Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 29

Na-enwe Obi Ụtọ n’Ọganihu Gị n’Ozi Jehova

Na-enwe Obi Ụtọ n’Ọganihu Gị n’Ozi Jehova

“Ka onye ọ bụla . . . na-enwe ọṅụ maka ihe ọ na-eme ma ghara ịna-eji onwe ya atụnyere onye ọzọ.”​—GAL. 6:4.

ABỤ NKE 34 Ekpebiela M Ime Ezi Omume

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị mere Jehova anaghị eji anyị atụnyere ndị ọzọ?

Ọ NA-AMASỊ Jehova ma e nwee ihe n’ụdị ya dị iche iche. Ihe ndị magburu onwe ha o kere, ma ụmụ mmadụ, gosiri na nke a bụ eziokwu. Onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ iche. N’ihi ya, Jehova anaghị eji gị atụnyere ndị ọzọ. Ọ ma ụdị onye ị bụ. (1 Sam. 16:7) Ọ ma ebe ị na-eme nke ọma na ebe ị na-anaghị eme nke ọma na otú e si zụlite gị. Ọ naghịkwa atụ anya ka i mee ihe ndị ị na-agaghị emeli. Anyị kwesịrị ịna-ele onwe anyị anya otú Jehova si ele anyị. Anyị mee otú ahụ, anyị ga ‘na-eche echiche otú gosiri na anyị na-ele ihe anya otú dị mma,’ ọ bụghị ịna-eche na anyị ka ndị ọzọ ma ọ bụkwanụ na anyị abaghị uru.​—Rom 12:3.

2. Gịnị mere ọ dịghị mma anyị iji onwe anyị na-atụnyere ndị ọzọ?

2 Anyị nwere ike isi n’aka ndị ọzọ mụta ihe. E nwere ike inwe nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwaanyị na-eme nke ọma n’ozi ọma. (Hib. 13:7) Anyị nwere ike isi n’aka ya mụta otú anyị ga-esi na-eme nke ọma n’ozi ọma. (Fil. 3:17) Ma, e nwere ihe dị iche n’isi n’ihe mmadụ na-eme nke ọma mụta ihe na iji onwe anyị na-atụnyere onye ahụ. Ọ bụrụ na anyị ejiri onwe anyị na-atụnyere ndị ọzọ, o nwere ike ime ka anyị na-emere ha anyaụfụ, ka anyị daa mbà, ma ọ bụdị na-eche na o nweghị uru anyị bara. Ma, dị ka anyị mụtara n’isiokwu bu nke a ụzọ, iji onwe anyị na-atụnyere ndị ọzọ n’ọgbakọ nwere ike ime ka anyị na Jehova gharazie ịdị ná mma. Ọ bụ ya mere Jehova ji gwa anyị, sị: “Ka onye ọ bụla na-eleru ihe ọ na-eme anya, ka o wee na-enwe ọṅụ maka ihe ọ na-eme ma ghara ịna-eji onwe ya atụnyere onye ọzọ.”​—Gal. 6:4.

3. Olee ihe ndị i merela n’ofufe Jehova na-eme gị obi ụtọ?

3 Jehova chọrọ ka obi na-adị gị ụtọ n’ihe ndị ị na-eme nke ọma n’ofufe ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na i meela baptizim, obi kwesịrị ịdị gị ụtọ. Ọ bụ gịnwa ji aka gị kpebie ime ya. Ihe mere i ji kpebie ime ya bụ na ị hụrụ Chineke n’anya. Chee gbasara ihe ndị i merela kemgbe ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ ga-abụ na ị na-agụ Baịbụl ma na-amụ ya karịa otú i na-emebu, na-esikwa n’ala ala obi gị na-ekpe ekpere ugbu a karịa na mbụ. (Ọma 141:2) Ọ ga-abụkwa na otú i si amalite mkparịta ụka na otú i si eji ihe ndị anyị ji ekwusa ozi ọma ezi ozi ọma akakwuola mma. Ọ bụrụ na i nwere ezinụlọ, ọ ga-abụ na Jehova enyerela gị aka ịbụ ezigbo di, ezigbo nwunye, ma ọ bụ ezigbo nne ma ọ bụ nna. Obi kwesịrị ịdị gị ụtọ gbasara ihe ndị a i merela.

4. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

4 Anyị nwere ike inyere ndị ọzọ aka ka ha na-enwe obi ụtọ n’ihe ndị ha na-eme nke ọma n’ofufe Jehova. Anyị nwekwara ike inyere ha aka ka ha kwụsị iji onwe ha na-atụnyere ndị ọzọ. N’isiokwu a, anyị ga-ahụ otú ndị nne na nna nwere ike isi nyere ụmụ ha aka, otú di na nwunye nwere ike isi nyere ibe ha aka, nakwa otú ndị okenye na ndị ọzọ nwere ike isi nyere ụmụnna ha aka. N’ikpeazụ, anyị ga-eleba anya n’amaokwu Baịbụl ụfọdụ nwere ike inyere anyị aka iji otú ihe si dịrị anyị kpebie ihe ndị anyị ga-achọ ime.

IHE NDỊ NNE NA NNA NA NDỊ DI NA NWUNYE NWERE IKE IME

Ndị nne na nna, na-egosinụ ụmụ unu na obi dị unu ụtọ maka ihe ọma ha na-eme (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5 na nke 6) *

5. Dị ka e kwuru ná Ndị Efesọs 6:​4, gịnị ka ndị nne na nna kwesịrị izere?

Ndị nne na nna kwesịrị ịkpachara anya ka ha ghara iji otu nwa ha na-atụnyere nwa ha ọzọ ma ọ bụ na-atụ anya ka nwa ha ahụ mee ihe ọ na-agaghị emeli. Ụdị ihe a nwere ike ime ka nwatakịrị daa mbà. (Gụọ Ndị Efesọs 6:4.) Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Sachiko * sịrị: “Ndị nkụzi m na-atụ anya na m ga na-eme nke ọma karịa ụmụ akwụkwọ ibe m. Mama m chọkwara ka m na-eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ n’ihi na ọ ga-eme ka papa m na-abụghị Onyeàmà Jehova na ndị nkụzi anyị na-ele Ndịàmà Jehova anya ọma. Ọ chọdịrị ka m na-enwetacha ihe niile n’ule. Ma nke ahụ ekweghị m omume. N’agbanyeghị na o meela ọtụtụ afọ m gụchara akwụkwọ, mgbe ụfọdụ, m ka na-eche ma ihe ndị m ji ike m niile na-eme ọ̀ na-amasịkwa Jehova.”

6. Olee ihe ndị nne na nna nwere ike ịmụta n’ihe e dere n’Abụ Ọma 131:​1, 2?

6 E dere otu ihe ndị nne na nna ga-amụta n’Abụ Ọma 131:​1, 2. (Gụọ ya.) Eze Devid kwuru na ya anaghị “achọ oké ihe” ma ọ bụ ihe ndị karịrị ya. Otú o si dị umeala n’obi, marakwa ebe ike ya ruru, mere ka ‘o wetuo obi ala nọrọ jụụ.’ Gịnị ka ndị nne na nna ga-amụta n’ihe a Devid kwuru? Otú ndị nne na nna ga-esi gosi na ha dị umeala n’obi, marakwa ebe ike ha ruru abụghị naanị n’ihe ha na-atụ anya n’aka ibe ha, kama n’ihe ha na-atụ anya n’aka ụmụ ha. Ndị nne na nna ga-enyere ụmụ ha aka ịmata na e ji ha kpọrọ ihe ma ha mata ebe nwa ha na-eme nke ọma na ebe ọ na-anaghị eme nke ọma, jirizie ya nyere ya aka ikpebi ihe ndị ọ ga-emeli. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Marina kwuru, sị: “Mama m anaghị eji m atụnyere ụmụnne m atọ ndị ọzọ ma ọ bụ ụmụaka ndị ọzọ. Ọ kụziiri m na onye ọ bụla n’ime anyị nwere nkà, nakwa na Jehova ji onye ọ bụla n’ime anyị kpọrọ ihe. Ihe ahụ o mere nyeere m aka mụ aghara ịna-eji onwe m atụnyere ndị ọzọ.”

7-8. Olee otú ndị di nwere ike isi na-akwanyere nwunye ha ùgwù?

