Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

1921—Ihe Ndị Mere Otu Narị Afọ Gara Aga

1921—Ihe Ndị Mere Otu Narị Afọ Gara Aga

N’ỤLỌ NCHE January 1, 1921, a jụrụ Ndị Mmụta Baịbụl, sị: “Olee ọrụ anyị na-atụ anya ịrụ n’afọ a?” Iji zaa ajụjụ ahụ, Ụlọ Nche ahụ kwuru ihe dị n’Aịzaya 61:​1, 2, ebe chetaara ha na e nyere ha ọrụ ikwusa ozi ọma. Ọ sịrị: “Jehova tere m mmanụ izi ndị dị umeala n’obi ozi ọma. . . . Ka m kwusaa afọ Jehova na-emere ndị mmadụ amara na ụbọchị Chineke anyị ga-akwụ ndị iro ya ụgwọ.”

NDỊ NA-EKWUSA OZI ỌMA N’ATỤGHỊ ỤJỌ

Iji nwee ike ịrụ ọrụ a nke ọma, Ndị Mmụta Baịbụl ga-abụ ndị na-anaghị atụ ụjọ. Ha ga-ekwusara ndị dị umeala n’obi “ozi ọma,” kwusaakwara ndị ajọ omume “ụbọchị Chineke anyị ga-akwụ ndị iro ya ụgwọ.”

Nwanna J. H. Hoskin bi na Kanada kwusara ozi ọma n’atụghị ụjọ n’agbanyeghị mkpagbu. N’ihe dị ka n’ọnwa Eprel afọ 1921, o zutere otu onye ụkọchukwu chọọchị Metọdist. Nwanna Hoskin sịrị ya, “Anyị kwesịrị iji obiọma kwurịta ihe dị na Baịbụl. Ọ bụrụgodị na e nwere ihe ụfọdụ anyị na-ekwekọrịtaghị na ya, o kwesịghị ime ka anyị gharazie ịbụ enyi.” Ma ihe ahụ o kwuru emezughị. Nwanna Hoskin kwuru, sị: “Obere oge mụ na ụkọchukwu ahụ kwuru okwu, o ji iwe kwachie ụzọ nke mere ka m chee na ugegbe dị n’ụzọ ahụ ga-akụwa.”

Ụkọchukwu ahụ ji iwe jụọ m, sị: “Gịnị mere ị gaghị agakwuru ndị na-abụghị Ndị Kraịst zie ha ozi ọma.” Nwanna Hoskin gbara ya nkịtị. Ma, ka Nwanna Hoskin na-apụ, ọ sịrị n’obi ya: “Ọ dịdị ka ị̀ bụ otu n’ime ha.”

N’echi ya, mgbe ụkọchukwu ahụ na-ekwu okwuchukwu ya, ọ nọgidere na-akatọ nwanna ahụ. Nwanna Hoskin kwuru, sị: “Ọ gwara ndị chọọchị ya na m bụ ezigbo onye ụgha e kwesịrị igbu egbu.” Ma ihe a emeghị ka Nwanna Hoskin tụọ ụjọ. Ọ nọgidere na-ekwusa ozi ọma. Ihe gazikwaara ya. Ọ sịrị: “Ikwusa ozi ọma n’ebe ahụ tọrọ m ezigbo ụtọ. Ụfọdụ ndị ebe ahụ kwuru sị, ‘Anyị ma na ị bụ onye nke Chineke.’ Ha kwukwara na ha ga-enye m ihe ọ bụla dị m mkpa.”

ỊMỤ IHE NA OFUFE EZINỤLỌ

Iji nyere ndị nwere mmasị aka ka ha nọgide na-eme nke ọma, Ndị Mmụta Baịbụl bipụtara ihe ndị ha ga-eji na-amụ Baịbụl n’akwụkwọ bụ́ The Golden Age. * E nwere ajụjụ ndị nne na nna ga-eji na-akụziri ụmụ ha ihe n’akwụkwọ ahụ. Ndị nne na nna “ga-ajụ ụmụ ha ajụjụ ndị a ma nyere ha aka ịchọta ebe azịza ya dị na Baịbụl.” Ụfọdụ n’ime ajụjụ ndị ahụ bụ, “Akwụkwọ ole ka e nwere na Baịbụl?” Ụdị ajụjụ ndị a ga-akụziri ha eziokwu ndị na-ataghị akpụ gbasara Baịbụl. Ajụjụ ndị ọzọ dị ka, “Onye Kraịst ò kwesịrị ịtụ anya na e nwere ike ịkpagbu ya?” na-akwadebe ụmụaka ndị ahụ ịbụ ndị nkwusa na-anaghị atụ ụjọ.

