Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NDỤ

M Nọ Na-achọ Ihe Ga-eme Ka Ndụ M Nwee Isi

M Nọ Na-achọ Ihe Ga-eme Ka Ndụ M Nwee Isi

MGBE m nọ na-eme njem n’etiti Oké Osimiri Mediterenian, o riri m ọnụ ịchọpụta na ụgbọ mmiri m mere ochie m nọ na ya nwere ebe ọ gbapuru agbapu nnukwu mmiri si na ya na-abata n’ụgbọ ahụ. Oké ifufe fekwara, ụjọ ejide m nke na m kpere ekpere nke mbụ ya kemgbe ọtụtụ afọ. Olee otú m si banye ná nsogbu a? Ka m bido n’isi kọọrọ unu.

Mgbe m dị afọ asaa, anyị bi na Brazil

A mụrụ m na Nedalandz n’afọ 1948. N’afọ na-eso ya, ezinụlọ anyị kwagara Saụ Paụlo dị na Brazil. Ndị mụrụ m na-ekpesi chọọchị ike. Anyị na-agụkwa Baịbụl kwa ụbọchị ma anyị richaa nri abalị. Anyị mechara kwaga Masachusets dị n’Amerịka n’afọ 1959.

Papa m na-arụsi ọrụ ike iji lekọta ezinụlọ anyị dị mmadụ asatọ. Ọrụ ndị papa m rụrụ bụ ịrụ okporo ụzọ na ịna-aga ebe dị iche iche ere ahịa. Ọ rụkwara n’ọdụ ụgbọelu. Obi tọrọ anyị niile ụtọ mgbe ahụ ọ na-arụ n’ọdụ ụgbọelu n’ihi na o mere ka anyị nwee ike ịga ebe dị iche iche.

Mgbe m nọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị, m na-ajụkarị, sị, ‘Olee ihe m ga-eme ma m too?’ Ụfọdụ ndị enyi m kpebiri ịga mahadum, ndị ọzọ abanye amị. Ma, o nwetụdịghị mgbe m chọrọ ịbanye amị n’ihi na anaghị m achọ ka mụ na mmadụ see okwu ma ya fọdụzie ịbịa lụwa ọgụ. M kpebiri ịga mahadum ka m ghara ịbanye amị. Ma, n’ime obi m, ihe m chọrọ ime bụ inyere ndị ọzọ aka n’ihi na m chere na ọ ga-eme ka ndụ m nwee isi.

MGBE M BANYERE MAHADUM

M nọ na-achọ ihe ga-eme ka ndụ m nwee isi ruo ọtụtụ afọ

Na mahadum, ịmụ gbasara otú ndụ si malite tọrọ m ụtọ n’ihi na m chọrọ ịmata otú ndụ si malite. A kụziiri anyị evolushọn, chọọkwa ka anyị niile kweta na ọ bụ eziokwu. Ma n’anya m, ihe ụfọdụ ha na-akụzi na ya anaghị edo anya. Ọ chọrọ ka mmadụ kweta ihe a na-ejighị n’aka nke na-abụkwaghịnụ otú e si akụzi sayensị.

A kụzirighị anyị ihe dị iche n’ihe ọma na ihe ọjọọ n’ụlọ akwụkwọ. Kama, ihe a na-akụrụ anyị ka ekwe bụ ime ihe niile anyị nwere ike ime ka anyị jiri asambodo dị mma pụta. Ịga oriri na nkwarị na ịṅụ ọgwụ ọjọọ mere ka m na-enwe obi ụtọ. Ma obi ụtọ ahụ bụ naanị nwa oge. M nọ na-eche, sị, ‘Ndụ a m na-ebi ò nwere isi?’

M mechara kwaga Bọstin banye mahadum dị n’ebe ahụ. M na-arụ ọrụ ma anyị gaa ezumike ka m nwee ike inweta ego m ga-eji akwụ ụgwọ akwụkwọ. Ọ bụ n’oge ahụ ka m hụrụ Ndịàmà Jehova nke mbụ ya. E nwere onye ọrụ anyị gwara m gbasara amụma e buru maka “oge asaa” na Daniel isi anọ ma kọwaara m na anyị bi n’oge ikpeazụ. (Dan. 4:13-17) M chọpụtara ozugbo na ọ bụrụ na mụ na ya anọgide na-ekwurịta okwu, mụ ejirikwa ihe ọ na-agwa m kpọrọ ihe, ọ ga-eme ka m gbanwee otú m si ebi ndụ. N’ihi ya, m mere ike m niile iji gbaara ya ọsọ.

