Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 6

‘Nwoke Bụ Isi nke Nwaanyị’

‘Nwoke Bụ Isi nke Nwaanyị’

“Nwoke bụkwa isi nke nwaanyị.”—1 KỌR. 11:3.

ABỤ NKE 13 Ọ Bụ Kraịst Ka Anyị Na-eso

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Ọ bụrụ na nwanna nwaanyị ekpebiwe onye ọ ga-alụ, olee ajụjụ ụfọdụ o kwesịrị ịjụ onwe ya?

NDỊ KRAỊST niile nọ n’okpuru Jizọs Kraịst bụ́ onyeisi zuru okè. Ma, ọ bụrụ na nwaanyị bụ́ Onye Kraịst alụọ di, ọ na-anọzi n’okpuru di ya bụ́ onye na-ezughị okè. O nwere ike ọ gaghị adịrị ya mfe ime otú ahụ. N’ihi ya, ọ bụrụ na nwanna nwaanyị ekpebiwe onye ọ ga-alụ, o kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Olee ihe gosiri na nwanna a ga-abụ ezigbo onyeisi ezinụlọ? Ihe ka ya mkpa ná ndụ ọ̀ bụ ofufe Jehova? Ọ bụrụ na ọ bụghị ya, olee ihe mere m ji chee na ọ ga-emeli ka okwukwe anyị na-esikwu ike ma anyị lụchaa?’ Ụmụnna nwaanyị kwesịkwara ịjụ onwe ha sị: ‘Olee àgwà ndị m nwere ga-abara anyị uru ma anyị lụọ? M̀ na-enwe ndidi ma na-emesapụ aka? Mụ na Jehova ànyị dị n’ezigbo mma?’ (Ekli. 4:9, 12) Ọ bụrụ na nwaanyị emee mkpebi dị mma tupu ya alụọ di, o nwere ike ime ka alụmdi na nwunye ha na-aga nke ọma, ya na di ya ana-enwekwa obi ụtọ.

2. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?

2 Ọtụtụ nde ụmụnna anyị nwaanyị bụ ndị e ji ama atụ n’ido onwe ha n’okpuru di ha. E kwesịkwara ịja ha mma. Obi dị anyị ụtọ na anyị na ụdị ụmụnna nwaanyị ndị a na-efekọ Jehova ọnụ. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’azịza ajụjụ atọ ndị a: (1) Olee ụfọdụ nsogbu ndị nwunye nwere ike inwe? (2) Olee ihe mere nwaanyị ji ekpebi ido onwe ya n’okpuru di ya? (3) Olee ihe ndị di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst ga-amụta n’aka Jizọs, Abigel, na Meri nne Jizọs gbasara ido onwe ha n’okpuru ndị isi ha?

OLEE ỤFỌDỤ NSOGBU NDỊ NWUNYE BỤ́ NDỊ KRAỊST NWERE IKE INWE?

3. Olee ihe mere na e nweghị di na nwunye na-anaghị enwe nsogbu?

3 Alụmdi na nwunye bụ onyinye zuru oké si n’aka Jehova. Ma, ụmụ mmadụ ezughị okè. (1 Jọn 1:8) Ọ bụ ya mere Baịbụl ji gwa ndị di na nwunye na ha ga-enwe nsogbu ụfọdụ ọ kpọrọ “mkpagbu n’anụ ahụ́.” (1 Kọr. 7:28) Ka anyị hụ ụfọdụ ihe nwere ike isiri ndị nwunye ike.

4. Gịnị nwere ike ime ka nwaanyị chee na ịnọ n’okpuru di ya bụ iwetu onwe ya ala?

4 Ebe nwaanyị toro nwere ike ime ka ọ na-eche na ido onwe ya n’okpuru di ya bụ iwetu onwe ya ala. Otu nwaanyị bi n’Amerịka aha ya bụ Marisol kwuru, sị: “N’ebe m toro, a na-agwakarị ụmụ nwaanyị na ha kwesịrị ime ihe ọ bụla ụmụ nwoke na-eme. Ama m na Jehova nyere ndị di ikike ịbụ isi ndị nwunye ha nakwa na ndị nwunye ha kwesịrị ịna-erubere ha isi. Ma, e kwesịkwara ịna-akwanyere ụmụ nwaanyị ùgwù. Ma ọ naghị adịrị m mfe irubere di m isi mgbe niile, n’ihi na ụwa na-ekwu na ọ bụghị iwu na m ga-eme otú ahụ.”

