Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 31

Ị̀ Dị Njikere Ichere Jehova?

Ị̀ Dị Njikere Ichere Jehova?

“M ga-echere.”​—MAỊ. 7:7.

ABỤ NKE 128 Ka Anyị Tachie Obi Ruo Ọgwụgwụ

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

OLEE otú obi na-adị gị ma ọ bụrụ na ahịa ị tụrụ dị gị ezigbo mkpa alọtaghị n’oge ị tụrụ anya ya? Ọ̀ ga-eme ka i chegbuwe onwe gị? Ilu 13:12 sịrị: “Ike na-agwụ mmadụ ma ọ bụrụ na ihe ọ na-atụ anya ya emezughị mgbe ọ tụrụ anya ya.” Ma, olee otú ọ ga-adị gị ma ị mata na e nwere ezigbo ihe mere ihe ahụ alọtaghị n’oge ị tụrụ anya ya? O yikarịrị ka ị ga-adị njikere ichere ya ruo mgbe ọ ga-alọta.

2 N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka ịmụta ‘ichere.’ (Maị. 7:7) Anyị ga-elebakwa anya n’ụzọ ebe abụọ anyị kwesịrị iji ndidi chere Jehova ka o mee ihe. N’ikpeazụ, anyị ga-atụle ngọzi ndị anyị ga-enweta ma ọ bụrụ na anyị ejiri ndidi na-echere Jehova.

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ NA-AKỤZIRI ANYỊ INWE NDIDI

3. Gịnị ka ihe e kwuru n’Ilu 13:11 na-akụziri anyị?

3 Ilu 13:11 kụziiri anyị ihe mere anyị kwesịrị iji na-enwe ndidi. Ọ sịrị: “Akụ̀ a kpatara ngwa ngwa ga na-agbada agbada, ma akụ̀ mmadụ na-akpata obere obere ga na-amụba amụba.” Ị̀ hụrụ ihe ebe a kwuru? Inwe ndidi na-aba ezigbo uru.

4. Gịnị ka ihe e kwuru n’Ilu 4:18 na-akụziri anyị?

4 Ilu 4:18 gwara anyị na “ụzọ ndị ezi omume yiri ìhè na-enwu mgbe chi bọrọ, nke na-enwusikwu ike ruo mgbe chi bọchara.” Ebe a na-ekwu gbasara otú Jehova si eji nwayọọ nwayọọ eme ka ndị ya mara ihe bụ́ nzube ya. Amaokwu a na-enyekwara anyị aka ịghọta otú Onye Kraịst si eme mgbanwe ná ndụ ya ka ya na Jehova dịkwuo ná mma. Ọ ga-ewe oge tupu mmadụ abịaruo Jehova nso. A naghị eme ya ọkụ ọkụ. Ọ bụrụ na anyị ana-amụ Okwu Chineke ma na-eme ihe ndị anyị na-amụta na ya, na-emekwa ihe ndị nzukọ ya na-akụziri anyị, anyị ga-eji nke nta nke nta na-akpa àgwà ka Kraịst. Anyị ga-amatakwukwa Chineke nke ọma. Ka anyị lee otú Jizọs si mee ihe atụ gbasara ya.

Otú ahụ osisi si eji nwayọọ nwayọọ na-eto ka onye na-anụ Okwu Chineke ma na-anabata ihe ọ na-anụ si eji nwayọọ nwayọọ na-agbanwe ihe ụfọdụ ná ndụ ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5)

5. Olee otú Jizọs si jiri ihe atụ gosi na mmadụ ga-eji nwayọọ nwayọọ mee mgbanwe?

5 Jizọs ji ihe atụ kọwaa otú eziokwu Alaeze anyị na-ekwusa si yie obere mkpụrụ na-eji nwayọọ nwayọọ na-eto n’obi ndị chọrọ ime ihe dị mma. Ọ sịrị: “Mkpụrụ ndị ahụ pulitere, tookwa, ma [onye kụrụ ya amaghị] otú o si mee. Mkpụrụ na-eji nwayọọ nwayọọ si n’ala puo. Akwụkwọ na-ebu ụzọ apụta, oko ya apụtazie. N’ikpeazụ, mkpụrụ kara aka na-esi n’oko ya apụta.” (Mak 4:​27, 28) Gịnị ka Jizọs na-ekwu? Ihe ọ na-ekwu bụ na otú ahụ mkpụrụ si eji nwayọọ nwayọọ eto ka onye nabatara eziokwu Alaeze na-eji nwayọọ nwayọọ agbanwe ndụ ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ndị anyị na-amụrụ Baịbụl ana-abịarukwu Jehova nso, anyị na-ahụ na ha na-agbanwe ụfọdụ ihe ná ndụ ha. (Efe. 4:​22-24) Ma, anyị kwesịrị icheta na ọ bụ Jehova na-eme ka mkpụrụ ahụ dị ntakịrị na-eto.​—1 Kọr. 3:7.

