Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 6

Obi Ò Siri Gị Ike na Jehova Na-eme Ihe Dị Mma Mgbe Niile?

Obi Ò Siri Gị Ike na Jehova Na-eme Ihe Dị Mma Mgbe Niile?

“Ọ bụ Oké Nkume. Ihe ọ na-eme zuru okè n’ihi na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi n’ihe niile ọ na-eme. Ọ bụ Chineke e kwesịrị ịtụkwasị obi, onye na-anaghị ekpe ikpe na-ezighị ezi. Ọ bụ onye ezi omume na onye na-eme ihe ziri ezi.​—DIUT. 32:4.

ABỤ NKE 3 Ị Bụ Ike Anyị, Olileanya Anyị, na Obi Ike Anyị

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. (a) Gịnị mere o ji esiri ọtụtụ ndị ike ịtụkwasị ndị ọchịchị obi taa? (b) Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a?

 TAA, ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike ịtụkwasị ndị ọchịchị obi. Ihe kpatara ya bụ na ha ahụla na ọtụtụ mgbe, ndị ọchịchị na-eme iwu ndị na-abara ndị ọnụ na-eru n’okwu na ndị bara ọgaranya uru. O nweghịkwa ihe ha ji ndị ogbenye kpọrọ. Ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Mmadụ nọ na-achị mmadụ ibe ya ọchịchị nchịgbu.” (Ekli. 8:9) Ihe ọzọ bụ na ụfọdụ ndị isi okpukpe na-eme ihe ndị na-adịghị mma, ya emezie ka ụfọdụ ndị ghara ịtụkwasị Chineke obi. N’ihi ya, ọ bụrụ na mmadụ ekweta ka anyị mụwara ya Baịbụl, anyị ga-agba mbọ nyere ya aka ka ọ mụta ịna-atụkwasị Jehova na ndị o ji eduzi nzukọ ya n’ụwa taa obi.

2 Ma, ọ bụghị naanị ndị anyị na-amụrụ Baịbụl kwesịrị ịmụta ịna-atụkwasị Jehova na nzukọ ya obi. Ọ bụrụgodị na anyị anọọla n’ọgbakọ ruo ọtụtụ afọ, anyị kwesịkwara ịna-atụkwasị Jehova obi na otú o si eme ihe kacha mma. Mgbe ụfọdụ, o nwere ihe ndị nwere ike ime ka a mata ma obi ò siri anyị ike na Jehova na-eme ihe dị mma mgbe niile. N’isiokwu a, anyị ga-ahụ atọ n’ime ha: (1) mgbe anyị gụrụ akụkọ ụfọdụ a kọrọ na Baịbụl, (2) mgbe nzukọ Jehova gwara anyị ihe anyị ga-eme, na (3) mgbe ihe ga-esiri anyị ike n’ọdịnihu.

TỤKWASỊ JEHOVA OBI MGBE Ị NA-AGỤ BAỊBỤL

3. Olee otú ihe ụfọdụ a kọrọ na Baịbụl nwere ike isi mee ka a mata ma ànyị tụkwasịrị Jehova obi?

 3 Anyị gụwa Okwu Chineke, o nwere ihe ndị nwere ike ịgbagwoju anyị anya banyere otú Jehova si mesoo ụfọdụ ndị ihe na ihe mere o ji mee ihe ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ Ọnụ Ọgụgụ gwara anyị na Jehova kwuru ka e gbuo otu nwoke Izrel nọ na-akpa nkụ n’Ụbọchị Izu Ike. Ma, n’akwụkwọ Samuel nke Abụọ, anyị gụtara na mgbe ọtụtụ afọ gachara, Jehova gbaghaara Eze Devid mgbe ọ kwara iko, gbuokwa mmadụ. (Ọnụ Ọgụ. 15:​32, 35; 2 Sam. 12:​9, 13) Anyị nwere ike ịna-eche, sị, ‘Gịnị mere Jehova ga-eji gbaghara Devid, onye gburu mmadụ, kwaakwa iko, ma kwuo ka e gbuo onye mmehie ya yiri ihe na-abụghị oké ihe?’ Iji zaa ajụjụ a, anyị ga-eleba anya n’ihe atọ anyị kwesịrị iburu n’uche ma anyị na-agụ Baịbụl.

