Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 50

Gee Ntị n’Olu Ezigbo Onye Ọzụzụ Atụrụ Ahụ

Gee Ntị n’Olu Ezigbo Onye Ọzụzụ Atụrụ Ahụ

“Ha ga-ege m ntị.”​—JỌN 10:16.

ABỤ NKE 3 Ị Bụ Ike Anyị, Olileanya Anyị, na Obi Ike Anyị

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee otu ihe mere Jizọs ji jiri ndị na-eso ụzọ ya tụnyere atụrụ?

JIZỌS ji otú ya na ndị na-eso ụzọ ya si dịrị ná mma tụnyere otú atụrụ na onye na-azụ ha si adị ná mma. (Jọn 10:14) Ihe atụ ahụ dabara adaba. Atụrụ na-ama olu onye na-azụ ya ma na-ege ya ntị. E nwere otu nwoke chọpụtara na ọ bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Anyị chọrọ ka atụrụ ụfọdụ bịa anyị nso ka anyị see ha foto. Ma, ha ekweghị abịa n’ihi na ha amaghị olu anyị. Ma, ozugbo otu obere nwa na-azụ atụrụ bịara kpọọ ha, ha sowere ya.”

2-3. (a) Olee otú ndị na-eso ụzọ Jizọs si gosi na ha na-ege ya ntị? (b) Olee ihe anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a na nke na-eso ya?

2 Ihe a nwoke a kọrọ chetaara anyị ihe Jizọs kwuru gbasara atụrụ ya, ya bụ, ndị na-eso ụzọ ya. Ọ sịrị: “Ha ga-ege m ntị.” (Jọn 10:16) Ma, ebe ọ bụ na Jizọs nọ n’eluigwe, olee otú anyị si na-ege ya ntị? Ụzọ kachanụ anyị si ege ya ntị bụ ime ihe ndị ọ kụziri.​—Mat. 7:​24, 25.

3 N’isiokwu a na n’isiokwu na-esonụ, anyị ga-eleba anya n’ihe ụfọdụ Jizọs kụziri. Anyị ga-ahụkwa na e nwere ihe ụfọdụ Jizọs kwuru ka anyị kwụsị ime, nweekwa ihe ụfọdụ o kwuru na anyị kwesịrị ịna-eme. Anyị ga-ebu ụzọ leba anya n’ihe abụọ onye ọzụzụ atụrụ ọma anyị gwara anyị ka anyị kwụsị ime.

“KWỤSỊNỤ ICHEGBU ONWE UNU”

4. Dị ka e kwuru na Luk 12:​29, olee ihe ụfọdụ nwere ike ịkpata ‘nchegbu’?

4 Gụọ Luk 12:29. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha ‘kwụsị ichegbu onwe ha’ maka ihe ndị dị ha mkpa. Anyị ma na ndụmọdụ ọ bụla Jizọs nyere na-adị mma, na-abakwa uru. Anyị chọrọ ime ya, ma mgbe ụfọdụ, ọ naghị adịrị anyị mfe. N’ihi gịnị?

5. Olee ihe mere ụfọdụ ndị nwere ike iji na-echegbu onwe ha maka ihe ndị dị ha mkpa?

 5 Ụfọdụ ndị nwere ike ịna-echegbu onwe ha maka ihe ndị dị ha mkpa, dị ka nri, uwe, na ebe obibi. O nwere ike ịbụ na obodo ha dara ogbenye, ya ana-esikwa ike inweta ọrụ ebe ahụ. O nwere ike isiri ha ike inweta ego ga-ezuru ha iji gboo mkpa ezinụlọ ha ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na onye na-akpa afọ ezinụlọ ha anwụọla, ya emezie ka ha ghara inwe ego ha ga-eji na-egbo mkpa ha. O nwekwara ike ịbụ na ọrịa koronavaịrọs emeela ka ọtụtụ ndị ghara inwe ọrụ na ihe ndị na-enye ha ego. (Ekli. 9:11) Ọ bụrụ na nke ọ bụla n’ime ihe ndị a emeela anyị, olee otú anyị nwere ike isi kwụsị ichegbu onwe anyị otú ahụ Jizọs kwuru?