6-7. Gịnị ka anyị na-amụta n’otú Jehova si kee ụwa?

6 Jehova na-eji ndidi rụọ ihe ọ bụla ọ chọrọ ịrụ n’agbanyeghị oge ọ ga-ewe ya. Ọ na-eme ya iji wetara aha ya otuto nakwa iji mee ihe ga-abara ndị ọzọ uru. Dị ka ihe atụ, ka anyị tụlee otú Jehova si jiri nwayọọ nwayọọ kee ụwa maka ụmụ mmadụ.

7 Mgbe Baịbụl na-ekwu otú Jehova si kee ụwa, o kwuru gbasara ikpebi “otú ọ ga-aha,” igwunye “ntọala ya,” nakwa ịdọnye “nkume ji ya.” (Job 38:​5, 6) Jehova wepụtadịrị oge leruo ihe ndị o kere eke anya. (Jen. 1:​10, 12) Ì nwere ike iche otú obi dị ndị mmụọ ozi mgbe ha hụrụ ihe ọhụrụ ọ bụla Jehova kere? Ọ ga-abụrịrị na obi tọgburu ha atọgbu. O nwere mgbe o ruru, ha amalite “iti mkpu otuto.” (Job 38:7) Gịnị ka anyị na-amụta? O were Jehova ọtụtụ puku afọ tupu ya arụchaa ọrụ ya. Ma, mgbe Jehova lechara ihe niile o ji nlezianya kee, ọ sịrị na “ha dị nnọọ mma.”​—Jen. 1:31.

8. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya?

8 Ihe ndị anyị tụlere ugbu a gosiri na e nwere ọtụtụ amaokwu Baịbụl kwuru mkpa ọ dị anyị inwe ndidi. Ugbu a, anyị ga-eleba anya n’ụzọ ebe abụọ anyị kwesịrị iji ndidi chere Jehova.

OLEE MGBE ANYỊ KWESỊRỊ ICHERE JEHOVA?

9. Olee otu ebe ọ dị mkpa ka anyị chere Jehova?

9 O nwere ike ịdị mkpa ka anyị chere ka Jehova za ekpere anyị. Ọ bụrụ na anyị arịọ Jehova ka o nye anyị ike anyị ga-eji die ọnwụnwa bịaara anyị ma ọ bụ ike anyị ga-eji akwụsị ihe ndị na-adịghị Jehova mma anyị na-eme, anyị nwere ike iche na Jehova na-egbu oge ịza anyị ekpere. Gịnị mere na ọ bụghị ekpere niile anyị kpere ka Jehova na-aza ozugbo?

10. Gịnị mere anyị kwesịrị iji nwee ndidi ma anyị kpee ekpere?

10 Jehova na-ege anyị ezigbo ntị ma anyị kpewe ekpere. (Ọma 65:2) Ọ na-ewere ekpere anyị si n’obi anyị na-ekpe ka ihe na-egosi na anyị nwere okwukwe n’ebe ọ nọ. (Hib. 11:6) Jehova na-achọkwa ịhụ na anyị ji obi anyị niile na-achọ ime ihe anyị na-ekpe n’ekpere ma chọọ ime uche ya. (1 Jọn 3:22) N’ihi ya, anyị kwesịrị inwe ndidi ma mee ihe dabara n’ihe anyị na-ekpe n’ekpere mgbe ọ bụla anyị chọrọ ịkwụsị àgwà ọjọọ anyị na-akpa. Ihe Jizọs kwuru mere ka anyị ghọta na ọ bụghị ekpere niile anyị kpere ka a ga-aza ozugbo. Ọ sịrị: “Na-arịọnụ, a ga-enye unu. Na-achọnụ, unu ga-achọta. Na-akụnụ aka n’ụzọ, a ga-emeghere unu ya. N’ihi na onye ọ bụla nke na-arịọ na-arịọta, onye ọ bụla nke na-achọkwa na-achọta, onye ọ bụla nke na-akụkwa aka n’ụzọ ka a ga-emeghere ụzọ.” (Mat. 7:​7, 8) Ọ bụrụ na anyị emee ihe a Jizọs kwuru ma ‘na-ekpe ekpere mgbe niile,’ obi ga-esi anyị ike na Nna anyị nke eluigwe ga-anụ ekpere anyị ma za ya.​—Kọl. 4:2.