4. Olee otú ihe e dere na Jenesis 18:​20, 21 na Diuterọnọmi 10:17 si eme ka obi sie anyị ike na Jehova na-ekpe ikpe ziri ezi?

4 Ọ bụghị mgbe niile ka Baịbụl na-agwa anyị ihe niile merenụ gbasara ihe ọ kọrọ. Dị ka ihe atụ, anyị ma na Devid ji obi ya niile chegharịa ná mmehie ya. (Ọma 51:​2-4) Ma, olee ụdị mmadụ nwoke ahụ mebiri iwu Ụbọchị Izu Ike bụ? Ihe o mere ò wutere ya? Ò mebiela iwu Jehova na mbụ? À dọbuola ya aka ná ntị, ya ajụ ịnabata ya? Baịbụl agwaghị anyị. Ma otu ihe doro anya bụ na Jehova “anaghị ekpe ikpe na-ezighị ezi.” (Diut. 32:4) Ọ na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe niile n’ihi na ọ ma ihe niile merenụ. Ọ naghị eme ka ndị mmadụ, ndị na-ekpe ikpe na-ezighị ezi mgbe ụfọdụ n’ihi na ha na-eji ihe ha nụrụ ma ọ bụ ihe ha chere banyere mmadụ ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ ekpe ya ikpe. (Gụọ Jenesis 18:​20, 21; Diuterọnọmi 10:17.) Ka anyị na-amụtakwu banyere Jehova na iwu ya, obi ga na-esikwu anyị ike na ihe ọ bụla o kpebiri dị mma. Ọ bụrụgodị na e nwere ihe anyị gụtara na Baịbụl anyị na-amaghị ihe mere o ji dị otú ahụ, ihe ndị anyị mụtara banyere Chineke ga-eme ka obi sie anyị ike na “ihe niile Jehova na-eme na-egosi na ọ bụ onye ezi omume.”​—Ọma 145:17.

5. Olee otú ezughị okè nwere ike isi eme ka anyị ghara ịna-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị mgbe ụfọdụ? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Ezughị Okè Na-eme Ka Anyị Ghara Ịna-ele Ihe Anya Otú Kwesịrị Ekwesị.”)

5 Ezughị okè na-eme ka anyị ghara ịna-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị mgbe ụfọdụ. Chineke kere anyị n’oyiyi ya. N’ihi ya, ọ naghị amasị anyị ịhụ ka a na-emegbu mmadụ. (Jen. 1:26) Ma, ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, anyị nwere ike ịghọtahie ihe, ọ bụrụgodị na anyị chere na anyị ma ihe niile banyere ya. Dị ka ihe atụ, ọ̀ kwa i chetara otú obi si jọọ Jona njọ mgbe Jehova meere ndị Ninive ebere? (Jona 3:10–4:1) Ma, chegodị uru ihe Jehova mere bara. A zọrọ ndị Ninive dị ihe karịrị otu narị puku na puku iri abụọ (120,000) ndụ n’ihi na ha chegharịrị. Akụkọ a gosiri na ọ bụ Jona ghọtahiere ndị Ninive, ọ bụghị Jehova.

6. Gịnị mere na ọ bụghị iwu na Jehova ga-akọwara anyị ihe o kpebiri ime?

6 Iwu ejighị Jehova ịkọrọ anyị ihe mere o ji mee ihe ọ bụla o mere. N’oge ochie, Jehova kwere ka ụfọdụ ndị ohu ya kwuo otú obi dị ha banyere ihe o kpebiri ime ma ọ bụ ihe ndị o mere. (Jen. 18:25; Jona 4:​2, 3) O nwere oge ndị ọ kọwara ihe mere o ji mee ihe o mere. (Jona 4:​10, 11) Ma, ọ bụghị iwu na ọ ga-akọwara anyị ihe mere o ji mee ihe o mere. Ebe ọ bụ ya kere anyị, o kwesịghị ịnata anyị ikike tupu ya emee ihe ọ chọrọ ime ma ọ bụkwanụ mgbe o mechara.​—Aịza. 40:​13, 14; 55:9.

