Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 8

Ndụmọdụ Ị Na-enye Ọ̀ “Na-eme Ka Obi Dị Mmadụ Ụtọ”?

Ndụmọdụ Ị Na-enye Ọ̀ “Na-eme Ka Obi Dị Mmadụ Ụtọ”?

“Mmanụ na ihe na-esi ísì ọma na-eme ka obi dị mmadụ ụtọ. Ezigbo ndụmọdụ enyi nyere enyi ya na-emekwa ka obi dị enyi ya ụtọ.”​—ILU 27:9.

ABỤ NKE 102 “Nyere Ndị Na-adịghị Ike Aka”

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. Olee ihe otu nwanna mụtara banyere inye ndụmọdụ?

 ỌTỤTỤ afọ gara aga, ndị okenye abụọ gara ileta otu nwanna nwaanyị na-anaghị abịachi ọmụmụ ihe anya. Otu n’ime ndị okenye ahụ gụụrụ ya ebe ụfọdụ na Baịbụl kwuru na anyị kwesịrị ịna-abịa ọmụmụ ihe. O chere na ihe ọ gwara nwanna nwaanyị ahụ gbara ya ume. Ma mgbe ha chọrọ ịla, nwanna nwaanyị ahụ gwara ha, sị: “Unu amaghị ihe mụ na ya na-alụ.” Ndị okenye ahụ nyere ya ndụmọdụ n’ebughị ụzọ mata ihe bụ́ nsogbu ya. N’ihi ya, nwanna nwaanyị ahụ echeghị na ndụmọdụ ahụ ha nyere ya baara ya uru.

2 Okenye nke gụụrụ ya ebe ndị ahụ na Baịbụl kwuru, sị: “Mgbe nwanna nwaanyị ahụ kwuru ihe ahụ, echere m na ọ na-akparị anyị. Ma mgbe m chebaara ya echiche, m bịara chọpụta na ihe m mere bụ naanị ịgba mbọ gụọrọ ya ebe ndị gosiri na anyị kwesịrị ịna-abịa ọmụmụ ihe, kama ịjụ ya otú ihe si dịrị ya nakwa ihe m ga-eme iji nyere ya aka.” Ihe a kụziiri okenye a ihe. Ugbu a, ọ bụzi ezigbo okenye na-echebara ụmụnna ya echiche ma na-enyere ha aka.

3. Olee ndị nwere ike inye mmadụ ndụmọdụ n’ọgbakọ?

 3 Ebe ọ bụ na ndị okenye na-elekọta ìgwè atụrụ Chineke, ọ bụ ọrụ ha ịna-enye ndụmọdụ mgbe ọ dị mkpa. Ma mgbe ụfọdụ, ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ nwekwara ike inye ndụmọdụ. Dị ka ihe atụ, nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwaanyị nwere ike isi na Baịbụl nye mmadụ ndụmọdụ. (Ọma 141:5; Ilu 25:12) Nwanna nwaanyị katarala ahụ́ nwere ike ‘ịdụ ụmụ nwaanyị na-akatabeghị ahụ́ ọdụ’ n’ihe ndị ahụ e kwuru okwu ha na Taịtọs 2:​3-5. O doro anya na ndị nne na nna kwesịrị ịna-enye ụmụ ha ndụmọdụ, na-adọkwa ha aka ná ntị. N’ihi ya, ọ bụ eziokwu na ọ bụ ndị okenye ka isiokwu a na-agwa otú ha ga-esi na-enye ndụmọdụ, anyị niile nwere ike isi na ya mụta otú anyị ga-esi na-enye ndụmọdụ ga-abara ndị anyị nyere ya uru, meekwa ‘ka obi dị ha ụtọ.’​—Ilu 27:9.

4. Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a?

