Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 20

Adakwala Mbà n’Ozi Gị

Adakwala Mbà n’Ozi Gị

“Ghaa mkpụrụ gị . . . , ekwekwala ka aka gị zuo ike.” —EKLI. 11:6.

ABỤ NKE 70 Chọpụta Ndị Ga-anabata Ozi Ọma Unu

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

Mgbe Jizọs laghachiri n’eluigwe, ndị na-eso ụzọ ya ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma na Jeruselem na n’ọtụtụ ebe ndị ọzọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 1)

1. Olee ihe Jizọs mere ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ịna-eme? Gịnịkwa ka ndị na-eso ụzọ ya mere? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

N’OGE niile Jizọs nọ n’ụwa, ọ daghị mbà n’ikwusa ozi ọma. Ọ chọkwara ka ndị na-eso ụzọ ya nọgide na-ekwusa ozi ọma n’adaghị mbà. (Jọn 4:35, 36) Mgbe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nọ, ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. (Luk 10:1, 5-11, 17) Ma, mgbe a nwụchiri ya ma gbuo ya, ndị na-eso ụzọ ya kwụsịtụrụ iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. (Jọn 16:32) Mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, ọ gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha lekwasị anya n’ikwusa ozi ọma. Mgbe ọ lakwara eluigwe, ha ji ezigbo ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma nke na ndị iro ha kwuru, sị: “Lee! unu emewo ka ozizi unu jupụta Jeruselem.”—Ọrụ 5:28.

2. Olee otú Jehova si na-agọzi ọrụ ikwusa ozi ọma?

2 N’oge ndịozi, Jizọs duziri ndị na-eso ụzọ ya n’ozi ọma ha kwusara. Jehova gọzikwara ha, ọtụtụ ndị anabata ozi ha. Dị ka ihe atụ, na Pentikọst nke afọ 33, ihe dị ka puku mmadụ atọ mere baptizim. (Ọrụ 2:41) Ọnụ ọgụgụ ndị na-eso ụzọ Jizọs mụbara n’ụzọ dị ịtụnanya. (Ọrụ 6:7) Jizọs bukwara amụma na ọtụtụ ndị ga-anabata ozi ọma n’oge ikpeazụ.—Jọn 14:12; Ọrụ 1:8.

3-4. Gịnị mere ikwusa ozi ọma ji esiri ụfọdụ ndị ike? Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?

3 Anyị niile na-agbalị iji obi ụtọ nọgide na-ekwusa ozi ọma. N’obodo ụfọdụ, ọ na-adị mfe ime ya. N’ihi gịnị? N’ihi na ọtụtụ ndị na-achọ ka a mụwara ha Baịbụl. Ụfọdụ n’ime ha enwebeghị onye na-amụrụ ha ihe. Ma n’obodo ụfọdụ, ikwusa ozi ọma na-esiri ụmụnna ike. Ndị mmadụ anaghị anọkarị n’ụlọ. Ndị nke nọkwanụ n’ụlọ anaghị enwe mmasị ịmụ Baịbụl.

4 Ọ bụrụ na i bi n’obodo ebe ikwusa ozi ọma na-esi ike, ihe ndị e dere n’isiokwu a nwere ike inyere gị aka. Anyị ga-eleba anya n’ihe ụfọdụ ndị merela iji nwetakwuo ndị ha ga-ekwusara ozi ọma. Anyị ga-ahụkwa ihe mere na anyị ekwesịghị ịda mbà ma ndị mmadụ hà na-ege anyị ntị ma ọ bụ na ha anaghị ege anyị ntị.