TỤKWASỊ JEHOVA OBI MA NZUKỌ YA GWA GỊ IHE Ị GA-EME

7. Olee ihe nwere ike isiri anyị ike, n’ihi gịnịkwa?

7 O doro anyị anya na Jehova na-eme ihe dị mma mgbe niile. Ma, o nwere ike ịna-esitụrụ anyị ike mgbe ụfọdụ ịtụkwasị ụmụ mmadụ ndị o ji eduzi anyị obi. Anyị nwere ike ịna-eche ma ụmụnna ndị a hà na-eme ihe Jehova chọrọ ka ha mee, ka hà na-eme ihe ha chere. O nwere ike ịbụ otú a ka ọ dị ụfọdụ ndị n’oge e dere Baịbụl. Ọ̀ kwa i chetara ndị e kwuru gbasara ha na  paragraf nke atọ? Ndị ikwu nwoke ahụ mebiri iwu Ụbọchị Izu Ike nwere ike ịna-eche ma Mosis ọ̀ jụtakwara Jehova ihe o chere tupu ya ekwuo na e kwesịrị igbu nwoke ahụ. Ndị enyi Yuraya onye Het, onye Devid na nwunye ya kwara iko, nwere ike ịna-eche na Devid ji ikike ya mee ka a ghara ịta ya ahụhụ n’ihi na ọ bụ eze. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na anyị agaghị ekwuli na anyị tụkwasịrị Jehova obi ma ọ bụrụ na anyị atụkwasịghị ndị o ji eduzi anyị obi, bụ́kwanụ ndị yanwa tụkwasịrị obi.

8. Olee otú ihe e kwuru n’Ọrụ Ndịozi 16:​4, 5 si yie ihe a na-eme n’ọgbakọ Ndị Kraịst taa?

8 Jehova na-eji “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” eduzi nzukọ ya n’ụwa taa. (Mat. 24:45) Ohu ahụ na-elekọta ndị Chineke n’ụwa niile ma na-agwa ndị okenye ihe ha ga-eme, otú ahụ òtù na-achị isi mere n’oge ndịozi Jizọ. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 16:​4, 5.) Ndị okenye na-emezi ihe a gwara ha mee n’ọgbakọ. Anyị ga-egosi na anyị tụkwasịrị otú Jehova si eme ihe obi ma ọ bụrụ na anyị ana-erube isi ná ntụziaka ọ bụla Òtù Na-achị Isi na ndị okenye nyere.

9. Olee mgbe o nwere ike isiri anyị ike ime ihe ndị okenye gwara anyị mee, n’ihi gịnịkwa?

9 Mgbe ụfọdụ, o nwere ike isiri anyị ike ime ihe ndị okenye sịrị anyị mee. Dị ka ihe atụ, n’oge na-adịbeghị anya, a hazigharịrị ọgbakọ na sekit dị iche iche. N’ebe ụfọdụ, ndị okenye gwara ụmụnna ụfọdụ ka ha gafee n’ọgbakọ ọzọ ka e nwee ike ịna-anọju oche ndị dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ bụrụ na a sị anyị gafee n’ọgbakọ ọzọ, o nwere ike isitụrụ anyị ike ịhapụ ndị enyi anyị na ndị ezinụlọ anyị. Ọ̀ bụ mmụọ nsọ Chineke na-agwa ndị okenye ebe ha ga-eziga onye nkwusa ọ bụla? Mba. Iche banyere ihe a nwere ike ime ka o sitụrụ anyị ike ime ihe ha gwara anyị. Ma, Jehova tụkwasịrị ndị okenye obi na ha ga-ekpebi ihe dị mma. Anyị kwesịkwara ịtụkwasị ha obi. *

10. Dị ka e kwuru ná Ndị Hibru 13:​17, gịnị mere anyị kwesịrị iji na-erubere ndị okenye isi?

10 Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-erubere ndị okenye isi ọ bụrụgodị na ihe ha sịrị anyị mee abụghị ihe anyị gaara achọ ime? Ọ bụ n’ihi na ọ bụrụ na anyị emee ya, ọ ga-eme ka ndị Chineke na-adị n’otu. (Efe. 4:​2, 3) Ihe na-aga nke ọma n’ọgbakọ ma ọ bụrụ na ndị niile nọ n’ọgbakọ ejiri obi umeala na-erube isi n’ihe ndị okenye kwuru. (Gụọ Ndị Hibru 13:17.) Ihe kadị mkpa bụ na irubere ndị Jehova họpụtara ka ha na-elekọta anyị isi ga-egosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi.​—Ọrụ 20:28.