Ka anyị na-echere Jehova, anyị anaghị akwụsị iji okwukwe na-ekpe ekpere (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11) *

11. Olee otú 1 Pita 5:​6, 7 si enyere anyị aka ma ọ bụrụ na o yie ka a zaghị anyị ekpere anyị ozugbo?

11 Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịdị ka Jehova ọ̀ na-egbu oge ịza ekpere anyị, ma ọ na-ekwe anyị nkwa na ọ ga-aza ya “mgbe oge ruru.” (Gụọ 1 Pita 5:​6, 7.) Ọ bụ ya mere na anyị ekwesịghị ịta Jehova ụta ma ọ bụrụ na ihe emeghị mgbe anyị tụrụ anya ya. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị ekpeela ekpere ọtụtụ afọ ka ha hụ mgbe Alaeze Chineke ga-ebibi ụwa ọjọọ a. Jizọs gwadịrị anyị ka anyị na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa. (Mat. 6:10) Ma, ọ ganụghị adị mma ma ọ bụrụ na mmadụ ekwe ka okwukwe o nwere na Chineke jụọ oyi n’ihi na ọgwụgwụ abịaghị mgbe ndị mmadụ tụrụ anya na ọ ga-abịa. (Hab. 2:3; Mat. 24:44) Anyị na-egosi na anyị ma ihe ma ọ bụrụ na anyị ana-echere Jehova ma jiri okwukwe na-ekpe ekpere. Ọgwụgwụ ga-abịa kpọmkwem n’oge kwesịrị ekwesị n’ihi na Jehova ewepụtala “ụbọchị na awa” ọ ga-abịa. Oge ahụ ga-akara mmadụ niile mma.​—Mat. 24:36; 2 Pita 3:15.

Olee ihe anyị na-amụta n’aka Josef gbasara inwe ndidi? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12 ruo na nke 14)

12. Olee mgbe o nwere ike isiri anyị ike inwe ndidi?

12 Anyị kwesịrị inwe ndidi ma e mee anyị ihe na-adịghị mma. Ndị mmadụ n’ụwa taa na-emejọkarị ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha, ndị ha na ha na-esighị otu ebe ma ọ bụkwanụ otu obodo. A na-emegbu ndị ụfọdụ n’ihi na ha nwere nkwarụ ma ọ bụkwanụ n’ihi na isi akpakọchaghị ha ọnụ. A na-emekwa ọtụtụ ndị Jehova ihe ọjọọ n’ihi na ha kweere na Baịbụl. Ọ bụrụ na e mejọọ anyị n’ihi ihe ndị a, anyị kwesịrị iburu ihe a Jizọs kwuru n’obi. Ọ sịrị: “Ọ bụ onye tachiri obi ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.” (Mat. 24:13) Ma, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ị mata gbasara mmehie dị oké njọ nwanna nọ n’ọgbakọ mere? Ọ bụrụ na a gwa ndị okenye gbasara ya, ị̀ ga-ahapụ okwu ahụ n’aka ha, jiri ndidi na-eche ka ha leba okwu ahụ anya otú Jehova si chọọ ya? Olee ihe ndị okenye nwere ike ime ma ọ bụrụ na nwanna emee mmehie dị oké njọ?

