Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 42

Obi Sie Gị Ike na Ihe I Kweere Bụ Eziokwu

Obi Sie Gị Ike na Ihe I Kweere Bụ Eziokwu

“Na-achọpụtanụ nke bụ́ eziokwu n’ihe niile; jidesienụ ihe dị mma aka ike.”​—1 TESA. 5:21.

ABỤ NKE 142 Ka Anyị Jidesie Olileanya Anyị Ike

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị mere ọtụtụ ndị amaghị okpukpe nke bụ́ nke ezigbo ya?

E NWERE ọtụtụ chọọchị na-ekwu na ha bụ Ndị Kraịst, na-ekwukwa na ọ bụ ha na-efe Chineke otú ọ chọrọ. Ọ bụ ya mere ọtụtụ ndị amaghịzi nke bụ́ ezigbo okpukpe. Ha na-ajụ, sị: “È nwere naanị otu ezigbo okpukpe, ka Chineke ọ̀ na-anabata okpukpe niile?” Obi ò siri anyị ike na ọ bụ Ndịàmà Jehova na-akụzi eziokwu nakwa na ọ bụ naanị otú ha si efe Jehova bụ otú ọ chọrọ? Ọ̀ ga-ekwe omume obi isi anyị ezigbo ike n’ihe ndị a? Ka anyị lee ihe ndị gosiri na ọ bụ anyị na-efe Jehova otú ọ chọrọ.

2. Dị ka e kwuru ná 1 Ndị Tesalonaịka 1:​5, gịnị mere obi ji sie Pọl onyeozi ike na ihe o kweere bụ eziokwu?

2 Obi siri Pọl onyeozi ike na ihe o kweere bụ eziokwu. (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 1:5.) Ihe mere o ji kwere n’ihe ndị ahụ abụghị naanị ka obi dị ya ụtọ, kama, ọ mụrụ okwu Chineke nke ọma, kwetakwa na “Ihe niile dị n’Akwụkwọ Nsọ si n’ike mmụọ nsọ Chineke.” (2 Tim. 3:16) Gịnị ka okwu Chineke ọ mụrụ kụziiri ya? Ọ hụrụ ihe mere ka obi sie ya ike na ọ bụ Jizọs bụ Mezaya ahụ e kwere ná nkwa, bụ́kwanụ ihe ndị ndú okpukpe ndị Juu na-ekwetaghị na ya. Ndị ihu abụọ ahụ kwuru na ha na-akụziri ndị mmadụ eziokwu gbasara Chineke. Ma, ha na-eme ihe ndị Chineke kpọrọ asị. (Taị. 1:16) Pọl emeghị ka ha. Ọ họrọghị ihe ndị nke ọ ga-ekwere n’Okwu Chineke na ndị nke ọ na-agaghị ekwere. Ọ dị njikere ịna-akụziri ndị mmadụ “ihe niile Chineke zubere ime.”​—Ọrụ 20:27.

3. Ànyị kwesịrị ịma azịza ajụjụ niile anyị nwere tupu obi esie anyị ike na ihe anyị kweere bụ eziokwu? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Ọrụ Jehova na Echiche Ya ‘Dị Nnọọ Ọtụtụ nke na E Nweghị Ike Ikwucha Ha.’”)

3 Ụfọdụ ndị chere na okpukpe ọ bụla bụ́ nke ezigbo ya ga-enwe ike ịza ajụjụ niile ma ndị nke Baịbụl na-azaghị. Ọ̀ bụ eziokwu? Chegodị gbasara ihe Pọl mere. Ọ gbara ụmụnna ya ume ka ha ‘na-achọpụta nke bụ́ eziokwu n’ihe niile.’ Ma, o kwetara na ọ bụghị ihe niile ka ọ ghọtara. (1 Tesa. 5:21) Ọ sịrị: “N’ihi na ihe anyị ma ezughị ezu, . . . ihe anyị ji ahụ ihe bụ enyo na-ahụ ihe inyoghi inyoghi.” (1 Kọr. 13:​9, 12) Ọ bụghị ihe niile gbasara nzube Jehova ka Pọl ghọtara nke ọma. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyịnwa. Ma, ihe ndị ọ maara mere ka obi sie ya ike na ihe o kweere bụ eziokwu.

