Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 27

Na-atachi Obi Ka Jehova

Na-atachi Obi Ka Jehova

“Ọ bụrụ na unu atachie obi ruo ọgwụgwụ, unu ga-enweta ndụ.”​—LUK 21:19.

ABỤ NKE 114 ‘Na-enwenụ Ndidi’

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. Olee otú ihe Jehova kwuru n’Aịzaya 65:​16, 17 si eme ka anyị ghara ịda mbà?

ISIOKWU mgbakọ ukwu nke afọ 2017 bụ “Adala Mbà.” Mgbakọ ahụ mere ka anyị mata otú anyị nwere ike isi na-atachi obi n’agbanyeghị ụdị nsogbu ọ bụla bịaara anyị. Afọ anọ agaala kemgbe anyị gara mgbakọ ahụ. Anyị ka nọkwa na-atachi obi n’ime ụwa ọjọọ a anyị nọ na ya.

2 Olee nsogbu ndị gị na ha na-alụ ugbu a? Onye ezinụlọ gị ị hụrụ n’anya ọ̀ nwụnahụrụ gị, ka ọ̀ bụ ezigbo enyi gị nwụrụ? Ọ̀ bụ ọrịa ka gị na ya na-alụ, ka ọ̀ bụ nká? Ka ọ̀ bụ ọdachi ndị na-emere onwe ha, tigbuo zọgbuo ma ọ bụkwanụ mkpagbu? Ka ọrịa koronavaịrọs ma ọ bụkwanụ ọrịa ọzọ ọ̀ kpaala gị aka ọjọọ? Anyị na-atụsi anya ike otu ụbọchị mgbe nsogbu ndị a niile na-agaghị adịkwa, mgbe ha ga-abụ ihe e ji akọ akụkọ na ihe e chefuru echefu.​—Gụọ Aịzaya 65:​16, 17.

3. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ugbu a, n’ihi gịnịkwa?

Ndụ siri ike n’ụwa a anyị nọ n’ime ya. Ihe nwekwara ike ịka njọ n’ọdịnihu. (Mat. 24:21) O doro anya na anyị kwesịrị ịnọgide na-agbalịsi ike ka anyị na-atachi obi. N’ihi gịnị? N’ihi na Jizọs sịrị: “Ọ bụrụ na unu atachie obi ruo ọgwụgwụ, unu ga-enweta ndụ.” (Luk 21:19) Ọ bụrụ na anyị echee gbasara otú ndị ọzọ si tachie obi n’ụdị nsogbu ndị anyị na ha na-alụ, ọ ga-enyere anyị aka ịtachi obi.

4. Gịnị mere anyị ji kwuo na ọ bụ Jehova kacha atachi obi?

4 Ònye kacha atachi obi? Ọ bụ Jehova Chineke. Ò juru gị anya? O nwere ike iju gị anya ma ọ bụrụ na i chebaraghị ya echiche. Ọ bụ Ekwensu na-achị ụwa a anyị nọ n’ime ya. Ọ bụ ya mere nsogbu ji jupụta na ya. Jehova nwere ikike ịkwụsị nsogbu niile n’otu ntabi anya. Ma, ọ na-eche ka ụbọchị ọ kara aka ịkwụsị ha ruo. (Rom 9:22) Ma, Chineke anyị ka na-atachi obi ruo mgbe oge ahụ ga-abịa. Ka anyị leba anya n’ihe itoolu Jehova na-edi.

OLEE IHE NDỊ JEHOVA NA-EDI?

5. Olee otú e si na-akọcha aha Chineke? Oleekwa otú ọ na-adị gị n’obi?

5 Nkatọ a na-akatọ aha ya. Jehova ejighị aha ya egwu egwu. Ọ chọkwara ka anyị niile na-akwanyere aha ya ùgwù. (Aịza. 42:8) Ma, kemgbe puku afọ isii, a nọgidela na-akatọ aha Jehova. (Ọma 74:​10, 18, 23) A malitere ịkatọ aha Jehova n’ogige Iden mgbe Ekwensu (nke pụtara “onye nkwutọ”) boro Jehova ebubo na ọ na-egbochi Adam na Iv inweta ihe ndị ga-eme ka ha na-enwe obi ụtọ. (Jen. 3:​1-5) Kemgbe ahụ ruo ugbu a, a nọgidekwala na-ekwu na Jehova na-egbochi ụmụ mmadụ inweta ihe ndị dị ha mkpa. Nkọcha a a na-akọcha aha Jehova wutere Jizọs nke ukwuu. Ọ bụ ya mere o ji kụziere ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere, sị: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.”​—Mat. 6:9.