4 N’isiokwu a, anyị ga-atụle ajụjụ anọ banyere inye ndụmọdụ: (1) Olee ihe kwesịrị ime ka e nye mmadụ ndụmọdụ? (2) È kwesịrị inye ndụmọdụ ahụ? (3) Ònye kwesịrị inye ndụmọdụ ahụ? (4) Olee otú ị ga-esi enye ndụmọdụ ga-aba uru?

OLEE IHE KWESỊRỊ IME KA E NYE MMADỤ NDỤMỌDỤ?

5. Gịnị ga-enyere okenye aka inye ndụmọdụ otú ga-eme ka ọ dịrị onye o nyere ya mfe ịnabata ya? (1 Ndị Kọrịnt 13:​4, 7)

5 Ndị okenye hụrụ ụmụnna ha n’anya. Otú ha si egosi ya mgbe ụfọdụ bụ inye nwanna ndụmọdụ ma ha hụ na ọ chọrọ ime ihe na-adịghị mma. (Gal. 6:1) Tupu okenye enye mmadụ ndụmọdụ, ọ ga-adị mkpa ka o buru ụzọ chebara ihe ụfọdụ Pọl onyeozi kwuru banyere ịhụnanya echiche. Pọl kwuru, sị: “Ịhụnanya na-enwe ndidi, dịrịkwa obiọma. . . . Ọ na-edi ihe niile, na-ekwere ihe niile, na-enwe olileanya ihe niile, na-atachi obi n’ihe niile.” (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 13:​4, 7.) Ọ bụrụ na okenye echebara ihe amaokwu ndị a kwuru echiche, ọ ga-enyere ya aka ijide n’aka na ihe mere o ji na-enye nwanna ya ndụmọdụ bụ n’ihi na ọ hụrụ ya n’anya. Ọ bụrụ na onye e nyere ndụmọdụ achọpụta na okenye ahụ hụrụ ya n’anya, ọ ga-aka enyere ya aka ime ihe a gwara ya.​—Rom 12:10.

6. Olee ihe Pọl onyeozi mere anyị kwesịrị ịmụta ihe na ya?

6 Pọl onyeozi mere ihe ndị okenye kwesịrị ịmụta ihe na ya. Dị ka ihe atụ, Pọl nyere ụmụnna nọ na Tesalonaịka ndụmọdụ mgbe ọ dị ha mkpa. Ma n’akwụkwọ ozi Pọl dere, o bu ụzọ kwuo otú ha si nwee okwukwe, ịhụnanya ha, na ntachi obi ha. O chebaara otú ihe si dịrị ha echiche ma kwuo na ọ ghọtara na ọ dịrịghị ha mfe nakwa na ha na-edi mkpagbu na ahụhụ. (1 Tesa. 1:3; 2 Tesa. 1:4) Ọ gwadịrị ụmụnna ndị ahụ na a na-akọ akụkọ ọma banyere ha. (1 Tesa. 1:​8, 9) Ọ ga-abụrịrị na ihe a ọ gwara ha mere ha obi ụtọ. O doro anya na Pọl onyeozi hụrụ ụmụnna ndị nọ na Tesalonaịka n’anya nke ukwuu. Ọ bụ ya mere o ji nwee ike inye ha ndụmọdụ bara uru n’akwụkwọ ozi abụọ o degaara ha.​—1 Tesa. 4:​1, 3-5, 11; 2 Tesa. 3:​11, 12.

7. Olee ihe nwere ike ime ka ụfọdụ ndị ghara ịnabata ndụmọdụ?

7 Olee ihe nwere ike ime ma ọ bụrụ na otú anyị si nye mmadụ ndụmọdụ adịghị mma? Otu okenye ma nke a na-akọ kwuru, sị: “Ihe mere ufọdụ anaghị anabata ndụmọdụ e nyere ha bụ n’ihi na otú e si nye ha ya egosighị na a hụrụ ha n’anya, ọ bụghị n’ihi na ihe a gwara ha mee adịghị mma.” Olee ihe anyị nwere ike ịmụta na ya? Ndị mmadụ na-aka anabata ndụmọdụ ma ha mata na ihe mere onye ahụ ji nye ha ya bụ na ọ hụrụ ha n’anya, ọ bụghị na ihe ha na-ewe ya iwe.