11. Olee ihe ga-eme ka obi sie anyị ike irube isi ná ntụziaka ndị okenye nyere?

11 Otu ihe ga-enyere anyị aka irube isi ná ntụziaka ndị okenye nyere bụ icheta na ha na-ekpe ekpere rịọ ka mmụọ nsọ Chineke nyere ha aka mgbe ha na-ekpebi ihe a ga-eme n’ọgbakọ. Ha na-asa anya ná mmiri chọọ ihe Baịbụl kwuru na ihe nzukọ Jehova kwuru banyere ihe ha chọrọ ime. Ha ji obi ha niile chọọ ime ihe dị Jehova mma, chọọkwa ịna-elekọta ndị ya otú kacha mma. Ụmụnna ndị a kwesịrị ntụkwasị obi ma na ha ga-aza Jehova ajụjụ maka otú ha si lekọta ndị ya. (1 Pita 5:​2, 3) Chegodị banyere ihe a: Agbụrụ, okpukpe, na ndọrọ ndọrọ ọchịchị emeela ka ndị mmadụ ghara ịdị n’otu n’ụwa taa. Ma, ndị Jehova dị n’otu, na-efekwa ezi Chineke. Naanị ihe mere o ji kwe omume bụ n’ihi na Jehova na-agọzi nzukọ ya.

12. Olee ihe ndị okenye kwesịrị ichebara echiche nke ọma tupu ha ekpebie ma onye mere mmehie ò chegharịala ná mmehie ya?

12 Otu ọrụ gbara ọkpụrụkpụ Jehova nyere ndị okenye bụ ịhụ na ọgbakọ ya na-adị ọcha. Ọ bụrụ na Onye Kraịst emee mmehie dị oké njọ, Jehova na-atụ anya na ndị okenye ga-ekpebi ma onye ahụ ọ̀ ka kwesịrị ịnọ n’ọgbakọ. Otu n’ime ihe ndị ha ga-achọpụta bụ ma ihe onye ahụ mere ò wutere ya n’eziokwu. Onye ahụ nwere ike ime ka ihe o mere ò wutere ya. Ma, ha ga-achọ ịma ma ọ̀ kpọrọ ihe ọjọọ ahụ o mere asị n’eziokwu. Ò kpebisiela ike na ọ gaghị eme ya ọzọ? Ọ bụrụ na ihe mere o ji mee ihe ahụ bụ n’ihi na ya na ndị ọjọọ na-akpa, ọ̀ dị njikere ịkwụsị iso ha akpa? Ndị okenye na-ekpe ekpere, leba anya n’ihe ndị merenụ, chọpụta ihe Baịbụl kwuru na otú obi dị onye ahụ mere mmehie gbasara ihe ahụ o mere. Ha ga-ekpebizi ma à ga-ahapụ ya n’ọgbakọ. Mgbe ụfọdụ, a na-achụ ụdị onye ahụ n’ọgbakọ.​—1 Kọr. 5:​11-13.

13. Olee ihe anyị nwere ike ịna-eche ma ọ bụrụ na a chụọ enyi anyị ma ọ bụ onye ezinụlọ anyị n’ọgbakọ?

13 Olee ihe e nwere ike iji mata ma ànyị tụkwasịrị ndị okenye obi? Ọ bụrụ na a chụọ onye na-abụghị enyi anyị ma ọ bụ onye ezinụlọ anyị n’ọgbakọ, o nwere ike ịdịrị anyị mfe ikweta na ihe ndị okenye kpebiri dị mma. Ma, ọ bụrụkwanụ na onye a chụrụ n’ọgbakọ bụ onye anyị na ya dị n’ezigbo mma? Anyị nwere ike ịna-eche na ndị okenye elebaraghị okwu ahụ anya nke ọma ma ọ bụkwanụ ma otú ha si kpee ikpe ahụ ọ̀ bụ otú Jehova gaara esi ekpe ya. Olee ihe nwere ike inyere anyị aka ịnabata ihe ndị okenye kpebiri?

14. Olee ihe ga-enyere anyị aka ma ọ bụrụ na ndị okenye ekpebie na a ga-achụ onye ezinụlọ anyị ma ọ bụ enyi anyị n’ọgbakọ?

