Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 51

Nọgidenụ ‘Na-ege Ya ntị’

Nọgidenụ ‘Na-ege Ya ntị’

“Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya. Ihe ya masịrị m. Geenụ ya ntị.”​—MAT. 17:5.

ABỤ NKE 54 “Lekwa Ụzọ”

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. (a) Olee ihe a gwara ndịozi Jizọs atọ ka ha mee, oleekwa ihe ha mere? (b) Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?

MGBE Ememme Ngabiga nke afọ 32 gachara, ndịozi atọ bụ́ Pita, Jems, na Jọn hụrụ ọhụụ dị ịtụnanya. Mgbe ha nọ n’ugwu dị oké elu, o nwere ike ịbụ n’akụkụ Ugwu Hemọn, Jizọs nwoghara n’ihu ha. Baịbụl sịrị: “Ihu ya [chawara] ka anyanwụ, uwe elu ya ana-enwukwa gbaa dị ka ìhè.” (Mat. 17:​1-4) Ná ngwụcha ọhụụ ahụ, ndịozi ahụ nụrụ ka Chineke sịrị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya. Ihe ya masịrị m. Geenụ ya nti.” (Mat. 17:5) Otú ndịozi atọ ahụ si bie ndụ gosiri na ha gere Jizọs ntị. Anyị kwesịkwara ime ka ha.

2 N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị mụtara na ige Jizọs ntị pụtara na anyị ga-akwụsị ime ihe ụfọdụ. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe abụọ Jizọs kwuru na anyị kwesịrị ịna-eme.

“SINỤ N’ỌNỤ ỤZỌ ÁMÁ DỊ WARARA BANYE”

3. Dị ka e kwuru na Matiu 7:​13, 14, gịnị ka anyị kwesịrị ime?

3 Gụọ Matiu 7:​13, 14. Ị̀ chọpụtara na Jizọs kwuru gbasara ụzọ abụọ dị iche iche na-edugakwa ebe dị iche iche? Otu dị “obosara” nke ọzọ adịrị “mkpagide.” E nweghị ụzọ nke atọ. Anyị kwesịrị ịhọrọ ụzọ nke anyị ga-esi na ya gafere. Ihe a bụ mkpebi kacha mkpa anyị kwesịrị ime n’ihi na nke ọ bụla anyị kpebiri iso ga-eme ka anyị nweta ndụ ebighị ebi ma ọ bụkwanụ mee ka ọ kwaa anyị.

4. Olee otú i nwere ike isi akọwa ụzọ ahụ dị “obosara”?

4 Anyị kwesịrị iburu n’obi ihe ndị dị iche n’ụzọ abụọ ahụ. Ọtụtụ ndị na-esikarị n’ụzọ ahụ dị “obosara” n’ihi na ọ dị mfe ịga na ya. Ọ dị mwute na ọtụtụ ndị na-ahọrọ ụzọ ahụ, na-akpakwa àgwà ka ndị ọzọ nọ n’ụzọ ahụ. Ha amaghị na ọ bụ Ekwensu chọrọ ka ndị mmadụ si n’ụzọ ahụ na-aga nakwa na ụzọ ahụ na-eduga n’ọnwụ.​—1 Kọr. 6:​9, 10; 1 Jọn 5:19.

