Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 8

Ịna-enwe Ọṅụ n’Oge Ọnwụnwa

Ịna-enwe Ọṅụ n’Oge Ọnwụnwa

“Gụọnụ ya n’ihe ọṅụ, ụmụnna m, mgbe unu zutere ọnwụnwa dị iche iche.”—JEMS 1:2.

ABỤ NKE 111 Ihe Mere Anyị Ji Enwe Ọṅụ

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. Dị ka e kwuru na Matiu 5:11, olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ọnwụnwa anya?

JIZỌS kwere ndị na-eso ụzọ ya nkwa na ha ga na-enwe ezigbo obi ụtọ. Ọ gwakwara ndị hụrụ ya n’anya na ọnwụnwa ga-abịara ha. (Mat. 10:22, 23; Luk 6:20-23) Anyị na-enwe ọṅụ na anyị bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Ma, olee otú obi na-adị anyị ma ndị ezinụlọ anyị chọọ ka anyị kwụsị ife Jehova, ndị ọchịchị na-akpagbu anyị, ma ọ bụkwanụ ma ụmụ klas anyị ma ọ bụ ndị ọrụ ibe anyị chọọ ka anyị mee ihe na-adịghị mma? O doro anya na iche gbasara ụdị ihe ndị ahụ nwere ike ime ka anyị chegbuwe onwe anyị.

2 Ọtụtụ ndị anaghị ele mkpagbu anya ka ihe ga-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ. Ma, ọ bụ ihe Okwu Chineke gwara anyị ka anyị na-eme. Dị ka ihe atụ, Jems gwara anyị ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị n’ihi ọnwụnwa, kama ka anyị na-ele ya anya ka ihe ga-eme ka anyị na-enwe ọṅụ. (Jems 1:2, 12) Jizọs gwakwara anyị na anyị kwesịrị ịna-enwe obi ụtọ, ma mgbe a na-akpagbu anyị. (Gụọ Matiu 5:11.) Olee otú anyị nwere ike isi na-enwe ọṅụ n’agbanyeghị ọnwụnwa? Ileba anya n’akwụkwọ ozi Jems degaara Ndị Kraịst oge mbụ ga-enyere anyị ezigbo aka ime otú ahụ. Ma, ka anyị buru ụzọ leba anya n’ọnwụnwa ndị bịaara Ndị Kraịst oge mbụ.

OLEE ỌNWỤNWA NDỊ BỊAARA NDỊ KRAỊST OGE MBỤ?

3. Gịnị mere obere oge Jems ghọchara onye na-eso ụzọ Jizọs?

3 Obere oge Jems nwanne Jizọs ghọrọ onye na-eso ụzọ Jizọs, a malitere ịkpagbu Ndị Kraịst nọ na Jeruselem. (Ọrụ Ndịozi 1:14; 5:17, 18) Mgbe e gburu Stivin, ọtụtụ Ndị Kraịst gbapụrụ n’obodo ahụ. A chụsasịkwara ha “n’ógbè ndị dị gburugburu Judia na Sameria.” Ha mechara ruo Saịprọs na Antiọk. (Ọrụ 7:58–8:1; 11:19) Ọtụtụ nsogbu bịaara Ndị Kraịst ndị ahụ. N’agbanyeghị ya, ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma n’ebe ọ bụla ha gara. Ha hiwekwara ọgbakọ n’ebe dị iche iche ndị Rom na-achị. (1 Pita 1:1) Ma, e nwekwara ọtụtụ nsogbu ndị ọzọ bịaara Ndị Kraịst oge ochie ahụ.

4. Olee nsogbu ndị ọzọ bịaara Ndị Kraịst oge mbụ?

4 Ọtụtụ ọnwụnwa bịaara Ndị Kraịst oge mbụ. Dị ka ihe atụ, n’ihe dị ka n’afọ 50, Eze Ukwu Rom aha ya bụ Klọdiọs nyere iwu ka ndị Juu niile pụọ na Rom. Ihe a mere ka ndị Juu niile ghọrọ Ndị Kraịst kwapụ n’ụlọ ha, kwaga ebe ọzọ. (Ọrụ 18:1-3) N’ihe dị ka afọ 61, Pọl onyeozi dere na a kọchara Ndị Kraịst ibe ya n’ihu ọha, tụọ ha mkpọrọ, bukọrọkwa ngwongwo ha. (Hib. 10:32-34) Ụfọdụ Ndị Kraịst dara ogbenye, na-arịakwa ọrịa, otú ahụ ọ dịkwa ndị ọzọ.—Rom 15:26; Fil. 2:25-27.

5. Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza?

5 Mgbe Jems dere akwụkwọ ozi ya tupu afọ 62, ọ ma nsogbu ndị na-abịara ụmụnna ya. Jehova mere ka Jems degara Ndị Kraịst ndị ahụ akwụkwọ ozi, gwa ha ihe ga-enyere ha aka ịna-enwe ọṅụ ma mgbe ọnwụwa bịaara ha. Ka anyị leba anya n’akwụkwọ ozi Jems ahụ ma zaa ajụjụ ndị a: Olee ụdị ọṅụ Jems na-ekwu gbasara ya? Olee ihe nwere ike ime ka Onye Kraịst ghara ịna-enwe ụdị ọṅụ ahụ? Olee otú amamihe, okwukwe, na obi ike ga-esi nyere anyị aka iji ọnụ na-efe Jehova n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị na-abịara anyị?

GỊNỊ NA-EME KA ONYE KRAỊST NA-ENWE ỌṄỤ?

Otú ahụ ọkụ a mụnyere na lampụ na-anọgide na-enwu ka Onye Kraịst na-anọgide na-enwe ọṅụ Jehova na-eme ka anyị nwee (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)

6. Dị ka e kwuru na Luk 6:22, 23, gịnị nwere ike ime ka Onye Kraịst na-enwe ọṅụ mgbe ọnwụnwa bịaara ya?

6 Ụfọdụ ndị nwere ike ịna-eche na naanị ihe ga-eme ka ha na-enwe ọṅụ bụ ma ahụ́ gbasie ha ike, ma ha nwee nnukwu ego, ma ọ bụkwanụ ma ha na-ebi n’udo n’ezinụlọ ha. Ma, ọ bụ mmụọ nsọ Chineke na-eme ka mmadụ nwee ụdị ọṅụ ahụ Jems na-ekwu okwu ya. Ọ bụ ya mere anyị ga-eji na-enwe ọṅụ n’agbanyeghị otú ihe si dịrị anyị. (Gal. 5:22) Ihe na-eme ka Onye Kraịst na-enwe ọṅụ ma ọ bụ na-enwe ezigbo obi ụtọ bụ ma ọ mata na ọ na-eme ihe dị Jehova mma, na-emekwa ka Jizọs. (Gụọ Luk 6:22, 23; Kọl. 1:10, 11) E nwere ike iji ụdị ọṅụ a tụnyere ọkụ a mụnyere na lampụ. Ọkụ ahụ na-anọgide na-enwu n’agbanyeghị mmiri ozuzo ma ọ bụ ifufe. Anyị nwere ike ịna-enwe ụdị ọṅụ a n’agbanyeghị otú ihe si dịrị anyị. Anyị agaghị akwụsị inwe ọṅụ ma mgbe ọrịa bịara anyị ma mgbe ego kọrọ anyị. Ịkwa emo na mkpagbu ndị ezinụlọ anyị na ndị ọzọ na-akpagbu anyị anaghị eme ka anyị kwụsị inwe ọṅụ. Anyị na-enwekwu ọṅụ mgbe ọ bụla ndị mmadụ chọrọ ka anyị kwụsị inwe ọṅụ. Ọnwụnwa ndị na-abịara anyị n’ihi okwukwe anyị na-egosi na anyị bụ ezigbo ndị na-eso ụzọ Kraịst. (Mat. 10:22; 24:9; Jọn 15:20) Ọ bụ ya mere Jems ji dee, sị: “Gụọnụ ya n’ihe ọṅụ, ụmụnna m, mgbe unu zutere ọnwụnwa dị iche iche.”—Jems 1:2.

Gịnị mere e nwere ike iji jiri ọnwụnwa tụnyere ọkụ e ji akpụ mma? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7) *

7-8. Olee uru ọnwụnwa na-abara okwukwe anyị?

7 Jems kwukwara ihe ọzọ na-eme ka Onye Kraịst dị njikere idi ọnwụnwa ndị siri ike. Ọ sịrị: “Okwukwe unu nke a nwalere anwale otú a na-arụpụta ntachi obi.” (Jems 1:3) E nwere ike iji ọnwụnwa tụnyere ọkụ e ji akpụ mma. E tinye mma ahụ n’ọkụ, wepụta ya, ya ajụọ oyi, ọ na-esikwu ike. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyị, anyị na-edi ọnwụnwa, ọ na-eme ka okwukwe anyị na-esikwu ike. Ọ bụ ya mere Jems ji dee, sị: “Ka ntachi obi rụzuo ọrụ ya, ka unu wee zuo ezu, gbasiekwa ike n’ụzọ niile.” (Jems 1:4) Ọ bụrụ na anyị ahụ na ọnwụnwa na-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike, ọ na-eme ka anyị jiri ọṅụ na-edi ya.