Mgbe m nọ na mahadum, m mụrụ ihe ndị ga-akwadebe m maka iwepụta onwe m inyere ndị mmadụ aka n’Ebe Ndịda Amerịka. M chere na inyere ndị nọ ná mkpa aka ga-eme ka ndụ m nwee isi. Ma, m mechara chọpụta na ihe a emeghị ka ndụ m nwee isi. O wutere m, mụ esi na mahadum pụta.

OTÚ M SI CHỌỌ IHE GA-EME KA NDỤ M NWEE ISI NÁ MBA NDỊ DỊ ANYA

N’ọnwa Mee afọ 1970, m kwagara Amstadam dị na Nedalandz ka m gaa rụọ ọrụ n’ọdụ ụgbọelu ahụ papa m rụburu. Ọrụ a mere ka m gaa ebe dị iche iche, gaa mba ndị dị ka, Afrịka, Amerịka na Mba Ndị Gbara Ya Gburugburu, Yurop, na Eshia. Ọ dịghị anya mụ achọpụta na n’obodo ọ bụla m gara, a na-enwe nsogbu ha na ndị obodo ahụ na-alụ. O nwekwaghị nke yiri ihe a ga-emeli ihe ọ bụla maka ya. M ka chọkwara iji ndụ m eme ihe bara uru. N’ihi ya, m kpebiri ịlaghachi Amerịka banye na mahadum ahụ dị na Bọstin.

Mgbe m laghachiri mahadum, ọ dịghị anya mụ achọpụta na ịga mahadum agaghị enyere m aka ịmata azịza ajụjụ ndị m na-ajụ gbasara ndụ. Amazighị m ihe m ga-eme eme, mụ ajụọ otu prọfesọ na-akụziri anyị ihe ihe m ga-eme. O juru m anya mgbe ọ sịrị m: “Gịnị ka ị nọ ebe a na-emekwanụ? Pụọnụ ozugbo ozugbo.” Ọ gwazughị m ya ugboro abụọ, mụ esi na mahadum ahụ pụọ.

Ma, ọ ka yikwara m ka ndụ m enwebeghị isi. N’ihi ya, m bidoro iso otu òtù na-ekwu na ha na-akwado ịhụnanya na udo. Mana, ha anaghị ekwe eme ihe ndị ọzọ na-eme. Mụ na ụfọdụ ndị enyi m so si Amerịka gaa Akapulko dị na Meziko. Ndị anyị na ha bi ebe ahụ bụ ndị na-eme otú ọ bụla o si masị ha. O yikwara ka ndụ ha enweghị nsogbu ọ bụla. M chọpụtakwara na otú ha si ebi ndụ anaghị eme ka ndụ mmadụ nwee isi ma ọ bụkwanụ ka mmadụ nwee ezigbo obi ụtọ. Kama, ha anaghị akwụwa aka ọtọ, ha ahụghịkwa ibe ha n’anya.

IJI ỤGBỌ MMIRI NA-ACHỌ IHE GA-EME KA NDỤ M NWEE ISI

Mụ na enyi m nọ na-achọgharị agwaetiti dị ka paradaịs

N’oge ahụ, ihe m chọrọ ime mgbe m dị obere bidoro ịbata m n’obi. M chọrọ ịgba n’oké osimiri dị iche iche, ọ bụghị ka onye e bu n’ụgbọ, kama ka onyeisi ụgbọ. Ma, naanị otú m ga-esi eme ya bụ inwe ụgbọ mmiri nke m. E nwere enyi m aha ya bụ Tom chọkwara ime ụdị ihe a. N’ihi ya, anyị abụọ kpebiri iji ụgbọ mmiri gazuo ụwa niile. M chọrọ ịchọta ezigbo agwaetiti dị ka paradaịs, ebe m ga-anọ n’enweghị onye ga na-agwa m ihe m ga-eme.