ADALA MBÀ MA Ọ NA-ESIRI GỊ IKE ỊHỤ NDỊ MMADỤ

5. Olee ihe na-esiri ọtụtụ ụmụnna ike?

5 Ọ na-esikwuru ọtụtụ ụmụnna ike inweta ndị mmadụ n’ụlọ. Ụfọdụ ndị nọ n’ebe ha na-ezi ozi ọma bi n’ụlọ ma ọ bụ n’ebe ndị a gbara ogige. E nwekwara ike inwe onye nche na-anaghị ekwe mmadụ banye, ọ gwụkwala ma ya na onye nwe ụlọ ahụ hà yiri agba tupu ya abịa. Ụfọdụ ụmụnna nwekwara ike ịga n’ụlọ n’ụlọ n’enweghị onye na-enye ha nsogbu, mana e nweghị onye ha na-ahụ n’ụlọ. E nwekwara ụmụnna ndị na-ezi ozi ọma n’ebe ndị bi ya na-ehighị nne. Ha nwere ike chọrọ naanị otu onye gaa ebe dị anya. O nwekwara ike ha ruo, ọ gaghị anọ ya. Ọ bụrụ na ọ dị otú a n’ebe ị na-ekwusa ozi ọma, i kwesịghị ịda mbà. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị nwee ike inwetakwu ndị mmadụ n’ozi ọma?

6. Olee otú onye na-ekwusa ozi ọma si yie onye na-akụ azụ̀?

6 Jizọs ji ikwusa ozi ọma tụnyere ịkụ azụ̀. (Mak 1:17) Ụfọdụ ndị na-akụ azụ̀ nwere ike ịga ịkụ azụ̀ ọtụtụ ụbọchị, ma o nweghị azụ̀ ha ga-akụta. Ma ha anaghị ada mbà. Ha na-agbanwe otú ha si akụ azụ̀. Ha na-agbanwe oge ha ji aga, ebe ha na-aga, na otú ha si akụ azụ̀. Anyị nwekwara ike ime ụdị ihe ahụ n’ozi ọma anyị. Ka anyị lee ihe ndị anyị nwere ike ime.

Ị na-ekwusa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anaghị anọkarị n’ụlọ, gbalịa gaa n’oge dị iche iche, n’ebe dị iche iche, sirikwa ụzọ dị iche iche zie ha ozi ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7 ruo na nke 10) *

7. Olee uru ịga ozi ọma n’oge dị iche iche nwere ike ịba?

7 Gbalịa gaa n’oge dị iche. Anyị ga-enwetakwu ndị mmadụ ma ọ bụrụ na anyị agaa n’oge e nwere ike ịhụ ha n’ụlọ. A sị ka e kwuwe, onye pụrụ apụ ga-alọta. Ọ gaghị atọ ebe ahụ. Ọtụtụ ụmụnna achọpụtala na a na-enweta ndị mmadụ n’ụlọ n’ehihie ma ọ bụ ná mgbede. Ihe ọzọkwa bụ na ndị mmadụ na-aka atụsara ahụ́, dịkwa njikere ha na mmadụ ikwurịta okwu n’oge ahụ. Ihe ọzọ nwere ike inyere gị aka bụ ime ihe otu okenye aha ya bụ David na-eme. Ọ sịrị na ya na onye ya na ya na-arụ n’ozi ọma gatụ ozi ọma, ha alọghachi n’ụlọ ndị ọ na-enweghị onye ha hụburu na ya. Ọ sịrị: “Mmadụ ole anyị na-enweta n’oge anyị laghachiri na-eju anyị anya.” *

Ị na-ekwusa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anaghị anọkarị n’ụlọ, gbalịa gaa n’oge dị iche iche zie ha ozi ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7 na nke 8)

8. Olee otú anyị nwere ike isi mee ihe e dere n’Ekliziastis 11:6 n’ozi ọma anyị?

8 Anyị ekwesịghị ịda mbà. Amaokwu Baịbụl e si nweta isiokwu a gosiri na nke a bụ eziokwu. (Gụọ Ekliziastis 11:6.) David anyị kwuburu okwu ya adaghị mbà. O mechara nweta otu onye o ziri ozi ọma n’otu ụlọ ọ garala ọtụtụ ugboro. Onye ahụ nwere mmasị ịmụ Baịbụl ma gwa ya, sị: “E nwetụbeghị mgbe m hụrụ Onyeàmà Jehova bịara kụọ aka n’ụlọ m kemgbe ihe dị ka afọ asatọ m bi ebe a.” David kwuru, sị: “Achọpụtala m na i mechaa hụ mmadụ n’ụlọ, obi na-adị ha ụtọ ige gị ntị.”

