Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 26

Ì Nwere Ike Inye Aka n’Ime Ndị Na-eso Ụzọ?

Ì Nwere Ike Inye Aka n’Ime Ndị Na-eso Ụzọ?

“Chineke . . . na-eme ka unu nwee mmasị ime ihe, na-enyekwa unu ike unu ji eme ya.”​—FIL. 2:13.

ABỤ NKE 64 Anyị Ji Ọṅụ Soro Na-ewe Ihe Ubi

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị ka Jehova meere gị?

OLEE otú i si ghọọ Onyeàmà Jehova? Nke mbụ, ị nụrụ “ozi ọma” ahụ. O nwere ike ịbụ nne na nna gị, onye ọrụ ibe gị ma ọ bụ nwa akwụkwọ ibe gị, ma ọ bụkwanụ Ndịàmà Jehova nọ n’ozi ụlọ n’ụlọ mere ka ị nụ ozi ọma ahụ na nke mbụ ya. (Mak 13:10) Mgbe e mechara, mmadụ wepụtara ezigbo oge ma gbaa mbọ duziere gị ọmụmụ Baịbụl. Mgbe unu na-amụ Baịbụl, ị bịara hụkwuo Jehova n’anya, chọpụtakwa na ọ hụrụ gị n’anya. Jehova dọtara gị n’eziokwu ahụ. Ugbu a, ị bụzi onye na-eso ụzọ Jizọs. I nwekwara olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. (Jọn 6:44) O doro anya na obi dị gị ụtọ na Jehova mere ka mmadụ bịa kụziere gị eziokwu ahụ, kwekwa ka ị bụrụ otu n’ime ndị ohu ya.

2. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

2 Ugbu a anyị matara eziokwu, anyị nwere ọrụ magburu onwe ya inyere ndị ọzọ aka ịbịa soro anyị na-eje ije n’ụzọ na-eduba ná ndụ. O nwere ike ịna-adịrị anyị mfe izi ndị mmadụ ozi ọma, ma, ịgwa ha ka anyị na ha mụwa ihe ma ọ bụkwanụ ịmụrụ ha ihe ana-esiri anyị ike. Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị gịnwa? Ọ bụrụ otú ahụ, ihe ụfọdụ e kwuru n’isiokwu a nwere ike inyere gị aka. Anyị ga-atụle ihe na-eme ka anyị chọọ iso na-eme ndị na-eso ụzọ, tụleekwa otú anyị ga-esi emeri ihe ndị nwere ike ime ka o siere anyị ike iduzi ọmụmụ Baịbụl. Ka anyị buru ụzọ lee ihe mere anyị kwesịrị iji bụrụ ndị nkụzi kama ịbụ naanị ndị na-ekwusa ozi ọma.

JIZỌS NYERE ANYỊ IWU IKWUSA OZI ỌMA NA ỊKỤZI IHE

3. Gịnị mere anyị ji ekwusa ozi ọma?

3 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o nyere ndị na-eso ụzọ ya ọrụ gbara mkpị. Nke mbụ, ọ gwara ha ka ha kwusaa ozi ọma nke Alaeze, gosikwa ha otú ha ga-esi arụ ya. (Mat. 10:7; Luk 8:1) Ọ gwakwara ha ihe ha ga-eme ma ndị mmadụ nabata ozi ha ma ọ bụkwanụ jụ ya. (Luk 9:​2-5) O kwukwara ebe ndị na-eso ụzọ ya ga-ekwusaru ozi ọma ahụ, gwakwa ha na ozi ha ga-abụrụ “mba niile àmà.” (Mat. 24:14; Ọrụ 1:8) N’agbanyeghị ma ndị mmadụ hà nabatara ozi ahụ ma ọ bụ jụ ya, ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-agwa ha gbasara Alaeze Chineke nakwa ihe ndị ọ ga-emezu.

