Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 47

Olee Otú Okwukwe Gị Ga-esiru n’Ike?

Olee Otú Okwukwe Gị Ga-esiru n’Ike?

Obi alọla unu mmiri. Nweenụ okwukwe.”—JỌN 14:1.

ABỤ NKE 119 Ka Anyị Nwee Okwukwe

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee ajụjụ anyị nwere ike ịjụ onwe anyị?

È NWERE mgbe ụfọdụ ị na-echegbu onwe gị gbasara ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu, dị ka, mgbe a ga-ebibi okpukpe ụgha, mgbe Gọg nke Megọg ga-awakpo ndị Chineke, nakwa agha Amagedọn? È nwetụla mgbe ị jụrụ onwe gị, sị: ‘M̀ ga-edili ihe ndị ga-eme n’oge ahụ ma nọgide na-erubere Chineke isi?’ Ọ bụrụ na i chetụla otú ahụ, ihe Jizọs kwuru n’amaokwu Baịbụl e si nweta isiokwu a ga-abara gị ezigbo uru. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Obi alọla unu mmiri. Nweenụ okwukwe.” (Jọn 14:1) Okwukwe siri ike ga-enyere anyị aka iji obi ike die ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu.

2. Olee otú anyị ga-esi mee ka okwukwe anyị sikwuo ike, oleekwa ihe ndị anyị ga-eleba anya na ha n’isiokwu a?

2 Ọ bụrụ na anyị echee ihe ndị anyị na-eme ugbu a ma nsogbu bịara anyị, ọ ga-enyere anyị aka ịma ihe ndị anyị ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike maka nsogbu ndị ga-abịara anyị n’ọdịnihu. Ọ bụrụ na anyị emerie nsogbu ọ bụla bịaara anyị, okwukwe anyị na-esikwu ike. Ọ ga-enyere anyị aka idi ọnwụnwa ndị ga-abịara anyị n’ọdịnihu. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya ná nsogbu anọ bịaara ndị na-eso ụzọ Jizọs nke mere ka a mara na ha kwesịrị ime ka okwukwe ha sikwuo ike. Anyị ga-elebazi anya n’otú ụdị nsogbu ahụ nwere ike isi bịara anyị nakwa ihe anyị ga-eme ugbu a iji kwadebe maka ọdịnihu.

INWE OKWUKWE NA CHINEKE GA-EGBORO ANYỊ MKPA ANYỊ

Ihe nwere ike isiri anyị ike, ma okwukwe anyị ga-enyere anyị aka ibute ihe ndị gbasara Alaeze Chineke ụzọ ná ndụ anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3 ruo na nke 6)

3. Dị ka e kwuru na Matiu 6:30, 33, olee ihe Jizọs mere ka o doo anya gbasara okwukwe?

3 Onyeisi ezinụlọ ọ bụla na-achọ inweta ihe ga-ezuru ya na ezinụlọ ya, dị ka, nri, uwe, nakwa ebe ha ga-ebi. Ihe a anaghị adịcha mfe mgbe niile n’oge ikpeazụ a. Mgbe ụfọdụ, e nwere ike ịchụ ụmụnna anyị n’ọrụ n’agbanyeghị na ha na-arụsi ọrụ ike, ya esiekwara ha ike inweta ọrụ ọzọ. Ụfọdụ ajụla ịrụ ọrụ ụfọdụ n’ihi na Onye Kraịst ekwesịghị ịrụ ha. Ụdị ihe a mee, anyị kwesịrị inwe okwukwe na Chineke ga-egboro anyị na ezinụlọ anyị mkpa anyị. Jizọs mere ka nke a doo anya n’Ozizi Elu Ugwu. (Gụọ Matiu 6:30, 33.) Ọ bụrụ na obi esie anyị ezigbo ike na Jehova agaghị ahapụ anyị, ọ ga-eme ka anyị lekwasị anya n’ihe ka mkpa, ya bụ, n’Alaeze Chineke. Ọ bụrụ na anyị achọpụta otú Jehova si egboro anyị mkpa anyị, ọ ga-eme ka anyị bịarukwuo ya nso, okwukwe anyị esikwuokwa ike.