Ị na-ekwusa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anaghị anọkarị n’ụlọ, gbalịa gaa n’ebe dị iche iche zie ha ozi ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9)

9. Olee ihe ndị ụfọdụ ụmụnna merela iji nweta ndị ọ na-ara ahụ́ inweta n’ụlọ?

9 Gbanwee ebe ị na-aga izi ozi ọma. Ụfọdụ ndị nkwusa agbanweela ebe ha na-aga ikwusa ozi ọma ka ha nwee ike inweta ndị ọ na-ara ahụ́ inweta n’ụlọ. Dị ka ihe atụ, ikwusa ozi ọma n’okporo ámá na iji ihe a na-akwagharị akwagharị ekwusa ozi ọma abaala ezigbo uru n’inweta ndị bi ná nnukwu ụlọ ebe a na-anaghị ekwe Ndịàmà Jehova baa ma ha gaa ozi ụlọ n’ụlọ. O meela ka Ndịàmà Jehova nwee ike izi ndị ọ na-ara ahụ́ inweta n’ụlọ ozi ọma ihu na ihu. Ọtụtụ ndị nkwusa achọpụtakwala na ndị mmadụ na-ege ntị ma ọ bụ na-anata akwụkwọ anyị n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị, n’ahịa, ma ọ bụkwanụ n’ebe ndị ọzọ a na-azụ ahịa. Otu nwanna bụ́ onye nlekọta sekit na Bolivia aha ya bụ Floiran kwuru, sị: “Anyị na-aga n’ebe ndị mmadụ na-azụ ahịa n’agbata elekere anya mbụ na elekere anya atọ nke ehihie. N’oge ahụ, ndị na-ere ahịa na-enwetụ ohere. Anyị na ha na-akparịtakwa. A malitekwarala ụfọdụ ndị ọmụmụ Baịbụl.”

Ị na-ekwusa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anaghị anọkarị n’ụlọ, gbalịa si n’ụzọ dị iche iche zie ha ozi ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)

10. Olee ihe ndị ọzọ i nwere ike ime iji zie mmadụ ozi ọma?

10 Gbalịa si ụzọ ọzọ zie ozi ọma. Ka e were ya na e nwere onye ị gara na nke ya ọtụtụ ugboro, ị gaala n’oge dị iche n’oge i ji agabu, ma i nwetabeghị ya n’ụlọ. Ò nwere ụzọ ọzọ i nwere ike isi zie onye ahụ ozi ọma? Katarína sịrị: “M na-edegara ndị ahụ m na-anaghị enweta n’ụlọ akwụkwọ ozi, gwa ha ihe ahụ m gaara agwa ha ma a sị na m hụrụ ha ihu na ihu.” Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Gbalịa na-esi n’ụzọ dị iche iche ezi onye ọ bụla nọ n’ókèala unu ozi ọma.

ADALA MBÀ MA NDỊ MMADỤ EKWEGHỊ EGE GỊ NTỊ

11. Gịnị mere na ụfọdụ ndị anaghị ege ntị n’ozi ọma anyị?

11 Ụfọdụ anaghị ege ntị n’ozi ọma anyị. Ha echeghị na ha kwesịrị ịmata gbasara Chineke ma ọ bụ Baịbụl. Ha ekwetaghị na Chineke n’ihi na ha na-ahụ na ahụhụ juru n’ụwa. Ha enweghị mmasị na Baịbụl n’ihi na ndị ndú okpukpe bụ́ ndị na-ekwu na ha na-eme ihe Baịbụl kwuru bụ ndị ihu abụọ. Ihe na-ewekọrọ oge ụfọdụ ndị bụ ọrụ ha, ezinụlọ ha, ma ọ bụ nsogbu ndị ha nwere. Ha echeghịkwanụ na Baịbụl nwere ike inyere ha aka. Olee otú anyị nwere ike isi na-enwe ọṅụ mgbe ndị mmadụ na-ekweghị ege anyị ntị n’ozi ọma?

