Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 37

“M Ga-eme Ka Mba Niile Maa Jijiji”

“M Ga-eme Ka Mba Niile Maa Jijiji”

“M ga-eme ka mba niile maa jijiji. Ihe ndị bara ezigbo uru nke mba niile ga-abata.”​—HAG. 2:7.

ABỤ NKE 24 Bịanụ n’Ugwu Jehova

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. Olee ụdị ịma jijiji Hagaị onye amụma kwuru ga-eme n’oge anyị a?

N’AFỌ 2015, o nwere otu ala ọma jijiji mere na Nepal. Otu onye nọ mgbe o mere sịrị: “N’ime nkeji ole na ole, ụlọ ahịa na ụlọ ndị mere ochie malitere ịdakasị.” Onye ọzọ sịkwara: “Ebe niile nọ na-agba ghara ghara . . . Ọtụtụ ndị sị na ala ọma jijiji ahụ were ihe dị ka nkeji abụọ. Ma n’anya m, o gburu ezigbo oge.” Ọ bụrụ na ihe na-atụ ụjọ otú a emetụla gị, o nwere ike isiri gị ike ichefu ya.

2 Taa, Jehova na-eme ka mba niile na-ama ụdị jijiji dị iche. Ọ na-eme ya kemgbe ọtụtụ afọ. Hagaị onye amụma kwuru gbasara ya, sị: “N’ihi na Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị, ‘N’oge na-adịghị anya, m ka ga-eme ọzọ ka eluigwe na ụwa na oké osimiri na ala nkịtị maa jijiji.’”​—Hag. 2:6.

3. Olee otú ịma jijiji nke Hagaị kwuru okwu ya si dị iche na nke ala ọma jijiji?

3 Ụdị ịma jijiji Hagaị kwuru gbasara ya abụghị ala ọma jijiji nke naanị ihe ọ na-akpata bụ imebisi ihe. Kama, ọ na-akpata ihe ọma. Jehova n’onwe ya gwara anyị, sị: “M ga-eme ka mba niile maa jijiji. Ihe ndị bara ezigbo uru nke mba niile ga-abata. M ga-emekwa ka ebube m jupụta n’ụlọ a.” (Hag. 2:7) Olee ihe amụma a pụtaara ndị dịrị ndụ n’oge Hagaị? Oleekwa ihe ọ pụtaara anyịnwa taa? Anyị ga-aza ajụjụ ndị a, mụtakwa otú anyị ga-esi soro na-eme ka mba niile na-ama jijiji taa.

OZI NA-AGBA EZIGBO UME N’OGE HAGAỊ

4. Gịnị mere Jehova ji zigara ndị Izrel Hagaị onye amụma?

4 Jehova nyere Hagaị onye amụma ọrụ dị ezigbo mkpa. Legodị ihe mere tupu mgbe ahụ. O nwere ike ịbụ na Hagaị so ná ndị si Babịlọn lọta Jeruselem n’afọ 537 Tupu Oge Ndị Kraịst. Obere oge ha ruru Jeruselem, ha malitere ịrụ ụlọ nsọ Jehova. (Ezra 3:​8, 10) Ma o teghị aka, otu ihe na-adịchaghị mma emee. Ha dara mbà ma kwụsị ịrụ ụlọ nsọ ahụ n’ihi mmegide. (Ezra 4:4; Hag. 1:​1, 2) N’ihi ya, n’afọ 520 Tupu Oge Ndị Kraịst, Jehova gwara Hagaị ka ọ gaa gbaa ndị Izrel ume ka ha nwee ike iji ịnụ ọkụ n’obi rụchaa ụlọ nsọ ahụ. *​—Ezra 6:​14, 15.

5. Olee ihe mere ihe Hagaị gwara ndị Juu ji mee ka obi sie ha ike?

5 Jehova chọrọ ka ozi ahụ o ziri Hagaị mee ka ndị Juu nwee okwukwe na ya. Onye amụma ahụ ji obi ike gwa ndị Juu ahụ dara mbà n’obi, sị: “Dịkwanụ ike, unu niile ndị bi n’ala a, rụọkwanụ ọrụ. N’ihi na m nọnyeere unu. Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.” (Hag. 2:4) Ọ ga-abụrịrị na okwu ahụ bụ́ “Jehova nke ụsụụ ndị agha” mere ka obi sie ha ike. Jehova nwere ọtụtụ ndị agha, bụ́ ndị mmụọ ozi, nọ n’okpuru ya. N’ihi ya, ihe ga-agaziri ndị Juu ma ha tụkwasị ya obi.

