Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 48

“Unu Ga-adị Nsọ”

“Unu Ga-adị Nsọ”

“Dịrịnụ nsọ n’ihe niile unu na-eme.”​—1 PITA 1:15.

ABỤ NKE 34 Ekpebiela M Ime Ezi Omume

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị ka Pita onyeozi gwara Ndị Kraịst ibe ya ka ha mee, gịnịkwa mere o ji yie ihe na-agaghị ekwe omume?

MA ÀNYỊ nwere olileanya ibi n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa, ịmụ gbasara ihe Pita onyeozi gwara Ndị Kraịst e tere mmanụ n’oge ndịozi ga-enyere anyị aka. Pita gwara ha, sị: “Dịrịnụ nsọ n’ihe niile unu na-eme, otú ahụ onye kpọrọ unu dị nsọ. N’ihi na e dere, sị: ‘Unu ga-adị nsọ, n’ihi na adị m nsọ.’” (1 Pita 1:​15, 16) Ihe a Pita kwuru na-akụziri anyị na anyị nwere ike iṅomi Jehova bụ́ onye kacha dịrị nsọ. Anyị ga-adịli nsọ. Anyị kwesịkwara ịdị nsọ. O nwere ike iyi ihe na-agaghị ekwe omume n’ihi na anyị ezughị okè. O nwekwara oge ndị Pita mejọrọ ihe. Ma, ihe ndị o mere gosiri na anyị nwere ike ‘ịdị nsọ.’

2. Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?

2 N’isiokwu a, anyị ga-aza ajụjụ ndị a: Gịnị ka ịdị nsọ pụtara? Gịnị ka Baịbụl kụziiri anyị gbasara ịdị nsọ Jehova? Olee otú anyị nwere ike isi dịrị nsọ n’omume anyị? Oleekwa ihe jikọrọ ịdị nsọ na adịm ná mma anyị na Jehova?

GỊNỊ KA ỊDỊ NSỌ PỤTARA?

3. Olee ihe ọtụtụ ndị na-eche na ịdị nsọ pụtara, oleekwa ebe anyị ga-esi mata ihe ịdị nsọ pụtara n’eziokwu?

3 Ọ bụrụ na e kwuo gbasara onye dị nsọ, ihe nwere ike ịgbata ọtụtụ ndị n’obi bụ onye ihu na-anaghị atọ ọchị, onye na-eyi uwe ndị okpukpe, nakwa onye na-eme nsọ nsọ. Ma, ọ bụghị ya bụ ịdị nsọ. Baịbụl kwuru na Jehova, bụ́ onye dị nsọ, bụ Chineke “obi ụtọ.” (1 Tim. 1:11) Baịbụl kwuru na ndị na-efe Chineke “na-enwe obi ụtọ.” (Ọma 144:15) Jizọs katọrọ ndị na-eyi uwe pụrụ iche na ndị na-eme ezi omume naanị ka ndị ọzọ hụ ha. (Mat. 6:1; Mak 12:38) Ezigbo Ndị Kraịst ma ihe mmadụ ịdị nsọ pụtara n’ihi ihe Baịbụl gwara ha. Anyị ma na Chineke anyị dị nsọ ma hụ anyị n’anya agaghị agwa anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli. N’ihi ya, mgbe Jehova gwara anyị, sị: “Unu ga-adị nsọ,” obi siri anyị ike na anyị ga-adịli nsọ. Ma, tupu anyị adịrị nsọ n’omume anyị, anyị kwesịrị ibu ụzọ ghọta ihe ịdị nsọ pụtara.

4. Gịnị ka “nsọ” na “ịdị nsọ” pụtara?

4 Gịnị bụ ịdị nsọ? Na Baịbụl, a na-ejikarị okwu bụ́ “nsọ” na “ịdị nsọ” akọwa ịdị ọcha n’omume ma ọ bụ ife ofufe dị ọcha. O nwekwara ike ịpụta ihe e dowere iche maka ofufe Chineke. E nwekwara ike ikwu na mmadụ dị nsọ ma ọ bụrụ na ọ na-eme omume dị ọcha, na-efe Jehova otú ọ chọrọ, nakwa ma ọ bụrụ na ya na ya dị n’ezigbo mma. Ọ na-eju anyị anya na n’agbanyeghị na anyị ezughị okè, Jehova bụ́ onye dị nsọ chọrọ ka anyị na ya bụrụ enyi.

