Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NDỤ

M Hụrụ Ihe Ka Ịbụ Dọkịta Mma

M Hụrụ Ihe Ka Ịbụ Dọkịta Mma

N’AFỌ 1971, mgbe m ka malitere ụlọ ọgwụ m ọhụrụ, m gwara di na nwunye bịara n’ụlọ ọgwụ m, sị: “Ihe a unu na-agwa m bụ ihe m chọrọ kemgbe m bụ nwata.” Olee ndị di na nwunye ahụ bụ? Gịnịkwa bụ ihe ahụ m chọrọ kemgbe m bụ nwata? Ka m kọọrọ gị otú ihe mụ na ha kwurịtara si gbanwee ihe m chọrọ iji ndụ m eme, nakwa ihe mere m ji kweta na ihe ahụ m chọrọ kemgbe m bụ nwata ga-emezu n’oge na-adịghị anya.

A mụrụ m n’afọ 1941 na Paris dị na Frans. Mama m na papa m abaghị ọgaranya. Ịga ụlọ akwụkwọ na-amasị m. Ọ bụ ya mere na obi adịghị m mma mgbe m rịawara ụkwara nta, ya emee ka m kwụsị ịga ụlọ akwụkwọ. Ndị dọkịta kwuru na m kwesịrị ịna-edina ala n’ihi na akpa ume m esighị ike. N’ihi ya, m nọrọ ọtụtụ ọnwa n’ụlọ ọgwụ. Ihe m ji oge ahụ na-eme bụ ịna-agụ akwụkwọ ọkọwa okwu na ige ihe omume mahadum dị na Paris na-eme na redio. Mgbe dọkịta mechara gwa m na mụ agbakeela nakwa na m nwere ike ịlaghachi n’ụlọ akwụkwọ, m nwere ezigbo obi ụtọ. M gwara onwe m, sị: ‘Ihe ndị dọkịta na-eme magburu onwe ya.’ Malite mgbe ahụ gawa, m nọ na-atụ anya mgbe m ga na-agwọ ndị mmadụ ọrịa. Mgbe ọ bụla papa m jụrụ m ihe m ga-achọ ime ma m too, m na-agwa ya na m chọrọ ịbụ dọkịta. Ọ bụ otú a ka ịbụ dọkịta si bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ m.

SAYENSỊ MERE KA M MỤTAKWUO GBASARA CHINEKE

Ndị ezinụlọ anyị bụ ndị Katọlik. Ma, amachaghị m gbasara Chineke. E nwere ọtụtụ ajụjụ m na-amaghị azịza ha. Ọ bụ mgbe m malitere ịgụ akwụkwọ ịbụ dọkịta na mahadum ka obi siri m ike na e nwere Onye kere ihe niile.

M chetara mgbe mbụ m ji onyokomita hụ ụmụ irighiri ihe ndị dị n’osisi. Ihe masịrị m bụ ihe ụmụ irighiri ihe ndị ahụ na-eme ma e nwee okpomọkụ ma ọ bụkwanụ ma ebe niile jụọ oyi. M chọpụtakwara na otu ihe dị n’ime irighiri ihe ndị ahụ na-atalata ma e metụ ya nnu ma na-agbasa ma e metụ ya mmiri dị ọcha. Ihe a na ọtụtụ ihe ndị ọzọ ihe ndị dị ndụ na-eme na-enyere ha aka ịna-adị ndụ n’agbanyeghị otú ihe si gbanwee n’ebe ha nọ. Mgbe m hụrụ ihe ndị dị ịtụnanya irighiri ihe ndị a na-eme, m bịara ghọta na e nwere Onye kere ha, na ha anọkataghị dịrị.