6. Gịnị ka ịma jijiji ahụ Hagaị buru amụma ya ga-akpata?

6 Jehova gwara Hagaị ka ọ gaa zie ndị Juu na ọ ga-eme ka mba niile maa jijiji. Ozi ahụ gbara ndị Juu ahụ dara mbà ma kwụsị ịrụ ụlọ nsọ ume. O gosiri na Jehova ga-eme ka Peshia, bụ́ mba na-achị ụwa niile n’oge ahụ, maa jijiji. Gịnị ka ịma jijiji ahụ ga-akpata? Nke mbụ, ndị Chineke ga-arụcha ụlọ nsọ ahụ. Ha rụchaa ya, ndị na-abụghị ndị Juu ga-abịa soro ha fewe Jehova na ya. O doro anya na ozi ahụ mere ka obi sie ndị Jehova ike.​—Zek. 8:9.

ỌRỤ GA-EME KA ỤWA MAA JIJIJI

Ì so na-ekwusa ozi ọma gbasara ịma jijiji nke mba niile a na-ekwusa taa? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7 na nke 8) *

7. Olee ọrụ na-eme ka ụwa maa jijiji anyị so na-arụ taa? Kọwaa.

7 Olee ihe amụma Hagaị pụtaara anyị taa? Jehova na-eme ka mba niile maa jijiji ọzọ. Na nke ugbu a, anyị so ya na-eme ya. Chegodị ihe a, n’afọ 1914, Jehova mere Jizọs Kraịst Eze nke Alaeze ya n’eluigwe. (Ọma 2:6) Ihe a adịghị ndị ọchịchị ụwa mma n’obi. Ọ pụtara na “oge ndị mba ọzọ,” ya bụ, oge a na-enweghị onye ọchịchị bụ́ mmadụ na-anọchite anya Chineke n’ụwa, agwụla. (Luk 21:24) N’ihi ya, kemgbe afọ 1919, ndị Chineke malitere ikwu na Alaeze Chineke bụ naanị ihe ga-ewepụrụ ụmụ mmadụ nsogbu ha niile. “Ozi ọma Alaeze Chineke” a na-ekwusa emeela ka ụwa na-ama jijiji.​—Mat. 24:14.

8. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 2:​1-3, gịnị ka mba dị iche iche mere gbasara ozi ọma ahụ?

8 Gịnị ka ndị mmadụ mere gbasara ozi a? Ọtụtụ n’ime ha jụrụ ya. (Gụọ Abụ Ọma 2:​1-3.) O mere ka mba niile na-agba ghara ghara. Ha jụrụ ịnabata Eze Jehova họpụtara. Ha ewereghị ozi ọma Alaeze anyị na-ekwusa ka “ozi ọma.” N’eziokwu, ndị ọchịchị ụfọdụ machiri ọrụ ikwusa ozi ọma anyị. N’agbanyeghị na ọtụtụ n’ime ha na-ekwu na ha na-efe Chineke, ha achọbeghị ịpụ n’ọchịchị. N’ihi ya, otú ahụ ndị ọchịchị mere n’oge Jizọs, ndị ọchịchị nke oge a na-emegide ndị na-eso ụzọ Jizọs si otú ahụ na-emegide onye Jehova tere mmanụ.​—Ọrụ 4:​25-28.

9. Ebe ọ bụ na mba niile jụrụ ozi ọma Chineke, gịnị ka o nyere ha ohere ime?

9 Ebe ọ bụ na mba niile jụrụ ozi ọma Chineke, gịnị ka o nyere ha ohere ime? Abụ Ọma 2:​10-12 sịrị: “Ugbu a, unu ndị eze, gosinụ na unu na-aghọta ihe. Unu ndị na-ekpe ikpe n’ụwa, nabatanụ aka ná ntị a na-adọ unu. Na-atụnụ egwu Jehova mgbe unu na-efe ya, na-amakwanụ jijiji mgbe unu na-aṅụrị ọṅụ. Kwanyerenụ ọkpara ya ùgwù, ma ọ́ bụghị ya, Chineke ga-ewe iwe, unu ewee laa n’iyi, N’ihi na o nwere ike iwe iwe ngwa ngwa. Ndị niile na-agbaba n’ime ya na-enwe obi ụtọ.” Jehova hapụrụ ndị a na-emegide ya iji mara ma hà ga-agbanwe. Ha ka nwere ike ịgbanwe obi ha ma nabata Alaeze Jehova. Ma, oge adịghịzi. Anyị bi ‘n’oge ikpeazụ’ nke ụwa ọjọọ Ekwensu. (2 Tim. 3:1; Aịza. 61:2) Ọ bụ ugbu a ka ọ kacha dị ọkụ ọkụ ka ndị mmadụ mata Chineke ma kpebie ife ya.