6. Gịnị mere Jehova ji kwe ka ogologo oge gafee iji mee ka o doo anya na ọ bụ yanwa ka o ruuru ịchị eluigwe na ụwa?

6 Mmegide a na-emegide ya na ọchịchị ya. Ọ bụ Chineke ka o ruuru ịchị eluigwe na ụwa, ọ bụkwa ọchịchị ya kacha mma. (Mkpu. 4:11) Ekwensu agbalịala iduhie ndị mmụọ ozi na ụmụ mmadụ ka ha chee na ọ bụghị Chineke ka o ruuru ịchị. Ọ ga-ewe oge iji mee ka a mata na ọ bụ Jehova ka o ruuru ịchị. Ọ bụ ya mere Jehova ji hapụ ka ogologo oge gafee ka ụmụ mmadụ mata na ọ bụrụ na ha ahapụ Onye kere ha chịwa onwe ha, ihe agaghị agaziri ha. (Jere. 10:23) Otú a Chineke si na-enwe ndidi ga-eme ka e kpebie okwu a otu mgbe. Ọ ga-emekwa ka o doo onye ọ bụla anya na ọ bụ ya ka o ruuru ịchị, nakwa na ọ bụ Alaeze ya ga-eme ka e nwee udo, obi eruokwa ndị mmadụ ala n’ụwa a.

7. Olee ndị nupụụrụ Jehova isi? Gịnịkwa ka Jehova ga-eme ha?

7 Isi ụfọdụ ụmụ ya na-enupụrụ ya. Jehova kere ma ndị mmụọ ozi ma ụmụ mmadụ ha ezuo okè, n’enweghịkwa ntụpọ ọ bụla. Ma, otu n’ime ndị mmụọ ozi bụ́ Setan (nke pụtara “onye mmegide”) nupụụrụ ya isi, meekwa ka Adam na Iv bụ́ ndị zuru okè nupụrụ ya isi. Ụfọdụ ndị mmụọ ozi na ụmụ mmadụ ndị ọzọ nupụkwaara ya isi. (Jud 6) Mgbe e mechara, ụfọdụ ndị Izrel, bụ́ ndị Chineke họọrọ, nupụụrụ ya isi ma hapụ ya gaa fewe chi ụgha dị iche iche. (Aịza. 63:​8, 10) Ihe a wutere Jehova nke ukwuu. Ma, o diri ihe ndị ahụ. Ọ ga-anọgidekwa na-enwe ndidi ruo mgbe ọ ga-ebibi ndị ahụ na-enupụrụ ya isi. Nke ahụ ga-eme ka ọtụtụ ndị na-erubere ya isi nọ na-edi ihe ọjọọ niile a na-eme n’ụwa ọjọọ Ekwensu a nwee obi ụtọ.

8-9. Olee ụgha ndị a na-agha gbasara Jehova, oleekwa ihe anyị kwesịrị ime gbasara ha?

8 Ụgha Ekwensu nọgidere na-agha. Setan boro Job na ndị ọzọ na-efe Jehova ebubo na ihe mere ha ji na-efe ya bụ ihe ọma ndị ọ na-emere ha. (Job 1:​8-11; 2:​3-5) Ekwensu ka nọkwa na-ebo ndị na-efe Chineke ebubo ahụ ruo taa. (Mkpu. 12:10) Ma, anyị ga-egosi na ebubo ahụ Ekwensu na-ebo anyị abụghị eziokwu ma ọ bụrụ na anyị atachie obi ná nsogbu ndị na-abịara anyị, nakwa ma ọ bụrụ na anyị ana-erubere Jehova isi n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya. Jehova ga-agọzi anyị otú ahụ ọ gọziri Job ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-atachi obi.​—Jems 5:11.