4. Dị ka e kwuru na Matiu 28:​18-20, gịnị ka anyị kwesịrị ime ma e wezụga ikwusa ozi ọma Alaeze?

4 Olee ihe nke abụọ n’iwu ahụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya? Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha kụziere ndị niile chọrọ ịbụ ndị na-eso ụzọ ya idebe ihe niile o nyere n’iwu. Ụfọdụ ndị na-ekwu na ọ bụ naanị ndị na-eso ụzọ Jizọs n’oge ahụ ka ọrụ ahụ dịịrị. Ọ̀ bụ eziokwu? Mba. Jizọs gosiri na a ga na-arụ ọrụ a dị mkpa ruo n’oge anyị a, “ruo ọgwụgwụ oge a.” (Gụọ Matiu 28:​18-20.) Ọ ga-abụ na Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu a mgbe ọ pụtara n’ihu ihe karịrị narị ndị na-eso ụzọ ya ise. (1 Kọr. 15:6) Ná mkpughe Jizọs kpugheere Jọn, o mere ka o doo anya na ndị na-eso ụzọ ya niile kwesịrị inyere ndị ọzọ aka ịmụta banyere Jehova.​—Mkpu. 22:17.

5. Dị ka e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 3:​6-9, olee otú Pọl si kọwaa otú ikwusa ozi ọma na ịkụzi ihe si yie?

5 Pọl onyeozi ji ọrụ ime ndị na-eso ụzọ tụnyere ịkọ ugbo. Ihe ọ pụtara bụ na ihe anyị ga-eme abụghị naanị ịkụ mkpụrụ. O chetaara ndị Kọrịnt, sị: “Akụrụ m mkpụrụ, Apọlọs agbaa ya mmiri. . . . Ununwa bụ ubi Chineke na-arụ ọrụ na ya, bụrụkwa ụlọ Chineke na-arụ.” (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 3:​6-9.) Dị ka ndị na-arụ ọrụ ‘n’ubi Chineke,’ ihe anyị ga-eme abụghị naanị ịkụ mkpụrụ. Anyị ga na-agbakwa ya mmiri, na-elekwa otú o si eme. (Jọn 4:35) Anyị kwesịkwara icheta na ọ bụ Chineke na-eme ka mkpụrụ ahụ anyị kụrụ na-eto.

6. Anyị na-akụziri mmadụ ihe, olee ihe anyị kwesịrị inyere ya aka ime?

6 Anyị na-achọ ndị “na-akpa àgwà otú na-egosi na ha chọrọ inweta ndụ ebighị ebi.” (Ọrụ 13:48) Ọ bụrụ na anyị chọrọ inyere ha aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, anyị kwesịrị inyere ha aka (1) ịghọta, (2) ikweta, na (3) ime ihe ndị ha na-amụta na Baịbụl. (Jọn 17:3; Kọl. 2:​6, 7; 1 Tesa. 2:13) Mmadụ niile nọ n’ọgbakọ nwere ike inyere ndị a na-amụrụ Baịbụl aka ma ha na-egosi ha na ha hụrụ ha n’anya, na-anabatakwa ha nke ọma ma ha bịa ọmụmụ ihe. (Jọn 13:35) O nwekwara ike ịdị mkpa ka onye na-amụrụ mmadụ ihe jiri nnukwu oge ma gbaa ezigbo mbọ inyere onye ọ na-amụrụ ihe aka ịgbanwe àgwà ma ọ bụ nkwenkwe ndị “gbanyesiri mgbọrọgwụ ike.” (2 Kọr. 10:​4, 5) O nwere ike iwe ọtụtụ ọnwa inyere onye a na-amụrụ ihe aka ime ihe ndị a ga-eme ka o mechaa ruo eruo ime baptizim. Ma, mgbalị ahụ anyị mere iji nyere ya aka efughị ọhịa.