5. Olee ihe ndị na-adịghị mma ụfọdụ ụmụ nwoke na-eche gbasara ụmụ nwaanyị?

5 Nwaanyị nwekwara ike ịlụ nwoke chere na ụmụ nwoke bara uru karịa ụmụ nwaanyị. Otu nwanna nwaanyị bi n’Ebe Ndịda Amerịka aha ya bụ Ivon kwuru, sị: “N’obodo anyị, ụmụ nwoke na-ebu ụzọ eri nri. Ha richaa, ụmụ nwaanyị erie. Ọ bụ ụmụaka ndị nwaanyị na-esi nri, na-ehichakwa ụlọ. Ma, ụmụaka ndị nwoke na-anọrọ, nne ha na ụmụnne ha ndị nwaanyị ana-ejere ha ozi. A na-agwa ha na ọ bụ hanwa bụ ‘eze nọ n’ụlọ.’” Otu nwanna nwaanyị bi n’Eshia aha ya bụ Yingling sịrị: “E nwere ihe a na-ekwu n’asụsụ anyị nke pụtara na ụmụ nwaanyị ekwesịghị ịma ihe ma ọ bụkwanụ nwee nkà. Ihe bụ́ ọrụ ha bụ ịrụ ọrụ niile dị n’ụlọ. Ha enweghịkwa ikike ịgwa di ha ihe bụ́ obi ha.” Nwoke na-eche echiche otú a Baịbụl na-akwadoghị na-eme ka ihe siere nwunye ya ike. Ọ naghịkwa eme ka Jizọs. Ihe ọ na-eme anaghịkwa adị Jehova mma.—Efe. 5:28, 29; 1 Pita 3:7.

6. Olee ihe ndị nwunye kwesịrị ime ka ha na Jehova nọgide na-adị ná mma?

6 Dị ka e kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, Jehova chọrọ ka Onye Kraịst bụ́ di na-egboro ezinụlọ ya mkpa ha, na-emekwa ka obi dị ha mma. Ọ chọkwara ka ọ na-enyere ha aka ife ya. (1 Tim. 5:8) Ma, ụmụnna nwaanyị lụrụ di kwesịrị ịna-ewepụta oge n’ụbọchị ọ bụla na-agụ Okwu Chineke ma na-atụgharị uche na ya, sirikwa n’ala ala obi ha na-ekpe ekpere. Ime ihe ndị a nwere ike isiri ha ike. Ndị nwunye na-ejikarị ọrụ n’aka. N’ihi ya, o nwere ike ịdị ha ka ha enweghị oge na ike ha ga-eji eme ihe ndị ahụ. Ma, ọ dị ezigbo mkpa ka ha wepụta oge ha ga-eji na-eme ha. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Jehova chọrọ ka onye nke ọ bụla n’ime anyị na-eme ka ya na ya dịrị ná mma nakwa ka anyị gbaa mbọ ka anyị na ya nọgide na-adị ná mma.—Ọrụ 17:27.

7. Olee ihe ga-eme ka ọ dịrị nwaanyị mfe ime ihe Jehova gwara ya mee?

7 O doro anya na o nwere ike ịdị mkpa ka nwaanyị gbaa ezigbo mbọ ka o nwee ike ido onwe ya n’okpuru di ya na-ezughị okè. Ma, ọ ga-adịrị ya mfe ime ihe a Jehova gwara ya mee ma ọ bụrụ na ọ ghọta ma nabata ihe mere Akwụkwọ Nsọ ji kwuo ka ọ nọrọ n’okpuru di ya.

GỊNỊ MERE NWAANYỊ JI EKPEBI ỊNỌ N’OKPURU DI YA?