12. Olee otú ime ihe e kwuru ná Ndị Filipaị 2:4 si enyere anyị aka n’ozi ọma?

12 Na-egosi na ihe gbasara ndị ọzọ na-emetụ gị n’obi. Ụfọdụ ndị na-anaghị egebu ozi ọma anyị na-emecha gewe ntị ma ha chọpụta na ihe gbasara ha na-emetụ nwanna bịara izi ha ozi ọma n’obi. (Gụọ Ndị Filipaị 2:4.) Dị ka ihe atụ, David anyị kwuburu okwu ya sịrị: “Ọ bụrụ na mmadụ asị na ya enweghị mmasị ige m ntị, anyị na-edosa Baịbụl na akwụkwọ ndị anyị ji, gwa ya sị: ‘M chọrọ ịma ihe mere na ị nweghị mmasị.’” Ndị mmadụ na-achọpụta ma mmadụ na-eche gbasara ha. Ha nwere ike ichefu ihe ị gwara ha. Ma ha ka nwere ike ịna-echeta otú ihe ị gwara ha dị ha n’obi. Ọ bụrụgodị na mmadụ ekweghị ka anyị gwa ya okwu, anyị nwere ike isi n’otú anyị si kpaa àgwà ma ọ bụ otú ihu anyị dị gosi ya na ihe gbasara ya na-emetụ anyị n’obi.

13. Olee otú i nwere ike isi gbanwee isiokwu i ji ezi ozi ọma ka o nwee ike ịmasị onye ị chọrọ izi ozi ọma?

13 Anyị na-egosi na ihe gbasara ndị ọzọ na-emetụ anyị n’obi ma ọ bụrụ na anyị ana-agbanwe isiokwu anyị ji ezi mmadụ ozi ọma ka ọ daba n’ihe bụ́ mkpa onye anyị chọrọ izi ozi ọma ma ọ bụkwanụ n’ihe na-amasị ya. Dị ka ihe atụ, è nwere ihe na-egosi na onye anyị chọrọ izi ozi ọma nwere ụmụaka? Anyị ma na ihe nwere ike ịmasị ndị nne na nna bụ ihe Baịbụl kwuru ga-enyere ha aka ịzụ ụmụ ha ma ọ bụ ihe ga-eme ka ha na-enwekwu obi ụtọ n’ezinụlọ ha. Ọ bụrụkwa na anyị achọpụta na e ji ọtụtụ igodi gbachie ụzọ ha, anyị nwere ike ikpebi ka anyị na onye ahụ kwuo gbasara tigbuo zọgbuo na ụjọ juru n’ụwa a. O nwere ike ime ka onye ahụ chọọ ịmata ihe ga-eme ka ihe ndị ahụ kwụsị kpamkpam. Mgbe ọ bụla anyị hụrụ onye nwere mmasị ige ihe anyị chọrọ ikwu, ka anyị gbalịa nyere ya aka ịghọta otú Baịbụl ga-esi nyere ya aka ná ndụ ya. Katarína anyị kwuburu okwu ya sịrị: “M na-echetara onwe m otú eziokwu m mụtarala si eme ka m na-enwe obi ụtọ.” Ihe a mere ka Katarína na-ezi ndị mmadụ ozi ọma otú gosiri na o kweere n’ihe ọ na-ekwu. Ha na-achọpụtakwa nke ahụ.

14. Olee ihe e kwuru n’Ilu 27:17 gosiri otú ndị na-arụ n’ozi ọma nwere ike isi nyere ibe ha aka?

14 Mụta ihe n’aka ndị ọzọ. N’oge ndịozi, Pọl kụziiri Timoti otú e si ekwusa ozi ọma na otú e si akụzi ihe, gbaakwa ya ume ka o si otú ahụ na-ezi ozi ọma ma na-akụzi ihe. (1 Kọr. 4:17) Anyị nwere ike ịmụta ihe n’aka ndị ma nke a na-akọ n’ọgbakọ otú ahụ Timoti mere. (Gụọ Ilu 27:17.) Legodị ihe otu nwanna aha ya bụ Shawn mere. O kwusara ozi ọma ruo oge ụfọdụ n’ime obodo ebe ọtụtụ ndị na-achọghị ige ya ntị n’ihi na okpukpe ha juru ha afọ. Gịnị nyeere ya aka ịghara ịda mbà? Ọ sịrị: “Mgbe ọ bụla o kwere omume, mụ na mmadụ na-eso aga ozi ọma. Anyị na-eji oge ahụ anyị ji aga n’ụzọ na-enyere onwe anyị aka ịna-emekwu nke ọma n’ozi ọma. Dị ka ihe atụ, anyị na-ekwu otú anyị si zie onye anyị gara na nke ya ozi ọma. Anyị na-ekwuzi otú ọzọ anyị nwere ike isi ezi ụdị onye ahụ ozi ọma.”

