Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 49

Otú Levitikọs Ga-esi Enyere Anyị Aka Ịna-emeso Ndị Ọzọ Ihe

Otú Levitikọs Ga-esi Enyere Anyị Aka Ịna-emeso Ndị Ọzọ Ihe

“Hụ mmadụ ibe gị n’anya otú ị hụrụ onwe gị.”​—LEV. 19:18.

ABỤ NKE 109 Jirinụ Obi Unu Niile Hụ Ibe Unu n’Anya

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. Gịnị ka anyị mụrụ n’isiokwu bu nke a ụzọ? Olee ihe anyị ga-amụ n’isiokwu a?

N’ISIOKWU bu nke a ụzọ, anyị lebara anya na ndụmọdụ ụfọdụ dị na Levitikọs isi nke iri na itoolu. Dị ka ihe atụ, n’amaokwu ya nke atọ, Jehova gwara ụmụ Izrel ka ha na-erubere nne na nna ha isi. Anyị kwukwara otú anyị nwere ike isi na-elekọta ndị nne na nna anyị, na-agba ha ume ma na-eme ka ha na Jehova dịrị ná mma. N’otu amaokwu ahụ, e chetaara ndị Izrel uru ọ bara ịna-edebe Ụbọchị Izu Ike. Ọ bụ eziokwu na anyị anaghị edebe iwu Ụbọchị Izu Ike taa, otú anyị ga-esi eme ihe anyị mụtara na ya bụ ịna-ewepụta oge mgbe niile na-eme ihe ndị gbasara ofufe Chineke. Ọ bụrụ na anyị ana-eme otú ahụ, ọ ga-egosi na anyị na-agbalịsi ike ịdị nsọ otú ahụ a gbara anyị ume ime na Levitikọs 19:2 na 1 Pita 1:15.

2 N’isiokwu a, anyị ga-amụta ihe ndị ọzọ e kwuru na Levitikọs isi nke iri na itoolu. Olee ihe ọ ga-akụziri anyị banyere ichebara ndị nwere nkwarụ echiche, ịkwụwa aka ọtọ, na ịhụ mmadụ ibe anyị n’anya? Anyị chọrọ ịdị nsọ otú ahụ Jehova dị nsọ. N’ihi ya, ka anyị lee ihe anyị nwere ike ịmụta n’isiokwu a. 

IJI OBIỌMA NA-EMESO NDỊ NWERE NKWARỤ IHE

Levitikọs 19:14 gwara anyị otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị ntị chiri na ndị kpuru ìsì (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3 ruo na nke 5) *

3-4. Dị ka e kwuru na Levitikọs 19:​14, olee otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị ntị chiri na ndị kpuru ìsì ihe?

3 Gụọ Levitikọs 19:14. Jehova chọrọ ka ndị na-efe ya ghara ịna-emegbu ndị nwere nkwarụ. Dị ka ihe atụ, ọ gwara ụmụ Izrel ka ha ghara ịkpọ onye ntị chiri iyi. Ịkpọ iyi ahụ nwere ike ịbụ ịgwa ya okwu ọjọọ ma ọ bụ iyi ya egwu. Ịkpọ onye ntị chiri iyi jọgburu onwe ya. Ebe ọ bụ na ọ naghị anụ ihe, ọ gaghị azaghachili onye kpọrọ ya iyi.

4 N’amaokwu nke iri na anọ, e kwukwara na ndị na-efe Chineke ekwesịghị idochiri “onye ìsì ihe n’ụzọ.” Lee ihe otu akwụkwọ kwuru gbasara ndị nwere nkwarụ: “N’Izrel oge ochie na mba ndị gbara ya gburugburu, a na-emegbu ndị nwere nkwarụ.” N’oge ahụ, ụfọdụ ndị obi tara mmiri nwere ike dochiere onye ìsì ihe n’ụzọ iji rụsa ya arụrụala ma ọ bụkwanụ iji jiri ya mee ihe ọchị. Omume dị otú ahụ jọgburu onwe ya. Jehova ji iwu a o nyere ụmụ Izrel mee ka ha mata na ha kwesịrị ịna-enwere ndị nwere nkwarụ ọmịiko.

