Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Ị Ga-esi Eme Ka Gị na Jehova Dịghachi ná Mma

Otú Ị Ga-esi Eme Ka Gị na Jehova Dịghachi ná Mma

KWA afọ, a na-anabata ọtụtụ atụrụ Jehova a chụrụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Chetụgodịnụ ụdị ọṅụ ‘a na-aṅụrị n’eluigwe’ ma onye nke ọ bụla n’ime ha lọghachi. (Luk 15:​7, 10) Ọ bụrụ na a nabatala gị n’ọgbakọ, obi sie gị ike na obi dị Jizọs, ndị mmụọ ozi, na Jehova ụtọ ịhụ na ị lọghachila n’ọgbakọ. Ma, ka ị na-agbalị ime ka gị na Jehova dịghachi ná mma, e nwere ihe ndị nwere ike ime ka o siere gị ike. Olee ụfọdụ n’ime ha? Gịnịkwa nwere ike inyere gị aka?

OLEE IHE NDỊ NA-EME KA O SIE IKE?

Obi ka na-ada ọtụtụ ụmụnna mbà n’agbanyeghị na a nabatala ha n’ọgbakọ. Chetụgodị otú obi dị Eze Devid. N’agbanyeghị na a gbagharala ya mmehie ya, o kwuru, sị: “Mmehie m anyịgbuola m.” (Ọma 40:12; 65:3) Ọ bụrụ na mmadụ alọghachikwute Jehova, obi ya ka nwere ike ịna-ama ya ikpe ma ọ bụkwanụ ihere ana-eme ya ruo ọtụtụ afọ. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Isabelle * a chụburu n’ọgbakọ ruo ihe karịrị afọ iri abụọ sịrị: “O siiri m ike ikweta na Jehova ga-agbaghara m.” Ọ bụrụ na obi adaa gị mbà, o nwere ike ime ka gị na Jehova ghara ịdị ná mma ọzọ. (Ilu 24:10) Ekwela ka o mee gị.

Ụfọdụ ndị nwere ike ịna-echegbu onwe ha na ha agaghị enwe ike ime ihe niile ha kwesịrị ime ka ha na Jehova dịghachi ná mma. Mgbe a nabatachara otu nwanna aha ya bụ Antoine n’ọgbakọ, ọ sịrị: “M chere na mụ echefuola ọtụtụ ihe m na-eme tupu a chụọ m n’ọgbakọ.” Iche otú a nwere ike ime ka ọtụtụ ndị na-ala azụ n’ime ihe ndị a na-eme n’ofufe Jehova.

Dị ka ihe atụ, e nwee onye ajọ ifufe mebisịrị ụlọ ya, obi nwere ike ịda ya mbà ma o cheta nnukwu ọrụ ọ ga-arụ na oge ọ ga-ewe ya iji rụzie ụlọ ahụ. Ọ bụrụkwa na i mere mmehie dị oké njọ, ya emee ka gị na Jehova ghara ịdị ná mma, i nwere ike iche na ọ ga-efu gị ọtụtụ ihe iji mee ka gị na Jehova dịghachi ná mma. Mana, e nwere ihe ga-enyere gị aka.

Jehova gwara anyị, sị: “Bịanụ ka anyị kpezie.” (Aịza. 1:18) Ị gbaala ezigbo mbọ ka gị na Jehova “kpezie.” Jehova hụrụ gị n’anya maka mbọ ahụ ị gbara. Chegodị ihe a: Otú a ị lọghachikwutere Jehova mere ka Jehova nwee ezigbo ihe ọ ga-azaghachi Ekwensu.​—Ilu 27:11.

Ihe a i mere gosiri na ị bịaruola Jehova nso, yanwa kwekwara nkwa na ọ ga-abịaru gị nso. (Jems 4:8) Ma, ihe dị mkpa abụghị naanị ndị mmadụ ịmata na ị lọghachila n’ọgbakọ. I kwesịrị ịna-eme ihe ndị ga-eme ka ị na-ahụkwu Nna gị na Enyi gị bụ́ Jehova n’anya. Olee otú i nwere ike isi na-eme ya?

KPEBIE IME IHE NDỊ Ị GA-EMELI

Gbalịa kpebie ihe ndị ị ga-emeli. O nwere ike ịbụ na ị na-echeta ihe ndị ị mụtara gbasara Jehova na nkwa ndị o kwere maka ọdịnihu. Ma ugbu a, e nwere ihe ndị ị ga na-eme mgbe niile, dị ka ikwusa ozi ọma, ịga ọmụmụ ihe, na gị na ụmụnna gị ịna-akpakọrịta. Lee ihe ndị ọzọ i nwere ike ịna-eme.