5. Olee otú ụfọdụ ndị sirila gbaa ezigbo mbọ ịchọta ụzọ ahụ dị “mkpagide” ma na-aga ije na ya?

5 Ụzọ nke ọzọ ahụ adịghị “obosara,” ọ dị “mkpagide.” Jizọs kwukwara na ọ bụ naanị mmadụ ole na ole na-achọta ya. N’ihi gịnị? N’amaokwu nke na-eso ya, Jizọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị gbasara ndị amụma ụgha. (Mat. 7:15) Ụfọdụ ndị kwuru na e nwere ọtụtụ puku okpukpe. Ọtụtụ n’ime ha na-ekwukwa na ha na-akụzi eziokwu. Otú a ha si dị ọtụtụ na-eme ka ọtụtụ nde mmadụ daa mbà ma ọ bụkwanụ ghara ịma ihe ha ga-eme eme nke na ha anaghịdị achọ ịmata nke bụ́ ezi okpukpe. Ma, mmadụ nwere ike ịchọta nke bụ́ ezigbo okpukpe. Jizọs sịrị: “Ọ bụrụ na unu ana-eme ihe m kwuru mgbe niile, unu bụ ndị na-eso ụzọ m n’eziokwu. Unu ga-amara eziokwu, eziokwu ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.” (Jọn 8:​31, 32) Ọ dị mma na i meghị ka ọtụtụ ndị ọzọ. Ị gbara mbọ mata nke bụ́ eziokwu. Ị malitere ịmụsi Baịbụl ike ka ị mụta ihe Jehova chọrọ gị n’aka. Ị gekwara ntị n’ihe Jizọs na-akụzi. Ihe ndị so n’ihe ị mụtara bụ na Jehova chọrọ ka anyị jụ ihe ndị okpukpe ụgha na-akụzi nakwa ka anyị kwụsị ịna-eme ememme si n’aka ndị ọgọ mmụọ. Ị mụtakwara na ọ bụrụ na ị chọrọ ime ihe dị Jehova mma, i kwesịrị ịgbanwe ihe ụfọdụ ná ndụ gị. Ime otú a nwekwara ike ọ gaghị adịrị gị mfe. (Mat. 10:​34-36) N’agbanyeghị nke ahụ, i jisiri ike na-agbanwe, n’ihi na ị hụrụ Nna gị nke eluigwe n’anya, chọọkwa ka ihe gị na-amasị ya. Obi dịkwa ya ezigbo ụtọ n’ebe ị nọ.​—Ilu 27:11.

OTÚ Ị GA-ESI NỌGIDE N’ỤZỌ AHỤ DỊ MKPAGIDE

Ihe ndị Jehova gwara anyị mee na-enyere anyị aka ịnọgide n’ụzọ ahụ dị “mkpagide” (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6 ruo na nke 8) *

6. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 119:​9, 10, 45, 133, gịnị ga-enyere anyị aka ịnọgide n’ụzọ ahụ dị mkpagide?

6 Anyị malite ịga ije n’ụzọ ahụ dị mkpagide, gịnị ga-enyere anyị aka ịnọgide na ya? Legodị ihe atụ a. Ihe e ji rụchie akụkụ ụzọ dị n’elu ugwu na-echebe ọkwọ ụgbọala na ụgbọala ya. A rụrụ ihe ahụ ka o nwee ike ichebe ndị na-akwọ ụgbọala ka ha ghara ịbịa nso n’ọnụ ọnụ ụzọ ahụ ma ọ bụkwanụ si n’ụzọ ahụ dapụ. E nweghị onye ga-asị na otú ahụ a rụchiri ebe ahụ adịghị mma. Ihe ndị Jehova gwara anyị mee e dere na Baịbụl dị ka ihe ahụ e ji rụchie akụkụ ụzọ dị n’elu ugwu. Ihe ndị ahụ ọ gwara anyị mee na-enyere anyị aka ịnọgide na-aga ije n’ụzọ ahụ dị mkpagide.​—Gụọ Abụ Ọma 119:​9, 10, 45, 133.

7. Olee otú ndị na-eto eto kwesịrị isi na-ele ụzọ ahụ dị mkpagide anya?

7 Ndị na-eto eto, è nwere mgbe ụfọdụ unu na-eche na iwu Jehova anaghị ekwe unu megharịa ahụ́? Ọ bụ ihe Ekwensu chọrọ ka unu chee. Ọ chọrọ ka unu lekwasị anya n’ihe ndị na-aga ije n’ụzọ ahụ dị obosara na-eme, nakwa otú o si yie ka hà na-ekpori ndụ. Ọ chọrọ ka unu na-eche na unu anaghị ekpori ndụ otú ụmụ akwụkwọ ibe unu ma ọ bụ ndị unu na-ahụ n’Ịntanet si ekpori ndụ. Ekwensu chọrọ ka unu chee na ihe ndị Jehova gwara unu mee anaghị ekwe ka unu kporie ndụ otú unu kwesịrị. * Ma, chetanụ na Setan achọghị ka ndị na-aga ije n’ụzọ ahụ dị obosara mara ihe ga-eme ha n’ikpeazụ. Ma, Jehova agwala anyị ihe ọ ga-emere ndị nọgidere na-eje ije n’ụzọ ahụ na-eduba ná ndụ.​—Ọma 37:29; Aịza. 35:​5, 6; 65:​21-23.

