka ndị isi ezinụlọ na-eme, kama ha na-eso omenala obodo ha. Ha nwekwara ike ime ndị nwunye ha ihe ọjọọ iji mee onwe ha obi ụtọ. Dị ka ihe atụ, di nwere ike iji aka ike na-emeso nwunye ya ihe iji mee onwe ya obi ụtọ ma ọ bụkwanụ iji gosi ndị ọzọ na ya bụ nwoke. O nwere ike iche na ya enweghị ike ịmanye nwunye ya ka ọ hụ ya n’anya, ma o nwere ike ime ka ọ na-atụ ya egwu. O nweziri ike iji egwu ahụ ọ na-atụ ya na-achị ya. * Isi otú a na-eche echiche ma ọ bụ na-akpa àgwà ga-eme ka a ghara ịna-akwanyere ụmụ nwaanyị ùgwù ma na-asọpụrụ ha otú kwesịrị ekwesị. Ọ bụghịkwa otú a ka Jehova chọrọ ya.—Gụọ Ndị Efesọs 5:25, 28.

OLEE OTÚ NWOKE GA-ESI AMỤTA ỊBỤ EZIGBO ONYEISI EZINỤLỌ?

8. Olee otú nwoke ga-esi amụta ịbụ ezigbo onyeisi ezinụlọ?

8 Nwoke nwere ike ịmụta ịbụ ezigbo onyeisi ezinụlọ ma o ṅomie otú Jehova na Jizọs si eji ike ha emeso ndị ọzọ ihe. Ka anyị tụlee naanị àgwà abụọ n’ime àgwà ndị Jehova na Jizọs nwere nakwa otú onyeisi ezinụlọ nwere ike isi na-akpa àgwà ndị a mgbe ọ na-emeso nwunye ya na ụmụ ya ihe.

9. Olee otú Jehova si egosi na ya dị umeala n’obi?

9 Ịdị umeala n’obi. Ọ bụ Jehova bụ Onye kacha mara ihe ma n’eluigwe ma n’ụwa. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-ege ntị ma ndị ohu ya kwuwe ihe bụ́ uche ha. (Jen. 18:23, 24, 32) E nweekwala mgbe o kwere ka ndị ohu ya kwuo ihe a ga-eme. (1 Eze 22:19-22) Jehova zuru okè, ma ọ naghị atụ anya ka anyị zuo okè ugbu a. Kama nke ahụ, ọ na-enyere ndị ohu ya na-ezughị okè aka ịna-emekwu nke ọma n’ozi ya. (Ọma 113:6, 7) Baịbụl kwuru na Jehova bụ “onye na-enyere” anyị aka. (Ọma 27:9; Hib. 13:6) Eze Devid kwuru na ihe mere ka o nwee ike ịrụcha nnukwu ọrụ e nyere ya bụ n’ihi na Jehova dị umeala n’obi.—2 Sam. 22:36.

10. Olee otú Jizọs si gosi na ọ dị umeala n’obi?

10 Ka anyị kwuo gbasara Jizọs. N’agbanyeghị na ọ bụ Onyenwe na Nna Ukwu ndị na-eso ụzọ ya, ọ sara ụkwụ ha. Olee otu ihe mere Jehova ji kwe ka e dee ihe a Jizọs mere na Baịbụl? O doro anya na ọ bụ iji gosi ndị isi ezinụlọ na ndị ọzọ ihe ha kwesịrị ịna-eme. Jizọs n’onwe ya sịrị: “M na-enye unu ihe nlereanya, ka unu meekwa otú ahụ, dị nnọọ ka m meere unu.” (Jọn 13:12-17) N’agbanyeghị na Jizọs nwere ikike buru ibu, ọ tụghị anya ka ndị ọzọ jeere ya ozi. Kama, o jeere ndị ọzọ ozi.—Mat. 20:28.

Otú onyeisi ezinụlọ nwere ike isi na-egosi na ọ hụrụ ndị ezinụlọ ya n’anya ma dịrị umeala n’obi bụ ịrụ ọrụ ndị dị n’ụlọ na ime ka okwukwe ndị ezinụlọ ya sie ike (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11 na nke 13)