5. Olee otú anyị ga-esi enwere ndị nwere nkwarụ ọmịiko?

5 Jizọs nweere ndị nwere nkwarụ ọmịiko. Cheta ihe ọ gwara ndị na-eso ụzọ Jọn Onye Na-eme Baptizim. Ọ sịrị ha: “Ndị ìsì na-ahụzi ụzọ, ndị ngwọrọ na-ejekwa ije. A na-eme ka ndị ekpenta dị ọcha, ndị ntị chiri na-anụkwa ihe. A na-akpọlite ndị nwụrụ anwụ.” Mgbe ndị niile nọ ebe ahụ hụrụ ọrụ ebube ndị a Jizọs rụrụ, “ha toro Chineke.” (Luk 7:​20-22; 18:43) Ndị Kraịst na-eji obi ụtọ eṅomi otú Jizọs si nweere ndị nwere nkwarụ ọmịiko. N’ihi ya, anyị na-emere ha ebere, na-echebara ha echiche, na-enwekwara ha ndidi. Ọ bụ eziokwu na Jehova enyeghị anyị ikike ịrụ ọrụ ebube, ma obi dị anyị ụtọ na anyị na-ezi ndị ìsì na ndị na-amaghị Chineke ozi ọma na Alaeze Chineke ga-eme ka ndị ìsì hụwa ụzọ, meekwa ka ndị na-amaghị Chineke mata ya nke ọma. (Luk 4:18) Ozi ọma a anyị na-ekwusa taa emeela ka ọtụtụ ndị na-eto Chineke.

ỊNA-AKWỤWA AKA ỌTỌ

6. Olee otú ihe e kwuru na Levitikọs isi nke iri na itoolu si kọwakwuo ihe ụfọdụ dị n’Iwu Iri ahụ?

6 Ụfọdụ amaokwu na Levitikọs isi nke iri na itoolu kọwakwuru ihe ụfọdụ dị n’Iwu Iri ahụ. Dị ka ihe atụ, iwu nke asatọ sịrị: “Ezula ohi.” (Ọpụ. 20:15) Ụfọdụ nwere ike ịna-ekwu na ọ bụrụ na ha akpachapụ anya ghara iwere ihe na-abụghị nke ha, na ha na-erube isi n’iwu ahụ. Ma, onye ahụ nwere ike isi n’ụzọ ndị ọzọ na-ezu ohi.

7. Olee otú onye na-azụ ahịa nwere ike isi daa iwu nke asatọ ahụ kwuru gbasara izu ohi?

7 Onye na-azụ ahịa nwere ike ịna-ekwusi ike na ya eweretụbeghị ihe onye ọzọ. Ma, olee otú o si na-azụ ahịa ya? Na Levitikọs 19:​35, 36, Jehova sịrị: “Unu ejila ihe ọ bụla e ji atụ̀ ihe nke na-ezughị ezu tụọ ihe, ma ùnu na-atụ otú ihe hà n’ogologo ma ùnu na-atụ otú ihe dịruru n’arọ ma ùnu na-atụ otú ihe bururu n’ibu. Unu ga na-eji ihe zuru ezu atụ̀ ihe. Jirikwanụ ihe zuru ezu e ji atụ̀ otú ihe dịruru n’arọ na ihe zuru ezu e ji atụ̀ ihe dị mmiri mmiri nakwa ihe zuru ezu e ji atụ̀ ihe na-adịghị mmiri mmiri na-atụ ihe.” Onye na-azụ ahịa ji ihe e ji atụ ihe na-abụghị nke ezigbo ya na-eresị ndị mmadụ ahịa iji ghọgbuo ha na-ezu ha ohi. Ihe ọzọ e kwuru na Levitikọs isi nke iri na itoolu mere ka nke a doo anya.