9 Setan na-eme ka ndị isi okpukpe na-ekwu na obi tara Jehova mmiri nakwa na ọ bụ ya kpatara ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata. Ụfọdụ n’ime ha na-ekwudị na ọ bụrụ na nwatakịrị anwụọ, ọ bụ Jehova kpọọrọ ya n’ihi na ọ chọkwuru ndị mmụọ ozi n’eluigwe. Ihe a bụ ịkparị Chineke. Ma, anyị ma nke bụ́ eziokwu. Ọ bụrụ na ọrịa jọgburu onwe ya arịawa anyị ma ọ bụ mmadụ anwụnahụ anyị, anyị anaghị ata Chineke ụta maka ya. Kama, obi siri anyị ike na otu ụbọchị, Chineke ga-eme ka ihe dị mma. Anyị na-agwa ndị mmadụ na Jehova hụrụ anyị n’anya, na-emekwa ka Jehova nwee ike ịzaghachi onye ahụ na-akwa ya emo okwu.​—Ilu 27:11.

10. Gịnị ka Abụ Ọma 22:​23, 24 mere ka anyị mata gbasara Jehova?

10 Ahụhụ ndị ohu ya ọ hụrụ n’anya na-ata. Jehova bụ Chineke nwere ọmịiko. Ọ na-ewute ya ịnụ ákwá anyị na-ebe n’ihi ahụhụ anyị na-ata, n’agbanyeghị ma ọ̀ bụ mkpagbu, ọrịa, ma ọ bụkwanụ ezughị okè. (Gụọ Abụ Ọma 22:​23, 24.) Nsogbu anyị na-ewute Jehova. Ọ chọsikwara ike ịkwụsị ya. Ọ ga-akwụsịkwa ya. (Tụlee Ọpụpụ 3:​7, 8; Aịzaya 63:9.) Baịbụl kwuru na oge na-abịa mgbe Jehova ga-ehichapụ “anya mmiri niile dị ha n’anya. Ọnwụ agaghịzi adị. Iru uju ma ọ bụ ibe ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịzi adị.”​—Mkpu. 21:4.

11. Olee otú obi na-adị Jehova maka ndị ohu ya nwụrụ anwụ?

11 Ọnwụ ndị enyi ya. Olee otú obi na-adị Jehova gbasara ndị ohu ya nwụrụ anwụ? Ọ na-achọsi ike ịhụ ha ọzọ. (Job 14:15) Ì chetụla echiche otú obi na-adị Jehova gbasara enyi ya Ebreham? (Jems 2:23) Ma ọ bụ Mosis, onye ya na ya kwuru “okwu ihu na ihu”? (Ọpụ. 33:11) Ọ ga-abụrịrị na ọ na-agụsi ya agụụ ike ịnụ ka Devid na ndị ọbụ abụ ndị ọzọ na-abụrụ ya abụ ndị dị ụtọ ha ji eto ya. (Ọma 104:33) N’agbanyeghị na ndị enyi Jehova ndị a anwụọla, Jehova echefubeghị ha. (Aịza. 49:15) Ọ na-echeta ihe niile gbasara ha. Baịbụl kwuru “na n’anya ya, ha niile dị ndụ.” (Luk 20:38) Otu ụbọchị, ọ ga-akpọlite ha niile n’ọnwụ, na-anụ ekpere ha, na-anabatakwa ofufe ha. Ọ bụrụ na e nwere onye nwụnahụrụ gị, ka ihe ndị a e kwuru gbasara Jehova kasie gị obi.

12. Olee ihe na-akacha ewute Jehova n’oge ikpeazụ a jọgburu onwe ya?

12 Mmegbu ndị ọjọọ na-emegbu mmadụ ibe ha. Mgbe nnupụisi bidoro n’ogige Iden, Jehova maara na ihe ga-adị ezigbo njọ tupu ihe adị mma. Jehova kpọrọ mmebi iwu, ikpe na-ezighị ezi, na ime mpụ juru n’ụwa taa asị. Ọ na-elekọta ndị na-adịghị ike na ndị na-enweghị ike ichebe onwe ha, dị ka, ụmụ na-enweghị nna na ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ. (Zek. 7:​9, 10) Ọ na-ewute Jehova nke ukwuu, karịchaa, ma ọ hụ ka a na-akpagbu ndị ohu ya ma ọ bụ tụọ ha mkpọrọ. Ka obi sie gị ike na Jehova hụrụ unu niile na-atachi obi ka ya n’anya.