8. Gịnị ka ndị na-eto eto nwere ike ịmụta n’akụkọ Olaf?

8 Chegodị ihe i nwere ike ịmụta n’akụkọ otu nwanna na-eto eto aha ya bụ Olaf. * Ndị klas ya chọrọ ime ka ọ kwaa iko. Mgbe ọ kọwaara ha na ya bụ Onyeàmà Jehova nakwa na ha na-eme ihe Baịbụl kwuru, ụfọdụ ụmụ agbọghọ nọ na klas ha gbalịsiri ike ka ha na ya nwee mmekọahụ. Ma, Olaf ekweghị ka ha nwata ya. Ọ bụghịkwa naanị ya bụ ọnwụnwa bịaara ya. Olaf sịrị: “Ndị nkụzi anyị nọ na-agwa m ka m gaa mahadum n’ihi na ọ ga-eme ka a na-akwanyere m ùgwù. Ha gwara m na ọ bụrụ na mụ emeghị otú ahụ, ihe agaghị agaziri m ná ndụ.” Gịnị nyeere Olaf aka imeri ọnwụnwa a? Ọ sịrị: “Mụ na ndị ọgbakọ anyị bịara dịrị n’ezigbo mma. Ha ghọrọ ndị ezinụlọ m. M malitekwara ịna-amụsi Baịbụl ike. Ka m na-amụkwu Baịbụl, ka obi na-esikwu m ike na ihe m kweere bụ eziokwu. N’ihi ya, m kpebisiri ike ime baptizim.”

9. Gịnị ka ndị chọrọ ịnọgide n’ụzọ ahụ dị mkpagide ga na-eme?

9 Setan ga-achọ ime ka i si n’ụzọ ahụ na-eduba ná ndụ pụọ. Ọ chọrọ ka i soro n’ọtụtụ ndị na-aga n’ụzọ ahụ dị obosara nke “na-eduba ná mbibi.” (Mat. 7:13) Ma, ihe ga-eme ka anyị nọgide n’ụzọ ahụ dị mkpagide bụ ịna-ege Jizọs ntị ma na-ewere ya ka ihe ga-echebe anyị. Ugbu a, ka anyị tụlee ihe ọzọ Jizọs kwuru na anyị kwesịrị ịna-eme.

MEE KA GỊ NA NWANNA GỊ DỊRỊ N’UDO

10. Dị ka e kwuru na Matiu 5:​23, 24, gịnị ka Jizọs kwuru na anyị kwesịrị ime?

10 Gụọ Matiu 5:​23, 24. N’amaokwu ndị a, Jizọs kwuru gbasara otu ihe dị ndị Juu na-ege ya ntị ezigbo mkpa. Chegodị gbasara onye nọ n’ụlọ nsọ na-achọ inye onye nchụàjà anụmanụ ọ chọrọ iji chụọ àjà. Ọ bụrụ na ọ nọrọ ebe ahụ cheta na nwanna ya na-ewere ya iwe, o kwesịrị ịhapụ anụmanụ ahụ pụọ. N’ihi gịnị? Olee ihe nwere ike ịdị mkpa karịa ịchụrụ Jehova àjà? Jizọs kwuru hoo haa, sị: “Buru ụzọ gaa ka gị na nwanne gị kpezie.”

Ị̀ ga-eme ka Jekọb bụ́ onye weturu onwe ya ala mee ka ya na nwanne ya dịrị n’udo? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11 na nke 12) *

11. Gịnị ka Jekọb mere ka ya na Ịsọ kpezie?

11 Anyị nwere ike isi n’aka Jekọb mụta ihe dị ezigbo mkpa gbasara ime udo. Mgbe Jekọb si n’ebe a mụrụ ya gbapụ ruo afọ iri abụọ, Jehova si n’ọnụ mmụọ ozi gwa ya ka ọ laghachi obodo ya. (Jen. 31:​11, 13, 38) Ma, e nwere nsogbu dịnụ. O nwere mgbe Ịsọ nwanne ya chọrọ igbu ya. (Jen. 27:41) “Ezigbo ụjọ wee jide Jekọb, ya echegbuwe onwe ya” na nwanne ya ka nwere ike ịna-eburu ya iwu n’obi. (Jen. 32:7) Gịnị ka Jekọb mere ka ya na nwanne ya kpezie? Nke mbụ, o kpesiri ekpere ike gbasara ya. Ihe ọzọ o mere bụ izigara Ịsọ onyinye buru ibu. (Jen. 32:​9-15) N’ikpeazụ, mgbe ya na nwanne ya hụrụ ihu na ihu, ọ kwanyeere ya ùgwù, kpọọrọ ya isiala ugboro asaa. Umeala n’obi Jekọb na ùgwù ọ kwanyeere nwanne ya mere ka ha kpezie.​—Jen. 33:​3, 4.