È KWESỊRỊ INYE NDỤMỌDỤ AHỤ?

8. Gịnị ka okenye kwesịrị ịjụ onwe ya tupu ya ekpebiwe ma ò kwesịrị inye mmadụ ndụmọdụ?

8 Ndị okenye ekwesịghị ịgbara ọsọ gaa nye ndụmọdụ. Tupu okenye enye mmadụ ndụmọdụ, o kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘M̀ kwesịrị ikwu ihe a m chọrọ ikwu? Ò doro m anya na ihe onye a na-eme adịghị mma? Ò nwere iwu Baịbụl o mebiri? Ka ọ̀ bụ naanị na otú o si mee ihe dị iche n’ihe m gaara eme?’ Ndị okenye ekwesịghị ịna-ekwu okwu “n’echeghị echiche.” (Ilu 29:20) Ọ bụrụ na o dochaghị okenye anya ma ò kwesịrị inye mmadụ ndụmọdụ, o nwere ike ịjụ okenye ọzọ ma ò chere na e nwere iwu Baịbụl onye ahụ mebiri nakwa ma è kwesịrị inye ya ndụmọdụ maka ya.​—2 Tim. 3:​16, 17.

9. Gịnị ka anyị mụtara n’aka Pọl gbasara otú anyị kwesịrị isi nye mmadụ ndụmọdụ n’ihe gbasara uwe na ejiji? (1 Timoti 2:​9, 10)

9 Chegodị ihe atụ a. Ka e were ya na otú nwanna si eji ejiji adịghị otu okenye mma. Okenye ahụ nwere ike ịjụ onwe ya, sị, ‘Ò nwere iwu Akwụkwọ Nsọ otú nwanna a si eji ejiji mebiri?’ Ebe ọ bụ na okenye ahụ achọghị iji aka ya eme iwu, o nwere ike ịjụta okenye ọzọ ma ọ bụkwanụ nwanna ọzọ ma nke a na-akọ ihe o chere. Ha abụọ nwere ike ileba anya n’ihe Pọl onyeozi kwuru gbasara uwe na ejiji. (Gụọ 1 Timoti 2:​9, 10.) Pọl kwuru ihe ụfọdụ anyị kwesịrị iburu n’obi maka ejiji. O kwuru na uwe Ndị Kraịst kwesịrị ịdị mma n’anya, na-egosi na ha na-emeru ihe n’ókè ma na-ele ihe anya otú dị mma. Ma Pọl akpọghị aha ụdị uwe Onye Kraịst kwesịrị iyi na nke ọ na-ekwesịghị iyi. Ọ ma na Onye Kraịst ọ bụla nwere ike iji ejiji dị ya mma ma ọ bụrụhaala na o mebighị ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru. N’ihi ya, mgbe ndị okenye na-atụle ma hà kwesịrị inye mmadụ ndụmọdụ maka ejiji ya, ha kwesịrị ịchọpụta ma uwe na ejiji nwanna ahụ ọ̀ dị mma n’anya ma na-egosi na ọ na-ele ihe anya otú dị mma.

10. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’uche banyere ihe ndị ọzọ kpebiri ime?

10 Anyị kwesịrị iburu n’uche na ụmụnna abụọ ma nke a na-akọ nwere ike ikpebi ime ihe abụọ dị iche, ya abụrụ na e nweghị nke dị njọ na ha abụọ. Anyị ekwesịghịkwa ịmanye ụmụnna anyị imewe ihe anyịnwa chere na ọ dị mma.​—Rom 14:10.

ÒNYE KWESỊRỊ INYE NDỤMỌDỤ AHỤ?