4-5. Olee ihe nyeere otu ezinụlọ aka mgbe ha na-echegbu onwe ha maka otú ha ga-esi gboo mkpa ha?

4 Ka anyị hụ otú Jehova si nyere otu ezinụlọ bi na Venezuela aka mgbe ha nọ na-echegbu onwe ha maka otú ha ga-esi enweta ihe ndị dị ha mkpa. E nwere mgbe ezinụlọ Nwanna Miguel na-enweta ihe ndị dị ha mkpa n’ugbo ha na-akọ. Ma, ndị omekome mechara weghara ala ha na-akọ ugbo ma chụpụ ha na ya. Nwanna Miguel sịrị: “Ugbu a, ọ bụ ihe anyị rụtara n’obere ala na-abụghị nke anyị ka anyị jizi na-egbo mkpa anyị. N’ụbọchị ọ bụla, m na-ebu ụzọ rịọ Jehova ka o gbooro anyị mkpa anyị n’ụbọchị ahụ.” Ihe siiri ezinụlọ Nwanna Miguel ike, ma, ha tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-egboro ha mkpa ha kwa ụbọchị. N’ihi ya, ha na-agachi ọmụmụ ihe na ozi ọma anya. Ha na-ebute ihe gbasara Alaeze Chineke ụzọ ná ndụ ha. Jehova na-egbokwara ha mkpa ha.

5 N’oge ahụ ihe na-esiri Nwanna Miguel na ezinụlọ ya ike, ya na nwunye ya aha ya bụ Yurai lekwasịrị anya n’otú Jehova si elekọta ha. Mgbe ụfọdụ, Jehova na-eme ka ụmụnna nye ha ihe ụfọdụ dị ha mkpa ma ọ bụkwanụ nyere Miguel aka ịchọta ọrụ. N’oge ndị ọzọ, Jehova si n’aka alaka ụlọ ọrụ gbatara ha ọsọ enyemaka. Jehova agbahapụghị ha. Ihe a mere ka okwukwe ezinụlọ Nwanna Miguel siekwa ike. Mgbe ada ha aha ya bụ Yoselin kọchara otú Jehova si nyere ha aka n’otu oge, ọ sịrị: “Ọ na-agba anyị ume ịhụ otú Jehova si enyere anyị aka. M na-ewerezi Jehova ka Enyi m m nwere ike ịtụkwasị obi ná ndụ m niile.” Ọ sịkwara: “Nsogbu ndị bịaara ezinụlọ anyị akwadebela anyị maka nsogbu ndị ka taa akpụ ga-abịara anyị n’ọdịnihu.”

6. Olee otú i nwere ike isi mee ka okwukwe gị sikwuo ike ma ihe na-esiri gị ike?

6 Ihe ọ̀ na-esiri gị ike? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ dịghịrị gị mfe. N’agbanyeghị ya, ị ka nwere ike iji oge a mee ka okwukwe gị sikwuo ike. Kpee ekpere ma gụọ ihe Jizọs kwuru na Matiu 6:25-34, tụgharịakwa uche na ya. Cheekwa gbasara ihe ụfọdụ mere n’oge anyị a gosiri na Jehova na-egboro ndị butere Alaeze ya ụzọ mkpa ha. (1 Kọr. 15:58) Ime otú ahụ ga-eme ka obi sie gị ike na Jehova ga-enyere gị aka otú ahụ o si nyere ha aka. Ọ ma ihe dị gị mkpa, marakwa otú ọ ga-esi emere gị ya. Ka ị na-ahụ na Jehova na-enyere gị aka ná ndụ gị, okwukwe i nwere n’ebe ọ nọ ga-esikwu ike, ọ ga-enyekwara gị aka ka i nwee ike idi ọnwụnwa ndị ka taa akpụ n’ọdịnihu.—Hab. 3:17, 18.