ỊHỤNANYA NA-EME KA ANYỊ NA-EME NDỊ NA-ESO ỤZỌ

7. Gịnị mere anyị ji achọ ikwusa ozi ọma na ime ndị na-eso ụzọ?

7 Gịnị mere anyị ji na-ekwusa ozi ọma ma na-eme ndị na-eso ụzọ? Nke mbụ, n’ihi na anyị hụrụ Jehova n’anya. Anyị na-egosi na anyị hụrụ Chineke n’anya ma anyị na-eme ike anyị niile idebe iwu o nyere anyị ikwusa ozi ọma na ime ndị na-eso ụzọ. (1 Jọn 5:3) Chegodị ihe a: Ị malitela izi ndị mmadụ ozi ọma n’ihi na i hụrụ Jehova n’anya. Ime ya ọ̀ dịịrị gị mfe? O yiri ka ọ dịchaghịrị gị mfe. N’oge mbụ ị gara izi ndị mmadụ ozi ọma, ụjọ ọ̀ tụrụ gị? O doro anya na ụjọ tụrụ gị. Ma, ị ma na ọ bụ ọrụ Jizọs chọrọ ka ị rụọ, gị arụọ ya. O yikwara ka ọ malitere ịdịtụrụ gị mfe ka oge na-aga. Ma, oleekwanụ gbasara iduziri ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl? Ọ̀ na-atụ gị ụjọ? O nwere ike. Ma, ọ bụrụ na ị rịọ Jehova ka o nyere gị aka ịkwụsị ịtụ ụjọ ma nwee obi ike ịgwa mmadụ ka ị malitere ya ọmụmụ Baịbụl, Jehova nwere ike inyere gị aka ịna-eme ndị na-eso ụzọ.

8. Dị ka e kwuru na Mak 6:​34, olee ihe ọzọ na-eme ka anyị na-akụziri ndị mmadụ ihe?

8 Nke abụọ, ịhụnanya anyị nwere n’ebe ndị mmadụ nọ na-eme ka anyị kụziere ha eziokwu. O nwere mgbe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya kwusachara ozi ọma, ike agwụ ha. Ha chọrọ ịga otu ebe zuru ike, ma ìgwè mmadụ hụrụ ha. Jizọs nweere ha ọmịiko ma malite izi ha “ọtụtụ ihe.” (Gụọ Mak 6:34.) N’agbanyeghị na ike gwụrụ ya n’oge ahụ, o zughị ike. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ ma otú o si dịrị ìgwè mmadụ ahụ. Ọ hụrụ na ha na-ata nnukwu ahụhụ, hụkwa na e kwesịrị ime ka ha nwee olileanya. Ọ chọkwara inyere ha aka. Ndị mmadụ taa nọkwa n’ụdị ọnọdụ ahụ. N’agbanyeghị na ha nwere ike iyi ndị na-enweghị nsogbu, ha dị ka atụrụ kpafuru akpafu na-enweghị onye ọzụzụ atụrụ. Pọl onyeozi kwuru na ndị mmadụ dị ka ndị na-amaghị Chineke na ndị na-enweghị olileanya. (Efe. 2:12) Ha na-eje ije ‘n’ụzọ na-eduba ná mbibi.’ (Mat. 7:13) Ọ bụrụ na anyị echee otú o si dị mkpa ka ndị nọ n’ókèala anyị mata Chineke, ịhụnanya na ọmịiko anyị nwere n’ebe ha nọ ga-eme ka anyị nyere ha aka. Ụzọ kacha mma anyị ga-esi enyere ha aka bụ ịgwa ha ka anyị na ha mụwa Baịbụl.

9. Dị ka e kwuru ná Ndị Filipaị 2:​13, olee otú Jehova nwere ike isi nyere gị aka?

9 O nwere ike ịbụ na ihe mere i ji egbu oge ịgwa mmadụ ka ị mụwara ya ihe bụ na ị ma na ọ ga-ewe gị oge ịkwadebe maka ọmụmụ ihe ahụ na ịmụrụ ya ihe. Ọ bụrụ otú ahụ, kọọrọ Jehova otú ọ dị gị n’obi. Rịọ ya ka o nyere gị aka inwe mmasị ịchọta onye ị ga-amụrụ ihe nakwa ịmụrụ ya ihe. (Gụọ Ndị Filipaị 2:13.) Jọn onyeozi mere ka obi sie anyị ike na Chineke ga-aza ekpere anyị ma ọ daba n’uche Ya. (1 Jọn 5:​14, 15) N’ihi ya, obi kwesịrị isi gị ike na Jehova ga-enyere gị aka inwe mmasị iso na-eme ndị na-eso ụzọ.