N’afọ nke abụọ m na mahadum ka m hụrụ ihe ndị gosikwuru m na Chineke dị. Mgbe anyị na-amụ gbasara ahụ́ mmadụ, anyị mụtara otú aka anyị si eme ka anyị nwee ike ịna-arọji mkpịsị aka anyị ma ọ bụ na-agbatị ya. O juru m anya otú e si jikọọ akwara na ọkpụkpụ ndị dị ná mkpịsị aka anyị, ha niile ana-arụkọ ọrụ nke ọma. Dị ka ihe atụ, m mụtara na e nwere akwara jikọrọ aka anyị na ọkpụkpụ nke abụọ dị ná mkpịsị aka anyị. Akwara ahụ na-eke ụzọ abụọ, ghọzie ebe akwara ọzọ nwere ike isi n’okpuru ya gafere ruo n’ọnụ ọnụ mkpịsị aka. E nwekwara ihe ndị na-ejidesi akwara ahụ ike n’ọkpụkpụ ndị dị ná mkpịsị aka. E wezụga otú a Chineke si kee mkpịsị aka, akwara ndị ahụ agaghị na-arọji arọji, mkpịsị aka anyị agaghịkwa na-arụ ọrụ nke ọma. O mere ka o doo m anya na e nwere onye ma ezigbo ihe kere ahụ́ mmadụ.

Ihe ọzọ tụrụ m n’anya gbasara Onye kere ihe niile bụ mgbe anyị mụrụ gbasara otú nwa a mụrụ ọhụrụ si amalite iku ume. M mụtara na tupu a mụọ nwata, ọ na-esi n’aka mama ya enweta ikuku. N’ihi ya, n’oge ahụ, ikuku adịbeghị n’ebe ikuku na-adị n’akpa ume ya. Obere oge tupu a mụọ ya, e nwere ihe na-anọchi ebe ahụ ikuku na-adị. A mụchazie nwa ahụ, ya ekuo ume mbụ ya, ihe dị ịtụnanya na-eme. Oghere dị n’obi ya na-emechi, mee ka ọbara banye n’akpa ume ya. Ihe ahụ nọchiri ebe ahụ ikuku na-adị na-eme ka ọ ghara ịnyakọta, ikuku ejuzie n’ime ya ozugbo. Ọ bụ otú ahụ ka nwa ahụ si amalite iku ume n’onwe ya.

Achọrọ m ịmatakwu gbasara Onye kere ihe ndị a dị ịtụnanya. N’ihi ya, m malitere ịgụsi Baịbụl ike. Iwu ndị Chineke nyere ụmụ Izrel gbasara ịdị ọcha ihe karịrị puku afọ atọ gara aga tụrụ m n’anya. Chineke gwara ha ka ha na-ekpochi nsị ha ájá, na-akwọ aka ha mgbe niile, na-akpọpụkwa onye na-arịa ọrịa na-efe efe iche. (Lev. 13:50; 15:11; Diut. 23:13) Baịbụl kwuru ihe ndị a ọtụtụ afọ gara aga. Ma, ọ ka bụ naanị n’ihe dị ka otu narị afọ na iri ise gara aga ka ndị sayensị chọpụtara otú ọrịa na-efe efe si agbasa. Ihe ọzọkwa bụ na iwu Chineke nyere ndị Izrel gbasara mmekọahụ n’akwụkwọ Levitikọs mere ka ha ghara ibute ọrịa. (Lev. 12:​1-6; 15:​16-24) Ihe ndị a mere ka m ghọta na Onye kere ihe niile nyere ụmụ Izrel iwu ndị a ka ọ baara ha uru. Ọ na-agọzikwa onye ọ bụla na-erube isi na ha. O mere ka obi sikwuo m ike na ọ bụ uche Chineke ka e dere na Baịbụl. Ma, n’oge ahụ, amabeghị m aha Chineke.

OTÚ M SI MATA NWUNYE M, MATAKWA JEHOVA

Mụ na Lydie nwunye m n’ụbọchị agbamakwụkwọ anyị n’abalị atọ n’ọnwa Eprel afọ 1965

Mgbe m nọ na mahadum na-agụ akwụkwọ ịbụ dọkịta, m hụrụ otu nwa agbọghọ aha ya bụ Lydie, hụkpọọ anya. Anyị lụrụ n’afọ 1965 mgbe m ka nọ na mahadum. Mgbe ọ na-erula afọ 1971, anyị amụọla atọ n’ime ụmụ isii anyị ji. Nwunye m na-eji obi ya niile akwado m, ma n’ọrụ m ma n’ezinụlọ.

