Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 10

Ị Ga-eyipụli “Àgwà Ochie” Ahụ

Ị Ga-eyipụli “Àgwà Ochie” Ahụ

“Yipụnụ àgwà ochie unu na-akpabu.”​—KỌL. 3:9.

ABỤ NKE 29 Na-ebi Ndụ Kwesịrị Aha Anyị

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee otú i si akpabu àgwà tupu gị amalite ịmụ Baịbụl?

 OLEE otú i si akpabu àgwà tupu gị na Ndịàmà Jehova amụwa Baịbụl? Ọtụtụ n’ime anyị anaghị achọ ichetatụdị otú ndụ anyị dị mgbe ahụ n’echiche. N’oge ahụ, anyị na-eme ihe ụwa sị na ọ dị mma, hapụkwa ihe ndị ha sịrị na ọ dịghị mma. Ọ bụrụ na ọ bụ otú ahụ ka ọ dị anyị, o gosiri na n’oge ahụ, anyị ‘enweghị olileanya, anyị amaghịkwa Chineke.’ (Efe. 2:12) Ma, ndụ anyị gbanwere mgbe anyị malitere ịmụ Baịbụl.

2. Olee ihe ndị ị mụtara mgbe ị malitere ịmụ Baịbụl?

2 Ka ị na-amụ Baịbụl, ị bịara mata Nna gị nke eluigwe, onye hụrụ gị n’anya nke ukwuu. Ị chọpụtara na ọ bụrụ na ị chọrọ ka ihe gị masị Jehova, gị esorokwa n’ezinụlọ ya, ị ga-agbanwe otú i si ebi ndụ nakwa otú i si eche echiche. Ihe ọzọ ị mụtakwara bụ na ị ga na-eme ihe dị Jehova mma ma jụ ihe ndị ọ kpọrọ asị.​—Efe. 5:​3-5.

3. Dị ka e kwuru ná Ndị Kọlọsi 3:​9, 10, gịnị ka Jehova chọrọ ka anyị mee? Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

3 Jehova, Onye kere anyị na Nna anyị nke eluigwe, ruru eru ikpebi otú ọ chọrọ ka ndị nọ n’ezinụlọ ya si na-akpa àgwà. O kwuru na tupu mmadụ emee baptizim, onye ahụ ga-eyipụ “àgwà ochie” ọ na-akpabu. * (Gụọ Ndị Kọlọsi 3:​9, 10.) Isiokwu a ga-enyere ndị chọrọ ime baptizim aka ịmata azịza ajụjụ atọ ndị a: (1) Gịnị bụ “àgwà ochie”? (2) Gịnị mere Jehova ji sị ka anyị yipụ ya? (3) Olee otú anyị ga-esi eme ya? Isiokwu a ga-enyere ndị merela baptizim aka ịghara ịmalitekwa na-eche echiche ma ọ bụ na-akpa àgwà ndị so n’àgwà ochie ahụ ha yipụrụla.

GỊNỊ BỤ “ÀGWÀ OCHIE”?

4. Olee otú onye yi “àgwà ochie” si akpa àgwà?

4 Onye yi “àgwà ochie” ahụ na-eche ihe na-agụ anụ ahụ́ ya agụụ, na-emekwa ya. O nwere ike ịbụ na ọ na-achọ ihe ga-abara naanị ya uru, na-ewe iwe ọkụ, ọ naghị ekele ndị meere ya ihe ọma, dịrịkwa mpako. Onye dị otú ahụ nwere ike ịna-ele ndị gba ọtọ, na-elekwa fim ebe a na-eme omume rụrụ arụ ma ọ bụ tigbuo zọgbuo. Onye a na-akpa àgwà ụfọdụ dị mma. O nwekwara ike ịbụ na ihe ọjọọ ọ na-eme na-ewute ya mgbe ụfọdụ, ma ọ katabeghị obi kwụsị ịna-eche ihe ọjọọ ma ọ bụ ịna-eme ya.​—Gal. 5:​19-21; 2 Tim. 3:​2-5.