8. Dị ka e kwuru ná Ndị Efesọs 5:22-24, gịnị mere nwaanyị bụ́ Onye Kraịst ji ekpebi ịnọ n’okpuru di ya?

8 Ihe mere nwaanyị bụ́ Onye Kraịst ji ekpebi ịnọ n’okpuru di ya bụ n’ihi na ọ bụ ihe Jehova gwara ya ka o mee. (Gụọ Ndị Efesọs 5:22-24.) Ọ tụkwasịrị Nna ya nke eluigwe obi n’ihi na ọ ma na ọ hụrụ ya n’anya, marakwa na ihe ọ na-agwa ya mee bụ ihe ga-abara ya uru.—Diut. 6:24; 1 Jọn 5:3.

9. Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na nwanna nwaanyị ana-edo onwe ya n’okpuru di ya?

9 Ụwa na-agwa ụmụ nwaanyị ka ha leghara ihe Jehova kwuru anya, nakwa ka ha na-ele ido onwe ha n’okpuru di ha anya ka iwetu onwe ha ala. Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị na-eme otú ahụ amaghị Chineke anyị hụrụ anyị n’anya. Jehova agaghị agwa ụmụ ya ndị nwaanyị ọ hụrụ n’anya ka ha mee ihe ga-eweda ha ala. Nwanna nwaanyị ga-eme ka udo dịrị n’ezinụlọ ya ma ọ bụrụ na ọ na-agba mbọ na-eme ihe Jehova gwara ya mee. (Ọma 119:165) Ime otú ahụ ga-abara di ya uru, baara yanwa uru, baakwara ụmụ ya.

10. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Carol kwuru?

10 Nwaanyị na-edo onwe ya n’okpuru di ya na-ezughị okè na-egosi na ọ hụrụ Jehova n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù n’ihi na ọ bụ Jehova mere ka e nwee onyeisi n’ezinụlọ. Otu nwanna nwaanyị bi n’ebe ndịda Amerịka aha ya bụ Carol kwuru, sị: “Ama m na di m ga-emehie ihe. Amakwa m na ihe m ga-eme ma di m mehie ihe ga-egosi otú mụ na Jehova dịruru ná mma. N’ihi ya, m na-agbalị ido onwe m n’okpuru di m n’ihi na m chọrọ irubere Nna m nke eluigwe isi.”

11. Olee ihe nyeere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Aneese aka ịna-agbaghara, oleekwa ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe ndị o kwuru?

11 O nwere ike isiri nwaanyị ike irubere di ya isi na ido onwe ya n’okpuru di ya ma ọ bụrụ na ọ na-eche na di ya anaghị eche gbasara ya ma ọ bụkwanụ otú obi dị ya. Ma, ka anyị hụ ihe otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Aneese na-eme ma ụdị ihe a mee. Ọ sịrị: “M na-agbalị ghara iburu di m iwe n’obi. M na-echeta na anyị niile na-emehie ihe. Ihe na-adị m mkpa bụ ịgbaghara, otú ahụ Jehova na-eme. Obi na-eru m ala ma m gbaghara ya.” (Ọma 86:5) Ọ ga na-adịrị nwaanyị na-agbaghara mfe ịnọ n’okpuru di ya.

GỊNỊ KA ANYỊ GA-AMỤTA N’AKA NDỊ A KỌRỌ AKỤKỌ HA NA BAỊBỤL?

12. Olee ihe ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl?

12 Ụfọdụ ndị nwere ike ịna-eche na onye na-edo onwe ya n’okpuru ndị ọzọ adịghị ike. Ma, ọ bụghị eziokwu. Na Baịbụl, a kọrọ akụkọ ọtụtụ ndị nwere obi ike doro onwe ha n’okpuru ndị ọzọ. Ka anyị lee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Jizọs, Abigel, na Meri.

