Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 35

Jiri Ụmụnna Anyị Ndị Agadi Kpọrọ Ihe

Jiri Ụmụnna Anyị Ndị Agadi Kpọrọ Ihe

“Isi awọ́ bụ okpueze mara mma.”​—ILU 16:31.

ABỤ NKE 138 Isi Awọ́ Mara Mma

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. (a) Dị ka e kwuru n’Ilu 16:​31, olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ụmụnna anyị ndị agadi anya? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?

E NWERE otu ebe a na-ezu ike dị n’Akansas dị n’Amerịka. Ndị gara ebe ahụ nwere ike ịhụ dayamọnd n’ala ebe ahụ. Ma, ọtụtụ ndị hụrụ dayamọnd ndị ahụ na-agafere ya n’amaghị ihe ọ bụ n’ihi na a nụchabeghị ya.

2 Ụmụnna anyị ndị mere agadi dị ezigbo oké ọnụ ahịa ka dayamọnd. Okwu Chineke ji isi awọ́ tụnyere okpueze. (Gụọ Ilu 16:31; 20:29) Ma, anyị nwere ike ileghara ụmụnna ndị a bara ezigbo uru anya. Ụmụnna na-akatabeghị ahụ́ ji ụmụnna ndị agadi kpọrọ ihe na-erite ezigbo uru n’aka ha. N’isiokwu a, anyị ga-aza ajụjụ atọ: Gịnị mere Jehova ji ele ndị agadi na-efe ya anya ka ndị bara uru? Gịnị mere ụmụnna ndị agadi ji dị ezigbo mkpa n’ọgbakọ Jehova? Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị nwee ike ịmụta ihe n’aka ha?

IHE MERE JEHOVA JI JIRI NDỊ AGADI NA-EFE YA KPỌRỌ EZIGBO IHE

Ndị agadi na-efe Chineke bara ezigbo uru n’anya Jehova na ọgbakọ ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3)

3. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 92:​12-15, gịnị mere Jehova ji jiri ndị agadi na-efe ya kpọrọ ezigbo ihe?

Ndị agadi na-efe Jehova dị ezigbo oké ọnụ ahịa n’anya ya. Ọ ma ụdị ndị ha bụ, jirikwa àgwà ọma ndị ha nwere kpọrọ ihe. Àgwà ọma ndị ha nwere na-amasịkwa ya. Obi na-adị Jehova ụtọ ma ndị agadi na-akụziri ndị na-eto eto ihe ndị ha mụtara kemgbe ọtụtụ afọ ha na-ejere ya ozi. (Job 12:12; Ilu 1:​1-4) Jehova jikwa ntachi obi ha kpọrọ ihe. (Mal. 3:16) Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ nsogbu bịaara ha, ma ha akwụsịghị inwe okwukwe n’ebe Jehova nọ. Ha nwere ezigbo olileanya ugbu a karịa mgbe ha mụtara eziokwu ọhụrụ. Jehova hụkwara ha n’anya n’ihi na ha nọgidere na-ekwusa aha ya ruo ‘n’agadi.’​—Gụọ Abụ Ọma 92:​12-15.

4. Olee ihe ndị ga-agba ụmụnna anyị ndị agadi ume?

4 Ọ bụrụ na i mewela agadi, ka obi sie gị ike na Jehova chetara ozi niile i jeere ya n’oge gara aga. (Hib. 6:10) I jirila ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma. Nke ahụ mekwara Nna anyị nke eluigwe obi ụtọ. I diela ọnwụnwa dị iche iche ma ndị nke tara akpụ, mee ihe Baịbụl kwuru, meekwa ka ndị ọzọ mata na ọ bụ ihe ha kwesịrị ime. Ị rụọla ọrụ ndị tara akpụ n’ọgbakọ Jehova, zụọkwa ndị ọzọ. Ị gbalịala ike gị niile ịna-eso nzukọ Jehova ụkwụ na ụkwụ. Ị kwadoola ụmụnna gị ndị nọ n’ozi oge niile, na-agbakwa ha ume. Jehova hụrụ gị n’anya nke ukwuu n’ihi na ị na-erubere ya isi. O kwere nkwa na ya agaghị “ahapụ ndị na-erubere ya isi.” (Ọma 37:28) O kwere unu nkwa na ‘isi unu chagodị awọ́, ọ ka ga na-elekọta unu.’ (Aịza. 46:4) N’ihi ya, echekwala na otú a ị bụzi agadi na ị dịghịzi mkpa n’ọgbakọ Jehova. Ị ka dịkwa ezigbo mkpa.