12. Gịnị ka anyị mụtara n’ihe Jekọb mere?

12 Anyị ga-amụta ezigbo ihe n’otú Jekọb si jikere izute nwanne ya na ihe o mere mgbe o zutere ya. O weturu onwe ya ala rịọ Jehova ka o nyere ya aka. O mere ike ya niile ka ya na nwanne ya nwoke mee udo iji gosi na ihe ahụ o kpere n’ekpere si ya n’obi. Mgbe ya na nwanne ya hụrụ, o bidoghị kwuwe gbasara onye metere na onye na-emeteghị. Ihe bụ́ mkpa Jekọb bụ ime udo. Olee otú anyị nwere ike isi mee ka Jekọb?

OTÚ ANYỊ NA NDỊ ỌZỌ GA-ESI NA-EME UDO

13-14. Ọ bụrụ na anyị emejọọ nwanna anyị, gịnị ka anyị kwesịrị ime?

13 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-aga n’ụzọ ahụ dị mkpagide, anyị kwesịrị ịna-eme ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’udo. (Rom 12:18) Gịnị ka anyị ga-eme ma anyị chọpụta na anyị emejọọla nwanna anyị? Anyị kwesịrị ikpe ekpere otú ahụ Jekọb mere. Anyị nwere ike ikpe ekpere ka Jehova nyere anyị aka ka anyị na nwanna ahụ kpezie.

14 Anyị kwesịkwara iwepụta oge chebara onwe anyị echiche. Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị ajụjụ ndị a: ‘M̀ dị njikere ikweta na m mejọrọ ihe, wetuo onwe m ala rịọ mgbaghara ka udo dị? Olee otú obi ga-adị Jehova na Jizọs ma ọ bụrụ na mụ eburu ụzọ gaa ka mụ na nwanna m mee udo?’ Ihe anyị zara n’ajụjụ ndị a ga-eme ka anyị gee Jizọs ntị ma jiri umeala n’obi gakwuru nwanna anyị ahụ ka anyị na ya kpezie. Anyị kwesịrị ime ka Jekọb.

15. Olee otú ime ihe e kwuru ná Ndị Efesọs 4:​2, 3 nwere ike isi nyere anyị aka ka anyị na nwanna anyị mee udo?

15 Chegodị ihe gaara eme ma a sị na Jekọb dịwara mpako mgbe ya na nwanne ya zutere. E nwere ike ha agaraghị ekpezi. Ọ bụrụ na anyị agakwuru nwanna anyị ka anyị na ya mee udo, anyị kwesịrị iwetu onwe anyị ala. (Gụọ Ndị Efesọs 4:​2, 3.) Ilu 18:19 sịrị: “Ọ na-esi ezigbo ike ime ka obi jụrụ nwanne e mejọrọ karịa otú ọ na-esi ike imeri obodo a rụsiri ike. Esemokwu na-ekewakwa ndị mmadụ otú ọnụ ụzọ ámá a tụchiri atụchi n’obodo a rụsiri ike si ekewa ndị nọ n’ime ya na ndị nọ n’èzí.” Anyị wetuo obi rịọ nwanna anyị mgbaghara, o nwere ike ime ka anyị na ya kpezie.

16. Gịnị ka anyị kwesịrị ichebara echiche, n’ihi gịnịkwa?

16 Anyị kwesịkwara ịkpachara anya n’ihe anyị chọrọ ịgwa nwanna anyị na otú anyị si ekwu ya. Ọ bụrụ na anyị ejikere ịgakwuru nwanna anyị, ihe anyị kwesịrị iburu n’obi bụ ịgwa ya okwu otú ga-eme ka anyị na ya kpezie. Ná mmalite, o nwere ike ikwu ihe na-adịghị mma, ya emee ka anyị wewe iwe ma ọ bụ mee ka anyị gọrọwa isi anyị. Ma ime otú ahụ ọ̀ ga-eme ka udo dịrị? Mba. Cheta na gị na nwanna gị ikpezi dị mkpa karịa ịchọwa onye metara na onye na-emetaghị.​—1 Kọr. 6:7.