IHE ỌMA ỊMA JIJIJI AHỤ MERE

10. Olee ihe dị mma ụfọdụ ndị ga-eme n’ihi ịma jijiji ahụ e kwuru okwu ya na Hagaị 2:​7-9?

10 Ịma jijiji ahụ Hagaị buru n’amụma mere ka ụfọdụ ndị mee ihe dị mma. Hagaị kwuru na n’ihi ịma jijiji ahụ, “ihe ndị bara ezigbo uru [ya bụ ndị nwere ezi obi] nke mba niile ga-abata” bịa fee Jehova. * (Gụọ Hagaị 2:​7-9.) Ma Aịzaya ma Maịka buru amụma na ụdị ihe ndị ahụ ga-eme “n’oge ikpeazụ.”​—Aịza. 2:​2-4; Maị. 4:​1, 2.

11. Gịnị ka otu nwanna mere mgbe mbụ ọ nụrụ ozi ọma Alaeze Chineke?

11 Chegodị gbasara ihe otu nwanna aha ya bụ Ken na-eje ozi ugbu a n’isi ụlọ ọrụ anyị mere mgbe ọ nụrụ eziokwu ahụ. Ọ ka na-echeta ihe mere mgbe mbụ ọ nụrụ ozi ọma Alaeze Chineke ihe dị ka afọ iri anọ gara aga. Nwanna Ken sịrị: “Mgbe mbụ m nụrụ eziokwu si n’Okwu Chineke, obi dị m ezigbo ụtọ na anyị bi n’oge ikpeazụ nke ụwa ọjọọ a. M ghọtara na m chọọ ka mụ na Chineke dịrị ná mma, mụ enwetakwa ndụ ebighị ebi, ekwesịghị m iso ụwa a a na-ejighị n’aka na-eme ihe ha na-eme. Kama, m kwesịrị ịkwụsi ike n’akụkụ Jehova. M kpere ekpere ma mee otú ahụ ozugbo. M kwụsịrị itinye aka n’ihe ụwa na-eme ma bata n’ọgbakọ Jehova ebe anyị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’Alaeze Chineke nke na-enweghị ihe nwere ike ime ya.”

12. Olee ihe ndị na-eme ka a na-eto Jehova n’oge ikpeazụ a?

12 O doro anya na Jehova na-agọzi ndị ya. N’oge ikpeazụ a, anyị ahụla na ndị ya na-amụba n’ike n’ike. N’afọ 1914, anyị dị naanị puku ole na ole. Ma ugbu a, e nwere ihe karịrị nde mmadụ asatọ na-efe Chineke. Ọtụtụ nde mmadụ na-esokwa anyị eme Ncheta Ọnwụ Jizọs kwa afọ. Ọ bụ otu a ka “ihe ndị bara ezigbo uru nke mba niile” si na-eju ná nzukọ Jehova. Otú a ndị na-abata n’ọgbakọ Jehova na-ahapụ àgwà ọjọọ ha ma kpawa àgwà ọma na-emekwa ka e too aha Jehova.​—Efe. 4:​22-24.

Ebe ndị Chineke n’ụwa niile ji obi ụtọ na-ezi ndị ọzọ ozi ọma Alaeze Chineke (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)

13. Olee amụma ndị ọzọ otú ndị mmadụ si enubata n’ọgbakọ Jehova na-emezu? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

13 Ihe ndị a na-eme na-emezukwa amụma Baịbụl ndị ọzọ, dị ka nke e dere n’Aịzaya isi iri isii. Amaokwu ya nke iri abụọ na abụọ sịrị: “Onye dị ntakịrị ga-aghọ otu puku mmadụ. Onye dị obere ga-aghọkwa mba dị ike. Mụnwa, bụ́ Jehova, ga-eme ka o mezuo ọsọ ọsọ n’oge ya.” Otú a ọtụtụ ndị si na-enubata n’ọgbakọ Jehova mere ka ihe dị ịtụnanya na-eme. “Ndị bara ezigbo uru” na-eji nkà dị iche iche ha nwere na-abata n’ọgbakọ Jehova. Ha dịkwa njikere iso na-ekwusa ozi Alaeze Chineke. Nke a mere ka ndị Chineke jiri nkà ndị ahụ Aịzaya kpọrọ “ara mba dị iche iche” na-ejere Jehova ozi. (Aịza. 60:​5, 16) Ndị a na-abata n’ọgbakọ Jehova na-enye aka eme ka anyị na-ekwusa ozi ọma na narị mba abụọ na iri anọ, na-ebikwa akwụkwọ anyị n’ihe karịrị otu puku asụsụ.

