Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 22

Nyere Onye Ị Na-amụrụ Baịbụl Aka Ka O Mee Baptizim

Nyere Onye Ị Na-amụrụ Baịbụl Aka Ka O Mee Baptizim

“Ka onye ọ bụla n’ime unu meekwa baptizim.”​—ỌRỤ 2:38.

ABỤ NKE 72 Anyị Na-eme Ka A Mara Eziokwu Alaeze

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị ka a gwara ìgwè mmadụ gbakọtaranụ n’oge ndịozi ka ha mee?

ÌGWÈ mmadụ si ebe dị iche iche gbakọtara na Jeruselem. Ha na-asụkwa asụsụ dị iche iche. E nwere otu ihe dị ịtụnanya mere n’ụbọchị ahụ. Ụfọdụ ndị Juu malitere ịsụ asụsụ obodo ndị ahụ gbakọtaranụ. Ihe a gbagwojuru ìgwè mmadụ ahụ anya. Ma, ihe kacha mkpa bụ ihe ndị Juu ahụ gwara ìgwè mmadụ ahụ nakwa ihe Pita onyeozi gwara mmadụ niile gbakọtaranụ. Ìgwè mmadụ ahụ mụtara na ihe ga-eme ka a zọpụta ha bụ inwe okwukwe na Jizọs Kraịst. Okwu ahụ ha nụrụ ruru ha n’obi, ha ajụọ, sị: “Gịnị ka anyị kwesịrị ime?” Pita gwara ha, sị: “Ka onye ọ bụla n’ime unu meekwa baptizim.”​—Ọrụ 2:​37, 38.

Ebe otu nwanna na nwunye ya na-amụrụ otu nwa okorobịa ihe. Nwa okorobịa ahụ ji akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi nke e biri ebi (A ga-akọwa ya n’isiokwu a na-amụ amụ nke 22, paragraf nke 2)

2. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

2 Ihe ọzọ mekwaranụ dị ịtụnanya. E mere ihe dị ka puku mmadụ atọ baptizim n’ụbọchị ahụ, ha aghọọ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Ọ bụ otú a ka ọrụ ahụ buru ibu Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ka ha rụọ si malite, ya bụ, ime ndị na-eso ụzọ. A ka na-arụkwa ọrụ ahụ ruo n’oge anyị a. Taa, anyị enweghị ike iji awa ole na ole nyere mmadụ aka ka o mee baptizim. O nwere ike iwe ọtụtụ ọnwa ma ọ bụdị otu afọ ma ọ bụ karịa tupu onye a na-amụrụ ihe eruo eru ime baptizim. Anyị ga-agbasi mbọ ike inyere mmadụ aka ka ọ ghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs. Ọ bụrụ na o nwere onye ị na-amụrụ ihe ugbu a, ị ga-achọpụta na nke a bụ eziokwu. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe i nwere ike ime iji nyere onye ị na-amụrụ ihe aka ka o ruo eru ime baptizim.

NYERE ONYE Ị NA-AMỤRỤ IHE AKA KA Ọ NA-EME IHE Ọ NA-AMỤTA

3. Dị ka e kwuru na Matiu 28:​19, 20, gịnị ka onye anyị na-amụrụ ihe kwesịrị ime ka o nwee ike iru eru ime baptizim?

3 Onye a na-amụrụ ihe kwesịrị ibu ụzọ na-eme ihe ndị ọ na-amụta na Baịbụl tupu ya emee baptizim. (Gụọ Matiu 28:​19, 20.) Ọ bụrụ na onye a na-amụrụ Baịbụl emewe ihe ọ na-amụta, e nwere ike iji ya tụnyere “nwoke nwere uche” Jizọs ji mee ihe atụ. Nwoke ahụ gwumiri ala egwumi ka o nwee ike ịrụ ụlọ ya n’elu nkume. (Mat. 7:​24, 25; Luk 6:​47, 48) Olee otú anyị nwere ike isi nyere onye a na-amụrụ ihe aka ime ihe ọ na-amụta? Ka anyị tụlee ụzọ atọ anyị nwere ike isi eme ya.

4. Olee otú anyị nwere ike isi nyere onye a na-amụrụ ihe aka ka ọ nọgide na-agba mbọ ma ruo eru ime baptizim? (Gụọkwa igbe isiokwu ya bụ “ Nyere Onye Ị Na-amụrụ Baịbụl Aka Inwe Ihe Ndị Ọ Chọrọ Ime na Ime ha.”)