Dị ka e kwuru na Levitikọs 19:​11-13, olee ajụjụ Ndị Kraịst kwesịrị ịjụ onwe ha gbasara otú ha si na-arụ ọrụ ha ma ọ bụ na-azụ ahịa ha? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8 ruo na nke 10) *

8. Olee otú ihe ndị ọzọ e kwuru na Levitikọs 19: 11-13 si nyere ndị Juu aka ime ihe e kwuru n’iwu nke asatọ ahụ? Oleekwa otú ọ ga-esi baara anyị uru?

8 Gụọ Levitikọs 19:​11-13. Mbido Levitikọs 19:11 sịrị: “Unu ezula ohi.” Amaokwu nke iri na atọ ji mmadụ ịghọ aghụghọ n’azụmahịa ya tụnyere izu ohi. Ọ sịrị: “Unu erigbula mmadụ ibe unu.” N’ihi ya, ọ bụrụ na mmadụ ejiri aghụghọ na-azụ ahịa, ọ bụ ohi ka ọ na-ezu. Ọ bụ eziokwu na iwu nke asatọ ahụ bụ gbasara izu ohi, ma ihe e kwuru n’ebe ndị ọzọ na Levitikọs kwuru otú ha kwesịrị isi na-akwụwa aka ọtọ n’ihe ndị ọzọ ha na-eme. Ọ dị mkpa ka anyị chebara otú Jehova si ele ịghọ aghụghọ na izu ohi anya echiche. Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘N’ihi ihe a e kwuru na Levitikọs 19:​11-13, ò nwere ihe ndị anyị na-eme ná ndụ anyị anyị kwesịrị ichebara echiche? È nwere ihe ndị m kwesịrị ịgbanwe n’otú m si azụ ahịa m ma ọ bụkwanụ n’ọrụ m?’

9. Olee otú iwu ahụ dị na Levitikọs 19:13 si abara ndị e goro ọrụ uru?

9 E nwere ihe ndị ọzọ gbasara ịkwụwa aka ọtọ Onye Kraịst were mmadụ n’ọrụ kwesịrị ichebara echiche. Levitikọs 19:13 sịrị: “Unu goo mmadụ ọrụ, unu ahapụla ịkwụ ya ụgwọ ọrụ ya chi abọọ.” Ọtụtụ ndị n’Izrel oge ochie bụ ndị ọrụ ubi. A na-akwụ ndị e goro ọrụ ụgwọ ná mgbede ụbọchị ahụ ha rụrụ ọrụ. Iji onye e goro ọrụ ụgwọ ga-eme ka ọ ghara inwe ego ọ ga-eji nye ezinụlọ ya nri n’ụbọchị ahụ. Jehova sịrị: “Ọ dara ogbenye, ọ bụkwa ụgwọ ọrụ ya bụ ihe o chekwubere.”​—Diut. 24:​14, 15; Mat. 20:8.

10. Olee ihe anyị ga-amụta n’ihe e kwuru na Levitikọs 19:13?

10 Taa, a na-akwụ ọtụtụ ndị ọrụ ụgwọ otu ugboro ma ọ bụ ugboro abụọ n’ọnwa. N’ihi ya, ihe ahụ e kwuru na Levitikọs 19:13 ka bakwara uru taa. Ụfọdụ ndị were ndị mmadụ n’ọrụ na-emegbu ndị ha were n’ọrụ, na-akwụ ha ụgwọ dị ezigbo ntakịrị karịa ihe e kwesịrị ịkwụ ha. Ha ma na e nweghị ihe ọzọ ndị ahụ ga-eme ma ọ́ bụghị ịrụwa ọrụ ahụ ka agụụ ghara igbu ha. E kwuo ya n’ụzọ ọzọ, ihe ha na-eme bụ ijichi ụgwọ ọrụ onye ha were n’ọrụ. Onye Kraịst were ndị mmadụ n’ọrụ kwesịrị ichebara ihe a echiche. Ugbu a, ka anyị lee ihe ọzọ anyị nwere ike ịmụta n’akwụkwọ Levitikọs isi nke iri na itoolu.