Kama ịna-echegbu onwe gị gbasara ihe ndị dị gị mkpa, tụkwasị Jehova obi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6 ruo na nke 8) *

6. Kọwaa ihe mere Pita onyeozi n’otu oge.

6 N’otu oge, Pita onyeozi na ndịozi ndị ọzọ nọ n’ụgbọ mmiri n’Oké Osimiri Galili mgbe oké ifufe na-efe, ha ahụ Jizọs ka ọ na-aga ije n’elu mmiri, Pita asị ya: “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ bụ gị, gwa m ka m bịakwute gị n’elu mmiri.” Jizọs gwara ya ka ọ “bịa.” Pita pụtara n’ụgbọ ahụ ma “jere ije n’elu mmiri ahụ gakwuruwe Jizọs.” Lee ihe ọzọ merenụ. “Mgbe ọ hụrụ oké ifufe ahụ, egwu tụrụ ya. Mgbe ọ malitekwara imikpu, o tiri mkpu, sị: ‘Onyenwe anyị, zọpụta m!’ ” Jizọs matịrị aka ya ma zọpụta ya. Ọ dị mkpa ka anyị cheta na mgbe Pita legidere Jizọs anya, ọ nọ na-eje ije n’elu mmiri ahụ. Ma, mgbe o leweziri anya n’oké ifufe ahụ, ụjọ jidere ya, ya enwewe obi abụọ, malitekwa imikpu n’ime mmiri ahụ.​—Mat. 14:​24-31.

7. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka Pita?

7 E nwere ihe anyị na-amụta n’aka Pita. Mgbe Pita si n’ụgbọ ahụ pụta gawa ije n’elu mmiri ahụ, ọ tụghị anya na e nwere ihe ga-adọpụ uche ya nke ga-eme ka o mikpuwe n’osimiri ahụ. Ọ chọrọ ịga ije n’elu mmiri ahụ ruo mgbe ọ gakwuuru Jizọs. Ma, kama ilekwasị Jizọs anya, ọ malitere ichegbu onwe ya maka oké ifufe ahụ. Taa, anyị kwesịrị inwe okwukwe iji die nsogbu ndị ga-abịara anyị, otú ahụ okwukwe dị Pita mkpa iji gaa ije n’elu mmiri. Ọ bụrụ na uche anyị apụọ n’ebe Jehova na nkwa ya nọ, okwukwe anyị agaghịzi esi ike. N’agbanyeghị nsogbu nwere ike ịbịara anyị ná ndụ, anyị kwesịrị ilekwasị anya n’ebe Jehova nọ, marakwa na ọ ga-enyeliri anyị aka. Olee otú anyị nwere ike isi eme ya?

8. Olee ihe ga-enyere anyị aka ịghara ịna-echegbu onwe anyị maka ihe ndị dị anyị mkpa?

8 Kama ịna-echegbu onwe anyị maka nsogbu anyị, anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi. Cheta na Nna anyị bụ́ Jehova kwere anyị nkwa na ọ ga-egboro anyị mkpa anyị ma ọ bụrụ na anyị ebute ofufe ya ụzọ ná ndụ anyị. (Mat. 6:​32, 33) Ọ na-emezu nkwa ya kemgbe ụwa. (Diut. 8:​4, 15, 16; Ọma 37:25) Ebe ọ bụ na Jehova na-egboro nnụnụ na okooko osisi mkpa ha, anyị ekwesịghị ịna-echegbu onwe anyị gbasara ihe anyị ga-eri ma ọ bụ ihe anyị ga-eyi. (Mat. 6:​26-30; Fil. 4:​6, 7) Otú ahụ nne na nna na-egboro ụmụ ha mkpa ha n’ihi na ha hụrụ ha n’anya, ka Jehova na-egbokwara ndị na-efe ya mkpa ha n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya. N’eziokwu, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-elekọta anyị.