4 Nyere onye ị na-amụrụ Baịbụl aka inwe ihe ọ chọrọ ime. Gịnị mere i kwesịrị iji mee ya? Chegodị gbasara ihe atụ a: Ọ bụrụ na ị chọrọ ịga ebe dị ezigbo anya, i nwere ike ikpebi ebe ụfọdụ ị ga-akwụsị zurutụ ike. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ịgaru ebe ahụ agaghị agwụ gị ike. Otú ahụ ka ọ dịkwa onye anyị na-amụrụ ihe. Ọ bụrụ na o nwee ihe ụfọdụ ga-ewe obere oge imecha o kpebiri ime ma mee ha, o nwere ike ime ka ọ mata na ọ ga-eruli eru ime baptizim. Jiri ihe dị n’ebe e dere “Ihe Ị Ga-agba Mbọ Mee” n’akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi nyere onye ị na-amụrụ Baịbụl aka ka ọ na-eme nke ọma. Unu mụchaa isiokwu nke ọ bụla, unu kwurịta otú ihe ndị ahụ ọ chọrọ ime si gbasa ihe unu ka mụpụrụ. Ọ bụrụ na e nwere ihe ọzọ ị chọrọ ka onye ị na-amụrụ ihe mee, denye ya n’ebe ahụ e dere “Ihe Ọzọ Ị Ga-agba Mbọ Mee.” Gị na ya jiri ihe e dere ebe a na-ekwurịta gbasara ihe ndị ọ chọrọ ime ga-ewe obere oge na ndị nke ga-ewe ogologo oge tupu ya emechaa ha.

5. Dị ka e kwuru na Mak 10:​17-22, gịnị ka Jizọs gwara otu nwoke bara ọgaranya ka o mee, n’ihi gịnịkwa?

5 Nyere onye ị na-amụrụ Baịbụl aka ịgbanwe otú o si ebi ndụ. (Gụọ Mak 10:​17-22.) Jizọs ma na ọ ga-esiri otu nwoke bara ọgaranya ike ire ihe niile o nwere. (Mak 10:23) Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ọ gwara nwoke ahụ ka o ree ihe niile o nwere. N’ihi gịnị? N’ihi na Jizọs hụrụ ya n’anya. Mgbe ụfọdụ, ihe nwere ike ime ka anyị ghara ịgwa onye anyị na-amụrụ ihe ka o mee mgbanwe ụfọdụ ná ndụ ya bụ na anyị chere na o jikerebeghị. O nwere ike iwe oge tupu ndị mmadụ ahapụ àgwà ọjọọ ndị ha na-akpa kpawa àgwà ọma. (Kọl. 3:​9, 10) Ma, ọ bụrụ na anyị ebido n’oge gwawa onye anyị na-amụrụ Baịbụl ihe ndị o kwesịrị ịgbanwe, o nwere ike ime ka ọ malite ime mgbanwe ndị ahụ ngwa ngwa. Ọ bụrụ na anyị agwa ya gbasara ya, o gosiri na anyị hụrụ ya n’anya.​—Ọma 141:5; Ilu 27:17.

6. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-ajụ onye anyị na-amụrụ ihe ajụjụ ga-eme ka o kwuo ihe o chere?

6 Ọ dị ezigbo mkpa ka ị na-ajụ onye ị na-amụrụ ihe ajụjụ ga-eme ka o kwuo ihe o chere gbasara ihe gị na ya na-amụ. Ọ ga-enyere gị aka ịmata ma onye ị na-amụrụ ihe ọ̀ na-aghọta ihe unu na-amụ, nyekwara gị aka ịghọta ihe ndị o kweere. Ọ bụrụ na ị na-ajụ ya ụdị ajụjụ a mgbe niile, ọ ga-eme ka ọ dịrị unu mfe ikwurịta ihe ndị ọzọ nwere ike isiri ya ike ikwere n’ọdịnihu. Akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi nwere ọtụtụ ụdị ajụjụ ndị a. Dị ka ihe atụ, n’isi nke anọ, e nwere ajụjụ sịrị: “Olee otú i chere obi ga-adị Jehova ma ị na-akpọ ya aha ya?” Isi nke itoolu nwere ajụjụ bụ́: “Olee ihe ụfọdụ i nwere ike ikpe ekpere gbasara ha?” O nwere ike isiri onye ahụ ị na-amụrụ ihe ike ná mmalite ịza ajụjụ ndị a. Ma, i nwere ike inyere ya aka ka o chebara amaokwu Baịbụl na ihe e sere n’ebe ahụ echiche.