E nwekwara ajụjụ ndị ọzọ gbasara Baịbụl ga-enyere Ndị Mmụta Baịbụl aka. E nwekwara ike ịchọta azịza ha na mpịakọta nke mbụ nke akwụkwọ bụ́ Studies in the Scriptures. Ihe a baara ọtụtụ puku ndị na-agụ ya uru. Ma, The Golden Age nke December 21, 1921, kwuru na a ga-akwụsị ibipụta ajụjụ na azịza ndị a. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị?

AKWỤKWỌ ỌHỤRỤ

Akwụkwọ The Harp of God

Kaadị e ji agụ akwụkwọ The Harp of God

Kaadị ahụ e dere ajụjụ

Ndị na-edu ndú n’ọgbakọ Jehova chọpụtara na ndị malitere ịmụ Baịbụl ọhụrụ kwesịrị inwe ụzọ a haziri ahazi ha ga-esi na-amụ ihe ndị na-ataghị akpụ dị na Baịbụl. N’ihi ya, ha wepụtara akwụkwọ bụ́ The Harp of God na Nọvemba afọ 1921. A na-edeba aha ndị nwere mmasị natara akwụkwọ a n’akwụkwọ ka ha nwee ike iji ya na-amụ Baịbụl n’onwe ha. Ịmụ akwụkwọ a ga-enyere ha aka ịmata otú Chineke ga-esi eme ka ụmụ mmadụ nweta ndụ ebighị ebi. Olee otú ha ga-esi na-amụ ya?

Ọ bụrụ na mmadụ anata akwụkwọ ahụ, a ga-enye ya obere kaadị e dere ebe ọ ga-agụ. N’izu na-eso ya, a ga-enye ya kaadị ọzọ e dere ajụjụ ndị ọ ga-eji ihe ọ gụrụ zaa. Ná ngwụcha kaadị ahụ, ọ ga-ahụ ihe ndị ọ ga-agụ n’izu na-esonụ.

Kwa izu, ruo izu iri na abụọ, ndị ọgbakọ nọ ebe onye ahụ bi na-ezigara ya kaadị ahụ. Ọtụtụ mgbe, ndị na-ezite kaadị ahụ bụ ụmụnna katarala ahụ́ ma ọ bụkwanụ ndị na-anaghị agali ozi ụlọ n’ụlọ. Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Anna K. Gardner bi na Milvale, Pensụlvenịa, dị n’Amerịka kwuru, sị: “Mgbe e wepụtara akwụkwọ The Harp of God, o mere ka nwanne m nwaanyị ọ na-esiri ike ịga ije aha ya bụ Thayle nwekwuo ihe ọ ga na-eme. Ọ na-ezigara ndị mmadụ kaadị ahụ e dere ajụjụ na ya kwa izu.” Ọ bụrụ na onye ahụ agụchaa akwụkwọ ahụ, ndị nkwusa na-aga na nke ya iji nyere ya aka ịmụtakwu ihe ndị ọzọ na Baịbụl.

Ebe Nwanna Nwaanyị Thayle Gardner nọ n’ígwè ndị ngwọrọ

ỌRỤ A GA-ARỤ

Ná ngwụcha afọ ahụ, Nwanna J. F. Rutherford zigaara ọgbakọ niile akwụkwọ ozi. N’akwụkwọ ozi ahụ, ọ gwara ha na “otú e si kwusaa ozi ọma n’ọtụtụ ebe n’afọ ahụ nakwa otú o si nyere ndị mmadụ aka karịrị nke afọ ndị gara aga.” O kwukwara, sị: “Ihe a ka ga-arụ ka buru nnọọ ezigbo ibu. Gbaanụ ndị ọzọ ume ka ha tinye aka iji hụ na ozi ọma a na-aga n’ihu.” O doro anya na ndị mmụta Baịbụl mere ihe a o kwuru. Ha ga-eji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke n’atụghị ụjọ n’afọ 1922 karịa otú ha metụrụla mbụ.

^ par. 9 N’afọ 1937, a gbanwere aha The Golden Age ka ọ bụrụ Consolation, malitekwa ịkpọ ya Awake! n’afọ 1946.