“NSỌ, NSỌ, NSỌ KA JEHOVA” DỊ

5. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta gbasara Jehova n’aka ndị mmụọ ozi?

5 Jehova dị ọcha n’ụzọ niile. Anyị si n’ihe ndị mmụọ ozi nọ nso n’ocheeze ya a na-akpọ ndị seraf kwuru mata ihe a. Ụfọdụ n’ime ha kwuru, sị: “Nsọ, nsọ, nsọ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha dị.” (Aịza. 6:3) Ihe mere ndị mmụọ ozi ndị a na Jehova, bụ́ onye dị nsọ, ji dị n’ezigbo mma bụ na hanwa dịkwa nsọ. N’eziokwu, naanị na mmụọ ozi Jehova bịara n’otu ebe n’ụwa nwere ike ime ka ebe ahụ dịrị nsọ. Ọ bụ ihe mere mgbe Mosis nọ n’ebe ọ hụrụ ọkụ na-enwu n’osisi ogwu.​—Ọpụ. 3:​2-5; Josh. 5:15.

E dere “Jehova bụ Onye dị nsọ” n’ihe mbadamba e ji ọlaedo rụọ na-adị n’ákwà isi nnukwu onye nchụàjà (A ga-akọwa ya paragraf nke 6 na nke 7)

6-7. (a) Di ka e kwuru n’Ọpụpụ 15:​1, 11, olee otú Mosis si mee ka o doo ndị Izrel anya na Jehova dị nsọ? (b) Olee ihe na-echetara ndị Izrel na Chineke dị nsọ? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

6 Mgbe Mosis duuru ụmụ Izrel gafee Oké Osimiri Uhie, o mere ka o doo ha anya na Jehova Chineke ha dị nsọ. (Gụọ Ọpụpụ 15:​1, 11.) Otú ndị Ijipt na-efe chi ụgha si akpa àgwà gosiri na ha adịtụdịghị nsọ. Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị Kenan na-efe chi ụgha. Ha na-eji ụmụ ha achụrụ chi ha àjà, na-emekwa omume rụrụ arụ. (Lev. 18:​3, 4, 21-24; Diut. 18:​9, 10) Ma, Jehova emekataghị gwa ndị na-efe ya ka ha mee ihe ga-eme ka ha ghara ịdị ọcha. Ọ dị ezigbo nsọ. Ihe e dere n’ihe mbadamba e ji ọlaedo rụọ na-adị n’ákwà isi nnukwu onye nchụàjà na-echetara ụmụ Izrel ihe a. Ihe e dere na ya bụ: “Jehova bụ Onye dị nsọ.”​—Ọpụ. 28:​36-38.

7 Ihe e dere n’ihe mbadamba ahụ e ji ọlaedo rụọ ga-eme ka onye ọ bụla hụrụ ya mara na Jehova dị nsọ n’eziokwu. Ọ bụrụkwanụ na onye Izrel ahụghị ya n’ihi na o nweghị ike iru nnukwu onye nchụàjà nso? Ọ̀ ga-ama na Jehova dị nsọ? Ee, ọ ga-ama. Ndị Izrel niile, ma ụmụ nwoke, ma ụmụ nwaanyị, ma ụmụaka, nụrụ mgbe a gụpụtaara ha iwu Chineke. (Diut. 31:​9-12) Ọ bụrụ na ị nọ ebe ahụ, ị gaara anụ mgbe a gụpụtara ihe ndị a: “Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu, unu [ga-adị] nsọ n’ihi na adị m nsọ.” “Unu ga-abụrụ m ndị dị nsọ, n’ihi na mụnwa bụ́ Jehova dị nsọ.”​—Lev. 11:​44, 45; 20:​7, 26.