13. Olee ihe Jehova chọrọ ka ndị okenye mee ma nwanna mee mmehie dị oké njọ?

13 Ọ bụrụ na ndị okenye achọpụta na e nwere onye mere mmehie dị oké njọ, ha na-ekpe ekpere ka Chineke nye ha “amamihe nke si n’eluigwe” ka ha nwee ike ile okwu ahụ anya otú Jehova si ele ya. (Jems 3:17) Mkpa ha bụ inyere onye ahụ mere mmehie aka “ka ọ hapụ ihe ọjọọ ndị ọ na-eme” ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume. (Jems 5:​19, 20) Ha chọkwara ime ihe ọ bụla ha nwere ike ime iji chebe ọgbakọ nakwa iji kasie ndị mmehie ahụ kpara aka ọjọọ obi. (2 Kọr. 1:​3, 4) Ọ bụrụ na ndị okenye elebawa okwu gbasara mmehie dị oké njọ anya, ha na-ebu ụzọ chọpụta otú ihe niile si mee. O nwekwara ike iwe oge. Ha na-ekpe ekpere ma si n’Akwụkwọ Nsọ nye onye ahụ mere mmehie ndụmọdụ ma gbazie ya “otú kwesịrị ekwesị.” (Jere. 30:11) Ọ bụ eziokwu na ndị okenye anaghị eyigharị ihe, ma, ha anaghị eme mkpebi ọkụ ọkụ. Ọ bụrụ na ndị okenye esoro ntụziaka Jehova, ọ ga-abara ọgbakọ niile uru. Ọ bụrụgodị na e mee ihe niile otú kwesịrị ekwesị, ndị onye ahụ mejọrọ ka nwere ike ịna-ewe iwe. Ọ bụrụ na ụdị ihe a emee gị, olee ihe i nwere ike ime ka ọ ghara ịna-ewute gị nke ukwuu?

14. Olee akụkọ Baịbụl nwere ike inyere gị aka ma Onye Kraist ibe gị mee gị ihe ọjọọ wutere gị nke ukwuu?

14 È metụla gị ihe ọjọọ wutere gị nke ukwuu? O nwedịrị ike ịbụ nwanna mere gị ya. Ọ bụrụ otú ahụ, i nwere ike ịchọpụta akụkọ ụfọdụ n’Okwu Chineke na-akụziri anyị otú anyị ga-esi chere Jehova ka o dozie okwu. Dị ka ihe atụ, n’agbanyeghị na ụmụnne Josef mere ya ihe ọjọọ, o kweghị ka ihe ha mere ya mee ka ọ na-ewe oké iwe. Kama nke ahụ, o lekwasịrị anya n’ozi ọ na-ejere Jehova. Jehova mechakwara gọzie ya n’ihi ndidi ya. (Jen. 39:21) Ka oge na-aga, Josef leghaara ihe ọjọọ ndị ahụ e mere ya n’oge gara aga anya, hụkwa otú Jehova si gọzie ya. (Jen. 45:5) Dịkwa ka Josef, obi na-eru anyị ala ma ọ bụrụ na anyị abịaruo Jehova nso ma hapụ ya ka o jiri aka ya dozie okwu n’oge ya.​—Ọma 7:17; 73:28.

15. Olee ihe nyeere otu nwanna nwaanyị aka ileghara ihe ọjọọ e mere ya anya?

15 Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị ihe ọjọọ niile e mere anyị ga-aharu ka nke ahụ e mere Josef. Ma, ihe ọjọọ ụfọdụ e mere anyị nwere ike ịgbawa anyị obi. Ọ bụrụ na anyị na mmadụ nwere nsogbu, ma ndị na-anaghị efe Jehova, ime ihe Baịbụl kwuru ga-abara anyị uru. (Fil. 2:​3, 4) Legodị otu ihe atụ. E nwere otu nwanna nwaanyị obi gbawara mgbe ọ chọpụtara na onye ọrụ ibe ya na-akọrọ ndị ọzọ ihe ndị na-adịghị mma na ihe ndị na-abụghị eziokwu banyere ya. Kama iji iwe gwawa ya okwu ozugbo, o wepụtara oge chebara ihe Jizọs mere echiche. Mgbe a kparịrị Jizọs, ọ kparịgwaraghị. (1 Pita 2:​21, 23) Ihe a mere ka nwanna nwaanyị ahụ kpebie ịhapụ okwu ahụ. O mechara chọpụta na onye ọrụ ibe ya ahụ na-arịa ọrịa ọjọọ nakwa na ọrịa ahụ mere ka ọ na-echegbu onwe ya. Nwanna nwaanyị ahụ kpebiri na onye ọrụ ibe ya ahụ ejighị anya ya kwuo ihe ndị ahụ o kwuru. N’ihi ya, obi tọrọ nwanna nwaanyị ahụ ụtọ na o diri ihe ọjọọ ahụ e mere ya. O mekwara ka obi ruo ya ala.