7. Olee otú anyị nwere ike isi jiri akụkọ mere eme nyere onye anyị na-amụrụ Baịbụl aka?

7 Ozugbo onye ị na-amụrụ ihe ghọtara ihe o kwesịrị ime, jiri akụkọ ndị mere eme nyere ya aka ime otú ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ọ na-esiri ya ike ịbịa ọmụmụ ihe, i nwere ike igosi ya vidio bụ́ Jehova Lekọtara M nke dị n’ebe e dere “Ihe Ị Ga-elebakwu Anya” n’isi nke iri na anọ. N’ọtụtụ ebe n’akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi, ị ga-ahụ ụdị akụkọ ndị a n’ebe e dere “Mụtakwuo Ihe” ma ọ bụkwanụ “Ihe Ị Ga-elebakwu Anya.” * Kpachara anya ka ị ghara iji onye ị na-amụrụ ihe tụnyere onye ọzọ. Agwakwala ya, sị: “Ọ bụrụ na onye a nwere ike ime ya, gịnwa nwekwara ike ime ya.” Hapụ ya ka o jiri aka ya kwuo otú ahụ. Kama ikwu otú ahụ, kwuo ihe ụfọdụ nyeere onye ahụ unu lere na vidio aka ime ihe Baịbụl kwuru. I nwere ike ikwu amaokwu Baịbụl ma ọ bụkwanụ ihe ọzọ nyeere ya aka. Mgbe ọ bụla o kwere omume, mee ka onye ị na-amụrụ ihe ghọta ihe nyeere onye unu tụlere akụkọ ya aka.

8. Gịnị nwere ike inyere onye anyị na-amụrụ Baịbụl aka ịhụ Jehova n’anya?

8 Nyere onye ị na-amụrụ ihe aka ịhụ Jehova n’anya. Olee otú ị ga-esi eme ya? Chọpụta oge ndị dị mma ị ga-eji agwa ya gbasara àgwà ndị Jehova nwere. Nyere ya aka ka ọ ghọta na Jehova bụ Chineke obi ụtọ, onye na-enyere ndị hụrụ ya n’anya aka. (1 Tim. 1:11; Hib. 11:6) Mee ka onye ị na-amụrụ ihe ghọta uru ndị ọ ga-erite ma ọ na-eme ihe ndị ọ na-amụta. Kọwaakwara ya na ihe a bụ otú Jehova si egosi ya na ọ hụrụ ya n’anya. (Aịza. 48:​17, 18) Ọ bụrụ na onye ị na-amụrụ Baịbụl ana-ahụkwu Jehova n’anya, ọ ga-adịrị ya mfe ime mgbanwe ndị o kwesịrị ime ná ndụ ya.​—1 Jọn 5:3.

MEE KA ONYE Ị NA-AMỤRỤ BAỊBỤL MATA ỤMỤNNA NDỊ ỌZỌ

9. N’ihi ihe e kwuru na Mak 10:​29, 30, gịnị nwere ike inyere mmadụ aka ịhapụ ihe ụfọdụ ma mee baptizim?

9 Ka onye a na-amụrụ Baịbụl nwee ike iru eru ime baptizim, ọ ga-adị mkpa ka ọ hapụ ihe ụfọdụ. Dị ka nwoke ahụ bara ọgaranya anyị kwuru okwu ya, ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịhapụ ihe ụfọdụ ha nwere. Ọ bụrụ na Akwụkwọ Nsọ akwadoghị ụdị ọrụ ha na-arụ, ha nwere ike ịhapụ ya chọrọ ọrụ ọzọ. O nwere ike ịdị mkpa ka ọtụtụ n’ime ha hapụ ndị enyi ha na-anaghị efe Jehova. Ndị ezinụlọ ha kpọrọ Ndịàmà Jehova asị nwekwara ike ịgbahapụ ha. Jizọs kwuru na ihe ndị a nwere ike isiri ụfọdụ ndị ike. Ma, o kwere nkwa na ndị na-eso ya agaghị akwa mmakwaara. Jehova ga-agọzi ha, nye ha ezinụlọ hụrụ ha n’anya. (Gụọ Mak 10:​29, 30.) Olee otú i nwere ike isi nyere onye ị na-amụrụ Baịbụl aka irite uru ná ngọzi Jehova a?