OKWUKWE GA-ENYERE ANYỊ AKA IDI NSOGBU NDỊ DỊ KA “OKÉ IFUFE”

Okwukwe siri ike anyị nwere ga-enyere anyị aka imeri nsogbu ndị yiri oké ifufe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7 ruo na nke 11)

7. Dị ka e kwuru na Matiu 8:23-26, olee otú “oké ifufe” si mee ka a mata ma ndị na-eso ụzọ Jizọs hà nwere okwukwe?

7 Mgbe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya ji ụgbọ mmiri na-eme njem, oké ifufe malitere ife. Jizọs ji ihe mere mgbe ahụ kụziere ha ebe ọ dị ha mkpa inwekwu okwukwe. (Gụọ Matiu 8:23-26.) Mgbe oké ifufe ahụ nọ na-efesi ike, mmiri ana-abatakwa n’ụgbọ ahụ, Jizọs nọ na-ehiri ụwa ya ụra. Ụjọ jidere ndị na-eso ụzọ ya, ha akpọtee ya ma gwa ya ka ọ zọpụta ha. Onyenwe anyị jụrụ ha, sị: “Gịnị mere ụjọ ji na-atụ unu, unu ndị okwukwe nta?” Ndị na-eso ụzọ ya ahụ ụjọ ji kwesịrị ịma na Jehova ga-echebeli Jizọs na ndị ya na ha nọ. Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ a? Ezigbo okwukwe nwere ike inyere anyị aka idi nsogbu ọ bụla nwere ike iyi “oké ifufe.”

8-9. Olee nsogbu bịaara Nwanna Nwaanyị Anel, gịnịkwa nyeere ya aka?

8 Chegodị ihe mere otu nwanna nwaanyị na-alụbeghị di bi na Pueto Riko aha ya bụ Anel. Nsogbu tara akpụ o diri mere ka okwukwe ya sikwuo ike. Nsogbu ya bidoro n’afọ 2017 mgbe oké ifufe mebiri ụlọ ya, meekwa ka ọ gharazie inwe ọrụ. Ọ sịrị: “N’oge ndị ahụ ihe siiri m ike, m nọ na-echegbu onwe m. Ma, ekpere nyeere m aka ịtụkwasị Jehova obi, nyekwara m aka ịghara ikwe ka nchegbu mee ka m ghara ime ihe ndị m kwesịrị ime.”

9 Anel kwuru na ihe ọzọ nyeere ya aka ná nsogbu ya bụ irube isi. Ọ sịrị: “Ịna-eme ihe ọ bụla nzukọ Jehova kwuru mere ka obi ruo m ala. Ahụrụ m otú Jehova si nyere m aka mgbe ụmụnna gbara m ume nakwa mgbe ha nyere m ihe ndị dị m mkpa.” Ọ sịkwara: “Jehova nyere m ihe karịrị ihe m rịọrọ ya, meekwa ka okwukwe m sie ezigbo ike.”

10. Gịnị ka i nwere ike ime ma ọ bụrụ na nsogbu yiri “oké ifufe” abịara gị?

10 È nwere nsogbu gị na ya na-alụ yiri “oké ifufe”? O nwere ike ịbụ nsogbu ọdachi ndị na-emere onwe ha kpataara gị ma ọ bụkwanụ na ọrịa mere ka ị daa mbà, meekwa ka ị ghara ịma ihe ị ga-eme eme. I nwere ike ịna-echegbu onwe gị mgbe ụfọdụ. Ma, ekwekwala ka o mee ka ị kwụsị ịtụkwasị Jehova obi. Na-ekpesi ekpere ike ka i nwee ike ịbịaru Jehova nso. Na-atụgharịkwa uche n’otú Jehova si nyere gị aka n’oge ndị gara aga ka o mee ka okwukwe gị sikwuo ike. (Ọma 77:11, 12) Obi kwesịrị isi gị ike na Jehova agaghị ahapụ gị ma ugbu a ma n’ọdịnihu.