11. Gịnị ka onyeisi ezinụlọ nwere ike ịmụta n’aka Jehova na Jizọs gbasara ịdị umeala n’obi?

11 Ihe anyị na-amụta. E nwere ọtụtụ ụzọ onyeisi ezinụlọ ga-esi gosi na ọ dị umeala n’obi. Dị ka ihe atụ, ọ naghị atụ anya ka nwunye ya na ụmụ ya zuo okè. Ọ na-ege ntị ma ndị ezinụlọ ya na-ekwu ihe bụ́ uche ha, ma mgbe ihe ha na-ekwu na-abụghị ihe ọ chọrọ. Otu nwaanyị aha ya bụ Marley bi n’Amerịka sịrị: “Olu mụ na di m na-agba iche n’ihe ụfọdụ. Ma, ama m na o ji m kpọrọ ihe ma na-akwanyere m ùgwù n’ihi na ọ na-ebu ụzọ jụta m ihe m chere, lebakwara ya anya nke ọma tupu ya ekpebie ihe a ga-eme.” Ihe ọzọ di dị umeala n’obi na-eme bụ inye aka rụọ ọrụ ụlọ, ọ bụrụgodị na ndị obodo ha na-ele ya anya ka ọrụ ụmụ nwaanyị. Ihe a nwere ike isi ike. N’ihi gịnị? Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Rachel sịrị: “N’obodo anyị, ọ bụrụ na nwoke enyere nwunye ya aka saa efere ma ọ bụ debe ụlọ ọcha, ndị agbata obi ya na ndị ikwu ya ga-asị na ọ bụghị nwoke. Ha nwere ike ịna-eche na ọ bụ nwunye ya na-agwa ya ihe ọ na-eme.” Ọ bụrụ otú a ka ndị mmadụ si eche echiche n’ebe i bi, cheta na Jizọs sara ụkwụ ndị na-eso ụzọ ya n’agbanyeghị na a na-ele ya anya ka ọrụ ndị ohu. Ihe na-abụ mkpa ezigbo onyeisi ezinụlọ abụghị otú ndị ọzọ si ele ya anya, kama, ọ bụ ịna-eme nwunye ya na ụmụ ya obi ụtọ. E wepụ ịdị umeala n’obi, olee àgwà ọzọ ọ dị mkpa ka ezigbo onyeisi ezinụlọ nwee?

12. Gịnị ka ịhụnanya mere ka Jehova na Jizọs mee?

12 Ịhụnanya. Ọ bụ ịhụnanya na-eme ka Jehova na-eme ihe niile ọ na-eme. (1 Jọn 4:7, 8) Otú o si egosi na ọ hụrụ anyị n’anya, chọọkwa ka anyị bụrụ ndị enyi ya bụ na o nyere anyị Okwu ya bụ́ Baịbụl, nyekwa anyị nzukọ ya. Ọ na-agwakwa anyị na ọ hụrụ anyị n’anya iji gosi na ọ na-eche gbasara anyị. Oleekwanụ otú o si egboro anyị mkpa anyị? Jehova “na-enye anyị ihe niile n’ụba ka anyị wee nwee ọṅụ.” (1 Tim. 6:17) Ọ bụrụ na anyị emejọọ ihe, ọ na-agbazi anyị, ma ọ naghị akwụsị ịhụ anyị n’anya. Jehova nyere anyị ihe mgbapụta iji gosi na ọ hụrụ anyị n’anya. Jizọs hụkwara anyị n’anya nke ukwuu nke na ọ nwụrụ n’ihi anyị. (Jọn 3:16; 15:13) O nweghị ihe ga-eme ka Jehova na Jizọs kwụsị ịhụ ndị na-erubere ha isi n’anya.—Jọn 13:1; Rom 8:35, 38, 39.

13. Gịnị mere o ji dị mkpa ka onyeisi ezinụlọ hụ ndị ezinụlọ ya n’anya? (Gụọkwa igbe isiokwu ya bụ “ Olee Ihe Nwoke Lụrụ Nwaanyị Ọhụrụ Ga-eme Ka Nwunye Ya Na-akwanyere Ya Ùgwù?”)

13 Ihe anyị na-amụta. Ọ bụ ịhụnanya kwesịrị ịna-eme ka onyeisi ezinụlọ na-eme ihe ọ bụla ọ na-eme. Gịnị mere o ji dị ezigbo mkpa? Jọn onyeozi zara ajụjụ a. Ọ sịrị: “Onye na-ahụghị nwanna ya [ma ọ bụ ndị ezinụlọ ya] n’anya, bụ́ onye ọ na-ahụ anya, apụghị ịhụ Chineke n’anya, bụ́ onye ọ na-adịghị ahụ anya.” (1 Jọn 4:11, 20) Nwoke hụrụ ndị ezinụlọ ya n’anya ma chọọ ime ka Jehova na Jizọs ga na-eme ka ndị ezinụlọ ya na Jehova dịrị ná mma, na-eme ka obi na-adị ha ụtọ, na-egbokwara ha mkpa ha. (1 Tim. 5:8) Ọ ga na-akụziri ụmụ ya ihe ma na-agbazi ha. Ọ ga-anọgidekwa na-amụta otú ọ ga-esi na-eme mkpebi ga-adị Jehova mma, nakwa nke ga-abara ezinụlọ ya uru. Ka anyị tụlee nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ onyeisi ezinụlọ kwesịrị ịna-eme nakwa otú ọ ga-esi na-eme ka Jehova na Jizọs.