Mụ na Tom so gaa Arenis de Maa dị nso na Baselona dị na Spen. Anyị zụrụ ụgbọ mmiri aha ya bụ Llygra dị ihe dị ka mita itoolu n’ogologo. Anyị malitere ịrụzigharị ya ka o nwee ike ịgba n’oké osimiri. Ebe ọ bụ na njem anyị adịghị anyị ọkụ ọkụ, anyị bupụrụ njin ya, na-agbanyezi mmiri ọṅụṅụ n’ebe ahụ. Anyị zụrụ ụmara abụọ dị ihe dị ka mita ise n’ogologo ka o nwee ike ịdịrị anyị mfe ịbanye na ịpụta n’ọdụ ụgbọ mmiri ndị dị obere. Mgbe e mechara, anyị kwọọrọ ụgbọ mmiri anyị gawa Seshel dị n’Oké Osimiri India. Ihe anyị bu n’obi bụ ka anyị siri n’ụsọ oké osimiri dị n’ebe ọdịda anyanwụ Afrịka gaa n’ebe a na-akpọ Kep ọf Gud Hop dị na Saụt Afrịka. Ihe ndị nyeere anyị aka ịma ebe anyị na-aga bụ kpakpando, map, akwụkwọ, na ihe ndị ọzọ. O juru m anya na ha nyeere anyị aka ịmata kpọmkwem ebe anyị nọ.

Ọ dịghị anya, anyị achọpụta na ụgbọ mmiri anyị ahụ e ji osisi rụọ agaghị agbalikwa n’oké osimiri. N’ihe dị ka otu awa, mmiri na-abata na ya na-eru galọn isii. Dị ka m kwuru ná mmalite, oké ifufe malitere ife, ụjọ atụwa m, mụ ekpee ekpere nke mbụ ya kemgbe ọtụtụ afọ, kwe Chineke nkwa na ọ bụrụ na ọ zọpụta m, m ga-agbalị mata ya. Oké ifufe ahụ kwụsịrị, mụ emezuokwa nkwa m.

M malitere ịgụ Baịbụl mgbe anyị ka nọ n’osimiri. Chegodịnụ ihe ọ dị ka ya ịnọ n’etiti Oké Osimiri Mediterenian ihe juru na ya bụ azụ̀ dị iche iche na mbara ígwé yiri ka ọ̀ kpọnyere ọnụ n’oké osimiri. Ọ na-amasị m ma m lelie anya elu n’abalị hụ ìgwè kpakpando juru n’eluigwe. O mekwara ka m kwetasie ike na e nwere Chineke nwere mmasị n’ebe ụmụ mmadụ nọ.

Ka anyị nọchara izu ole na ole n’oké osimiri, anyị kwọọrọ ụgbọ anyị gaa n’ọdụ ụgbọ mmiri dị n’Alịkante dị na Spen. Mgbe anyị ruru ebe ahụ, anyị kpọsara ụgbọ mmiri anyị ahịa ka anyị nwee ike ire ya ma zụọ nke ka ya mma. O jughị anyị anya na o siiri anyị ike inweta onye ga-azụ ụgbọ mmiri mere ochie, na-ehi ehi, na-enweghịkwa njin. Ma, o mere ka m nwee nnukwu oge m ga-eji na-agụ Baịbụl.

Ka m na-agụ Baịbụl, ka m na-ewere ya ka akwụkwọ ga-enyere anyị aka ná ndụ. Ọ tọrọ m ezigbo ụtọ na Baịbụl kwuru hoo haa na ndị mmadụ kwesịrị ịna-eme omume dị ọcha. O juru m anya na ọtụtụ ndị na-ekwu na ha bụ Ndị Kraịst anaghị eme ihe a Baịbụl kwuru, ma mụnwa.

M kpebiri na m ga-agba mbọ biwe ndụ dị mma. N’ihi ya, m kwụsịrị ịṅụ ọgwụ ike. M nọkwa na-eche na a ga-enwerịrị ndị na-ebi ndụ dị ọcha otú ahụ Baịbụl kwuru. M chọkwara ịhụ ha. M kpere ekpere nke ugboro abụọ ya, rịọ Jehova ka o nyere m aka ịchọta ha.