13. Gịnị mere Jizọs ji edo onwe ya n’okpuru Jehova? Kọwaa.

13 Jizọs doro onwe ya n’okpuru Jehova. Ma, ọ bụghị maka na ọ maghị ihe ma ọ bụkwanụ na o nweghị ihe ọ ma eme. Ọ bụ naanị onye nwere ezigbo amamihe ga-akụzili ihe, ya edoo anya, dịkwa mfe nghọta otú ahụ Jizọs mere. (Jọn 7:45, 46) Jehova ma na e nwere ọtụtụ ihe Jizọs nwere ike ime. Ọ bụ ya mere o ji kwe ka ya na ya rụkọọ ọrụ mgbe ọ na-eke ihe niile dị n’eluigwe na n’ụwa. (Ilu 8:30; Hib. 1:2-4) Kemgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, Jehova nyefere ya “ikike niile n’eluigwe na n’elu ụwa.” (Mat. 28:18) N’agbanyeghị na Jizọs nwere nkà, ọ ka na-ekwe ka Jehova na-eduzi ya. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ hụrụ Nna ya n’anya.—Jọn 14:31.

14. Olee ihe ndị di ga-amụta (a) n’otú Jehova si ele ụmụ nwaanyị anya? (b) n’ihe e dere n’Ilu 31?

14 Ihe ndị di nwere ike ịmụta. Ihe mere Jehova ji mee ka ụmụ nwaanyị nọrọ n’okpuru di ha abụghị n’ihi na o weere ha ka ndị na-enweghị ihe ha bụ ma e jiri ha tụnyere ụmụ nwoke. Jehova mere ka nke ahụ doo anya mgbe ọ họọrọ ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị ka ha soro Jizọs chịa. (Gal. 3:26-29) Jehova nyere Ọkpara ya ikike iji gosi na ọ tụkwasịrị ya obi. Otú ahụkwa ka di mara ihe kwesịrị isi nye nwunye ya ikike ime ihe ụfọdụ n’ezinụlọ. Baịbụl kwuru ihe ụfọdụ ezigbo nwaanyị nwere ike ime n’ezinụlọ. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịhazi ọrụ ndị dị n’ụlọ, zụọ ala ma ọ bụ ree ala, na-azụkwa ahịa. (Gụọ Ilu 31:15, 16, 18.) Nwaanyị abụghị ohu na-enweghị ọnụ n’ezinụlọ. Kama, di ya tụkwasịrị ya obi, na-egekwa ya ntị n’ihe ọ na-ekwu. (Gụọ Ilu 31:11, 26, 27.) Ọ bụrụ na di esi otú ahụ na-emeso nwunye ya, ọ gaghị esiri nwunye ya ike ido onwe ya n’okpuru ya.

Olee ihe ndị nwunye na-arụsi ọrụ ike nwere ike ịmụta n’otú Jizọs si doo onwe ya n’okpuru Jehova? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)

15. Gịnị ka ndị nwunye nwere ike ịmụta n’aka Jizọs?

15 Ihe ndị nwunye nwere ike ịmụta. N’agbanyeghị ihe ndị Jizọs merela, o cheghị na ido onwe ya n’okpuru Jehova bụ iwetu onwe ya ala. (1 Kọr. 15:28; Fil. 2:5, 6) Otú ahụ ka ọ dịkwa ezigbo nwaanyị chọrọ ime ka Jizọs. Ọ gaghị ewere ya na ido onwe ya n’okpuru di ya bụ iwetu onwe ya ala. Ihe ga-eme ka ọ na-akwado di ya abụghị naanị na ọ hụrụ ya n’anya. Kama, isi ihe mere ọ ga-eji eme ya bụ na ọ hụrụ Jehova n’anya, chọọkwa ịna-erubere ya isi.

Mgbe Abigel zigachaara Devid na ndị ya na ha so ihe oriri, ọ gakwuuru ya. O gburu ikpere n’ala ma rịọ ya ka ọ ghara ime ihe ga-eme ka ikpe ọbara ma ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)

16. Dị ka e kwuru na 1 Samuel 25:3, 23-28, olee nsogbu bịaara Abigel? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