13. Olee ihe ọjọọ ndị Jehova na-ahụ na ụmụ mmadụ na-eme? Gịnịkwanụ ka ọ ga-eme gbasara ya?

13 Mmekọahụ rụrụ arụ juru ụwa niile. Ekwensu na-enwe ezigbo obi ụtọ ma ọ hụ na ụmụ mmadụ e kere n’oyiyi Chineke na-enwe mmekọahụ rụrụ arụ. Mgbe Chineke hụrụ “na ihe ọjọọ mmadụ na-eme n’ụwa karịrị akarị” n’oge Noa, “o wutere Jehova na o kere mmadụ n’ụwa, obi adịghịkwa ya mma.” (Jen. 6:​5, 6, 11) Ihe ọ̀ kalanụ mma kemgbe ahụ? Mba. Obi na-atọ Setan ezigbo ụtọ ma ọ na-ahụ mmekọahụ rụrụ arụ n’ụdị ya dị iche iche jupụtara n’ụwa taa, ma nke nwoke na nwaanyị, ma nke nwoke na nwoke na nke nwaanyị na nwaanyị. (Efe. 4:​18, 19) Setan na-enwe ezigbo obi ụtọ mgbe ọ bụla o mere ka ndị na-efe Chineke mee mmehie dị oké njọ. Mgbe Jehova ga-akwụsị inwe ndidi, otú ọ ga-esi egosi na obi adịghị ya mma maka ihe ọjọọ a ndị mmadụ na-eme bụ ibibi ndị kpachaara anya na-emebi iwu ya ma jụ ichegharị.

14. Olee ihe mmadụ na-eme ihe ndị Chineke kere n’ụwa?

14 Mmebi ụmụ mmadụ na-emebi ihe ndị o kere. Ọ bụghị naanị na ‘mmadụ na-achị mmadụ ibe ya ọchịchị nchịgbu,’ kama, ọ na-emebi ụwa Chineke nyere ya ka ọ na-elekọta, na-emegbukwa ụmụ anụmanụ. (Ekli. 8:9; Jen. 1:28) Ụfọdụ ndị ọkachamara ekwuola na otú ụmụ mmadụ si na-emebi ụwa nwere ike ime ka ụdị ihe dị iche iche e kere eke ruru otu nde gharakwa ịdị n’ụwa a n’oge na-adịghị anya. Ka a sịkwa ihe mere ụfọdụ ndị ji na-ekwu na ụwa anyị a nọ n’ezigbo nsogbu. Ma, obi dị anyị ụtọ na Jehova kwere nkwa na ya ga-ebibi “ndị na-ebibi ụwa” ma mee ka ụwa a ghọọ paradaịs.​—Mkpu. 11:18; Aịza. 35:1.

IHE ANYỊ GA-AMỤTA NÁ NTACHI OBI JEHOVA

15-16. Gịnị kwesịrị ime ka anyị soro Jehova na-atachi obi? Nye ihe atụ.

15 Chee gbasara nsogbu dị iche iche jọgburu onwe ha Nna anyị nke eluigwe na-edi kemgbe ọtụtụ puku afọ gara aga. (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Ihe Ndị Jehova Na-edi.”) Jehova nwere ike ibibi ụwa ọjọọ a mgbe ọ bụla masịrị ya. Ma, ndidi ọ na-enwe abaarala anyị uru. Legodị ihe atụ a. Ka e were ya na a gwara otu di na nwunye na nwa ha ga-amụ ga-enwe ọtụtụ nsogbu, nakwa na ọ bụrụ na a mụọ ya, ọ ga-ahụsi anya, nwụchuokwa ọnwụ. N’agbanyeghị ihe niile ọ ga-ewe nne na nna ahụ, ha kpebiri na ha ga-amụ nwa ahụ. Otú ha si hụ nwa ahụ n’anya mere ka ha tachie obi n’agbanyeghị ahụhụ niile ha ga-ata iji mee ka ndụ kara nwa ahụ mma.

