Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 12

Ị̀ Na-ahụ Ihe Zekaraya Hụrụ?

Ị̀ Na-ahụ Ihe Zekaraya Hụrụ?

‘Ọ bụ mmụọ m ga-eme ha.’ Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.”​—ZEK. 4:6

ABỤ NKE 73 Mee Ka Anyị Ghara Ịtụ Egwu

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee ihe ọma na-aga imere ndị Juu a dọọrọ n’agha?

 OBI dị ndị Juu niile ụtọ. Jehova Chineke “mere ka Saịrọs eze Peshia” nye iwu ka a hapụ ndị Izrel niile ndị Babịlọn dọọrọ n’agha kemgbe ọtụtụ afọ. Eze kwuru na ndị Juu nwere ike ịlaghachi n’ala nna ha ma “rụghachi ụlọ Jehova bụ́ Chineke Izrel.” (Ezra 1:​1, 3) Ihe a o kwuru mere ha ezigbo obi ụtọ. Ọ pụtara na ha ga-amaliteghachi ife ezi Chineke n’ala Jehova Chineke nyere ha.

2. Mgbe ndị Juu ahụ laghachiri Jeruselem, olee ihe mbụ ha mere?

2 Ndị nke mbụ lawara n’ime ndị Juu ahụ a dọọrọ n’agha rutere Jeruselem bụ́ isi obodo Juda n’afọ 537 Tupu Oge Ndị Kraịst. Ndị Juu ahụ malitere ịrụghachi ụlọ nsọ ahụ ozugbo. Mgbe ọ na-erule afọ 536 Tupu Oge Ndị Kraịst, ha atọọla ntọala ya.

3. Olee ndị megidere ndị Juu? Oleekwa otú ha si mee ya?

3 Ozugbo ndị Juu malitere ịrụghachi ụlọ nsọ ahụ, ọtụtụ ndị bidoro imegide ha. Obodo ndị gbara ha gburugburu nọ “na-eme ka obi ghara isi ndị Juda ike, na-emekwa ka ike ịrụ ụlọ ahụ gwụ ha.” (Ezra 4:4) Ihe a mere ka ihe siere ndị Juu ahụ ike. Ma ihe mechara ka njọ. N’afọ 522 Tupu Oge Ndị Kraịst, Atazaksis ghọrọ eze Peshia. * Ndị mmegide ahụ chere na ebe ọ bụ na e nweela eze ọhụrụ, ọ ga-eme ka ọ dịrị ha mfe ime ka a kwụsị ịrụ ụlọ nsọ ahụ. Ha malitere ‘iji iwu akpata nsogbu.’ (Ọma 94:20) Ha gwara Eze Atazaksis na ndị Juu na-achọ inupụrụ ya isi. (Ezra 4:​11-16) Eze kwetara ụgha a ha ghaara ya ma nye iwu ka a kwụsị ịrụ ụlọ nsọ ahụ. (Ezra 4:​17-23) N’ihi iwu a eze nyere, ndị Juu kwụsịrị ịrụ ụlọ nsọ ahụ.​—Ezra 4:24.

4. Gịnị ka Jehova mere mgbe ndị iro mere ka a machie ịrụ ụlọ nsọ ahụ? (Aịzaya 55:11)

4 Ndị bi n’obodo ahụ na-anaghị efe Jehova nakwa ụfọdụ ndị nọ n’ọchịchị na Peshia fooro ntutu taa na ha ga-akwụsịrịrị ụlọ nsọ ahụ a na-arụ. Ma Jehova kpebisikwara ike na ọ ga-eme ka a rụrụ ọrụ ahụ na-aga. Ihe ọ bụla o zubere na-emezukwa. (Gụọ Aịzaya 55:11.) O mere ka e nwee onye amụma na-anaghị atụ egwu aha ya bụ Zekaraya. O mekwara ka ọ hụ ọhụụ asatọ na-eme obi ụtọ. Zekaraya mechara gwa ndị Juu gbasara ọhụụ ndị ahụ iji gbaa ha ume. Ọhụụ ndị ahụ na-agba ume nyeere ha aka ịhụ na ha ekwesịghị ịtụ ndị iro ha ụjọ, gbaakwa ha ume ịrụrụ ọrụ Jehova na-aga. N’ọhụụ nke ise, Zekaraya hụrụ ihe e ji adọsa ọkụ na osisi oliv abụọ.

5. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

5 Anyị niile na-ada mbà mgbe ụfọdụ. N’ihi ya, ịmụ banyere ọhụụ nke ise ahụ Jehova gosiri Zekaraya iji gbaa ndị Izrel ume nwekwara ike ịgba anyị ume. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú ịghọta ọhụụ a ga-esi enyere anyị aka ịnọgide na-efe Jehova mgbe a na-emegide anyị, mgbe ihe gbanwere ná ndụ anyị, ma ọ bụkwanụ mgbe nzukọ Jehova nyere ntụziaka anyị na-aghọtachaghị.

MGBE A NA-EMEGIDE ANYỊ

N’ọhụụ Zekaraya hụrụ, ọ hụrụ osisi oliv abụọ mmanụ si na ya na-abanye n’ihe e ji adọsa ọkụ ọkụ asaa dị na ya (A ga-akọwa ya paragraf nke 6)

6. Olee otú ọhụụ gbasara ihe ahụ e ji adọsa ọkụ na osisi oliv abụọ ahụ e kwuru okwu ha na Zekaraya 4:​1-3 si mee ka ndị Juu nwee obi ike? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

6 Gụọ Zekaraya 4:​1-3. Olee otú ọhụụ gbasara ihe ahụ e ji adọsa ọkụ na osisi oliv abụọ ahụ si mee ka ndị Juu nwee obi ike ịnọgide na-arụ ọrụ ha n’agbanyeghị mmegide? Ị̀ chọpụtara na mmanụ ọkụ anaghị akọ ụkọ n’ihe ahụ e ji adọsa ọkụ? Mmanụ si n’osisi oliv abụọ ahụ na-abanye n’otu efere dị ebe ahụ. Mmanụ ndị ahụ esizie na ya na-abanye n’ọkụ asaa ahụ a dọkwasịrị n’elu ihe e ji adọsa ọkụ. Mmanụ ọkụ ahụ na-eme ka ọkụ ahụ na-enwu mgbe ọ bụla. Zekaraya jụrụ mmụọ ozi na-agwa ya okwu, sị: “Gịnị ka ihe ndị a pụtara?” Mmụọ ozi ahụ gwara ya na Jehova kwuru, sị: “‘Ọ bụghị ìgwè ndị agha ga-eme ihe ndị a, ọ bụghịkwa ike mmadụ, kama ọ bụ mmụọ m ga-eme ha.’ Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.” (Zek. 4:​4, 6) Mmanụ ọkụ ahụ si n’osisi abụọ ahụ na-anọchi anya mmụọ nsọ Jehova nke na-enweghị ihe ga-eme ka Jehova kwụsị inye ya. Mmụọ nsọ Chineke dị ike karịa ndị agha Peshia niile. Ebe ọ bụ na Jehova nọnyeere ndị ahụ na-ewughachi ụlọ nsọ ahụ, ha ga-enwe ike ịrụcha ọrụ ha n’agbanyeghị na a na-emegide ha. Ihe a gbara ndị Juu ume. Ihe ha kwesịrị ime bụ ịtụkwasị Jehova obi ma maliteghachi ịrụ ụlọ nsọ ahụ. Ọ bụkwa ihe ha mere n’agbanyeghị na a ka machiri ha ịrụ ụlọ nsọ ahụ.