14 Anyị kwesịrị icheta na ọ bụ Jehova mere ndokwa ka a na-achụ ndị mmehie na-ekweghị echegharị n’ọgbakọ. Ọ na-abakwara ma ọgbakọ ma onye ahụ mere mmehie uru. A hapụ onye mere mmehie dị oké njọ na-ekweghị echegharị n’ọgbakọ, o nwere ike ime ka ndị ọzọ soro ya kpawa àgwà ọjọọ. (Gal. 5:9) Ihe ọzọ bụ na o nwere ike ime ka ọ ghara ịma otú ihe o mere dịruru ná njọ, meekwa ka ọ ghara ịgba mbọ mee ka ya na Jehova dịrị ná mma. (Ekli. 8:11) Ka obi sie anyị ike na ndị okenye ga-elezi anya tupu ha ekpebie ma à ga-achụ mmadụ n’ọgbakọ. Ha na-echeta ihe a gwara ndị ikpe Izrel n’oge ochie, ya bụ, na ‘ọ bụghị mmadụ ka ha na-ekpere ikpe kama ọ bụ Jehova.’​—2 Ihe 19:​6, 7.

OTÚ ỊTỤKWASỊ JEHOVA OBI UGBU A GA-ESI BAARA ANYỊ URU N’ỌDỊNIHU

Gịnị ga-enyere anyị aka irube isi ná ntụziaka ndị a ga-enye anyị n’oge oké mkpagbu? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)

15. Gịnị mere anyị kwesịrị iji tụkwasị ntụziaka Jehova na-enye anyị obi ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ?

15 Ka ọgwụgwụ ụwa ochie a na-eru nso, ọ dị anyị mkpa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ ịtụkwasị Jehova obi na ọ na-eme ihe dị mma mgbe niile. Maka gịnị? Ọ bụ maka na n’oge oké mkpagbu, e nwere ike inye anyị ntụziaka ndị nwere ike isiri anyị ike ịghọta ma ọ bụ ime. O doro anya na Jehova agaghị esi n’eluigwe gwa anyị okwu. O nwere ike isi n’aka ndị o ji eduzi nzukọ ya mee ka anyị mata ihe anyị ga-eme. Ọ bụrụ na ha agwa anyị ihe anyị ga-eme n’oge ahụ, anyị ekwesịghị ịbịa chewe ma ọ̀ bụ ihe anyị kwesịrị ime ma ọ bụ na ọ bụghị, ma ọ bụkwanụ na-eche, sị, ‘Ọ̀ bụ ihe a ka Jehova chọrọ ka anyị mee? Ka ọ̀ ga-abụ na ụmụnna ndị a na-agwa anyị ihe dị ha mma?’ Ị̀ ga-atụkwasị Jehova na nzukọ ya obi n’oge ahụ? Ihe ị na-eme ugbu a ma nzukọ Jehova gwa anyị ihe anyị ga-eme ga-egosi ihe ị ga-eme n’oge ahụ. Ọ bụrụ na ị na-atụkwasị ntụziaka ndị ha na-enye anyị ugbu a obi ma na-eme ihe ha gwara anyị mee ozugbo, ọ ga-adịrị gị mfe ime ya n’oge oké mkpagbu.​—Luk 16:10.

16. N’ọdịnihu, gịnị nwere ike ime ka a mata ma ànyị tụkwasịrị Jehova obi na ihe ọ bụla o kpebiri ime kacha mma?

16 Anyị kwesịkwara iche echiche nke ọma banyere ihe anyị ga-eme gbasara ihe Jehova ga-ekpebi ime mgbe ọ ga-ebibi ụwa Setan a. Ka ọ dị ugbu a, anyị na-atụ anya na ọtụtụ ndị na-anaghị efe Jehova ugbu a, ma ndị ikwu anyị, ga-emecha kpebie ife Jehova tupu ọgwụgwụ abịa. Ma n’Amagedọn, Jehova ga-esi n’aka Jizọs kpee onye ọ bụla ikpe. (Mat. 25:​31-33; 2 Tesa. 1:​7-9) Ọ bụghị anyị ka ọ dịịrị ikpebi onye Jehova ga-emere ebere ma ọ bụ onye ọ na-agaghị emere ebere. (Mat. 25:​34, 41, 46) Obi ọ̀ ga-esi anyị ike na ihe ọ bụla Jehova kpebiri kacha mma, ka ànyị ga-akwụsị ife Jehova maka na anyị ekwetaghị ihe o kpebiri? O doro anya na anyị kwesịrị ime ka obi sie anyị ike ugbu a na ihe ọ bụla Jehova kpebiri dị mma n’ihi na ọ ga-eme ka anyị tụkwasị ya obi kpamkpam n’ọdịnihu.