11. Gịnị mere anyị kwesịrị iji kpebisie ike ịna-erubere ndị na-edu ndú ná nzukọ Jehova isi?

11 Olee ihe ọzọ ga-enyere gị aka idi ọnwụnwa? Dịkwa ka Anel kwuru, ọ bụ irube isi. Mụta ịtụkwasị ndị Jehova na Jizọs tụkwasịrị obi obi. Mgbe ụfọdụ, ndị na-edu ndú n’ọgbakọ Jehova nwere ike ịgwa anyị mee ihe nwere ike iyi anyị ihe na-enweghị isi. Ma, Jehova na-agọzi ndị na-erubere ya isi. Okwu ya na ihe ndị ụmụnna anyị kọrọ gosiri na irubere Jehova isi na-echebe anyị. (Ọpụ. 14:1-4; 2 Ihe 20:17) Na-atụgharị uche n’ụdị akụkọ ndị a. Ọ ga-enyere gị aka ikpebisikwu ike ime ihe ọ bụla nzukọ Jehova gwara anyị mee ma ugbu a ma n’ọdịnihu. (Hib. 13:17) Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, o nweghị ihe ọ bụla ga-eme ka ụjọ bịa gị maka oké mkpagbu ga-abịa n’ọdịnihu.—Ilu 3:25.

OKWUKWE GA-ENYERE ANYỊ AKA MGBE A NA-EKPE ANYỊ IKPE NA-EZIGHỊ EZI

Ikpesi ekpere ike ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12)

12. Olee otú Luk 18:1-8 si gosi ihe jikọrọ inwe okwukwe na ịtachi obi mgbe e kpere anyị ikpe na-ezighị ezi?

12 Jizọs ma na ikpe na-ezighị ezi juru n’ụwa ga-eme ka a mata ma ndị na-eso ụzọ ya hà nwere okwukwe. Iji nyere ha aka, o meere ha ihe atụ e dere n’akwụkwọ Luk. Jizọs kọọrọ ha gbasara otu nwaanyị di ya nwụrụ na-arịọ otu ọkàikpe na-anaghị atụ egwu Chineke ka o kpeere ya ikpe ziri ezi. Obi siri ya ike na mgbalị ya agaghị efu ọhịa. Mgbe e mechara, ọkàikpe ahụ gere ya ntị. Gịnị ka anyị na-amụta? Jehova anaghị ekpe ikpe na-ezighị ezi. Ọ bụ ya mere Jizọs ji sị: “Ebe ọ bụ na Chineke na-enwere ndị ọ họọrọ ndidi, bụ́ ndị na-etiku ya ehihie na abalị, ọ̀ bụ na ọ gaghị eme ka e kpeere ha ikpe ziri ezi?” (Gụọ Luk 18:1-8.) Jizọs kwukwara sị: “Mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịarute, ọ̀ ga-ahụ ndị nwere okwukwe n’ụwa?” Ọ bụrụ na a na-ekpe anyị ikpe na-ezighị ezi, anyị kwesịrị ịna-enwe ndidi ma na-arịọsi Jehova arịrịọ ike iji gosi na anyị nwere okwukwe siri ike ka nwaanyị ahụ di ya nwụrụ. Okwukwe dị otú ahụ ga-eme ka obi sie anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka. Obi kwesịkwara isi anyị ike na ekpere na-akpa ike. Mgbe ụfọdụ, e nwere ike ịza anyị ekpere anyị otú anyị na-atụghị anya ya.

13. Olee otú ekpere si nyere otu ezinụlọ aka?

13 Ka anyị lee ihe mere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Vero bi na Kongo Kinshasa. Ya na di ya na-abụghị Onyeàmà Jehova na nwa ha nwaanyị dị afọ iri na ise si n’obodo ha gbapụ mgbe ndị amị wakporo obodo ha. Mgbe ha na-agbapụ, ha rutere n’ebe ndị amị nọ, ha ejichie ha ma kwuo na a ga-egbu ha. Mgbe Nwanna Nwaanyị Vero malitere ibe ákwá, nwa ya nwaanyị gbalịrị ịkasi ya obi ma kpee ekpere n’olu dara ụda, na-akpọkwa aha Jehova n’ekpere ya ahụ. Mgbe o kpechara, onyeisi ndị amị ahụ jụrụ ya, sị: “Nne, ònye kụziiri gị ikpe ekpere?” Ọ zara ya, sị: “Ọ bụ mama m. O ji ihe e dere na Matiu 6:9-13 kụziere m ya.” Onyeisi ndị amị ahụ sịrị ya: “Nne, gị na mama gị na papa gị lawa. Ka Jehova bụ́ Chineke unu chebe unu.”

