Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 9

Na-enyere Ndị Ọzọ Aka Ka Jizọs

Na-enyere Ndị Ọzọ Aka Ka Jizọs

“A na-aka enwe obi ụtọ n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.”​—ỌRỤ 20:35.

ABỤ NKE 17 “Achọrọ M”

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee ọrụ ọma ndị na-efe Jehova na-arụ?

 ỌTỤTỤ afọ gara aga, Baịbụl buru amụma na ndị Chineke “ga-eji obi ha wepụta onwe ha” na-ejere Jehova ozi, na-emekwa ihe Jizọs kwuru. (Ọma 110:3) Amụma a na-emezu taa. Kwa afọ, ndị Jehova na-eji ọtụtụ nde awa na-ekwusa ozi ọma. Ha wepụtara onwe ha na-eme ya. A naghịkwa akwụ ha ụgwọ. Ha na-ewepụtakwa oge na-enyere ụmụnna ha aka, na-egboro ha mkpa ha, na-agba ha ume, na-emekwa ka okwukwe ha na-esikwu ike. Ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi na-ejikwa ọtụtụ awa na-akwado ihe omume ha ga-eme n’ọmụmụ ihe, na-agakwa eleta ụmụnna ha iji gbaa ha ume. Gịnị mere ha ji eme ihe ndị a niile? Ọ bụ n’ihi na ha hụrụ Jehova na ndị agbata obi ha n’anya.​—Mat. 22:​37-39.

2. Dị ka e kwuru ná Ndị Rom 15:​1-3, olee ihe Jizọs mere anyị kwesịrị ịna-eme?

2 Ihe ndị Jizọs mere gosiri na ọ na-eche gbasara ndị ọzọ karịa onwe ya. Anyị na-agbalị ike anyị niile ịna-eme ka ya. (Gụọ Ndị Rom 15:​1-3.) Ọ bụrụ na anyị ana-eme ka ya, ọ ga-abara anyị ezigbo uru. Jizọs sịrị: “A na-aka enwe obi ụtọ n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.”​—Ọrụ 20:35.

3. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

3 N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe ụfọdụ Jizọs mere iji nyere ndị ọzọ aka. Anyị ga-ahụkwa otú anyị nwere ike isi na-eme ka ya. Anyị ga-atụlekwa ihe ga-eme ka anyị dịkwuo njikere inyere ndị ọzọ aka.

NA-EME KA JIZỌS

Gịnị ka Jizọs mere mgbe ìgwè mmadụ bịakwutere ya n’agbanyeghị na ike gwụchara ya? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4)

4. Olee otú Jizọs si gosi na ọ na-eche gbasara ndị ọzọ karịa onwe ya?

4 Jizọs nyeere ndị ọzọ aka, ma mgbe ike gwụrụ ya. Chegodị gbasara ihe Jizọs mere mgbe ọtụtụ ndị bịakwutere ya n’akụkụ ugwu. O nwere ike ịbụ ebe dị nso na Kapaniọm. Jizọs ji abalị bọtara ụbọchị ahụ kpee ekpere. Ọ ga-abụkwa na ezigbo ike gwụrụ ya. Ma, mgbe ọ hụrụ ìgwè mmadụ ahụ, o meteere ndị dara ogbenye na ndị na-arịa ọrịa ebere. Ọ bụghị naanị na ọ gwọrọ ha, kama, o kwuru okwu kacha gbaa ndị mmadụ ume e kwutụrụla. Ọ bụ ya bụ okwu ahụ ọ nọ n’elu ugwu kwuo.​—Luk 6:​12-20.