8 N’akwụkwọ ozi ahụ Jems dere, o kwukwara ụfọdụ ihe nwere ike ime ka mmadụ kwụsị ịna-enwe ọṅụ. Gịnị bụ ihe ndị ahụ? Oleekwa otú anyị ga-esi merie ha?

IMERI NSOGBU NDỊ NWERE IKE IME KA ANYỊ GHARA ỊNA-ENWE ỌṄỤ

9. Gịnị mere amamihe ji dị anyị mkpa?

9 Nsogbu: Mgbe anyị na-amaghị ihe anyị ga-eme. Ọ bụrụ na ọnwụnwa abịara anyị, anyị na-achọ ka Jehova nyere anyị aka ikpebi ihe anyị ga-eme ga-adị ya mma, baara ụmụnna anyị uru, meekwa ka anyị na-erubere ya isi. (Jere. 10:23) Amamihe dị anyị mkpa iji mara ihe anyị ga-eme nakwa iji mara ihe anyị ga-agwa ndị na-akpagbu anyị. Ọ bụrụ na anyị amaghị ihe anyị ga-eme, o nwere ike ime ka anyị daa mbà, meekwa ka anyị kwụsị inwe ọṅụ.

10. Gịnị ka Jems 1:5 gwara anyị na anyị kwesịrị ịna-eme ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta amamihe?

10 Ihe ị ga-eme: Rịọ Jehova ka o nye gị amamihe. Iji nwee ike iji ọṅụ na-edi ọnwụnwa ndị bịaara anyị, anyị kwesịrị ibu ụzọ rịọ Jehova ka o nye anyị amamihe anyị ga-eji na-eme mkpebi ndị dị mma. (Gụọ Jems 1:5.) Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma anyị chee na Jehova azaghị anyị ekpere anyị ozugbo? Jems kwuru na anyị kwesịrị ‘ịna-arịọ Chineke.’ Jehova anaghị ewe iwe ma anyị nọgide na-arịọ ya ka o nye anyị amamihe. Nna anyị nke eluigwe “na-eji mmesapụ aka” enye anyị amamihe ma anyị rịọ ya maka ya iji die ọnwụnwa ndị na-abịara anyị. (Ọma 25:12, 13) Ọ na-ahụ ọnwụnwa ndị na-abịara anyị, na-enwere anyị ọmịiko, dịrịkwa njikere inyere anyị aka. Nke a na-eme ka anyị na-enwe ezigbo ọṅụ. Ma, olee otú Jehova si enye anyị amamihe?

11. Olee ihe ọzọ anyị ga-eme iji nweta amamihe?

11 Jehova na-esi n’Okwu ya enye anyị amamihe. (Ilu 2:6) Iji nweta amamihe ahụ, anyị ga na-amụ Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. Ma, ihe dị anyị mkpa abụghị naanị ịna-amụ Baịbụl. Anyị ga na-emekwa ihe anyị mụtara na ya. Jems dere, sị: “Bụrụnụ ndị na-eme okwu Chineke, unu abụla ndị na-anụ naanị ọnụnụ.” (Jems 1:22) Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe Baịbụl kwuru, anyị ga na-eme udo, nwee ezi uche, na-emekwa ebere. (Jems 3:17) Àgwà ndị a na-enyere anyị aka idi ọnwụnwa ọ bụla bịaara anyị ma ka na-enwe ọṅụ.

12. Gịnị mere ịma Baịbụl nke ọma ji dị mkpa?

12 Okwu Chineke dị ka enyo. Ọ na-enyere anyị aka ịhụ ihe anyị ga-emezikwu na otú anyị ga-esi emezi ya. (Jems 1:23-25) Dị ka ihe atụ, anyị na-amụ Baịbụl, anyị nwere ike ịchọpụta na o kwesịrị ka anyị na-ejide onwe anyị ma iwe bịa anyị. Jehova ga-enyere anyị aka ịmụta otú anyị ga-esi na-ejide onwe anyị ma ndị mmadụ ma ọ bụ ihe ọzọ kpasuo anyị iwe. Anyị na-ejide onwe anyị, ọ ga-eme ka anyị nwee ike ịna-eche echiche nke ọma, na-emekwa mkpebi ndị dị mma. (Jems 3:13) Ịma Baịbụl nke ọma dị ezigbo mkpa.

13. Gịnị mere anyị kwesịrị iji mụọ gbasara ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl?

13 Mgbe ụfọdụ, anyị na-esi n’ihe anyị na-emetaghị mụta ihe. Ma, ọ bụghị ụzọ ka mma isi mụta ihe. Ụzọ ka mma isi nweta amamihe bụ isi n’ihe ndị ọzọ metara na ihe ha mejọrọ mụta ihe. Ọ bụ ya mere Jems ji gwa anyị ka anyị mụọ gbasara ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, ndị dị ka Ebreham, Rehab, Job, na Ịlaịja. (Jems 2:21-26; 5:10, 11, 17, 18) Ndị a ji obi ha fee Jehova diri ọnwụnwa ndị gaara eme ka ha kwụsị ịna-enwe ọṅụ. Otú ha si tachie obi na-egosi anyị na Jehova nwekwara ike inyere anyị aka ime ka ha.

14-15. Gịnị mere anyị kwesịrị iji gbalịa ka anyị kwụsị inwe obi abụọ?

14 Nsogbu: Inwe obi abụọ. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike isiri anyị ike ịghọta ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru. Ma ọ bụkwanụ, ya abụrụ na Jehova azaghị anyị ekpere anyị otú anyị tụrụ anya ya. Ihe a nwere ike ime ka anyị nwewe obi abụọ. Ọ bụrụ na o nweghị ihe anyị mere gbasara ya, o nwere ike ime ka okwukwe anyị ghara isi ike, kpaakwa adịm ná mma anyị na Jehova aka ọjọọ. (Jems 1:7, 8) O nwedịrị ike ime ka anyị kwụsị inwe olileanya maka ọdịnihu.

15 Pọl onyeozi ji olileanya anyị tụnyere arịlịka. (Hib. 6:19) Arịlịka na-ejide ụgbọ mmiri n’oge oké ifufe, meekwa ka ifufe ahụ ghara iburu ya gaa kụọ na nkume. Ma, naanị ihe na-eme ka arịlịka baa uru bụ ma ọ bụrụ na agbụ ígwè e ji kegide ya n’ụgbọ mmiri ahụ adọbighị. Otú ahụ nchara si eme ka agbụ ígwè ghara isi ike ka obi abụọ nwere ike isi mee ka okwukwe anyị gharakwa isi ike. Mkpagbu nwere ike ime ka onye nwere obi abụọ kwụsị inwe okwukwe na Jehova ga-emezu nkwa ndị o kwere. Ọ bụrụ na anyị akwụsị inwe okwukwe, anyị ga-akwụsị inwe olileanya. Dị ka Jems kwuru, onye nwere obi abụọ “dị ka ebili mmiri nke oké osimiri nke ifufe na-akwagharị, na-enugharịkwa.” (Jems 1:6) O nwere ike onye ahụ agaghị na-enwe ọṅụ ma otu.

16. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị na-enwe obi abụọ?

16 Ihe ị ga-eme: Gbalịa kwụsị inwe obi abụọ, meekwa ka okwukwe gị sie ike. Egbula oge ime ihe gbasara ya. N’oge Ịlaịja onye amụma, ndị Jehova malitere inwe obi abụọ. Ịlaịja gwara ha, sị: “Ruo ole mgbe ka unu ga na-enwe echiche abụọ dị iche? Ọ bụrụ na ọ bụ Jehova bụ ezi Chineke, sowenụ ya; ma ọ bụrụ na ọ bụ Bel, sowenụ ya.” (1 Eze 18:21) Taa, anyị kwesịkwara ime ihe ozugbo. Anyị kwesịrị ime nchọnchọ iji mee ka obi sie anyị ike na ọ bụ Jehova bụ ezi Chineke, na Baịbụl bụ Okwu ya, nakwa na ọ bụ Ndịàmà Jehova bụ ndị Chineke. (1 Tesa. 5:21) Ime ka obi sie anyị ike n’ihe ndị a ga-eme ka anyị kwụsị inwe obi abụọ, meekwa ka okwukwe anyị sie ike. Anyị nwere ike ịgakwuru ndị okenye ma anyị chọọ ka e nyere anyị aka ịkwụsị inwe obi abụọ. Anyị kwesịrị ime ihe ngwa ngwa ma ọ bụrụ na anyị chọrọ iji ọṅụ na-ejere Jehova ozi.

