Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Bụ Onye Ya na Ndị Ọzọ Na-arụkọ Ọrụ Nke Ọma?

Ị̀ Bụ Onye Ya na Ndị Ọzọ Na-arụkọ Ọrụ Nke Ọma?

“M NỌ n’akụkụ ya na-arụ ọrụ. Abụkwa m ọkà n’ọrụ. . . . M na-aṅụrị ọṅụ n’ihu ya mgbe niile.” (Ilu 8:30) Ihe a bụ otú Baịbụl si kọwaa otú Ọkpara Chineke na Nna ya si rụkọọ ọrụ ọtụtụ afọ tupu ya abịa n’ụwa. Amaokwu Baịbụl a kwukwara otú obi dị Jizọs na ya na Nna ya na-arụkọ ọrụ. Ọ “na-aṅụrị ọṅụ n’ihu ya.”

Jizọs mụtara àgwà ndị mechara mee ka ya na ndị ya na ha mekọrọ ihe mgbe ọ bịara n’ụwa rụkọọ ọrụ nke ọma. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Jizọs? Ọ bụrụ na anyị eleba akụkọ ya anya nke ọma, anyị ga-ahụ ihe atọ nwere ike inyere anyị aka ka anyị na ndị ọzọ na-arụkọ ọrụ nke ọma. Ihe atọ ndị ahụ ga-enyere anyị aka ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’udo, na-emekọkwa ihe ọnụ.

Dị njikere ịkụziri ndị gị na ha na-arụkọ ọrụ ihe ị mụtara si otú ahụ na-eme ka Jehova na Jizọs

IHE NKE MBỤ: ‘NA-ASỌPỤRỤ NDỊ ỌZỌ’

Onye chọrọ ka ya na ndị ọzọ na-arụkọ ọrụ nke ọma na-eji ndị ọrụ ibe ya akpọrọ ihe, dịrịkwa umeala n’obi. Ọ naghị achọ ịna-egosi ha na ya ka ha mara ọrụ. Jizọs mụtara àgwà a n’aka Nna ya. Ọ bụ eziokwu na ọ bụ naanị Jehova ka e kwesịrị ịkpọ Onye Okike, o mere ka a mata ọrụ dị mkpa Ọkpara ya so ya rụọ. Ihe Jehova kwuru mere ka anyị ghọta nke a. Ọ sịrị: “Ka anyị kee mmadụ n’oyiyi anyị.” (Jen. 1:26) Mgbe Jehova kwuru ihe ahụ, Jizọs matara na Nna ya dị ezigbo umeala n’obi.​—Ọma 18:35.

Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ dịkwa umeala n’obi ka Nna ya. Mgbe ndị mmadụ toro ya maka ihe ndị o mere, o toro Chineke bụ́ onye o ruuru ka e too. (Mak 10:​17, 18; Jọn 7:​15, 16) Jizọs mere ka ya na ndị na-eso ụzọ ya dịrị ná mma ma were ha ka ndị enyi ya, ọ bụghị ndị ohu ya. (Jọn 15:15) Ọ sadịrị ụkwụ ha iji kụziere ha ịdị umeala n’obi. (Jọn 13:​5, 12-14) Anyị kwesịkwara ịna-asọpụrụ ndị ọzọ kama ịna-eme ihe dị naanị anyị mma. Ọ bụrụ na anyị ‘ana-asọpụrụ ndị ọzọ,’ gharakwa ịna-azọ onye a ga-eto, anyị ga-arụpụtakwu ọtụtụ ihe.​—Rom 12:10.

Onye dị umeala n’obi na-amakwa na a “na-arụpụta ezigbo ihe ma e nwee ọtụtụ ndị ndụmọdụ.” (Ilu 15:22) N’agbanyeghị ihe anyị ma ma ọ bụ ihe anyị nwere ike ime, anyị kwesịrị icheta na o nweghị mmadụ macha ihe niile. Jizọs kwudịrị na e nwere ihe ndị yanwa na-amaghị. (Mat. 24:36) Ọ na-achọkwa ịma ihe ndị na-eso ụzọ ya na-ezughị okè ma nakwa ihe ha chere. (Mat. 16:​13-16) Ọ bụ ya mere obi ji eru ndị ya na ha rụkọrọ ọrụ ala ma ya na ha nọrọ. Ọ bụrụkwa na anyị adịrị umeala n’obi ma cheta na e nwere ihe ndị anyị na-amaghị ma gee ntị n’ihe ndị ọzọ nwere ikwu, ọ ga-eme ka anyị na ha dịrị ná mma, anyị niile arụpụta “ezigbo ihe.”