OTÚ ANYỊ GA-ESI MERIE NSOGBU NDỊ ỌZỌ

10-11. Gịnị nwere ike ime ka anyị gbuo oge ịmalitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl?

10 Anyị nwere ike ịrụ ọrụ a Chineke nyere anyị ịkụziri ndị mmadụ ihe n’agbanyeghị na anyị na nsogbu ndị nwere ike ime ka o siere anyị ike ime ndị na-eso ụzọ na-alụ. Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime nsogbu ndị a nakwa ihe anyị nwere ike ime maka ha.

11 Otú ihe si dịrị anyị nwere ike ime ka anyị ghara imecha otú anyị chọrọ. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ụmụnna anyị emeela agadi ma ọ bụkwanụ na-arịa ọrịa. Ọ̀ bụ otú a ka ọ dị gịnwa? Ọ bụrụ otú ahụ, ka anyị lee otu ihe ọrịa koronavaịrọs kụziiri anyị. Anyị achọpụtala na anyị nwere ike iji ekwentị ma ọ bụ siri n’Ịntanet duziere ndị mmadụ ọmụmụ ihe. N’ihi ya, i nwere ike ịnọ n’ụlọ gị malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl ma na-amụrụ ya ihe. O nwekwara uru ọzọ isi otú a ezi ozi ọma bara. Ụfọdụ ndị chọrọ ịmụ Baịbụl, ma, ha anaghị anọ ya n’oge ụmụnna anyị ji aga ozi ọma. Ha nwere ike ịnọ ya n’isi ụtụtụ ma ọ bụkwanụ n’abalị. Ì nwere ike iwepụta ohere mụọrọ ha ihe mgbe ahụ? Jizọs kụziiri Nikọdimọs ihe n’abalị, bụ́ oge kaara Nikọdimọs mma.​—Jọn 3:​1, 2.

12. Olee ihe ndị nwere ike ime ka obi sie gị ike na ị ga-akụzili ihe nke ọma?

12 Anyị nwere ike iche na anyị agaghị eduzili ọmụmụ Baịbụl. Anyị nwere ike iche na anyị kwesịrị ịmatakwu ihe ma ọ bụ bụrụ ezigbo ndị nkụzi tupu anyị enwee ike ịmụrụ mmadụ ihe. Ọ bụrụ otú a ka ọ dị gị, lee ihe atọ ga-eme ka obi sie gị ike na ị ga-eduziliri mmadụ ọmụmụ Baịbụl. Nke mbụ, Jehova weere ya na i ruru eru ịkụziri ndị ọzọ ihe. (2 Kọr. 3:5) Nke abụọ, Jizọs bụ́ onye nwere ike niile “n’eluigwe na n’ụwa” nyere gị iwu ka ị kụziere ndị ọzọ ihe. (Mat. 28:18) Nke atọ, ndị ọzọ nwere ike inyere gị aka. Ihe Jizọs kụziiri ndị mmadụ bụ ihe nna ya kụziiri ya. Gịnwa nwekwara ike ime otú ahụ. (Jọn 8:28; 12:49) Ihe ọzọ i nwekwara ike ime bụ ịgwa onye nlekọta ìgwè ozi ubi unu, ọsụ ụzọ, ma ọ bụ onye nkwusa bụ́ aka ochie ka o nyere gị aka ịmalite ọmụmụ Baịbụl na iduzi ya. Ihe ọzọ ga-enyere gị aka ka obi sie gị ike bụ iso otu n’ime ụmụnna ndị a mụọrọ mmadụ ihe.