16 Otú ahụ ka ọ dịkwa ụmụ Adam na Iv niile. Ha ezughị okè mgbe a mụrụ ha. Ma, Jehova hụrụ ha n’anya ma na-elekọta ha. (1 Jọn 4:19) O nwere ihe Jehova nwere ike ime nne na nna ahụ e ji mee ihe atụ ahụ na-agaghị emeli. Jehova nwere ike ime ka nsogbu anyị kwụsị. O wepụtala otu ụbọchị ọ ga-eji mee ka nsogbu niile na-echi ụmụ mmadụ ọnụ n’ala ghara ịdịkwa. (Mat. 24:36) Ịhụnanya Jehova nwere n’ebe anyị nọ kwesịrị ime ka anyị soro ya na-atachi obi n’agbanyeghị oge ọ ga-ewe.

17. Olee otú ihe e dere ná Ndị Hibru 12:​2, 3 si enyere anyị aka ịna-atachi obi?

17 Ọ bụ Jehova kacha atachi obi. Jizọs tachikwara obi ka Nna ya. Mgbe Jizọs bịara n’ụwa, o diri okwu ọjọọ dị iche iche a gwara ya, ihe ihere ndị e mere ya, nakwa ahụhụ ọ tara n’elu osisi ịta ahụhụ n’ihi anyị. (Gụọ Ndị Hibru 12:​2, 3.) O doro anya na otú Jehova si atachi obi nyeere Jizọs aka ịtachi obi. O nwekwara ike inyere anyị aka.

18. Olee otú ihe e kwuru na 2 Pita 3:9 si nyere anyị aka ịghọta na ndidi Jehova nwere bara ezigbo uru?

18 Gụọ 2 Pita 3:9. Jehova ma oge kacha mma ọ ga-ebibi ụwa ọjọọ a. Ndidi ya emeela ka oké ìgwè mmadụ dị ọtụtụ nde nwee ike ịbịa fewe ya ma na-eto ya. Ha nwere ezigbo obi ụtọ na Jehova nwere ndidi ka a mụọ ha, ha amụta banyere ya, hụ ya n’anya, nyefeekwa ya onwe ha. Mgbe ọtụtụ nde mmadụ tachiri obi ruo ọgwụgwụ, Jehova enyekwa ha ụgwọ ọrụ ha, ka ọ ga-edo anya na ndidi Jehova bara uru.

19. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime? Oleekwa ihe ga-abụ ụgwọ ọrụ anyị?

19 Anyị esila n’aka Jehova mụta iji ọṅụ na-atachi obi. N’agbanyeghị nsogbu niile Ekwensu kpatara, Jehova ka bụkwa “Chineke onye obi ụtọ.” (1 Tim. 1:11) Anyị nwekwara ike iji obi ụtọ na-eche ruo mgbe Jehova ga-eme ka e doo aha ya nsọ, mee ka a mata na ọ bụ yanwa ka o ruuru ịchị, bibie ndị ọjọọ niile, meekwa ka nsogbu anyị niile kwụsị. Ka anyị kpebisie ike na anyị ga na-atachi obi ma nwee obi ike n’ihi na anyị ma na Nna anyị nke eluigwe na-atachikwa obi. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, ihe e kwuru na Jems 1:12 ga-emezu n’ebe anyị nọ. Ọ sịrị: “Onye na-atachi obi n’ọnwụnwa na-enwe obi ụtọ, n’ihi na o dichaa ọnwụnwa ahụ, Jehova ga-enye ya ndụ, nke bụ́ ụgwọ ọrụ o kwere nkwa ịkwụ ndị hụrụ ya n’anya.”

ABỤ NKE 139 Hụ Onwe Gị n’Ụwa Ọhụrụ

^ par. 5 Mmadụ niile nwere otu nsogbu ma ọ bụ ọzọ. Ma, o nweghị ihe anyị ga-emeli gbasara ọtụtụ n’ime ha ugbu a. Ihe anyị ga-eme bụ ịna-atachi obi. Ma, ọ bụghị naanị anyị na-atachi obi. Jehova n’onwe ya na-atachikwa obi n’ọtụtụ ihe. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’itoolu n’ime ha. Anyị ga-elebakwa anya n’ihe ntachi obi Jehova rụpụtara nakwa otú ọ ga-esi abara anyị uru.