Ọ bụrụ na anyị eyipụ “àgwà ochie” anyị, anyị agaghịzi na-eme ihe ndị na-adịghị mma anyị na-emebu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5) *

5. Olee ihe anyị kwesịrị iburu n’obi n’ihe gbasara iyipụ àgwà ochie? (Ọrụ Ndịozi 3:19)

5 Anyị ezughị okè. N’ihi ya, anyị agaghị emeli ka ihe ọjọọ ghara ịgụ anyị agụụ ma ọ bụ ghara ịbata anyị n’uche kpamkpam. Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike kwuo ma ọ bụ mee ihe anyị ga-emecha kwaara mmakwaara. (Jere. 17:9; Jems 3:2) Ma ọ bụrụ na anyị eyipụ àgwà ochie, anyị agaghịzi na-eme ihe na-adịghị mma anyị na-emebu. Ọ bụghịzi ihe a ga-eji mara anyị.​—Aịza. 55:7; gụọ Ọrụ Ndịozi 3:19.

6. Gịnị mere Jehova ji gwa anyị ka anyị kwụsị ịna-eche ihe ọjọọ, kwụsịkwa ịna-akpa àgwà ọjọọ?

6 Jehova chọrọ ka anyị kwụsị ịna-eche ihe ọjọọ, kwụsịkwa ịna-akpa àgwà ọjọọ n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu, chọọkwa ka anyị na-enwe obi ụtọ. (Aịza. 48:​17, 18) Ọ ma na ndị na-anaghị agba mbọ ka ha kwụsị ịna-eche ihe ọjọọ na-akpatara ma onwe ha ma ndị ọzọ nsogbu. Ọ na-ewute ya ịhụ ka anyị na-akpatara onwe anyị ma ọ bụ ndị ọzọ nsogbu.

7. Dị ka Ndị Rom 12:​1, 2 kwuru, olee ihe onye ọ bụla n’ime anyị ga-ekpebi?

7 Ụfọdụ ndị enyi anyị ma ọ bụ ndị ezinụlọ anyị nwere ike ịmalite na-akwa anyị emo ma ha hụ na anyị na-agbalị ịgbanwe otú anyị si ebi ndụ. (1 Pita 4:​3, 4) Ha nwere ike ịgwa anyị na anyị ga-emeli ihe ọ bụla anyị chọrọ, na anyị ekwesịghị ikwe ka ndị ọzọ na-agwa anyị ihe anyị ga-eme. Ma, ọ̀ bụ eziokwu na e nweghị onye na-atụrụ ndị na-achọghị ime ihe Jehova kwuru ihe ha na-eme? Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ ụwa Setan na-atụrụ ha ihe ha na-eme. (Gụọ Ndị Rom 12:​1, 2.) Onye ọ bụla n’ime anyị ga-ekpebi ma ọ̀ ka ga-eyiri àgwà ochie ya, ya bụ, ịna-eme mmehie ma na-ekwe ka ụwa Setan na-atụrụ ya ihe ọ ga-eme, ma ọ bụkwanụ ma ọ̀ ga-ekwe ka Jehova gbanwee ya ka ọ bụrụ ụdị mmadụ Jehova chọrọ ka ọ bụrụ.​—Aịza. 64:8.

OLEE OTÚ ANYỊ GA-ESI ‘YIPỤ’ ÀGWÀ OCHIE?

8. Olee ihe ndị ga-enyere anyị aka ịkwụsị ịna-eche ihe na-adịghị mma na ịna-akpa àgwà ọjọọ?

8 Jehova ma na ọ gaghị adịrị anyị mfe ịkwụsị ịna-eche ihe na-adịghị mma na ịna-akpa àgwà na-adịghị mma. Ọ makwa na ọ ga-ewe anyị oge ime ya. (Ọma 103:​13, 14) Ma, ọ na-eji Okwu ya, mmụọ ya, na nzukọ ya na-enye anyị amamihe, ike, na ume anyị ga-eji gbanwee ụdị ndị anyị bụ. O doro anya na o nyela anyị ihe ndị dị anyị mkpa iji nwee ike ịgbanwe. Ugbu a, ka anyị lee ihe ụfọdụ i nwere ike ime iji nwee ike iyipụ àgwà ochie ma ruo eruo ime baptizim.