17. Olee uru ihe ndị Jehova mere ga-abara anyị ma e bibichaa ụwa Setan?

17 Chegodị otú obi ga-adị anyị n’ụwa ọhụrụ Chineke mgbe anyị ga-ahụ uru ihe ndị o mere bara. A gaghịzi enwe okpukpe ụgha ma ọ bụkwanụ ndị azụmahịa anyaukwu ha na ndị ọchịchị na-agbakọ aka eme ka ihe siere ndị mmadụ ike kemgbe ụwa. Ọrịa na nká ga-ala ka naị. Mmadụ agaghịzi na-anwụnahụ anyị. A ga-eke Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya agbụ ruo otu puku afọ. Nsogbu niile nnupụisi ha kpatara agaghịzi adị. (Mkpu. 20:​2, 3) Obi ga-adị anyị ezigbo ụtọ mgbe ahụ na anyị tụkwasịrị Jehova obi na otú o si eme ihe kacha mma.

18. Olee ihe anyị mụtara n’ihe ụmụ Izrel mere e kwuru n’Ọnụ Ọgụgụ 11:​4-6 na 21:5?

18 N’ụwa ọhụrụ, è nwere ihe nwere ike ime ka o siere anyị ike inwe obi ike na ihe Jehova mere dị mma? Chegodị banyere ihe mere obere oge ụmụ Izrel si n’ịgba ohu n’Ijipt pụta. Ụfọdụ n’ime ha malitere ịtamu ntamu maka na ha anaghịzi eri ụdị nri ha na-eribu n’Ijipt. Ha kpọrọ mana Jehova nyere ha ka ha na-eri asị ma sị na ọ baghị uru. (Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 11:​4-6; 21:5.) Ụdị ihe a ò nwere ike ime anyị ma oké mkpagbu gachaa? Anyị amaghị otú ọrụ anyị ga-arụ iji mee ka ụwa a dị ọcha ma ghọọ paradaịs ga-aha. Ọ dị ka ànyị ga-arụ ọtụtụ ọrụ. O nwekwara ike ime ka ihe sitụrụ anyị ike ná mmalite. Ànyị ga-atamu ntamu banyere ihe ndị Jehova ga-enye anyị n’oge ahụ? Otu ihe doro anya bụ na ọ bụrụ na obi dị anyị ụtọ maka ihe ndị Jehova na-enye anyị ugbu a, obi ga-adịkwa anyị ezigbo ụtọ maka ihe ndị ọ ga-enye anyị n’oge ahụ.

19. Olee ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ isiokwu a na-akụziri anyị?

19 Jehova na-eme ihe dị mma mgbe niile. Obi kwesịrị isi anyị ike na ọ bụ eziokwu. Anyị kwesịkwara ịtụkwasị ndị Jehova ji eduzi anyị obi, n’ihi na ọ tụkwasịrị ha obi. Anyị ekwesịghị ichefu ihe Jehova si n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Aịzaya gwa anyị. Ọ sịrị: “Unu ga-adị ike naanị ma unu nọrọ jii ma tụkwasị m obi.”​—Aịza. 30:15.

ABỤ NKE 98 Akwụkwọ Nsọ Si n’Ike Mmụọ Nsọ Chineke

^ par. 5 Isiokwu a ga-eme ka anyị mata mkpa ọ dị ịtụkwasị Jehova na ụmụ mmadụ ndị o ji eduzi anyị obi. Anyị ga-ahụkwa uru ime ihe ndị a ga-abara anyị ugbu a nakwa otú ọ ga-esi nyere anyị aka n’ọdịnihu.

^ par. 9 Mgbe ụfọdụ, e nwere ihe dị ezigbo mkpa nwere ike ime ka a ghara ịgbanwere nwanna ma ọ bụ ezinụlọ ọgbakọ. Gụọ “Igbe Ajụjụ” dị n’Ozi Alaeze Anyị nke Nọvemba 2002.