NDỊ AGADI BARA URU N’ỌGBAKỌ JEHOVA

5. Olee ihe ndị agadi kwesịrị iburu n’obi?

5 E nwere ọtụtụ uru ndị agadi na-abara ọgbakọ Jehova. Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ha enweghịzi ike ha nweburu n’oge gara aga, ha ahụla ọtụtụ ihe ná ndụ. Jehova ka nwere ike iji ha na-arụ ọtụtụ ọrụ, dị ka anyị ga-ahụ n’akụkọ ndị fere Jehova n’oge gara aga na n’oge a.

6-7. Mee ihe atụ si na Baịbụl gbasara ndị agadi Jehova gọziri n’ihi na ha rubeere ya isi.

6 Na Baịbụl, e nwere ọtụtụ akụkọ ndị ji obi ha niile fee Jehova ruo mgbe ha mere agadi. Dị ka ihe atụ, Mosis dị ihe dị ka afọ iri asatọ mgbe ọ ghọrọ onye amụma Jehova na onye ndú Izrel. Daniel ka bụkwa onye amụma Jehova mgbe ọ dị ihe dị ka afọ iri itoolu. O nwekwara ike ịbụ na Jọn onyeozi akarịala afọ iri itoolu mgbe Chineke ji mmụọ ya mee ka o dee akwụkwọ Mkpughe.

7 E nwere ọtụtụ ndị ọzọ fere Jehova na-abụghị ndị a ma ama. E nwekwara ike ileghara ha anya. Ma, Jehova ma ha, gọziekwa ha maka isi ha rubeere ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụ naanị ihe ole na ole ka Baịbụl kwuru banyere otu nwoke aha ya bụ Simiọn bụ́ “onye ezi omume na onye na-asọpụrụ Chineke.” Ma, Jehova ma ya, mee ka ọ hụ Jizọs, meekwa ka o buo amụma banyere Jizọs na mama ya. (Luk 2:​22, 25-35) Cheekwa gbasara onye amụma nwaanyị di ya nwụrụ aha ya bụ Ana. Ọ dị afọ iri asatọ na anọ, ma “ụkwụ ya anaghị akọ ụkọ n’ụlọ nsọ.” Otú Jehova si gọzie ya maka ịgachi ụlọ nsọ anya bụ na o mere ka ọ hụ Jizọs mgbe e ku ya n’aka bịa n’ụlọ nsọ. Jehova ji ma Simiọn ma Ana kpọrọ ihe.​—Luk 2:​36-38.

Nwanna Nwaanyị Didur gaferela afọ iri asatọ ugbu a anọgidela na-ejere Jehova ozi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8)

8-9. Olee ihe otu nwanna nwaanyị di ya nwụrụ mere n’ozi Jehova?

8 N’oge a, e nwere ọtụtụ ndị agadi na-efe Jehova ndị na-eto eto ga-amụta ezigbo ihe n’aka ha. Legodị akụkọ Nwanna Nwaanyị Lois Didur. Ọ dị naanị afọ iri abụọ na otu mgbe ọ ghọrọ ọsụ ụzọ pụrụ iche na Kanada. Ya na di ya aha ya bụ John ji ọtụtụ afọ rụọ ọrụ nlekọta sekit. Ha mechara jee ozi na Betel dị na Kanada ihe karịrị afọ iri abụọ. Mgbe Lois dị afọ iri ise na asatọ, a gwara ya na di ya ka ha gaa jewe ozi na Yukren. Gịnị ka ha ga-eme? Hà ga-asị na ha etofeela ịga jewe ozi n’obodo ọzọ? Ha nabatara ozi ahụ. Di ya mechara soro na Kọmitii Alaka obodo ahụ. Mgbe afọ asaa gachara di ya nwụrụ, ọ nọgidekwara na-eje ozi n’obodo ahụ. Ugbu a, ọ dị afọ iri asatọ na otu, ọ ka na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ Yukren. Ụmụnna ndị ebe ahụ hụkwara ya n’anya.

9 E nwere ike a gaghị na-anụ gbasara ụmụnna nwaanyị di ha nwụrụ otú e si na-anụ gbasara ha mgbe di ha dị ndụ. Ma, na di ha anwụọla emeghị ka Jehova gharazie iji ha kpọrọ ihe. Jehova ji ụmụnna nwaanyị ndị kwadoro di ha ruo ọtụtụ afọ ma ka nọgidekwa na-ejere ya ozi ruo ugbu a kpọrọ ezigbo ihe. (1 Tim. 5:3) Ha na-agbakwa ndị na-eto eto ezigbo ume.