7. Olee ihe gbanwere nke mere ka ihe dịtụrụ ndị ahụ na-arụ ụlọ nsọ ahụ mfe?

7 E nwere ihe gbanwere nke mere ka ihe dịtụrụ ndị ahụ na-arụ ụlọ nsọ ahụ mfe. Olee ihe ọ bụ? Eze ọhụrụ aha ya bụ Darayọs nke Mbụ malitere ịchị Peshia. N’afọ nke abụọ ọ malitere ịchị, ya bụ n’afọ 520 Tupu Oge Ndị Kraịst, ọ chọpụtara na iwu akwadoghị mmachi ahụ a machiri ịrụ ụlọ nsọ ahụ. Darayọs nyeziri iwu ka a maliteghachi ịrụ ụlọ nsọ ahụ ma rụchaa ya. (Ezra 6:​1-3) Ihe a o kwuru tụrụ mmadụ niile n’anya. Ma o nwekwara ihe ọzọ eze ahụ mere. O nyere iwu ka ndị niile bi gburugburu ha ghara inye ha nsogbu n’ọrụ a ha na-arụ nakwa ka ha nye ha ego na ihe ndị dị ha mkpa iji rụchaa ụlọ nsọ ahụ. (Ezra 6:​7-12) Ihe a mere ka ndị Juu rụchaa ụlọ nsọ ahụ n’afọ 515 Tupu Oge Ndị Kraịst, ya bụ, mgbe afọ anọ na ọnwa ole na ole gachara.​—Ezra 6:15.

Tụkwasị Jehova obi na ọ ga-enye gị ike mgbe a na-emegide gị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8)

8. Gịnị mere i kwesịrị iji nwee obi ike ma a na-akpagbu gị?

8 Taa, a na-akpagbukwa ọtụtụ ndị na-efe Jehova. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị bi n’ebe ndị ọchịchị machiri anyị ịrụ ọrụ anyị. N’obodo ndị ahụ, e nwere ike ịnwụchi ụmụnna anyị ma ‘kpụga ha n’ihu ndị gọvanọ na ndị eze.’ Ọ ga-abụkwara ha àmà. (Mat. 10:​17, 18) Mgbe ụfọdụ, ọ bụrụ na ọchịchị agbanwee, ọ na-eme ka ihe dịtụrụ ụmụnna anyị mfe. Mgbe ụfọdụkwanụ, ọkàikpe dị obiọma nwere ike kpebie ikpe otú ga-eme ka anyị nwee ike ịna-efe Chineke n’enweghị ndị na-enye anyị nsogbu. Otú e si emegide ụmụnna anyị ndị ọzọ dịkwa iche. Ụfọdụ bi n’obodo ndị ọchịchị na-amachighị ha ife Jehova, mana ndị ezinụlọ ha ekpebisie ike na ha ga-eme ka ha kwụsị ife Chineke. (Mat. 10:​32-36) Ọtụtụ mgbe, ọ bụrụ na ndị ezinụlọ ụmụnna ndị a na-akpagbu ha achọpụta na mbọ ha na-agba ịkwụsị ụmụnna anyị ife Jehova akụọla afọ n’ala, ha na-akwụsị ịkpagbu ha. E nwedịrị ụfọdụ ndị na-akpagbubu ndị ezinụlọ ha mechara ghọọ Ndịàmà Jehova na-anụ ọkụ n’obi. Ọ bụrụ na a na-akpagbu gị, adala mbà. Nwee obi ike. Jehova ga-eji mmụọ nsọ ya dị ike na-akwado gị. N’ihi ya, i kwesịghị ịtụ ụjọ.

MGBE IHE GBANWERE NÁ NDỤ ANYỊ

9. Gịnị mere obi ji gbawaa ụfọdụ ndị Juu mgbe a tọrọ ntọala ụlọ nsọ ọhụrụ ahụ?

9 Mgbe a tọrọ ntọala ụlọ nsọ ahụ, ụfọdụ ndị Juu mere agadi bere ákwá. (Ezra 3:12) Ha hụrụ otú ụlọ nsọ Solomọn rụrụ si dị ebube. Ha cheziri na nke ọhụrụ a ‘enweghị ihe ọ bụ ma e were ya tụnyere’ nke mbụ ahụ. (Hag. 2:​2, 3) Obi gbawara ha mgbe ha ji otú ụlọ nsọ nke mbụ ahụ dị tụnyere nke a na-arụ ugbu a. Olee otú ọhụụ Zekaraya ga-esi enyere ha aka ịmaliteghachi inwe obi ụtọ?

10. Olee otú ihe mmụọ ozi ahụ kwuru e dere na Zekaraya 4:​8-10 si nyere ndị Juu aka ịmaliteghachi inwe ọṅụ?

10 Gụọ Zekaraya 4:​8-10. Gịnị ka mmụọ ozi ahụ bu n’obi mgbe ọ gwara ndị Juu na ha “ga-aṅụrị ọṅụ, hụkwa eriri e ji atụ̀ ihe n’aka Zerubabel” bụ́ gọvanọ ndị Juu? A na-eji eriri e ji atụ̀ ihe ama ma ihe ọ̀ kwụkwa ọtọ otú o kwesịrị. Mmụọ ozi ahụ na-emesi ndị Chineke obi ike na n’agbanyeghị na ụlọ nsọ ahụ nwere ike ọ gaghị ebu ibu ma ọ bụ maa mma ka nke mbụ ahụ, a ga-arụcha ya. Ọ ga-emekwa Jehova obi ụtọ. Ebe ọ bụ na ụlọ nsọ ahụ ga-amasị Jehova, o kwesịkwara ịmasị ha. Ihe dị Jehova mkpa bụ ka a na-efe ya otú ọ chọrọ n’ụlọ nsọ ọhụrụ ahụ. Ọ bụrụ na ndị Juu elekwasị anya n’ife Jehova otú ọ chọrọ na ime ihe na-amasị ya, ha ga-amaliteghachi inwe ọṅụ.

Na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị ma ihe gbanwee ná ndụ gị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11 na nke 12) *

11. Olee ihe na-esiri ụfọdụ ndị Jehova ike taa?

11 Ọ naghị adịrị ọtụtụ n’ime anyị mfe ma ihe gbanwee ná ndụ anyị. A gbanweerela ụfọdụ ụmụnna anyị jerela ozi oge niile pụrụ iche ruo ọtụtụ afọ ọrụ ha ma ọ bụkwanụ kwụsị ụfọdụ n’ime ha ọrụ kpamkpam. Ụfọdụ akwụsịkwala ozi ha na-eje na-atọgbu ha atọgbu n’ihi na ha emeela agadi. O nwere ike ịna-ewute anyị ma ụdị ihe a mee anyị. Ozugbo e mere ụdị ihe a, e nwere ike anyị agaghị aghọta ihe mere e ji mee ya ma ọ bụ kweta na e kwesịrị ime ya. O nwere ike ịna-agụ anyị agụụ ka ihe dịkwa otú ọ dịbu. O nwekwara ike ime ka anyị daa mbà, anyị ana-eche na e nwechaghịzi uru anyị baara Jehova. (Ilu 24:10) Olee otú ọhụụ Zekaraya ga-esi enyere anyị aka ịnọgide na-enye Chineke ihe kacha mma anyị nwere?

12. Olee otú ọhụụ Zekaraya ga-esi enyere anyị aka ịnọgide na-enwe ọṅụ ma ihe gbanwee ná ndụ anyị?

12 Ọ ga-aka adịrị anyị mfe ịnabata mgbanwe ma ọ bụrụ na anyị agbalịa lee ihe anya otú Jehova si ele ya. Jehova na-arụ ọtụtụ ihe taa. Obi dịkwa anyị ụtọ na anyị na ya na-arụkọ ọrụ. (1 Kọr. 3:9) E nwere ike ịgbanwe ihe anyị na-arụ ná nzukọ Jehova, ma otú Jehova si hụ anyị n’anya anaghị agbanwe agbanwe. N’ihi ya, ọ bụrụ na mgbanwe nzukọ Jehova mere agbasa gị, anọkwala na-echegbu onwe gị gbasara ihe mere e ji mee mgbanwe ahụ. Kama ịna-achọ ka ihe dịrị gị otú ọ dị ‘n’oge gara aga,’ kpee ekpere ma rịọ Jehova ka o mee ka ị hụ uru mgbanwe ahụ bara. (Ekli. 7:10) Kama ịna-eche banyere ihe ndị ị na-enweghịzi ike ime, na-eche banyere ihe ndị i nwere ike ime. Ọhụụ Zekaraya na-akụziri anyị ịna-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị. Ọ ga-eme ka anyị jiri ọṅụ nọgide na-efe Jehova, ọ bụrụgodị na ihe agbanwee ná ndụ anyị.