13. Gịnị mere anyị kwesịrị iji gbalịa ka anyị mụta isi n’ụzọ dị iche iche na-akụzi ihe?

13 O nwere ike isiri anyị ike isi n’ụzọ ọhụrụ ma ọ bụ iji ihe ọhụrụ na-akụziri ndị mmadụ ihe. Otú anyị si eduziri ndị mmadụ ọmụmụ ihe agbanweela ugbu a. Akwụkwọ bụ́ isi anyị jizi eduziri ndị mmadụ ihe ugbu a bụ akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi. Ọ dị mkpa ka anyị kwadebe ihe anyị na onye anyị na-amụrụ ihe ga-amụ ma si otú dị iche n’otú anyị sibu eduzi ihe duzie ya. Paragraf anyị ga-amụ dịzi ole na ole. E nwekwara ọtụtụ ihe anyị na onye anyị na-amụrụ ihe ga-ekwurịta. Ihe anyị na-akachazi eji akụziri ndị mmadụ ihe ugbu a bụ vidio na ihe ndị dị ka JW Library®. Ọ bụrụ na anyị amaghị otú e si eji ihe ndị a amụrụ mmadụ ihe, anyị nwere ike ịgwa mmadụ ka ọ kụziere anyị. Anyị ma na ọ naghị adị mfe ịmụta ihe ọhụrụ. Ọ na-esiri anyị ike isi n’ụzọ ọhụrụ na-eme ihe ndị anyị na-emebu mbụ. Ma, Jehova na ụmụnna anyị ga-enyere anyị aka ya adịrị anyị mfe ịmụta ụzọ ọhụrụ a e si akụziri ndị mmadụ ihe, ya ana-atọkwa anyị ụtọ. Otu ọsụ ụzọ sịrị: “Isi otú a akụzi ihe na-eme ka obi na-atọ ma onye a na-amụrụ ihe ma onye na-amụrụ ya ihe ụtọ.”

14. Gịnị ka anyị kwesịrị icheta ma ọ bụrụ na ndị mmadụ anaghị ege ntị n’ókèala anyị? Olee otú ihe e dere ná 1 Ndị Kọrịnt 3:​6, 7 si agba anyị ume?

14 O nwere ike ịbụ na i bi n’ókèala ọ na-esi ike ịmalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl. O nwere ike ịbụ na ndị nọ n’ókèala anyị anaghị achọ ịnụ ozi ọma anyị ma ọ bụkwanụ ha ana-emegide anyị. Gịnị ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ịda mbà? Cheta na ndụ ndị mmadụ nwere ike ịgbanwe na mberede n’ụwa a nsogbu juru. Ndị na-anabughị ege anyị ntị nwere ike chọpụta na ọ dị mkpa ka Chineke na-eduzi ha. (Mat. 5:3) Ụfọdụ ndị na-anaghị achọ ịgụ akwụkwọ anyị emechaala kweta ka a mụwara ha Baịbụl. Anyị ma na ọ bụ Jehova nwe ubi ahụ. (Mat. 9:38) Ọ chọkwara ka anyị nọgide na-akụ mkpụrụ ma na-agba ya mmiri, ma, ọ bụ ya bụ Onye ga-eme ka o too. (1 Kọr. 3:​6, 7) Obi dịkwa anyị ụtọ ịmara na ọ bụrụgodị na anyị anaghị eduziri mmadụ ọmụmụ Baịbụl ugbu a, Jehova ga-agọzi anyị maka mbọ anyị gbara inyere ndị mmadụ aka, ọ bụghị maka mmadụ ole anyị duziiri ihe ma ọ bụ nyefee akwụkwọ anyị. *

KA IME NDỊ NA-ESO ỤZỌ NA-ATỌ GỊ ỤTỌ

Lee otú ozi ọma na ihe anyị na-amụrụ ndị mmadụ nwere ike isi gbanwee ndụ mmadụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15 ruo na nke 17) *

15. Olee otú obi na-adị Jehova ma ọ bụrụ na mmadụ ekweta ka a mụwara ya Baịbụl ma na-eme ihe ọ na-amụta?

15 Obi na-adị Jehova ụtọ ma ọ bụrụ na mmadụ amụta eziokwu Baịbụl, na-akọkwara ya ndị ọzọ. (Ilu 23:​15, 16) Jehova na-enwe ezigbo obi ụtọ ma ọ hụ ka a na-ekwusa ozi ọma ma na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl taa. Dị ka ihe atụ, n’agbanyeghị ike ọrịa koronavaịrọs kpara n’afọ ije ozi 2020, e duziiri nde mmadụ asaa narị puku asaa na ise na narị asaa na iri isii na ise ọmụmụ Baịbụl. Ihe a mere ka narị puku mmadụ abụọ na iri puku anọ na otu na narị itoolu na iri itoolu na anọ nyefee Jehova onwe ha, e mee ha baptizim. Ndị ọhụrụ ndị a ga-eduziwekwara ndị ọzọ ọmụmụ Baịbụl si otú ahụ metakwuo ndị na-eso ụzọ. (Luk 6:40) Obi siri anyị ike na ọrụ ime ndị na-eso ụzọ anyị na-arụ na-eme Jehova obi ụtọ.