15. Gịnị mere ekpere ji dị mkpa n’ozi ọma anyị?

15 Rịọ Jehova ka o nyere gị aka. Rịọ Jehova ka o nyere gị aka mgbe ọ bụla ị nọ n’ozi ọma. O nweghị ihe onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ime ma ọ bụrụ na mmụọ nsọ Chineke enyereghị ya aka. (Ọma 127:1; Luk 11:13) Kpọọ okwu aha ma ị na-arịọ Jehova ka o nyere gị aka. Dị ka ihe atụ, gwa ya ka o duga gị na nke onye chọrọ ịmụta gbasara ya nakwa onye dị njikere ige ntị. Gbazie mbọ ka i zie onye ọ bụla ị hụrụ ozi ọma.

16. Gịnị mere ịmụsi Baịbụl ike ji dị mkpa ka anyị nwee ike ịna-emekwu nke ọma n’ozi anyị?

16 Wepụta oge na-amụ Baịbụl. Okwu Chineke kwuru, sị: “Chọpụta n’onwe unu ihe bụ́ uche Chineke, nke ziri ezi na nke dị ya mma, nke zukwara okè.” (Rom 12:2) Ka anyị na-amụ Baịbụl, anyị ga-amatakwu Chineke nke ọma. Anyị gwawazie ndị mmadụ gbasara ya, ha ga-amata na anyị kweere n’ihe anyị na-ekwu. Katarína anyị kwuburu okwu ya sịrị: “N’oge na-adịbeghị anya, m chọpụtara na m kwesịrị imekwu ka okwukwe m sikwuo ike gbasara ihe ụfọdụ Baịbụl na-akụzi. N’ihi ya, m mụrụ Baịbụl ma hụkwuo ihe mere m ga-eji kwere na e nwere Onye kere ihe niile, na Baịbụl bụ Okwu Chineke n’eziokwu, nakwa na Chineke nwere nzukọ ya n’ụwa taa.” Katarína kwuru na ịmụ Baịbụl n’onwe ya nyeere ya aka mee ka okwukwe ya sikwuo ike, meekwa ka ọ na-enwekwu ọṅụ n’ozi ọma.

IHE MERE NA ANYỊ EKWESỊGHỊ ỊDA MBÀ N’OZI ANYỊ

17. Gịnị mere na Jizọs adaghị mbà n’ozi ya?

17 Jizọs adaghị mbà. Ọ nọgidere na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị na ụfọdụ egeghị ya ntị. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ ma na ndị mmadụ kwesịrị ịmata nke bụ́ eziokwu. Ọ chọkwara inye ọtụtụ ndị ohere ịnụ ozi ọma Alaeze Chineke. Ọ makwa na ụfọdụ ndị na-anabughị ekwe ege ntị ga-emecha gewe ntị. Legodị ihe mere n’ezinụlọ yanwa. N’ime afọ atọ na ọkara Jizọs jere ozi ya n’ụwa, o nweghị otu nwanne ya ghọrọ onye na-eso ụzọ ya. (Jọn 7:5) Ma mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ, ha ghọrọ Ndị Kraịst.—Ọrụ 1:14.

18. Gịnị mere na anyị anaghị ada mbà?

18 Anyị amaghị onye ga-emecha ghọọ onye na-efe Chineke. Ọ na-ewe ụfọdụ ndị oge ịmụta eziokwu karịa ibe ha. Ma ndị na-achọghịdị ige anyị ntị na-ahụ àgwà ọma anyị nakwa na anyị anaghị ada mbà. O nwere ike ime ka ha nye “Chineke otuto.”—1 Pita 2:12.