4. Olee otú anyị ga-esi mee ka obi sie anyị ike na ihe anyị kweere bụ eziokwu? Gịnị ka anyị ga-atụle gbasara ezigbo Ndị Kraịst?

4 Otu ụzọ anyị ga-esi mee ka obi sie anyị ike na ihe anyị kweere bụ eziokwu bụ iji otú Ndịàmà Jehova si efe Chineke taa tụnyere otú Jizọs si fee Chineke. N’isiokwu a, anyị ga-amụta na ezigbo Ndị Kraịst (1) anaghị etinye aka n’ikpere arụsị, (2) na-akwanyere aha Jehova ùgwù, (3) hụrụ eziokwu n’anya, (4) na-ahụkwa ibe ha n’anya nke ukwuu.

ANYỊ ANAGHỊ EKPERE ARỤSỊ

5. Gịnị ka anyị na-amụta n’aka Jizọs gbasara otú e kwesịrị isi na-efe Chineke, oleekwa otú anyị nwere ike isi na-eme ihe ọ kụziri?

5 N’oge niile Jizọs nọ n’eluigwe nakwa mgbe ọ bịara n’ụwa a, o fere naanị Jehova n’ihi na ọ hụrụ ya n’anya nke ukwuu. (Luk 4:8) Ọ kụzikwaara ndị na-eso ụzọ ya ịna-eme otú ahụ. Ma Jizọs ma ndị na-eso ụzọ ya ejighị ihe oyiyi fee Chineke. Ebe ọ bụ na Chineke bụ mmụọ, o nweghị otú mmadụ ga-esi kpụọ ihe ọ bụla ga-eyi ya. (Aịza. 46:5) Oleekwanụ banyere ịkpụ ndị sent na ịgwa ha okwu n’ekpere? Iwu nke abụọ Jehova nyere ụmụ Izrel sịrị: “Emerela onwe gị arụsị a pịrị apị ma ọ bụ ihe yiri ihe ọ bụla dị n’eluigwe ma ọ bụ ihe dị n’ụwa . . . Akpọrọla ha isiala.” (Ọpụ. 20:​4, 5) Ihe ebe a kwuru doro ndị niile na-achọ ime ihe Jehova kwuru anya.

6. Olee otú Ndịàmà Jehova si efe Chineke taa?

6 Ndị na-akọ akụkọ ihe mere n’oge ochie kwuru na Ndị Kraịst oge ochie fere naanị Chineke. Dị ka ihe atụ, otu akwụkwọ aha ya bụ History of the Christian Church kwuru na Ndị Kraịst oge ochie “agaghị achọtụdị” idowe ihe oyiyi n’ebe ha na-efe ofufe. Taa, Ndịàmà Jehova na-eme ihe Ndị Kraịst oge ochie ahụ mere. Anyị anaghị agwa ihe oyiyi ndị sent ma ọ bụ ndị mmụọ ozi ma ọ bụdị Jizọs okwu n’ekpere. Anyị anaghị egbuchapụrụ ọkọlọtọ ma ọ bụ na-eme ihe ọ bụla ọzọ ga-egosi na anyị na-efe obodo anyị. Mee elu mee ala, anyị kpebisiri ike ime ihe Jizọs kwuru. Ọ sịrị: “Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka i kwesịrị ife ofufe.”​—Mat. 4:10.

7. Olee ihe ndị mere Ndịàmà Jehova ji dị iche n’okpukpe ndị ọzọ?

7 Taa, ọtụtụ ndị na-ege ndị isi okpukpe a ma ama ntị. Otú ihe ha si amasị ha na-emedị ka ọ fọ obere ka ha fewe ha. Ọtụtụ ndị na-aga chọọchị ha, na-azụ akwụkwọ ha, na-enyekwa nnukwu ego n’onyinye. Ụfọdụ na-ekwere n’ihe ọ bụla ndị isi okpukpe ndị ahụ kwuru, na-eweredị ha ka hà bụ Jizọs. Ma, ezigbo Ndị Kraịst enweghị ndị isi. Ọ bụ eziokwu na anyị na-akwanyere ndị na-edu ndú ùgwù, anyị kwetara ihe Jizọs kwuru nke bụ́: “Unu niile bụ ụmụnna.” (Mat. 23:​8-10) Anyị anaghị efe mmadụ, ma ndị isi okpukpe ma ndị ọchịchị. Anyị anaghịkwa akwado ihe ndị ha na-eme na chọọchị ma ọ bụ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Kama, anyị dị iche n’ụwa. Ihe ndị a mere ka anyị dịrị iche n’okpukpe ndị ọzọ na-ekwu na ha bụ Ndị Kraịst.​—Jọn 18:36.