8. Olee ihe anyị mụtara na Levitikọs 19:2 na 1 Pita 1:​14-16?

8 Ugbu a, ka anyị leba anya n’otu ihe dị na Levitikọs 19:2 a gụụrụ ndị Izrel. Jehova gwara Mosis, sị: “Gwa nzukọ Izrel niile okwu, sị ha, ‘Unu ga-adị nsọ, n’ihi na mụnwa, bụ́ Jehova Chineke unu, dị nsọ.’” Ọ ga-abụ ihe dị n’amaokwu a ka Pita bu n’obi mgbe ọ na-agwa Ndị Kraịst ka ha ‘dịrị nsọ.’ (Gụọ 1 Pita 1:​14-16.) Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na anyị anọghị n’okpuru Iwu Mosis. Ma, ihe Pita kwuru mere ka ihe e dere na Levitikọs 19:2 doo anya, ya bụ, na Jehova dị nsọ, nakwa na ndị niile hụrụ ya n’anya kwesịrị ịgbalị ka ha dị nsọ. Anyị niile kwesịrị ịdị nsọ ma ànyị nwere olileanya ịga eluigwe ma ọ bụ ibi n’ụwa mgbe ọ ga-abụ paradaịs.​—1 Pita 1:4; 2 Pita 3:13.

“DỊRỊNỤ NSỌ N’IHE NIILE UNU NA-EME”

9. Olee uru ịmụ Levitikọs isi nke iri na itoolu ga-abara anyị?

9 Ebe ọ bụ na anyị chọrọ ime ihe ga-adị Chineke anyị dị nsọ mma, anyị chọrọ ịmụta ihe anyị ga-eme iji dịrị nsọ. Jehova gwara anyị otú anyị ga-esi eme ya. I nwere ike ịhụ otu n’ime ha na Levitikọs isi nke iri na itoolu. Otu ọkà mmụta bụ́ onye Hibru aha ya bụ Marcus Kalisch dere, sị: “Levitikọs isi nke iri na itoolu nwere ike ịbụ isi kacha mkpa na Levitikọs niile nakwa na Jenesis ruo Diuterọnọmi.” Ka anyị cheta na ihe e bu ụzọ kwuo na Levitikọs isi nke iri na itoolu bụ: “Unu ga-adị nsọ.” Ka anyị lebazie anya n’ụfọdụ amaokwu dị na ya ga-akụziri anyị ihe ndị dị mkpa gbasara ihe ndị anyị na-eme ná ndụ anyị kwa ụbọchị.

Olee ihe ihe e kwuru na Levitikọs 19:3 gbasara nne na nna kwesịrị ime ka Onye Kraịst na-eme? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10 ruo na nke 12) *

10-11. Olee ihe Levitikọs 19:3 kwuru na anyị kwesịrị ime, oleekwa ihe mere o ji dị mkpa?

10 Mgbe Jehova kwuchara na ụmụ Izrel kwesịrị ịdị nsọ, ọ sịrị: “Onye ọ bụla n’ime unu ga na-akwanyere nne ya na nna ya ùgwù. . . . Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.”​—Lev. 19:​2, 3

11 O doro anya na anyị kwesịrị idebe iwu Chineke bụ́ ka anyị sọpụrụ nne na nna anyị. Cheta na e nwere otu nwoke jụrụ Jizọs, sị: “Olee ezi ihe m ga-eme ka m nweta ndụ ebighị ebi?” Otu n’ime ihe ndị Jizọs zara ya bụ na o kwesịrị ịsọpụrụ nne ya na nna ya. (Mat. 19:​16-19) Jizọs katọdịrị ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ n’ihi na ha na-agbara ilekọta ndị mụrụ ha ọsọ. Ha si otú ahụ “mee ka okwu Chineke bụrụ ihe efu.” (Mat. 15:​3-6) Iwu nke ise n’Iwu Iri ahụ na ihe dị na Levitikọs 19:3 so ‘n’Okwu Chineke’ ahụ. (Ọpụ. 20:12) Ọzọkwa, cheta na mgbe e kwuru ka mmadụ sọpụrụ nne na nna ya bụ ozugbo e kwuchara, sị: “Unu ga-adị nsọ, n’ihi na mụnwa, bụ́ Jehova Chineke unu, dị nsọ.”