OGE IME MKPEBI

14. Olee mkpebi ndị mmadụ ga-eme ugbu a?

14 N’oge ikpeazụ a, ịma jijiji nke mba niile na-eme ka ndị mmadụ kpebie ma hà ga-akwado Alaeze Chineke ka hà ga na-atụkwasị ọchịchị ụwa a obi. Ihe a bụ mkpebi dịịrị onye ọ bụla. N’agbanyeghị na ndị Jehova na-erube isi n’iwu obodo ha nọ na ya, ha anaghị etinye aka n’ihe ọ bụla gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ụwa a. (Rom 13:​1-7) Ha ma na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-egboro ụmụ mmadụ mkpa ha niile. Alaeze ahụ abụghịkwa nke ụwa a.​—Jọn 18:​36, 37.

15. Olee ule akwụkwọ Mkpughe kwuru ga-abịara ndị Chineke?

15 Akwụkwọ Mkpughe kọwara otú a ga-esi ele okwukwe ndị Chineke ule n’oge ikpeazụ. Mkpagbu na mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ ga-abịara anyị. Ndị ọchịchị ụwa a ga-achọ ka anyị na-efe ha. Ha ga-akpagbukwa ndị ọ bụla jụrụ ịkwado ha. (Mkpu. 13:​12, 15) Ha ga-amanye “mmadụ niile ka a kaa ha akara n’aka nri ha ma ọ bụ n’egedege ihu ha, ma ndị nta ma ndị ukwu, ma ndị ọgaranya ma ndị ogbenye, ma ndị nweere onwe ha ma ndị ohu.” (Mkpu. 13:16) N’oge ochie, a na-aka ndị ohu akara iji gosi onye nwe ha. Taakwa, ndị ọchịchị ga-achọ ka onye ọ bụla gosi onye ọ na-akwado. Ha ga-achọ ka ndị mmadụ si n’otú ha si eche echiche na n’ihe ndị ha na-eme gosi na ha na-akwado ọchịchị ụwa a.

16. Gịnị mere anyị ji kwesị ịkwụsi ike n’ebe Jehova nọ ugbu a?

16 Ànyị ga-ekwe ka a kaa anyị akara a iji gosi na anyị na-akwado ọchịchị ụwa a? Ihe ga-esiri ndị na-ekweghị ka a kaa ha akara ike. Akwụkwọ Mkpughe kwuru na o nweghị “onye ga-azụ ihe ma ọ bụ ree ihe ma e wezụga onye nwere akara ahụ.” (Mkpu. 13:17) Ma, ndị Chineke ma ihe Chineke ga-eme ndị nwere akara ahụ e kwuru gbasara ya ná Mkpughe 14:​9, 10. N’ihi ya, kama ha ga-ekwe ka a kaa ha akara ahụ, ha ga-adị ka ndị dere “Abụ m nke Jehova” n’aka ha. (Aịza. 44:5) Ugbu a bụ oge iji kwụsie ike n’ebe Jehova nọ. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, obi ga-adị Jehova ụtọ ikwu na anyị bụ nke ya.

ỊMA JIJIJI NKE IKPEAZỤ

17. Gịnị ka anyị kwesịrị icheta gbasara ndidi Jehova?

17 Jehova enweerela ụmụ mmadụ ezigbo ndidi n’oge ikpeazụ a. Ọ chọghị ka e bibie onye ọ bụla. (2 Pita 3:9) O nyela onye ọ bụla ohere ichegharị ma kpebie ife ya. Ma, ọ gaghị enwe ndidi ruo mgbe ebighị ebi. Ọ ga-adị ndị na-ekweghị akwado Alaeze Chineke otú ọ dị Fero n’oge Mosis. Jehova gwara Fero, sị: “M gaarala eweli aka m kpatara gị na ndị obodo gị ọrịa ọjọọ, ka e wee kpochapụ gị n’ụwa. Ma ihe mere m ji hapụ gị ndụ bụ ka m gosi gị ike m nakwa ka a kọsaa aha m n’ụwa niile.” (Ọpụ. 9:​15, 16) Mba niile ga-emecha mara na ọ bụ naanị Jehova bụ ezi Chineke. (Ezik. 38:23) Olee otú nke a ga-esi eme?