16. Olee ihe ga-eme ka obi ruo gị ala ma ọ bụrụ na e mere gị ihe ọjọọ? (1 Pita 3:12)

16 Ọ bụrụ na obi na-ajọ gị njọ n’ihi ikpe na-ezighị ezi ma ọ bụ ihe ọjọọ ọzọ, cheta na Jehova na-anọ “ndị obi gbawara nso.” (Ọma 34:18) Ọ hụrụ gị n’anya n’ihi na ị na-enwe ndidi, na-ebunyekwa ya ibu niile na-anyịgbu gị. (Ọma 55:22) Ọ bụ ya bụ Onyeikpe nke ụwa niile. Ọ na-ahụ ihe niile na-emenụ. (Gụọ 1 Pita 3:12.) Ọ bụrụ na nsogbu ị na-agaghị emeli ihe ọ bụla gbasara ya abịara gị, ị̀ dị njikere ichere Jehova?

NDỊ NA-ECHERE JEHOVA GA-ENWETA NGỌZI GA-ADỊRU EBIGHỊ EBI

17. Olee ihe Jehova kwere nkwa imere anyị n’Aịzaya 30:18?

17 N’oge na-adịghị anya, Nna anyị nke eluigwe ga-agọzi anyị n’Alaeze ya. Aịzaya 30:18 sịrị: “Jehova na-enwere unu ndidi ka o meere unu amara. Ọ gaghịkwa agba nkịtị. Ọ ga-emere unu ebere. Jehova bụ Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi. Ndị niile na-atụ anya ya na-enwe obi ụtọ.” Ndị na-echere Jehova ga-enweta ọtụtụ ngọzi ma ugbu a ma n’ụwa ọhụrụ na-abịanụ.

18. Olee ngọzi ndị anyị ga-enweta n’ọdịnihu?

18 Mgbe ndị Chineke ga-aba n’ụwa ọhụrụ, nsogbu na nchegbu ha na ya na-alụ taa agaghịzi adị. Ikpe na-ezighị ezi na ihe mgbu ga-ala ka naị. (Mkpu. 21:4) O nweghịzi ihe ọ bụla ga na-echegbu anyị n’ihi na anyị ga-enwe ihe niile n’uju. (Ọma 72:16; Aịza. 54:13) Ihe a ga-amagbu nnọọ onwe ya.

19. Olee ihe Jehova ji nwayọọ nwayọọ na-akwadebe anyị maka ya ugbu a?

19 Jehova na-akwadebe anyị ugbu a ka anyị nwee ike ibi n’ụwa ọhụrụ ya. Otú o si eme ya bụ inyere anyị aka imeri nsogbu ndị na-abịara anyị, ịkwụsị àgwà ọjọọ ndị anyị nwere, nakwa ịmalite kpawa àgwà ndị na-amasị ya. Adala mbà, akwụsịkwala ife Jehova. Ndụ kacha mma ka dị n’ihu. Ka anyị na-ele anya ka ihe ndị a magburu onwe ha mee n’ọdịnihu, ka anyị jiri obi ụtọ jiri ndidi na-eche ka Jehova mee ihe ndị o kwuru na ọ ga-eme.

ABỤ NKE 118 “Nyere Anyị Aka Ka Okwukwe Anyị Sie Ike”

^ par. 5 Ị̀ nụtụla ka onye fere Jehova ruo ọtụtụ afọ kwuru, sị: ‘Amaghị m na ụwa ochie a ga-adịgide ruo ugbu a’? Anyị niile na-achọsi ike ịhụ mgbe Jehova ga-ebibi ụwa ọjọọ a, karịchaa, n’oge a ihe siri ezigbo ike. Ma, anyị kwesịrị ịmụta inwe ndidi. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe Baịbụl kwuru nwere ike inyere anyị aka ịna-enwe ndidi. Anyị ga-elebakwa anya n’ebe abụọ anyị kwesịrị iji ndidi chere Jehova. N’ikpeazụ, anyị ga-atụle uru ndị anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị adịrị njikere ichere.

^ par. 56 NKỌWA FOTO1: E nwere otu nwanna nwaanyị na-ekpe ekpere kemgbe ọ bụ nwata. N’oge ahụ, nne na nna ya kụziiri ya otú e si ekpe ekpere. Mgbe ọ nọ afọ iri na ụma, ọ ghọrọ ọsụ ụzọ oge niile. Ọ na-ekpekwa ekpere mgbe niile ka Jehova gọzie ozi ya. Mgbe ọrịa ọjọọ jidere di ya, ọ rịọrọ Jehova ka o nye ya ike ọ ga-eji die nsogbu a bịaara ya. Ugbu a ọ bụ nwaanyị isi mkpe, ọ ka na-ekpesikwa ekpere ike, obi sikwara ya ike na Jehova ga na-aza ekpere ya otú ahụ o si na-aza ya kemgbe ọ bụ nwata.