ỊHỤ MMADỤ IBE GỊ N’ANYA OTÚ Ị HỤRỤ ONWE GỊ

11-12. Olee ihe Jizọs chọrọ ka a ghọta mgbe o kwughachiri ihe dị na Levitikọs 19:​17, 18?

11 Ihe Chineke chọrọ ka anyị mee abụghị naanị ịghara ime mmadụ ibe anyị ihe ọjọọ. Levitikọs 19:​17, 18 mere ka nke a doo anya. (Gụọ ya.) Jehova sịrị: “Hụ mmadụ ibe gị n’anya otú ị hụrụ onwe gị.” Onye Kraịst kwesịrị ime ihe a ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ime ihe dị Chineke mma.

12 Legodị ihe Jizọs kwuru nke gosiri na iwu ahụ dị na Levitikọs 19:18 bara ezigbo uru. Otu onye Farisii jụrụ Jizọs, sị: “Olee iwu kacha iwu niile n’Iwu Mosis?” Jizọs zara ya na “iwu kacha iwu niile, bụrụkwa nke mbụ” bụ mmadụ iji obi ya niile, mkpụrụ obi ya niile, na uche ya niile hụ Jehova n’anya. Jizọs gwaziri ya ihe dị na Levitikọs 19:​18, sị: “Nke abụọ, dị ka ya, bụ: ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya otú ị hụrụ onwe gị.’” (Mat. 22:​35-40) E nwere ọtụtụ ụzọ mmadụ nwere ike isi gosi na ọ hụrụ onye agbata obi ya n’anya. Ma, anyị nwere ike ịmụta ụfọdụ n’ime ha na Levitikọs isi nke iri na itoolu.

13. Olee otú ihe a kọrọ gbasara Josef na Baịbụl si mee ka ihe e kwuru na Levitikọs 19:18 dokwuo anya?

13 Otu ụzọ anyị nwere ike isi gosi onye agbata obi anyị na anyị hụrụ ya n’anya bụ ime ihe e kwuru na Levitikọs 19:18. Ọ sịrị: “Abọla ọbọ. Ebukwarala mmadụ ibe gị iwe n’obi.” Ọtụtụ n’ime anyị na-ahụ ndị na-eburu onye ọrụ ibe ha, nwa akwụkwọ ibe ha, onye ikwu ha, ma ọ bụkwanụ onye ezinụlọ ha iwe n’obi, o nwedịrị ike ịbụ ruo ọtụtụ afọ. Cheta na ụmụnne Josef iri buuru ya ezigbo iwe n’obi nke mere ka ha mee ya ihe ọjọọ. (Jen. 37:​2-8, 25-28) Ma, Josef mesoro ha ihe otú dị iche. Mgbe ọ nọ n’ọkwá dị elu, ọ gaara emegwara ha ihe ha mere ya. Ma, o meere ha ebere. O burughị ha iwe n’obi. Kama nke ahụ, o mere ihe e kwuru na Levitikọs 19:18.​—Jen. 50:​19-21.

14. Olee ihe gosiri na anyị ka kwesịrị ịna-eme ihe Levitikọs 19:18 na-akụziri anyị?

14 Ndị Kraịst chọrọ ime ihe dị Chineke mma kwesịrị iṅomi Josef bụ́ onye gbaghaara ụmụnne ya kama imegwara ha ihe ha mere ya. Ihe a o mere dabara n’ihe Jizọs kwuru n’ekpere ahụ o ji kụziere ndị na-eso ụzọ ya otú e si ekpere ekpere. Ọ gwara anyị ka anyị na-agbaghara ndị mehiere anyị. (Mat. 6:​9, 12) Otú ahụkwa ka Pọl onyeozi gbara Ndị Kraịst ume ka ha na-eme. Ọ sịrị ha: “Ndị m hụrụ n’anya, unu abọrọla onwe unu ọbọ.” (Rom 12:19) Ọ gwakwara ha, sị: “Na-edirinụ ibe unu ihe, na-agbagharakwanụ ibe unu kpamkpam ma e nwee onye ibe ya mejọrọ.” (Kọl. 3:13) Ihe a Jehova kwuru agbanwebeghị. Anyị ka kwesịkwara ịna-eme ihe Levitikọs 19:18 na-akụziri anyị.