ANYỊ NA-AKWANYERE AHA JEHOVA ÙGWÙ

Obi na-adị ezigbo Ndị Kraịst ụtọ ịgwa ndị ọzọ gbasara Jehova (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8 ruo na nke 10) *

8. Olee otú anyị si mara na Jehova chọrọ ka e mee ka aha ya dị ebube nakwa ka mmadụ niile mara aha ya?

8 O nwere mgbe Jizọs kpere ekpere, sị: “Nna, mee ka aha gị dị ebube.” Jehova ji olu dara ụda si n’eluigwe za ya ekpere ahụ, kwekwa ya nkwa na ya ga-eme ka aha ya dị ebube. (Jọn 12:28) N’oge niile Jizọs kwusara ozi ọma n’ụwa, o mere ka aha Nna ya dị ebube. (Jọn 17:26) N’ihi ya, ezigbo Ndị Kraịst kwesịrị iji aha Chineke na-akpa nganga, na-emekwa ka ndị ọzọ mara ya.

9. Olee otú Ndị Kraịst oge mbụ si gosi na ha na-akwanyere aha Chineke ùgwù?

9 Obere oge e hiwechara ọgbakọ Ndị Kraịst n’oge ndịozi, Jehova ‘chetara ndị mba ọzọ, malitezie isi n’ime ha na-ahọrọ ndị ga-aza aha ya.’ (Ọrụ 15:14) Ndị Kraịst oge mbụ ahụ ji aha Chineke kpaa nganga, meekwa ka ndị ọzọ mara ya. Ha mere ka ndị mmadụ mata aha ahụ mgbe ha na-ekwusa ozi ọma nakwa n’akwụkwọ Baịbụl ndị ha dere. * Ha si otú a mee ka a mata na ha bụ ndị e ji aha Chineke mara.​—Ọrụ 2:​14, 21.

10. Olee ihe gosiri na Ndịàmà Jehova bụ ndị e ji aha Chineke mara?

10 Ndịàmà Jehova hà bụ ndị e ji aha Chineke mara? Chegodị gbasara ihe a. Taa ọtụtụ ndị ndú okpukpe anwaala ike ha niile iji zochiere ndị mmadụ aha Chineke. Ha wepụrụ ya na Baịbụl ndị ha sụgharịrị. E nwekwara mgbe ha machiri ndị mmadụ ịkpọ aha ahụ na chọọchị. * O doro anya na ọ bụ naanị Ndịàmà Jehova na-akwanyere aha Jehova ùgwù otú o kwesịrị. Anyị na-eme ka ndị mmadụ mara aha Jehova karịa okpukpe ọ bụla ọzọ, si otú ahụ na-eme ihe dabara n’aha anyị na-aza. N’eziokwu, anyị bụ Ndịàmà Jehova. (Aịza. 43:​10-12) Anyị ebipụtala Baịbụl Nsọ​—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ karịrị narị nde abụọ na iri anọ. Na Baịbụl ahụ, e dere aha Jehova n’ọtụtụ ebe ndị sụgharịrị Baịbụl ndị ọzọ na-edeghị ya. Anyị ebipụtakwala ọtụtụ akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl e dere aha Jehova na ha n’ihe karịrị otu puku asụsụ.

ANYỊ HỤRỤ EZIOKWU AHỤ N’ANYA

11. Olee otú Ndị Kraịst oge mbụ si gosi na ha hụrụ eziokwu n’anya?

11 Jizọs hụrụ eziokwu ahụ n’anya, ya bụ, eziokwu gbasara Chineke na nzube ya. Otú o si bie ndụ gosikwara na o kwetara n’eziokwu ahụ. O mekwara ka ndị ọzọ mara gbasara ya. (Jọn 18:37) Ndị na-eso ụzọ Jizọs hụkwara eziokwu ahụ n’anya. (Jọn 4:​23, 24) Pita onyeozi kpọdịrị ihe Ndị Kraịst kweere “eziokwu.” (2 Pita 2:2) Ndị Kraịst oge mbụ jụrụ okpukpe, omenala, na echiche ndị mmadụ na-adabaghị n’eziokwu ahụ. (Kọl. 2:8) Taakwa, ezigbo Ndị Kraịst na-agbalịsi ike ka ha ‘nọgide na-eje ije n’eziokwu ahụ.’ Otú ha si eme ya bụ ịgbalịsi ike hụ na ihe ha kweere na otú ha si ebi ndụ dabara n’Okwu Chineke.​—3 Jọn 3, 4.