11-12. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka e nye mmadụ ndụmọdụ, olee ajụjụ okenye kwesịrị ịjụ onwe ya? N’ihi gịnịkwa?

11 Ọ bụrụ na o doro anya na e kwesịrị inye mmadụ ndụmọdụ, ajụjụ okenye kwesịrị ịjụ onwe ya bụ, ‘Ònye kwesịrị inye ndụmọdụ a?’ Tupu okenye enye nwanna nwaanyị lụrụ di ma ọ bụ nwatakịrị ndụmọdụ, o kwesịrị ibu ụzọ gwa di nwanna nwaanyị ahụ ma ọ bụ ndị mụrụ nwa ahụ. Ha nwere ike ịchọ iji aka ha nye ndụmọdụ ahụ. * Di nwanna nwaanyị ahụ ma ọ bụ ndị mụrụ nwa ahụ nwere ike ịsị na ha ga-achọ ịnọ mgbe a ga-enye ndụmọdụ ahụ. Dị ka anyị kwuru na  paragraf nke atọ, o nwere mgbe ụfọdụ ọ ga-aka mma ka nwanna nwaanyị katarala ahụ́ nye nwanna nwaanyị na-akatabeghị ahụ́ ndụmọdụ.

12 E nwere ihe ọzọ okenye kwesịrị ichebara echiche tupu ya enye ndụmọdụ. Okenye nwere ike ịjụ onwe ya, sị, ‘Ọ̀ bụ m kwesịrị inye ndụmọdụ a, ka ọ̀ ga-aka mma ka nwanna ọzọ nye nwanna a ndụmọdụ?’ Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ na-eche na ọ baghị uru, o nwere ike ịka mma ka okenye nwetụrụla ụdị nsogbu ahụ nye ya ndụmọdụ. Okenye ahụ nwere ike ịka aghọta ya, ya emee ka ihe ọ ga-ekwu ruo onye ahụ n’obi, dịkwara ya mfe ịnabata ndụmọdụ ahụ. Ma, ọ bụ ọrụ ndị okenye niile ịna-agba ụmụnna ha ume ịna-eme ihe Baịbụl kwuru. N’ihi ya, ọ bụrụhaala na ọ dị mkpa ka e nye mmadụ ndụmọdụ, ihe kacha mkpa bụ ka e nye ndụmọdụ ahụ.

OLEE OTÚ Ị GA-ESI ENYE NDỤMỌDỤ GA-ABA URU?

Gịnị mere ndị okenye kwesịrị iji “na-anụ ihe ngwa ngwa”? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13 na nke 14)

13-14. Gịnị mere o ji dị mkpa ka okenye na-ege ntị nke ọma?

13 Dịrị njikere ige ntị. Ọ bụrụ na okenye ana-akwadebe inye mmadụ ndụmọdụ, o kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Gịnị ka m ma gbasara otú ihe si dịrị nwanna a m chọrọ inye ndụmọdụ? Olee nsogbu bịaara ya? Ò nwere nsogbu o nwere m na-amaghị banyere ya? Olee ihe kacha dị ya mkpa ugbu a?’

