Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Anyị Ga-akwụsịli Ịkpọ Ndị Ọzọ Asị

Anyị Ga-akwụsịli Ịkpọ Ndị Ọzọ Asị

È nwetụla mgbe mmadụ kpọrọ gị asị?

Ọ bụrụ na e nwetụbeghị, ọ ga-abụ na ị hụtụla ndị a kpọrọ asị. N’akụkọ ụwa, anyị na-anụkarị gbasara ndị kpọrọ ndị ọzọ asị n’ihi agbụrụ ha si, ma ọ bụ n’ihi na ha bụ ụmụ nwoke ma ọ bụ ụmụ nwaanyị ma ọ bụkwanụ ndị mbịarambịa. Ọ bụ ya mere ndị ọchịchị n’obodo dị iche iche ji eti iwu na mmadụ mesie onye ọzọ ike maka na ọ kpọrọ ya asị, a ga-ata ya ezigbo ahụhụ.

Ndị a kpọrọ asị na-akpọkarịkwa ndị ọzọ asị. Ndị e mere ihe ọjọọ maka na a kpọrọ ha asị na-emegwarakarị ihe e mere ha. Ihe a na-emekwa ka ịkpọasị na-arị ibe ya elu.

O nwere ike ịbụ na e nwetụla onye kpọrọ gị asị maka obodo i si. Ma ọ bụkwanụ na mmadụ akwatụla gị emo, kparịa gị, ma ọ bụ yie gị egwu. E nwedịrị ihe ndị ọzọ ka njọ ịkpọasị na-akpata. Ọ na-emekarị ka obi fee ndị mmadụ azụ, ha ana-emesi ndị ọzọ ike, na-emebisị ihe ndị ọzọ nwe, na-eti ndị ọzọ ihe, na-edina ndị ọzọ n’ike, na-egbu ndị ọzọ, ma ọ bụdị gbukpọọ otu agbụrụ.

Ụlọ Nche a ga-eme ka anyị mata otú ịkpọasị ga-esi akwụsị. Ọ ga-azakwa ajụjụ ndị a:

  • Gịnị mere ọtụtụ ndị ji akpọ ibe ha asị?

  • Gịnị ka mmadụ ga-eme ka ọ kwụsị ịkpọ ndị ọzọ asị?

  • È nwere mgbe ịkpọasị na-agaghịzi adị n’ụwa a?