16 Aha di Abigel bụ Nebal. Nebal dị mpako, na-achọ ọdịmma naanị onwe ya, ọ naghịkwa eji ihe e meere ya akpọrọ ihe. Ma, Abigel ejighị maka ya sị na ya anaghịzi alụ ya. Ọ bụrụ na Abigel chọrọ, ọ gaara agbachi nkịtị ka Devid na ụmụ nwoke ya na ha so gbuo di ya. Kama ime otú ahụ, o mere ihe iji chebe Nebal na nnukwu ezinụlọ ya. Chegodị ụdị obi ike Abigel nwere ịbịakwute ndị agha dị narị anọ na-agwa Devid okwu. Ọ rịọchiteere di ya arịrịọ maka ihe ndị o mere. (Gụọ 1 Samuel 25:3, 23-28.) Devid ghọtara ozugbo na Jehova si n’aka Abigel na-egbochi ya ime mmehie jọgburu onwe ya.

17. Olee ihe ndị di nwere ike ịmụta n’ihe a kọrọ gbasara Devid na Abigel?

17 Ihe ndị di nwere ike ịmụta. Abigel bụ nwaanyị maara ihe. Otú Devid si gee ya ntị gosiri na Devid maara ihe. Ntị o gere ya mere ka ikpe ọbara ghara ịma ya. Ọ bụ otú ahụ ka di nwere amamihe kwesịrị isi na-ege nwunye ya ntị ma o mewe mkpebi dị mkpa. Ihe nwunye ya kwuru nwere ike ime ka ọ ghara ime mkpebi na-adịghị mma.

18. Gịnị ka ndị nwunye nwere ike ịmụta n’aka Abigel?

18 Ihe ndị nwunye nwere ike ịmụta. Nwaanyị hụrụ Jehova n’anya ga-abara ezinụlọ ya uru, ọ bụrụgodị na di ya anaghị efe Jehova ma ọ bụ na ọ naghị ebi ndụ otú Jehova chọrọ. Ọ gaghị achọ isi n’ụzọ Baịbụl na-akwadoghị hapụ di ya. Kama nke ahụ, ọ ga-edo onwe ya n’okpuru di ya, na-agbalịkwa ime ihe ọ bụla o nwere ike ime ka di ya mụta gbasara Jehova. (1 Pita 3:1, 2) Ọ bụrụgodị na àgwà ọma ya emeghị ka di ya gbanwee, obi ga-adị Jehova ụtọ na ọ na-erubere ya isi.

19. Olee mgbe o kwesịrị ka nwanna nwaanyị jụ ime ihe di ya kwuru?

19 Nwaanyị bụ́ Onye Kraịst agaghị ege di ya ntị ma ọ bụrụ na ọ gwa ya mee ihe megidere iwu Chineke e dere na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, di nwanna nwaanyị na-abụghị Onye Kraịst nwere ike ịgwa ya ka ọ ghaa ụgha, zuo ohi, ma ọ bụkwanụ mee ihe ọzọ Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị. Ndị Kraịst niile, ma ụmụnna nwaanyị lụrụ di, kwesịrị ịna-erubere Jehova isi karịa onye ọ bụla ọzọ. Ọ bụrụ na a gwa nwanna nwaanyị ka o mee ihe Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị, o kwesịrị ịjụ. O kwesịkwara iji nwayọọ kọwaa ihe mere o ji sị na ya agaghị eme ihe ahụ.—Ọrụ 5:29.

A ga-akọwa ya na paragraf nke 20 *

20. Olee otú anyị si mara na Meri na Jehova dị n’ezigbo mma?

20 Meri na Jehova dị n’ezigbo mma. Ọ makwa Akwụkwọ Nsọ nke ọma. Mgbe ya na Elizabet bụ́ nne Jọn Onye Na-eme Baptizim na-akparịta ụka, o kwuru ihe karịrị ihe iri abụọ si n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. (Luk 1:46-55) Chegodị echiche: Ọ bụ eziokwu na Meri na Josef ekwela onwe ha nkwa na ha ga-alụ, mmụọ ozi Chineke ebughị ụzọ gakwuru Josef. O bu ụzọ gakwuru Meri ma gwa ya na ọ ga-amụ Ọkpara Chineke. (Luk 1:26-33) Jehova maara Meri nke ọma, tụkwasịkwa ya obi na ọ ga-ahụ Ọkpara ya n’anya ma lekọta ya nke ọma. Meri na Jehova nọgidekwara na-adị ná mma ruo mgbe Jizọs nwụrụ, a kpọlite ya n’ọnwụ, ya agaa eluigwe.—Ọrụ 1:14.