12. Dị ka e kwuru na Levitikọs 19:​3, olee ajụjụ anyị nwere ike ịjụ onwe anyị?

12 Anyị chee gbasara iwu Jehova nyere anyị gbasara ịkwanyere ndị mụrụ anyị ùgwù, anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Olee ihe m na-eme gbasara ya?’ Ọ bụrụ na i chee na e nwere ihe ndị ị gaara eme n’oge gara aga, i nwere ike ikpebi imezikwu ihe ugbu a. Ị gaghị agbanweli ihe ndị i mere n’oge gara aga. Ma, i nwere ike ikpebi isi ugbu a na-akwanyekwuru ndị mụrụ gị ùgwù. O nwere ike ịbụ iwepụtakwu oge gị na ha ga-eji na-anọrị ma ọ bụ inyere ha aka igbo mkpa ha ma ọ bụkwanụ inyere ha aka ka ha nọgide na-efe Jehova. I nwekwara ike ịna-agbakwu ha ume ma na-akasi ha obi. Ime ihe ndị a dabara n’ihe e kwuru na Levitikọs 19:3.

13. (a) Olee ndụmọdụ ọzọ dị na Levitikọs 19:3? (b) Dị ka e kwuru na Luk 4:​16-18, olee otú anyị nwere ike isi na-eme ka Jizọs taa?

13 Levitikọs 19:3 na-akụzikwara anyị ihe ọzọ gbasara ịdị nsọ. O kwuru gbasara idebe Ụbọchị Izu Ike. Ndị Kraịst anọghị n’okpuru Iwu Mosis, n’ihi ya, ọ dịghị mkpa ka ha na-edebe iwu Ụbọchị Izu Ike. Ma, anyị nwere ike ịmụta ezigbo ihe n’otú ndị Izrel si debe iwu ahụ nakwa otú o si baara ha uru. A na-eji Ụbọchị Izu Ike ezu ike maka ọrụ ndị a rụrụ n’izu ma jiri oge ahụ lekwasị anya n’ihe gbasara ofufe Chineke. * N’ihi ya, ọ dabara adaba na Jizọs gara n’ụlọ nzukọ dị n’obodo ya n’Ụbọchị Izu Ike ma gụọ Okwu Chineke. (Ọpụ. 31:​12-15; gụọ Luk 4:​16-18.) Iwu Chineke nyere na Levitikọs 19:3 ka anyị ‘na-edebe ụbọchị izu ike ya’ kwesịrị ime ka anyị na-ewepụtakwu oge n’ihe ndị anyị na-eme iji nwee ike ịna-efe Chineke. Ì chere na e nwere ihe ndị i kwesịrị ime iji na-emekwu nke ọma na ya? Ọ bụrụ na ị na-ewepụta oge mgbe niile na-efe Chineke, ọ ga-eme ka gị na ya dịrị n’ezigbo mma, nke bụ́kwanụ ihe dị ezigbo mkpa ga-eme ka ị dị nsọ.

MEE KA GỊ NA JEHOVA DỊRỊKWUO NÁ MMA

14. Olee otu eziokwu dị mkpa e kwuru ọtụtụ ugboro na Levitikọs isi nke iri na itoolu?

14 E nwere ọtụtụ ebe na Levitikọs isi nke iri na itoolu kwuru otu eziokwu dị ezigbo mkpa ga-enyere anyị aka ịnọgide na-adị nsọ. Ihe ikpeazụ e kwuru n’amaokwu ya nke anọ bụ: “Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.” Okwu a ma ọ bụ okwu yiri ya gbara ugboro iri na isii na Levitikọs isi nke iri na itoolu. Ihe a na-echetara anyị iwu nke mbụ bụ́: “Abụ m Jehova Chineke gị . . . Enwela chi ọ bụla ọzọ ma e wepụ m.” (Ọpụ. 20:​2, 3) Onye Kraịst ọ bụla chọrọ ịdị nsọ kwesịrị ịkpachara anya ka ihe ọ bụla ghara ịka ya mkpa karịa adịm ná mma ya na Jehova. Ebe ọ bụkwa na anyị bụ Ndịàmà Jehova, anyị kpebisiri ike izere ime ihe ọ bụla ga-emechu Jehova ihu ma ọ bụkwanụ mee ka e kwutọọ aha nsọ ya.​—Lev. 19:12; Aịza. 57:15.

15. Olee ihe amaokwu ndị kwuru gbasara iji ụmụ anụmanụ achụ àjà na Levitikọs isi nke iri na itoolu kwesịrị ime ka anyị mee?