10. Gịnị ka ị mụtara n’ihe Manuel kwuru?

10 Meta onye ị na-amụrụ Baịbụl enyi. Ọ dị ezigbo mkpa ka i gosi onye ị na-amụrụ Baịbụl na ị hụrụ ya n’anya. N’ihi gịnị? Lee ihe Manuel bi na Meksiko kwuru. O chetara ihe mere mgbe a na-amụrụ ya Baịbụl. Ọ sịrị: “Tupu anyị amụwa ihe n’ụbọchị ọ bụla, onye na-amụrụ m ihe na-ajụ m otú m mere. Ọ na-eme ka ahụ́ ruo m ala ma hapụ m ka m kwuo ihe ọ bụla bụ́ nsogbu m. Ihe a mere ka m mata na ọ hụrụ m n’anya.”

11. Olee otú anyị na onye anyị na-amụrụ Baịbụl ịnọrị nwere ike isi baara ya uru?

11 Wepụta oge gị na onye ị na-amụrụ Baịbụl ga-eji anọrị, otú ahụ Jizọs wepụtara oge ka ya na ndị na-eso ụzọ ya nọrịa. (Jọn 3:22) Ọ bụrụ na ọ ga-adaba, i nwere ike ịkpọ onye ị na-amụrụ ihe na-eme nke ọma ka ọ bịa n’ụlọ gị ka gị na ya ritụ obere ihe ma ọ bụkwanụ lee ihe omume tiivi anyị. Obi nwere ike ịkacha tọọ ya ụtọ ma ị kpọọ ya ụdị òkù a n’oge a na-eme ememme okpukpe, oge o nwere ike ịdị ya ka ọ̀ nọ naanị ya. Otu nwanna aha ya bụ Kazibwe bi na Yuganda sịrị: “M mụtara ọtụtụ ihe gbasara Jehova n’oge mụ na onye na-amụrụ m ihe ji nọrịa, otú ahụ m na-amụtakwa n’oge anyị na-eji amụ ihe. M hụrụ na Jehova hụrụ ndị ya n’anya nke ukwuu nakwa na ha na-enwe obi ụtọ. Ọ bụ ihe ahụ ka m chọrọ ná ndụ m.”

Ọ bụrụ na anyị na ụmụnna dị iche iche esoro na-amụrụ mmadụ ihe, ọ ga-eme ka ọ dịrị onye ahụ a na-amụrụ ihe mfe ịbịa ọmụmụ ihe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12) *

12. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-akpọrọ ụmụnna dị iche iche aga ịmụrụ mmadụ ihe?

12 Kpọrọ ụmụnna dị iche iche gaa mụọrọ ya ihe. Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike iche na ọ kaara anyị mfe ịga naanị anyị mụọrọ mmadụ ihe ma ọ bụ ịna-akpọrọ otu nwanna mgbe ọ bụla anyị na-aga. O nwere ike ịkara anyị mfe ime otú ahụ. Ma, ọ ga-aka abara onye anyị na-amụrụ ihe uru ma ọ bụrụ na anyị akpọrọ ụmụnna dị iche iche gaa ịmụrụ ya ihe. Otu nwanna aha ya bụ Dmitrii bi na Mọldova sịrị: “Nwanna ọ bụla so bịa ịmụrụ m ihe na-esi n’ụzọ pụrụ iche akọwara m ihe. Ihe a nyeere m aka ịhụ ụzọ ọzọ m nwere ike isi na-eme ihe m na-amụta. O mekwara ka ihere ghara imecha m mgbe mbụ m gara ọmụmụ ihe n’ihi na amatala m ọtụtụ ụmụnna.”