12. Gịnị ka ndị na-edu ndú n’ọgbakọ Jehova na-eme ma ha chọpụta na e kwesịrị ịgbanwe otú anyị si ghọta ihe ụfọdụ? Gịnịkwa mere ha ji eme otú ahụ?

12 Ndịàmà Jehova anaghị ekwu na ha ghọtachara ihe niile dị na Baịbụl. E nweela mgbe ha kọwahiere ihe dị na Baịbụl ma ọ bụ mee ihe ụfọdụ n’ihi na ha aghọtachaghị ihe Baịbụl kwuru nke ọma. Ma, nke ahụ ekwesịghị iju anyị anya n’ihi na Baịbụl kwuru na ka oge na-aga, ndị Chineke ga na-aghọtakwu eziokwu Baịbụl. (Kọl. 1:​9, 10) Jehova na-eme ka e jiri nwayọọ nwayọọ na-aghọtakwu eziokwu ahụ. Anyị kwesịkwara ịdị njikere ichere ruo mgbe anyị ga-aghọta ya nke ọma. (Ilu 4:18) Ọ bụrụ na ndị na-edu ndú ná nzukọ Jehova achọpụta na e kwesịrị ịgbanwe otú e si ghọta otu ihe Baịbụl kwuru, ha anaghị egbu oge ime ya. Ọtụtụ chọọchị na-agbanwe ihe ha na-eme iji mee ka obi dị ndị chọọchị ha mma ma ọ bụkwanụ iji mee ka ha na-eme ka ndị ụwa. Ma, ihe na-eme ka Ndịàmà Jehova gbanwee ihe ụfọdụ bụ na ha chọrọ ịbịarukwu Chineke nso, na-efekwa ya otú Jizọs si fee ya. (Jems 4:4) Anyị anaghị agbanwe ihe anyị na-eme n’ihi na ndị mmadụ agbanweela otú ha si ele ihe anya, kama, ọ bụ n’ihi na anyị aghọtakwuola Akwụkwọ Nsọ nke ọma. Anyị hụrụ eziokwu ahụ n’anya.​—1 Tesa. 2:​3, 4.

ANYỊ JI OBI ANYỊ NIILE HỤ IBE ANYỊ N’ANYA

13. Olee àgwà a kacha jiri mara ezigbo Ndị Kraịst? Olee otú Ndịàmà Jehova si egosi ya?

13 E ji ọtụtụ àgwà ọma mara Ndị Kraịst oge mbụ. Ma, àgwà a kacha jiri mara ha bụ ịhụnanya. Jizọs sịrị: “Ọ bụrụ na unu hụrụ ibe unu n’anya, mmadụ niile ga-eji ya mata na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.” (Jọn 13:​34, 35) Taa, Ndịàmà Jehova n’ụwa niile hụrụ ibe ha n’anya, dịrịkwa n’otu. Anyị dị iche ná ndị okpukpe ndị ọzọ n’ihi na anyị dị ka ndị si n’otu ezinụlọ n’agbanyeghị na anyị si ná mba dị iche iche, agbụrụ dị iche iche, nweekwa omenala dị iche iche. Anyị na-ahụ otú anyị si hụ ibe anyị n’anya n’ọmụmụ ihe anyị nakwa ná mgbakọ dị iche iche. Ihe a gosiri n’eziokwu na ọ bụ naanị anyị na-efe Jehova otú ọ chọrọ.

14. Dị ka e kwuru ná Ndị Kọlọsi 3:​12-14, olee otu ụzọ dị mkpa anyị ga-esi gosi na anyị ji obi anyị niile hụ ibe anyị n’anya?