14. Olee ihe ndị nwere ike ime ka a mata ma ànyị nwere okwukwe, oleekwa ihe ga-enyere anyị aka idi ha?

14 Ụdị akụkọ a na-akụziri anyị ịghara ịna-eleda uru ekpere na-aba anya. Ma, ọ bụrụkwanụ na a zaghị ekpere anyị ozugbo ma ọ bụ n’ụzọ pụrụ iche? Dịkwa ka nwaanyị ahụ di ya nwụrụ Jizọs ji mee ihe atụ, nọgide na-ekpe ekpere. Ka obi sie gị ike na Chineke anyị agaghị ahapụ gị nakwa na mgbe oge ruru, ọ ga-aza gị ekpere. Nọgide na-arịọ Jehova ka o nye gị mmụọ ya. (Fil. 4:13) Cheta na n’oge na-adịghị anya, Jehova ga-agọzi gị nke ukwuu otú ga-eme ka i chefuo ahụhụ niile ị tara. Ọ bụrụ na Jehova enyere gị aka idi nsogbu ndị na-abịara gị taa, ọ ga-eme ka okwukwe gị sie ike maka nsogbu ndị ka ga-abịa n’ọdịnihu.—1 Pita 1:6, 7.

OKWUKWE GA-ENYERE GỊ AKA IDI NSOGBU NDỊ YIRI UGWU

15. Dị ka e kwuru na Matiu 17:19, 20, olee ihe siiri ndị na-eso ụzọ Jizọs ike ime?

15 Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya na okwukwe ga-enyere ha aka idi nsogbu ndị yiri ugwu. (Gụọ Matiu 17:19, 20.) O nwere oge ndị na-eso ụzọ ya na-enweghị ike ịchụpụ otu mmụọ ọjọọ n’agbanyeghị na ha na-emebu otú ahụ. Gịnị kpatara ya? Jizọs gwara ha na ha chọkwuru okwukwe. Ọ gwara ha na ọ bụrụ na ha enwee okwukwe siri ike na ha ga-enwe ike imeri nsogbu ndị yiri ugwu. Taa, anyị nwekwara ike inwe nsogbu ndị nwere ike ịdị anyị ka anyị agaghị emerili ha.

Anyị nwere ike ịna-eru uju, ma, okwukwe anyị ga-enyere anyị aka ịnọgide na-efe Jehova (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)

16. Olee otú okwukwe Geydi si nyere ya aka idi ọnwụ di ya?

16 Legodi ihe mere otu nwanna nwaanyị onye Gụatemala aha ya bụ Geydi. E gburu di ya aha ya bụ Edi mgbe ha si ọmụmụ ihe na-alọta. Olee otú okwukwe Geydi si nyere ya aka idi ọnwụ di ya? Ọ sịrị: “Ekpere nyeere m aka ibunye Jehova nsogbu m. O mere ka obi ruo m ala. Ahụrụ m na Jehova si n’aka ezinụlọ m na ndị enyi m n’ọgbakọ nyere m aka. Ịna-eme ihe ndị a na-eme n’ofufe Jehova enyerela m aka idi ya, meekwa ka m ghara ịna-echegbu onwe m maka echi. Ihe a mere m mere ka m mụta na n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla nwere ike ịbịara m n’ọdịnihu, Jehova, Jizọs, na ọgbakọ ya ga na-enyere m aka idi ya.”