21. Olee ihe ndị di ga-amụta n’ihe Baịbụl kwuru gbasara Meri?

21 Ihe ndị di nwere ike ịmụta. Di nwere amamihe na-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na nwunye ya amara Akwụkwọ Nsọ nke ọma. Ọ gaghị na-ewere ya iwe ma na-eche na ọ chọziri ịbụ onyeisi ezinụlọ. Ọ ma na nwunye ya ga-abara ezinụlọ ha uru ma ọ mara Akwụkwọ Nsọ nke ọma. Ọ bụrụgodị na nwunye ya gụrụ akwụkwọ karịa ya, ọ ka bụkwa ọrụ ya ịna-ebute ụzọ n’ofufe ezinụlọ ha nakwa n’ihe ndị ọzọ gbasara ofufe Chineke.—Efe. 6:4.

Olee ihe ndị nwunye ga-amụta n’aka Meri nne Jizọs gbasara ịmụ ihe n’onwe ha na ịtụgharị uche? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 22) *

22. Olee ihe ndị nwunye ga-amụta n’aka Meri?

22 Ihe ndị nwunye nwere ike ịmụta. Nwaanyị ọ bụla kwesịrị irubere di ya isi. Ma, ọ bụ n’aka ya ka ọ dị ime ka ya na Chineke dịrị ná mma. (Gal. 6:5) N’ihi ya, o kwesịrị iwepụta ohere ọ ga-eji na-amụ ihe n’onwe ya, na-atụgharịkwa uche. Ọ ga-eme ka ọ na-ahụ Jehova n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù, meekwa ka o jiri obi ụtọ na-edo onwe ya n’okpuru di ya.

23. Olee otú ụmụnna nwaanyị na-edo onwe ha n’okpuru di ha si abara onwe ha, ezinụlọ ha, na ọgbakọ uru?

23 Ụmụnna nwaanyị na-erubere di ha isi n’ihi na ha hụrụ Jehova n’anya na-enwe ezigbo obi ụtọ karịa ndị na-anaghị erubere iwu Jehova nyere gbasara nwaanyị ịnọ n’okpuru di ya isi. Ha na-akpa àgwà ọma ndị ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ nọ n’ọgbakọ kwesịrị iṅomi. Ha na-emekwa ka mmadụ niile nọ n’ọgbakọ dịrị n’udo ma na-enwe obi ụtọ. (Taị. 2:3-5) Taa, ọtụtụ n’ime ndị ji obi ha niile na-efe Jehova bụ ụmụnna nwaanyị. (Ọma 68:11) Ma ànyị bụ nwoke ma ànyị bụ nwaanyị, anyị niile nwere ike itinye aka mee ka a na-enwe obi ụtọ n’ọgbakọ. Isiokwu na-esonụ ga-eme ka anyị mata otú onye nke ọ bụla n’ime anyị ga-esi eme ya.

ABỤ NKE 131 “Ihe Chineke Kekọtara”

^ par. 5 Jehova haziri ka nwaanyị nọrọ n’okpuru di ya. Ma, gịnị ka nke a pụtara? Ndị di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst ga-amụta ezigbo ihe gbasara mmadụ ido onwe ya n’okpuru ndị bụ́ ndị isi ha n’aka Jizọs na ụmụ nwaanyị ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl.

^ par. 68 NKỌWA FOTO: Mgbe Meri na Elizabet nne Jọn Onye Na-eme Baptizim na-ekwurịta okwu, o kwuru ọtụtụ ihe si n’Akwụkwọ Nsọ Hibru o bu n’isi.

^ par. 70 NKỌWA FOTO: Nwanna nwaanyị lụrụ di kwesịkwara iwepụta oge na-amụ ihe n’onwe ya iji mee ka ya na Jehova dịrị n’ezigbo mma.