9. Gịnị ka Okwu Chineke ga-enyere gị aka ime?

9 Jiri Baịbụl na-enyocha onwe gị nke ọma. Okwu Chineke dị ka enyo. O nwere ike inyere gị aka inyocha otú i si eche echiche, otú i si ekwu okwu, nakwa otú i si akpa àgwà. (Jems 1:​22-25) Onye na-amụrụ gị Baịbụl na ụmụnna ndị ọzọ ma nke a na-akọ nwekwara ike ịgwa gị ihe ụfọdụ ga-enyere gị aka. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike inyere gị aka iji Baịbụl chọpụta ebe ndị ị na-eme nke ọma na ebe ndị ị na-anaghị eme nke ọma. Ha nwere ike ịkụziri gị otú ị ga-esi achọta ihe Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka ịkwụsị àgwà ọjọọ ị na-akpa. Jehova dịkwa njikere inyere gị aka mgbe ọ bụla. Ọ ma otú kacha mma ọ ga-esi enyere gị aka. Ọ ma ihe dị gị n’obi. (Ilu 14:10; 15:11) N’ihi ya, na-ekpe ekpere ma na-amụ Okwu ya ụbọchị niile.

10. Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ Elie?

10 Ka obi sie gị ike na ihe ọ bụla Jehova chọrọ ka i mee kacha mma. Ọ bụrụ na anyị emee ihe ọ bụla Jehova sịrị anyị mee, ọ ga-abara anyị uru. Ndị na-eme ihe Jehova chọrọ na-enwe obi ụtọ, ndụ ha na-enwe isi, obi na-esikwa ha ike na ha bara uru. (Ọma 19:​7-11) Ma ndị na-achọghị ime ihe Jehova kwuru na-ata ahụhụ n’ihi na ha na-eme ihe na-agụ ahụ́ ha agụụ. Ka anyị lee ihe otu nwoke aha ya bụ Elie kwuru gbasara mmadụ ịkwụsị ime ihe Jehova chọrọ. Ndị mụrụ ya kụziiri ya ịhụ Jehova n’anya. Ma mgbe Elie na-eto eto, ọ malitere iso ndị ọjọọ. Ha mere ka ọ ṅụwa ọgwụ ọjọọ, na-eme omume rụrụ arụ, na-ezukwa ohi. Elie chọpụtara na ọ na-ewezi iwe ọkụ, na-emekwa tigbuo zọgbuo. O kwuru, sị: “M bidoro ịna-eme ihe niile a kụziiri m na Onye Kraịst ekwesịghị ime.” Ma Elie echefughị ihe a kụziiri ya mgbe ọ ka na-eto eto. O mechara malite ịmụ Baịbụl ọzọ. Ọ gbasiri mbọ ike kwụsị àgwà ọjọọ ndị ọ na-akpa ma mechaa mee baptizim n’afọ 2000. Olee otú ibi ndụ otú Jehova chọrọ si baara ya uru? Elie kwuru, sị: “Obi na-eruzi m ala ugbu a. Akọnụche m anaghịkwa ama m ikpe.” * Akụkọ a kụziiri anyị na ndị jụrụ ime ihe Jehova chọrọ na-akpatara onwe ha nsogbu. Ma, Jehova dịkwa njikere inyere ha aka ịgbanwe.