ỊCHỌ EZI OKPUKPE

M chere na otú kacha mma m ga-esi achọta ezigbo okpukpe bụ ilebara ha anya otu otu ruo mgbe m chọpụtara nke ezigbo ya. Ka m na-agafe n’okporo ámá ndị dị n’Alịkante, m hụrụ ọtụtụ ụlọ okpukpe. Mana, ọtụtụ n’ime ha nwere ihe a kpụrụ akpụ na ha. N’ihi ya, o sighịrị m ike ịmata na ha abụghị ezi okpukpe.

N’otu ehihie Sọnde, m gara n’elu ugwu m nwere ike ịnọ hụ otu ọdụ ụgbọ mmiri, nọrọ ebe ahụ na-agụ Jems 2:1-5. Ebe ahụ dọrọ aka ná ntị ka anyị ghara ịna-emelara ndị ọgaranya ihe. Ka m nọ n’ụzọ na-alaghachi, m gafere ebe yiri ụlọ okpukpe e dere “Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova” n’ihu ya.

M gwara onwe m, sị: ‘Ka m banyegodị ebe a hụ otú ndị a ga-esi anabata m.’ N’ihi ya, m banyere n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ. M gba ụkwụ nkịtị, afụ ọnụ m rujuru eruju, uwe m yi dọkakwara adọka. Onye atendantị kpọọrọ m nye m oche n’akụkụ otu nwaanyị katarala ahụ́. Nwaanyị ahụ nyeere m aka ịchọta ebe ọkà okwu na-agụ na Baịbụl. Mgbe ọmụmụ ihe ahụ gbasara, o juru m anya otú ha si na-ekele m. Otu nwoke gwara m ka m bịa n’ụlọ ya ka anyị kwurịta okwu. Ma, ebe ọ bụ na agụchabeghị m Baịbụl, m gwara ya, sị, “M ga-eme ka ị mara mgbe m ga-abịa.” Ma, m malitere ịga ọmụmụ ihe niile ozugbo.

Mgbe izu ole na ole gachara, m gara n’ụlọ nwoke ahụ, ya ejiri Baịbụl zaa m ajụjụ ndị m jụrụ ya. Mgbe otu izu gachara, o nyere m otu akpa uwe mara mma juru. Ọ gwara m na a tụrụ onye nwe uwe ndị ahụ mkpọrọ n’ihi na ọ na-edebe iwu Baịbụl bụ́ ka anyị hụ ndị mmadụ n’anya nakwa ka anyị ghara ịmụta otú e si alụ agha. (Aịza. 2:4; Jọn 13:34, 35) Ugbu a, obi siri m ike na ahụla m ihe m nọ na-achọ kemgbe, ya bụ, ndị na-eme ihe Baịbụl kwuru gbasara omume dị ọcha. Ihe ka m mkpa ugbu a abụghị ịchọta agwaetiti mara mma ka paradaịs, kama ọ bụzi ịmụ Baịbụl na ịghọta ya. N’ihi ya, m laghachiri Nedalandz.

ỊCHỌ ỌRỤ

O were m abalị anọ ịgaru Groningen dị na Nedalandz. M chọrọ inweta ọrụ ga-enyere m aka ịna-egboro onwe m mkpa n’ebe ahụ. E nwere otu oge m gara ịchọ ọrụ n’ụlọ ọrụ ndị kapịnta. N’akwụkwọ e nyere m ka m dejupụta, a jụrụ m okpukpe m na-ekpe, mụ edee na m bụ Onyeàmà Jehova. Mgbe onye nwe ụlọ ọrụ ahụ gụchara ya, m chọpụtara na ihu ya gbanwere. Ọ sịrị: “M ga-akpọ gị.” Mana, ọ kpọghị m.

Mgbe m gakwara n’ụlọ ọrụ kapịnta ọzọ, m jụrụ onye nwe ebe ahụ ma ọ̀ chọrọ onye ọrụ. Ọ sịrị m weta asambodo m na akwụkwọ ozi si n’ebe m rụburu ọrụ. M gwara ya na mụ arụzibuola ụgbọ mmiri e ji osisi rụọ mebiri emebi. O juru m anya na ọ sịrị m, “I nwere ike ịmalite ọrụ n’ehihie a. Mana, naanị otu ihe ka m chọrọ n’aka gị. Achọghị m ka ị kpatara m nsogbu n’ụlọ ọrụ m n’ihi na abụ m Onyeàmà Jehova, m na-emekwa ihe Baịbụl kwuru.” O juru m anya, mụ asị ya, “Mụnwa bụkwa Onyeàmà Jehova.” Ma n’ihi na ntutu m toro ogologo, afụ ọnụ m etojuokwa, ọ sịrị m, “Ngwanụ, m ga na-amụrụ gị Baịbụl.” M ji obi ụtọ kweta ka ọ mụwara m Baịbụl. Ugbu a ka o doro m anya ihe mere onye nwe ụlọ ọrụ nke mbụ ahụ akpọghị m. Ọ bụ otú Jehova si za m ekpere. (Ọma 37:4) M rụrụ ọrụ n’ụlọ ọrụ nwanna ahụ ruo otu afọ. N’oge ahụ, mụ na ya nọkwa na-amụ Baịbụl, mụ emechaa mee baptizim n’ọnwa Jenụwarị afọ 1974.