14 Ihe e kwuru na Jems 1:19 ga-abara ndị na-enye ndụmọdụ uru. Jems dere, sị: “Onye ọ bụla kwesịrị ịbụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-anaghị ekwu okwu ngwa ngwa, na onye na-anaghị ewe iwe ngwa ngwa.” Okenye nwere ike iche na ọ ma ihe niile gbasara ihe ọ chọrọ inye nwanna ndụmọdụ banyere ya. Ma, ọ̀ ma ya n’eziokwu? Ilu 18:13 sịrị: “Ọ bụrụ na mmadụ azaa okwu tupu ya anụ ihe merenụ, ọ na-egosi na ọ dị iberiibe, na-emechukwa onwe ya ihu.” Ọ ka mma ịjụ nwanna ahụ ka ọ kọọ ihe merenụ. N’ihi ya, okenye kwesịrị ige ntị tupu ya ekwuwe okwu. Cheta ihe okenye ahụ anyị kwuru okwu ya ná mmalite isiokwu a mụtara. Ọ chọpụtara na ihe o kwesịrị ime abụghị ibu ụzọ gwawa nwanna nwaanyị ahụ ihe ọ kwadebere, kama, na ọ gaara ajụ nwanna nwaanyị ahụ ajụjụ ndị dị ka: “Olee nsogbu gị na ya na-alụ?” “Olee ihe m ga-eme iji nyere gị aka?” Ọ bụrụ na ndị okenye agbaa mbọ na-ege ụmụnna ha ntị nke ọma, ọ ga-aka eme ka ha nyere ha aka ma gbaa ha ume.

15. Olee otú ndị okenye ga-esi eme ihe e kwuru n’Ilu 27:23?

15 Mata ụmụnna gị nke ọma. Dị ka anyị kwuru ná mbido isiokwu a, inye mmadụ ndụmọdụ ga-eru ya n’obi apụtaghị ịgụrụ ya ebe ụfọdụ na Baịbụl ma ọ bụ ịgwa ya ihe ndị anyị chere na ọ ga-eme. Ụmụnna anyị kwesịrị ịghọta na anyị hụrụ ha n’anya, na anyị na-aghọta ha, nakwa na anyị chọrọ inyere ha aka. (Gụọ Ilu 27:23.) Ndị okenye kwesịrị ịgbalị mee ka ha na ụmụnna ha dịrị n’ezigbo mma.

Olee ihe ga-eme ka ọ dịrị ndị okenye mfe inye ndụmọdụ? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)

16. Olee ihe ga-enyere ndị okenye aka inye ndụmọdụ ga-abara ụmụnna ha uru?

16 Ndị okenye ekwesịghị ime ka ụmụnna na-eche na naanị mgbe ha na-achọ ka ha na ha kwurịta okwu bụ mgbe a chọrọ inye ha ndụmọdụ ma ọ bụ mgbe ha mejọrọ ihe. Kama, ha na ụmụnna ha kwesịrị ịna-ekwurịta okwu mgbe niile. Ha kwesịkwara ịna-egosi ha na ihe gbasara ha na-emetụ ha n’obi ma ha nwee nsogbu. Otu okenye ma nke a na-akọ kwuru, sị: “Ọ bụrụ na i mee ihe a, gị na ụmụnna gị ga-adị n’ezigbo mma. Ọ ga-adịziri gị mfe inye ha ndụmọdụ.” Ọ ga-adịkwara onye e nyere ndụmọdụ ahụ mfe ịnabata ya.

Gịnị mere okenye kwesịrị iji nwee ndidi ma dịrị obiọma mgbe ọ na-enye ndụmọdụ? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)

17. Olee mgbe ọ dị ezigbo mkpa ka okenye nwee ndidi ma dịrị obiọma?

17 Na-enwe ndidi, dịrịkwa obiọma. Okenye kwesịrị ịdị obiọma, nweekwa ndidi karịchaa ma ọ bụrụ na onye o si na Baịbụl nye ndụmọdụ anabataghị ya ozugbo. Okenye ekwesịghị iwe iwe ma ọ bụrụ na nwanna o nyere ndụmọdụ anabataghị ya ozugbo ma ọ bụ ghara ime ihe ọ gwara ya ozugbo. E kwuru banyere Jizọs, sị: “Ọ gaghị azọgbu ahịhịa amị fọrọ obere ka ọ kpọnwụọ, ọ gaghịkwa emenyụ owu mpanaka ọ bụla na-achọ ịnyụ anyụ.” (Matiu 12:20) Ọ bụrụ na okenye ahụ ekpewe ekpere n’onwe ya, o nwere ike ịrịọ Jehova ka ọ gọzie onye ahụ o nyere ndụmọdụ ma nyere ya aka ịghọta ihe mere o ji nye ya ndụmọdụ ahụ ma mee ya. O nwere ike iwe nwanna ahụ e nyere ndụmọdụ oge iji chebara ndụmọdụ ahụ e nyere ya echiche. Ọ bụrụ na okenye ahụ ejiri ndidi na obiọma gwa nwanna ahụ okwu, ọ ga-eme ka ọ dịrị ya mfe ige ntị na ndụmọdụ ahụ ọ na-enye ya. Ndụmọdụ ọ bụla anyị nyere kwesịrị isi n’Okwu Chineke.