11. Olee ihe ndị Jehova kpọrọ asị?

11 Kpọọ ihe Jehova kpọrọ asị asị. (Ọma 97:10) Baịbụl kwuru na Jehova kpọrọ ‘mpako, ịgha ụgha, na igbu onye aka ya dị ọcha’ asị. (Ilu 6:​16, 17) Ọ kpọkwara “ndị tigbuo zọgbuo na ndị na-aghọ aghụghọ asị.” (Ọma 5:6) Jehova kpọrọ àgwà ọjọọ ndị a asị nke na o ji maka ya bibie ndị niile na-eme ha n’oge Noa n’ihi na ha mere ka tigbuo zọgbuo ju n’ụwa. (Jen. 6:13) Legodị ihe atụ ọzọ. Jehova si n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Malakaị kwuo na ọ kpọrọ onye ọ bụla ji aghụghọ gbaa nwunye ya aka ya dị ọcha alụkwaghịm asị. Jehova anaghị anabata ofufe ha na-efe ya. Ha ga-azakwa ya ajụjụ maka ihe ha mere.​—Mal. 2:​13-16; Hib. 13:4.

Otú ahụ nri mebiri emebi si asọ anyị oyi, ka ime ihe Jehova sị na ọ dịghị mma kwesịrị isi na-asọ anyị oyi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11 na nke 12)

12. Gịnị ka ‘ịkpọ ihe ọjọọ asị’ pụtara?

12 Jehova chọrọ ka anyị ‘kpọọ ihe ọjọọ asị.’ (Rom 12:9) Ọ pụtara na ọ chọrọ ka ihe ọjọọ na-asọ anyị oyi, ka anyị ghara inwe mmasị na ya chaa chaa. Chegodịnụ otú ọ ga-adị gị ma ọ bụrụ na mmadụ asị gị rie nri mebiri emebi. Naanị iche ya n’echiche nwere ike inu gị agbọ. Ọ bụkwa otú ahụ ka iche echiche ime ihe Jehova kpọrọ asị kwesịrị isi na-asọ anyị oyi.

13. Gịnị mere anyị kwesịrị iji wepụ echiche ọjọọ ọ bụla na-abata anyị n’uche?

13 Wepụ echiche ọjọọ n’uche gị. Anyị na-emekarị ihe anyị chere n’echiche. Ọ bụ ya mere Jizọs ji gwa anyị ka anyị ghara ịna-eche ihe ọjọọ n’ihi na o nwere ike ime ka anyi mee mmehie dị oké njọ. (Mat. 5:​21, 22, 28, 29) O doro anya na anyị chọrọ ime ihe dị Nna anyị nke eluigwe mma, ọ́ bụghị ya? Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa na anyị ga-agba mbọ wepụ echiche ọjọọ ọ bụla na-abata anyị n’uche ozugbo.

14. Gịnị ka ihe anyị na-ekwu na-egosi banyere ụdị ndị anyị bụ? Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?

14 Kpachara anya n’ihe ị na-ekwu. Jizọs kwuru, sị: “Ihe ọ bụla si n’ọnụ pụta si n’obi.” (Mat. 15:18) Ihe anyị na-ekwu na-egosi ụdị mmadụ anyị bụ. N’ihi ya, ọ dị mkpa ka ị jụọ onwe gị ajụjụ ndị a: ‘M̀ na-agbalị ka m ghara ịgha ụgha ọ bụrụgodị na ikwu eziokwu ga-akpatara m nsogbu? M̀ na-agbalịsi ike ka m ghara ịna-ekwu okwu rụrụ arụ? M̀ na-emeda obi agwa mmadụ okwu ma a kpasuo m iwe?’ Ọ bụrụ na ị lụọla di ma ọ bụ nwunye, jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-akpachara anya ka m ghara ịna-achụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị?’ Ichebara ajụjụ ndị a echiche ga-abara gị uru. Otú ahụ eriri e ji dụkọta ákwà na-eme ka o siere mmadụ ike ịdọka ya, ka okwu ọjọọ na-eme ka o siere anyị ike iyipụ àgwà ochie. Ọ ga-adịkwara anyị mfe iyipụ àgwà ochie ma ọ bụrụ na anyị agbaa mbọ kwụsị ikwu okwu ọjọọ, ịgha ụgha, na ikwu okwu rụrụ arụ. Ọ ga-adị ka ebe e ji ihe chabie eriri jikọtara anyị na àgwà ochie anyị.

15. Gịnị ka ịkpọgide àgwà ochie anyị “n’osisi” pụtara?

15 Dịrị njikere ime ihe i kwesịrị ime ozugbo. Pọl onyeozi ji ihe atụ kụziere anyị na ọ dị ezigbo mkpa ka anyị gbanwee otú anyị si ebi ndụ. O kwuru na anyị kwesịrị ịkpọgide àgwà ochie anyị “n’osisi.” (Rom 6:6) Jizọs kwere ka a kpọgide ya n’elu osisi iji mee ihe dị Jehova mma. Ọ bụrụkwa na anyị chọrọ ime ihe dị Jehova mma, anyị kwesịrị ịkwụsị ime ihe ọ bụla Jehova kpọrọ asị. Ọ bụ naanị mgbe anyị mere ihe ndị a ka anyị ga-enwe ezigbo akọnuche, nweekwa olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. (Jọn 17:3; 1 Pita 3:21) Jehova agaghị agbanwe iwu ya iji mee anyị obi ụtọ. Kama, ọ bụ anyịnwa kwesịrị ịgbanwe ụdị mmadụ anyị bụ iji rubere ya isi.​—Aịza. 1:​16-18; 55:9.

16. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-agba mbọ ewepụ ihe ọjọọ na-abata anyị n’obi?

16 Nọgide na-agba mbọ ka ihe ọjọọ ghara ịna-agụ gị agụụ. I mechagodị baptizim, ị ka ga-anọgidekwa na-agba mbọ ka ihe ọjọọ ghara ịna-agụ gị agụụ. Chegodị ihe mere otu nwoke aha ya bụ Maurício. Mgbe ọ dị obere, ya na ụmụ nwoke ibe ya malitere inwe mmekọahụ. Ya na Ndịàmà Jehova mechara bido ịmụ Baịbụl, ya amalitekwa ịgbanwe ndụ ya. O mere baptizim n’afọ 2002. Ọ bụ eziokwu na ọ dịla anya Maurício fewere Jehova, o kwuru, sị: “Ime ihe ọjọọ na-abata m n’obi mgbe ụfọdụ. Ma m na-agbalị iwepụ ya n’obi m ozugbo.” O kweghị ka ihe a mee ka ọ daa mbà, kama, o kwuru, sị: “Obi na-eru m ala ma m cheta na obi na-adị Jehova ụtọ na anaghị m eme ihe ọjọọ ndị ahụ na-abata m n’uche.” *

17. Olee ihe ị mụtara n’akụkọ Nabiha gbara gị ume?

17 Rịọ Jehova ka o nyere gị aka. Atụkwasịla onwe gị obi, kama tụkwasị mmụọ nsọ ya obi. (Gal. 5:22; Fil. 4:6) Anyị ga-agbasi mbọ ike ma ọ bụrụ na anyị chọrọ iyipụ àgwà ochie anyị kpamkpam. Ka anyị lee ihe mere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Nabiha. Nna ya hapụrụ ya mgbe ọ dị naanị afọ isii. O kwuru, sị: “Ihe a wutere m, meekwa ka obi gbawaa m.” Mgbe Nabiha tolitere, ọ malitere iwe iwe ọkụ, na-erekwa ọgwụ ọjọọ. E jidere ya, tụọ ya mkpọrọ, ya anọọkwa afọ ole na ole n’ụlọ mkpọrọ. Ndịàmà Jehova bịara zie ya ozi ọma n’ụlọ mkpọrọ ma malite ịmụrụ ya Baịbụl. Nabiha malitere ịgbanwe ndụ ya. O kwuru, sị: “O sighịrị m ike ịkwụsị ụfọdụ ihe ọjọọ ndị m na-emebu. Ma, o siiri m ezigbo ike ịkwụsị ịṅụ sịga.” Nabiha gbara mbọ ihe karịrị otu afọ tupu ya enwee ike ịkwụsị ịṅụ sịga. Olee otú o si mee ya? O kwuru, sị: “Ihe kacha nyere m aka ịkwụsị ya bụ na m na-ekpe ekpere mgbe niile, na-arịọ Jehova ka o nyere m aka.” O kwukwara, sị: “Ebe ọ bụ na m gbanwere àgwà ọjọọ m ma mewe ihe dị Jehova mma, o nweghị onye na-enweghị ike ịgbanwe àgwà ọjọọ nke ya.” *