Ọ dị ezigbo mkpa ka ndị okenye dịrị umeala n’obi ka Jizọs mgbe ha na ibe ha na-arụkọ ọrụ. Ha kwesịrị icheta na mmụọ nsọ nwere ike ime ka otu okenye kwuo ihe ga-enyere ndị okenye niile aka ime mkpebi dị mma. Ọ bụrụ na ndị okenye emee ka ọ na-adịrị okenye ọ bụla mfe ikwu obi ya ná nnọkọ ha, ọ ga-eme ka ha gbakọọ aka mee mkpebi ga-abara ọgbakọ niile uru.

IHE NKE ABỤỌ: ‘MEE KA A MARA NA Ị NA-ELE IHE ANYA OTÚ KWESỊRỊ EKWESỊ’

Onye chọrọ ka ya na ndị ọzọ na-arụkọ ọrụ nke ọma na-echebara ha echiche. Ọ naghị achọ ka okwu bie n’ọnụ ya. O doro anya na Jizọs hụrụ ọtụtụ ugboro Nna ya lere ihe anya otú kwesịrị ekwesị. Dị ka ihe atụ, Jehova zitere ya ka ọ gbapụta ụmụ mmadụ n’aka mmehie na ọnwụ ha kwesịrị ịnwụ.​—Jọn 3:16.

Jizọs na-eme ihe ndị ọzọ kwuru mgbe ọ dabara adaba ma ọ bụ mgbe ọ dị mkpa ka o mee otú ahụ. Cheta otú o si nyere otu nwaanyị onye Finishia aka n’agbanyeghị na ọ bụ ndị Izrel ka e zitere ya ka o nyere aka. (Mat. 15:​22-28) Ọ tụghịkwa anya ka ndị na-eso ụzọ ya mee ihe karịrị ha. Mgbe ezigbo enyi ya bụ́ Pita gọnahụrụ ya n’ihu ndị mmadụ, ọ gbaghaara ya. O mechakwara nye ya ọrụ ndị dị mkpa ka ọ rụọ. (Luk 22:32; Jọn 21:17; Ọrụ 2:14; 8:​14-17; 10:​44, 45) Ihe Jizọs mere gosiri na anyị kwesịrị ime ka “mmadụ niile mara na [anyị] na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị.” Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịghara ịna-achọkarị ka okwu bie n’ọnụ anyị.​—Fil. 4:5.

Ile ihe anya otú kwesịri ekwesị ga-eme ka anyị na ụdị mmadụ niile na-arụkọ ọrụ ọnụ. Otú Jizọs si mesoo ndị nọ ya nso mere ka ndị iro ya jiri anyaụfụ na-ebo ya ebubo na “ọ bụ enyi ndị ọnaụtụ na ndị mmehie” gere ya ntị. (Mat. 11:19) Anyị na ndị ọzọ ànyị nwere ike ịna-arụkọ ọrụ nke ọma otú ahụ Jizọs mere? E nwere otu nwanna aha ya bụ Louis bụ́ onye nlekọta sekit ọtụtụ afọ, jeekwa ozi na Betel. Ya na ndị si ebe dị iche iche rụkọkwara ọrụ. Ọ sịrị: “M na-eji ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ atụnyere nkume na-ahaghị nhata e ji na-arụ mgbidi. Ọ bụrụ na a hazie nkume ndị ahụ nke ọma, mgbidi e ji ya rụọ ga-akwụrụ ọtọ. Agbalịakwala m ịgbanwe ọtụtụ ihe ná ndụ m ka mụ na ndị ọzọ nwee ike ịdị ná mma.” Ihe ahụ o mere magburu onwe ya.