7 Onye Kraịst bụ́ di kwesịrị ịna-akwanyere nwunye ya ùgwù. (1 Pita 3:7) Onye na-akwanyere mmadụ ùgwù na-eji ya akpọrọ ihe. Dị ka ihe atụ, di na-egosi na ọ na-akwanyere nwunye ya ùgwù ma ọ bụrụ na ọ na-emeso ya ihe ka onye dị ezigbo mkpa. Ọ naghị atụ anya ka o mee ihe ọ na-agaghị emeli. Ọ naghịkwa eji ya atụnyere ụmụ nwaanyị ndị ọzọ. Olee otú obi ga-adị nwaanyị ma ọ bụrụ na di ya ejiri ya na-atụnyere ụmụ nwaanyị ndị ọzọ? E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Rosa. Di ya na-abụghị Onyeàmà Jehova na-ejikarị ya atụnyere ụmụ nwaanyị ndị ọzọ. Okwu ọjọọ ndị ọ na-agwa ya emeela ka ọ ghara ịna-enwe obi ụtọ, meekwa ka ọ na-eme ya obi abụọ ma è nwekwara onye hụrụ ya n’anya. Rosa sịrị: “M na-achọ ka a na-echetara m mgbe niile na Jehova ji m kpọrọ ihe.” Di bụ́ Onye Kraịst anaghị eji nwunye ya atụnyere ndị ọzọ, kama, ọ na-akwanyere ya ùgwù. Ọ ma na ịkwanyere ya ùgwù ga-eme ka ha abụọ dịrị ná mma, meekwa ka ya na Jehova dịrị ná mma. *

8 Ezigbo di na-akwanyere nwunye ya ùgwù, na-aja ya mma, na-emesikwa ya obi ike na ọ hụrụ ya n’anya. (Ilu 31:28) Ọ bụ ihe a ka di Katerina anyị kwuburu okwu ya n’isiokwu bu nke a ụzọ mere. Ọ na-enyere ya aka ịghara ịna-eche na e nweghị ihe ọ dị mma ya. Mgbe ọ dị obere, mama ya na akatọkarị ya, na-ejikwa ya atụnyere ụmụaka ndị nwaanyị ndị ọzọ, ma ndị enyi ya. Ihe a mere ka Katerina malite iji onwe ya na-atụnyere ndị ọzọ, ma mgbe ọ batara n’ọgbakọ. Ma, di ya bụ́ Onye Kraịst nyeere ya aka ịkwụsị ihe a, nyekwara ya aka ịmata na yanwa bara uru. Ọ sịrị: “Ọ hụrụ m n’anya, na-aja m mma maka ihe ndị m na-emeta, na-ekpekwara m ekpere. Ọ na-echetara m àgwà ndị magburu onwe ha Jehova nwere, na-enyekwara m aka ịkwụsị iji onwe m atụnyere ndị ọzọ.”

IHE NDỊ OKENYE NA NDỊ ỌZỌ NWERE IKE IME

9-10. Olee otú ndị okenye hụrụ ụmụnna n’anya si nyere otu nwanna nwaanyị aka ya akwụsị iji onwe ya atụnyere ndị ọzọ?

9 Olee otú ndị okenye ga-esi enyere ndị na-ejikarị onwe ha atụnyere ndị ọzọ aka? E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Hanuni. Mgbe ọ bụ nwata, a naghị ajakarị ya mma. Ọ sịrị: “M bụ ezigbo onye ihere, na-echekwa na ụmụaka ndị ọzọ ka m mma. M malitere iji onwe m na-atụnyere ndị ọzọ kemgbe m bụ nwata.” Ma, mgbe Hanuni batara n’ọgbakọ, ọ ka na-eji onwe ya atụnyere ndị ọzọ. Nke ahụ mere ka o chee na ya abaghị uru n’ọgbakọ. Ma ugbu a, ọ bụzi ọsụ ụzọ oge niile na-enwe obi ụtọ. Gịnị nyeere ya aka ịgbanwe?