13. Gịnị mere anyị kwesịrị iji nyere onye anyị na-amụrụ ihe aka ka ọ na-abịa ọmụmụ ihe?

13 Nyere onye ị na-amụrụ ihe aka ịbịa ọmụmụ ihe. N’ihi gịnị? Jehova nyere ndị na-efe ya iwu izukọ ọnụ. Ọ bụ otu ụzọ anyị si efe ya. (Hib. 10:​24, 25) Ihe ọzọkwa bụ na ụmụnna nọ n’ọgbakọ dị ka ndị ezinụlọ anyị. Ọ bụrụ na anyị na ha anọrọ n’ọmụmụ ihe, o yiri ka anyị na ha ọ̀ nọkọtara ọnụ na-eri ihe. Ọ bụrụ na i nyere onye ị na-amụrụ ihe aka ịbịa ọmụmụ ihe, ị na-enyere ya aka ime otu ihe dị mkpa ga-enyere ya aka iru eru ime baptizim. Ma, o nwere ike isiri ya ike ịbịa ọmụmụ ihe. Olee otú akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi nwere ike isi nyere ya aka ịbịa ọmụmụ ihe n’agbanyeghị nsogbu ndị ọ na-enwe?

14. Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị anyị na-amụrụ ihe aka ịbịa ọmụmụ ihe?

14 Jiri isi nke iri n’akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi nyere onye ị na-amụrụ ihe aka ịbịawa ọmụmụ ihe. Tupu e wepụta akwụkwọ a, a gwara ụfọdụ ndị nkwusa bụ́ aka ochie ka ha na ndị ha na-amụrụ ihe mụọ isi nke iri n’akwụkwọ a. Ha kwuru na akwụkwọ a bara uru, nyekwara ndị ha na-amụrụ ihe aka ịbịawa ọmụmụ ihe. Ma i kwesịghị ichere ruo mgbe unu ga-amụ isi nke iri tupu gị agwa onye ị na-amụrụ ihe ka ọ bịawa ọmụmụ ihe. Mgbe ọ bụla unu malitere ịmụchi ihe anya, gwa ya ka ọ bịawa ọmụmụ ihe, nọgidekwa na-agwa ya. Nsogbu otu onye a na-amụrụ Baịbụl na-enwe na-adị iche na nke ibe ya. N’ihi ya, leruo anya ala ka ị mara nsogbu onye ị na-amụrụ Baịbụl nwere na otú ị ga-esi enyere ya aka. Adakwala mbà n’obi ma ọ bụrụ na o gburu oge tupu ya abịa ọmụmụ ihe. Nweere ya ndidi. Ma, akwụsịkwala ịgwa ya ka ọ bịa ọmụmụ ihe.

NYERE ONYE Ị NA-AMỤRỤ BAỊBỤL AKA ỊKWỤSỊ ỊTỤ ỤJỌ

15. Olee ihe ụfọdụ nwere ike ịna-atụ ndị anyị na-amụrụ ihe ụjọ?

15 Ì chetara na o nwere mgbe ụjọ tụtụrụ gị ịbụ Onyeàmà Jehova? O nwere ike ịbụ na ị na-eche na ị gaghị ezili ndị mmadụ ozi ọma ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ị na-atụ ụjọ na ndị ezinụlọ gị ma ọ bụ ndị enyi gị nwere ike imegide gị. Ọ bụrụ otú ahụ, ị ga-aghọta otú ọ dị onye ị na-amụrụ ihe. Jizọs kwuru na ụfọdụ ndị ga-atụ ụdị ụjọ a. Ma, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha ghara ikwe ka ụdị ụjọ a gbochie ha ife Jehova. (Mat. 10:​16, 17, 27, 28) Olee otú Jizọs si nyere ndị na-eso ụzọ ya aka ịkwụsị ịtụ ụjọ? Oleekwa otú anyị ga-esi eme ka ya?