9. Gịnị ka i nwere ike ịmụta n’akụkọ otu di na nwunye?

9 Legodị ihe otu di na nwunye bụ́ ọsụ ụzọ kọrọ gosiri otú Jehova si egboro anyị mkpa anyị. Ha ji ụgbọala ha mere ochie gaa iburu ụfọdụ ụmụnna nwaanyị nọ n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ gaa ọmụmụ ihe. Nwanna ahụ sịrị: “Mgbe ọmụmụ ihe gbasara, anyị gwara ụmụnna nwaanyị ndị ahụ ka ha bịa n’ụlọ anyị rie nri. Ma, anyị mechara chọpụta na anyị enweghị nri ọ bụla anyị ga-enye ha.” Gịnị ka di na nwunye a ga-eme? Nwanna ahụ sịrị: “Mgbe anyị lọtara, anyị hụrụ akpa abụọ nri juru nọ n’ihu ụlọ anyị. Anyị amaghị onye busara ha ebe ahụ. Jehova lekọtara anyị.” N’oge ọzọkwa, ụgbọala ha mebiri. Ụgbọala ahụ dịkwanụ ha mkpa iji na-eje ozi ha. Ma, ha enweghị ego ha ga-eji rụzie ya. Mgbe ha bugara ya ebe a ga-arụzi ya ka ha mara ego ole a ga-eji arụzi ya, otu nwoke bịara jụọ, sị: “Ònye nwe ụgbọala a?” Nwanna ahụ gwara ya na ọ bụ nke ya nakwa na o mebiri emebi. Nwoke ahụ zara ya, sị: “Nsogbu adịghị. Ọ bụ ụdị ụgbọala a ka nwunye m chọrọ, ma otú o si acha. Ego ole ka ị ga-achọ ire ya?” Nwanna a mechara resị nwoke ahụ ụgbọala ahụ. Ego o retekwara ya zuuru ya ịzụ ụgbọala ọzọ. Nwanna ahụ sịrị: “Obi tọgburu anyị atọgbu n’ụbọchị ahụ. Anyị ma na ihe a emeghị ná ndaba. Aka Jehova dị na ya.”

10. Olee otú Abụ Ọma 37:5 si agba anyị ume ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị maka ihe ndị dị anyị mkpa?

10 Ọ bụrụ na anyị egee ezigbo onye ọzụzụ atụrụ anyị ntị ma kwụsị ịna-echegbu onwe anyị maka ihe ndị dị anyị mkpa, obi ga-esi anyị ike na Jehova ga-egboro anyị mkpa anyị. (Gụọ Abụ Ọma 37:5; 1 Pita 5:7) Chee gbasara nsogbu ndị ahụ e kwuru okwu ha na  paragraf nke ise. Ruo ugbu a, o nwere ike ịbụ na Jehova ji onyeisi ezinụlọ anyị ma ọ bụkwanụ onye were anyị n’ọrụ na-egboro anyị mkpa anyị kwa ụbọchị. Ọ bụrụ na onyeisi ezinụlọ anyị enwezighị ike ịna-elekọta anyị ma ọ bụkwanụ na a chụrụ anyị n’ọrụ, Jehova ga-esikwa n’ụzọ ọzọ na-elekọta anyị. Obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga-egboro anyị mkpa anyị. Ugbu a, ka anyị leba anya n’ihe ọzọ onye ọzụzụ atụrụ anyị gwara anyị ka anyị kwụsị ime.

“KWỤSỊNỤ IKPE IKPE”

Ileba anya n’otú ihe si dịrị ụmụnna anyị ga-enyere anyị aka ịkwụsị ịna-ekpe ha ikpe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11, nke 14 ruo na nke 16) *

11. Dị ka e kwuru na Matiu 7:​1, 2, gịnị ka Jizọs gwara anyị ka anyị kwụsị ime? Oleekwa ihe mere o nwere ike iji siere anyị ike?

11 Gụọ Matiu 7:​1, 2. Jizọs ma na ụmụ mmadụ ezughị okè nakwa na ha na-ahụkarị ebe ndị ọzọ na-emejọ ihe. Ọ bụ ya mere o ji sị: “Kwụsịnụ ikpe ikpe.” O nwere ike isiri anyị ike ịghara ịna-ekpe ụmụnna anyị ikpe. Ma, anyị niile ezughị okè. Ọ bụrụ na anyị achọpụta na mgbe ụfọdụ, anyị na-ahụkarị ebe ndị ọzọ na-emejọ, gịnị ka anyị kwesịrị ime? Ka anyị gee Jizọs ntị ma gbalịsie ike kwụsị ikpe ndị ọzọ ikpe.

12-13. Olee otú ịtụgharị uche n’otú Jehova si were Eze Devid nwere ike isi nyere anyị aka ịkwụsị ikpe ndị ọzọ ikpe?