10. Olee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’aka Nwanna Tony?

10 E nwere ọtụtụ ụmụnna ndị agadi naanị ha bi. Jehova jikwa ha kpọrọ ezigbo ihe. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwanna aha ya bụ Tony bi n’ebe a na-elekọta ndị agadi ugbu a. O mere baptizim na Pensụlvenịa dị n’Amerịka n’ọnwa Ọgọst afọ 1942 mgbe ọ dị afọ iri abụọ. O teghị aka o mechara baptizim, e nye ya iwu ka ọ banye amị. Ma, ọ jụrụ ime otú ahụ, ya emee ka a tụọ ya mkpọrọ afọ abụọ na ọnwa isii. Ya na nwunye ya Hilda mụtara ụmụ abụọ, ha nọkwa n’ọgbakọ. Kemgbe afọ ndị ahụ, ọ bụrụla onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ n’ọgbakọ atọ, bụrụkwa onye nlekọta mgbakọ sekit. Ọ na-aga n’otu ụlọ mkpọrọ na-eduzi ọmụmụ ihe anyị, na-amụkwara ndị mmadụ Baịbụl. Ugbu a ọ dị afọ iri itoolu na asatọ, ọ chọbeghịkwa ịkwụsị ijere Jehova ozi. Ọ na-eme ike ya niile n’ozi Jehova, ya na ụmụnna nọ n’ọgbakọ ya na-efekọkwa Jehova.

11. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị ji ụmụnna anyị ndị agadi nọ naanị ha kpọrọ ihe?

11 Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị ji ndị agadi bi naanị ha kpọrọ ihe? Ndị okenye nwere ike ịna-enyere ha aka ka ha na-abịa ọmụmụ ihe ma ọ bụ na-egere ya mgbe ọ bụla o kwere omume. Anyị nwere ike igosi na ihe gbasara ha na-emetụ anyị n’obi ma anyị na-aga eleta ha ma ọ bụ anyị na ha si n’Ịntanet na-ekwurịta. Anyị kwesịrị iwepụtara ụmụnna anyị ndị agadi naanị ha nọ ohere, na-elekọtakwa ha. Ma anyị akpacharaghị anya, anyị nwere ike ichefu ụmụnna ndị a. O nwere ike isiri ụfọdụ n’ime ha ike ikwu gbasara onwe ha ma ọ bụ ha echee na ha ekwesịghị ikwuwe ya. Ma, ọ bụrụ na anyị ewepụta oge jụọ ha ajụjụ ma gee ha ntị ka ha na-akọrọ anyị gbasara ihe ọma ndị meere ha n’ozi Jehova, anyị ga-amụta ọtụtụ ihe ga-abara anyị uru.

12. Olee ụdị ụmụnna anyị nwere ike ịhụ n’ọgbakọ anyị?

12 O nwere ike iju anyị anya ịchọpụta na e nwere ọtụtụ ndị agadi nọ n’ọgbakọ anyị anyị ga-amụta ezigbo ihe n’aka ha. E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Harriette ferela Jehova ọtụtụ afọ n’ọgbakọ ya dị na Niu Jesi dị n’Amerịka. O mechara gaa ka ya na nwa ya nwaanyị biri. Ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ ahụ wepụtara oge matakwuo ya nke ọma. Ha chọpụtara na ọ bara nnọọ ezigbo uru. O ji akụkọ otú ha si gaa ozi ọma mgbe ọ natara eziokwu ọhụrụ n’ihe dị ka n’afọ 1925 gbaa ha niile ume. N’oge ahụ, ọ na-eji ihe o ji ata atụ n’akpa ma ọ gawa ozi ọma, a dịghị ama ama a nwụchie ya. N’afọ 1933, a tụrụ ya mkpọrọ otu izu ugboro abụọ. Di ya na-abụghị Onyeàmà Jehova na-akwado ya. O lekọtakwara ụmụ ha atọ n’oge ndị ahụ ọ nọ na mkpọrọ. N’eziokwu, anyị kwesịrị iji ụmụnna ndị agadi ji obi ha niile na-efe Jehova ka Harriette kpọrọ ezigbo ihe.

13. Olee ihe anyị mụtara gbasara uru ndị agadi bara n’ọgbakọ Jehova?

13 Ụmụnna anyị ndị agadi dị ezigbo mkpa n’ọgbakọ Jehova. Ha ahụla otú Jehova si gọzie ọgbakọ ya n’ọtụtụ ụzọ nakwa otú Jehova si gọzie hanwa. Ha esila n’ihe ndị ha mejọrọ mụta ọtụtụ ihe dị mkpa. Were ha ka “ebe e si enweta amamihe” ma mụta ihe n’aka ha. (Ilu 18:4) Ọ bụrụ na i wepụta oge mata ha nke ọma, okwukwe gị ga-esikwu ike, ị ga-amụtakwa ọtụtụ ihe n’aka ha.