10 Hanuni sịrị na ndị okenye nyeere ya ezigbo aka. Ha gwara ya na ọ bara ezigbo uru n’ọgbakọ, jaakwa ya mma maka ihe ndị dị mma ọ na-eme. Ọ sịrị: “E nwere mgbe ụfọdụ ndị okenye gwara m ka m gbaa ụmụnna nwaanyị e kwesịrị ịgba ume ume. Ọrụ a ha na-enye m na-eme ka m mata na m bara uru. M chetara otu mgbe ndị okenye kelere m maka ịgba ụfọdụ ụmụnna nwaanyị na-eto eto ume. Ha gụụrụ m 1 Ndị Tesalonaịka 1:​2, 3. Ihe ahụ metụrụ m n’obi. Ndị okenye ndị ahụ enyerela m aka ịmata n’eziokwu na m bara uru n’ọgbakọ Jehova.”

11. Dị ka e kwuru n’Aịzaya 57:​15, olee otú anyị nwere ike isi nyere “ndị obi gbawara na ndị dara mbà n’obi” aka?

11 Gụọ Aịzaya 57:15. Jehova na-eche gbasara “ndị obi gbawara na ndị dara mbà n’obi.” Anyị niile, ọ bụghị naanị ndị okenye, nwere ike inyere ụmụnna ndị a aka. Otu ụzọ anyị nwere ike isi gbaa ha ume bụ igosi ha na ihe gbasara ha na-emetụ anyị n’obi. Jehova chọrọ ka anyị na-egosi ụmụnna ndị a na ọ hụrụ ha n’anya. (Ilu 19:17) Otú ọzọ anyị nwekwara ike isi nyere ụmụnna anyị aka bụ ịdị umeala n’obi na ịghara ịna-eji nkà ndị anyị nwere na-etu ọnụ. Anyị ekwesịghị ime ihe ga-eme ka e towe anyị ka ọ ghara ime ka ndị ọzọ mewere anyị anyaụfụ. Kama nke ahụ, ka anyị jiri nkà anyị nwere na ihe ndị anyị ma na-agba ụmụnna anyị ume.​—1 Pita 4:​10, 11.

Ndị na-eso ụzọ Jizọs na-abịakwute ya n’ihi na ọ naghị eme ka ọ̀ ka ha mma. Ọ na-achọ ka ya na ndị enyi ya na-anọrị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12)

12. Olee ihe mere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha ji abịakwute Jizọs? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

12 Anyị nwere ike isi n’otú Jizọs si mesoo ndị na-eso ụzọ ya mụta otú anyị ga-esi na-emeso ndị ọzọ ihe. Ọ bụ nwoke kacha ukwuu dịtụrụla ndụ n’ụwa. Ma, ọ “dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi.” (Mat. 11:​28-30) O jighị ihe ndị ọ ma nakwa otú ụbụrụ si aghọ ya nkọ na-anya isi. O ji okwu ndị dị mfe nghọta na ihe atụ ndị na-eru n’obi kọwaara ndị na-enweghị ka ọ hà ha ihe. (Luk 10:21) Ọ dịghị ka ndị ndú okpukpe ndị Juu bụ́ ndị onwe ha na-ebu isi. O meghịkwa ka ndị ọzọ chee na e nweghị ihe Chineke ji ha kpọrọ. (Jọn 6:37) Kama nke ahụ, ọ kwanyeere ndị ọ na-enweghị ihe e ji ha kpọrọ ùgwù.

13. Olee otú Jizọs si meere ndị na-eso ụzọ ya obiọma, hụkwa ha n’anya?

13 Otú Jizọs si mesoo ndị na-eso ụzọ ya gosiri na ọ dị obiọma, hụkwa ha n’anya. Ọ ma na otú ihe si dịrị ha dị iche iche, marakwa na ha nwere nkà dị iche iche. N’ihi ya, ihe ndị ha ga-emeli nakwa ihe ha ga-arụpụtali n’ozi ọma dị iche iche. Ma, obi na-adị ya ụtọ na onye ọ bụla n’ime ha na-eme ike ya. Jizọs ji ihe atụ o mere gbasara talent gosi ihe a. N’ihe atụ ahụ, otu nwoke nyere ohu ya nke ọ bụla ọrụ “dị ka ike ya hà.” Ndị ohu abụọ ahụ rụsiri ọrụ ike. Ma, otu nwetara uru karịa onye nke ọzọ. N’agbanyeghị ya, nna ha ukwu jara onye nke ọ bụla n’ime ha mma, sị ya: “I mere nke ọma, ezigbo ohu kwesịrị ntụkwasị obi.”​—Mat. 25:​14-23.