15 Ndị Izrel rubere isi n’iwu ndị Chineke nyere ha iji gosi na Jehova bụ Chineke ha. Levitikọs 18:4 kwuru, sị: “Unu ga na-eme ihe niile m kpebiri, na-edebekwa iwu m niile ma na-eso ha. Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.” Ụfọdụ n’ime “iwu” ndị ahụ Jehova nyere ụmụ Izrel dị na Levitikọs isi nke iri na itoolu. Dị ka ihe atụ, amaokwu nke ise ruo nke asatọ, nke iri abụọ na otu, na nke iri abụọ na abụọ kwuru gbasara iji anụmanụ achụ àjà. A ga-achụ ha otú ha na-agaghị ‘emerụ àjà dị nsọ a chụụrụ Jehova.’ Ịgụ amaokwu ndị ahụ kwesịrị ime ka anyị chọọ ime ihe ndị dị Chineke mma, chụọkwara ya àjà otuto otú ahụ Ndị Hibru 13:15 gwara anyị mee.

16. Olee ihe nwere ike ichetara anyị na ọ dị mkpa ka anyị dịrị iche n’ebe ndị na-anaghị efe Chineke nọ?

16 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịdị nsọ, anyị kwesịrị ịdị njikere ịna-eme ihe dị iche n’ihe ndị na-anaghị efe Jehova na-eme. Ihe a nwere ike isiri anyị ike. Mgbe ụfọdụ, ụmụ akwụkwọ ibe anyị, ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ, ndị ikwu anyị na-abụghị Ndịàmà Jehova, na ndị ọzọ nwere ike ịchọ ka anyị ghara ife Chineke otú ọ chọrọ. Ọ bụrụ na ụdị ihe a emee, e nwere ihe dị mkpa anyị ga-ekpebi ime. Olee ihe ga-enyere anyị aka ime mkpebi dị mma? Ka anyị tụlee ihe dị ezigbo mkpa anyị kwesịrị ime dị na Levitikọs 19:19. Ebe ngwụcha ya sịrị: “Unu eyikwala uwe e ji ụdị eri abụọ dị iche iche kpaa.” Iwu a nyeere ndị Izrel aka ịdị iche ná mba ndị gbara ha gburugburu. Taa, o nweghị iwu ọ bụla machiri anyị iyi uwe e ji ihe dị iche iche mee. Ma, anyị anaghị achọ ịdị ka ndị na-eme ihe na-adabaghị n’ihe Baịbụl kwuru, ọ bụrụgodị na ha bụ ụmụ akwụkwọ ibe anyị, ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ, ma ọ bụkwanụ ndị ikwu na ibe anyị. N’eziokwu, anyị hụrụ ndị ikwu na ibe anyị na ndị agbata obi anyị n’anya. Ma, mkpebi ndị anyị na-eme ná ndụ kwesịrị igosi na anyị na-erubere Jehova isi, ọ bụrụgodị na ihe anyị na-eme dị iche n’ihe ndị ọzọ na-eme. Cheta na otu ihe na-egosi na anyị dị nsọ bụ na anyị ga-adị iche n’ihi na anyị na-efe Chineke. Ihe a dị ezigbo mkpa ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịdị nsọ.​—2 Kọr. 6:​14-16; 1 Pita 4:​3, 4.

Olee ihe ndị Izrel kwesịrị ịmụta na Levitikọs 19:​23-25, oleekwa ihe gịnwa mụtara n’amaokwu ndị ahụ? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17 na nke 18) *

17-18. Olee ihe dị mkpa anyị na-amụta na Levitikọs 19:​23-25?

17 Okwu ahụ bụ́ “Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu” kwesịrị inyere ndị Izrel aka ịmata na ha kwesịrị ime ka ihe ka ha mkpa bụrụ adịm ná mma ha na Jehova. Olee otú ha ga-esi eme ya? E kwuru otu ụzọ ha ga-esi eme ya na Levitikọs 19:​23-25. (Gụọ ya.) Chegodị otú ha ga-esi na-eme ihe a ma ha banye n’Ala Nkwa ahụ. Ọ bụrụ na mmadụ kụrụ osisi, ọ gaghị eri mkpụrụ osisi ahụ mịrị ruo afọ atọ. N’afọ nke anọ ya, a ga ewega mkpụrụ ọ mịrị n’ụlọ nsọ. Ọ bụ n’afọ nke ise ka onye nwe osisi ahụ ga-eri mkpụrụ ya. Iwu a kwesịrị inyere ndị Izrel aka ịghọta na ihe kwesịrị ịka ha mkpa abụghị ọdịmma onwe ha. Ha kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi na ọ ga-egboro ha mkpa ha, werekwa ife ya ka ihe kacha ha mkpa. Ọ ga-ahụ na nri agaghị akọ ha. Chineke gwakwara ha ka ha na-enye onyinye iji na-akwado ebe a na-anọ efe ya.