MỤTA IHE N’AKA NDỊ AGADI

Otú ahụ Ịlaịsha si mụta ihe n’aka Ịlaịja ka ụmụnna nwere ike isi mụta ihe n’ihe ụmụnna nọterela aka n’ọgbakọ na-akọrọ ha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14 na nke 15)

14. Gịnị ka Diuterọnọmi 32:7 gwara ndị na-eto eto ka ha na-eme?

14 Na-agakwuru ndị agadi ka gị na ha na-ekwurịta okwu. (Gụọ Diuterọnọmi 32:7.) N’eziokwu, e nwere ike ha anaghị ahụcha ụzọ nke ọma ma ọ bụ na-agasi ike ma ọ bụkwanụ na-ekwu okwu nke ọma. Ma, ha ka chọrọ ịna-ejere Jehova ozi. Ha emeekwarala onwe ha “ezigbo aha” n’ebe Jehova nọ. (Ekli. 7:1) Cheta ihe mere Jehova ji jiri ha kpọrọ ihe. Nọgide na-akwanyere ha ùgwù. Na-eme ka Ịlaịsha. Ịlaịsha ekweghị ahapụ Ịlaịja ruokwa n’ụbọchị ikpeazụ ha abụọ nọkọrọ. Ugboro atọ ka Ịlaịsha kwuru, sị: “Agaghị m ahapụ gị.”​—2 Eze 2:​2, 4, 6

15. Olee ajụjụ ndị i nwere ike ịjụ ndị agadi?

15 Iji gosi na i nwere mmasị n’ebe ndị agadi nọ, na-ajụ ha ajụjụ. (Ilu 1:5; 20:5; 1 Tim. 5:​1, 2) Jụọ ha ajụjụ ndị dị ka: “Mgbe ị ka na-eto eto, gịnị mere obi ji sie gị ike na ị chọtala eziokwu ahụ?” “Olee otú ihe ndị mere gị si mee ka gị na Jehova dịkwuo ná mma?” “Olee ihe ndị ị chọpụtara na-eme ka mmadụ na-enwe obi ụtọ n’ozi ọ na-ejere Jehova?” (1 Tim. 6:​6-8) Gee ha ntị nke ọma ka ha na-aza gị ajụjụ ndị ahụ.

16. Olee otú nkwurịta okwu onye na-eto eto na onye agadi ga-esi baara ha abụọ uru?

16 Ọ bụrụ na onye agadi na onye na-eto eto ana-ekwurịta okwu, ọ na-abara ha abụọ uru. (Rom 1:12) Ọ ga-eme ka onye ahụ na-eto eto nwekwuo obi ụtọ maka otú Jehova si na-elekọta ndị na-efe ya, meekwa ka onye agadi ahụ mara na e ji ya kpọrọ ihe. Ọ ga-eme ya obi ụtọ ịkọrọ gị otú Jehova sirila gọzie ya.

17. Olee ihe mere anyị nwere ike iji kwuo na ndị agadi na-efe Jehova na-amakwu mma kwa afọ?

17 Nká nwere ike ime ka ndị agadi gharazie ịma mma elu ahụ́. Ma, ndị na-ejere Jehova ozi na-amakwu mma n’anya ya ka ha na-aka nká. (1 Tesa. 1:​2, 3) Gịnị mere o ji bụrụ eziokwu? Ọ bụ n’ihi na kemgbe ha nọ n’ọgbakọ, ha ekwela ka mmụọ Jehova kpụgharịa ha ma mee ka ha na-akpa àgwà ndị dị mma. Ka anyị na-agbalịkwu ịmata ndị agadi anyị na ha nọ n’ọgbakọ, ịkwanyere ha ùgwù, na ịmụta ihe n’aka ha ka anyị na-amatakwu na ha baara anyị ezigbo uru.

18. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu na-esonụ?

18 Okwukwe ndị nọ n’ọgbakọ na-esikwu ike ma ndị na-eto eto jiri ndị agadi nọ n’ọgbakọ ha kpọrọ ihe, ndị agadi ejirikwa hanwa kpọrọ ihe. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-eleba anya n’otú ndị agadi ga-esi gosi ndị na-eto eto na ha bara uru n’ọgbakọ.

ABỤ NKE 144 Lekwasị Anya n’Ụgwọ Ọrụ

^ par. 5 Ụmụnna anyị ndị agadi bara ezigbo uru. Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịmata otú anyị ga-esi jiri ụmụnna anyị ndị a kpọrọkwuo ihe. Anyị ga-elebakwa anya n’otú amamihe ndị agadi ga-esi baara anyị uru. Isiokwu a ga-emekwa ka obi sie ndị agadi ike na ha bara uru n’ọgbakọ Jehova.