MGBE NZUKỌ JEHOVA NYERE NTỤZIAKA ANYỊ NA-AGHỌTACHAGHỊ

13. Gịnị mere ụfọdụ ndị Izrel nwere ike iji chee na ntụziaka ahụ e nyere ka a maliteghachị ịrụ ụlọ nsọ ahụ adabaghị adaba?

13 N’agbanyeghị na a machiri ịrụghachi ụlọ nsọ ahụ, Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Jeshụa (Joshụa) na Gọvanọ Zerubabel, bụ́ ndị Jehova ji na-eduzi ndị ya, “malitere ịrụghachi ụlọ Chineke.” (Ezra 5:​1, 2) Ụfọdụ ndị Juu nwere ike iche na ihe a ha na-eme adabaghị adaba. O nweghị otú ha ga-esi na-arụghachi ụlọ nsọ ahụ ndị iro ha aghara ịma. Ha ga-agbalịkwa isi ụzọ ọ bụla kwụsị ha ịrụ ya. Ọ dị mkpa ka e mesie Joshụa na Zerubabel, bụ́ ndị Jehova ji na-edu ndị ya, obi ike na Jehova kwụ ha n’azụ. E mesikwara ha obi ike. Olee otú e si mee ya?

14. Dị ka e kwuru na Zekaraya 4:​12, 14, olee otú e si mesie Nnukwu Onye Nchụàjà Joshụa na Gọvanọ Zerubabel obi ike?

14 Gụọ Zekaraya 4:​12, 14. N’ebe ndị a anyị gụrụ n’ọhụụ Zekaraya, mmụọ ozi ahụ mere ka onye amụma Chineke ghọta na osisi oliv abụọ ahụ nọchiri anya “ndị e tere mmanụ. Ha dị abụọ.” Ha bụ Joshụa na Zerubabel. Mmụọ ozi ahụ kwuru na ụmụ nwoke abụọ ahụ “guzokwa n’akụkụ Onyenwe elu ụwa niile,” ya bụ, Jehova. Ihe a gosiri na Jehova ji ha kpọrọ ihe. Ọ tụkwasịrị ha obi. N’ihi ya, ndị Izrel kwesịrị ịtụkwasị ha obi ma mee ihe ọ bụla ha gwara ha mee n’ihi na ọ bụ ha ka Jehova ji na-edu ha.

15. Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị ji ntụziaka Jehova si n’Okwu ya na-enye anyị kpọrọ ihe?

15 Taakwa, Jehova na-eji Okwu ya bụ́ Baịbụl eduzi ndị ya. Ọ na-esi na ya agwa anyị otú ọ chọrọ ka anyị si na-efe ya. Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị ji ntụziaka e si na Baịbụl na-enye anyị kpọrọ ihe? Ọ bụ iwepụta oge na-agụ ya ma gbalịa ịghọta ihe ọ na-ekwu. Jụọ onwe gị, sị: ‘M gụwa Baịbụl ma ọ bụ akwụkwọ anyị, m̀ na-akwụsịtụ tụgharịa uche n’ihe ọ na-akụziri m? M̀ na-eme nchọnchọ iji ghọta eziokwu ndị “siri ike nghọta” dị na Baịbụl? Ka ihe m na-eme ọ̀ bụ naanị ịgụ ya elu elu?’ (2 Pita 3:16) Ọ bụrụ na anyị ewepụta oge na-atụgharị uche n’ihe Jehova na-akụziri anyị, ọ ga-eme ka ọ dịrị anyị mfe ịna-eso ntụziaka ndị ọ na-enye anyị, nweekwa ike ijezu ozi anyị.​—1 Tim. 4:​15, 16.

Tụkwasị “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” obi ma ha nye ntụziaka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16) *

16. Ọ bụrụ na anyị aghọtachaghị ihe “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” gwara anyị mee, gịnị ga-enyere anyị aka ime ya?