16. Olee otú anyị nwere ike isi nyere onye anyị na-amụrụ ihe aka ịgwa ndị ọzọ ihe ọ na-amụta?

16 Na-enyere onye ị na-amụrụ Baịbụl aka ka ọ na-agwa ndị ọzọ ihe o kweere. O nwere ike ịbụ na ụjọ tụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs mgbe o zipụrụ ha ka ha gaa kwusaa ozi ọma. Ma, Jizọs nyeere ha aka. Ọ gwara ha ebe ha ga-aga kwusaa ozi ọma na ihe ha ga-ezi. (Mat. 10:​5-7) Olee otú i nwere ike isi mee ihe a Jizọs mere? Nyere onye ị na-amụrụ ihe aka ka ọ chọpụta ebe o nwere ike izi ozi ọma. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịjụ ya ma ò nwere onye ọ ma otu eziokwu ọ mụtara nwere ike ịbara uru. Nyeziere ya aka ịkwadebe ihe ọ ga-ekwu. Otú ị ga-esi eme ya bụ igosi ya ụzọ dị mfe ọ ga-esi akọwara onye ahụ eziokwu ahụ. Mgbe ọ bụla ọ dabara adaba, gị na ya nwere ike ime ihe dị n’ebe e dere “Ụfọdụ Na-asị” nakwa “Mmadụ Nwere Ike Ịjụ” nke dị n’akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi. Unu mewe ya, lekwasị anya n’inyere ya aka iji akọ jiri Baịbụl zaa mmadụ ajụjụ n’ụzọ dị mfe nghọta.

17. Olee otú anyị nwere ike isi jiri ihe e dere na Matiu 10:​19, 20, 29-31 nyere onye anyị na-amụrụ Baịbụl aka ịtụkwasị Jehova obi?

17 Nyere onye ị na-amụrụ Baịbụl aka ịtụkwasị Jehova obi. Jizọs mere ka obi sie ndị na-eso ụzọ ya ike n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya. (Gụọ Matiu 10:​19, 20, 29-31.) Mee ka onye ị na-amụrụ ihe mata na Jehova ga-enyekwara ya aka. I nwere ike inyere ya aka ka ọ tụkwasị Jehova obi ma ị na-akpọtụ ihe ndị ọ chọrọ ime aha ma gị na ya na-ekpe ekpere. Otu nwanna aha ya bụ Franciszek bi na Poland sịrị: “Onye na-amụrụ m Baịbụl na-etinyekarị ihe ndị m chọrọ ime n’ekpere ya. Mgbe m hụrụ otú Jehova si za ekpere onye na-amụrụ m Baịbụl, m bidoro ikpe ekpere ozugbo. Ahụrụ m otú Jehova si za m ekpere m mgbe m chọrọ ka e nye m ohere n’ebe m nwetara ọrụ ọhụrụ iji na-aga ọmụmụ ihe nakwa iji gaa mgbakọ.”

18. Olee otú obi dị Jehova maka ọrụ Ndị Kraịst na-arụ ịkụziri ndị ọzọ gbasara ya?

18 Jehova hụrụ ndị anyị na-amụrụ ihe n’anya nke ukwuu. O ji mbọ Ndị Kraịst na-agba ịkụziri ndị ọzọ gbasara ya kpọrọ ihe, hụkwa ha n’anya maka ya. (Aịza. 52:7) Ọ bụrụ na e nweghị onye ị na-amụrụ Baịbụl ugbu a, i nwekwara ike inyere ndị a na-amụrụ ihe aka ime nke ọma ma mee baptizim ma i soro ndị ọzọ na-aga amụrụ ha ihe.

ABỤ NKE 60 Ọ Ga-eme Ka Ha Nweta Ndụ

^ par. 5 N’isiokwu a, anyị ga-atụle otú Jizọs si nyere ndị mmadụ aka ịbụ ndị na-eso ụzọ ya nakwa otú anyị nwere ike isi na-eme ka ya. Anyị ga-atụlekwa ihe ụfọdụ dị n’akwụkwọ ọhụrụ anyị bụ́ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi. E dere akwụkwọ a ka anyị jiri ya nyere ndị anyị na-amụrụ ihe aka ka ha ruo eru ime baptizim.

^ par. 7 Ebe ọzọ i nwere ike ịhụ akụkọ ndị mere eme bụ (1) n’Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ, n’okpuru isiokwu bụ́ “Baịbụl,” n’isiokwu nta bụ́ “Uru Baịbụl Bara,” n’ebe e dere “‘Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ’ (Isiokwu na-agbakarị n’Ụlọ Nche)” ma ọ bụkwanụ (2) n’ebe vidio na-adị na JW Library®, n’ebe e dere “Ajụjụ Ọnụ.”

^ par. 62 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna na nwunye ya na-amụrụ otu nwa okorobịa ihe. N’oge ndị ọzọ, ya na ụmụnna ndị ọzọ sokwa gaa ịmụrụ nwa okorobịa ahụ ihe.