14. Olee otú anyị nwere ike isi na-eme ka Jizọs n’otú anyị si emeso ndị ọzọ?

14 Jizọs hụrụ anyị n’anya, jirikwa obiọma na-emeso anyị ihe. Ọ ma na otú ihe si dịrị anyị na ihe anyị ga-emeli abụghị otu. Obi na-adịkwa ya ụtọ ma anyị mee ike anyị niile. Anyị kwesịrị ịna-eme ka Jizọs. Anyị ekwesịghị imenye nwanna anyị ihere ma ọ bụ mee ka o chee na o nweghị uru ọ bara n’ihi na ọ naghị emeli ihe ndị ọzọ na-eme. Kama nke ahụ, ka anyị gbalịa na-achọ ụzọ anyị ga-esi na-aja ụmụnna anyị mma ma ha mee ike ha niile n’ofufe Jehova.

KPEBIE IME IHE NDỊ Ị GA-EMELI

Na-ekpebi ime ihe ndị ị ga-emeli. Ọ ga-eme ka ị na-enwe ọṅụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15 na nke 16) *

15-16. Olee uru otu nwanna nwaanyị ritere n’ihi na o kpebiri ime ihe ndị ọ ga-emeli n’ofufe Jehova?

15 Ọ bụrụ na e nwee ihe ndị anyị kpebiri ime n’ozi Jehova, ndụ anyị ga na-atọ anyị ụtọ. Ma, anyị kwesịrị iji otú ihe si dịrị anyị kpebie ihe anyị ga-emeli, ọ bụghị ikpebi ime ihe ndị ọzọ kpebiri ime, n’ihi na ọ ga-eme ka anyị daa mbà. (Luk 14:28) Legodị ihe mere otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ aha ya bụ Midori.

16 Papa Midori abụghị Onyeàmà Jehova. Ọ na-emenye ya ihere mgbe ọ bụ nwata n’ihi na ọ na-eji ya na-atụnyere ụmụaka ibe ya na ụmụ klas ya. Midori kwuru, sị: “Echere m na ndụ m abaghị uru.” Ma, mgbe Midori toro, o mechara mata na ọ bara uru. Ọ sịrị: “M na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị n’ihi na ọ na-enyere m aka ịmata na Jehova hụrụ m n’anya.” Ihe ọzọkwa bụ na o kpebiri ime ihe ndị ọ ga-emeli, rịọkwa Jehova ka o nyere ya aka imezu ihe ndị ahụ o kpebiri ime. Ihe a mere ka Midori na-enwe obi ụtọ n’ihe ndị ọ na-eme n’ofufe Jehova.

NỌGIDE NA-EMERE JEHOVA IKE GỊ NIILE

17. Olee otú anyị ga-esi ‘na-eme ka otú anyị si eche echiche dị ọhụrụ,’ oleekwa uru ọ ga-abara anyị?

17 Ọ na-ewe oge tupu mmadụ akwụsị iche ihe na-adịghị mma gbasara onwe ya. Ọ bụ ya mere Jehova ji gwa anyị, sị: “Unu kwesịkwara ịna-eme ka otú unu si eche echiche dị ọhụrụ.” (Efe. 4:​23, 24) Ihe ga-enyere anyị aka ime ya bụ ikpe ekpere, ịmụ Okwu Chineke, na ịtụgharị uche. Na-eme ihe ndị a, na-arịọkwa Jehova ka o nye gị ike. Mmụọ nsọ ya ga-enyere gị aka ka ị ghara ịna-eji onwe gị atụnyere ndị ọzọ. Jehova ga-enyekwara gị aka ịchọpụta ma ị̀ na-emere ndị ọzọ anyaụfụ ma ọ bụ dị mpako, nyekwara gị aka ịgbanwe.

