Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị ka Pọl onyeozi bu n’obi mgbe ọ sịrị: “M nwụrụ anwụ ma a bịa n’idebe iwu.”​—Gal. 2:19.

Pọl dere, sị: “M nwụrụ anwụ ma a bịa n’idebe iwu, ka m wee dị ndụ jewere Chineke ozi.”​—Gal. 2:19.

Ihe a Pọl onyeozi kwuru dabara n’otu ihe bụ́ isi ọ chọrọ ime ka ọgbakọ ndị dị na Galeshia nke ndị Rom na-achị ghọta. Ndị nkụzi ụgha na-emegharị ụfọdụ Ndị Kraịst nọ n’ebe ahụ anya. Ha na-akụzi na ihe ga-eme ka a zọpụta mmadụ bụ idebe Iwu Mozis, karịchaa, iwu gbasara ibi úgwù. Ma, Pọl maara na ọ bụghị iwu na a ga-ebi Onye Kraịst úgwù. Pọl kwuru ihe doro anya gosiri na ihe ha na-akụzi abụghị eziokwu, meekwa ka okwukwe ụmụnna ya sie ike n’àjà mgbapụta Jizọs Kraịst.​—Gal. 2:4; 5:2.

Baịbụl mere ka o doo anya na ozugbo mmadụ nwụrụ, ọ naghị ama ihe na-eme gburugburu ya. (Ekli. 9:5) Mgbe Pọl sịrị: “M nwụrụ anwụ ma a bịa n’idebe iwu,” ihe ọ na-ekwu bụ na iwu ejighị ya idebe Iwu Mozis. Kama, obi siri ya ike na okwukwe o nwere n’àjà mgbapụta Jizọs mere ka ọ “dị ndụ jewere Chineke ozi.”

Ihe mere ndụ Pọl ji gbanwee bụ “iwu.” Olee otú ọ bụ? Pọl ka kwupụrụ na “ọ bụghị mmadụ ime ihe e kwuru n’iwu ga-eme ka a kpọọ ya onye ezi omume, kama ọ bụ naanị ma onye ahụ nwee okwukwe na Jizọs Kraịst.” (Gal. 2:16) O doro anya na Iwu ahụ rụrụ ọrụ dị mkpa n’oge ya. Ma, Pọl gwara Ndị Galeshia, sị: “E nyere ya ka a mata ihe ọjọọ ndị mmadụ na-eme ruo mgbe nwa ahụ ga-abịa, bụ́ onye e kwere nkwa ahụ.” (Gal. 3:19) N’eziokwu, Iwu ahụ mere ka o doo anya na ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-eme mmehie agaghị edebeli Iwu ahụ ruo n’isi, nakwa na ọ dị mkpa ka e nwee àjà ikpeazụ, bụ́ nke zuru okè. N’ihi ya, Iwu ahụ nyeere ndị mmadụ aka ịmata na Kraịst bụ “mkpụrụ ahụ.” Ọ bụrụ na mmadụ enwee okwukwe na Jizọs Kraịst, Chineke nwere ike ịkpọ ya onye ezi omume. (Gal. 3:24) Ihe mere e ji kpọọ Pọl onye ezi omume bụ na Iwu ahụ mere ka ọ nabata Jizọs ma nwee okwukwe na ya. N’ihi ya, Pọl “nwụrụ anwụ ma a bịa n’idebe iwu” ma dịrịzie ndụ “jewere Chineke ozi.” Iwu ahụ enweghịzi ikike n’ebe ọ nọ, ma Chineke nwere.

Pọl kwuru ihe yiri ihe a n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Rom. Ọ sịrị: “Ụmụnna m, e sikwa n’ahụ́ Kraịst mee ka unu nwere onwe unu n’Iwu ahụ . . . Anyị enwerela onwe anyị n’Iwu ahụ n’ihi na iwu ahụ ejighịzi anyị.” (Rom 7:​4, 6) Amaokwu a na Ndị Galeshia 2:19 gosiri na Pọl anaghị ekwu gbasara mmadụ ịnwụ n’ihi na e ji Iwu ahụ maa ya ikpe ọnwụ. Kama, ihe ọ na-ekwu gbasara ya kpọmkwem bụ ime ka anyị nwere onwe anyị. Iwu ahụ ejighịzi ya na ndị ọzọ dị ka ya. Okwukwe ha nwere n’àjà mgbapụta Jizọs Kraịst emeela ka ha nwere onwe ha na ya.