16 Jehova na-esikwa n’aka “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” enye anyị ntụziaka. (Mat. 24:45) Mgbe ụfọdụ, ha nwere ike inye anyị ntụziaka anyị na-agaghị aghọtacha. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ịgwa anyị ihe anyị ga-eme iji kwadebe maka ọdachi ndị na-emere onwe ha. Ma anyị nwere ike iche na ụdị ọdachi ahụ emekataghị mee n’ebe anyị bi. Anyị nwekwara ike iche na otú ha si akpachapụ anya ma e nwee ọrịa na-efe efe na-agafe ókè. Olee ihe anyị kwesịrị ime ma anyị chee na ntụziaka ha nyere adabaghị adaba? Anyị nwere ike iche banyere uru ndị Izrel ritere n’ihi na ha sooro ntụziaka Joshụa na Zerubabel nyere ha. Anyị nwekwara ike iche banyere akụkọ ndị ọzọ dị na Baịbụl anyị gụrụla. E nwere oge ndị a gwara ndị Chineke ka ha mee ihe ndị ha chere na ọ dabaghị adaba, ma ime ihe ndị ahụ zọrọ ha ndụ.​—Ikpe 7:7; 8:10.

HỤ IHE ZEKARAYA HỤRỤ

17. Olee uru ọhụụ gbasara ihe ahụ e ji adọsa ọkụ na osisi oliv abụọ baara ndị Juu?

17 O nwere ike ịbụ na ọhụụ nke ise Zekaraya hụrụ dị nkenke, ma o nyeere ndị Juu aka iji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ ha ma na-efe Chineke. Mgbe ha mere ihe ha mụtara n’ọhụụ ahụ Zekaraya hụrụ, Jehova gọziri ha n’ihi na ha sooro ntụziaka ahụ e nyere ha. Jehova ji mmụọ nsọ ya dị ike nyere ha aka ịrụ ọrụ ahụ ma maliteghachi inwe ọṅụ.​—Ezra 6:16.

18. Olee uru ọhụụ Zekaraya ga-abara gị?

18 Ọhụụ Zekaraya gbasara ihe ahụ e ji adọsa ọkụ na osisi oliv abụọ ahụ nwekwara ike ịbara gị uru. Dị ka anyị tụlerela, o nwere ike inyere gị aka inweta ike ị ga-eji die mmegide, ime ka ị na-enwe ọṅụ mgbe ihe gbanwere ná ndụ gị, meekwa ka ị tụkwasị ndị Jehova ji eduzi anyị obi ma ha nye ntụziaka ị na-aghọtaghị. Olee ihe ị ga-eme ma ihe gbanwee ná ndụ gị? Nke mbụ, hụ ihe Zekaraya hụrụ, ya bụ, ihe gosiri na Jehova na-elekọta ndị ya. Mee ihe iji gosi na ị tụkwasịrị Jehova obi ma jiri obi gị niile na-efe ya. (Mat. 22:37) Ọ bụrụ na i mee ya, Jehova ga-enyere gị aka iji ọṅụ na-efe ya ruo mgbe ebighị ebi.​—Kọl. 1:​10, 11.

ABỤ NKE 7 Jehova Bụ Ike Anyị

^ par. 5 Jehova mere ka Zekaraya hụ ọtụtụ ọhụụ na-eme obi ụtọ. Ọhụụ ahụ mere ka Zekaraya na ndị Jehova maliteghachi ofufe dị ọcha n’agbanyeghị na ọ dịghịrị ha mfe. Ọhụụ ndị ahụ nwekwara ike inyere anyị aka iji obi anyị niile na-efe Jehova n’agbanyeghị nsogbu. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe ndị dị mkpa anyị ga-amụta n’otu n’ime ọhụụ ndị Zekaraya hụrụ. N’ọhụụ ahụ, Zekaraya hụrụ ihe e ji adọsa ọkụ na osisi oliv abụọ.

^ par. 3 Mgbe ọtụtụ afọ gachara, n’oge Gọvanọ Nehemaya, e nwere eze ọzọ malitere ịchị Peshia aha ya bụkwa Atazaksis. O meere ndị Juu ihe ọma.

^ par. 60 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna chọpụtara na o kwesịghị ikwe ka nká na ọrịa mee ka ọ ghara ịna-enwe ọṅụ.

^ par. 62 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna nwaanyị na-atụgharị uche n’ihe gosiri na Jehova na-akwado “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” otú ahụ ọ kwadoro Joshụa na Zerubabel.