18 Iwu ahụ dị na Levitikọs 19:​23-25 na-echetara anyị ihe Jizọs kwuru n’Ozizi Elu Ugwu ya. Ọ sịrị: “Kwụsịnụ ichegbu onwe unu banyere . . . ihe unu ga-eri ma ọ bụ ihe unu ga-aṅụ.” Ọ sịkwara: “Nna unu nke eluigwe ma na ihe ndị a niile dị unu mkpa.” Jehova ga-egboro anyị mkpa anyị otú ahụ o si egboro ụmụ nnụnụ. (Mat. 6:​25, 26, 32) Anyị tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-egboro anyị mkpa anyị. Anyị na-enyekwa “onyinye ebere” iji nyere ndị nọ ná mkpa aka. Obi na-adịkwa anyị ụtọ inye onyinye iji hụ na a kwụrụ ụgwọ ihe ndị a na-emefu n’ọgbakọ. Jehova na-ahụ mmesapụ aka anyị. Ọ ga-akwụkwa anyị ụgwọ maka ya. (Mat. 6:​2-4) Anyị na-emesapụ aka, ọ na-egosi na anyị ghọtara ihe e kwuru na Levitikọs 19:​23-25.

19. Olee otú ịmụ amaokwu ụfọdụ na Levitikọs isi nke iri na itoolu sirila baara gị uru?

19 Anyị ekwuola ihe ole na ole dị na Levitikọs isi nke iri na itoolu nyeere anyị aka ịghọta otú anyị ga-esi dịrị nsọ ka Chineke anyị dị nsọ. Ọ bụrụ na anyị eṅomie Chineke, o gosiri na anyị na-agbalị ‘ịna-adị nsọ n’ihe niile anyị na-eme.’ (1 Pita 1:15) Ọtụtụ ndị na-anaghị efe Chineke ejirila anya ha hụ àgwà ọma anyị. O meedịla ka ụfọdụ n’ime ha too Jehova. (1 Pita 2:12) Ma, e nwere ihe ndị ọzọ anyị nwere ike ịmụta na Levitikọs isi nke iri na itoolu. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-eleba anya n’amaokwu ndị ozọ dị na Levitikọs isi nke iri na itoolu. Ọ ga-enyekwara anyị aka ịmata ebe ndị ọzọ anyị kwesịrị ‘ịdị nsọ’ otú ahụ Pita gwara anyị mee.

ABỤ NKE 80 ‘Detụ Jehova Ire, Hụ na Ọ Dị Mma’

^ par. 5 Anyị hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu, chọọkwa ime ihe dị ya mma. Jehova dị nsọ. Ọ chọkwara ka ndị na-efe ya dịrị nsọ. Ma, ò kwere omume ụmụ mmadụ na-ezughị okè ịdị nsọ? Ee, o kwere omume. Iche gbasara ihe Pita onyeozi gwara ụmụnna ya na ihe Jehova gwara ụmụ Izrel oge ochie ka ha mee ga-enyere anyị aka ịmụta otú anyị ga-esi dị nsọ n’àgwà anyị niile.

^ par. 13 Iji matakwuo gbasara Ụbọchị Izu Ike na ihe anyị nwere ike ịmụta na ya, gụọ isiokwu bụ́ “‘E Nwere Oge A Kara Aka Maka’ Ịrụ Ọrụ na Izu Ike.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Disemba 2019.

^ par. 57 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwoke kpọ nwunye ya na ụmụ ya bịa ileta nne na nna ya. Ọ na-agbakwa mbọ akpọtụrụ ha.

^ par. 59 NKỌWA FOTO: Ebe otu onye Izrel na-eleru mkpụrụ nọ n’osisi ọ kụrụ anya.