E nwere ụlọ ọgwụ m rụrụ ọrụ afọ atọ tupu mụ emepee ụlọ ọgwụ nke m. O teghị aka m mepere ụlọ ọgwụ m, di na nwunye ahụ m kwuru okwu ha ná mmalite abịa n’ụlọ ọgwụ m. Mgbe m chọrọ ide ọgwụ a ga-azụtara di ya, nwunye ya sịrị m: “Biko, dọkịta, anyị achọghị ka ọbara soro n’ọgwụ a ga-enye ya.” O juru m anya, mụ asị ya: “Eziokwu? N’ihi gịnị?” Ya asị m: “Anyị bụ Ndịàmà Jehova.” Anụtụbeghị m gbasara Ndịàmà Jehova ma ọ bụkwanụ ihe ha kweere gbasara ọbara. Nwaanyị ahụ wepụtara Baịbụl ya, gosi m ihe Baịbụl kwuru mere na ha anaghị ekwe ka a mịnye ha ọbara. (Ọrụ 15:​28, 29) Ya na di ya jikwa Baịbụl gosi m ihe Alaeze Chineke ga-emere anyị. Ọ ga-eme ka ahụhụ, ọrịa, na ọnwụ gharazie ịdị. (Mkpu. 21:​3, 4) M ji obi ụtọ sị ha: “Ihe a unu na-agwa m bụ ihe m chọrọ kemgbe m bụ nwata. Ihe mere m ji bụrụ dọkịta bụ ka m mee ka ndị mmadụ kwụsị ịna-ata ahụhụ.” Ihe ahụ mụ na ha na-ekwu masịrị m nke na anyị ji otu awa na ọkara kparịta n’ụbọchị ahụ. Mgbe di na nwunye ahụ na-apụ, m kpebiziri n’obi m na abụghịzi m onye Katọlik. M mụtakwala na e nwere Onye kere ihe niile, nakwa na aha ya bụ Jehova.

Mụ na di na nwunye ahụ kparịtara ugboro atọ ọzọ n’ụlọ ọgwụ m. Anyị ji ihe karịrị otu awa kparịta na nke ọ bụla. M gwaziri ha ka ha bịa n’ụlọ m ka anyị nwekwuo oge ikwu gbasara Baịbụl. Ọ bụ eziokwu na Lydie nwunye m kwetara iso anyị na-amụ Baịbụl, mana, o kwetaghị na ụfọdụ ihe ndị Katọlik na-akụzi abụghị ihe Baịbụl na-akụzi. N’ihi ya, m gwara otu ụkọchukwu ka ọ bịa n’ụlọ anyị. Anyị ji naanị Baịbụl kwurịta gbasara ihe ndị Katọlik na-akụzi ruo n’etiti abalị. Ihe ahụ anyị kwurịtara mere ka obi sie Lydie ike na ọ bụ Ndịàmà Jehova na-akụzi eziokwu. Mgbe e mechara, anyị bịara hụkwuo Jehova n’anya, anyị abụọ emee baptizim n’afọ 1974.

IME KA OFUFE JEHOVA BỤRỤ IHE KACHA M MKPA

Ihe m mụtara gbasara ihe Chineke bu n’obi imere ụmụ mmadụ mere ka ihe kacha m mkpa ná ndụ gbanwee. Mụ na nwunye m mere ka ife Jehova bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ anyị. Anyị kpebisiri ike na anyị ga na-eji ihe Baịbụl kwuru na-azụ ụmụ anyị. Anyị kụziiri ụmụ anyị ịna-ahụ Chineke na ụmụ mmadụ n’anya. Ihe ahụ mere ka ezinụlọ anyị dịrị n’udo.​—Mat. 22:​37-39.

Anyị na-anwụkarị n’ọchị ma anyị cheta otú ọ na-adị ụmụ anyị na anyị abụọ na-enwe otu olu n’ihe ọ bụla. Ha ma na ọ bụ ihe ahụ Jizọs kwuru ka anyị na-eme n’ụlọ anyị, ya bụ, “ka ‘Ee’ unu kwuru bụrụ ee, ka ‘Ee e’ unu kwuru bụrụ ee e.” (Mat. 5:37) Dị ka ihe atụ, mgbe ada anyị dị afọ iri na asaa, nwunye m ekweghị ya ka ọ gaa soro ụmụaka ibe ya pụọ. Otu n’ime ụmụaka ndị ahụ sịrị nwa m nwaanyị: “Ọ bụrụnụ na mama gị ekweghị ka ị gaa, jụọnụ papa gị.” Ma, nwa m nwaanyị zara ya, sị: “Ọ baghị uru ịjụ papa m. Ha abụọ na-enwe otu olu mgbe niile.” Ụmụ anyị isii ma na anyị na-enwe otu olu ma a bịa n’ihe Baịbụl kwuru. Anyị na-ekele Jehova na taa, ọtụtụ ndị ezinụlọ anyị na-efe ya.