19. Dị ka e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 3:6, 7, gịnị ka anyị kwesịrị ịna-echeta?

19 Ka anyị na-akụ mkpụrụ ma na-agba ya mmiri, anyị kwesịrị icheta na ọ bụ Chineke na-eme ka o too. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 3:6, 7.) Otu nwanna na-eje ozi n’Itiopia aha ya bụ Getahun sịrị: “Ruo ihe karịrị iri afọ abụọ, ọ bụ naanị m bụ Onyeàmà Jehova n’otu ókèala a na-anaghị ezikarị ozi ọma na ya. Ma ugbu a, e nwere ndị nkwusa iri na anọ n’ebe a. Iri na atọ n’ime ha emeela baptizim, ma nwunye m ma ụmụ m atọ. Ugbu a, anyị na-adị ihe dị ka mmadụ iri atọ na abụọ n’ọmụmụ ihe.” Obi dị Getahun ụtọ na ọ nọgidere na-ekwusa ozi ọma ma na-eche ka Jehova dọta ndị nwere ezi obi ka ha bata n’ọgbakọ ya.—Jọn 6:44.

20. Olee otú anyị si yie ndị gara ịzọ ndị mmadụ ndụ?

20 Jehova ji mmadụ niile kpọrọ ihe. O meere anyị ihe ọma kwe ka anyị na Ọkpara ya na-arụkọ ọrụ ime ka ndị si ná mba niile bata n’ọgbakọ ya tupu ọgwụgwụ abịa. (Hag. 2:7) E nwere ike iji ọrụ ikwusa ozi ọma anyị tụnyere ndị na-azọ ndị mmadụ ndụ. Anyị dịkwa ka ndị gara ịzọpụta ndị ájá zegidere n’ebe ha na-egwu ihe. Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịbụ mmadụ ole na ole n’ime ha ka a ga-azọpụta. Ma, ọrụ ndị niile gara ọrụ ahụ rụrụ bara uru. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ọrụ ikwusa ozi ọma anyị taa. Anyị amaghị mmadụ ole a ga-emecha zọpụta n’ụwa Ekwensu a. Mana, Jehova nwere ike iji onye ọ bụla n’ime anyị nyere ha aka. Otu nwanna bi na Bolivia aha ya bụ Andreas sịrị: “Ama m na ihe na-eme ka mmadụ mụta eziokwu bịa mee baptizim bụ na ụmụnna gbakọrọ aka nyere ya aka.” Ka anyị ghara ịda mbà n’ozi anyị. Ọ bụrụ na anyị adaghị mbà, Jehova ga-agọzi anyị, anyị ga na-enwekwa obi ụtọ n’ozi anyị.

ABỤ NKE 66 Na-ekwusa Ozi Ọma

^ par. 5 Olee otú anyị ga-esi ghara ịda mbà n’ozi anyị ọ bụrụgodị na ọtụtụ ndị anaghị ege anyị ntị ma ọ bụ na ha anaghị anọ n’ụlọ? N’isiokwu a, anyị ga-ahụ ihe ụfọdụ ga-enyere anyị aka ịnọgide na-ekwusa ozi ọma n’adaghị mbà.

^ par. 7 Ụmụnna kwesịrị irubere iwu obodo ha isi mgbe ha si n’ụzọ dị iche iche e kwuru n’isiokwu a na-ekwusa ozi ọma.

^ par. 60 NKỌWA FOTO: (si n’elu gbadaa ala): Ebe otu di na nwunye na-ekwusa ozi ọma ebe ọ na-esi ike inweta ndị mmadụ n’ụlọ. Onye nke mbụ nọ n’ụlọ ọrụ ya, onye nke abụọ anọrọ n’ụlọ ọgwụ, onye nke atọ agaa ịzụta ihe. Ha nwetara onye nke mbụ mgbe ha gaghachiri n’ụlọ ya ná mgbede. Ha nwetara onye nke abụọ mgbe ha na-ekwusa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị n’akụkụ ụlọ ọgwụ ahụ. Ha nwetara onye nke atọ mgbe ha kpọrọ ya n’ekwentị.