NDỤ M MECHARA NWEE ISI

Mgbe otu ọnwa gachara, m malitere ịsụ ụzọ. O mekwara ka m nwee ezigbo obi ụtọ. N’ọnwa na-eso ya, m kwafere Amstadam iji nyere ìgwè ọhụrụ na-eji asụsụ Spanish amụ ihe aka. Obi tọrọ m ezigbo ụtọ ịmụrụ ndị mmadụ ihe n’asụsụ Spanish na Pọtugiiz. N’ọnwa Mee afọ 1975, a họpụtara m ka m bụrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche.

Otu ụbọchị, otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ pụrụ iche aha ya bụ Ineke bịara ebe anyị ji asụsụ Spanish na-amụ ihe ma gosi anyị nwaanyị Bolivia ọ na-amụrụ Baịbụl. Mụ na Ineke kpebiri ịna-edere ibe anyị akwụkwọ ozi ka anyị nwee ike ịmatakwu onwe anyị. O mere ka anyị chọpụta na anyị abụọ kpebiri ime otu ihe. Anyị lụrụ n’afọ 1976 ka bụrụkwa ọsụ ụzọ pụrụ iche ruo n’afọ 1982, mgbe a kpọrọ anyị ka anyị gaa klas nke iri asaa na atọ nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied. O juru anyị anya, tọọkwa anyị ụtọ na e zigara anyị n’ebe Ọwụwa Anyanwụ Afrịka. Anyị jere ozi afọ ise na Mombasa dị na Kenya. N’afọ 1987, e zigara anyị Tanzania, bụ́ ebe e wepụrụ iwu a machiri ụmụnna anyị ikwusa ozi ọma. Anyị nọrọ ebe ahụ ruo afọ iri abụọ na isii tupu anyị alaghachikwa Kenya.

Inyere ndị bi n’ebe Ọwụwa Anyanwụ Afrịka aka ịmụta eziokwu dị na Baịbụl mere mụ na nwunye m ezigbo obi ụtọ

Inyere ndị dị umeala aka ka ha mụta eziokwu Baịbụl emeela ka ndụ anyị nwee isi. Dị ka ihe atụ, onye mbụ m mụụrụ Baịbụl na Mombasa bụ nwoke m hụrụ n’ozi ọma. Mgbe m nyechara ya magazin abụọ, ọ sịrị m, “Ọ bụrụ na mụ agụchaa ha, olee ihe ọzọ m ga-eme?” N’izu na-eso ya, anyị malitere ịmụrụ ya akwụkwọ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala a ka wepụtara ọhụrụ n’asụsụ Swahili. O mere baptizim mgbe otu afọ gachara ma ghọọ ọsụ ụzọ oge niile. Kemgbe ahụ, ya na nwunye ya enyerela ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ otu narị mmadụ aka inyefe Jehova onwe ha ma mee baptizim.

Mụ na nwunye m ahụla otú Jehova si agọzi ndị ya ma mee ka ndụ ha nwee isi

Mgbe mbụ m ghọtara ihe mere anyị ji dịrị ndụ, ọ dị m otú ahụ ọ dị onye ahịa ahụ chọtara nkume pel dị oké ọnụ ahịa na-achọghị ka o funahụ ya. (Mat. 13:45, 46) M chọkwara iji ndụ m nyere ndị ọzọ aka ịmata ihe ha ga-eme ka ndụ ha nwee isi. Mụ na nwunye m ejirila anya anyị hụ otú Jehova si eme ka ndụ ndị na-efe ya nwee isi.