Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Uru Ịmụmụ Ọnụ Ọchị Bara

Uru Ịmụmụ Ọnụ Ọchị Bara

KA ỤMỤ agbọghọ abụọ nọ na-aga n’otu obodo a na-akpọ Bangui Siti, dị na Filipinz, ha hụrụ ihe a na-akwagharị akwagharị e ji ezi ozi ọma, ma ha erughị ya nso. Otu nwanna nwaanyị nọ n’akụkụ ihe nkwagharị ahụ aha ya bụ Helen mụmụụrụ ha ọnụ ọchị. Ụmụ agbọghọ ndị ahụ gawara ebe ha na-aga, ma ọnụ ọchị ahụ Nwanna Nwaanyị Helen mụmụụrụ ha masịrị ha.

Mgbe e mechara, ka ụmụ agbọghọ ahụ nọ n’ụgbọala na-ala, ha hụrụ ebe e dere jw.org n’ihu otu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ha chetara na ọ bụ otu ihe ahụ ka e dere n’ihe nkwagharị ahụ ha hụrụ. Ha abụọ rịturu n’ụgbọala gaa lee oge ndị e dere n’ihu ebe ahụ ọgbakọ dị iche iche ji amụ ihe.

Ụmụ agbọghọ abụọ ahụ gara otu n’ime ọmụmụ ihe e nwere ebe ahụ. Ka ha na-abanye n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ị̀ ma onye ha hụrụ? Ọ bụ Nwanna Nwaanyị Helen. Ha chetara ozugbo na ọ bụ ya bụ onye ahụ mụmụụrụ ha ọnụ ọchị. Nwanna Nwaanyị Helen kwuru, sị: “Mgbe ha bịakwutere m, ụjọ tụtụrụ m. M nọ na-eche ma ò nweela ihe ọjọọ m mere.” Ma, ha kọwaara Helen otú ha si mata ya.

Ọmụmụ ihe ahụ tọrọ ụmụ agbọghọ ndị ahụ ụtọ. Otú ụmụnna si nabata ha mere ka obi ruo ha ala. Mgbe ha hụrụ ka a na-azacha Ụlọ Nzukọ Alaeze mgbe ọmụmụ ihe gbasara, ha jụrụ ma hà nwere ike inye aka. Ọ dịghị anya, otu n’ime ụmụ agbọghọ ndị ahụ apụọ n’obodo ahụ. Onye nke ọzọ bidoro ịbịa ọmụmụ ihe. Ọ malitekwala ịmụ Baịbụl. Ihe kpatara ihe ndị a bụ ọnụ ọchị ahụ a mụmụụrụ ha.