Otú ahụ ọ na-adịghị mma ịnọ na-adụtụ ebe anyị merụrụ ahụ́ ihe mgbe niile, ka anyị na-ekwesịghịkwa ịnọgide na-eche gbasara ihe ọjọọ e mere anyị. Anyị kwesịrị ịgbalị chefuo ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15) *

15. Olee ihe atụ anyị nwere ike iji kọwaa uru ọ bara mmadụ ichefu ihe e mere ya?

15 Chegodị ihe atụ a. E nwere ike iji ihe wutere mmadụ tụnyere mmerụ ahụ́. Ụfọdụ na-adị obere, ụfọdụ ana-ebu ezigbo ibu. Dị ka ihe atụ, were ya na ị na-ebe mbọ, gị emerụọ onwe gị obere ahụ́ na mkpịsị aka. O nwere ike ịfụ gị ụfụ. Ma, ọ gaghị ete aka ya alaa. Ihe dị ka otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ gachaa, o nwere ike ị gaghị echeta ebe ihe ahụ mere gị. Mmadụ nwekwara ike mee anyị ihe na-abughị oké ihe ọjọọ. Dị ka ihe atụ, enyi anyị nwere ike kwuo okwu ma ọ bụ mee ihe n’echeghị echiche, ya ewee anyị iwe. Ma, ọ na-adịrị anyị mfe ịgbaghara ya. Ma ọ bụrụ na anyị emerụọ ezigbo ahụ́, o nwere ike ịdị mkpa ka dọkịta dụchie ebe ahụ anyị merụrụ ahụ́ ma kechie ya ihe ka o nwee ike ịla. Ọ bụrụ na anyị anọgide na-adụtụ ebe ahụ anyị merụrụ ahụ́ ihe, anyị ga-emerụkwu onwe anyị ahụ́. Mmadụ nwere ike ịna-eme ụdị ihe ahụ ma e mee ya ihe wutere ya. O nwere ike ịnọ na-eche ihe ahụ e mere ya mgbe niile nakwa otú o si na-ewute ya. Ma, ndị na-ebu iwe n’obi na-ata onwe ha ahụhụ. Ọ bụ ya mere o ji dị ezigbo mkpa ka anyị mee ihe ahụ e kwuru na Levitikọs 19:18.

16. Dị ka e kwuru na Levitikọs 19:​33, 34, olee otú ndị Izrel kwesịrị isi na-emeso ndị mbịarambịa? Oleekwa ihe anyị ga-amụta na ya?

16 Mgbe Jehova nyere ụmụ Izrel iwu ka ha hụ mmadụ ibe ha n’anya, ihe o bu n’obi abụghị ka ha hụ naanị ndị ha na ha si n’otu agbụrụ ma ọ bụ n’otu obodo n’anya. Ha kwesịkwara ịhụ ndị mbịarambịa nọ n’etiti ha n’anya. Ọ bụ ihe a ka e kwuru na Levitikọs 19:​33, 34. (Gụọ ya.) Ebe ahụ kwuru na ha kwesịrị ịna-emeso onye mbịarambịa “ka nwa afọ,” ‘hụkwa ya n’anya’ otú ha si hụ onwe ha. Dị ka ihe atụ, ndị Izrel kwesịrị ịhapụ ma onye mbịarambịa ma ogbenye ka ha na-ewere ihe ha wefọrọ n’ubi ha. (Lev. 19:​9, 10) Ndị Kraịst taa kwesịkwara ịna-ahụ ndị mbịarambịa n’anya. (Luk 10:​30-37) Olee otú ha ga-esi eme ya? E nwere ọtụtụ ndị mbịarambịa taa. O nwekwara ike ịbụ na e nwere ụfọdụ n’ime ha gị na ha bi nso. Ọ dị ezigbo mkpa ka anyị na-akwanyere ha ùgwù, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị ma ụmụaka.