18. (a) Olee ihe anyị kwesịrị iburu n’uche ma anyị nyewe ndụmọdụ? (b) Dị ka foto dị n’igbe ahụ gosiri, gịnị ka nne na nna ahụ na-ekwurịta?

18 Si n’ihe ndị i mejọrọ mụta ihe. Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, o nweghị mgbe anyị ga-emetacha ihe niile e kwuru n’isiokwu a. (Jems 3:2) Anyị ga-emehie ihe. Ma ọ bụru na anyị emehie ihe, anyị kwesịrị ịgbalị mụta ihe na ya. Ọ bụrụ na ụmụnna anyị achọpụta na anyị hụrụ ha n’anya, o nwere ike ime ka ọ dịrị ha mfe ịgbaghara anyị ma ọ bụrụ na ihe anyị kwuru ma ọ bụ ihe anyị mere akpasuo ha iwe.​—Gụọ igbe bụ́ “ Ihe Ndị Nne na Nna Kwesịrị Iburu n’Uche.”

GỊNỊ KA ANYỊ MỤTARALA?

19. Olee otú anyị ga-esi eme ka obi dị ụmụnna anyị ụtọ?

19 Dị ka anyị hụrụla, ọ naghi adị mfe inye mmadụ ndụmọdụ. Anyị ezughị okè otú ndị anyị na-enye ndụmọdụ na-ezughịkwa. Na-echeta ihe ndị anyị kwuru n’isiokwu a. Tupu gị enye ndụmọdụ, gbalịa ka ihe mere i ji na-enye nwanna ndụmọdụ bụrụ na ị hụrụ ya n’anya. Gbalịakwa chọpụta ma è kwesịrị inye ndụmọdụ ahụ n’eziokwu nakwa ma ọ̀ bụ gị bụ onye kacha mma inye ya. Tupu gị enye ndụmọdụ, jụọ onye ị chọrọ inye ndụmọdụ ajụjụ ma gee ya ntị nke ọma ka i nwee ike ịghọta otú ihe si dịrị ya. Gbalịa ka ị ghọta ihe ahụ otú yanwa si ghọta ya. Dịrị nwayọọ, meekwa ka gị na ụmụnna gị dịrị ná mma. Cheta na ihe anyị bu n’obi enye ndụmọdụ bụ ka ọ baara ụmụnna anyị uru nakwa ‘ka obi dị ha ụtọ.’​—Ilu 27:9.

ABỤ NKE 103 Ndị Ọzụzụ Atụrụ Bụ Onyinye Jehova Nyere Anyị

^ par. 5 Ọ naghị adịkarị mfe inye mmadụ ndụmọdụ. Ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa na anyị ga-enye mmadụ ndụmọdụ, olee otú anyị ga-esi enye ya ka ọ baara onye anyị nyere ya uru, gbaakwa ya ume? Isiokwu a ga-enyere ndị okenye aka ịma otú ha ga-esi enye ndụmọdụ, ya eruo ndị ha nyere ya n’obi, ha emeekwa ihe a gwara ha.

^ par. 11 Gụọ isiokwu bụ́ “Ikike Ndị Okenye Nwere n’Ọgbakọ.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Febụwarị 2021.