17. Gịnị ka i nwere ike ịmụta n’ihe Gilbert mere?

17 Otu nwanna aha ya bụ Gilbert gbasiri mbọ ike ka ya na ndị ọzọ na-adị n’udo. Ọ sịrị: “Mụ na nwa m nwaanyị sere ezigbo okwu. Ruo ihe karịrị afọ abụọ, m gbasiri mbọ ike ka m wetuo obi ka mụ na ya kwurịta ya ka anyị nwee ike kpezie.” Gịnị ọzọ ka nwanna Gilbert mere? Ọ sịrị: “Tupu mụ na ya ekwuo, m na-ebu ụzọ kpee ekpere gwa onwe m na mụ ekwesịghị iwe iwe ọ bụrụgodị na ọ gwa m okwu ọjọọ. M kwesịrị ịdị njikere ịgbaghara ya. M ma na ihe m kwesịrị ime abụghị igosi ya na o nweghị ihe ọjọọ m mere ya. Ọ bụ ọrụ m ime ka udo dịrị.” Gịnị si n’ihe a nwanna Gilbert mere pụta? Ọ sịrị: “Taa, obi eruola m ala na mụ na ndị ezinụlọ anyị niile dị n’ezigbo mma.”

18-19. Ọ bụrụ na anyị emejọọ mmadụ, olee ihe anyị kwesịrị ikpebisi ike ime? N’ihi gịnịkwa?

18 Gịnịzi ka i kwesịrị ikpebi ime ma ị chọpụta na e nwere nwanna i mejọrọ? Gbalịa ka gị na ya mee udo otú ahụ Jizọs kwuru. Kpee ekpere gbasara ya, tụkwasịkwa Jehova obi na ọ ga-eji mmụọ nsọ ya nyere gị aka ime udo. I mee otú ahụ, obi ga-adị gị ụtọ, ị ga-egosikwa na ị na-ege Jizọs ntị.​—Mat. 5:9.

19 Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova si n’aka Jizọs bụ́ “onyeisi ọgbakọ ya” na-eduzi anyị. (Efe. 5:23) Ka anyị kpebisie ike ‘ịna-ege ya ntị’ otú ahụ ndịozi bụ́ Pita, Jems na Jọn mere. (Mat. 17:5) Anyị elebala anya n’otú anyị nwere ike isi mee ka anyị na ụmụnna anyị ndị anyị mejọrọ kpezie. Ọ bụrụ na anyị ana-eme otú ahụ ma nọgide n’ụzọ ahụ na-eduba ná ndụ, anyị ga-enweta ọtụtụ ngọzi ugbu a, na-enwekwa obi ụtọ ruo ebighị ebi.

ABỤ NKE 130 Na-agbaghara Ndị Ọzọ

^ par. 5 Jizọs gwara anyị ka anyị na-aga ije n’ọnụ ụzọ ámá dị mkpagide nke na-eduba ná ndụ. Ọ gwakwara anyị ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’udo. Olee ihe ụfọdụ nwere ike ime ka o siere anyị ike ime ihe a Jizọs kwuru? Oleekwa otú anyị ga-esi emeri ha?

^ par. 7 Na broshọ bụ́ Azịza Ajụjụ Iri Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, gụọ ajụjụ nke isii isiokwu ya bụ “Olee Otú M Ga-esi Merie Nsogbu Ndị Ọgbọ M Na-enye M?” nakwa katuun a na-ese na bọọdụ dị na jw.org aha ya bụ Ekwela Ka Ndị Ọgbọ Gị Rafuo Gị. (Gaa n’ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI, pịa NDỊ NA-ETO ETO.)

^ par. 8 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ par. 56 NKỌWA FOTO: Ịnọ n’ụzọ ahụ dị “mkpagide” na-eme ka anyị ghara ịna-ele ndị gba ọtọ, ka anyị na ndị ọjọọ ghara ịna-akpa, nakwa ka anyị ghara ibute agụmakwụkwọ ụzọ ná ndụ anyị.

^ par. 58 NKỌWA FOTO: Jekọb kpọọrọ Ịsọ isiala ọtụtụ ugboro iji mee ka ha kpezie.