IHE ONYEISI EZINỤLỌ KWESỊRỊ ỊNA-EME

14. Olee otú onyeisi ezinụlọ ga-esi eme ka okwukwe ezinụlọ ya sie ike?

14 O kwesịrị ịna-eme ka ndị ezinụlọ ya na Jehova dịrị ná mma. Dịkwa ka Jehova, ihe bụ́ mkpa Jizọs bụ inyere ndị ọ na-elekọta aka ka okwukwe ha sie ike. (Mat. 5:3, 6; Mak 6:34) Ihe kwesịkwara ịkacha onyeisi ezinụlọ mkpa bụ ime ka okwukwe ndị ezinụlọ ya sie ike. (Diut. 6:6-9) Otú ọ ga-esi eme ya bụ ịhụ na ya na ndị ezinụlọ ya na-agụ Okwu Chineke, na-aga ọmụmụ ihe, na-ekwusakwa ozi ọma. Ọ ga-ahụkwa na ndị ezinụlọ ya na Jehova bụ enyi ma nọgide bụrụ enyi.

15. Olee otu ụzọ onyeisi ezinụlọ nwere ike isi mee ka obi na-adị ndị ezinụlọ ya mma?

15 O kwesịrị ịna-eme ka obi na-adị ndị ezinụlọ ya ụtọ. Jehova gwara Jizọs na ọ hụrụ ya n’anya n’ihu ndị ọzọ. (Mat. 3:17) Jizọs gwakwara ndị na-eso ụzọ ya na ọ hụrụ ha n’anya. O mekwara ihe ndị gosiri na ọ hụrụ ha n’anya. Ha gwakwara ya na ha hụrụ ya n’anya. (Jọn 15:9, 12, 13; 21:16) Onyeisi ezinụlọ nwere ike isi n’ihe ndị ọ na-eme gosi nwunye ya na ụmụ ya na ọ hụrụ ha n’anya, dị ka ya na ha ịmụ Baịbụl. O kwesịkwara ịgwa ha na ọ hụrụ ha n’anya, jirikwa ha kpọrọ ihe. O kwesịkwara ịja ha mma n’ihu ndị ọzọ mgbe ọ dabara adaba.—Ilu 31:28, 29.

Ọ bụrụ na onyeisi ezinụlọ chọrọ ka ihe ya na-amasị Jehova, o kwesịrị ịna-egboro ndị ezinụlọ ya mkpa ha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)

16. Olee ihe ọzọ onyeisi ezinụlọ kwesịrị ịna-eme? Oleekwa ihe o kwesịrị izere?

16 O kwesịrị ịna-egboro ndị ezinụlọ ya mkpa ha. Jehova gbooro ndị Izrel mkpa ha ma mgbe ha na-ata ahụhụ maka nnupụisi ha. (Diut. 2:7; 29:5) Ọ na-egbokwara anyị mkpa anyị taa. (Mat. 6:31-33; 7:11) Jizọs nyekwara ìgwè mmadụ na-eso ya nri. (Mat. 14:17-20) Ọ gwọkwara ọtụtụ ndị ọrịa ha. (Mat. 4:24) Ọ bụrụ na onyeisi ezinụlọ chọrọ ime ihe dị Jehova mma, o kwesịrị ịna-egboro ndị ezinụlọ ya mkpa ha. Ma, e nwere ihe o kwesịrị izere. O kwesịghị iji oge buru ibu na-akpa afọ ezinụlọ ya nke ga-eme ka ọ ghara inwe ohere ọ ga-eji na-enyere ndị ezinụlọ ya aka ka ha na Jehova dịrị ná mma, na-emekwa ka obi dị ha mma.

17. Olee otú Jehova na Jizọs si akụziri ndị ọzọ ihe ma na-agbazi ha?

17 O kwesịrị ịna-azụ ndị ezinụlọ ya. Jehova na-azụ anyị ma na-agbazi anyị n’ihi na ọ chọrọ inyere anyị aka. (Hib. 12:7-9) Jizọs mekwara ka Nna ya, jiri ịhụnanya zụọ ndị nọ n’okpuru ya. (Jọn 15:14, 15) Ọ na-abara onye mejọrọ ihe mba, dịrịkwa obiọma. (Mat. 20:24-28) Ọ ma na anyị ezughị okè nakwa na anyị na-emejọ ihe ọtụtụ ugboro.—Mat. 26:41.

18. Gịnị ka ezigbo onyeisi ezinụlọ kwesịrị ịna-echeta?

18 Onyeisi ezinụlọ chọrọ ime ka Jehova na Jizọs ga-echeta na ndị ezinụlọ ya ezughị okè. Ọ naghị eweso nwunye ya ma ọ bụ ụmụ ya “oké iwe.” (Kọl. 3:19) Kama, ọ na-eme ihe e kwuru ná Ndị Galeshia 6:1 ma gbalịa iji “mmụọ dị nwayọọ” gbazie ha, na-echeta na yanwa ezukwaghị okè. Dịkwa ka Jizọs, ọ na-echeta na ụzọ kacha mma ọ ga-esi akụziri ndị ezinụlọ ya ihe bụ ịna-eme ihe ọ chọrọ ka ha na-eme.—1 Pita 2:21.

19-20. Olee otú ndị isi ezinụlọ nwere ike isi ṅomie Jehova na Jizọs ma a bịa n’ime mkpebi?

19 Ọ ga na-eme mkpebi ga-abara ndị ezinụlọ ya uru. Jehova na-eme mkpebi na-abara ndị ọzọ uru. Dị ka ihe atụ, ihe mere Jehova ji kee ihe ndị ọzọ dị ndụ abụghị ka ha baara ya uru, kama, ọ bụ ka ndụ na-atọ anyị ụtọ. E nweghị onye gaara amanye ya ka o jiri ndụ Ọkpara ya kpuchie mmehie anyị. O mere ya n’ihi na ọ chọrọ inyere anyị aka. Jizọs mekwara mkpebi baara ndị ọzọ uru. (Rom 15:3) Dị ka ihe atụ, e nwere mgbe ọ hapụrụ izu ike ka o nwee ike ịkụziri ìgwè mmadụ ihe.—Mak 6:31-34.

20 Ezigbo onyeisi ezinụlọ ma na otu n’ime ihe ndị kacha taa akpụ ọ ga-eme bụ ime mkpebi ga-abara ndị ezinụlọ ya uru, ọ naghịkwa eji ya egwu egwu. Ọ na-agbalịkwa izere ime mkpebi n’enweghị ezigbo ihe kpatara ya ma ọ bụ n’echebaraghị ya echiche nke ọma. Kama, ọ na-ekwe ka Jehova na-azụ ya. * (Ilu 2:6, 7) Ọ ga-esi otú ahụ gosi na ọ na-eche gbasara ihe ga-abara ndị ọzọ uru, ọ bụghị onwe ya.—Fil. 2:4.

21. Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

21 Jehova nyere ndị isi ezinụlọ ọrụ siri ike. Ha ga-azakwa ya ajụjụ maka otú ha si rụọ ya. Ma, ọ bụrụ na di agbalịa na-eme ka Jehova na Jizọs, ọ ga-abụ ezigbo onyeisi ezinụlọ. Ọ bụrụkwa na nwunye ya ana-arụ ọrụ ya nke ọma, ha ga na-enwe obi ụtọ n’ezinụlọ ha. Olee otú nwaanyị kwesịrị isi na-ele ọrụ di ya bụ́ onyeisi ezinụlọ anya? Oleekwa ihe ndị nwere ike ịna-eme ka o siere ya ike ịnọ n’okpuru di ya? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.

ABỤ NKE 16 Toonụ Jaa n’Ihi Ọkpara Ya O Tere Mmanụ

^ par. 5 Nwoke lụọ nwaanyị, ọ na-abụ onyeisi ezinụlọ ọhụrụ. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ikike Jehova nyere ndị ọzọ na ihe mere o ji nye ha ya, nakwa n’ihe ụmụ nwoke nwere ike ịmụta n’ihe Jehova na Jizọs Kraịst mere. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle ihe ndị di na nwunye nwere ike ịmụta n’aka Jizọs Kraịst nakwa n’aka ndị ọzọ a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. N’isiokwu nke atọ, anyị ga-eleba anya n’ihe ụmụnna nwoke ga-eji ikike e nyere ha n’ọgbakọ na-eme.

^ par. 7 Ụfọdụ akwụkwọ na fim ndị a na-ele taa na-akụziri ndị mmadụ na ọ dị mma ka nwoke na-emegbu nwunye ya ma ọ bụdị na-akụ ya ihe. Ihe a nwere ike ime ka ọtụtụ ndị na-eche na ọ dịghị njọ nwoke ịna-emegbu nwunye ya.

^ par. 20 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu otú e si eme ezigbo mkpebi, gụọ isiokwu bụ́ “Mee Mkpebi Ndị Na-ewetara Chineke Otuto.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche nke Eprel 15, 2011, peeji nke 13 ruo na nke 17.