Olee ụzọ ndị anyị nwere ike isi na-enyere ndị ọzọ aka ka Jizọs? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5)

5. Olee otú ndị isi ezinụlọ si eme ka Jizọs mgbe ike gwụrụ ha?

5 Otú ndị isi ezinụlọ si eme ka Jizọs. Chegodị gbasara ihe atụ a. Ka e were ya na onyeisi ezinụlọ si ọrụ lọta, ike agwụchaa ya. N’agbanyeghị na ọ dị ya ka ya kagbuo Ofufe Ezinụlọ nke ụbọchị ahụ, mana o meghị otú ahụ. Ọ rịọrọ Jehova ka o nye ya ike iji duzie Ofufe Ezinụlọ ahụ. Jehova zara ya ekpere, ya eduzie nke izu ahụ. Otu ihe dị mkpa ụmụ ya mụtara n’abalị ahụ bụ na ihe kacha nne na nna ha mkpa bụ ihe gbasara ofufe Jehova.

6. Nye ihe atụ otú Jizọs si wepụta oge ya nyere ndị ọzọ aka.

6 Jizọs wepụtara oge ya nyere ndị ọzọ aka. Chegodị otú obi dị Jizọs mgbe ọ nụrụ na e gbuola enyi ya bụ́ Jọn Onye Na-eme Baptizim. Ọ ga-abụrịrị na ọ gbawara Jizọs obi. Baịbụl kwuru ihe mere mgbe Jọn Onye Na-eme Baptizim nwụchara. Ọ sịrị: “Mgbe Jizọs nụrụ ihe a, o ji ụgbọ mmiri si ebe ahụ pụọ gaa n’ebe ndị mmadụ na-anaghị anọkarị, ka ọ nọrọ naanị ya.” (Mat. 14:​10-13) Ihe mere Jizọs ji chọọ ịnọrọ onwe ya doro anya. Ọtụtụ n’ime anyị na-achọ ịnọrọ onwe ha ma ha ruwe uju. Ma, ndị mmadụ ekweghị ka Jizọs nọọrọ onwe ya. Ìgwè mmadụ bu ya ụzọ garuo ebe ahụ ndị mmadụ na-anaghị anọkarị. Gịnị ka Jizọs mere mgbe ọ hụrụ ha? O chere gbasara ihe ndị bụ́ mkpa ha, ya emee ka ‘o metere ha ebere.’ Ọ hụrụ na ha chọsiri ike ka e jiri Okwu Chineke nyere ha aka ma gbaa ha ume. O nyekwaara ha aka ozugbo. Nke bụ́ eziokwu bụ na ‘ọ malitere izi ha ọtụtụ ihe,’ ọ bụghị ihe ole na ole.​—Mak 6:​31-34; Luk 9:​10, 11.

7-8. Nye ihe atụ gosiri otú ndị okenye hụrụ ụmụnna ha n’anya si eme ka Jizọs ma nsogbu bịara nwanna ha.

7 Otú ndị okenye hụrụ ụmụnna ha n’anya si eme ka Jizọs. Obi dị anyị ezigbo ụtọ maka ihe ndị okenye na-emere anyị. E nwere ọtụtụ ihe ha na-arụ n’ọgbakọ anyị na-anaghị ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na e nwee ihe gbata gbata mere nwanna, ndị so na Kọmitii Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ na-agbatara onye ahụ ọsọ enyemaka. Ọtụtụ mgbe, ihe gbata gbata ndị ahụ na-eme n’ime abalị. Ma, ebe ọ bụ na ndị okenye ahụ na ndị ezinụlọ ha hụrụ ụmụnna ha n’anya, ndị ezinụlọ ha na-akwado ha ha agaa nyere nwanna ahụ aka.

8 Ndị okenye na-esokwa arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na ụlọ ndị ọzọ nzukọ Jehova na-arụ. Ha na-esokwa agbatara ụmụnna ha ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka. Ha na-ejikwa ọtụtụ awa akụziri ndị ọgbakọ ha ihe, na-agba ha ume, ma na-enyere ha aka. Anyị kwesịrị iji obi anyị niile na-aja ndị okenye ndị a na ndị ezinụlọ ha mma. Ka Jehova gọzie ha maka ọrụ ọma a ha na-arụ. Dịkwa ka onye ọ bụla n’ime anyị, ndị okenye ekwesịghị imefe ihe ókè. Ha ekwesịghị iji oge ha niile na-arụ ọrụ ọgbakọ gharazie inwe ohere ilebara ezinụlọ ha anya.