12 Ịtụgharị uche n’otú Jehova si eme ihe ga-abara anyị uru. Ọ na-elekwasị anya n’ebe ndị mmadụ na-emeta. Anyị chọpụtara nke a n’otú o si meso Eze Devid, bụ́ onye mejọrọ ọtụtụ ihe. Dị ka ihe atụ, ya na Bat-shiba kwara iko, ya egbuokwa di ya. (2 Sam. 11:​2-4, 14, 15, 24) Ihe a Devid mere kpataara ma ya ma ndị ezinụlọ ya nsogbu, ma ndị nwunye ya ndị ọzọ. (2 Sam. 12:​10, 11) N’oge ọzọ, Devid atụkwasịghị Jehova obi kpamkpam mgbe o nyere iwu ka a gụọ ndị agha Izrel ọnụ, bụ́kwanụ ihe Jehova na-agwaghị ya mee. O nwere ike ịbụ na ihe mere Devid ji mee ihe a bụ na isi buwere ya maka ọtụtụ ndị agha o nwere. Ọ tụkwasịkwara ha obi maka nchebe. Gịnị mechara mee? Puku ndị Izrel iri asaa nwụrụ mgbe Jehova mere ka e nwee ọrịa na-efe efe.​—2 Sam. 24:​1-4, 10-15.

13 Ọ bụrụ na i bi n’Izrel n’oge ahụ, olee otú ị gaara esi ele Devid anya? Ị̀ gaara ekwu na o kwesịghị ka Jehova meere ya ebere? Jehova echeghị otú ahụ. O lekwasịrị anya n’otú Devid si na-atụkwasị ya obi kemgbe ndụ ya nakwa n’otú o si jiri obi ya niile chegharịa. Ihe a mere ka Jehova gbaghara ya mmehie ndị a dị oké njọ o mere. Jehova ma na Devid hụrụ ya n’anya nke ukwuu nakwa na ọ na-achọ ime ihe dị mma. Ọ̀ bụ na obi anaghị adị gị ụtọ na Chineke na-elekwasị anya n’ebe ndị anyị na-emeta?​—1 Eze 9:4; 1 Ihe 29:​10, 17.

14. Olee ihe na-enyere Ndị Kraịst aka ịkwụsị ikpe ndị ọzọ ikpe?

14 Ebe ọ bụ na Jehova anaghị atụ anya ka anyị zuo okè, anyị ekwesịghịkwa ịtụ anya ka ndị ọzọ zuo okè. Kama, anyị kwesịrị ịna-elekwasị anya n’ebe ndị ha na-emeta. Ọ na-adịkarị mfe ịna-achọpụta ebe ndị ọzọ na-anaghị emeta na ịna-akatọ ha. Ma, onye ji ife Chineke kpọrọ ihe nwere ike ịna-ahụ ebe mmadụ ibe ya na-anaghị emeta ma gbalịa leghara ya anya, ya na ya aka dịkwa ná mma. Dị ka ihe atụ, mmadụ nwere ike ịzafu ihe bara ezigbo uru n’ihi na ọ maghị uru ọ bara, eleghị anya, n’ihi na otú ọ dị n’anya adịghị mma. Ma, anyị kwesịrị ịna-eme ka Jehova na Jizọs. Anyị kwesịrị ịgba mbọ ka anyị na-ahụ àgwà ọma ụmụnna anyị kama ilekwasị anya n’otú ha dị n’anya.

15. Olee otú iche gbasara otú ihe si dịrị mmadụ nwere ike isi nyere anyị aka ịghara ịkatọ ya?

15 E wezụga ilekwasị anya n’ebe ndị ọzọ na-emeta, olee ihe ga-enyere anyị aka ịghara ịna-akatọ ha? Na-eche otú ihe si dịrị ha. Chegodị ihe atụ a. Otu ụbọchị n’ụlọ nsọ, Jizọs hụrụ otu nwaanyị di ya nwụrụ dara ogbenye ebe ọ tụnyere mkpụrụ ego abụọ na-enweghị oké ihe ha ga-azụta n’igbe a na-atụnye ego. Ọ jụghị, sị: “Gịnị mere o ji bụrụ naanị ihe a ka ọ tụnyere?” Kama ilekwasị anya n’ego ole nwaanyị ahụ tụnyere, o lekwasịrị anya n’ihe o bu n’obi na otú ihe si dịrị ya ma jaa ya mma maka na o mere ike ya niile.​—Luk 21:​1-4.

16. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe Veronica kọrọ?