ỌRỤ DỊ MKPA A NA-EKWUGHỊ NA LEVITIKỌS ISI NKE IRI NA ITOOLU

17-18. (a) Gịnị ka Levitikọs 19:2 na 1 Pita 1:15 gbara anyị ume ka anyị na-eme? (b) Olee ọrụ dị ezigbo mkpa Pita onyeozi gbara anyị ume ka anyị na-arụ?

17 Ma Levitikọs 19:2 ma 1 Pita 1:15 gwara ndị Chineke ka ha dị nsọ. Ọtụtụ amaokwu ndị ọzọ dị na Levitikọs isi nke iri na itoolu nwere ike inyere anyị aka ịmata otú anyị ga-esi na-eme ihe dị Jehova mma. Anyị elebala anya n’amaokwu ndị ahụ ma chọpụta ihe ndị anyị kwesịrị ime na ihe ndị anyị na-ekwesịghị ime. * Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst gwakwara anyị ka anyị mee otu ihe ahụ. Ma, o nwere ihe ọzọ Pita onyeozi kwukwara na anyị kwesịrị ime.

18 Ọ bụ eziokwu na anyị nwere ike ịna-eme ihe ndị a na-eme n’ofufe Chineke ma na-arụ ọrụ ọma dị iche iche, Pita onyeozi kwuru otu ihe dị ezigbo mkpa. Mgbe ọ gbachara Ndị Kraịst ume ka ha gbalịa na-adị nsọ n’ihe niile ha na-eme, ọ gwara ha, sị: “Keenụ ájị̀ n’ume maka ọrụ.” (1 Pita 1:​13, 15) Gịnị ka ọ chọrọ ka ha mee? Pita gwara ụmụnna Kraịst e tere mmanụ ka ha “kwusaa n’ebe niile na Chineke dị mma.” (1 Pita 2:9) N’eziokwu, taa, Ndị Kraịst niile na-arụ ọrụ dị ezigbo mkpa na-abara ndị mmadụ ezigbo uru. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na ebe anyị dị nsọ, anyị nwere ohere iso na-ekwusa ozi ọma ma na-akụziri ndị mmadụ eziokwu gbasara Chineke mgbe niile. (Mak 13:10) Ọ bụrụ na anyị agbasie mbọ ike na-eme ihe ndị e kwuru na Levitikọs isi nke iri na itoolu, ọ ga-egosi na anyị hụrụ Chineke n’anya, hụkwa ndị agbata obi anyị n’anya. Anyị ga-esikwa otú ahụ gosi na anyị chọrọ ‘ịdị nsọ’ n’ihe ọ bụla anyị na-eme.

ABỤ NKE 111 Ihe Mere Anyị Ji Enwe Ọṅụ

^ par. 5 Ndị Kraịst anọghị n’okpuru Iwu Mosis. Ma, Iwu ahụ kwuru ọtụtụ ihe ndị anyị kwesịrị ime na ihe ndị anyị na-ekwesịghị ime. Ịmụ gbasara ha ga-enyere anyị aka ịhụ ndị ọzọ n’anya na ime ihe dị Chineke mma. Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịma otú anyị ga-esi eme ihe ụfọdụ Levitikọs isi nke iri na itoolu na-akụziri anyị.

^ par. 17 Amaokwu ndị anyị na-ekwughị gbasara ha n’isiokwu a nakwa n’isiokwu bu ya ụzọ kwuru gbasara ịkpa ókè, ikwutọ ndị ọzọ, iri ọbara, ime mgbaasị, ịkọ ọdịnihu, na ịkwa iko.​—Lev. 19:​15, 16, 26-29, 31.​—Gụọ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” dị n’Ụlọ Nche a.

^ par. 52 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna na-enyere nwanna dara ogbi aka ịgwa dọkịta okwu.

^ par. 54 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna na-akwụ onye rụụrụ ya ọrụ ụgwọ.

^ par. 56 NKỌWA FOTO: Nwanna nwaanyị merụrụ obere ahụ́ nwere ike ichefu ya ngwa ngwa. Ma, o merụọ nnukwu ahụ́, ọ̀ ga-adịrị ya mfe ichefu ya?