17. Gịnị ka i nwere ike ime ma nsogbu ndị yiri ugwu bịara gị?

17 Mmadụ ọ̀ nwụnahụrụ gị? Wepụta oge gụọ akụkọ Baịbụl ndị kwuru gbasara ndị a kpọlitere n’ọnwụ ka o mee ka obi sie gị ike na Chineke ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Ọ̀ na-ewute gị na a chụrụ onye ezinụlọ gị n’ọgbakọ? Wepụta oge mụọ ihe ka obi sie gị ike na otú Jehova si adọ anyị aka ná ntị bụ otú kacha mma. N’agbanyeghị nsogbu ọ bụla bịaara gị, were ya ka ohere i nwere iji mee ka okwukwe gị sikwuo ike. Gwa Jehova otú obi dị gị. Anọpụla iche. Kama, soro ụmụnna gị na-akpakọrịta. (Ilu 18:1) Na-eme ihe ndị ga-enyere gị aka ịna-edi nsogbu gị, ọ bụrụgodị na anya mmiri nwere ike ịna-agba gị ma i cheta ihe mere gị. (Ọma 126:5, 6) Na-agachi ọmụmụ ihe na ozi ọma anya, na-amụchikwa Baịbụl anya. Na-eche ihe ọma ndị Jehova ga-emere gị n’ọdịnihu. Ka ị na-ahụ otú Jehova si enyere gị aka, okwukwe i nwere n’ebe ọ nọ ga-esikwu ike.

“MEE KA ANYỊ NWEKWUO OKWUKWE”

18. Ọ bụrụ na ị chọpụta na e nwere ebe okwukwe gị na-esichaghị ike, gịnị ka i nwere ike ime?

18 Ọ bụrụ na nsogbu ndị bịaara gị n’oge gara aga ma ọ bụ ugbu a egosi na e nwere ebe okwukwe gị na-esichaghị ike, ike agwụla gị. Were ya ka ohere ị ga-eji mee ka okwukwe gị sikwuo ike. Rịọ ụdị arịrịọ ahụ ndị na-eso ụzọ Jizọs rịọrọ. Ha rịọrọ ya, sị: “Mee ka anyị nwekwuo okwukwe.” (Luk 17:5) Ihe ọzọ ga-enyekwara gị aka bụ iche gbasara ndị a kọrọ akụkọ ha n’isiokwu a. Na-echeta oge niile Jehova nyeere gị aka otú ahụ Miguel na Yurai mere. Na-ekpesi ekpere ike, karịchaa, mgbe ọnwụnwa bịara otú ahụ nwa Nwanna Nwaanyị Vero na Anel mere. Cheta na Jehova nwere ike isi n’aka ndị enyi gị na n’aka ndị ezinụlọ gị nyere gị aka otú ahụ o meere Geydi. Ọ bụrụ na i kwe ka Jehova nyere gị aka idi nsogbu ndị na-abịara gị ugbu a, obi ga-esikwu gị ike na ọ ga-enyere gị aka idi nsogbu ndị ga-abịara gị n’ọdịnihu.

19. Olee ihe obi siri Jizọs ike na ya, oleekwa ihe obi kwesịrị isi gị ike na ya?

19 Jizọs nyeere ndị na-eso ụzọ ya aka ịmata ebe ha chọkwuru okwukwe. Ma, o meghị ya obi abụọ na Jehova ga-enyere ha aka imeri ọnwụnwa ndị ga-abịara ha n’ọdịnihu. (Jọn 14:1; 16:33) Obi siri ya ike na e nwere oké ìgwè mmadụ okwukwe ha ga-enyere aka ịgafe oké mkpagbu na-abịanụ. (Mkpu. 7:9, 14) Ị̀ ga-eso na ha? N’ebere Jehova, ị ga-eso ma ọ bụrụ na ị na-eme ihe niile i nwere ike ime ugbu a iji mee ka okwukwe gị sie ezigbo ike.—Hib. 10:39.

ABỤ NKE 118 “Nyere Anyị Aka Ka Okwukwe Anyị Sie Ike”

^ par. 5 Anyị niile na-atụ anya mgbe a ga-ebibi ụwa ọjọọ Ekwensu a. Ma mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ịna-eche ma okwukwe anyị ọ̀ ga-esi ike idi ihe ndị ga-eme tupu mgbe ahụ. N’isiokwu a, anyị ga-ekwu gbasara ụfọdụ ndị, kwuokwa ihe ndị anyị ga-amụta n’aka ha ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike.