Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 17

Jehova Ji Gị Kpọrọ Ihe

Jehova Ji Gị Kpọrọ Ihe

“Ihe ndị Jehova na-atọ ya ụtọ.”—ỌMA 149:4.

ABỤ NKE 108 Ịhụnanya Chineke

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

Ihe onye ọ bụla n’ime anyị “na-atọ” Nna anyị nke eluigwe ụtọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 1)

1. Olee ihe Jehova na-ahụ n’ebe ndị ya nọ?

“IHE ndị Jehova na-atọ ya ụtọ.” (Ọma 149:4) Ihe a na-eme anyị ezigbo obi ụtọ. Jehova na-ahụ àgwà ọma dị iche iche anyị nwere, ọ na-ahụkwa ihe ọma ndị anyị nwere ike ime, na-achọkwa ka anyị na ya dịrị n’ezigbo mma. Ọ bụrụ na anyị ana-erubere ya isi, anyị na ya ga-adị ná mma ruo mgbe ebighị ebi.—Jọn 6:44.

2. Gịnị mere o ji esiri ụfọdụ ndị ike ikweta na Jehova hụrụ ha n’anya?

2 Ụfọdụ ndị na-asị, ‘Ama m na Jehova hụrụ ndị ya n’anya. Ma, olee otú m ga-esi ama ma Jehova ọ̀ hụrụ mụnwa n’anya?’ Olee ihe nwere ike ime ka mmadụ jụọ ụdị ajụjụ ahụ? Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Oksana * nwere ọtụtụ nsogbu mgbe ọ na-eto eto. Ọ sịrị: “Obi dị m ụtọ mgbe m mere baptizim, malitekwa ịsụ ụzọ. Ma mgbe afọ iri na ise gachara, ihe ndị mere n’oge gara aga bịara na-enye m nsogbu n’obi, mụ ekwubie na ihe m adịghịzi Jehova mma, nakwa na ọ gaghị ahụli m n’anya.” Nwanna nwaanyị ọzọ bụ́ ọsụ ụzọ aha ya bụ Yua, onye nwekwara nsogbu n’oge ọ ka na-eto eto, sịrị: “Enyefere m Jehova onwe m n’ihi na m chọrọ ime ya obi ụtọ. Ma, m kwetara na ọ gaghị ahụli m n’anya.”

3. Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?

3 Dị ka ụmụnna nwaanyị abụọ ahụ anyị kwuru okwu ha, ị hụrụ Jehova n’anya. Ma, o nwekwara ike ịna-eme gị obi abụọ ma ọ̀ hụkwara gị n’anya. Olee ihe mere obi kwesịrị iji sie gị ike na Jehova hụrụ gị n’anya? Oleekwa ihe ga-enyere gị aka ma i nwewe obi abụọ ma Jehova ọ̀ hụrụ gị n’anya? Anyị ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu a.

INWE OBI ABỤỌ MA JEHOVA Ọ̀ HỤRỤ ANYỊ N’ANYA NWERE IKE ỊKPATARA ANYỊ NSOGBU

4. Gịnị mere inwe obi abụọ ma Jehova ọ̀ hụrụ anyị n’anya nwere ike iji kpatara anyị nsogbu?

4 Ọ bụrụ na obi esie anyị ike na Jehova hụrụ anyị n’anya, anyị ga na-eme ike anyị niile n’ofufe ya ọ bụrụgodị na ihe siiri anyị ike. Ma, ọ bụrụ na anyị na-enwe obi abụọ ma Jehova ọ̀ hụrụ anyị n’anya, ike anyị “ga-adị ntakịrị.” (Ilu 24:10) Ọ bụrụ na obi esighị anyị ike na Jehova hụrụ anyị n’anya, ọ ga-eme ka Ekwensu nweta anyị ngwa ngwa.—Efe. 6:16.

5. Gịnị mere ụfọdụ ụmụnna anyị nwere obi abụọ ma Jehova ọ̀ hụkwara ha n’anya?

5 E nwere ụfọdụ ụmụnna anyị malitere inwe obi abụọ n’oge a ma Jehova ọ̀ hụkwara ha n’anya, ya emee ka okwukwe ha gharazie isi ike. Otu okenye aha ya bụ James sịrị: “M na-eje ozi na Betel, nọrọkwa n’ọgbakọ na-eji asụsụ ọzọ amụ ihe. N’agbanyeghị ihe ndị a, m na-enwe obi abụọ ma Jehova ọ̀ na-anabatakwa ozi m na-ejere ya. M mechadịrị chewe ma Jehova ọ̀ na-anụ ekpere m.” Otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ oge niile aha ya bụ Eva sịrị: “M chọpụtara na inwe obi abụọ ma Jehova ọ̀ hụrụ m n’anya nwere ike ịkpatara m ezigbo nsogbu n’ihi na ọ na-akpa ihe niile anyị na-eme n’ofufe Jehova aka. Ihe a ga-eme ka ị ghara inwe mmasị n’ihe ndị gbasara ofufe Jehova, meekwa ka ị ghara iji obi ụtọ na-ejere ya ozi.” Otu nwanna aha ya bụ Michael bụ ọsụ ụzọ, bụrụkwa okenye. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na i kwetaghị na Jehova hụrụ gị n’anya, ị ga-eji nke nta nke nta kpafuo.”

6. Gịnị ka anyị kwesịrị ime mgbe ọ bụla anyị nwere obi abụọ ma Jehova ọ̀ hụrụ anyị n’anya?

6 Ihe ndị a kọrọ gbasara ụmụnna ndị a gosiri na mmadụ inwe obi abụọ ma Jehova ọ̀ hụrụ ya n’anya nwere ike ịkpa okwukwe ya aka ọjọọ. Ma, olee ihe anyị nwere ike ime ma anyị nwewe obi abụọ ma Jehova ọ̀ hụkwara anyị n’anya? Anyị kwesịrị ịkwụsị ya ozugbo. Anyị kwesịrị ịrịọ Jehova ka o jiri “udo nke Chineke nke karịrị echiche niile” dochie “nchegbu” anyị. (Ọma 139:23; Fil. 4:6, 7) Chetakwa na ọ bụghị naanị gị ka ọ dị otú ahụ. E nwekwara ụmụnna anyị ndị ọzọ ụdị ihe ahụ na-echegbu. N’oge ochie, e nwekwara ndị fere Jehova nwere ụdị nchegbu ahụ. Ka anyị lee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Pọl onyeozi.

IHE ANYỊ GA-AMỤTA N’IHE MERE PỌL

7. Olee nsogbu ndị bịaara Pọl?

7 Ò nwere mgbe ọ na-adị gị ka ihe i ji n’aka ọ̀ karịrị akarị nke na ị gaghị emechali ha? Ọ bụrụ otú ahụ, ị ga-aghọta otú ihe si dịrị Pọl. Ọ nọ na-echegbu onwe ya, ọ bụghị naanị maka otu ọgbakọ, kama, “maka ọgbakọ niile.” (2 Kọr. 11:23-28) Ò nwere ọrịa ị na-arịa na-eme ka ị ghara ịna-enwe obi ụtọ? Pọl nwere “ogwu n’anụ ahụ́” ya nọ na-enye ya nsogbu, nke nwere ike ịbụ ọrịa. Ọ chọkwara ka e wepụrụ ya ya. (2 Kọr. 12:7-10) Ị̀ na-ada mbà n’ihi ihe ụfọdụ ị na-anaghị emeta? Otú ahụ ka ọ dịkwa Pọl mgbe ụfọdụ. O kwuru na ya ‘na-ahụsi anya’ n’ihi ọgụ ọ na-alụso ezughị okè ya.—Rom 7:21-24.

8. Olee ihe nyeere Pọl aka imeri nsogbu ya?

8 N’agbanyeghị ọnwụnwa na nsogbu ndị mere ka Pọl daa mbà, ọ nọgidere na-efe Jehova. Gịnị nyeere ya aka ịnọgide na-efe Jehova? Ọ bụ eziokwu na ọ ma na ya ezughị okè, ọ nọgidere na-enwe okwukwe n’àjà mgbapụta Jizọs. Ọ ma na Jizọs kwere nkwa na “onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya” ga-enwe “ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16; Rom 6:23) O doro anya na Pọl so ná ndị ahụ nwere okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ. Obi siri ya ike na Jehova dị njikere ịgbaghara ndị niile mere mmehie dị oké njọ ma ọ bụrụ na ha echegharịa.—Ọma 86:5.

9. Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe Pọl kwuru ná Ndị Galeshia 2:20?

9 Obi sikwara Pọl ike na Jehova hụrụ ya n’anya nke ukwuu n’ihi na o zitere Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst ka ọ bịa nwụọ n’ihi ya. (Gụọ Ndị Galeshia 2:20.) Ná ngwụcha amaokwu ahụ, Pọl kwuru ihe na-emesi obi ike. Ọ sịrị: “Ọkpara Chineke . . . hụrụ m n’anya ma nyefee onwe ya maka m.” Pọl echeghị na ya emeela ihe ọjọọ nke na Chineke ahụghịzi ya n’anya. O cheghị, sị, ‘Jehova hụrụ ụmụnna m n’anya. Mana, o nweghị ike ịhụ mụnwa n’anya.’ Pọl chetaara ndị Rom, sị: “Mgbe anyị ka bụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ n’ihi anyị.” (Rom 5:8) O nweghị ihe ọ bụla ga-egbochi Chineke ịhụ anyị n’anya.

10. Gịnị ka anyị na-amụta ná Ndị Rom 8:38, 39?

10 Gụọ Ndị Rom 8:38, 39. Obi siri Pọl ike na ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ọ nọ siri ezigbo ike. Ọ sịrị na o nweghị ihe ọ bụla ga-enwe “ike ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke.” Pọl ma otú Jehova si nweere ndị Izrel ndidi. Ọ makwa otú o si meere yanwa ebere. Anyị nwere ike ikwu na Pọl na-eche, sị: ‘Ebe ọ bụ na Jehova zitere Ọkpara ya ka ọ nwụọ n’ihi m, o nweghị ihe ọ bụla kwesịrị ime ka m nwewe obi abụọ ma ọ̀ hụrụ m n’anya.’—Rom 8:32.

Ihe dị Jehova mkpa bụ ihe anyị na-eme ugbu a na nke anyị ga-eme n’ọdịnihu, ọ bụghị ihe ọjọọ ndị anyị mere n’oge gara aga (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11) *

11. N’agbanyeghị na Pọl mere mmehie ndị ahụ e kwuru na 1 Timoti 1:12-15, gịnị mere obi ji sie ya ike na Chineke hụrụ ya n’anya?

11 Gụọ 1 Timoti 1:12-15. Ọ ga-abụrịrị na o nwere mgbe ihe ndị Pọl mere n’oge gara aga nyere ya nsogbu n’obi. Ọ dịghị ịtụnanya na Pọl kpọrọ onwe ya “onye mbụ” ná ndị mmehie. Tupu Pọl aghọọ onye na-efe Chineke, o ji ike ya niile si n’otu obodo gaa n’obodo ọzọ na-achụgharị Ndị Kraịst, na-atụ ụfọdụ mkpọrọ, na-akwadokwa ka e gbuo ndị ọzọ. (Ọrụ 26:10, 11) Olee otú i chere ọ ga-adị Pọl ma ọ hụ Onye Kraịst na-eto eto ọ kwadoro ka e gbuo nne na nna ya? Pọl mechara kwaa mmakwaara maka ihe ndị o mere. Mana, ọ ma na ya agaghị agbanweli ihe ndị o mere. Ọ bụ ya mere o ji jiri obi ike kwuo, sị: “Site n’obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ, abụ m ihe m bụ.” (1 Kọr. 15:3, 10) Olee ihe anyị na-amụta? Kweta na Kraịst nwụrụ n’ihi gị ma mee ka i nwee ohere magburu onwe ya gị na Jehova ịdị n’ezigbo mma. (Ọrụ 3:19) Ihe kacha Chineke mkpa bụ ihe anyị na-eme ugbu a na ihe anyị ga-eme n’ọdịnihu, ọ bụghị ihe anyị mejọrọ n’oge gara aga, ma ànyị abụrụla Ndịàmà Jehova n’oge ahụ ma ọ bụ na anyị abụbeghị.—Aịza. 1:18.

12. Olee otú ihe e dere na 1 Jọn 3:19, 20 nwere ike isi nyere anyị aka ma anyị chewe na anyị abaghị uru ma ọ bụkwanụ na Chineke agaghị ahụli anyị n’anya?

12 I cheta otú Jizọs si nwụọ iji mee ka a gbaghara gị mmehie, i nwere ike ịna-eche, sị, ‘Echeghị m na m ruru eru ka e meere m ụdị ihe ahụ.’ Gịnị mere o nwere ike iji dị gị otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na obi anyị na-ezughị okè nwere ike ịghọgbu anyị, mee ka anyị chewe na o nweghị uru anyị bara ma ọ bụkwanụ na Chineke agaghị ahụli anyị n’anya. (Gụọ 1 Jọn 3:19, 20.) Ya dị anyị otú ahụ, anyị kwesịrị icheta na “Chineke karịrị obi anyị.” Nna anyị nke eluigwe ka hụrụ anyị n’anya ọ bụrụgodị na anyị na-eche na ọ hụghị anyị n’anya ma ọ bụkwanụ na ọ gaghị agbaghara anyị. Ọ ga-agbaghara anyị. Anyị kwesịrị ime ka obi sie anyị ike na Jehova hụrụ anyị n’anya. Iji mee ya, anyị ga na-amụchi Akwụkwọ Nsọ anya, na-ekpe ekpere mgbe niile, na-esokwa ụmụnna anyị emekọ ihe mgbe niile. Gịnị mere ime ihe ndị a ji dị ezigbo mkpa?

OTÚ ỊMỤ BAỊBỤL, IKPE EKPERE, NA EZIGBO NDỊ ENYI NWERE IKE ISI NYERE ANYỊ AKA

13. Olee otú ịmụ Baịbụl ga-esi enyere anyị aka? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Otú Okwu Chineke Si Enyere Ha Aka.”)

13 Na-amụ Baịbụl kwa ụbọchị ka ị hụ àgwà ọma ndị Chineke nwere. Ọ ga-eme ka ị mata na Chineke hụrụ gị n’anya. Ichebara ihe ị gụrụ na Baịbụl echiche kwa ụbọchị ga-enyere gị aka iche echiche nke ọma, meekwa ka “ihe guzozie” n’uche gị nakwa n’obi gị. (2 Tim. 3:16) Otu okenye aha ya bụ Kevin, onye ọ na-adị ka o nweghị uru ọ bara, kwuru, sị: “Ịgụ Abụ Ọma 103 na ịtụgharị uche na ya enyerela m aka ịghọta onwe m nakwa ịghọta otú Jehova si were m.” Eva anyị kwuburu okwu ya sịrị: “Ihe ikpeazụ m na-eme n’ụbọchị bụ ịtụgharị uche n’iwu Jehova. Ọ na-eme ka obi ruo m ala, na-emekwa ka okwukwe m sikwuo ike.”

14. Olee otú ikpe ekpere si enyere anyị aka?

14 Na-ekpe ekpere mgbe niile. (1 Tesa. 5:17) Ọ bụ ịna-ekwurịta okwu mgbe niile na-eme ka mmadụ na ibe ya bụrụ ezigbo enyi. Otú ahụ ka ọ dịkwa ma a bịa n’anyị na Jehova ịbụ enyi. Ọ bụrụ na anyị ana-agwa ya otú obi dị anyị na ihe anyị na-eche n’echiche n’ekpere, anyị na-egosi na anyị tụkwasịrị ya obi nakwa na anyị ma na ọ hụrụ anyị n’anya. (Ọma 94:17-19; 1 Jọn 5:14, 15) Yua anyị kwuburu gbasara ya sịrị: “M kpewe ekpere, ihe m na-agwa Jehova abụghị naanị ihe ndị m mere n’ụbọchị. M na-agwa ya ihe niile otú ọ dị m n’obi. Ejirila m nke nta nke nta were Jehova ka Nna hụrụ ụmụ ya n’anya, ọ bụghị ka onyeisi ụlọ ọrụ.”—Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Ị̀ Gụọla Ya?

15. Olee otú Jehova si egosi na ọ hụrụ anyị n’anya?

15 Gị na ezigbo ndị enyi na-akpakọrịta. Ha bụ onyinye si n’aka Jehova. (Jems 1:17) Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya na-eme ka anyị nwee ezigbo ndị enyi “nwere ịhụnanya mgbe niile.” (Ilu 17:17) N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Kọlọsi, ọ kpọrọ aha ụfọdụ Ndị Kraịst nyeere ya aka. Ọ sịrị na ha bụ ‘ndị na-enyere ya aka, na-eme ka ọ dị ike.’ (Kọl. 4:10, 11) E nwedịrị mgbe enyemaka dị Jizọs mkpa. Obi dịkwa ya ụtọ na ndị enyi ya nyeere ya aka, ma ndị mmụọ ozi ma ndị mmadụ.—Luk 22:28, 43.

16. Olee otú ezigbo ndị enyi si enyere anyị aka ka anyị na Jehova dịrịkwuo ná mma?

16 Ị̀ na-agakwuru ndị enyi gị n’ọgbakọ ka ha nyere gị aka? Ịkọrọ ndị enyi gị ma nke a na-akọ n’ọgbakọ otú obi dị gị anaghị egosi na ị dịghị ike. O nwere ike ichebe gị. Legodị ihe James anyị kwuburu okwu ya kwuru. Ọ sịrị: “Ezigbo ndị enyi m nwere n’ọgbakọ na-enyere m ezigbo aka. Ọ bụrụ na echiche ọjọọ abata m n’obi, ha na-ege m ntị ma na-echetara m na ha hụrụ m n’anya. M na-esi n’aka ha amata na Jehova hụrụ m n’anya, na-elekọtakwa m.” Ọ dị ezigbo mkpa ka anyị na ndị enyi anyị n’ọgbakọ dị n’ezigbo mma, nọgidekwa na-adị ná mma.

NỌGIDE N’ỊHỤNANYA JEHOVA

17-18. Ònye ka anyị kwesịrị ige ntị, n’ihi gịnịkwa?

17 Setan chọrọ ka anyị kwụsị ịna-agba mbọ ime ihe dị mma. Ọ chọrọ ka anyị kweta na Jehova ahụghị anyị n’anya nakwa na anyị erughị eru ka Jehova zọpụta anyị. Ma, dị ka anyị hụrụla, nke ahụ abụghị eziokwu.

18 Jehova hụrụ gị n’anya. O jikwa gị kpọrọ ezigbo ihe. Ọ bụrụ na ị na-erubere ya isi, ị “ga-anọgide n’ịhụnanya” ya otú ahụ Jizọs mere. (Jọn 15:10) N’ihi ya, egela Setan ma ọ bụ obi gị na-agwa gị na Jehova ahụghị gị n’anya ntị. Kama, gee Jehova ntị n’ihi na ọ na-ahụ ebe onye ọ bụla n’ime anyị na-emeta. Ka obi sie gị ike na “ihe ndị Jehova na-atọ ya ụtọ,” ma nke gịnwa.

ABỤ NKE 141 Ndụ Bụ Ọrụ Ebube

^ par. 5 Ọ na-esiri ụfọdụ ụmụnna anyị ike ikweta na Jehova hụrụ ha n’anya. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na Jehova hụrụ onye nke ọ bụla n’ime anyị n’anya. Anyị ga-elebakwa anya n’otú anyị nwere ike isi kwụsị ịna-enwe obi abụọ ma Jehova ọ̀ hụrụ anyị n’anya.

^ par. 2 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ par. 67 NKỌWA FOTO: Na mbụ, Pọl kpagburu Ndị Kraịst, kwadokwa ka a tụọ ọtụtụ mkpọrọ. Ma, mgbe ọ nabatara ihe Jizọs meere ya, ọ gbanwere ma na-agba ụmụnna ya ume. O nwekwara ike ịbụ na ụfọdụ n’ime ha bụ ndị ọ kpagburu ndị ikwu ha.