14 Baịbụl gwara anyị ka anyị ‘jiri obi anyị niile hụ ibe anyị n’anya.’ (1 Pita 4:8) Otu ụzọ anyị si egosi ibe anyị na anyị hụrụ ha n’anya bụ ịgbaghara ha na idiri ha ihe ndị ha mere anyị n’ihi ezughị okè. Anyị na-achọ ụzọ anyị ga-esi na-emesapụrụ ndị anyị na ha nọ n’ọgbakọ aka, ma ndị nke mejọrọ anyị. (Gụọ Ndị Kọlọsi 3:​12-14.) Ọ bụ ụdị ịhụnanya a ka e ji amata ezigbo Ndị Kraịst.

“OTU OKWUKWE”

15. Olee ụzọ ndị ọzọ anyị si na-efe Chineke otú Ndị Kraịst oge mbụ si fee ya?

15 E nwekwara ụzọ ndị ọzọ otú anyị si efe Chineke taa si yie otú Ndị Kraịst oge mbụ si fee ya. Dị ka ihe atụ, a haziri anyị otú e si hazie ha. Anyị nwere ndị nlekọta sekit, ndị okenye, na ndị ohu na-eje ozi otú ahụ hanwa nwekwara. (Fil. 1:1; Taị. 1:5) Otú ha si were mmekọahụ, alụmdi na nwunye, na ọbara ka anyịnwa sikwa were ya. Otú ha sikwa echebe ọgbakọ ka ndị mmehie na-ekweghị echegharị ghara imebi ya ka anyịnwa sikwa na-eme.​—Ọrụ 15:​28, 29; 1 Kọr. 5:​11-13; 6:​9, 10; Hib. 13:4.

16. Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe e kwuru ná Ndị Efesọs 4:​4-6?

16 Jizọs kwuru na ọtụtụ ndị ga-asị na ha bụ ndị na-eso ụzọ ya. Ma, ọ bụghị ha niile ga-abụ ezigbo ndị na-eso ụzọ ya. (Mat. 7:​21-23) Baịbụl kwukwara na n’oge ikpeazụ, ọtụtụ ndị ga-abụ “ndị na-eme ka hà ji ife Chineke kpọrọ ihe.” (2 Tim. 3:​1, 5) Baịbụl kwuru hoo haa na e nwere “otu okwukwe” Chineke kwadoro.​—Gụọ Ndị Efesọs 4:​4-6.

17. Olee ndị na-eso ụzọ Jizọs ma nwee otu ezigbo okwukwe taa?

17 Ole ndị na-eme ihe gosiri na ha nwere otu ezigbo okwukwe taa? Anyị elebala anya n’ihe ndị gosiri ndị ha bụ, lebakwa anya n’otú Jizọs Kraịst si kụziere anyị ife Chineke, bụ́kwanụ otú Ndị Kraịst oge mbụ si fee ya. Ihe ndị a emeela ka anyị mata azịza ajụjụ ahụ. Ọ bụ naanị Ndịàmà Jehova. Obi dị anyị ụtọ na anyị bụ ndị Jehova, bụrụkwa ndị maara eziokwu gbasara ya na nzube ya. Ka anyị nọgidesie ike na-ejidesi eziokwu ahụ ike.

ABỤ NKE 3 Ị Bụ Ike Anyị, Olileanya Anyị, na Obi Ike Anyị

^ par. 5 N’isiokwu a, anyị ga-amụ otú Jizọs si fee Chineke na otú ndị mbụ soro ụzọ ya si mee ka ya. Anyị ga-elebakwa anya n’ihe ndị gosiri na ọ bụ Ndịàmà Jehova na-efe Chineke otú ahụ n’oge a.

^ par. 9 Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ndị Kraịst Mbụ Hà Kpọrọ Aha Chineke?” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Julaị 1, 2010, peeji nke 6.

^ par. 10 Dị ka ihe atụ, n’afọ 2008, Poopu Benedict XVI nyere iwu ka a ghara ịkpọ aha Chineke na chọọchị Katọlik ma ọ bụ n’ekpere ha ma ọ bụkwanụ dee ya n’abụ ha.

^ par. 63 NKỌWA FOTO: Nzukọ Jehova ewepụtala Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’ihe karịrị narị asụsụ abụọ ka ndị mmadụ nwee ike ịgụ ya n’asụsụ ha. E dekwara aha Chineke na Baịbụl ndị ahụ.