Ị GA-ERULI ERU KA E MEE GỊ BAPTIZIM

18. Dị ka e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 6:​9-11, gịnị ka ụfọdụ ndị Chineke merela?

18 N’oge ndịozi Jizọs, ụfọdụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị Jehova họọrọ ka ha bụrụ ndị ga-eso Kraịst chịa na-akpabu àgwà ọjọọ. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ n’ime ha bụbu ndị di ma ọ bụ ndị nwunye na-akwa iko, ndị ha na ụmụ nwoke ibe ha na-edina, na ndị ohi. Ma, mmụọ nsọ Chineke nyeere ha aka ha akwụsị ịkpa àgwà ọjọọ ndị ahụ. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 6:​9-11.) Taakwa, Baịbụl enyerela ọtụtụ nde mmadụ aka ịgbanwe ndụ ha. * Ha enweela ike ịkwụsị àgwà ọjọọ ndị riri ha ahụ́. Akụkọ ha na-egosi na gịnwa nwekwara ike ịgbanwe ndụ gị, kwụsị àgwà ọjọọ ị na-akpa ma ruo eruo ime baptizim.

19. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

19 Ndị chọrọ ime baptizim ga-eyipụrịrị àgwà ochie ha. Ma, ha ga-agbakwa mbọ yiri àgwà ọhụrụ. Isiokwu na-esonụ ga-akọwa otú anyị ga-esi eyiri àgwà ọhụrụ nakwa otú ndị ọzọ ga-esi enyere anyị aka iyiri ya.

ABỤ NKE 41 Biko, Nụrụ Ekpere M

^ par. 5 Tupu mmadụ eruo eruo ka e mee ya baptizim, onye ahụ ga-agbanwe ihe ụfọdụ ná ndụ ya. Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịmata àgwà ndị so n’àgwà ochie, ihe mere anyị kwesịrị iji yipụ àgwà ochie, na otú anyị ga-esi eyipụ ya. Isiokwu na-eso nke a ga-akọwa otú anyị ga-esi ka yiri àgwà ọhụrụ mgbe anyị mechara baptizim.

^ par. 3 NKỌWAKWU: ‘Iyipụ àgwà ochie’ pụtara na anyị ga-akwụsị ịkpa àgwà ndị na-adịghị Jehova mma. Anyị kwesịrị ime ya tupu anyị emee baptizim.​—Efe. 4:22.

^ par. 10 Ị chọọ ịgụkwu gbasara ya, gụọ isiokwu bụ́ “Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ, ‘Achọpụtara M na M Kwesịrị Ịlọghachikwute Jehova.’” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Eprel 1, 2012.

^ par. 16 Ị chọọ ịgụkwu banyere ya, gụọ isiokwu bụ́ “Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ, ‘Ha Nyeere M Ezigbo Aka.’” Ọ gbara n’Ụlọ Nche nke Mee 1, 2012.

^ par. 17 Ị chọọ ịgụkwụ banyere ya, gụọ isiokwu bụ́ “Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ, ‘M Na-ewe Iwe Ọkụ ma Na-esekarị Okwu.’” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Ọktoba 1, 2012.

^ par. 18 Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ.”

^ par. 64 NKỌWA FOTO: Mmadụ ịkwụsị ịkpa àgwà ndị na-adịghị mma ọ na-akpabu dị ka iyipụ ákwà merela ochie.