OTÚ ANYỊ GA-ESI MỤTA ỊNA-ENYERE NDỊ ỌZỌ AKA

9. Dị ka e kwuru ná Ndị Filipaị 2:​4, 5, olee ihe Ndị Kraịst niile kwesịrị ịmụta ịna-eme?

9 Gụọ Ndị Filipaị 2:​4, 5. Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị anyị niile bụ ndị okenye, mana, anyị niile nwere ike ịmụta otú Kraịst si nyere ndị ọzọ aka. Baịbụl kwuru na ọ “dịrị ka ohu.” (Fil. 2:7) Chegodị ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe a amaokwu a kwuru. Ezigbo ohu na-achọ ihe ọ ga-eme ka obi dị nna ya ukwu mma. Ebe anyị bụ ohu Jehova na ohu ụmụnna anyị, o doro anya na anyị ga-achọ ịna-abakwuru ma Jehova ma ụmụnna anyị uru. Ka anyị lee aro ndị ga-enyere anyị aka ime otú ahụ.

10. Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?

10 Chee gbasara otú i si eme. Jụọ onwe gị ajụjụ ndị a: ‘M̀ na-adị njikere ịhapụ ihe ụfọdụ nyere ndị ọzọ aka? Dị ka ihe atụ, gịnị ka m ga-eme ma a sị m gaa nyere nwanna mere agadi aka ma ọ bụkwanụ gaa bute nwanna nwaanyị mere agadi ọmụmụ ihe? E kwuo na a chọrọ ndị ga-aga mee ka ụlọ mgbakọ dị ọcha ma ọ bụkwanụ rụzie ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, m̀ na-ewepụta onwe m ozugbo?’ Mgbe anyị nyefere Jehova onwe anyị, anyị kwere ya nkwa na anyị ga-eji ihe niile anyị nwere na-efe ya. Ọ chọrọ ka anyị jiri ike anyị, oge anyị, na ihe ndị anyị nwere na-enyere ndị ọzọ aka. N’ihi ya, obi na-adị ya ụtọ ma anyị na-enyere ndị ọzọ aka. Ọ bụrụ na anyị achọpụta na e nwere ebe anyị na-anaghị eme nke ọma, gịnị ka anyị ga-eme?

11. Olee otú ekpere nwere ike isi nyere anyị aka ịchọkwu ịna-enyere ndị ọzọ aka?

11 Jiri obi gị niile kpee ekpere ka Jehova nyere gị aka. Ka e were ya na ị chọpụtara na e nwere ebe ị na-anaghị eme nke ọma, ya abụrụkwa na ọ naghị agụ gị agụụ ịna-eme nke ọma n’ebe ndị ahụ. Jiri obi gị niile kpee ekpere ka Jehova nyere gị aka. Ezorola ya ọnụ. Gwa ya otú obi dị gị. Gwa ya ka o mee ‘ka i nwee mmasị ime ihe, na-enyekwa gị ike i ji eme ya.’​—Fil. 2:13.

12. Olee otú nwa okorobịa merela baptizim nwere ike isi nyere ọgbakọ aka?

12 Ọ bụrụ na ị bụ nwa okorobịa merela baptizim, rịọ Jehova ka o nyere gị aka ka ị chọkwuo ịna-enyere ụmụnna gị aka n’ọgbakọ. N’obodo ụfọdụ, ndị okenye e nwere karịrị ndị ohu na-eje ozi. Ọtụtụ n’ime ndị ohu na-eje ozi ahụ emeekwalanụ agadi ma ọ bụ akatawala ahụ́. Ka ọtụtụ ndị na-abatakwu n’ọgbakọ ka a na-achọkwu ụmụ okorobịa ga-enye aka na-elekọta ndị Jehova. Ọ bụrụ na ị dị njikere ime ihe ọ bụla a chọrọ ka i mee ná nzukọ Jehova, obi ga-adị gị ụtọ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ị na-eme ihe dị Jehova mma, na-emere onwe gị ezigbo aha, obi ana-adịkwa gị mma na ị na-enyere ndị ọzọ aka.