18. Olee otú ihe e dere n’Ihe E Mere 6:​29, 30 nwere ike isi kasie anyị obi?

18 Gụọ 2 Ihe E Mere 6:​29, 30. Jehova ma obi anyị. Ọ makwa na anyị na-alụso mmụọ nke ụwa na ezughị okè anyị ọgụ. Ka Jehova na-ahụ ka anyị na-alụso ihe ndị a ọgụ, ka ọ na-ahụkwu anyị n’anya.

19. Olee otú Jehova si kọwaa otú o si hụ anyị n’anya?

19 Jehova ji otú nne si hụ nwa ọhụrụ ya n’anya tụnyere otú o si hụ anyị n’anya. (Aịza. 49:15) Legodị ihe otu nne aha ya bụ Rachel kwuru. Ọ sịrị: “Nwa m nwaanyị aha ya bụ Stephanie akaghị aka mgbe a mụrụ ya. Mgbe mbụ m hụrụ ya, ọ dị ezigbo ntakịrị. Ma, ndị ụlọ ọgwụ ahụ kwere ka m na-eku ya kwa ụbọchị n’ọnwa mbụ ahụ e tinyere ya n’ígwè a na-etinye ụmụ na-akaghị aka. O mere ka mụ na nwa m ahụ dịkwuo n’ezigbo mma. Ọ dị afọ isii ugbu a. O pere mpe karịa ụmụaka ya na ha bụ ọgbọ. N’agbanyeghị ya, m hụrụ ya n’anya nke ukwuu n’ihi na ọ chọsiri ike ịdị ndụ. O mekwara m ezigbo obi ụtọ.” Obi dị anyị ụtọ ịmata na ọ bụ otú ahụ ka Jehova si ahụ anyị n’anya ma ọ na-ahụ ka anyị na-agba mbọ ime ike anyị niile n’ofufe ya.

20. Ebe ị bụ ohu Jehova nyefere ya onwe gị, olee ihe ga-eme ka ị na-enwe ọṅụ?

20 Ebe ọ bụ na ị bụ ohu Jehova, o ji gị kpọrọ ihe n’ezinụlọ ya, o nweghịkwa onye ọzọ dị ka gị. Ihe mere Jehova ji dọta gị n’ebe ọ nọ abụghị na ị ka ndị ọzọ mma. Ihe mere o ji dọta gị bụ na o lere obi gị hụ na ị dị umeala n’obi, nakwa na ọ bụrụ na ya akụziere gị ihe, ị ga-agbanwe. (Ọma 25:9) Ka obi sie gị ike na Jehova ji ihe niile ị na-eme iji nwee ike ife ya otú i nwere ike kpọrọ ihe. Otú i si na-atachi obi ma jiri okwukwe na-ejere ya ozi gosiri na i nwere “ezigbo obi.” (Luk 8:15) N’ihi ya, nọgide na-eme ike gị niile n’ozi Jehova. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ọ ga-eme ka ị na-enwe ọṅụ “maka ihe [ị] na-eme” n’ozi ya.

ABỤ NKE 38 Ọ Ga-eme Ka I Sie Ike

^ par. 5 Jehova anaghị eji anyị atụnyere ndị ọzọ. Ma, anyị nwere ike iji onwe anyị na-atụnyere ndị ọzọ, ya emee ka anyị chee na e nweghị ihe anyị dị mma ya. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe mere anyị ekwesịghị ịna-eji onwe anyị atụnyere ndị ọzọ. Anyị ga-ahụkwa otú anyị nwere ike isi nyere ndị ezinụlọ anyị na ndị anyị na ha nọ n’ọgbakọ aka ịna-ele onwe ha anya otú Jehova si ele ha.

^ par. 5 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ par. 7 Ọ bụ eziokwu na ebe a na-ekwu gbasara ndị di, ọtụtụ ihe e kwuru ebe a gbasakwara ndị nwunye.

^ par. 58 NKỌWA FOTO: Ebe otu ezinụlọ na-enwe ofufe ezinụlọ, nne na nna ana-egosi ụmụ ha na obi dị ha ụtọ maka mbọ ha gbara n’ịrụ ụgbọ Noa.

^ par. 62 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna nwaanyị naanị ya na-azụ obere nwa ya na-ahazi oge ya ka o nwee ike ịsụ ụzọ inyeaka. Obi dịkwa ya ụtọ na o meliri ya.