Na-ekpe ekpere mgbe niile. Nna gị nke eluigwe ghọtara na ọ bụrụ na obi gị ka na-ama gị ikpe, o nwere ike ime ka o siere gị ike ikpe ekpere. (Rom 8:26) N’agbanyeghị ya, ‘nọgide na-ekpe ekpere.’ Na-agwa Jehova na ị chọsiri ike ka gị na ya bụrụ enyi. (Rom 12:12) Otu nwanna aha ya bụ Andrej chetara ihe mere ya n’oge gara aga. Ọ sịrị: “Obi m nọ na-ama m ezigbo ikpe, ihere ana-emekwa m. Ma, mgbe ọ bụla m kpere ekpere, obi na-aka eru m ala.” Ọ bụrụ na ị maghị ihe ị ga-ekpe n’ekpere, gụọ ekpere Eze Devid kpere mgbe o chegharịrị n’Abụ Ọma nke 51 na nke 65.

Na-amụchi Baịbụl anya. Ime otú ahụ ga-eme ka okwukwe gị sie ike, meekwa ka ị hụkwuo Jehova n’anya. (Ọma 19:​7-11) Otu nwanna aha ya bụ Felipe sịrị: “Amụchighị Baịbụl anya bụ ihe mbụ mere ka okwukwe m nyụọ ka ọkụ, meekwa ka m mejọọ Jehova. Achọghị m ka ụdị ihe ahụ mee m ọzọ. N’ihi ya, m kpebiri na m ga na-amụchi Baịbụl anya.” I nwekwara ike ime otú ahụ. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata isiokwu ndị ị ga na-amụ, gwa enyi gị ma nke a na-akọ ka o nyere gị aka.

Mee ka gị na ụmụnna gị dịghachi ná mma. Ụfọdụ ndị lọghachiri n’ọgbakọ na-echegbu onwe ha na ndị ọzọ ga na-ele ha anya ọjọọ. Otu nwanna aha ya bụ Larissa sịrị: “Ezigbo ihere nọ na-eme m. M chere na mụ emechuola ụmụnna m ihu. M chere otú a ruo ọtụtụ oge.” Obi sie gị ike na ndị okenye na ụmụnna ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ chọsiri ike inyere gị aka ka gị na Jehova dịghachi ná mma. (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Gịnị Ka Ndị Okenye Nwere Ike Ime?”) Obi dị ha ụtọ na ị lọghachila. Ha chọkwara ka ị na-enwe obi ụtọ.​—Ilu 17:17.

Gịnị ka i nwere ike ime ka gị na ụmụnna gị dịkwuo ná mma? Soro ha na-agachi ọmụmụ ihe anya. Gị na ha na-arụkwa n’ozi ọma. Olee otú ihe a ga-esi nyere gị aka? Otu nwanna aha ya bụ Felix sịrị: “Ndị nọ n’ọgbakọ na-atụsi anya ike ka m lọghachi. O mere ka m mata na ha hụrụ m n’anya. Ha niile nyeere m aka ịlọghachi n’ọgbakọ, ịmata na Jehova hụrụ m n’anya, nakwa ịna-emekwu nke ọma n’ofufe Jehova.”​—Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Gịnị Ka I Nwere Ike Ime?

ADALA MBÀ

Ekwensu ga-anọgide na-ewetara gị nsogbu ndị ọzọ iji mee ka mbọ ị na-agba ka gị na Jehova dịghachi ná mma kụọ afọ n’ala. (Luk 4:13) Dị njikere ime ka okwukwe gị sie ezigbo ike ugbu a.

Jehova kwuru banyere atụrụ ya, sị: “M ga-achọ nke furu efu, dughachite nke kpafuru akpafu, kee ọkpụkpụ nke gbajiri agbaji ákwà, meekwa ka nke ike na-adịghị dị ike.” (Ezik. 34:16) Jehova enyerela ọtụtụ ndị ọzọ aka ka ya na ha dịrị ná mma. Ka obi sie gị ike na ọ chọrọ inyere gị aka ná mbọ ị na-agba ka gị na ya na-adịkwu ná mma.

^ par. 4 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.