Ndị Kraịst si na Judia gafee Osimiri Jọdan, gbaga obodo Pela. Ndị bú ụzọ ruo ebe ahụ na-ekesara ụmụnna ha ndị ka rutere erute ihe oriri (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)

13-14. Gịnị ka anyị nwere ike ime iji nyere ụmụnna anyị aka? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

13 Na-eleru anya ala ka ị mata ndị e kwesịrị inyere aka. Pọl onyeozi gwara ndị Hibru, sị: “Unu echefukwala ịna-eme ihe ọma na ịna-enye ndị ọzọ ihe n’ihi na ụdị àjà ndị a na-adị Chineke ezigbo mma.” (Hib. 13:16) Ihe a Pọl gwara ha bara ezigbo uru. Ọ dịghị anya Ndị Kraịst nọ na Judia nwetachara akwụkwọ ozi a ha ahapụ ụlọ ha, ihe ha ji akpa afọ ha, na ndị ikwu ha na-abụghị Ndị Kraịst “malite ịgbaga n’ugwu.” (Mat. 24:16) N’oge ahụ, ọ dị ezigbo mkpa ka ha na-enyere ibe ha aka. Ọ bụrụ na ha na-eji ihe ndị ha nwere na-enyere ibe ha aka tupu ha agbapụ, ọ gaghị esiri ha ike ịna-eme ya n’ebe ọhụrụ ahụ ha gbagara.

14 Ọ bụghị mgbe niile ka ụmụnna anyị ga-agwa anyị ihe ndị dị ha mkpa. Ka e were ya na e nwere nwanna nwunye ya nwụrụ. Nwanna ahụ ọ̀ chọrọ ka e nyere ya aka na-esi nri, na-ebuga ya ebe ụfọdụ ma ọ bụ na-emere ya ihe ụfọdụ n’ụlọ? E nwere ike ọ gaghị ekwu na ọ chọrọ ya n’ihi na ọ chọghị inye ndị ọzọ nsogbu. Ma, obi nwere ike ịdị ya ezigbo ụtọ ma ọ bụrụ na anyị enyere ya aka tupu ya agwa anyị. Anyị ekwesịghị iche na onye ọzọ ga-enyere ya aka ma ọ bụkwanụ na ọ ga-agwa anyị mgbe ọ bụla ọ chọrọ ka e nyere ya aka. Jụọ onwe gị, sị: ‘Ọ bụrụ m ka ụdị ihe ahụ mere, olee ihe m ga-achọ ka ndị ọzọ meere m?’

15. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-enyere ndị ọzọ aka?

15 Mee ka ọ dịrị ndị ọzọ mfe ịgwa gị ka i nyere ha aka. O doro anya na ị ma ụmụnna nọ n’ọgbakọ unu dị njikere inyere ndị ọzọ aka. Ha anaghị eme ka anyị chee na anyị na-enye ha nsogbu. Anyị ma na ha ga-adị njikere inyere anyị aka mgbe ọ bụla. Anyị chọkwara ịna-eme ka ha. Otu okenye dị afọ iri anọ na ise aha ya bụ Alan chọrọ ka ọ dịrị ndị ọzọ mfe ịna-agwa ya ka o nyere ha aka. Mgbe o chechara gbasara otú Jizọs si nyere ndị ọzọ aka, ọ sịrị: “Jizọs na-eji ọrụ n’aka. Ma, mmadụ niile, ma nwata ma okenye, na-achọ ịbịaru ya nso. Ụjọ anaghịkwa atụ ha ịgwa ya ka o nyere ha aka. Ha ma na ọ hụrụ ha n’anya nke ukwuu. Achọsiri m ike ịna-eme ka Jizọs ka ndị mmadụ mara m ka onye dị obiọma na onye dị njikere inyere ha aka ma hụ ha n’anya.”