18. (a) Olee ụdị ịma jijiji ọzọ e kwuru okwu ya na Hagaị 2:​6, 20-22? (b) Olee otú anyị si mara na ihe Hagaị kwuru ga-emezu n’ọdịnihu?

18 Ọtụtụ afọ Hagaị nwụchara, Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ dee na ihe a e kwuru na Hagaị 2:​6, 20-22 ga-emezu n’ọdịnihu. (Gụọ ya.) Pọl dere, sị: “O kwere nkwa ugbu a, sị: ‘M ka ga-eme ọzọ ka ụwa na eluigwe maa jijiji.’ Ma okwu bụ́ ‘m ka ga-eme ọzọ’ na-egosi na a ga-ewepụ ihe ndị e mere ka ha maa jijiji, bụ́ ihe ndị Chineke na-ekeghị, ka ihe ndị a na-emeghị ka ha maa jijiji wee dịgide.” (Hib. 12:​26, 27) Ịma jijiji nke e kwuru okwu ya na Hagaị 2:7 dị iche n’ịma jijiji nke a. Ịma jijiji nke a ga-eme ka e bibie ndị dị ka Fero kpamkpam bụ́ ndị na-ekwetaghị na ọ bụ Jehova ka o ruuru ịchị.

19. Olee ihe na-agaghị ama jijiji? Olee otú anyị si mara?

19 Olee ihe na-agaghị ama jijiji ma ọ bụ ihe a na-agaghị ewepụ? Pọl kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na anyị ga-eketa Alaeze a na-enweghị ike ime ka ọ maa jijiji, ka anyị na-ekwe ka amara Chineke baara anyị uru, nke anyị ga-esi na ya jiri egwu Chineke na-ejere ya ozi dị nsọ nke ọ na-anabata.” (Hib. 12:28) Mgbe ịma jijiji a ga-akwụsị, naanị Alaeze Chineke ga-adị. O nweghị ihe ga-eme ya.​—Ọma 110:​5, 6; Dan. 2:44.

20. Olee ihe ndị mmadụ ga-ekpebirịrị ime? Olee otú anyị nwere ike isi nyere ha aka?

20 Oge adịghịzi. Ndị mmadụ ga-ahọrọ ma hà ga-anọgide na-akwado ụwa a nke ga-eme ka e bibie ha, ka hà ga-agbasi mbọ ike na-akpa àgwà otú Chineke chọrọ nke ga-eme ka ha nweta ndụ ebighị ebi. (Hib. 12:25) Ozi ọma anyị na-ekwusa ga-enyere ndị mmadụ aka ikpebi ebe ha kwụ n’okwu a dị ezigbo mkpa. Ka anyị nyekwuoro ọtụtụ ndị aka ikpebi ịkwado Alaeze Chineke. Ka anyị burukwa n’obi ihe Onyenwe anyị Jizọs Kraịst kwuru. Ọ sịrị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma Alaeze Chineke n’ebe niile n’ụwa ka ọ bụụrụ mba niile àmà, mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”​—Mat. 24:14.

ABỤ NKE 40 Ònye Ka Anyị Bụ Nke Ya?

^ par. 5 Isiokwu a ga-eme ka anyị gbanwee otú anyị si ghọta ihe e kwuru na Hagaị 2:7. N’isiokwu a, anyị ga-amụta otú anyị nwere ike isi soro n’otu ọrụ dị ezigbo mkpa nke na-eme ka mba niile maa jijiji. Anyị ga-amụtakwa otú ịma jijiji a si enyere ndị ụfọdụ aka ma na-akpa ndị ọzọ aka ọjọọ.

^ par. 4 Anyị ma na Hagaị mere ihe Jehova gwara ya mee n’ihi na a rụchara ụlọ nsọ ahụ n’afọ 515 Tupu Oge Ndị Kraịst.

^ par. 10 Ihe a bụzi otú anyị si ghọta ya. N’oge gara aga, anyị kwuru na ọ bụghị ịma jijiji nke mba niile na-eme ka ndị ji ezi obi chọọ ịbịa fee Jehova. Gụọ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” nke gbara n’Ụlọ Nche Mee 15, 2006.

 

^ par. 63 NKỌWA FOTO: Ebe Hagaị na-agba ndị Chineke ume ka ha jiri ịnụ ọkụ n’obi rụghachi ụlọ nsọ. Taa, ndị Chineke ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ebe di na nwunye na-ekwusa ozi ọma gbasara ịma jijiji nke ikpeazụ ga-abịanụ.