17. Gịnị ga-eme ma anyị kwụsị inwe obi ike?

17 Nsogbu: Ịda mbà n’obi. Okwu Chineke gwara anyị, sị: “Ì nwewo obi ịda mbà n’ụbọchị ahụhụ? Ike gị ga-adị ntakịrị.” (Ilu 24:10) Okwu Hibru a sụgharịrị “ịda mbà” nwere ike ịpụta “ịkwụsị inwe obi ike.” Ọ bụrụ na ị kwụsị inwe obi ike, ọ gaghị ara ahụ́ gị akwụsị inwe ọṅụ.

18. Gịnị ka mmadụ ịtachi obi pụtara?

18 Ihe ị ga-eme: Tụkwasị Jehova obi na ọ ga-enye gị obi ike i ji edi ọnwụnwa. Obi ike dị anyị mkpa iji na-edi ọnwụnwa ndị na-abịara anyị. (Jems 5:11) Ihe Jems kwuru a sụgharịrị “ntachi obi” pụtara mmadụ ịkwụsi ike n’otu ebe. O nwere ike ime ka anyị cheta onye agha ji obi ike kwụrụ ebe ọ kwụ, jụ ịgba ọsọ mgbe ndị agha bịara ịlụso ya ọgụ.

19. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Pọl onyeozi mere?

19 Pọl onyeozi bụ onye e ji ama atụ n’inwe obi ike na n’ịtachi obi. E nwere mgbe ụfọdụ ike gwụrụ ya. Ma, ihe nyeere ya aka ịtachi obi bụ na ọ tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-enye ya ike. (2 Kọr. 12:8-10; Fil. 4:13) Anyị ga-enwe ụdị ike na ụdị obi ike Pọl nwere ma ọ bụrụ na anyị ejiri umeala n’obi kweta na anyị chọrọ enyemaka Jehova.—Jems 4:10.

GỊ NA CHINEKE DỊRỊ NÁ MMA KA I NWEE IKE ỊNA-ENWE ỌṄỤ

20-21. Gịnị ka obi kwesịrị isi anyị ike na ya?

20 Ka obi sie anyị ike na Jehova ejighị ọnwụnwa ndị na-abịara anyị ata anyị ahụhụ. Jems gwara anyị, sị: “N’oge ọnwụnwa, ka onye ọ bụla ghara ịsị: ‘Ọ bụ Chineke na-anwa m.’ N’ihi na a pụghị iji ihe ọjọọ nwaa Chineke, ya onwe ya adịghịkwa anwa onye ọ bụla.” (Jems 1:13) Ọ bụrụ na obi esie anyị ike na ihe a bụ eziokwu, anyị na Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya ga-adịkwu ná mma.—Jems 4:8.

21 Jehova anaghị “agbanwe agbanwe.” (Jems 1:17) O nyeere Ndị Kraịst oge mbụ aka mgbe ọnwụnwa bịaara ha. Ọ ga-enyekwara onye ọ bụla n’ime anyị aka taa. Si n’ala ala obi gị rịọ Jehova ka o mee ka i nweta amamihe, okwukwe, na obi ike. Ọ ga-aza ekpere gị. Obi ga-esikwa gị ike na ọ ga-enyere gị aka iji ọṅụ na-edi ọnwụnwa ndị na-abịara gị.

ABỤ NKE 128 Ka Anyị Tachie Obi Ruo Ọgwụgwụ

^ par. 5 E nwere ọtụtụ ndụmọdụ dị n’akwụkwọ Jems ga-enyere anyị aka n’oge ọnwụnwa. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ụfọdụ ndụmọdụ ndị ahụ. Ndụmọdụ ndị ahụ nwere ike inyere anyị aka ịna-edi ọnwụnwa ma ka jiri ọṅụ na-efe Jehova.

^ par. 59 NKỌWA FOTO: Ebe ndị uwe ojii bịara n’ụlọ otu nwanna kpụrụ ya, nwunye ya na nwa ya nwaanyị ana-ele ha. Mgbe nwanna ahụ nọ n’ụlọ mkpọrọ, ndị ọgbakọ ha sooro nwanna nwaanyị ahụ na nwa ya nwaanyị na-amụ ihe. Nwanna nwaanyị ahụ na nwa ya nwaanyị na-arịọ Jehova mgbe niile ka o nye ha ike iji die ọnwụnwa ahụ bịaara ha. Jehova mere ka obi ruo ha ala, ha enweekwa obi ike. Nke a mere ka okwukwe ha sikwuo ike, meekwa ka ha jiri ọṅụ na-atachi obi.