16. Olee otú ime ihe e kwuru n’Abụ Ọma 119:​59, 60 nwere ike isi nyere anyị aka ịna-emekwu ka Jizọs?

16 Ike ekwesịghị ịgwụ anyị ma ọ bụrụ na anyị anaghị emetacha ihe niile ka Jizọs. (Jems 3:2) Nwa akwụkwọ anaghị aka onye nkụzi ya. Ma, ọ bụrụ na nwa akwụkwọ esi n’ihe ndị ọ na-emetaghị na-amụta ihe, na-agbakwa mbọ ka ọ na-eme ka onye nkụzi ya, ọ ga na-emekwu nke ọma. Otú ahụ ka ọ dị anyị. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ndị anyị na-amụta ma anyị na-amụ ihe, gbalịsiekwa ike ịna-emezi ihe ndị anyị na-anaghị emeta, anyị nwere ike ịna-emekwu ka Jizọs.​—Gụọ Abụ Ọma 119:​59, 60.

URU INYERE NDỊ ỌZỌ AKA NA-ABA

Ọ bụrụ na ndị okenye ana-eme ka Jizọs na-enyere ndị ọzọ aka, ndị na-eto eto ga na-amụta ihe n’aka ha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17) *

17-18. Ọ bụrụ na anyị ana-enyere ndị ọzọ aka ka Jizọs, olee uru ụfọdụ ọ ga-aba?

17 Ọ bụrụ na anyị adị njikere inyere ndị ọzọ aka, ndị ọzọ nwere ike isi n’aka anyị mụta ịna-enyere ndị ọzọ aka. Otu okenye aha ya bụ Tim sịrị: “Anyị nwere ụfọdụ ụmụ okorobịa ghọrọla ndị ohu na-eje ozi. Otu ihe kpatara ya bụ na ha hụrụ otú ndị ọzọ si adị njikere inyere ibe ha aka, ha achọọkwa ịna-eme ka ha. Ụmụ okorobịa ndị a na-enyere ọgbakọ aka, na-akwadokwa ndị okenye.”

18 Anyị bi n’ụwa ọtụtụ ndị na-achọ ihe ga-abara naanị onwe ha uru. Ma, ndị Jehova dị iche. Otú Jizọs si dị njikere inyere ndị ọzọ aka na-emetụ anyị n’obi. Anyị kpebisikwara ike na anyị ga na-eme ka ya. Anyị agaghị emetachali ihe niile o mere. Ma, anyị nwere ike ‘ịna-esosi nzọụkwụ ya ike.’ (1 Pita 2:21) Ọ bụrụ na anyị ana-agbalịsi ike inyere ndị ọzọ aka ka Jizọs, anyị ga-enwe obi ụtọ n’ihi na anyị na-eme ihe dị Jehova mma.

ABỤ NKE 13 Ọ Bụ Kraịst Ka Anyị Na-eso

^ par. 5 Jizọs na-eche gbasara ndị ọzọ mgbe niile karịa otú o si eche gbasara onwe ya. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ụzọ ndị anyị nwere ike isi na-eme ka Jizọs. Anyị ga-ahụkwa otú inyere ndị ọzọ aka ka Jizọs ga-esi baara anyị ezigbo uru.

^ par. 57 NKỌWA FOTO: Ebe nwa okorobịa aha ya bụ Dan na-ele otú ndị okenye abụọ si bịa ileta papa ya n’ụlọ ọgwụ. Ihe ahụ ndị okenye ahụ mere mere ka Dan chọkwuo ịna-enyere ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ha aka. Nwa okorobịa ọzọ aha ya bụ Ben hụrụ otú Dan si egosi na ihe gbasara ndị ọzọ na-emetụ ya n’obi. Ihe ahụ Dan na-eme mere ka Ben soro na-eme ka Ụlọ Nzukọ Alaeze dị ọcha.