N’agbanyeghị na eziokwu Baịbụl agbanweela ihe kacha m mkpa ná ndụ, m ka chọrọ iji ihe m maara banyere ọrụ dọkịta nyere ndị Chineke aka. Ọ bụ ya mere m ji wepụta onwe m ịbụ dọkịta na Betel dị na Paris. M mechakwara soro na-arụ ọrụ na Betel ọhụrụ e nwere na Luvie. Kemgbe ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ iri ise, m na-esi n’ụlọ m aga enye aka na Betel. N’oge ahụ niile, emetara m ọtụtụ ndị enyi. Ụfọdụ n’ime ha agbaala ihe karịrị afọ iri itoolu. Obi tọrọ m ezigbo ụtọ otu ụbọchị mgbe m hụrụ otu onye bịara Betel ọhụrụ. O so ná ndị m nyere aka a mụọ ihe dị ka afọ iri abụọ gara aga.

AHỤRỤ M OTÚ JEHOVA SI NA-ELEKỌTA NDỊ YA

Kemgbe afọ ndị a, ahụkwuola m Jehova n’anya, hụkwa otú o si jiri nzukọ ya na-eduzi ndị ya ma na-echebe ha. N’ihe dị ka afọ 1980, Òtù Na-achị Isi hiwere otu ngalaba ga-enyere ndị dọkịta na ndị ụlọ ọgwụ aka ịghọta ihe mere Ndịàmà Jehova anaghị ekwe ka a mịnye ha ọbara.

N’afọ 1988, Òtù Na-achị Isi hiwere otu ngalaba na Betel, ya bụ, Ngalaba Na-enyere Ndị Dọkịta Aka Ịgwọ Ndịàmà Jehova n’Ejighị Ọbara. Ná mmalite, ngalaba a na-elekọta Kọmitii Ndị Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ e hiwere n’Amerịka inyere ụmụnna anyị ahụ́ na-adịghị aka ịchọta dọkịta ndị ga-agwọ ha n’amịnyeghị ha ọbara. Mgbe e mechara mee ka e nwee ngalaba a n’ụwa niile, e hiwere Kọmitii Ndị Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ na Frans. Ọ na-atụ m n’anya ịhụ otú ọgbakọ Jehova si eji obiọma na-elekọta ụmụnna anyị na-arịa ọrịa.

IHE M NA-ATỤ ANYA YA GA-EMEZU

Anyị akwụsịbeghị ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke

Ịbụ dọkịta bụbu ihe kacha m mkpa ná ndụ. Ma, mgbe m chebaara ihe ndị kacha m mkpa ná ndụ echiche, m ghọtara na ihe kacha mkpa bụ iji Okwu Chineke na-agwọ ndị mmadụ, ya bụ, inyere ha aka ka ha na Jehova Chineke bụ́ Onye na-enye ndụ dịrị ná mma. Mgbe m lara ezumike nká, mụ na nwunye m ghọrọ ọsụ ụzọ oge niile, jiri ọtụtụ awa na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke kwa ọnwa. Anyị ka na-emekwa ike anyị niile n’ọrụ a na-azọ ndụ.

Mụ na Lydie nwunye m n’afọ 2021

M ka na-enyere ndị ọrịa aka. M chọpụtara na e nweghị dọkịta ọ bụla ga-agwọli ọrịa niile ma ọ bụ mee ka ọnwụ gharazie ịdị. N’ihi ya, m na-atụsi anya ike mgbe ihe mgbu, ọrịa, na ọnwụ na-agaghịzi adị. N’ụwa ọhụrụ ahụ ji ọsọ na-abịa, m ga-enwe ike ịmụ gbasara ihe ndị Chineke kere ruo mgbe ebighị ebi, ma otú dị ịtụnanya o si kee ahụ́ mmadụ. N’eziokwu, ihe m na-atụ anya ya kemgbe m bụ nwata ga-emezucha n’oge na-adịghị anya. Obi siri m ike na ọdịnihu ga-akacha mma.