Onye ya na ndị ọzọ na-arụkọ ọrụ nke ọma anaghị ezochiri ha ihe ha kwesịrị ịma ka ọ bụrụ ya ga na-atụrụ ha ụka

Olee mgbe anyị nwere ike ime ihe gosiri na anyị chọrọ ka anyị na ụmụnna anyị na-emekọ ihe ọnụ? Otu bụ mgbe anyị na ha na-arụ n’ozi ọma. Ndị anyị na ha na-arụ n’ozi ọma nwere ike ịbụ ndị ihe ha na-arụ n’ezinụlọ ha ka nke anyị ma ọ bụkwanụ ndị anyị na ha na-abụghị ọgbọ. O nwere ike ịdị mkpa ka anyị ghara ịna-agasi ike ma anyị na ha soro ma ọ bụ gbanwee otú anyị si ezi ozi ọma ka ozi ọma nwee ike ịtọ ha ụtọ.

IHE NKE ATỌ: ‘NA-ENYE NDỊ ỌZỌ IHE’

Onye chọrọ ka ya na ndị ọzọ na-arụkọ ọrụ nke ọma ga ‘na-enye ndị ọzọ ihe.’ (1 Tim. 6:18) Mgbe Jizọs na Nna ya na-arụkọ ọrụ, ọ ga-abụ na ọ chọpụtara na Jehova anaghị ezochi ihe. Mgbe Jehova “kwadebere eluigwe,” Jizọs nọ ya. Ọ mụtakwara ihe n’aka ya. (Ilu 8:27) Obi dịkwa Jizọs ụtọ mgbe o mechara kụziere ndị na-eso ụzọ ya ‘ihe ọ nụrụ’ n’ọnụ Nna ya. (Jọn 15:15) Anyị nwekwara ike ịna-eme ka Jehova ma ọ bụrụ na anyị ana-akụziri ụmụnna anyị ihe anyị mụtara. Onye chọrọ ka ya na ndị ọzọ na-arụkọ ọrụ nke ọma agaghị ezochiri ha ihe ha kwesịrị ịma naanị ka o nwee ike ịna-atụrụ ha ihe ha ga na-eme. Obi ga-adị ya ezigbo ụtọ ịna-akụziri ndị ọzọ ihe ndị ọ mụtara.

Anyị nwekwara ike ịna-agba ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ ume. Obi ọ́ naghị adị anyị ụtọ ma ọ bụrụ na mmadụ achọpụta na anyị na-arụsi ọrụ ike ma jaa anyị mma maka ya? Jizọs gwara ndị ya na ha na-arụkọ ọrụ ihe ọma ndị ọ hụrụ ha na-eme. (Tụlee Matiu 25:​19-23; Luk 10:​17-20.) Ọ gwadịrị ha na ha “ga-arụkwa ọrụ karịrị” nke ya. (Jọn 14:12) N’abalị bọtara ụbọchị ọ nwụrụ, ọ jara ndịozi ya rubeere ya isi mma. Ọ sịrị ha: “Unu ahapụghị m n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị bịaara m.” (Luk 22:28) Chegodị otú okwu ndị a si gbaa ha ume ma mee ka ha mee ihe ndị ọ chọrọ ka ha mee. Ọ bụrụkwa na anyị ana-aja ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ mma, obi ga na-adị ha ụtọ, ha ana-arụpụtakwu ọrụ.

I NWERE IKE ỊBỤ ONYE YA NA NDỊ ỌZỌ NA-ARỤKỌ ỌRỤ NKE ỌMA

Otu nwanna aha ya bụ Kayode sịrị na “mmadụ agaghị ezu okè tupu ya na ndị ọzọ enwee ike ịrụkọ ọrụ nke ọma. Ma, onye chọrọ ka ya na ndị ọzọ rụkọọ ọrụ nke ọma ga na-eme ka ndị ya na ha nọ na-enwe obi ụtọ, na-emekwa ka ihe ghara ịna-esiri ha ike.” Ị̀ bụ ụdị onye ahụ? Gbalịa jụọ ụmụnna gị na ha na-arụkọ ọrụ ka ị mara otú i si eme. Ọ bụrụ na obi na-adị ha ụtọ gị na ha ịrụkọ ọrụ, otú ahụ obi dị ndị na-eso ụzọ Jizọs ụtọ ya na ha ịrụkọ ọrụ, i nwere ike ikwu ihe ahụ Pọl onyeozi kwuru. Ọ sịrị: “Anyị bụ ndị ọrụ ibe unu, ndị na-eme ka unu na-aṅụrị ọṅụ.”​—2 Kọr. 1:24.