16. Gịnị ka anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ime?

16 Ime ndị na-eso ụzọ abụghị obere ọrụ. Ma, Jehova ga-enyere anyị aka anyị esoro kụziere ndị ọhụrụ ịhụ Nna anyị nke eluigwe n’anya. Ànyị nwere ike ịgbalị malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl, ọ bụrụgodị otu onye? Ọ bụrụ na anyị ejiri ohere ọ bụla dapụtaranụ gwa mmadụ ka anyị mụwara ya Baịbụl, ihe ga-emenụ nwere ike iju anyị anya. Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-agọzi mgbalị anyị mere.

17. Olee otú obi ga-adị anyị ma ọ bụrụ na anyị eduzie ọmụmụ Baịbụl?

17 Ikwusa ozi ọma na ịkụziri ndị mmadụ ihe bụ ọrụ magburu onwe ha. Ọrụ a na-eme ka anyị na-enwe ezigbo obi ụtọ. Pọl onyeozi, bụ́ onye nyeere ọtụtụ ndị nọ na Tesalonaịka aka ịbụ ndị na-eso ụzọ, kwuru otú obi dị ya n’ihi ọrụ a. Ọ sịrị: “Gịnị bụ olileanya anyị ma ọ bụ ọṅụ anyị ma ọ bụ okpueze aṅụrị anyị n’ihu Onyenwe anyị Jizọs n’oge ọnụnọ ya? Ọ̀ bụ na ọ bụghị unu? N’eziokwu, ọ bụ unu bụ ebube anyị na ọṅụ anyị.” (1 Tesa. 2:​19, 20; Ọrụ 17:​1-4) Ọ bụ otú a ka ọ dị ọtụtụ ndị taa. Otu nwanna nwaanyị aha ya bu Stéphanie ya na di ya nyeere ọtụtụ ndị aka ime baptizim sịrị: “O nweghị ihe na-eme obi ụtọ karịa inyere ndị mmadụ aka inyefe Jehova onwe ha.”

ABỤ NKE 57 Anyị Na-ezi Ụdị Mmadụ Niile Ozi Ọma

^ par. 5 Ọrụ magburu onwe ya Chineke nyere anyị abụghị naanị ikwusa ozi ọma. O nyekwara anyị ọrụ ịkụziri ndị mmadụ ka ha debe ihe niile Jizọs nyere n’iwu. Gịnị mere anyị ji achọ ịkụziri ndị mmadụ ihe? Olee ihe ụfọdụ nwere ike isiri anyị ike n’ikwusa ozi ọma na ime ndị na-eso ụzọ? Olee otú anyị nwere ike isi merie ihe isi ike ndị ahụ? Anyị ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu a.

^ par. 14 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata otú onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ si enye aka n’ime ka mmadụ ghọọ onye na-eso ụzọ, gụọ isiokwu bụ́ “Otú Ọgbakọ Ga-esi Enyere Ndị A Na-amụrụ Baịbụl Aka Iru Eru Ime Baptizim.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche nke Mach 2021.

^ par. 53 NKỌWA FOTO: Olee otú ịmụ Baịbụl nwere ike isi baara mmadụ uru? Na mbụ, nwoke a yiri onye ndụ ya na-enweghị isi. Ma, Ndịàmà Jehova ziri ya ozi ọma, ya ekweta ka a mụwara ya ihe. Ihe a kụziiri ya mere ka o nyefee Jehova onwe ya ma mee baptizim. Ka oge na-agakwa, yanwa ghọrọ onye na-eme ndị na-eso ụzọ. N’ikpeazụ, ha niile nọzi na Paradaịs.