16 Iji nyere anyị aka ịna-echebara ndị ọzọ echiche, ka anyị lee ihe otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Veronica kọrọ. N’ọgbakọ Veronica nọbu, e nwere otu nwanna nwaanyị na-azụ nwa ya nwoke naanị ya. Veronica kwuru, sị: “M weere ha ka ndị na-anaghị agachi ozi ọma na ọmụmụ ihe anya. O mere ka m na-ele ha anya ọjọọ. Ma, mgbe mụ na nwanna nwaanyị ahụ so gaa ozi ọma, ọ kọwaara m nsogbu ọ nọ na ya nakwa ọrịa ọjọọ nwa ya na-arịa. Ọ na-agbalị ike ya niile ilekọta nwa ya ahụ, na-agbalịkwa ịkụziri ya gbasara Jehova. Mgbe ụfọdụ, n’ihi ahụ́ nwa ya ahụ, ọ na-aga ọmụmụ ihe n’ọgbakọ ọzọ.” Veronica kwukwara, sị: “Amabughị m ihe ya na nwanna nwaanyị a na-alụ. Ma ugbu a, obi dị m ezigbo ụtọ maka mbọ ọ na-agba ife Jehova.”

17. Gịnị ka Jems 2:8 gwara anyị ka anyị na-eme? Oleekwa otú anyị nwere ike isi mee ya?

17 Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị achọpụta na e nwere nwanna anyị na-ele anya ọjọọ? Ka anyị cheta na anyị kwesịrị ịhụ ụmụnna anyị n’anya. (Gụọ Jems 2:8.) Anyị kwesịkwara ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka ka anyị kwụsị ịna-ekpe ndị ọzọ ikpe. Iji mee ihe ahụ anyị na-arịọ Jehova, anyị kwesịrị iwepụta oge ka anyị na onye ahụ anyị na-ele anya ọjọọ kwurịta. Nke ahụ nwere ike ime ka anyị matakwuo ya nke ọma. Anyị nwekwara ike ịgwa ya ka anyị na ya rụọ n’ozi ọma ma ọ bụkwanụ ka ọ bịa na nke anyị rie nri. Ọ bụrụ na anyị amata nwanna ahụ nke ọma, ọ ga-eme ka anyị ṅomie ihe ahụ Jehova na Jizọs na-eme, ya bụ, ilekwasị anya n’ebe ndị ọ na-emeta. Anyị mee otú ahụ, ọ ga-egosi na anyị na-edebe iwu onye ọzụzụ atụrụ ọma ahụ nyere anyị nke bụ́ ka anyị kwụsị ikpe ndị ọzọ ikpe.

18. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị na-ege ntị n’olu ezigbo onye ọzụzụ atụrụ ahụ?

18 Otú ahụ atụrụ si ege onye ọzụzụ atụrụ ntị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs si ege ya ntị. Ọ bụrụ na anyị agbalịa kwụsị ịna-echegbu onwe anyị maka ihe ndị dị anyị mkpa ma kwụsị ịna-ekpe ndị ọzọ ikpe, Jehova na Jizọs ga-agọzi anyị. Ma ànyị so ‘n’ìgwè atụrụ nta’ ma ọ bụ ‘n’atụrụ ọzọ,’ ka anyị nọgide na-ege onye ọzụzụ atụrụ ọma ahụ ntị ma na-erubere ya isi. (Luk 12:32; Jọn 10:​11, 14, 16) N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-eleba anya n’ihe abụọ Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na ha kwesịrị ịna-eme.

ABỤ NKE 101 Anyị Na-arụkọ Ọrụ ma Dịrị n’Otu

^ par. 5 Mgbe Jizọs kwuru na atụrụ ya ga-ege ntị n’olu ya, ihe ọ na-ekwu bụ na ndị na-eso ụzọ ya ga-ege ntị n’ihe ndị ọ na-akụzi ma na-eme ya eme ná ndụ ha. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe abụọ Jizọs kụziri. Ha bụ, ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị maka ihe ndị dị anyị mkpa nakwa ka anyị kwụsị ikpe ndị ọzọ ikpe. Anyị ga-elebakwa anya n’otú anyị ga-esi na-eme ha.

^ par. 51 NKỌWA FOTO: Ebe a kwụsịrị otu nwanna ọrụ, ebe ọ na-enweghị ego ọ ga-eji gboo mkpa ezinụlọ ya, na ebe ha si n’ụlọ ha bi na-akwaga ebe ọzọ. Ọ bụrụ na ọ kpacharaghị anya, o nwere ike ịna-echegbu onwe ya, ya emee ka ọ kwụsị ibute ofufe Jehova ụzọ.

^ par. 53 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna bịara ọmụmụ ihe mgbe ọmụmụ ihe bidochara. Ma, ọ na-agbalị na-ezi ozi ọma mgbe ọ na-anọghị n’ozi ọma, na-enyere onye agadi aka, na-enyekwa aka idebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha.